Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2016

“Na-agbanụ Ibe Unu Ume Kwa Ụbọchị”

“Na-agbanụ Ibe Unu Ume Kwa Ụbọchị”

“Ọ bụrụ na unu nwere okwu agbamume ọ bụla unu ga-agwa ndị a, kwuonụ ya.”—ỌRỤ 13:15.

ABỤ: 121, 45

1, 2. Olee ihe gosiri na ịgba ndị ọzọ ume dị mkpa?

OTU nwa agbọghọ dị́ afọ iri na asatọ aha ya bụ Chidịmma [1] sịrị: “Papa m na mama m anaghị agba m ume. Ha na-akatọkarị m. Ihe ha na-agwa m na-afụ m ụfụ n’obi. Ha sịrị na m na-akpa àgwà ụmụaka, na mụ agaghị amụta ịkpa àgwà ka dimkpa, nakwa na m buru ibu. N’ihi ya, m na-ebekarị ákwá. Anaghị m achọ ịgwa ha okwu. Ọ na-adị m ka o nweghị ihe m dị mma ya.” Ọ bụrụ na a naghị agba anyị ume, ike ụwa nwere ike ịgwụ anyị.

2 Ma, chegodị uru ịgba ndị ọzọ ume ga-abara ha. Otu nwanna aha ya bụ Rubén sịrị: “Kemgbe ọtụtụ afọ, ọ na-adị m ka o nweghị uru m bara. Ma, otu ụbọchị, mụ na otu okenye nọ n’ozi ọma, ya achọpụta na obi adịghị m mma. O gere m ntị nke ọma ka m na-akọrọ ya otú obi dị m. Mgbe m kọchara, ya echetara m ihe ọma ndị m na-eme. O chetakwaara m na Jizọs kwuru na onye ọ bụla n’ime anyị bara uru karịa ọtụtụ nza. M na-echetakarị amaokwu Baịbụl ahụ. Ọ ka na-emetụ m n’obi. Okwu okenye ahụ gwara m mere ka obi dị m mma.”—Mat. 10:31.

3. (a) Gịnị ka Pọl onyeozi kwuru gbasara ịgba ndị ọzọ ume? (b) Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu a?

3 O kwesịghị iju anyị anya na Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịna-agba ibe anyị ume. Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị  Hibru akwụkwọ ozi, sị: “Ụmụnna m, lezienụ anya ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịmalite inwe ajọ obi nke na-enweghị okwukwe site n’ịhapụ Chineke dị ndụ; ma na-agbanụ ibe unu ume kwa ụbọchị, . . . ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịbụ onye ike dị aghụghọ nke mmehie mere ka obi ya kpọchie.” (Hib. 3:12, 13) I cheta otú obi dị gị mgbe a gbara gị ume, ị ga-aghọta na anyị kwesịrị ịna-agba ụmụnna anyị ume otú ahụ Pọl kwuru. N’ihi ya, ajụjụ ndị anyị ga-aza bụ: Gịnị mere ịgba ume ji dị mkpa? Gịnị ka anyị ga-amụta n’otú Jehova, Jizọs, na Pọl si gbaa ndị ọzọ ume? Oleekwa otú anyị ga-esi na-agba ndị ọzọ ezigbo ume?

E KWESỊRỊ ỊNA-AGBA ONYE Ọ BỤLA UME

4. Ònye ka e kwesịrị ịna-agba ume? Gịnị mere o ji dị ụkọ taa?

4 E kwesịrị ịna-agba anyị niile ume, nke ka nke, ndị na-eto eto. Otu onye nkụzi aha ya bụ Timothy Evans kwuru na “e kwesịrị ịna-agba ụmụaka ume otú ahụ e kwesịrị ịna-agba ihe a kụrụ akụ mmiri.” O kwukwara na “ịgba nwatakịrị ume ga-eme ka ọ ghọta na ya bara uru nakwa na e ji ya kpọrọ ihe.” Ma ebe anyị bi n’oge dị oké egwu, ọtụtụ ndị na-achọ naanị ọdịmma nke ha, ha enweghị obi mmadụ, ha anaghịkwa agba ndị ọzọ ume. (2 Tim. 3:1-5) Ụfọdụ ndị nne na nna anaghị aja ụmụ ha mma n’ihi na nne ha na nna ha ajaghị ha mma. A naghị aja ọtụtụ ndị e were n’ọrụ mma. Ọ bụ ya mere ha ji ekwu na ịgba mmadụ ume dị ezigbo ụkọ n’ụlọ ọrụ.

5. Olee otú anyị nwere ike isi gbaa ndị ọzọ ume?

5 Ọtụtụ mgbe, otú e nwere ike isi gbaa mmadụ ume bụ ịja ya mma maka ihe ọma o mere. Otú ọzọ e nwere ike isi gbaa ndị ọzọ ume bụ ịna-agwa ha àgwà ọma ha na-akpa ma ọ bụ ihe ga-eme ka obi dị ha mma mgbe ha “dara mbà.” (1 Tesa. 5:14) Okwu Grik a na-esikarị asụgharịta ‘ịgba ume’ pụtara ‘mmadụ ịkpọta onye ọzọ ka ọ bịa nọrọ ya n’akụkụ.’ Ka anyị na ụmụnna anyị na-efekọ Jehova, anyị nwere ike inwe ọtụtụ ohere anyị ga-eji kwuo ihe ga-agba ha ume. (Gụọ Ekliziastis 4:9, 10.) Ànyị na-eji ohere dabara adaba eme ka ndị ọzọ mata ihe mere anyị ji hụ ha n’anya, jirikwa ha kpọrọ ihe? Tupu anyị azaa ajụjụ a, anyị kwesịrị icheta na Baịbụl kwuru na “okwu e kwuru n’oge ya” magburu onwe ya.—Ilu 15:23.

6. Gịnị mere Ekwensu ji achọ ime ka anyị daa mbà? Nye ihe atụ.

6 Setan bụ́ Ekwensu chọrọ ime ka anyị daa mbà n’ihi na ọ ma na ịda mbà nwere ike ime ka ife Chineke gwụwa anyị ike. Ilu 24:10 kwuru, sị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” Setan chọrọ ka Job daa mbà. Ọ bụ ya mere o ji taa ya ezigbo ahụhụ, bookwa ya ọtụtụ ebubo ụgha. Ma arụrụala ya kụrụ afọ n’ala. (Job 2:3; 22:3; 27:5) Anyị nwere ike ịkụghasị ọrụ Ekwensu ma ọ bụrụ na anyị na-agba ndị ọzọ ume ma n’ezinụlọ anyị ma n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị ga na-enyere ibe anyị aka ịna-enwe obi ụtọ, ha na Jehova adịkwa ná mma.

NDỊ GBARA NDỊ ỌZỌ UME NA BAỊBỤL

7, 8. (a) Olee ihe ndị a kọrọ na Baịbụl gosiri na Jehova chọrọ ka a na-agba ndị ọzọ ume? (b) Olee otú ndị nne na nna ga-esi na-eṅomi Jehova? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

7 Jehova. Otu ọbụ abụ sịrị: “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.” (Ọma 34:18) Mgbe ụjọ ji Jeremaya, obi adaakwa ya mbà, Jehova mere ka obi sie ya ike. (Jere. 1:6-10) Mgbe Daniel onye amụma mere agadi, chegodị otú obi si dị ya ụtọ mgbe Chineke zitere otu mmụọ ozi ka ọ bịa  gbaa ya ume. Mmụọ ozi ahụ kpọrọ Daniel “nwoke a hụrụ n’anya nke ukwuu.” (Dan. 10:8, 11, 18, 19) Ị hụ ndị nkwusa, ndị ọsụ ụzọ, na ụmụnna ndị merela agadi ike na-adịghịzi, ị̀ ga-agba ha ume otú ahụ?

8 Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, Chineke echeghị na ya ekwesịghị ịja ya mma ma gbaa ya ume ebe ọ bụ na ha abụọ rụkọrọ ọrụ n’eluigwe ọtụtụ afọ. Kama, Jizọs nụrụ ka Nna ya si n’eluigwe kwuo ugboro abụọ, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” (Mat. 3:17; 17:5) Chineke si otú ahụ jaa Jizọs mma, meekwa ka obi sie ya ike na ọ na-eme nke ọma. Ọ ga-abụrịrị na obi dị Jizọs ụtọ ugboro abụọ ọ nụrụ ihe ahụ, ma mgbe ọ malitere ozi ya ma mgbe o jechawara ozi ya n’ụwa. N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ nọ na-echegbu onwe ya. Jehova zitere otu mmụọ ozi ka ọ gbaa ya ume ma kasie ya obi. (Luk 22:43) Ndị nne na nna, na-agbanụ ụmụ unu ume iji gosi na unu na-eṅomi Jehova. Jaanụ ha mma ma ha mee nke ọma. Ọnwụnwa bịara ha n’ụlọ akwụkwọ, meenụ ihe niile unu nwere ike ime ka obi sie ha ike, nyekwaranụ ha aka idi ya.

9. Gịnị ka anyị ga-amụta n’otú Jizọs si mesoo ndịozi ya?

9 Jizọs. N’abalị ahụ Jizọs malitere Ncheta Ọnwụ ya, ọ chọpụtara na ndịozi ya dị mpako. O weturu onwe ya ala saa ha ụkwụ, ma ha ka nọkwa na-arụrịta ụka gbasara onye kacha ukwuu n’ime ha. Pita tukwara ọnụ na ya agaghị ahapụ Jizọs. (Luk 22:24, 33, 34) Ma, Jizọs jara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi mma maka na ha ahapụghị ya mgbe ọnwụnwa dị iche iche bịaara ya. O kwuru na ha ga-arụ ọrụ karịrị ọrụ ndị ọ rụrụ, meekwa ka obi sie ha ike na Chineke hụrụ ha n’anya. (Luk 22:28; Jọn 14:12; 16:27) Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị iṅomi Jizọs ma na-aja ma ụmụ m ma ndị ọzọ mma maka ihe ọma ha mere kama ilewe ebe ha na-anaghị eme nke ọma?’

10, 11. Olee otú Pọl onyeozi si gosi na ịgba ndị ọzọ ume dị ya ezigbo mkpa?

10 Pọl onyeozi. N’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst ibe ya, o kwuru okwu ọma banyere ha. Ya na ụfọdụ n’ime ha esorola gaa ebe dị iche iche ọtụtụ afọ. O doro anya na ọ ma ihe ndị ha na-anaghị emeta. Ma, o kwuru okwu ọma gbasara ha. Dị ka ihe atụ, Pọl kwuru na Timoti bụ ‘nwa ya ọ hụrụ n’anya nke kwesịrị ntụkwasị obi n’ime Onyenwe anyị’ nakwa na ihe banyere Ndị Kraịst ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi. (1 Kọr. 4:17; Fil. 2:19, 20) Pọl gwara ọgbakọ dị́ na Kọrịnt okwu ọma banyere Taịtọs, kwuo na ọ bụ ‘onye ọrụ ibe ya maka ọdịmma ha.’ (2 Kọr. 8:23) O doro anya na ihe a Pọl kwuru gbara Timoti na Taịtọs ume.

11 Pọl na Banabas gara ebe dị iche iche gbaa ụmụnna ha ume n’agbanyeghị na ịga ebe ndị ahụ nwere ike ịta isi ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na a chọrọ igbu ha na Listra, ha laghachiri ebe ahụ ka ha gaa gbaa ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ọhụrụ ume ka okwukwe ha sie ike. (Ọrụ 14:19-22) Ìgwè mmadụ iwe ji chọrọ igbu Pọl n’Efesọs. Ọrụ Ndịozi 20:1, 2 kwuru, sị: “Mgbe oké ụzụ ahụ dajụrụ, Pọl ziri ozi ka a kpọọ ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs. Mgbe ọ gbasịrị ha ume ma gwa ha ka ha nọrọ nke ọma, ọ gawara Masedonia. Mgbe ọ gafesịrị ebe ndị ahụ ma kwuo ọtụtụ okwu iji gbaa ndị nọ n’ebe ahụ ume, ọ batara Gris.” O doro anya na Pọl ejighị ịgba ndị ọzọ ume gwuo egwu.

KA ANYỊ NA-AGBARỊTA IBE ANYỊ UME

12. Olee otú ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe si enyere anyị aka ịna-agbarịta ibe anyị ume?

12 Ihe mere Nna anyị nke eluigwe ji hazie ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe kwa  izu bụ ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume. (Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.) Anyị na-ezukọ ka anyị mụọ banyere Jehova nakwa ka a gbaa anyị ume otú ahụ ndị mbụ soro ụzọ Jizọs mere. (1 Kọr. 14:31) Chidịmma ahụ e kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a sịrị: “Ihe na-akacha atọ m ụtọ n’ọmụmụ ihe bụ na ụmụnna na-egosi na ha hụrụ m n’anya, na-agbakwa m ume. Mgbe ụfọdụ, obi anaghị adị m mma ma m ruo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma, ụmụnna nwaanyị na-abịakwute m, makụọ m, sị m na m bụ sọ mma. Ha na-agwa m na ha hụrụ m n’anya nakwa na obi dị ha ụtọ na m na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Otú ha si agba m ume na-eme ka obi dị m mma.” Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị niile ‘na-agbarịta ibe anyị ume.’—Rom 1:11, 12.

13. Gịnị mere e ji kwesị ịna-agba ndị ferela Chineke ọtụtụ afọ ume?

13 E kwesịkwara ịna-agba ndị ferela Chineke ọtụtụ afọ ume. Chegodị banyere Jọshụa. O fere Chineke ọtụtụ afọ. Ma, Jehova gwara Mozis ka ọ gbaa ya ume. Ọ sịrị Mozis: “Mee Jọshụa onye ndú, gbaakwa ya ume ma mee ka ọ dị ike, n’ihi na ọ bụ ya ga-ebutere ndị a ụzọ mgbe ha na-agafe, ọ bụkwa ya ga-eme ka ha nweta ala ahụ ị ga-ahụ.” (Diut. 3:27, 28) Nnukwu ọrụ Jọshụa ga-arụ bụ idu ndị Izrel ka ha merie ndị bi n’Ala Nkwa ahụ ma nweta ya. Ọ ga-enwe nsogbu. Ọ dịkarịa ala, a ga-emeri ya otu ugboro. (Jọsh. 7:1-9) Ka a sịkwa ihe mere e ji kwesị ịgba Jọshụa ume, meekwa ka ọ dị ike. N’ihi ya, ka anyị na-agba ndị okenye na ndị nlekọta sekit ume, bụ́ ndị na-agbasi mbọ ike ilekọta atụrụ Chineke. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:12, 13.) Otu onye nlekọta sekit kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ụmụnna na-edetara anyị akwụkwọ ozi kelee anyị, kwuo na obi dị ha ụtọ na anyị bịara leta ha. Anyị na-edosa akwụkwọ ozi ndị ahụ ma gụọ ha mgbe obi na-adịchaghị anyị mma. Ha na-agba anyị ezigbo ume.”

Ụmụ anyị ga na-eme nke ọma ma ọ bụrụ na anyị na-ewetu obi gbaa ha ume (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Olee ihe gosiri na ịja mmadụ mma na ịgba ya ume ga-eme ka ndụmọdụ a na-enye ya ruo ya n’obi?

14 Ndị okenye na ndị nne na nna achọpụtala na ịja ndị ọzọ mma na ịgba ha ume na-eme ka ndụmọdụ Baịbụl ruo ha n’obi. Mgbe Pọl na-aja ndị Kọrịnt mma maka otú ha si mee ihe ọ gwara ha, ọ ga-abụrịrị na ihe o kwuru mere ka ha na-eme ihe dị mma. (2 Kọr. 7:8-11) Otu nwanna mụtara ụmụ abụọ, aha ya bụ Andreas, sịrị: “Ịgba ụmụaka ume na-eme ka ha na Chineke dịrị ná mma, gharakwa ịna-akpa àgwà ụmụaka ma ha too. Ịgba ha ume ga-eme ka ndụmọdụ i nyere ha ruo ha n’obi. Ọ bụ eziokwu na ụmụ anyị ma ihe dị́ mma, ịgba ha ume mgbe niile ga-eme ka ime ihe dị́ mma mara ha ahụ́.”

 OTÚ Ị GA-ESI GBAA NDỊ ỌZỌ EZIGBO UME

15. Olee otu n’ime ihe ndị anyị ga-eme iji gbaa ndị ọzọ ume?

15 Na-agwa ụmụnna gị na obi dị gị ụtọ maka mbọ ha na-agba nakwa àgwà ọma ha na-akpa. (2 Ihe 16:9; Job 1:8) Jehova na Jizọs anaghị eji mbọ anyị niile na-agba ịkwado ihe gbasara Alaeze egwu egwu, ọ bụrụgodị na mbọ anyị gbara ma ọ bụ ihe anyị nyere ebughị ibu n’ihi otú ihe si dịrị anyị. (Gụọ Luk 21:1-4; 2 Ndị Kọrịnt 8:12.) Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ụmụnna merela agadi na-agbalịsi ike ịbịachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-aja ha mma, na-agbakwa ha ume?

16. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịgbachi nkịtị ma anyị hụ ihe kwesịrị ime ka anyị gbaa ndị ọzọ ume?

16 Na-agba ndị ọzọ ume mgbe niile. Anyị hụ ihe kwesịrị ime ka anyị jaa ndị ọzọ mma, anyị ekwesịghị ịgbachi nkịtị. Chegodị banyere ihe mere mgbe Pọl na Banabas nọ n’Antiọk dị́ na Pisidia. Ndị isi oche ụlọ nzukọ ndị Juu gwara ha, sị: “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu agbamume ọ bụla unu ga-agwa ndị a, kwuonụ ya.” (Ọrụ 13:13-16, 42-44) Ọ bụrụ na anyị ga-agbali mmadụ ume, ànyị kwesịrị imechi ọnụ? Anyị nwere ike ịchọpụta na ọ bụrụ na anyị na-agbakarị ndị mmadụ ume, ndị ọzọ ga na-agba anyị ume.—Luk 6:38.

17. Olee otú kacha mma anyị ga-esi jaa ndị ọzọ mma?

17 Gwa onye ị na-agba ume eziokwu, kpọọkwa okwu aha. Ịgba mmadụ ume ma jaa ya mma n’akpọghị okwu aha nwere ike ịba uru. Ma, ihe Jizọs gwara Ndị Kraịst bí na Tayataịra gosiri na ọ ka mma ịkpọ okwu aha. (Gụọ Mkpughe 2:18, 19.) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị bụ nne ma ọ bụ nna, anyị nwere ike ịgwa ụmụ anyị ihe na-atọ anyị ụtọ n’otú ha si eme nke ọma n’ọgbakọ. Anyị nwere ike ịgwa nwanna nwaanyị naanị ya na-azụ ụmụ ya ihe na-eme anyị obi ụtọ n’otú o si azụ ụmụ ya n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara ya. Ụdị ịja mma na ịgba ume ahụ nwere ike ịba ezigbo uru.

18, 19. Olee otú anyị ga-esi na-agba ụmụnna anyị ume ka okwukwe ha sie ike?

18 Jehova agaghị esi n’eluigwe gwa anyị gbaa mmadụ ume otú ahụ ọ gwara Mozis ka ọ gbaa Jọshụa ume ma mee ka ọ dị ike. Ma, obi na-adị Chineke ụtọ ma anyị na-agba ụmụnna anyị na ndị ọzọ ume. (Ilu 19:17; Hib. 12:12) Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịgwa onye kwuru okwu ihu ọha otú okwu ya si mee ka anyị mata ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụ nyere anyị aka ịghọta otu amaokwu Baịbụl. Otu nwanna nwaanyị degaara ọkà okwu si esi bịa akwụkwọ ozi, sị: “Ọ bụ eziokwu na ọ bụ naanị nkeji ole na ole ka mụ na gị kwurịtara okwu, ị ghọtara ihe na-enye m nsogbu n’obi, ị kasikwara m obi ma gbaa m ume. Achọrọ m ka ị mara na mgbe i weturu obi kwuo okwu, ma n’elu ikpo okwu ma n’ihu n’ihu, aghọtara m na ọ bụ onyinye si n’aka Jehova.”

19 Anyị nwere ike ịmata ọtụtụ ụzọ anyị ga-esi na-agba ndị ọzọ ume ma ọ bụrụ na anyị kpebisiri ike ime ihe ahụ Pọl onyeozi gwara anyị mee. Ọ sịrị: “Na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu, dị nnọọ ka unu na-eme.” (1 Tesa. 5:11) O doro anya na obi ga-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ‘na-agba ibe anyị ume kwa ụbọchị.’

^ [1] (paragraf nke 1) Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.