Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2016

Chineke Haziri Ndị Ya Otú Akwụkwọ Nsọ Kwuru

Chineke Haziri Ndị Ya Otú Akwụkwọ Nsọ Kwuru

“Jehova ji amamihe tọọ ntọala ụwa. O jikwa nghọta mee ka eluigwe guzosie ike.”—ILU 3:19.

ABỤ: 105, 107

1, 2. (a) Olee ihe ụfọdụ na-ekwu banyere Chineke inwe nzukọ? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

CHINEKE ò nwere nzukọ? Ụfọdụ ndị nwere ike ikwu, sị: “E kwesịghị inwe nzukọ ga na-eduzi gị. Naanị ihe dị́ mkpa bụ gị na Chineke ịdị ná mma.” Ma ihe a ha na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu? Gịnị ka ihe Baịbụl kwuru na-egosi?

2 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe na-egosi na Jehova abụghị Chineke aghara nakwa na otú o si ahazi ihe enweghị atụ. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe anyị kwesịrị ime ma nzukọ Jehova gwa anyị ihe a ga-eme. (1 Kọr. 14:33, 40) N’oge ndịozi Jizọs nakwa n’oge anyị a, Akwụkwọ Nsọ enyerela nzukọ Jehova aka ikwusa ozi ọma n’ọtụtụ ebe. Anyị na-eme ka ọgbakọ na-adị ọcha, na-adị n’udo, na-adịkwa n’otu n’ihi na anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru na ihe nzukọ Jehova gwara anyị mee.

OTÚ JEHOVA SI AHAZI IHE ENWEGHỊ ATỤ

3. Gịnị mere obi ji sie gị ike na otú Jehova si ahazi ihe enweghị atụ?

3 Ihe ndị Chineke kere gosiri na otú o si ahazi ihe enweghị atụ. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova ji amamihe tọọ ntọala ụwa. O jikwa nghọta mee ka eluigwe guzosie ike.” (Ilu 3:19)  E nwere ọtụtụ ihe anyị na-amaghị banyere ihe ndị Jehova kere. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ma naanị ‘ntakịrị ihe n’ọrụ ya niile.’ (Job 26:14) Ma obere nke anyị ma banyere eluigwe na ụwa mere ka o doo anyị anya na a haziri ha nke ọma. (Ọma 8:3, 4) E nwere ọtụtụ nde kpakpando n’ụyọkọ kpakpando ndị dị na mbara igwe. Ha niile na-aga n’usoro. Ụwa na ihe ndị ọzọ ndị Bekee na-akpọ planet na-agba anyanwụ gburugburu na mbara igwe n’usoro ka à ga-asị na ha na-erubere iwu okporo ụzọ isi. Ihe ndị a dị́ mgbagwoju anya n’eluigwe na n’ụwa na-enyere anyị aka ịmata n’eziokwu na Jehova “ji nghọta kee eluigwe” na ụwa nakwa na anyị kwesịrị ịna-eto ya, na-erubere ya isi ma na-efe ya.—Ọma 136:1, 5-9.

4. Gịnị mere na ndị ọkà mmụta sayensị enweghi ike ịza ọtụtụ ajụjụ ndị dị mkpa?

4 Ndị ọkà mmụta sayensị ejirila ọtụtụ ihe ha mụtara banyere eluigwe na ụwa mepụta ihe ndị na-abara anyị uru. Ma e nwere ọtụtụ ajụjụ ndị ha na-enweghị ike ịza. Dị ka ihe atụ, ndị na-enyocha mbara igwe enweghị ike ịgwa anyị otú eluigwe na ụwa si malite ma ọ bụ ihe mere ụmụ mmadụ na ihe ndị ọzọ dị́ ndụ ji dịrị n’ụwa. Ọtụtụ ndị enweghịkwa ike ịkọwa ihe mere ụmụ mmadụ ji chọsie ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Ekli. 3:11) Gịnị mere e ji nwee ọtụtụ ajụjụ dị́ mkpa ha na-enweghị ike ịza? Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị na ndị ọzọ na-ekwu na Chineke adịghị nakwa na e keghị mmadụ eke. Ma, Jehova zara ajụjụ ndị na-echu ndị mmadụ ụra n’ụwa niile n’Okwu ya bụ́ Baịbụl.

5. Olee otú iwu ndị na-achịkwa ihe ndị e kere eke si abara ụmụ mmadụ uru?

5 Jehova kere ọtụtụ iwu na-achịkwa ihe ndị o kere eke. Iwu ndị ahụ anaghị agbanwe agbanwe. Ha na-abara ndị na-arụ ihe dị iche iche uru n’ọrụ ha, ma ndị na-awaya ọkụ ma ndị plọmba ma ndị njinia ma ndị na-anya ụgbọelu ma ndị dọkịta na-awa ahụ́. Dị ka ihe atụ, e nwere ebe obi na-adị n’ahụ́ mmadụ. N’ihi ya, ndị dọkịta na-awa ahụ́ ma ebe ha ga-ahụ ya n’ahụ́ onye ọ bụla ha na-agwọ. Onye ọ bụla makwa na onye sí n’ebe dị́ ezigbo elu wụtuo nwere ike ịnwụ. Anyị agaghị emewe ụdị ihe ahụ n’ihi na o nwere ike ịta isi anyị.

IHE CHINEKE HAZIRI

6. Olee otú anyị si mara na Jehova chọrọ ka a hazie ndị na-efe ya ahazi?

6 Otú Jehova si hazie eluigwe na ụwa dị egwu. N’ihi ya, o doro anya na Jehova chọrọ ka a hazie ndị na-efe ya ahazi nke ọma. Ọ bụ ya mere o ji nye anyị Baịbụl ka ọ na-eduzi anyị. Ọ bụrụ na anyị anaghị eme ihe Jehova na nzukọ ya gwara anyị, anyị agaghị enwe obi ụtọ, ndụ anyị agaghịkwa enwe isi.

7. Olee ihe anyị ga-amụta n’otú e si dee Baịbụl?

7 Baịbụl bụ onyinye pụrụ iche Chineke nyere anyị. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sịrị na Baịbụl bụ akwụkwọ ndị Juu na Ndị Kraịst ji uche nke ha dee. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ Chineke kpebiri ndị ga-ede ya, mgbe ha ga-ede ya nakwa ihe ha ga-ede. Ọ bụ ya mere akwụkwọ niile dị́ na Baịbụl ji enyere anyị aka ịghọta ihe Chineke kwuru. Sí na Jenesis ruo Mkpughe, Baịbụl gosiri na a ga-enwe “mkpụrụ” nke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Anyị amụtala na “mkpụrụ” ahụ bụ Jizọs Kraịst nakwa na Alaeze ya ga-eme ka a mata na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị onye ọ bụla.—Gụọ Jenesis 3:15; Matiu 6:10; Mkpughe 11:15.

8. Olee ihe gosiri na a haziri ndị Izrel nke ọma?

 8 Otú Chineke si hazie ndị Izrel oge ochie enweghị atụ. Dị ka ihe atụ, n’Iwu Mozis, e nwere “ndị inyom na-eje ozi, bụ́ ndị jere ozi a haziri ahazi n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.” (Ọpụ. 38:8) Chineke haziri otú ndị Izrel ga-esi na-ebupụ ma ụlọikwuu nke ha ma nke ya. Eze Devid mechara hazie ndị Livaị na ndị nchụàjà n’ìgwè n’ìgwè. (1 Ihe 23:1-6; 24:1-3) Mgbe ndị Izrel rubeere Jehova isi, ọ gọziri ha, ha ana-eme ihe n’usoro, dịrị n’udo, dịrịkwa n’otu.—Diut. 11:26, 27; 28:1-14.

9. Olee ihe gosiri na a haziri ọgbakọ Ndị Kraịst ahazi n’oge ndịozi Jizọs?

9 A hazikwara ọgbakọ Ndị Kraịst ahazi n’oge ndịozi Jizọs. E nwere òtù na-achị isi, bụ́ ụmụnna nwoke ndị na-eduzi ọgbakọ dị iche iche. Ná mmalite, ọ bụ ndịozi bụ òtù na-achị isi. (Ọrụ 6:1-6) Ụmụnna ndị ọzọ mechara soro na ya. (Ọrụ 15:6) Jehova mere ka ụfọdụ n’ime ndị ahụ só n’òtù na-achị isi na ndị ha na ha rụkọrọ ọrụ dee akwụkwọ ozi iji nye ọgbakọ dị iche iche ndụmọdụ na ntụziaka. (1 Tim. 3:1-13; Taị. 1:5-9) Olee uru ntụziaka òtù na-achị isi nyere ọgbakọ ndị ahụ baara ha?

10. Gịnị mere mgbe ọgbakọ ndị e nwere n’oge ndịozi Jizọs mere ihe òtù na-achị isi gwara ha? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

10 Gụọ Ọrụ Ndịozi 16:4, 5. Ụmụnna ndị na-anọchite anya òtù na-achị isi gara leta ọgbakọ dị iche iche, na-agwa ha “iwu ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem kpebiri ka ha debe.” Ka ọgbakọ niile na-edewe iwu ndị ahụ, “a nọgidere na-eme ka ọgbakọ dị iche iche dị ike n’okwukwe, ha na-amụbakwa n’ọnụ ọgụgụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.” Ihe a Baịbụl kọrọ ọ́ naghị akụziri anyị ihe anyị kwesịrị ịna-eme ná nzukọ Chineke taa?

Ị̀ NA-EME IHE NZUKỌ JEHOVA KWURU KA E MEE?

11. Gịnị ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ime ma nzukọ Chineke kwuo ihe a ga-eme?

11 Olee ihe ndị so na Kọmitii Alaka ma ọ bụ Kọmitii Na-elekọta Mba, ndị nlekọta sekit, na ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ime ma nzukọ Chineke kwuo ihe a ga-eme? Baịbụl bụ́ Okwu Chineke gwara anyị niile ka anyị na-erubere ndị Chineke si n’aka ha na-eduzi nzukọ ya isi ma na-anọ n’okpuru ha. (Diut. 30:16; Hib. 13:7, 17) Ndị ji obi ha niile na-efe Jehova anaghị enupụrụ nzukọ ya isi. Ha anaghịkwa akatọ ntụziaka e nyere ha. Anyị ekwesịghị ime ka Dayọtrefis, bụ́ onye na-akwanyereghị ụmụnna na-elekọta ọgbakọ ùgwù. Ime otú ahụ ga-eme ka udo ghara ịdị n’ọgbakọ, meekwa ka ọ ghara ịdị n’otu. (Gụọ 3 Jọn 9, 10.) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-agba ụmụnna m ume ka ha na-erubere Jehova isi? Ndị na-elekọta ọgbakọ kwuo ihe a ga-eme, m̀ na-eme ya ozugbo?’

12. Olee ihe a gbanwere n’otú e si ahọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi?

12 Chegodị banyere ihe Òtù Na-achị Isi gbanwere n’oge na-adịbeghị anya. “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” nke gbara n’Ụlọ Nche Nọvemba 15, 2014, kwuru otú a ga-esizi na-ahọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Isiokwu ahụ kwuru na n’oge ndịozi Jizọs, òtù na-achị isi nyere ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ikike ịhọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. N’ihi ya, kemgbe abalị mbụ n’ọnwa Septemba afọ 2014, ọ bụzi ndị nlekọta sekit na-ahọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Onye nlekọta sekit na-agbalị ịmata ụmụnna ndị okenye tụrụ aro ka a họpụta, ya na ha arụọkwa n’ozi ọma ma o kwe omume. Onye nlekọta  sekit na-eleru ezinụlọ onye ahụ a tụrụ aro ka a họpụta anya. (1 Tim. 3:4, 5) Ndị okenye na onye nlekọta sekit na-asa anya ná mmiri lee ma onye ahụ a chọrọ ịhọpụta ka ọ bụrụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ò ruru eru otú Akwụkwọ Nsọ kwuru.—1 Tim. 3:1-10, 12, 13; 1 Pita 5:1-3.

13. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-eme ihe ndị okenye si na Baịbụl na-agwa anyị?

13 Anyị kwesịrị ịna-eme ihe ọ bụla ndị okenye si na Baịbụl gwa anyị mee. Ndị ọzụzụ atụrụ ndị a na-eme ihe e kwuru n’Okwu Chineke, bụ́ “okwu na-enye ezi ndụ,” nke na-abara anyị uru. (1 Tim. 6:3) Cheta ndụmọdụ Pọl nyere banyere ndị na-anaghị agazi agazi n’ọgbakọ dị́ na Tesalonaịka. Ha anaghị “arụ ọrụ ma ọlị, kama ha na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha.” Ndị okenye gbalịrị inye ha ndụmọdụ, ma ha ekweghị eme ihe a gwara ha. Gịnị ka ọgbakọ ahụ kwesịrị ime ụdị onye ahụ? Pọl gwara ha, sị: “Rịbanụ onye ahụ ama, unu na ya kwụsị ịkpakọrịta.” Ma, ọ gwakwara ha na ha ekwesịghị iwere onye ahụ ka onye iro. (2 Tesa. 3:11-15) Taa, ndị okenye nwere ike ikwu okwu n’ọgbakọ iji dọọ anyị aka ná ntị gbasara onye na-eme ihe ga-emebi aha ọgbakọ. O nwere ike ịbụ nwanna nwaanyị ya na nwoke onye ụwa na-akpa. (1 Kọr. 7:39) Ọ bụrụ na ndị okenye ekwuo okwu ahụ, gịnị ka ị ga-eme? Ọ bụrụ na ị ma onye mere ụdị ihe ahụ, ị̀ ga-agba mbọ ka naanị ihe gị na ya na-emekọ bụrụ ihe gbasara ofufe Chineke? I mee otú ahụ, o nwere ike ime ka onye ahụ kwụsị ihe ọjọọ ahụ ọ na-eme. [1]

NA-EME KA ỌGBAKỌ DỊ ỌCHA, DỊ N’UDO, DỊKWA N’OTU

14. Olee otú anyị ga-esi na-eme ka ọgbakọ dị ọcha?

14 Anyị ga na-eme ka ọgbakọ dị ọcha ma anyị na-eme ihe Okwu Chineke kwuru. Chegodị ihe mere na Kọrịnt n’oge ochie. Pọl ji obi ya niile na-ekwusa ozi ọma n’obodo ahụ, hụkwa “ndị nsọ” ibe ya nọ́ n’ebe ahụ n’anya. (1 Kọr. 1:1, 2) Ma, chee otú obi dị ya mgbe ọ chọpụtara na otu n’ime ha na-akwa iko, ụmụnna ahapụ onye ahụ n’ọgbakọ. Pọl gwara ndị okenye ka ha nyefee nwoke dị́ otú ahụ n’aka Setan, ya bụ, ka ha chụọ ya n’ọgbakọ. Ndị okenye kwesịrị iwepụ “ihe iko achịcha” ahụ ka ọgbakọ dị́ ọcha. (1 Kọr. 5:1, 5-7, 12) Ọ bụrụ na anyị na-akwado ndị okenye ma ha kpebie ịchụpụ onye mmehie na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ, anyị so na-eme ka ọgbakọ dị́ ọcha. O nwekwara ike ime ka onye ahụ chegharịa ma rịọ Jehova ka ọ gbaghara ya.

15. Olee otú anyị ga-esi mee ka udo dịrị n’ọgbakọ?

15 E nwere nsogbu ọzọ e kwesịrị ilebara anya na Kọrịnt. Ụfọdụ na-akpọpụ ụmụnna ha ụlọikpe. Pọl jụrụ ha ajụjụ ha kwesịrị ichebara echiche. Ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị mere unu ekweghị ka e mejọọ unu?” (1 Kọr. 6:1-8) Ụdị ihe a na-emekwa taa. Mgbe ụfọdụ, nwanna na nwanna na-ese okwu n’ihi na achụmnta ego ha tinyere aka na ya ghọrọ ha ahịa, otu onye ekwuwe na onye nke ọzọ egwuola ya wayo. Ụfọdụ akpọpụla ụmụnna ha ụlọikpe. Ma Okwu Chineke mere ka anyị mata na ọ ka mma na ihe funahụrụ anyị kama ime ka a kọchaa aha Chineke ma ọ bụ mee ka udo ghara ịdị n’ọgbakọ. [2] Iji dozie nsogbu na esemokwu, anyị kwesịrị ime ihe Jizọs kwuru. (Gụọ Matiu 5:23, 24; 18:15-17.) Anyị mee otú ahụ, anyị ga-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu.

16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụ anya na ndị Jehova ga-adị n’otu?

16 Baịbụl kwuru ihe mere anyị ji kwesị  ịtụ anya na ndị Jehova ga-adị n’otu. Ọbụ abụ bụ́ Devid sịrị: “Lee ka o si dị mma, bụrụkwa ihe na-enye obi ụtọ mgbe ụmụnne bikọtara ọnụ n’ịdị n’otu!” (Ọma 133:1) Mgbe ndị Izrel rubeere Jehova isi, a haziri ha, ha adịrị n’otu. Chineke kwuru ihe ọ ga-emere ndị ya. Ọ sịrị: “M ga-eme ka ha dịrị n’otu, dị ka ìgwè atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ.” (Maị. 2:12) Jehova sikwa n’ọnụ Zefanaya onye amụma kwuo, sị: “M ga-agbanwe asụsụ nke ndị dị iche iche ka ọ bụrụ asụsụ dị ọcha [bụ́ eziokwu dị́ na Baịbụl], ka ha niile wee na-akpọku aha Jehova, ka ha wee jiri otu obi na-efe ya ofufe.” (Zef. 3:9) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị ji otu obi na-efe Jehova.

Ndị okenye na-agbalịsi ike iji Baịbụl nyere onye mere mmehie dị́ oké njọ aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Nwanna mee mmehie dị́ oké njọ, gịnị ka ndị okenye kwesịrị ime ka ọgbakọ nwee ike ịdị n’otu ma dị ọcha?

17 Nwanna mee mmehie dị́ oké njọ, ndị okenye kwesịrị iji obiọma gbazie ya ozugbo. Ha ma na Jehova chọrọ ka ha gbaa mbọ ka ọgbakọ ghara ịmụta àgwà ọjọọ onye ahụ, nakwa ka ọgbakọ nwee ike ịdị n’otu ma dị ọcha. (Ilu 15:3) Pọl ma na ịhụnanya Chineke apụtaghị na ọ na-eleghara omume ọjọọ anya. N’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kọrịnt, ọ gbaziri ha n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. Akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ha mgbe ọnwa ole na ole gachara gosiri na ndị okenye ahụ mere ihe ọ gwara ha. Onye Kraịst ‘zọhie ụkwụ tupu ya amata na ọ zọhiere ụkwụ,’ ndị okenye kwesịrị iji obiọma gbazie ya.—Gal. 6:1.

18. (a) Olee otú ndụmọdụ dị́ n’Akwụkwọ Nsọ si nyere ọgbakọ aka n’oge ndịozi Jizọs? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu na-esonụ?

18 N’oge ndịozi Jizọs, o doro anya na ndụmọdụ dị́ n’Akwụkwọ Nsọ nyeere Ndị Kraịst nọ́ na Kọrịnt na n’ebe ndị ọzọ aka ime ka ọgbakọ na-adị ọcha, na-adị n’udo ma na-adị n’otu. (1 Kọr. 1:10; Efe. 4:11-13; 1 Pita 3:8) Ọ bụ ya mere ụmụnna anyị n’oge ahụ ji nwee ike ikwusa ozi ọma n’ọtụtụ ebe. Pọl kwuru na ‘e kwusara ozi ọma n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.’ (Kọl. 1:23) Taa, a haziri ndị Jehova ahazi, ha adịrịkwa n’otu. Ha na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ụwa niile, na-agwa ha ihe ọma Chineke bu n’obi imere ụmụ mmadụ. N’isiokwu na-esonụ, a ga-akọwakwu ihe gosiri na ndị Jehova ji Baịbụl kpọrọ ihe nakwa na ha kpebisiri ike ịsọpụrụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova.—Ọma 71:15, 16.

^ [1] (paragraf nke 13) Gụọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 134 ruo 136.

^ [2] (paragraf nke 15) Ị chọọ ịmata ihe nwere ike ime ka Onye Kraịst kpebie ịgba nwanna akwụkwọ, gụọ Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” peeji nke 223, nakwa ihe e dere n’ala ala peeji ahụ.