Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mee 2017

Na-enyere Ụmụ “Ndị Mbịarambịa” Aka

Na-enyere Ụmụ “Ndị Mbịarambịa” Aka

“Ọ dịghị ihe ọzọ ga-eme ka m nwee obi ekele karịa ihe a, ya bụ, na m ga na-anụ na ụmụ m na-eje ije n’eziokwu ahụ.”—3 JỌN 4.

ABỤ: 88, 41

1, 2. (a) Olee nsogbu ọtụtụ ụmụaka ha na ndị mụrụ ha bi ná mba ọzọ na-enwe? (b) Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu a?

E NWERE otu nwanna aha ya bụ Joshua. Ya na ndị mụrụ ya bi ná mba ọzọ. Ọ sịrị: “Malite mgbe m dị obere, m na-asụ asụsụ papa m na mama m ma n’ụlọ ma n’ọgbakọ. Ma, mgbe m bidoro ịga ụlọ akwụkwọ, ọ na-akara m mma ịsụ asụsụ ndị obodo ahụ. Mgbe afọ ole na ole gachara, ọ bụzi naanị asụsụ ndị obodo ahụ ka m na-asụ. Anaghịzi m aghọta ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe. Ọ naghịkwa adị m ka m̀ bụ onye obodo papa m na mama m.” Ihe a mere Joshua na-emekwa ndị ọzọ.

2 Taa, ihe karịrị narị nde mmadụ abụọ na nde iri anọ ebighị n’obodo a mụrụ ha. Ọ bụrụ na gị na ụmụ gị bi ná mba ọzọ, olee otú kacha mma ị ga-esi nyere ha aka ka ha hụ Jehova n’anya ma “na-eje ije n’eziokwu ahụ”? (3 Jọn 4) Oleekwa otú ndị ọzọ ga-esi enye aka?

NDỊ NNE NA NNA, JIRINỤ OFUFE CHINEKE KPỌRỌ IHE

3, 4. (a) Olee otú ndị nne na nna ga-esi kụziere ụmụ ha iji ofufe Jehova kpọrọ ihe? (b) Gịnị ka ndị nne na nna na-ekwesịghị ịtụwa anya ya n’aka ụmụ ha?

3 Ndị nne na nna, iji ofufe Chineke kpọrọ ihe ga-enyere ụmụ unu aka ka ha na Jehova dịrị ná mma, ha enwetakwa ndụ ebighị  ebi. Ụmụ unu hụ na unu ‘bu ụzọ na-achọ alaeze’ Chineke, ha ga-amụta ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga na-egboro ha mkpa ha kwa ụbọchị. (Mat. 6:33, 34) N’ihi ya, unu ebila ndụ okomoko. Jirinụ ozi Jehova kpọrọ ihe, kama ịchụwa ego ka à na-anwụ anwụ. Gbalịanụ ka unu ghara ịna-eji ụgwọ. Na-achọnụ “akụ̀ n’eluigwe,” ya bụ, na-emenụ ka unu na Jehova dịrị ná mma, kama ịchụwa akụnụba ma ọ bụ “otuto mmadụ.”—Gụọ Mak 10:21, 22; Jọn 12:43.

4 Unu ekwela ka mere nke a mere nke ọzọ mee ka unu ghara iwepụtara ụmụ unu ohere. Meenụ ka ha mata na unu ji ha eme ọnụ ma ha were ofufe Jehova ka ihe dị mkpa karịa ịchọwa ịbụ ndị a ma ama ma ọ bụ ịchụ akụnụba, ma hà na-achụtara ya onwe ha ma hà na-achụtara ya unu. Ndị ụwa na-eche na ọ bụ ụmụ kwesịrị ịkpatara nne na nna ha akụ̀. Unu echela otú ahụ. Chetanụ na “ọ bụghị ụmụ kwesịrị ịkpakọbara ndị mụrụ ha ihe, kama ọ bụ ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịkpakọbara ụmụ ha ihe.”—2 Kọr. 12:14.

NDỊ NNE NA NNA, GBALỊANỤ MỤTA ASỤSỤ ỤMỤ UNU NA-ASỤ

5. Gịnị mere ndị nne na nna kwesịrị iji na-akụziri ụmụ ha banyere Jehova?

5 Ndị “si n’asụsụ niile nke mba dị iche iche” na-abata ná nzukọ Jehova otú ahụ Baịbụl buru n’amụma. (Zek. 8:23) Ma, ọ bụrụ na ụmụ gị anaghị aghọta asụsụ gị, o nwere ike isiri gị ike ịkụziri ha eziokwu Baịbụl. Ụmụ gị bụ ndị kacha mkpa i kwesịrị ịna-amụrụ ihe. Ha ‘mata’ Jehova, ha ga-enweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Ka ụmụ gị nwee ike ịmụta ihe Jehova na-akụzi, i kwesịrị ‘ikwu banyere ya’ mgbe niile.—Gụọ Diuterọnọmi 6:6, 7.

6. Olee uru ụmụ gị ga-erite ma ha mụta asụsụ gị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

6 Ọ bụrụ na gị na ụmụ gị bi ná mba ọzọ, ha nwere ike ịmụta asụsụ obodo ahụ n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ebe unu bi, ma ha ga-amụta asụsụ gị ma gị na ha jiri ya na-ekwurịta okwu mgbe niile. Ọ bụrụ na ụmụ gị na-asụ asụsụ gị, ọ ga-adịrị ha mfe ịna-agwa gị okwu, na-akọrọ gị otú obi dị ha. Ma, e nwekwara uru ndị ọzọ ha ga-erite. Ọ bụrụ na ha na-asụ ihe karịrị otu asụsụ, ọ ga-eme ka ụbụrụ ha na-aghọ nkọ, meekwa ka ha ghọta ihe ndị ọzọ chere. O nwekwara ike ime ka ha jekwuoro Jehova ozi. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Caroline. Ya na nne na nna ya bi ná mba ọzọ. O kwuru, sị: “Ịnọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe na-atọgbu m atọgbu. Obi dị m ụtọ ịna-enye aka n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu.”

7. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị naghị aghọta asụsụ ụmụ gị na-asụ?

7 Ma, ka ụmụaka ha na nne ha na nna ha bi ná mba ọzọ na-amụtakwu asụsụ ndị ebe ahụ na omenala ha, ụfọdụ n’ime ha nwere ike ha agaghịzi achọ ịna-amụ asụsụ nne ha na nna ha ma ọ bụdị ịna-asụ ya. Ndị nne na nna, ọ bụrụ na ọ dị ụmụ unu otú ahụ, ùnu nwere ike ịgbalị mụtatụ asụsụ obodo ahụ? Ọ ga-adịrị unu mfe ịzụ ụmụ unu ka ha ghọọ Ndị Kraịst ma ọ bụrụ na unu na-aghọta ihe ha na-ekwurịta, ihe ha ji atụrụ ndụ, na ihe ha na-amụ n’ụlọ akwụkwọ nakwa ma unu na ndị nkụzi ha na-ekwurịta okwu. N’eziokwu, onye chọrọ ịmụ asụsụ ọzọ ga-ewepụta oge, gbasie mbọ ike, dịkwa umeala n’obi. Ma, a sị na nwa gị bụ onye ogbi, ị́ gaghị agbalịsi ike mụta asụsụ ndị ogbi ka gị na ya nwee ike ịna-ekwurịta okwu? Ọ bụrụ na nwa gị na-akacha aghọta asụsụ ị na-anaghị asụ, í cheghị na i kwesịrị ịmụta asụsụ ahụ? *

8. Olee otú ị ga-esi nyere ụmụ gị aka ma ọ bụrụ na ị machaghị asụsụ ha na-asụ?

8 O nwere ike isiri ụfọdụ ndị nne na nna ha na ụmụ ha bi ná mba ọzọ ike ịna-asụ  asụsụ ụmụ ha mụtara. Nsogbu ahụ nwere ike ime ka o siere ha ike ịkụziri ụmụ ha Okwu Chineke. (2 Tim. 3:15) Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, ị ka nwere ike inyere ụmụ gị aka ka ha mata Jehova ma hụ ya n’anya. Otu okenye aha ya bụ Shan kwuru, sị: “Mama anyị naanị ya na-azụ ụmụ aghọtachaghị asụsụ anyị na-asụ nke ọma. Mụ na nwanne m nwaanyị anaghịkwa asụ asụsụ mama anyị nke ọma. Ma, ka anyị na-ahụ ka ọ na-amụ ihe, na-ekpe ekpere, na-agbakwa mbọ iduzi ofufe ezinụlọ anyị kwa izu, anyị ghọtara na ịmata Jehova dị ezigbo mkpa.”

9. E nwee ụmụaka e kwesịrị iji asụsụ abụọ na-akụziri ihe, olee otú nne ha na nna ha ga-esi na-enyere ha aka?

9 E nwere ụfọdụ ụmụaka e kwesịrị iji asụsụ abụọ na-akụziri gbasara Jehova. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na asụsụ ha na-asụ n’ụlọ akwụkwọ dị iche na nke ha na-asụ n’ụlọ. Ọ bụ ya mere ụfọdụ ndị nne na nna ji eji akwụkwọ anyị, ihe ndị a na-egere egere, na vidio e nwere n’asụsụ abụọ ahụ na-akụziri ụmụ ha ihe. O doro anya na ndị nne na nna ha na ụmụ ha bi ná mba ọzọ kwesịrị iwepụtakwu oge, na-agbakwu mbọ inyere ụmụ ha aka ka ha na Jehova dịkwuo ná mma.

OLEE ỌGBAKỌ UNU KWESỊRỊ ỊNỌ?

10. (a) Olee onye ga-ekpebi ọgbakọ ndị nọ n’ezinụlọ ga-anọ? (b) Gịnị ka o kwesịrị ime tupu ya ekpebie ọgbakọ ha ga-anọ?

10 Ọ bụrụ na ebe “ndị mbịarambịa” bi dị anya n’ebe ụmụnna ndị na-asụ asụsụ ha bi, ha kwesịrị ịnọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ obodo ahụ amụ ihe. (Ọma 146:9) Ma, ọ bụrụ na ọgbakọ na-eji asụsụ gị amụ ihe dị nso n’ebe i bi, ajụjụ i kwesịrị ichebara echiche bụ: Olee ọgbakọ ga-akacha baara ezinụlọ gị uru? Ọ bụ onyeisi ezinụlọ ga-ekpebi ya ma o chebara ya echiche, kpee ekpere, ya na ụmụ ya na nwunye ya ekwurịtakwa ya. (1 Kọr. 11:3) Olee ihe ndị o kwesịrị ichebara echiche? Olee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru gbasara ya? Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

11, 12. (a) Olee otú asụsụ si gbasa ihe nwatakịrị na-amụta n’ọmụmụ ihe? (b) Gịnị mere ụfọdụ ụmụaka anaghị achọ ịmụ asụsụ nne ha na nna ha?

11 Ndị nne na nna kwesịrị iche banyere ihe ga-abara ụmụ ha uru. N’eziokwu, e wezụga asụsụ, ihe ga-eme ka ụmụaka ghọtakwuo eziokwu Baịbụl nke ọma abụghị naanị awa ole na ole ahụ e ji amụ ihe n’ọmụmụ ihe kwa izu, kama ọ bụ iwepụtakwu oge na-akụziri ha ihe. Ma, chegodị banyere ihe a: Ọ bụrụ na ụmụaka anọrọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ ha na-aghọta nke ọma amụ ihe, ha nwere ike ịghọtakwu ihe a na-amụ karịa otú ndị mụrụ ha tụrụ anya ya. Ma, ọ gaghị adị otú ahụ ma ọ bụrụ na ụmụaka anaghị aghọtacha asụsụ e ji amụ ihe n’ọmụmụ ihe. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 14:9, 11.) Ọ bụghị iwu na ọ bụ asụsụ nne na nna ga-abụ asụsụ ga na-eru nwa ha n’obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụfọdụ ụmụaka nwere ike ịmụta iji asụsụ nne na nna ha zaa ajụjụ, zie ozi ọma, meekwa ihe omume, ma ihe ha na-ekwu agaghị eru ha n’obi.

12 Ihe ọzọ bụ na ọ bụghị naanị asụsụ na-eme ka nwatakịrị mụta ihe. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị Joshua anyị kwuburu okwu ya. Nwanne ya nwaanyị bụ́ Esther kwuru, sị: “Ụmụaka na-ewere ya na asụsụ papa ha na mama ha, omenala ha, na okpukpe ha bụ otu ihe.” Ọ bụrụ na ha ewereghị omenala papa ha na mama ha ka omenala nke ha, o nwere ike ha agaghị achọ ịmụta asụsụ ha na okpukpe ha. Gịnị ka ndị nne na nna ha na ụmụ ha bi ná mba ọzọ ga-eme?

13, 14. (a) Gịnị mere otu nwanna na nwunye ya ji kpọrọ ụmụ ha gafee n’ọgbakọ na-eji asụsụ obodo ha bi amụ ihe? (b) Olee otú ha abụọ si mee ka okwukwe ha na-esi ike?

13 Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-eji adịm ná mma ụmụ ha na Jehova kpọrọ  ihe karịa ihe dị hanwa mma. (1 Kọr. 10:24) Samuel bụ́ papa Joshua na Esther kwuru, sị: “Mụ na nwunye m lebaara ụmụ anyị anya ka anyị chọpụta asụsụ kacha eru ha n’obi, anyị ekpeekwa ekpere ka Jehova nye anyị amamihe. Ihe Jehova zara anyị n’ekpere ahụ abụghị ihe dị anyị mma. Ma, mgbe anyị hụrụ na ụmụ anyị anaghị eritecha uru n’ọmụmụ ihe e ji asụsụ anyị na-amụ, anyị kpebiri ịgafe n’ọgbakọ na-eji asụsụ obodo ha bi amụ ihe. Anyị na ha na-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya. Anyị na-akpọkwa ndị enyi anyị ka ha bịa soro anyị rie nri ma gaa legharịa anya. Ihe ndị a niile nyeere ụmụ anyị aka ka ha mata ụmụnna, matakwa na Jehova bụ Chineke ha, Nna ha, na Enyi ha. Anyị weere ihe ndị a ka ihe dị mkpa karịa ịmụwa asụsụ anyị.”

14 Samuel kwukwara, sị: “Mụ na nwunye m na-agakwa ọmụmụ ihe n’asụsụ anyị ka okwukwe anyị sikwuo ike. Anyị anaghị enwe ohere, ike na-agwụkwa anyị. Ma, anyị na-ekele Jehova maka otú o si gọzie mbọ anyị gbara na ihe ndị anyị hapụrụ iji nyere ụmụ anyị aka. Ụmụ atọ anyị mụrụ na-ejere Jehova ozi oge niile.”

IHE NDỊ NA-ETO ETO NWERE IKE IME

15. Gịnị mere Kristina ji chee na ọ ga-emekwu nke ọma ma ọ gafee n’ọgbakọ na-eji asụsụ obodo ha bi amụ ihe?

15 Ụmụaka too, ha nwere ike chọpụta na ha ga-emekwu nke ọma n’ozi Jehova ma ha nọrọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ ha kacha aghọta amụ ihe. Ya bụrụ otú ahụ, ndị mụrụ ha ekwesịghị ichewe na ụmụ ha ajụla ha. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Kristina kwuru, sị: “Ama m okwu ụfọdụ n’asụsụ ndị mụrụ m, ma asụsụ e ji amụ ihe n’ọmụmụ ihe siiri m ezigbo ike. Mgbe m dị afọ iri na abụọ, m gara mgbakọ e nwere n’asụsụ anyị ji amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ. Ihe a bụ nke mbụ m na-aga mgbakọ, ya edoo m anya na ihe m na-anụ bụ eziokwu. Ihe ọzọ bụ na m bidoro iji asụsụ anyị ji amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ na-ekpe ekpere. M na-agwazi Jehova otú obi dị m.” (Ọrụ 2:11, 41) Mgbe Kristina ghọrọ agbọghọbịa, ya na ndị mụrụ ya kparịtara gbasara asụsụ kacha eru ya n’obi, ha ekpebie ka ọ gafee n’ọgbakọ na-eji asụsụ ndị obodo ahụ amụ ihe. Kristina kwuru, sị: “Iji asụsụ anyị ji amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ na-amụ gbasara Jehova mere ka m mekwuo nke ọma n’ozi Jehova.” Ọ dịghị anya, ya aghọọ ọsụ ụzọ oge niile, na-enwekwa obi ụtọ.

16. Gịnị mere obi ji dị Nadia ụtọ na ọ nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ ndị mụrụ ya amụ ihe?

16 Ndị na-eto eto, ùnu chere na ọ ga-akara unu mma ịnọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ ebe unu bi amụ ihe? Ya bụrụ otú ahụ, jụọ onwe gị ihe mere i ji eche otú ahụ. Ịgafe n’ọgbakọ ahụ ọ̀ ga-eme ka ị bịarukwuo Jehova nso? (Jems 4:8) Ka ọ̀ bụ na ị chọrọ ịgafe ka ndị mụrụ gị ghara ịma otú i si eme n’ọgbakọ ma ọ bụ ka ị ghara ịna-agba mbọ n’ọgbakọ? Otu nwanna nwaanyị, na-eje ozi na Betel, aha ya bụ Nadia sịrị: “Mgbe mụ na ụmụnne m na-eto eto, anyị chọrọ ịgafe n’ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ebe anyị bi amụ ihe.” Ma ndị mụrụ ya ma na ịgafe n’ọgbakọ ahụ agaghị eme ka ha na-eme nke ọma n’ozi Jehova. Nadia kwukwara, sị: “Obi dị anyị ụtọ ugbu a na ndị mụrụ anyị gbasiri mbọ ike ịkụziri anyị asụsụ ha ma mee ka anyị nọrọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ ha amụ ihe. O meela ka ndụ anyị kakwuo mma, meekwa ka anyị na-enyekwuru ndị ọzọ aka ka ha mata Jehova.”

OTÚ NDỊ ỌZỌ NWERE IKE ISI NYE AKA

17. (a) Ole ndị ka Jehova nyere ọrụ ịzụ ụmụ? (b) Olee otú ndị nne na nna ga-esi nweta enyemaka n’ịkụziri ụmụ ha eziokwu Baịbụl?

17 Ọ bụ nne na nna ka Jehova nyere ọrụ ịzụ ụmụ ha, ọ bụghị nne nne na nna nna ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ. (Gụọ Ilu 1:8; 31:10, 27, 28.) Ma, ndị nne na nna na-amaghị  asụsụ ndị ebe ha bi nwere ike ịgwa onye ọzọ ka o nyere ha aka ka ha nwee ike iru ụmụ ha n’obi. Ịchọ ụdị enyemaka ahụ apụtaghị na ndị nne na nna na-agbara ọrụ e nyere ha ịzụ ụmụ ha ọsọ. Kama, o nwere ike iso n’otú ha ga-esi zụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) Dị ka ihe atụ, ndị nne na nna nwere ike ịgwa ndị okenye ka ha tụọrọ ha aro otú ha ga-esi na-eduzi ofufe ezinụlọ nakwa ka ha nyere ha aka chọta ndị ezigbo mmadụ ha na ụmụ ha ga na-akpa.

Ma ụmụaka ma ndị nne na nna na-erite uru ma ha soro ndị ọgbakọ ha na-akpakọrịta (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18 na nke 19)

18, 19. (a) Olee otú Ndị Kraịst ndị ọzọ ga-esi nyere ndị na-eto eto aka? (b) Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ịna-eme?

18 Dị ka ihe atụ, ndị nne na nna nwere ike ịna-akpọ ndị ezinụlọ ọzọ ka ha soro ha nwee ofufe ezinụlọ kwa mgbe kwa mgbe. Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ ndị na-eto eto na-eme nke ọma ma ha soro Ndị Kraịst ndị ọzọ na-aga ozi ọma, na-emekọkwa ihe ndị ọzọ ọnụ. (Ilu 27:17) Nwanna Shan anyị kwuburu okwu ya sịrị: “M chetara ụmụnna ndị nyeere m aka. Mgbe ọ bụla ha nyeere m aka n’ihe omume e nyere m n’ọmụmụ ihe, m na-amụtakwu ihe. Ntụrụndụ ndị anyị nwekọrọ tọkwara m ụtọ.”

19 N’eziokwu, ndị ndị nne na nna họọrọ ka ha nyere ụmụ ha aka kwesịrị ịna-agba ụmụaka ume ka ha na-erubere nne na nna ha isi, ha kwesịkwara ịna-ekwu okwu ọma gbasara ndị mụrụ ụmụaka ahụ. Ha ekwesịghịkwa ịnara ndị nne na nna ọrụ e nyere ha ịzụ ụmụ ha. Ihe ọzọ bụ na ndị na-enyere nne na nna aka ekwesịghị ịna-akpa àgwà ndị mmadụ nwere ike ịna-ele anya ọjọọ n’èzí ma ọ bụ n’ọgbakọ. (1 Pita 2:12) Ọ bụ eziokwu na ndị nne na nna nwere ike chọọ ka ndị ọzọ nyere ha aka, ma ọ ka bụ ọrụ ha ịkụziri ụmụ ha eziokwu Baịbụl. Ha kwesịrị ịna-eleba anya n’otú ndị ọzọ si na-enyere ụmụ ha aka ma jiri aka ha na-akụziri ụmụ ha ihe.

20. Olee otú ndị nne na nna ga-esi nyere ụmụ ha aka ka ha jiri obi ha niile na-ejere Jehova ozi?

20 Ndị nne na nna, na-arịọnụ Jehova ka o nyere unu aka, na-agbasikwanụ mbọ ike. (Gụọ 2 Ihe E Mere 15:7.) Jirinụ adịm ná mma ụmụ unu na Jehova kpọrọ ihe karịa ihe dị unu mma. Meenụ ihe ọ bụla unu nwere ike ime ka Okwu Chineke ruo ụmụ unu n’obi. Ka obi sie unu ike mgbe niile na ụmụ unu ga-emecha jiri obi ha niile na-ejere Jehova ozi. Mgbe ụmụ unu na-eme ihe Baịbụl kwuru, na-emekwa ihe ọma ha mụtara n’aka unu, obi ga-adị unu otú ahụ ọ dị Jọn onyeozi. O kwuru banyere ndị o nyeere aka ịghọ Ndị Kraịst, sị: “Ọ dịghị ihe ọzọ ga-eme ka m nwee obi ekele karịa ihe a, ya bụ, na m ga na-anụ na ụmụ m na-eje ije n’eziokwu ahụ.”—3 Jọn 4.

^ para. 7 Gụọ isiokwu kwuru gbasara ịmụ asụsụ ọzọ. Ọ gbara na Teta! (Bekee) nke March 2007, peeji nke 10 ruo nke 12.