Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mee 2017

Na-enyere “Ndị Mbịarambịa” Aka Ka Ha ‘Jiri Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi’

Na-enyere “Ndị Mbịarambịa” Aka Ka Ha ‘Jiri Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi’

“Jehova na-eche ndị mbịarambịa nche.”—ỌMA 146:9.

ABỤ: 84, 73

1, 2. (a) Olee nsogbu ụmụnna ụfọdụ na-enwe? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

OTU nwanna aha ya bụ Lije kwuru, sị: “Mgbe agha dara na Burundi, ndị ezinụlọ anyị nọ ná mgbakọ. Anyị hụrụ ka ndị mmadụ na-agba ọsọ, a na-akwa mgbọ. Papa m na mama m na mụ na ụmụnne m iri gbara ọsọ ndụ. Ọ bụ naanị ihe ole na ole ka anyị ji gbaa ọsọ. Ụfọdụ n’ime ndị ezinụlọ anyị mechara ruo n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ na Malawi. Ha gara ije ihe karịrị otu puku kilomita na narị isii. Ndị ọzọ gbagara n’ebe dị iche iche.”

2 N’ụwa niile, ndị gbara ọsọ ndụ n’ihi agha ma ọ bụ mmegide akarịala nde iri isii na ise ugbu a. Ihe a bụ ọnụ ọgụgụ kacha elu e nwetụrụla. * Ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova so ná ndị a gbara ọsọ ndụ. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ọtụtụ n’ime ha gbazi aka ihe niile, ndị ha hụrụ n’anya anwụọkwa. Olee nsogbu ndị ọzọ ndị gbara ọsọ ndụ na-enwe? Olee otú anyị ga-esi nyere ụmụnna ndị a aka ka ha ‘jiri ọṅụ na-ejere Jehova ozi’ n’agbanyeghị nsogbu bịaara ha? (Ọma 100:2) Oleekwa otú kacha mma anyị ga-esi zie ndị gbara ọsọ ndụ, bụ́ ndị na-amabeghị Jehova, ozi ọma?

 OTÚ IMI NA ANYA NA-ADỊ NDỊ GBARA ỌSỌ NDỤ

3. Olee otú Jizọs na ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya si ghọọ ndị gbara ọsọ ndụ?

3 Mgbe mmụọ ozi Jehova gwara Josef na Eze Herọd chọrọ igbu Jizọs, Jizọs na ndị mụrụ ya ghọrọ ndị gbara ọsọ ndụ n’Ijipt. Ha nọ ebe ahụ ruo mgbe Herọd nwụrụ. (Mat. 2:13, 14, 19-21) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, a malitere ịkpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs, ‘chụsasịa ha n’ógbè ndị dị gburugburu Judia na Sameria.’ (Ọrụ 8:1) Jizọs ma na ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya ga-agbapụ n’ụlọ ha gbaga ebe ọzọ. Ọ sịrị ha: “Mgbe ha kpagburu unu n’otu obodo, gbalaganụ n’obodo ọzọ.” (Mat. 10:23) Mmadụ ịgbapụ n’ụlọ ya n’ihi ihe ọ bụla anaghị adị mfe.

4, 5. Olee nsogbu ndị gbara ọsọ ndụ na-enwe (a) mgbe ha na-agba ọsọ ndụ? (b) mgbe ha bi n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ?

4 Ndị gbara ọsọ ndụ nwere ike nwee nsogbu mgbe ha na-agba ọsọ ndụ ma ọ bụ mgbe ha bi n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ. Gad, bụ́ nwanne Lije nke ọ tọrọ, kwuru, sị: “Anyị gara ije ọtụtụ izu, na-agafe ọtụtụ ozu ndị mmadụ. Adị m afọ iri na abụọ mgbe ahụ. Otú ụkwụ m si zaa mere ka m gwa ndị ezinụlọ anyị ka ha hapụ m gawa. Papa m kuuru m n’ihi na ọ chọghị ka ndị agha nnupụisi kpọrọ m. Mkpa anyị bụ naanị ihe anyị ga-eri n’ụbọchị. Anyị nọ na-ekpe ekpere ma tụkwasị Jehova obi. Mgbe ụfọdụ, naanị ihe anyị na-eri bụ mango ndị anyị ghọtara n’ụzọ.”—Fil. 4:12, 13.

5 Ọtụtụ ndị ezinụlọ Lije mechara bie ọtụtụ afọ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke Òtù Mba Ụwa. Ma, e nwekwara nsogbu ndị bịaara ha n’ebe ahụ. Lije, bụ́ onye nlekọta sekit ugbu a, kwuru, sị: “Ọtụtụ n’ime ndị gbara ọsọ ndụ enweghị ọrụ. Ha na-agba asịrị, na-aṅụ oké mmanya, na-agba chaa chaa, na-ezu ohi, na-akwakwa iko.” Ihe ga-eme ka Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ndị ahụ ghara ịmụta àgwà ọjọọ ndị ahụ bụ iso na-eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ. (Hib. 6:11, 12; 10:24, 25) Ha ji oge ha na-eme ihe bara uru ka okwukwe ha sie ike. Ọtụtụ ndị malitekwara ịsụ ụzọ. Obi na-esi ha ike ma ha cheta na ha ga-emecha si n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ pụta otú ahụ ndị Izrel si n’ala ịkpa pụta.—2 Kọr. 4:18.

NA-EGOSI NDỊ GBARA ỌSỌ NDỤ NA Ị HỤRỤ HA N’ANYA

6, 7. (a) Olee otú “ịhụnanya maka Chineke” si eme ka Ndị Kraịst na-emeso ụmụnna ha nọ ná nsogbu? (b) Nye ihe atụ.

6 “Ịhụnanya maka Chineke” na-eme ka anyị na-egosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya, karịchaa, mgbe ha nọ ná nsogbu. (Gụọ 1 Jọn 3:17, 18.) Mgbe ụkọ nri kpara Ndị Kraịst nọ na Judia aka ọjọọ n’oge ndịozi Jizọs, ụmụnna gbataara ha ọsọ enyemaka. (Ọrụ 11:28, 29) Pọl onyeozi na Pita onyeozi gwara Ndị Kraịst ka ha na-ele ibe ha ọbịa. (Rom 12:13; 1 Pita 4:9) Ebe ọ bụ na Ndị Kraịst kwesịrị ịnabata ụmụnna si ebe ọzọ bịa, ha kwesịkwara ịnabata ụmụnna ha nọ ná nsogbu ma ọ bụ ndị a na-emegide n’ihi ihe ha kweere.—Gụọ Ilu 3:27. *

7 N’oge na-adịbeghị anya, ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka, si n’ebe ọwụwa anyanwụ Yukren gbaa ọsọ ndụ n’ihi agha na mmegide. Ọ dị mwute na e gburu ụfọdụ n’ime ha. Ma, ụmụnna ndị nọ n’ebe ndị ọzọ na Yukren nakwa na Rọshịa nabatara ọtụtụ n’ime ndị a gbara ọsọ ndụ. Ma na Yukren ma na Rọshịa, ụmụnna anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha “abụghị nke ụwa.” Ha jikwa ịnụ ọkụ n’obi “na-ezisa ozi ọma banyere okwu Chineke.”—Jọn 15:19; Ọrụ 8:4.

 NA-ENYERE NDỊ GBARA ỌSỌ NDỤ AKA KA OKWUKWE HA SIE IKE

8, 9. (a) Olee nsogbu ndị gbara ọsọ ndụ nwere ike inwe ma ha gbaga n’obodo ha na-agatụbeghị? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị iji ndidi na-enyere ha aka?

8 Ụfọdụ ndị gbara ọsọ ndụ na-agbaga ebe ọzọ n’obodo ha, ọtụtụ ndị ọzọ na-agbagakwa obodo ha na-agatụbeghị. Ndị ọchịchị nwere ike inye ha nri, uwe, na ebe ha ga-ebi, ma nri ha na-enye ha nwere ike bụrụ nri ha na-eritụbeghị. Ndị si n’obodo okpomọkụ dị nwere ike gbaga ebe oyi na-atụ, ha nwere ike ha agaghịkwa ama ụdị uwe ha ga-eyi maka ya. Ndị nke si n’ime ime obodo nwere ike ha agaghị ama otú e si eji ihe ndị ọgbara ọhụrụ eme ihe n’ụlọ.

9 E nwere ihe ụfọdụ ndị ọchịchị na-emere ndị gbatara ọsọ ndụ ka ebe ha bịara mara ha ahụ́. Ma, ha na-achọkarị ka ndị gbatara ọsọ ndụ lekọtawa onwe ha ma ọnwa ole na ole gachaa. Ọ naghị adị mfe. Chegodị otú ha ga-esi na-agbalị ịmụta ihe niile otu mgbe, ya bụ, asụsụ ndị ebe ahụ, omenala ha, na iwu ndị gbasara ịkwụ ụtụ isi, ụgwọ ọkụ na ụgwọ ihe ndị ọzọ, ịga ụlọ akwụkwọ, na ịzụ ụmụ. Ị̀ ga-ejili ndidi nyere ụmụnna ndị a aka n’akparịghị ha?—Fil. 2:3, 4.

10. Olee otú anyị ga-esi mee ka okwukwe ụmụnna anyị ndị gbatara ọsọ ndụ sie ike? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

10 Mgbe ụfọdụ, ndị ọchịchị na-eme ka o siere ụmụnna ndị gbara ọsọ ndụ ike ịkpọtụrụ ọgbakọ dị n’ebe ha gbagara. Ụfọdụ ụlọ ọrụ ndị na-enyere ndị gbara ọsọ ndụ aka na-ekwu na ha ga-akwụsị inyere ụmụnna anyị aka ma ọ bụ jụ ịnabata ha n’obodo ha ma ha jụ ịrụ ọrụ ga-egbochi ha ịna-aga ọmụmụ ihe. Ụfọdụ ụmụnna ekwetala ịrụ ụdị ọrụ ahụ n’ihi ụjọ nakwa n’ihi na ha amaghị ihe ọzọ ha ga-eme. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịga hụ ụmụnna anyị gbatara ọsọ ndụ ozugbo ha rutere. Anyị kwesịrị ime ka ha ghọta na anyị hụrụ ha n’anya. Okwukwe ha nwere ike isikwu ike ma anyị nweere ha ọmịiko, nyekwara ha aka.—Ilu 12:25; 17:17.

NA-EGBORO NDỊ GBARA ỌSỌ NDỤ MKPA HA

11. (a) Gịnị na-adị ndị gbatara ọsọ ndụ mkpa ná mmalite? (b) Olee otú ndị gbatara ọsọ ndụ ga-esi egosi na ihe e meere ha dị ha mma?

11 Ná mmalite, anyị nwere ike nye ụmụnna anyị ndị gbatara ọsọ ndụ nri, uwe, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. * Imere nwanna obere ihe, dị ka inye ya taị, nwere ike ịba ezigbo uru. Ọ bụrụ na ndị gbara ọsọ ndụ egosi na ihe e meere ha dị ha mma, gharakwa ịna-ekwu ka e nye ha ihe, ọ ga-eme ka ụmụnna ndị na-enyere ha aka jiri obi ụtọ na-eme ya. N’eziokwu, ndị gbatara ọsọ ndụ nwere ike ire ùgwù ha ma ha lewe anya ka ndị ọzọ na-egboro ha mkpa ha ruo ogologo oge. O nwekwara ike ime ka ha na ụmụnna ha ghara ịdị ná mma. (2 Tesa. 3:7-10) Ma, anyị kwesịrị ịna-enyere ha aka.

Olee otú anyị ga-esi nyere ụmụnna anyị ndị gbatara ọsọ ndụ aka? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 ruo na nke 13)

12, 13. (a) Olee otú anyị ga-esi na-enyere ndị gbatara ọsọ ndụ aka? (b) Nye ihe atụ.

12 Inyere ndị gbatara ọsọ ndụ aka apụtaghị ịna-ebunye ha ego, kama ọ pụtara ịna-ewepụtara ha oge, na-egosikwa ha na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. I nwere ike igosi ha ebe ha ga na-aba ụgbọala ma ọ bụ na-azụta ihe ndị dị mma e ji esi nri, bụ́ ndị na-adịghị oké ọnụ. I nwekwara ike igosi ha otú ha ga-esi enweta ígwè e ji akwa ákwà ma ọ bụ ihe ọzọ ha ga-eji na-akpata ihe ha ga-eri. Nke kadị mkpa bụ inyere ha aka ka ha soro na-eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ ọhụrụ ha. O kwe  omume, jiri ụgbọala gị buga ha ọmụmụ ihe. Kọwaakwara ha otú ha ga-esi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ókèala unu. Gị na ha nwekwara ike ịrụ n’ozi ọma.

13 Mgbe ụmụ okorobịa anọ gbatara ọsọ ndụ n’otu ọgbakọ, ndị okenye dị iche iche kụziiri ha otú e si anya ụgbọala, otú e si eji kọmputa ede ihe, na otú e si ede akwụkwọ e ji achọ ọrụ nakwa otú ha ga-esi hazie oge ha iji were ozi Jehova ka ihe kacha mkpa. (Gal. 6:10) Obere oge, ha anọ ghọrọ ndị ọsụ ụzọ. Aka e nyeere ha na mbọ ha gbara iji ofufe Chineke kpọrọ ihe mere ka ha na-eme nke ọma, ma ghara itinye isi n’ụwa Setan.

14. (a) Olee ọnwụnwa ndị gbara ọsọ ndụ kwesịrị imeri? (b) Nye ihe atụ.

14 Ụmụnna ndị gbara ọsọ ndụ kwesịrị ịna-agbalịsi ike imeri ọnwụnwa otú ahụ Ndị Kraịst ndị ọzọ na-eme. Ha ekwesịghịkwa ikwe ka ịchọ ihe afọ ga-eri mee ka ha nupụrụ Jehova isi. * Nwanna Lije, anyị kwuburu okwu ya, na ụmụnne ya chetara ihe nna ha kụziiri ha gbasara okwukwe n’oge ahụ ha na-agba ọsọ ndụ. Ọ sịrị: “O ji nwayọọ nwayọọ tụfuchaa ihe ụfọdụ na-adịghị mkpa anyị bu na-agba ọsọ ndụ. N’ikpeazụ, o weliri okpokoro akpa ahụ elu, chịtụ ọchị ma sị: ‘Ùnu ahụla? Ọ bụ naanị ihe a ka unu kwesịrị iwere.’”—Gụọ 1 Timoti 6:8.

NA-EGBORO NDỊ GBATARA ỌSỌ NDỤ MKPA HA KACHANỤ

15, 16. Olee otú anyị ga-esi nyere ndị gbara ọsọ ndụ aka (a) ka okwukwe ha sie ike? (b) ka obi na-adị ha mma?

15 Ọ bụghị naanị uwe na nri ka e kwesịrị inye ụmụnna gbatara ọsọ ndụ. E kwesịrị ime ka obi na-adị ha mma, jirikwa Baịbụl na-agba ha ume. (Mat. 4:4) Ndị okenye nwere ike inyere ha aka ka ha na-enweta akwụkwọ anyị n’asụsụ ha, nyekwara ha aka ịchọta ụmụnna ndị na-asụ asụsụ ha. Ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ hapụrụ ndị ikwu na ibe ha, ndị obodo ha, na ndị ọgbakọ ha, bụ́ ndị ha na ha dị n’ezigbo mma. Ụmụnna kwesịrị ime ka ha ghọta na Jehova hụrụ ha n’anya ma na-enwere ha ọmịiko. Ma ọ́ bụghị ya, ha nwere ike chọwa ka ndị ikwu ha ma ọ bụ ndị obodo ha na-abụghị Ndịàmà Jehova nyere ha aka. (1 Kọr. 15:33) Anyị mee ka obi ruo ha ala n’ọgbakọ, ọ pụtara na anyị so Jehova “na-eche ndị mbịarambịa nche.”—Ọma 146:9.

 16 Jizọs na ndị mụrụ ya agaghị alaghachili n’obodo ha mgbe ndị na-emegide ha ka nọ n’ọchịchị. Otú ahụ ka o nwere ike ịdị ndị gbara ọsọ ndụ. Ụfọdụ agadịghị achọ ịlaghachi. Lije kwukwara na “ọtụtụ ndị nne na nna ndị hụrụ ka e dinara ndị ezinụlọ ha ma gbuo ha agaghị achọ ịkpọrọ ụmụ ha laghachi n’ebe ihe ahụ mere.” Iji nyere ụmụnna ụdị ihe a mere aka, ụmụnna ndị nọ n’ebe ha gbatara ọsọ ndụ kwesịrị ịna-egosi na ‘ihe banyere ụmụnna ha na-emetụ ha n’obi, hụ ha n’anya, na-enwere ha obi ọmịiko, dịrịkwa umeala n’obi.’ (1 Pita 3:8) Mkpagbu emeela ka ụfọdụ ndị gbara ọsọ ndụ na-anọrọ onwe ha. Ihere nwekwara ike ịna-eme ha ikwu banyere ahụhụ ha na-ata, nke ka nke, n’ihu ụmụ ha. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na m bụ ha, gịnị ka m ga-achọ ka e meere m?’—Mat. 7:12.

IZI NDỊ NA-ABỤGHỊ NDỊÀMÀ JEHOVA GBATARA ỌSỌ NDỤ OZI ỌMA

17. Olee otú ozi ọma anyị si eme ka obi ruo ndị gbatara ọsọ ndụ ala?

17 Taa, ọtụtụ n’ime ndị gbara ọsọ ndụ si ná mba ndị a machibidoro ozi ọma anyị iwu. Otú ụmụnna na-anụ ọkụ n’obi si na-anabata ndị gbatara ọsọ ndụ n’obodo ha emeela ka ọtụtụ puku n’ime ndị na-anụtụbeghị “okwu banyere alaeze ahụ” nụ ya. (Mat. 13:19, 23) Ịga ọmụmụ ihe na-akasi ọtụtụ “ndị e boro ibu dị arọ” obi, meekwa ka obi ruo ha ala. Ha na-ekwu ozugbo, sị: “N’ezie, Chineke nọ n’etiti unu.”—Mat. 11:28-30; 1 Kọr. 14:25.

18, 19. Anyị ziwe ndị gbara ọsọ ndụ ozi ọma, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ma ihe?

18 Ndị na-ezi ndị gbara ọsọ ndụ ozi ọma kwesịrị ‘ịdị akọ’ ma ‘mara ihe.’ (Mat. 10:16; Ilu 22:3) Gee ha ntị nke ọma ma ha kọwa nsogbu ha. Ma, gị na ha ekwukwala gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mee ihe alaka ụlọ ọrụ na ndị ọchịchị obodo kwuru ka ị ghara itinye onwe gị ma ọ bụ ndị ọzọ ná nsogbu. Mata ihe ndị gbara ọsọ ndụ kweere na omenala ha. Akatọkwala ihe ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, ihe gbasara ụdị uwe nwaanyị kwesịrị ịna-eyi na-ewe ndị si n’obodo ụfọdụ ezigbo iwe. N’ihi ya, i ziwe ndị gbatara ọsọ ndụ ozi ọma, yiri uwe na-agaghị ewe ha iwe.

19 Anyị kwesịrị inyere ndị na-ata ahụhụ aka, ma ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova. Anyị mee otú ahụ, anyị na-eṅomi onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi Jizọs kwuru okwu ya n’ihe atụ ya. (Luk 10:33-37) Otú kacha mma anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ezi ha ozi ọma. Otu okenye nyeerela ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ aka kwuru, sị: “Ọ dị mkpa ime ka o doo ha anya ozugbo na anyị bụ Ndịàmà Jehova nakwa na anyị bịara izi ha ozi ọma, ọ bụghị inye ha ihe e ji ebi ndụ. Ma ọ́ bụghị ya, ụfọdụ nwere ike ịna-eso anyị naanị n’ihi ihe ha ga-enweta n’aka anyị.”

URU Ọ NA-ABA

20, 21. (a) Olee uru ọ na-aba ma anyị mee ihe gosiri na anyị hụrụ ndị gbatara ọsọ ndụ n’anya? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a?

20 Ime ihe gosiri na anyị hụrụ “ndị mbịarambịa” n’anya na-aba ezigbo uru. Mgbe di otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Alganesh nwụrụ, ọ kpọ ụmụ ya isii si n’Eritria gbapụ n’ihi mkpagbu. Ije ha gara ụbọchị asatọ n’ọzara mere ka ike gwụ ha. Ha emechaa rute Sudan. O kwuru, sị: “Ụmụnna ndị ebe ahụ nabatara anyị nke ọma ka ụmụnne ha, na-enye anyị nri, uwe, ebe anyị ga-ebi, na ego ụgbọ. È nwere ndị ọzọ ga-esi otú ahụ nabata ndị ha na-amaghị n’ụlọ ha naanị n’ihi na ha na-efe otu Chineke? Ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova.”—Gụọ Jọn 13:35.

21 Oleekwanụ maka ọtụtụ ụmụaka ndị so ndị mụrụ ha gbaa ọsọ ndụ na ndị ọzọ si n’obodo ha kwafeta n’obodo anyị? N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-amụ otú anyị ga-esi nyere ha aka ka ha jiri ọṅụ na-ejere Jehova ozi.

^ para. 2 N’isiokwu a, “ndị gbara ọsọ ndụ” pụtara ndị hapụrụ ụlọ ha gbaga ebe ọzọ, ma ọ̀ bụ ná mba ọzọ ma ọ̀ bụ ná mba nke ha, n’ihi agha, mmegide ma ọ bụ ọdachi. Ngalaba Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ kwuru na e kee ndị bi n’ụwa taa ụzọ otu narị na iri na atọ, otu ụzọ bụ ndị gbara ọsọ ndụ.

^ para. 6 Gụọ isiokwu bụ́ “Unu Echefula Imere Ndị Bịara Abịa Ihe Ọma,” n’Ụlọ Nche Ọktoba 2016, peeji nke 8 ruo nke 12.

^ para. 11 Ozugbo nwanna gbatara ọsọ ndụ, ndị okenye kwesịrị ime ihe e kwuru n’akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, n’isi nke asatọ, paragraf nke iri atọ. Ndị okenye nwere ike ịkpọtụrụ ọgbakọ ndị dị ná mba ndị ọzọ. Otú ha ga-esi eme ya bụ isi na jw.org degara alaka ụlọ ọrụ ha akwụkwọ ozi. Ha ga-ejizi akọ jụọ onye ahụ gbasara ọgbakọ ya na ozi ya iji mata otú o si eme n’ọgbakọ.

^ para. 14 Gụọ isiokwu bụ́ “E Nweghị Onye Ga-abụli Ohu Nna Ukwu Abụọ” na “Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka,” n’Ụlọ Nche Eprel 15, 2014, peeji nke 17 ruo nke 26.