Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mee 2017

“Ị̀ Hụrụ M n’Anya Karịa Ihe Ndị A?”

“Ị̀ Hụrụ M n’Anya Karịa Ihe Ndị A?”

“Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya karịa ihe ndị a?”—JỌN 21:15.

ABỤ: 128, 45

1, 2. Gịnị ka Pita mụtara mgbe ọ mụchara anya abalị n’ebe ha na-egbu azụ̀?

MGBE a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, mmadụ asaa n’ime ndị na-eso ụzọ ya mụrụ anya abalị niile na-egbu azụ̀ n’Oké Osimiri Galili, ma e nweghị nke ha gbutere. Mgbe chi bọrọ, Jizọs nọ n’akụkụ osimiri ahụ na-ele ha. “O wee sị ha: ‘Wụnyenụ ụgbụ n’akụkụ aka nri nke ụgbọ mmiri unu, unu ga-egbute azụ̀.’ Ha wee wụnye ya, ma ha enwekwaghị ike ịdọbata ya n’ihi otú azụ̀ si dị ọtụtụ.”—Jọn 21:1-6.

2 Mgbe Jizọs nyechara ha nri ụtụtụ, o lere Saịmọn Pita anya, sị ya: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya karịa ihe ndị a?” Gịnị bụ ihe ndị a Jizọs kwuru okwu ha? Pita ejighị ọrụ igbu azụ̀ eti epele. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na Jizọs na-ajụ ya ihe o weere ka ihe kacha mkpa. Ọ̀ bụ azụ̀ na ọrụ igbu azụ̀ dị Pita mkpa karịa Jizọs na ihe ndị ọ kụziri? Pita zara ya, sị: “Ee, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị n’anya nke ukwuu.” (Jọn 21:15) N’eziokwu, Pita mezuru ihe ahụ o kwuru. Si mgbe ahụ gawa, o mere ihe gosiri na ọ hụrụ Jizọs n’anya. Otú o si mee ya bụ ịgbasi  mbọ ike n’ikwusa ozi ọma, mechaakwa bụrụ ogidi n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ahụ.

3. Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya ka ọ ghara ime ha?

3 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Jizọs gwara Pita? Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịkwụsị ịhụ Jizọs n’anya, uche anyị apụzie n’ihe gbasara Alaeze Chineke. Jizọs ma na ihe ga-esi ike n’ụwa ochie a nakwa na ndị mmadụ ga na-echegbu onwe ha. N’ilu ọ tụrụ gbasara ọgha mkpụrụ, o kwuru na ụfọdụ ndị ga-anụ “okwu banyere alaeze ahụ,” meekwa nke ọma ná mmalite. Ma ‘nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụnụba ga-akpagbu okwu ahụ.’ (Mat. 13:19-22; Mak 4:19) N’eziokwu, ma anyị akpacharaghị anya, nsogbu ụwa nwere ike ime ka anyị lawa azụ n’ofufe Chineke. Ọ bụ ya mere Jizọs ji dọọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu.”—Luk 21:34.

4. Gịnị ga-enyere anyị aka ịma ma ànyị hụrụ Jizọs n’anya n’eziokwu? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 Otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Jizọs n’anya bụ iji ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe otú ahụ Pita mere. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-eme otú ahụ? Anyị kwesịrị ịna-eme, anyị gụrụ gụrụ, anyị ajụọ onwe anyị, sị: ‘Gịnị ka m weere ka ihe kacha mkpa? Ihe kacha eme m obi ụtọ ọ̀ bụ ijere Jehova ozi, ka ọ̀ bụ ihe ndị ọzọ?’ N’ihi ya, ka anyị leba anya n’ihe atọ nwere ike ime ka anyị kwụsị ịhụ Jizọs n’anya ma anyị akpacharaghị anya. Ha bụ ọrụ ego, ntụrụndụ, na ihe onwunwe.

EKWELA KA ỌRỤ EGO MEE KA I LEGHARA OZI CHINEKE ANYA

5. Olee ọrụ Baịbụl gwara ndị isi ezinụlọ ka ha na-arụ?

5 Ọ bụghị naanị na igbu azụ̀ na-atọ Pita ụtọ, ọ bụkwa ihe o ji akpa afọ ezinụlọ ya. Ndị isi ezinụlọ taa ma na Baịbụl gwara ha ka ha na-egboro ndị ezinụlọ ha mkpa ha. (1 Tim. 5:8) Ha kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-arụ ọrụ a Chineke nyere ha. Ma, n’oge ikpeazụ a, ọrụ ego na-emekarị ka ndị mmadụ na-echegbu onwe ha.

6. Olee nsogbu ndị e nwere n’ọtụtụ ụlọ ọrụ?

6 Otú ọrụ si dị ụkọ emeela ka ọtụtụ ndị e were n’ọrụ jiri ọtụtụ awa na-arụ ọrụ. Mgbe ụfọdụ, a naghịkwa akwụ ha ezigbo ụgwọ. Ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe na-agbalị iji naanị mmadụ ole na ole na-arụpụta ihe karịrị akarị. Ọ na-eme ka ike na-agwụ ndị ọrụ, isi ana-agba ha gharaghara, obi ana-ajọkwa ha njọ. Ụjọ na-atụ ọtụtụ ndị ọrụ na a ga-achụ ha n’ọrụ ma ha emeghị ihe ọ bụla nna ha ukwu kwuru.

7, 8. (a) Ònye ka anyị kwesịrị ịkacha hụ n’anya? (b) Olee ihe bara uru otu nwanna bi na Taịland mụtara gbasara ọrụ ya?

7 Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị hụrụ Jehova Chineke n’anya karịa ndị were anyị n’ọrụ. (Luk 10:27) Ọrụ ego bụ ihe anyị ji egbo mkpa anyị. Ọ na-enyekwara anyị aka ịna-ejere Chineke ozi. Ma anyị akpacharaghị anya, ọrụ ego nwere ike ime ka anyị leghara ofufe Chineke anya. Dị ka ihe atụ, otu nwanna bi na Taịland kwuru, sị: “Ọrụ m na-arụbu n’ụlọ ọrụ na-arụzi kọmputa nọ na-atọ m ụtọ. Ma, ọ naghị enye m ohere. O mere ka m ghara ịna-enwe efe maka ihe gbasara ofufe Chineke. M mechara chọpụta na ọ bụrụ na m chọrọ ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, m kwesịrị ịgbanwe ọrụ m.” Gịnị ka nwanna a mere?

 8 O kwuru, sị: “Mgbe m hazichara ihe niile ruo ihe dị ka otu afọ, m kpebiri irewe aịs krim n’okporo ụzọ. Mgbe m bidoro ya, ihe siiri m ike, obi adawa m mbà. Ọ na-abụ, m hụ ndị mụ na ha na-arụbu n’otu ebe, ha ana-achị m ọchị, na-ajụ m ihe mere m ji chee na ire aịs krim dị mma karịa ịrụ n’ụlọ ọrụ na-arụzi kọmputa n’ebe e nwere ntụoyi. M kpere ekpere rịọ Jehova ka o nyere m aka idi nsogbu ahụ ma nwee oge m ga-eji na-ejekwuru ya ozi otú ahụ m kpebiri. Ọ dịghị anya, ihe adịtụwa mma. M matakwuru ụdị aịs krim ndị ahịa m chọrọ, ghọzie aka ochie n’ime aịs krim. N’oge na-adịghị anya, m buru aịs krim pụọ, ya agwụ n’ụbọchị ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ego m nwetawaziri karịrị nke m na-enweta mgbe ahụ m na-arụzi kọmputa. O meela ka obi na-adịkwu m ụtọ n’ihi na anaghịzi m echegbu onwe m otú m na-emebu mgbe m na-arụzi kọmputa. Nke kacha mkpa bụ na mụ na Jehova adịkwuola ná mma ugbu a.”—Gụọ Matiu 5:3, 6.

9. Olee otú anyị ga-esi mee ka ọrụ ego ghara ime ka anyị leghara ofufe Chineke anya?

9 Anyị rụsiwe ọrụ ike, ọ na-eme Jehova obi ụtọ. Ọ na-abakwa uru. (Ilu 12:14) Nwanna ahụ anyị kwuru okwu ya mechara chọpụta na mmadụ ekwesịghị ikwe ka ọrụ ego mee ka o leghara ofufe Chineke anya. Jizọs sịrị: “Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.” (Mat. 6:33) Ihe ga-enyere anyị aka ịmata ma ọrụ ego ò meela ka anyị na-eleghara ihe gbasara ofufe Chineke anya bụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ịrụ ọrụ ego ọ̀ na-atọ m ụtọ, ma o ruzie n’ihe gbasara ofufe Chineke, o nweghị ihe m ga-eji ya kpọrọ?’ Anyị chee otú obi na-adị anyị gbasara ọrụ ego na ofufe Chineke, ọ ga-enyere anyị aka ịmata ihe anyị ji kpọrọ ihe karịchaa.

10. Olee ihe bara uru Jizọs kụziri gbasara ihe anyị kwesịrị iji kpọrọ ihe karịchaa?

10 Jizọs kụziiri anyị otú anyị ga-esi jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe karịa ihe ndị ọzọ. O nwere mgbe ọ gara n’ụlọ Meri na nwanne ya nwaanyị bụ́ Mata. Mata nọ na-agba kpuru kpuru kpuru ka o sie nri, Meri anọrọ n’akụkụ ụkwụ Jizọs na-egere ihe ọ na-ekwu. Mgbe Mata gwara Jizọs na Meri ekweghị enyere ya aka, Jizọs gwara ya, sị: “Meri họọrọ òkè dị mma, a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.” (Luk 10:38-42) Jizọs ji ihe ahụ kụziere Mata ihe bara uru. Ọ bụrụ na anyị achọghị ka ihe ndị ọzọ megharịa anyị anya, chọọkwa igosi na anyị hụrụ Jizọs n’anya, anyị kwesịrị ịna-ahọrọ “òkè dị mma,” ya bụ, iji ihe gbasara ife Chineke kpọrọ ihe.

OTÚ ANYỊ SI ELE NTỤRỤNDỤ NA EGWUREGWU ANYA

11. Gịnị ka Baịbụl na-akụziri anyị gbasara izu ike na ntụrụndụ?

11 Anyị kwesịrị ịna-ewepụta oge anyị ga-eji na-atụrụ ndụ, na-ezukwa ike, n’agbanyeghị ọtụtụ ihe anyị na-arụ n’ụbọchị. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe dịịrị mmadụ mma karịa iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, meekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya.” (Ekli. 2:24) Jizọs ma na izu ike bara uru. Dị ka ihe atụ, mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya gbachara ezigbo mbọ n’ozi ọma, ọ gwara ha, sị: “Bịanụ ka anyị gaa zurutụ ike n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị.”—Mak 6:31, 32.

12. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya n’ihe gbasara ntụrụndụ na egwuregwu? Nye ihe atụ.

12 N’eziokwu, egwuregwu na ntụrụndụ na-aba ezigbo uru. Ma, nsogbu dị na ya bụ na ntụrụndụ nwere ike ịghọzi  ihe kacha mmadụ mkpa. N’oge ndịozi Jizọs, ihe ọtụtụ ndị na-ekwu bụ: “Ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Kọr. 15:32) Ọtụtụ ndị na-emekwa otú ahụ n’ọtụtụ ebe n’ụwa taa. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ afọ gara aga, otu nwa okorobịa bi n’otu mba dị n’Ebe Ndịda Yurop malitere ịga ọmụmụ ihe. Ma, ntụrụndụ riri ya isi, mee ka ọ kwụsị iso ndị Jehova. Ka oge na-aga, ọ ghọtara na otú o si buru ntụrụndụ n’isi akpatarala ya nsogbu, meekwa ka obi na-ajọ ya njọ. N’ihi ya, o bidokwara ịmụ Baịbụl, mechaa bụrụ onye nkwusa. Mgbe e mechara ya baptizim, ọ sịrị: “Naanị mmakwaara m na-akwa bụ na m gburu ezigbo oge tupu mụ aghọta na ijere Jehova ozi na-eme obi ụtọ karịa ibu ntụrụndụ ụwa a n’isi.”

13. (a) Nye ihe atụ na-egosi nsogbu egwuregwu na ntụrụndụ nwere ike ịkpata. (b) Olee ihe ga-enyere anyị aka ka ntụrụndụ na egwuregwu ghara ime ka anyị leghara ofufe Chineke anya?

13 Ntụrụndụ kwesịrị ime ka anyị zuo ike ma nweta onwe anyị. N’ihi ya, awa ole ka anyị kwesịrị iji na-atụrụ ndụ? Chegodị banyere ihe atụ a: Ịracha swiit na ihe ndị ọzọ na-atọ bịrịbịrị na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ. Ma anyị ma na mmadụ riwe naanị ụdị ihe ahụ, ọ ga-erite ọrịa. Ọ bụ ya mere anyị ji eri nri na-edozi ahụ́. Otú ahụ ka ntụrụndụ dị. Anyị were ya ka ihe kacha mkpa, okwukwe anyị ga-anyụ ka ọkụ. Ma anyị achọghị ka ụdị ihe ahụ mee anyị, anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike n’ihe gbasara ofufe Chineke. Oleekwanụ otú anyị ga-esi mata ma ntụrụndụ ò mewela ka anyị leghara ozi Chineke anya? N’otu izu, anyị nwere ike dekọwa awa ole anyị ji eme ihe gbasara ofufe Chineke, dị ka ịga ọmụmụ ihe, ozi ọma, ịmụ ihe nke onwe anyị, na ọmụmụ ihe ezinụlọ. Anyị nwekwara ike dekọọ awa ole anyị ji tụrụ ndụ n’izu ahụ, ya bụ, oge anyị ji megaa ahụ́, lee tiivi, ma ọ bụ gwuo egwuregwu vidio. Anyị nweziri ike chọpụta nke ka ibe ya. Gịnị ka ihe anyị chọpụtara nwere ike igosi anyị? Ọ̀ ga-abụ na anyị kwesịrị ibelata awa ole anyị ji atụrụ ndụ?—Gụọ Ndị Efesọs 5:15, 16.

14. Olee ihe ga-enyere anyị aka ikpebi ụdị ihe anyị ga-eji na-atụrụ ndụ?

14 Onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie ihe ọ ga-eji na-atụrụ ndụ ma ọ bụrụhaala na ọ bụghị ụdị ihe ga-eme ka o mebie iwu Chineke. * Otú ahụkwa ka ndị isi ezinụlọ kwesịrị ime. Ezigbo ntụrụndụ bụ “onyinye Chineke” nyere anyị. (Ekli. 3:12, 13) Anyị makwa na nke dị Okeke mma nwere ike ọ gaghị adị Okafọ mma. (Gal. 6:4, 5) Ntụrụndụ ọ sọkwara anyị họrọ, anyị ekwesịghị ikwe ka o mee ka anyị leghara ihe ndị ka mkpa anya. Jizọs sịrị: “N’ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.” (Mat. 6:21) N’ihi ya, otú anyị si jiri obi anyị niile hụ Jizọs n’anya ga-eme ka anyị na-agbalịsi ike ka echiche anyị, okwu anyị, na omume anyị gosi na anyị ji ihe gbasara Alaeze Chineke kpọrọ ihe karịa ihe ndị ọzọ anyị na-eme kwa ụbọchị.—Fil. 1:9, 10.

ACHỤLA AKỤNỤBA ỌNWỤ ỌNWỤ

15, 16. (a) Olee otú ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ nwere ike isi ghọọrọ Onye Kraịst ọnyà? (b) Olee ezigbo ndụmọdụ Jizọs nyere gbasara akụnụba?

15 Ihe ọgbara ọhụrụ na-agba ọtụtụ ndị ara, ma efe ma ekwentị ma kọmputa ma ihe ndị ọzọ. N’ihi ya, Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịna-eme, ya nọtụ, ya echebara onwe ya echiche, ma jụọ onwe ya, sị: ‘Ihe onwunwe ọ̀ dịla m mkpa ruo  nke na m na-ewepụta oge ime nchọnchọ gbasara ụgbọala ma ọ bụ uwe ndị pụtara ọhụrụ, na-echekwa banyere ha karịa otú m na-eme n’ihe gbasara ịkwado ọmụmụ ihe? Mere nke a mere nke ọzọ ò meela ka m ghara ịna-enwe ohere ikpe ekpere ma ọ bụ ịna-agụ Baịbụl?’ Anyị chọpụta na anyị jizi ihe onwunwe kpọrọ ihe karịa Jizọs, anyị kwesịrị icheta na Jizọs kwuru, sị: “Lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla.” (Luk 12:15) Gịnị mere Jizọs ji dọọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị a?

16 Jizọs kwuru na mmadụ agaghị abụli ‘ohu nna ukwu abụọ.’ O kwukwara, sị: “Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” Ihe kpatara ya bụ na “nna ukwu” nke ọ bụla chọrọ ka anyị fee naanị ya. (Mat. 6:24) Jizọs kwuru na ihe anyị ga-eme bụ ‘ịkpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya,’ ma ọ bụ ‘rapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya.’ Ebe anyị na-ezughị okè, anyị niile kwesịrị ịna-alụso “ọchịchọ anụ ahụ́ anyị” ọgụ, ma ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ.—Efe. 2:3.

17. (a) Ihe anụ ahụ́ baa mmadụ n’ụmị, gịnị mere ọ ga-eji siere ya ike ịna-ele ihe onwunwe anya otú kwesịrị ekwesị? (b) Olee ihe ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-achụ akụnụba ọnwụ ọnwụ?

17 Ihe anụ ahụ́ baa mmadụ n’ụmị, ọ ga-esiri ya ike ịna-ele ihe onwunwe anya otú kwesịrị ekwesị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe onwunwe eriela ya isi. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 2:14.) Ọ maghịzi ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. (Hib. 5:11-14) Ụdị ihe ahụ emeela ka ụfọdụ ndị na-achụ akụnụba ka à na-anwụ anwụ. Nke ọ bụla ha nwetara anaghị eju ha afọ. Ha ana-achọkwu ọzọ. (Ekli. 5:10) Obi dị anyị ụtọ na Chineke enyela anyị ihe e ji agwọ ụdị ọrịa ahụ. Ọ bụ Okwu ya bụ́ Baịbụl. Anyị kwesịrị ịna-agụchi ya anya. (1 Pita 2:2) Ịtụgharị uche n’eziokwu Chineke nyeere Jizọs aka imeri ọnwụnwa. Otú ahụ ka ime ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere anyị aka ka anyị ghara ịna-achụ akụnụba ọnwụ ọnwụ. (Mat. 4:8-10) Anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị hụrụ Jizọs n’anya karịa ihe onwunwe.

Olee ihe ndị i weere ka ihe kacha mkpa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18. Gịnị ka i kpebiri ime?

18 Mgbe Jizọs jụrụ Pita, sị: “Ị̀ hụrụ m n’anya karịa ihe ndị a?” ọ chọrọ ichetara Pita na o kwesịrị iwere ihe gbasara ofufe Chineke ka ihe kacha mkpa. Aha ahụ bụ́ Pita pụtara “Nkume.” E nwere ike iji àgwà ọma ndị Pita nwere tụnyere nkume siri ezigbo ike. (Ọrụ 4:5-20) Otú ahụkwa ka anyị kwesịrị ikpebisi ike na anyị agaghị akwụsị ịhụ Jizọs n’anya, nakwa na anyị agaghị ekwe ka ọrụ ego, ntụrụndụ, na ihe onwunwe megharịa anyị anya. Ka ihe ndị anyị na-ekpebi ime kwa ụbọchị gosi na ọ dị anyị otú ọ dị Pita, mgbe ọ sịrị Jizọs: “Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị n’anya nke ukwuu.”

^ para. 14 Gụọ isiokwu bụ́ “Ntụrụndụ Ị Na-enwe Ọ̀ Na-abara Gị Uru?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Ọktoba 15, 2011, peeji nke 9 ruo nke 12, paragraf nke 6 ruo nke 15.