Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mee 2017

Otú Geyọs Si Nyere Ụmụnna Ya Aka

Otú Geyọs Si Nyere Ụmụnna Ya Aka

NÁ NGWỤCHA oge ndịozi Jizọs, e nwere nsogbu ndị bịaara Geyọs na ụmụnna ndị ọzọ. Ndị na-akụzi ihe na-abụghị eziokwu chọrọ itisa ọgbakọ, mee ka okwukwe ụmụnna nyụọ ka ọkụ. (1 Jọn 2:18, 19; 2 Jọn 7) Otu nwoke aha ya bụ Dayọtrefis nọ na-ekwu “okwu ọjọọ” banyere Jọn onyeozi na ndị ọzọ. Ọ naghị ekwe ele ụmụnna bịara ileta ọgbakọ ọbịa. Ọ na-agbakwa mbọ ka ndị ọzọ na-eme ka ya. (3 Jọn 9, 10) Ọ bụ ihe ndị a nọ na-eme mgbe Jọn degaara Geyọs akwụkwọ ozi n’ihe dị ka n’afọ 98. A na-akpọ akwụkwọ ozi a “Jọn nke Atọ.” Ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

Geyọs ji obi ya niile na-efe Jehova n’agbanyeghị nsogbu ndị ahụ bịaara ya. Olee otú o si gosi na o ji obi ya niile na-efe Jehova? Gịnị mere anyị ji kwesị iṅomi Geyọs? Olee otú akwụkwọ ozi Jọn dere ga-esi enyere anyị aka ime otú ahụ?

AKWỤKWỌ OZI JỌN DEGAARA EZIGBO ENYI YA

Onye dere Jọn nke Atọ kpọrọ onwe ya “okenye.” Ihe a mere ka Geyọs, bụ́ onye o weere ka nwa ya ọ hụrụ n’anya, mata na ọ bụ Jọn onyeozi. Jọn kpọrọ Geyọs, ‘onye m hụrụ n’anya n’ezie.’ O kwuziri na ya nwere olileanya na okwukwe Geyọs siri ike otú ahụ o nwere ahụ́ ike. Ihe a o kwuru gosiri na ọ jara Geyọs mma.—3 Jọn 1, 2, 4.

O nwere ike ịbụ na Geyọs bụ okenye n’ọgbakọ, ma e kwughị ya hoo haa n’akwụkwọ ozi ahụ. Jọn jara Geyọs mma maka ile ụmụnna ọbịa n’agbanyeghị na ọ hụtụbeghị ha. Jọn weere ya na ihe a Geyọs mere gosiri na o kwesịrị ntụkwasị obi ebe ọ bụ na kemgbe ụwa, ile ọbịa so n’ihe e ji mara ndị na-efe Chineke.—Jen. 18:1-8; 1 Tim. 3:2; 3 Jọn 5.

Otú Jọn si jaa Geyọs mma maka ọbịa o lere ụmụnna gosiri na Ndị Kraịst na-esikarị n’ebe Jọn nọ gaa leta ọgbakọ dị iche iche, lọtakwa. Ọ ga-abụ na ha na-akọrọ Jọn ihe ha hụrụ. O nwere ike ịbụ otú ahụ ka Jọn si nụ ihe na-eme n’ọgbakọ ndị ahụ.

Ndị Kraịst ndị gara ileta ọgbakọ ọzọ kwesịrị ịnọ n’ụlọ ụmụnna. A na-elekarị ụlọ ndị njem anya ọjọọ. A naghị elekọta ndị na-ehi na ya nke ọma. A na-aṅụkwa omume rụrụ arụ ka mmiri n’ebe ahụ. N’ihi ya, o kwe omume, ndị njem ma ihe na-anọ n’ụlọ ndị enyi ha; Ndị Kraịst ndị na-aga ileta ọgbakọ ọzọ na-anọ n’ụlọ ụmụnna.

 “HA GAWARA N’IHI AHA YA”

Jọn gwara Geyọs ka o lee ụmụnna ọbịa ọzọ, n’ihi na Jọn gwara ya na ‘mgbe ụmụnna ndị ahụ na-ala,’ ka o meso ha otú Chineke chọrọ. Ihe ọ pụtara bụ na ọ ga-enye ha ihe ha ga-eri n’ụzọ nakwa ihe ga-ezuru ha ruo mgbe ha ga-agaru ebe ha na-aga. O doro anya na Geyọs emeela otú ahụ mgbe ụmụnna bịara leta ya, ebe ọ bụ na ha kọọrọ Jọn gbasara ịhụnanya Geyọs na okwukwe ya.—3 Jọn 3, 6.

O nwere ike ịbụ na ndị ọbịa ndị ahụ bụ ndị ozi ala ọzọ, ndị Jọn dunyere ozi, ma ọ bụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ bụ ozi ọma mere ka ha palie njem. Jọn kwuru, sị: “Ha gawara n’ihi aha ya.” (3 Jọn 7) Jọn ebula ụzọ kwuo gbasara Chineke n’amaokwu nke isii. N’ihi ya, ọ dị ka ọ̀ bụ aha Jehova ka Jọn bu n’obi kwuo “n’ihi aha ya.” O doro anya na ụmụnna ndị ahụ nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, kwesịkwa ka a nabata ha. Ọ bụ ya mere Jọn ji dee, sị: “Anyị ji ụgwọ ịnabata ndị dị otú ahụ nke ọma, ka anyị wee ghọọ ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ n’eziokwu ahụ.”—3 Jọn 8.

JỌN NYEERE GEYỌS AKA MGBE NSOGBU BỊAARA YA

Ihe mere Jọn ji degara Geyọs akwụkwọ ozi ahụ abụghị naanị ka o kelee ya. Jọn chọkwara inyere ya aka imeri nsogbu tara akpụ. N’ihi ihe ụfọdụ, otu nwanna aha ya bụ Dayọtrefis achọghị ịna-ele ụmụnna bịara ileta ọgbakọ ọbịa. Ọ gbalịdịrị igbochi ndị ọzọ ile ha ọbịa.—3 Jọn 9, 10.

O doro anya na Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi agaghị achọ ịnọ n’ụlọ Dayọtrefis ọ bụrụgodị na o kwere ha omume. Ọ chọrọ ịnọ n’ọkwá kachanụ n’ọgbakọ. O nweghị ihe o ji ihe Jọn kwuru kpọrọ. Ọ na-ekwukwa okwu ọjọọ gbasara Jọn onyeozi na ndị ọzọ. Jọn ekwughị na Dayọtrefis na-akụzi ihe na-abụghị eziokwu. Ma ọ naghị ekwe ka e mee ihe Jọn kwuru. Otú Dayọtrefis si jiri aka abụọ na-azọ ọkwá nakwa ụdị àgwà ndị ụwa ọ na-akpa gosiri na ọ naghị erubere Chineke isi. Ihe o mere na-egosi na nwanna nwee oké ọchịchọ ma ọ bụ dị mpako, o nwere ike itisa ọgbakọ. Ọ bụ ihe mere Jọn ji gwa Geyọs ka ọ ghara ‘ịna-eṅomi ihe ọjọọ.’ Ihe a o kwuru gbasakwara onye ọ bụla n’ime anyị.—3 Jọn 11.

IHE MAGBURU ONWE YA MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊNA-EME IHE ỌMA

Jọn kwuru na otu nwanna aha ya bụ Dimitriọs emeghị ka Dayọtrefis. Jọn dere, sị: “Ha niile gbaara Dimitriọs àmà . . . N’ezie, anyị onwe anyị na-agbara ya àmà, ị makwaara na àmà anyị na-agba bụ eziokwu.” (3 Jọn 12) Ọ ga-abụ na Dimitriọs chọrọ ka Geyọs nyere ya aka. O nwekwara ike ịbụ na Jọn ji akwụkwọ ozi ya nke atọ kọwaara Geyọs onye Dimitriọs bụ nakwa na ọ bụ ezigbo nwanna. Ọ dị ka ọ̀ bụ Dimitriọs gara nye Geyọs akwụkwọ ozi ahụ. Ebe Dimitriọs so ná ndị Jọn na-edunye ozi, bụrụkwa onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ma eleghị anya, o nwere ike ịbụ na o mesikwuru ihe Jọn dere ike.

Gịnị mere Jọn ji gbaa Geyọs ume ka ọ na-ele ọbịa ebe ọ bụ na ọ na-eme otú ahụ? Jọn ọ̀ chọpụtara na e kwesịrị imesikwu Geyọs obi ike? Ọ̀ ga-abụ na ọ na-echegbu onwe ya na Geyọs nwere ike kwụsị ile ọbịa n’ihi na Dayọtrefis chọrọ ịchụpụ ụmụnna ndị na-ele ọbịa n’ọgbakọ? Nke ọ bụla ọ bụ, Jọn mesikwuru Geyọs obi ike, sị: “Onye na-eme ihe ọma sitere na Chineke.” (3 Jọn 11) Ọ bụ ya bụ ihe magburu onwe ya mere anyị ji kwesị ịna-eme ihe ọma n’adaghị mbà.

Akwụkwọ ozi a Jọn dere ò mere ka Geyọs ghara ịkwụsị ile ụmụnna ọbịa? Anyị nwere ike ikwu na o mere otú ahụ ebe ọ bụ na Jọn nke Atọ mechara soro n’akwụkwọ ndị dị na Baịbụl iji gbaa ndị ọzọ ume ka ha “na-eṅomi ihe ọma.”

 IHE NDỊ ANYỊ MỤTARA NA JỌN NKE ATỌ

O nweghị ihe ọzọ anyị ma banyere Geyọs, bụ́ ezigbo nwanna anyị biri n’oge ochie. Ma, obere ihe a Baịbụl kọrọ gbasara ya na-akụziri anyị ọtụtụ ihe.

Olee ụzọ dị iche iche anyị ga-esi ‘na-ele ọbịa’?

Nke mbụ, e nwere ike ikwu na ihe mere ọtụtụ n’ime anyị ji mụta eziokwu Baịbụl bụ na e nwere ụmụnna wepụtara onwe ha bịa kụziere anyị ya. O doro anya na ọ bụghị ụmụnna niile taa na-aga ebe dị anya n’ihi ozi ọma. Ma, anyị nwere ike ịna-akwado ndị na-aga ebe dị iche iche ma na-agba ha ume, dị ka onye nlekọta sekit na nwunye ya. Ọ bụ ihe Geyọs mere. Anyị nwekwara ike ịna-enyere ụmụnna ndị kwagara n’obodo ọzọ aka, ma ọ bụ ná mba ha ma ọ bụ ná mba ọzọ, bụ́ ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. N’ihi ya, ka anyị ‘na-ele ọbịa.’—Rom 12:13; 1 Tim. 5:9, 10.

Nke abụọ, o kwesịghị iju anyị anya ma e nwee ndị na-ekweghị eme ihe e kwuru ka e mee n’ọgbakọ, ọ bụ eziokwu na ụdị ihe ahụ anaghị emekarị. E nwere ndị na-ekweghị eme ihe Jọn kwuru ka e mee. Ụfọdụ mekwara Pọl otú ahụ. (2 Kọr. 10:7-12; 12:11-13) Gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ma anyị hụ ndị na-eme otú ahụ n’ọgbakọ? Pọl gwara Timoti, sị: “Ohu nke Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị ịbụ onye na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ, onye ruru eru izi ihe, onye na-ejide onwe ya mgbe ọnọdụ dị njọ, jiri nwayọọ na-ezi ndị isi ike ihe.” Anyị jide onwe anyị ma a kpasuo anyị iwe, o nwere ike ime ka ụfọdụ ndị na-akatọ ndị ọzọ jiri nwayọọ nwayọọ gbanwee àgwà ha. Jehova nwere ike ime “ka ha nwee nchegharị nke na-eduga n’ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—2 Tim. 2:24, 25.

Nke atọ, anyị hụ ụmụnna ndị na-erubere Jehova isi n’agbanyeghị na a na-emegide ha, anyị kwesịrị ịna-aja ha mma maka ya. O doro anya na Jọn onyeozi gbara Geyọs ume ma mesie ya obi ike na ọ na-eme ihe dị mma. Otú ahụ ka ndị okenye kwesịkwara ịna-eme. Ha kwesịrị ịna-agba ụmụnna ume ka ha ghara ‘ịda mbà.’—Aịza. 40:31; 1 Tesa. 5:11.

N’asụsụ Grik e ji dee Baịbụl, okwu ndị dị n’akwụkwọ ozi a Jọn degaara Geyọs dị naanị narị abụọ na iri na itoolu. N’ihi ya, ọ bụ akwụkwọ a kacha ntakịrị n’akwụkwọ ndị dị na Baịbụl. Ma, ọ baara Ndị Kraịst ezigbo uru n’oge anyị a.