Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mee 2017

Ekwela Ka Ịhụnanya Gị Nyụọ Ka Ọkụ

Ekwela Ka Ịhụnanya Gị Nyụọ Ka Ọkụ

“N’ihi ịba ụba nke mmebi iwu, ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.”—MAT. 24:12.

ABỤ: 60, 135

1, 2. (a) Olee ndị mbụ ihe Jizọs kwuru na Matiu 24:12 mezuru n’isi ha? (b) Olee otú akwụkwọ Ọrụ Ndịozi si gosi na ọtụtụ Ndị Kraịst ekweghị ka ịhụnanya ha nyụọ ka ọkụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

OTU n’ime ihe ndị Jizọs kwuru a ga-eji mata “ọgwụgwụ usoro ihe a” bụ na ‘ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụ oyi.’ (Mat. 24:3, 12) N’oge ndịozi Jizọs, ndị Juu kwuru na ha na-efe Chineke, ma ha kwere ka ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ nyụọ ka ọkụ.

2 Ma, ọtụtụ Ndị Kraịst n’oge ahụ ji obi ha niile “na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst,” na-emekwa ihe gosiri na ha hụrụ Chineke, Ndị Kraịst ibe ha, na ndị na-ekweghị ekwe n’anya. (Ọrụ 2:44-47; 5:42) Ma, ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ahụ kwere ka ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ nyụọ ka ọkụ.

3. Olee ihe ọ ga-abụ ya mere ka ịhụnanya ụfọdụ Ndị Kraịst nyụọ ka ọkụ?

3 Mgbe Jizọs laghachichara n’eluigwe, ọ gwara ọgbakọ dị n’Efesọs, sị: “Ihe i mere nke na-adịghị m mma bụ na ị hapụwo ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ.” (Mkpu. 2:4) Gịnị mere o ji gwa ha ihe a? O nwere ike ịbụ na Ndị Kraịst ndị ahụ kwere  ka ndị ụwa mee ka ha mewe ihe anụ ahụ́ ha chọrọ. (Efe. 2:2, 3) Omume ọjọọ juru n’Efesọs n’oge ahụ otú o juru n’ọtụtụ obodo taa. Efesọs bụ obodo bara ezigbo ọgaranya. Ihe bụ́ mkpa ndị bi na ya bụ ibi ndụ okomoko, ịtụrụ ndụ, na ikpori ndụ. Ọ dị ka ihe nke ụwa ò mere ka ha ghara ịhụ Chineke n’anya. Omume rụrụ arụ jọgburu onwe ya jukwara ebe niile.

4. (a) Olee ụzọ dị iche iche ịhụnanya ndị mmadụ si na-anyụ ka ọkụ n’oge anyị a? (b) Olee ihe atọ nwere ike ime ka a mata ma ànyị nwere ịhụnanya?

4 Amụma ahụ Jizọs buru na ịhụnanya ndị mmadụ ga-ajụ oyi na-emezukwa n’oge anyị a. Ọtụtụ ndị taa ahụghịzi Chineke n’anya. Ọtụtụ nde mmadụ agbakụtala ya azụ, chewezie na ọ bụ òtù dị iche iche ndị mmadụ hiwere ga-ewepụ nsogbu ụmụ mmadụ. Ọ bụ ihe mere ịhụnanya ndị na-anaghị efe Jehova Chineke ji na-anyụ ka ọkụ. Ma, ezigbo Ndị Kraịst nwekwara ike chee na ụwa zuuru ha ma kwe ka ịhụnanya ha laa ka naị otú ahụ ndị nọ n’ọgbakọ dị n’Efesọs mere n’oge ochie. Ka anyị leba anya n’ihe atọ nwere ike ime ka a mata ma ànyị nwere ịhụnanya. Nke mbụ bụ ịhụ Jehova n’anya. Nke abụọ bụ iji eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe. Nke atọ abụrụ ịhụ ụmụnna anyị n’anya.

ỊHỤ JEHOVA N’ANYA

5. Gịnị mere anyị ji kwesị ịhụ Chineke n’anya?

5 N’otu ụbọchị ahụ Jizọs kwuru na ịhụnanya ọtụtụ ndị ga-ajụ oyi, o bula ụzọ kwuo onye anyị kwesịrị ịkacha hụ n’anya. Ọ sịrị: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ.” (Mat. 22:37, 38) Ịhụ Chineke n’anya ga-enyere anyị aka ịna-erubere iwu ya isi, na-atachi obi ma kpọọ ihe ọjọọ asị. (Gụọ Abụ Ọma 97:10.) Ma, Setan na ụwa ya na-agbalịsi ike ime ka anyị ghara ịhụ Chineke n’anya.

6. Gịnị ka otú ịhụnanya ndị mmadụ nwere n’ebe Chineke nọ si nyụọ ka ọkụ kpatarala?

6 Otú ndị ụwa si ele ịhụnanya anya abụtụdịghị ya. Kama ịhụ Chineke n’anya, ndị mmadụ “hụrụ naanị onwe ha n’anya.” (2 Tim. 3:2) Ụwa a Setan na-achị na-eme ka ihe kacha ndị mmadụ mkpa bụrụ “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ.” (1 Jọn 2:16) Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị ka ihe kacha ha mkpa ghara ịbụ ime ihe anụ ahụ́ ha chọrọ. Ọ sịrị: “Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ọnwụ . . . n’ihi na ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ịbụ onye iro Chineke.” (Rom 8:6, 7) N’eziokwu, ndị weere ịchụ akụnụba ma ọ bụ inwe mmekọahụ ka ihe kacha mkpa ná ndụ na-emecha chịrị obi n’aka.—1 Kọr. 6:18; 1 Tim. 6:9, 10.

7. Olee nsogbu ndị nwere ike ịkpa Ndị Kraịst aka ọjọọ taa?

7 Ndị na-ekwu na Chineke adịghị na ndị na-ekwu na a gaghị amatali ma Chineke ọ̀ dị nakwa ndị na-akụzi na e keghị mmadụ eke na-eme ka ndị mmadụ ghara ịhụ Chineke n’anya, meekwa ka ha ghara ikwere na ya. Ha emeela ka ọtụtụ ndị kweta na ọ bụ onye iberiibe ma ọ bụ onye na-agụghị akwụkwọ ga-ekweta na Chineke dị. Ihe ọzọ bụ na ndị mmadụ na-akwanyere ndị ọkà mmụta sayensị ùgwù karịa Onye kere anyị. (Rom 1:25) Anyị gewe ihe ndị ahụ, o nwere ike ime ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma, anyị akwụsịkwa ịhụ ya n’anya.—Hib. 3:12.

8. (a) Olee nsogbu ndị nwere ike ime ka ndị ohu Jehova daa mbà? (b) Olee otú ihe dị n’Abụ Ọma nke 136 ga-esi akasi anyị obi?

8 Anyị daa mbà n’obi, o nwere ike ime ka okwukwe anyị ghara isi ike, ya emezie  ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ ghara isi ike. Mgbe ụfọdụ, anyị niile na-enwe nsogbu ndị nwere ike ime ka ike gwụ anyị n’ụwa a Ekwensu na-achị. (1 Jọn 5:19) O nwere ike ịbụ na nká, ọrịa, ma ọ bụ ụkọ ego emeela ka anyị na nsogbu na-alụ ugbu a. Anyị nwekwara ike ịna-eche na e nweghị ihe anyị dị mma ya, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na anyị enwetaghị ihe anyị tụrụ anya ya. Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị ahụ mee ka anyị chee na Jehova ahapụla anyị. Kama, anyị kwesịrị ịtụgharị uche n’okwu na-agba ume e kwuru gbasara ịhụnanya Jehova na-anaghị ada ada. E dere ụfọdụ n’ime ha n’akwụkwọ Abụ Ọma 136:23, bụ́ ebe sịrị: “Onye chetara anyị mgbe e wedara anyị ala: n’ihi na obiọma ya [ma ọ bụ ịhụnanya ya na-adịghị ada ada] na-adịru mgbe ebighị ebi.” N’eziokwu, ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị ohu ya nọ anaghị ada ada. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ na-anụ “arịrịọ” anyị, na-emekwara anyị ihe anyị rịọrọ ya.—Ọma 116:1; 136:24-26.

9. Gịnị nyeere Pọl aka ka ọ ghara ịkwụsị ịhụ Chineke n’anya?

9 Ihe mere ka okwukwe Pọl sie ike bụ na o chebaara otú Jehova si na-akwado ya echiche. O dere, sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?” (Hib. 13:6) Otú a Pọl si tụkwasị Jehova obi nyeere ya aka idi nsogbu ndị bịaara ya. O kweghị ka nsogbu ya mee ka ike gwụ ya. N’eziokwu, ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ dee ọtụtụ akwụkwọ ozi o ji gbaa ụmụnna ya ume. (Efe. 4:1; Fil. 1:7; Faị. 1) Mgbe ezigbo ọnwụnwa bịaara ya, ọ kwụsịghị ịhụ Chineke n’anya. Gịnị nyeere ya aka ime otú ahụ? Ọ bụ ịtụkwasị “Chineke nke nkasi obi niile” obi, bụ́ “onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.” (2 Kọr. 1:3, 4) Olee otú anyị ga-esi ṅomie Pọl ma mee ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ sie ike?

Gosi na ị hụrụ Jehova n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Olee otú anyị ga-esi eme ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ sie ike?

10 Pọl kwuru otu ụzọ kacha mkpa anyị nwere ike isi mee ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ sie ike. O degaara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ ozi, sị: “Na-ekpenụ ekpere n’akwụsịghị akwụsị.” O mechara deekwa, sị: “Nọgidesienụ ike n’ekpere.” (1 Tesa. 5:17; Rom 12:12) Ịgwa Chineke okwu n’ekpere bụ otú anyị na ya ga-esi na-adị n’ezigbo mma. (Ọma 86:3) Anyị wepụtakwuo oge na-agwa Jehova otú obi dị anyị, ọ ga-eme ka anyị bịarukwuo Nna anyị nke eluigwe, bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” nso. (Ọma 65:2) Ihe ọzọ bụ na anyị hụ otú Jehova si zaa ekpere anyị, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya. Ọ ga-edokwu anyị anya na “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso.” (Ọma 145:18) Inwe ụdị obi ike ahụ n’ebe Jehova nọ ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị ọzọ nwere ike ịbịara anyị n’ọdịnihu.

IJI EZIOKWU BAỊBỤL KPỌRỌ IHE

11, 12. Olee ihe anyị ga-eme ka eziokwu Baịbụl nwee ike ịna-atọ anyị ezigbo ụtọ?

11 Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị ejighị eziokwu eti epele. Ọ bụ n’Okwu Chineke ka eziokwu dị. Jizọs gwara Nna ya n’ekpere, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) N’ihi ya, anyị chọọ iji eziokwu kpọrọ ihe, anyị ga-ebu ụzọ mụta ihe Baịbụl na-akụzi. (Kọl. 1:10) Ma, naanị ịmụ Baịbụl buru n’isi abụghị ebe okwu biri. Buru n’obi otú onye dere Abụ Ọma nke 119 si nyere anyị aka ịghọta ihe mmadụ iji eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe pụtara. (Gụọ Abụ Ọma 119:97-100.) Ànyị na-ewepụta oge na-atụgharị uche n’amaokwu Baịbụl n’ụbọchị dum? Anyị ga-eji eziokwu Baịbụl kpọrọkwuo  ihe ma anyị na-atụgharị uche n’uru ime ihe o kwuru na-abara anyị.

12 Ọbụ abụ ahụ kwukwara, sị: “Lee ka okwu gị si atọ okpo ọnụ m ụtọ, ọ dị m ụtọ n’ọnụ karịa mmanụ aṅụ!” (Ọma 119:103) Otú ahụ ka akwụkwọ ndị nzukọ Chineke na-ewepụtara anyị kwesịrị ịna-atọru anyị n’ụmị ọkpụkpụ. Anyị kwesịrị iwetu obi na-amụ ha ka anyị nwee ike ịna-echeta “okwu dị ụtọ,” bụ́ eziokwu dị na ha, jirikwa ya na-enyere ndị ọzọ aka.—Ekli. 12:10.

13. Gịnị nyeere Jeremaya aka iji eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ihe, oleekwa uru ọ baara ya?

13 Jeremaya onye amụma ejighị eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ gwuo egwu. Chegodị otú o mere ka obi dị ya. O dere, sị: “Okwu gị ruru m aka, m wee rie ya; okwu gị wee bụrụ ihe na-enye m ọṅụ na ihe na-eme ka obi tọọ m ụtọ; n’ihi na a kpọkwasịwo m aha gị, Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha.” (Jere. 15:16) Jeremaya riri Okwu Chineke ka nri, ya abaa ya n’ọbara. Otú o si mee ya bụ ịtụgharị uche na ya, nke mere ka o jiri aha Chineke a kpọkwasịrị ya kpọrọ ihe. Iji eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe ò meela ka anyị ghọta na aha Chineke anyị na-aza na Alaeze ya anyị na-ekwusa n’oge ikpeazụ a bụ ihe ùgwù pụrụ iche?

Gosi na i ji eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị jiri eziokwu Baịbụl kpọrọkwuo ihe?

14 E wezụga ịgụ Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, olee ihe ọzọ anyị ga-eme ka anyị jiri eziokwu Baịbụl kpọrọkwuo ihe? Ọ bụ ịgachi ọmụmụ ihe anya. Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche anyị na-enwe kwa izu so n’otú kachanụ e si akụziri anyị ihe. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọta isiokwu nke ọ bụla a na-amụ, anyị kwesịrị ịkwadebe ya nke ọma. Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịgụ amaokwu Baịbụl nke ọ bụla dị n’isiokwu ahụ. Ugbu a, e nwere ike isi na jw.org/ig nweta Ụlọ Nche ma ọ bụ si na JW Library gụọ ya n’ọtụtụ asụsụ. E nwere ụdị nke ị ga-emepe n’ebe ahụ, gị enwee ike ịgụ amaokwu Baịbụl ndị dị n’isiokwu a na-amụ amụ ozugbo ị dụrụ ya aka. Ma, otú ọ bụla anyị si na-amụ ya, ịgụ amaokwu Baịbụl ndị dị na ya ma na-atụgharị  uche na ha ga-eme ka anyị jiri eziokwu Baịbụl kpọrọkwuo ihe.—Gụọ Abụ Ọma 1:2.

ỊHỤ ỤMỤNNA ANYỊ N’ANYA

15, 16. (a) Olee iwu e nyere anyị na Jọn 13:34, 35? (b) Olee otú ịhụ ụmụnna anyị n’anya si gbasa ịhụ Jehova n’anya na iji eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe?

15 N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:34, 35.

16 E nwere ihe jikọrọ ịhụ ụmụnna anyị n’anya na ịhụ Jehova n’anya. N’eziokwu, ma anyị ahụghị ụmụnna anyị n’anya, anyị agaghị ahụli Chineke n’anya. Jọn onyeozi dere, sị: “Onye na-ahụghị nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụ anya, apụghị ịhụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-adịghị ahụ anya.” (1 Jọn 4:20) Ịhụ Jehova na ụmụnna anyị n’anya gbasakwara iji eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na iji eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe ga-eme ka anyị jiri obi anyị niile hụ Chineke na ụmụnna anyị n’anya otú ahụ Baịbụl gwara anyị mee.—1 Pita 1:22; 1 Jọn 4:21.

Gosi na ị hụrụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Gịnị na gịnị ka anyị nwere ike ime iji gosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya?

17 Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 4:9, 10. Olee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịna-eme iji gosi na anyị hụrụ ndị ọgbakọ anyị n’anya? Nwanna merela agadi nwere ike ịna-achọ onye ga na-ebuga ya ọmụmụ ihe. Nwanna nwaanyị di ya nwụrụ nwere ike ịchọ ka a rụzie ihe ụfọdụ n’ụlọ ya. (Jems 1:27) Ma ànyị bụ ndị na-eto eto ma ànyị bụ ndị agadi, e nwee ụmụnna dara mbà n’obi ma ọ bụ ndị ha na nsogbu na-alụ, anyị kwesịrị inyere ha aka, gbaa ha ume ma kasie ha obi. (Ilu 12:25; Kọl. 4:11) Anyị ga-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya ma anyị jiri okwu ọnụ anyị na omume anyị gosi na ihe banyere “ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe” na-emetụ anyị n’obi.—Gal. 6:10.

18. Gịnị ga-enyere anyị aka idozi nghọtahie anyị na ụmụnna anyị nwere?

18 Baịbụl kwuru na ihe a ga-eji mara ‘oge ikpeazụ’ bụ na ndị mmadụ ga-abụ ndị anyaukwu, na-achọkwa ihe ga-abara naanị ha uru. (2 Tim. 3:1, 2) Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị na-ahụkwu Chineke na ụmụnna anyị n’anya, jirikwa eziokwu Baịbụl kpọrọkwuo ihe. N’eziokwu, anyị na ụmụnna anyị nwere ike inwe nghọtahie mgbe ụfọdụ. Ma, ebe anyị hụrụ ibe anyị n’anya, anyị kwesịrị ịgba mbọ jiri obiọma dozie ya n’egbughị oge. (Efe. 4:32; Kọl. 3:14) N’ihi ya, ka anyị ghara ikwe ka ịhụnanya anyị nyụọ ka ọkụ. Kama, ka anyị na-ahụ Jehova na ụmụnna anyị n’anya ma jiri Okwu ya kpọrọ ihe.