Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mach 2017

Nwee Okwukwe, Jiri Amamihe Na-ekpebi Ihe Ị Ga-eme

Nwee Okwukwe, Jiri Amamihe Na-ekpebi Ihe Ị Ga-eme

“Jiri okwukwe na-arịọ, n’enweghị obi abụọ ma ọlị.”—JEMS 1:6.

ABỤ: 81, 70

1. Gịnị mere Ken ji kpebie ime ihe na-adịghị mma? Gịnị ka ọ kpataara ya?

KEN kwesịrị ikpebi ihe ọ ga-eme. Ọ bụ ya ga-ekpebi ma ọ̀ ga-ahapụ ime ihe ọjọọ dị ya n’obi, ka ọ̀ ga-eme ihe obi ya gwara ya. Ihe o kpebiri ime ga-abara ya uru ma ọ bụ ghọ ya ahịa ná ndụ ya niile. Ị manụ ihe Ken mechara kpebie; o meghị ihe o kwesịrị ime. Ihe o kpebiri ime na ihe o mechara mee mere ka o gbuo nwanne ya Ebel bụ́ onye ezi omume. Ihe ahụ Ken kpebiri mekwara ka ya na Onye kere ya ghara ịdị ná mma.—Jen. 4:3-16.

2. Gịnị mere ikpebi ime ihe dị mma ji dị mkpa?

2 E nwekwara ihe ndị anyịnwa kwesịrị ịna-ekpebi. Ụfọdụ n’ime ha na-adị ezigbo mkpa, ụfọdụ anaghị adị. Ma, ọtụtụ n’ime ha nwere ike ịbara anyị uru ná ndụ ma ọ bụ ghọ anyị ahịa. Anyị kpebie ime ihe dị mma, o nwere ike ime ka anyị ghara inwe ọtụtụ nsogbu. Obi ga-erukwa anyị ala. Ma anyị kpebie ime ihe na-adịghị mma, o nwere ike ịkpatara anyị ọtụtụ nsogbu, meekwa ka obi koro anyị n’elu.—Ilu 14:8.

3. (a) Olee ihe anyị kwesịrị inwe okwukwe na ya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-ekpebi ihe dị mma? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

3 Olee ihe ga-enyere anyị aka ikpebi ime ihe dị mma? Anyị  kwesịrị inwe okwukwe na Chineke. O kwesịghị imewe anyị obi abụọ na ọ chọrọ inyere anyị aka nakwa na ọ ga-enye anyị amamihe anyị ga-eji kpebie ime ihe dị mma. Anyị kwesịkwara inwe okwukwe n’Okwu Jehova nakwa n’ihe ndị ọ na-eme, obi esiekwa anyị ike na ndụmọdụ ya ga-abara anyị uru. (Gụọ Jems 1:5-8.) Ka anyị na-abịarukwu Jehova nso, jirikwa Okwu ya kpọrọkwuo ihe, anyị na-atụkwasị ihe ndị o kwuru obi. N’ihi ya, anyị ga-amụta ịna-eleba anya n’Okwu Chineke tupu anyị ekpebie ihe anyị ga-eme. Ma, olee otú anyị ga-esi na-emekwu nke ọma n’ikpebi ihe ndị anyị na-eme? Ọ̀ pụtara na anyị kpebihaala ihe anyị ga-eme, anyị agaghị agbanwe ya?

ANYỊ NIILE NA-EKPEBI IHE ANYỊ GA-EME

4. Olee ihe Adam kwesịrị ikpebi, gịnịkwa ka ihe o kpebiri kpataara ya?

4 Kemgbe ụwa, ụmụ mmadụ na-ekpebi ihe ndị dị mkpa ha ga-eme. Adam kwesịrị ikpebi ma ọ̀ ga-ege nwunye ya ntị ka ọ̀ ga-ege Chineke ntị. Ọ dị njikere ikpebi ihe ọ ga-eme. Ma, olee ihe i chere gbasara ihe ahụ o mere? Nwunye ya e duhiere eduhie mere ka o kpebie ime ihe jọgburu onwe ya, nke mere ka o tụfuo Paradaịs Chineke nyere ya, ya emechaakwa nwụọ. Ma, ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri. Anyị ka na-ata ahụhụ ihe ọjọọ ahụ Adam mere.

5. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ikpebi ihe anya?

5 Ụfọdụ nwere ike ịna-eche na ndụ ga-aka ụtọ ma a sị na anyị anaghị ekpebi ihe anyị ga-eme. Ị̀ na-eche otú ahụ? Cheta na Jehova ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-eme ka robọt na-anaghị eche echiche ma ọ bụ ekpebi ihe ọ na-eme. N’eziokwu, Baịbụl na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-ekpebi ihe dị mma. Ọ bụ eziokwu na Jehova chọrọ ka anyị na-ekpebi ihe anyị ga na-eme, ma ọ chọghị ka ọ kpatara anyị nsogbu. Ka anyị leba anya n’ihe gosiri na ọ bụ eziokwu.

6, 7. Olee ihe ndị Izrel oge ochie kwesịrị ikpebi? Gịnị mere o ji siere ha ike ikpebi ime ihe dị mma? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

6 Ozugbo ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa, ha kwesịrị iji aka ha kpebie ma hà ga na-efe Jehova, ka hà ga na-efe chi ndị ọzọ. (Gụọ Jọshụa 24:15.) O nwere ike iyi ihe na-esighị ike ikpebi. Ma, ihe ha kpebiri ga-eme ka ha dị ndụ ma ọ bụ nwụọ. N’oge Ndị Ikpe, ndị Izrel kpebiri ime ihe na-adịghị mma ugboro ugboro. Ha hapụrụ Jehova fewe arụsị. (Ikpe 2:3, 11-23) I nwekwara ike icheta oge ọzọ ndị Izrel kwesịrị ikpebi ihe ha ga-eme. Ịlaịja onye amụma gwara ha hoo haa ihe ha ga-eme, ya bụ, ife Jehova ma ọ bụ ife Bel. (1 Eze 18:21) Ịlaịja baara ha mba maka na ha amaghị nke ha ga-eme eme. I nwere ike iche na ọ dị mfe ikpebi ihe ha ga-eme n’ihi na ife Jehova na-aba uru mgbe niile. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị onye ma ihe kwesịrị ịga fewe Bel. Ma, ndị Izrel nọ “na-enwe echiche abụọ dị iche.” Ịlaịja gwara ha ka ha kpebie ife ezi Chineke bụ́ Jehova.

7 Gịnị nwere ike ime ka o siere ndị Izrel ike ikpebi ime ihe dị mma? Nke mbụ bụ na ha enweghịzi okwukwe na Jehova, ha ekweghịkwa ege ya ntị. Ha ewepụtaghị oge mụọ banyere ya ma ọ bụ amamihe ya. Ha atụkwasịghịkwa Jehova obi. Ime ihe ha mụtara n’Okwu Chineke gaara enyere ha aka ime ihe dị mma. (Ọma 25:12) Ihe ọzọ bụ na ndị Izrel sooro ndị ọzọ na-eme ihe ha na-eme ma ọ bụdị kwe ka ha kpebiere ha ihe ha ga-eme.  Ndị bi n’ala ahụ, bụ́ ndị na-anaghị efe Jehova, mere ka ndị Izrel chewe echiche ka ha, meekwa ka ha fewe arụsị ha. Jehova ebula ụzọ dọọ ha aka ná ntị na ụdị ihe ahụ nwere ike ime.—Ọpụ. 23:2.

Ọ̀ BỤ NDỊ ỌZỌ KWESỊRỊ IKPEBIRI ANYỊ IHE ANYỊ GA-EME?

8. Olee ihe dị mkpa akụkọ ndị Izrel kwesịrị ịkụziri anyị gbasara ikpebi ihe anyị ga-eme?

8 Ihe ndị a Baịbụl kọrọ kwesịrị ịkụziri anyị ezigbo ihe. Ọ bụ onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie ihe ọ ga-eme. Ọ bụkwa ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ikpebi ime ihe dị mma. Ndị Galeshia 6:5 gwara anyị, sị: “Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.” Anyị ekwesịghị ikwe ka onye ọzọ kpebiere anyị ihe anyị ga-eme. Kama, anyị kwesịrị ịmụta ihe dị Chineke mma ma na-eme ya.

9. Gịnị mere ikwe ka ndị ọzọ kpebiere anyị ihe anyị ga-eme nwere ike iji kpatara anyị nsogbu?

9 Olee otú anyị nwere ike isi kwe ka ndị ọzọ kpebiwere anyị ihe anyị ga-eme? Ndị ọzọ nwere ike inyewe anyị nsogbu ka anyị mee ihe na-adịghị mma. (Ilu 1:10, 15) N’agbanyeghị otú ndị ọzọ si enye anyị nsogbu, ọ bụ anyị ga-eji akọnuche anyị e ji Baịbụl zụọ kpebie ihe anyị ga-eme. Ọtụtụ mgbe, ọ bụrụ na anyị ekwe ka ndị ọzọ kpebiere anyị ihe anyị ga-eme, ọ pụtara na anyị kpebiri ‘iso ha.’ Ime otú ahụ nwere ike ịkpatara anyị ezigbo nsogbu.

10. Olee aka ná ntị Pọl dọrọ ndị nọ n’ọgbakọ Galeshia?

10 Pọl onyeozi taara ndị Galeshia ụkwa, jaara ha ezé na ha kwe ka ndị ọzọ kpebiere ha ihe ha ga-eme, ọ ga-akpatara ha nsogbu. (Gụọ Ndị Galeshia 4:17.) Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ chọrọ ịna-ekpebiri ndị ọzọ ihe ha ga-eme ka ha ghara ịna-eme ihe ndịozi Jizọs kwuru. N’ihi gịnị? Ha chọrọ ịbụ ndị a ma ama. Ha mere ihe ha na-ekwesịghị ime. Ha ekweghị ahapụ ụmụnna ha ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme.

11. Olee otú anyị ga-esi nyere ndị ọzọ aka ma ha kpebiwe ihe ha ga-eme?

11 Pọl onyeozi hapụrụ ụmụnna ya ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. Anyị kwesịrị ịmụta ihe n’aka ya. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:24.) Taa, ndị okenye kwesịrị ime otú ahụ Pọl mere ma ha nyewe  mmadụ ndụmọdụ n’ihe onye ahụ kwesịrị iji aka ya kpebie. Obi na-adị ha ụtọ ịgwa ìgwè atụrụ Chineke ihe Baịbụl kwuru. Ma, ha na-ahapụ nwanna ọ bụla ka o jiri aka ya kpebie ihe ọ ga-eme. O kwesịrị ekwesị n’ihi na onye ọ bụla ga-eji isi ya buru ihe o kpebitara. Ihe dị mkpa anyị kwesịri ịmụta bụ na anyị nwere ike inyere ndị ọzọ aka ịghọta ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ha chọrọ ikpebi. Ma ọ bụ ha ga-eji aka ha kpebie ihe ha ga-eme. Ha jiri amamihe mee otú ahụ, ọ ga-abara ha uru. O doro anya na anyị ekwesịghị iche na anyị nwere ikike ikpebiri ụmụnna anyị ihe ha ga-eme.

Ndị okenye na-enyere ndị ọzọ aka ịmata otú ha ga-esi na-ekpebi ihe ha ga-eme (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

EKWELA KA OBI GỊ DUHIE GỊ MGBE Ị NA-EKPEBI IHE Ị GA-EME

12, 13. Iwe wewe anyị ma ọ bụ anyị daa mbà, gịnị mere ime ihe obi anyị gwara anyị nwere ike iji kpata nsogbu?

12 Ihe ọtụtụ ndị na-ekwukarị bụ: Mee ihe obi gị gwara gị. Ma, mmadụ mee otú ahụ, o nwere ike ịkpatara ya nsogbu. E nwere ike ikwu na ime otú ahụ dị iche n’ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara ikwe ka obi anyị na-ezughị okè ma ọ bụ ihe obi anyị na-agwa anyị megharịa anyị anya ma anyị kpebiwe ihe anyị ga-eme. (Ilu 28:26) Ihe ndị a kọrọ na Baịbụl na-eme ka anyị mata na mmadụ ime ihe obi ya gwara ya nwere ike ịkpatara ya ezigbo nsogbu. Nsogbu kachanụ bụ na obi ụmụ mmadụ na-ezughị okè “dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite.” (Jere. 3:17; 13:10; 17:9; 1 Eze 11:9) N’ihi ya, gịnị nwere ike ime ma anyị mee ihe obi anyị gwara anyị mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme?

13 Obi Onye Kraịst dị mkpa n’ihi na Baịbụl gwara anyị ka anyị jiri obi anyị niile hụ Jehova n’anya, hụkwa onye agbata obi anyị n’anya otú anyị hụrụ onwe anyị. (Mat. 22:37-39) Ma, amaokwu Baịbụl ndị e dere na paragraf bu nke a ụzọ gosiri nsogbu o nwere ike ịkpata ma mmadụ chewe ma ọ bụ mewe ihe obi ya gwara ya. Dị ka ihe atụ, gịnị nwere ike ime ma anyị kpebie ihe ndị anyị ga-eme mgbe iwe ji anyị? Anyị nwere ike ịma azịza ajụjụ a ma ọ bụrụ na anyị mere otú ahụ n’oge gara aga. (Ilu 14:17; 29:22) Ka ì chere na anyị ga-ekpebi ime ihe dị mma mgbe anyị dara mbà? (Ọnụ Ọgụ. 32:6-12; Ilu 24:10) Cheta na Okwu Chineke mere ka anyị mata na ‘ịbụ ohu n’ebe iwu Chineke dị’ na-aba uru. (Rom 7:25) O doro anya na obi anyị nwere ike iduhie anyị ma anyị jiri otú obi dị anyị kpebie ihe dị mkpa anyị ga-eme.

MGBE I KWESỊRỊ ỊGBANWE IHE I KPEBIRI

14. Olee otú anyị si mara na mmadụ ịgbanwe ihe o kpebiri ime nwere ike ikwesị ekwesị mgbe ụfọdụ?

14 Anyị kwesịrị ịna-ekpebi ime ihe dị mma. Ma ọ pụtaghị na anyị kpebihaala ihe anyị chọrọ ime, na anyị ekwesịghị ịgbanwe ya. E nwere mgbe ụfọdụ anyị kwesịrị ichebara ihe anyị kpebiri ime echiche ma gbanwee ya ma eleghị anya. Chegodị ihe Jehova mere gbasara ndị Ninive n’oge Jona. Baịbụl sịrị: “Ezi Chineke wee hụ ọrụ ha, na ha ahapụwo ụzọ ọjọọ ha; ezi Chineke wee gbanwee obi ya banyere ọdachi o kwuru na ya ga-ewetara ha; o wetaghịzi ya.” (Jona 3:10) Mgbe Jehova hụrụ na ndị Ninive echegharịala, gbanwee otú ha si ele ihe anya, ọ gbanwere ihe o kpebiri ime. Ihe ahụ o mere gosiri na o nwere ezi uche, na ọ dị umeala n’obi, nweekwa obi ọmịiko. Ihe ọzọ bụ na Chineke anaghị eji iwe dị ya n’obi otu mgbe ekpebi ihe ọ ga-eme, ya bụ, ụdị iwe ọkụ ọtụtụ ndị na-ewe taa.

15. Olee ihe ndị nwere ike ime ka anyị gbanwee ihe anyị kpebiri ime?

 15 E nwere mgbe ụfọdụ ọ ga-adị mma ka anyị gbanwee ihe anyị kpebiri ime. O nwere ike ịbụ mgbe ihe gbanwere. Mgbe ụfọdụ, Jehova gbanwere ihe o kpebiri ime n’ihi na ihe gbanwere. (1 Eze 21:20, 21, 27-29; 2 Eze 20:1-5) Ihe ọhụrụ anyị chọpụtara nwekwara ike ime ka anyị gbanwee ihe anyị kpebiri ime. Chegodị banyere Eze Devid. A gwara ya ihe na-abụghị eziokwu banyere Mefiboshet, bụ́ nwa nwa Sọl. Mgbe Devid mechara mata nke bụ́ eziokwu, ọ gbanwere ihe o kpebiri ime. (2 Sam. 16:3, 4; 19:24-29) O nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee otú ahụ mgbe ụfọdụ.

16. (a) Olee ihe ụfọdụ nwere ike inyere anyị aka ịna-ekpebi ihe ga-abara anyị uru? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ilebagharị anya n’ihe anyị kpebiri ime, oleekwa otú anyị ga-esi mee ya?

16 Baịbụl gwara anyị na e nwee ihe dị mkpa anyị chọrọ ikpebi, na anyị ekwesịghị ikpebi ya ọkụ ọkụ. (Ilu 21:5) Anyị wepụta oge chee ihe niile gbasara ya, o nwere ike ime ka ihe anyị ga-ekpebi baara anyị uru. (1 Tesa. 5:21) Tupu onyeisi ezinụlọ ekpebie ihe ọ ga-eme, o kwesịrị iwepụta oge chọpụta ihe Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl kwuru gbasara ya, chọpụtakwa ihe ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ya chere gbasara ihe ahụ. Cheta na Chineke gwara Ebreham ka o gee nwunye ya ntị. (Jen. 21:9-12) Ndị okenye kwesịkwara iwepụta oge na-eme nchọnchọ. Ha nwee ezi uche ma dị umeala n’obi, ha agaghị atụwa ụjọ na ndị ọzọ agaghịzi akwanyere ha ùgwù ma ha gbanwee ihe ha kpebiri n’ihi ihe ọhụrụ ha chọpụtara. Ha kwesịrị ịdị njikere ịgbanwe ihe ha chere na ihe ha kpebiri ime ma ọ dị mkpa. Anyị niile kwesịkwara ịna-eme ka ha. Ọ ga-eme ka udo dị n’ọgbakọ, ihe niile ana-agakwa siriri werere.—Ọrụ 6:1-4.

NA-EME IHE I KPEBIRI

17. Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe ndị anyị ga-eme?

17 Ụfọdụ ihe ndị anyị na-ekpebi na-adị mkpa karịa ndị ọzọ. Tupu anyị ekpebie ihe dị ezigbo mkpa, anyị kwesịrị ibu ụzọ chee ya echee, kpeekwa ekpere banyere ya. Ime otú ahụ nwere ike iwe oge. E nwere Ndị Kraịst na-eche ma hà ga-alụ di ma ọ bụ nwunye nakwa onye ha ga-alụ. Ihe ọzọ dị ezigbo mkpa mmadụ nwere ike ikpebi nke nwere ike ime ka ngọzi Jehova zowere ya ka mmiri bụ otú ọ ga-esi malite ozi oge niile na mgbe ọ ga-amalite ya. N’ụdị ihe a, obi kwesịrị isi anyị ezigbo ike na Jehova ga-enye anyị amamihe anyị ga-eji kpebie ihe anyị ga-eme. (Ilu 1:5) N’ihi ya, anyị kwesịrị isi na Baịbụl nweta ndụmọdụ ga-akacha baara anyị uru, rịọkwa Jehova ka o duzie anyị. Chetakwa na Jehova ga-eme ka anyị nwee àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe bụ́ uche ya. Mgbe anyị na-ekpebi ihe dị mkpa, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ihe a m kpebiri ime, ọ̀ ga-egosi na m hụrụ Jehova n’anya? Ọ̀ ga-eme ka ndị ezinụlọ m na-enwe obi ụtọ, udo adịkwa? Ọ̀ ga-egosi na m na-enwe ndidi ma dịrị obiọma?’

18. Gịnị mere Jehova ji chọọ ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme?

18 Jehova anaghị amanye anyị ịhụ ya n’anya na ife ya. Ọ bụ anyị ga-ekpebi ihe anyị ga-eme. N’ihi ya, ọ hapụrụ anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ma ànyị ga-efe ya ma ọ bụ na anyị agaghị efe ya. (Jọsh. 24:15; Ekli. 5:4) Ma ọ chọrọ ka anyị na-eme ihe ndị ọzọ anyị kpebiri ime n’ihi ihe Baịbụl gwara anyị. Anyị nwee okwukwe siri ike n’otú Jehova si eduzi anyị ma na-eme ihe ọ gwara anyị, anyị ga-enwe ike ịna-ekpebi ihe ga-abara anyị uru. Anyị ga-esikwa otú ahụ gosi na anyị kwụsiri ike n’ụzọ anyị niile.—Jems 1:5-8; 4:8.