Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mach 2017

Na-asọpụrụ Ndị E Kwesịrị Ịsọpụrụ

Na-asọpụrụ Ndị E Kwesịrị Ịsọpụrụ

“Ka ngọzi na nsọpụrụ na otuto na ike dịrị Onye ahụ nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa Atụrụ ahụ, ruo mgbe niile ebighị ebi.”—MKPU. 5:13.

ABỤ: 9, 108

1. Gịnị mere e ji kwesị ịna-asọpụrụ ụfọdụ ndị, gịnịkwa ka anyị ga-atụle ugbu a?

ỊSỌPỤRỤ mmadụ pụtara igosi onye ahụ na anyị ejighị ya egwu egwu nakwa na anyị na-akwanyere ya ùgwù. Anyị kwesịrị ịtụ anya na onye ahụ mere ihe e kwesịrị iji maka ya na-asọpụrụ ya ma ọ bụ na ọ na-arụ ọrụ pụrụ iche. N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ, sị, Ònye ka anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ? Maka gịnị?

2, 3. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-asọpụrụ Jehova karịchaa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Ná Mkpughe 5:13, ònye bụ Nwa Atụrụ ahụ, gịnịkwa mere e ji kwesị ịna-asọpụrụ ya?

2 Ihe Mkpughe 5:13 kwuru gosiri na ‘Onye ahụ nọ ọdụ n’ocheeze ahụ na Nwa Atụrụ ahụ’ kwesịrị ka a sọpụrụ ha. Mkpughe isi nke anọ kwukwara ihe mere e kwesịrị iji na-asọpụrụ Jehova. Ndị mmụọ e kere eke nọ n’eluigwe na-abụ abụ n’olu dara ụda iji too Jehova, bụ́ “Onye na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi.” Ha na-asị, “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka  ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.”—Mkpu. 4:9-11.

3 Nwa Atụrụ ahụ bụ Jizọs Kraịst, bụ́ “Nwa Atụrụ Chineke nke na-ewepụ mmehie nke ụwa.” (Jọn 1:29) Baịbụl gwara anyị na ọ ka mmadụ niile bụ́ ndị eze ma ọ bụ ndị bụtụrụla eze. Ọ sịrị: “Onye bụ́ Eze nke ndị na-achị achị dị ka ndị eze, na Onyenwenụ nke ndị na-achị achị dị ka ndị nwenụ, onye naanị ya nwere anwụghị anwụ, onye bi n’ìhè a na-apụghị iru nso, onye mmadụ ọ bụla na-ahụtụbeghị, ọ dịghịkwa mmadụ ọ bụla pụrụ ịhụ ya.” (1 Tim. 6:14-16) N’eziokwu, ò nwere eze ọzọ wepụtara onwe ya nwụọ iji gbapụta anyị ná mmehie? Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ iso ọtụtụ puku ndị mmụọ e kere eke na-ekwu, sị: “Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu kwesịrị ịnata ike na akụnụba na amamihe na ume na nsọpụrụ na otuto na ngọzi.”—Mkpu. 5:12.

4. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-asọpụrụ Jehova na Kraịst?

4 Anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ Jehova na Kraịst. Ịsọpụrụ ha ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi. Ihe Jizọs kwuru na Jọn 5:22, 23 nyeere anyị aka ịghọta ya nke ọma. Ọ sịrị: “Nna m adịghị ekpe onye ọ bụla ikpe ma ọlị, kama o nyefewo ikpe ikpe niile n’aka Ọkpara ya, ka mmadụ niile wee na-asọpụrụ Ọkpara ya dị nnọọ ka ha na-asọpụrụ Nna ya. Onye na-adịghị asọpụrụ Ọkpara ahụ adịghị asọpụrụ Nna ya nke zitere ya.”—Gụọ Abụ Ọma 2:11, 12.

5. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-asọpụrụ mmadụ niile ma na-akwanyere ha ùgwù?

5 E kere ụmụ mmadụ “n’onyinyo Chineke.” (Jen. 1:27) N’ihi ya, ọtụtụ n’ime ha nwetụrụ ụfọdụ àgwà Chineke nwere. Ụmụ mmadụ ga-ahụli ibe ha n’anya, na-emere ibe ha obiọma, na-enwekwara ha obi ọmịiko. Ebe ọ bụ na Chineke nyere ndị mmadụ akọnuche, ha na-amata ihe dị mma na ihe na-adịghị mma, ihe bụ́ eziokwu na ihe na-abụghị eziokwu, na ihe kwesịrị ekwesị na ihe na-ekwesịghị ekwesị, n’agbanyeghị na ihe ha chere na-ehie ụzọ mgbe ụfọdụ. (Rom 2:14, 15) Ihe dị ọcha na ihe mara mma na-amasịkarị ọtụtụ ndị. Ha na-achọkarị ka ha na ndị ọzọ na-ebi n’udo. Ma hà ghọtara ma ha aghọtaghị, e nwere ike ikwu na ha na-egositụ ebube Jehova. N’ihi ya, e kwesịrị ịna-asọpụrụ ha ma na-akwanyere ha ùgwù.—Ọma 8:5.

OTÚ ANYỊ KWESỊRỊ ISI NA-ASỌPỤRỤ NDỊ ỌZỌ

6, 7. Olee otú Ndịàmà Jehova si dị iche n’ọtụtụ ndị n’ihe gbasara ịsọpụrụ ndị mmadụ?

6 Anyị kwesịrị ilezi anya ka anyị mata ụdị nsọpụrụ anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ ndị ọzọ nakwa otú anyị ga-emeru ya. Ọ bụ mmụọ nke ụwa Setan na-eme ka ọtụtụ ndị na-ezughị okè na-akpa àgwà ọjọọ. Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji eme ụfọdụ ndị ka hà bụ chi kama ịkwanyere ha naanị ùgwù e kwesịrị ịkwanyere ha. Ha na-ebugo ndị isi chọọchị, ndị ọchịchị, ndị na-agba bọl, ndị na-eme fim, na ndị ọzọ a ma ama elu gafee ókè, na-emezi ha ka hà bụ chi. N’ihi ya, onye ukwu na onye nta na-eṅomi ihe ọ bụla ha na-eme, ma ihe ndị maara ha ahụ́ ma ejiji ha ma omume ha.

7 Ezigbo Ndị Kraịst anaghị ewere ụdị ihe ahụ ka ịsọpụrụ mmadụ. Ọ bụ naanị Kraịst bụ mmadụ bitụrụla n’ụwa a anyị kwesịrị iṅomi ihe ọ bụla o mere. (1 Pita 2:21) Obi agaghị adị Chineke mma ma anyị na-asọpụrụ ndị mmadụ karịa otú anyị kwesịrị. Eziokwu anyị kwesịrị iburu n’obi bụ na “mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube  Chineke.” (Rom 3:23) N’eziokwu, e nweghị mmadụ ọ bụla e kwesịrị ịna-efe.

8, 9. (a) Olee otú Ndịàmà Jehova si were ndị ọchịchị? (b) Olee otú anyị kwesịrị ịkwadoru ndị ọchịchị?

8 E nwere ụfọdụ bụ́ ndị ọchịchị n’ụwa taa. Ndị ọchịchị kwesịrị ime ka ndị mmadụ na-eme ihe iwu kwuru, meekwa ka udo dị. Ha kwesịkwara ịna-egboro ụmụ amaala ha mkpa ha. Ọ na-abara mmadụ niile uru. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji gwa Ndị Kraịst ka ha na-asọpụrụ “ndị ọchịchị.” Ọ gwara ha, sị: “Na-enyenụ mmadụ niile ihe ruuru ha, onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ isi, tụọrọnụ ya ụtụ isi; . . . onye e kwesịrị ịsọpụrụ, sọpụrụnụ ya.”—Rom 13:1, 7.

9 Ọ dabara adaba na Ndịàmà Jehova na-eji obi ha niile asọpụrụ ndị ọchịchị na ndị na-arụrụ ha ọrụ otú ha kwesịrị ịna-eme nakwa otú iwu obodo kwuru. Anyị na-akwado ha n’ọrụ ha na-arụ. N’eziokwu, anyị na-asọpụrụ ha ma na-akwado ha naanị otú Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ịsọpụrụ ha agaghị eme ka anyị nupụrụ Chineke isi ma ọ bụ mee ihe Onye Kraịst na-ekwesịghị ime.—Gụọ 1 Pita 2:13-17.

10. Olee otú ndị fere Jehova n’oge gara aga si gosi na ha na-asọpụrụ ndị ọchịchị na ndị na-arụrụ ha ọrụ?

10 Ndị fere Jehova n’oge gara aga gosiri otú anyị kwesịrị isi na-asọpụrụ ndị ọchịchị na ndị na-arụrụ ha ọrụ. Mgbe Alaeze Rom nyere ndị mmadụ iwu ka ha gaa deba aha n’akwụkwọ, Josef na Meri mere otú ahụ. Ha gara Betlehem n’agbanyeghị na Meri ga-amụ nwa mbụ ya n’oge na-adịghị anya. (Luk 2:1-5) Mgbe e mechara bo Pọl ebubo ụgha, o weturu obi zara ọnụ ya ma sọpụrụ Eze Herọd Agrịpa na Festọs, bụ́ gọvanọ Rom chịrị Judia.—Ọrụ 25:1-12; 26:1-3.

11, 12. (a) Gịnị mere ùgwù anyị na-akwanyere ndị ọchịchị ji dị iche n’ùgwù anyị na-akwanyere ndị ndú okpukpe? (b) Olee uru ùgwù otu nwanna bụ́ onye Ọstria kwanyeere otu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị bara?

11 Ma, anyị bụ́ Ndịàmà Jehova anaghị akwanyere ndị ndú okpukpe ùgwù pụrụ iche n’agbanyeghị na ha nwere ike ịtụ anya ya. Okpukpe ụgha na-ekwu ihe na-ezighị ezi banyere Chineke, na-akụzikwa ihe na-adịghị na Baịbụl. N’ihi ya, anyị weere ndị ndú okpukpe otú anyị si were ndị ọzọ, ma anyị anaghị akwanyere ha ùgwù pụrụ iche. Anyị na-echeta na Jizọs katọrọ ụdị ndị ahụ n’oge ya, kpọọ ha ndị ihu abụọ na ndị ndú kpuru ìsì. (Mat. 23:23, 24) Ma, ịkwanyere ndị ọchịchị ùgwù ruuru ha nwere ike ịrụpụta ihe bara uru na ihe anyị na-atụghị anya ya mgbe ụfọdụ.

12 Otu nwanna na-anụ ọkụ n’obi aha ya bụ Leopold Engleitner bụ onye Ọstria. Ndị Nazi nwụchiri ya, jiri ụgbọ okporo ígwè buga ya n’ụlọ mkpọrọ dị na Buken-wọd. Onye mkpọrọ ọzọ nọ n’ụgbọ okporo ígwè ahụ bụ otu nwoke aha ya bụ Heinrich Gleissner. Ọ bụbu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’Ọstria. Ma, ya na ndị Nazi adịghịzi ná mma. Mgbe ha nọ n’ụzọ, Nwanna Engleitner weturu obi kọọrọ Gleissner ihe o kweere, ya egee ntị nke ọma. Mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, Gleissner ji ikike ya nyere Ndịàmà Jehova aka ugboro ugboro n’Ọstria. I nwere ike icheta oge ndị ọzọ Ndịàmà Jehova kwanyeere ndị ọchịchị ùgwù ruuru ha, ya abaa ezigbo uru n’ihi na ha sọpụụrụ ha otú ahụ Baịbụl kwuru.

NDỊ ỌZỌ E KWESỊRỊ ỊNA-ASỌPỤRỤ

13. Olee ndị anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ ma na-akwanyere ùgwù karịchaa? Maka gịnị?

13 Ụmụnna anyị so ná ndị anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ ma na-akwanyere ùgwù,  nke ka nke, ndị okenye ọgbakọ. (Gụọ 1 Timoti 5:17.) Anyị na-asọpụrụ ha n’agbanyeghị obodo ha si, ebe ha gụruru akwụkwọ, ma ọ bụ otú ha nweruru ego. Baịbụl sịrị na ha bụ “onyinye n’ụdị mmadụ” nakwa na ha so ná ndị Chineke si n’aka ha na-elekọta ndị na-efe ya. (Efe. 4:8) Chegodị gbasara ndị okenye ọgbakọ, ndị nlekọta sekit, ndị so na Kọmitii Alaka na ndị so n’Òtù Na-achị Isi. Ụmụnna anyị n’oge ndịozi Jizọs na-asọpụrụ ndị Chineke họpụtara ka ha na-edu ha. Otú ahụ ka anyị na-emekwa taa. Anyị anaghị efe ndị a ma ama na-anọchite anya ọgbakọ Ndị Kraịst ma ọ bụ na-eme ha ka hà bụ ndị mmụọ ozi. Ma anyị na-asọpụrụ ha, na-akwanyekwara ha ùgwù maka otú ha si arụsi ọrụ ike na otú ha si dị umeala n’obi.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:24; Mkpughe 19:10.

14, 15. Olee otú ezigbo Ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ si dị iche ná ndị sịrị na ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ?

14 Anyị ghọtara na ndị okenye bụ ndị ọzụzụ atụrụ dị umeala n’obi. Ihe gosiri na ha dị umeala n’obi bụ na ha anaghị ekwe ka ndị ọzọ na-eme ha ka hà bụ ndị a ma ama n’ụwa. Ha si otú a dị iche n’ọtụtụ ndị ndú okpukpe n’oge anyị a nakwa n’oge ndịozi Jizọs, bụ́ ndị Jizọs kwuru gbasara ha, sị: “Ọ na-atọ ha ụtọ ịnọ n’ebe kasị ùgwù ná nri anyasị nakwa n’oche ihu n’ụlọ nzukọ, nakwa ka a na-ekele ha n’ọma ahịa.”—Mat. 23:6, 7.

15 Ezigbo Ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ na-ewetu onwe ha ala, na-eme ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Ka a ghara ịkpọ unu onwe unu Rabaị, n’ihi na otu onye bụ onye ozizi unu, ma unu niile bụ ụmụnna. Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa, n’ihi na otu onye bụ Nna unu, ya bụ, Onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ‘ndị ndú,’ n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst. Ma onye kasị ukwuu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi. Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.” (Mat. 23:8-12) N’ihi ya, i nwere ike ịghọta ihe mere ndị okenye ọgbakọ n’ụwa niile ji akpa àgwà ọma mere ka ụmụnna ha hụ ha n’anya, na-akwanyere ha ùgwù ma na-asọpụrụ ha.

Otú ndị okenye si dị umeala n’obi na-eme ka anyị hụ ha n’anya, na-akwanyere ha ùgwù ma na-asọpụrụ ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 ruo na nke 15)

16. Gịnị mere i ji kwesị ịna-agbalịsi ike ịghọta ihe Baịbụl kwuru gbasara ịsọpụrụ ndị ọzọ ma na-eme ya eme?

16 N’eziokwu, o nwere ike iwetụ oge tupu anyị amata otú anyị kwesịrị isi na-asọpụrụ ndị ọzọ nakwa ndị anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa Ndị Kraịst oge mbụ. (Ọrụ 10:22-26; 3 Jọn 9, 10) Ma, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị na-asọpụrụ ndị ọzọ otú ahụ Baịbụl  kwuru. Ịmata otú anyị kwesịrị isi na-asọpụrụ ndị ọzọ ga-abara anyị ọtụtụ uru.

URU ỊSỌPỤRỤ NDỊ ỌZỌ OTÚ KWESỊRỊ EKWESỊ NA-ABA

17. Olee uru ụfọdụ ịsọpụrụ ndị na-achị achị na-aba?

17 Ọ bụrụ na anyị na-akwanyere ndị na-achị achị ùgwù ma na-asọpụrụ ha, o nwere ike ime ka ha gbachitere anyị ma e nyewe anyị nsogbu n’ozi ọma anyị na-ekwusa. Ụdị ihe ahụ na-emekarị ka e lewe ozi ọma anyị na-ekwusa anya ọma. Afọ ole na ole gara aga, otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ na Jamanị aha ya bụ Birgit gara ememme ngụcha akwụkwọ nwa ya nwaanyị. Ndị nkụzi gwara ya na obi dị ha ụtọ na ha na ụmụ Ndịàmà Jehova na-emekọ ihe kemgbe ọtụtụ afọ. Ha kwuru na ọ ga-abụ ihe ihere ma ọ bụrụ na e nweghị ụmụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ akwụkwọ ha. Nwanna nwaanyị ahụ gwara ha, sị: “Anyị na-akụziri ụmụ anyị ka ha na-akpa àgwà otú Chineke chọrọ. Ịkwanyere ndị nkụzi ùgwù na ịsọpụrụ ha so n’ihe anyị na-akụziri ha.” Otu onye nkụzi kwuru, sị: “A sị na ụmụaka niile dị ka ụmụ Ndịàmà Jehova, ọrụ nkụzi gaara adị ka ịnọ n’alaeze.” Mgbe izu ole na ole gara, otu n’ime ndị nkụzi ahụ bịara mgbakọ distrikti e mere na Laịpzig.

18, 19. Gịnị mere anyị ji kwesị ịmata otú anyị kwesịrị isi na-akwanyere ndị okenye ùgwù?

18 N’eziokwu, ihe ndị e kwuru na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịma otú anyị kwesịrị isi na-akwanyere ndị okenye ọgbakọ ùgwù. (Gụọ Ndị Hibru 13:7, 17.) Anyị kwesịrị ịna-aja ha mma maka otú ha si arụsi ọrụ ike, na-agbakwa mbọ ime ihe ha gwara anyị mee. Ime otú ahụ nwere ike inyere ha aka iji ọṅụ na-arụ ọrụ ha. Ma, ọ pụtaghị na anyị ga na-agba mbọ ime ihe ọ bụla okenye a ma ama mere, na-eji ejiji ka ya ma ọ bụ na-akpụ ụdị isi ọ na-akpụ, na-ekwu okwu otú o si ekwu, ma mgbe ọ na-eme ihe omume ma mgbe ya na ndị mmadụ na-akparịta ụka. Ọ bụrụ na anyị mee otú ahụ, o nwere ike ịdị ka ànyị bụ ndị na-eso ụzọ ya. Anyị ekwesịghị ichefu na yanwa bụkwa mmadụ na-ezughị okè. Ọ bụ Jizọs Kraịst ka anyị kwesịrị ịna-eso ụzọ ya.

19 Ọ bụrụ na anyị na-akwanyere ndị okenye ùgwù ma na-asọpụrụ ha otú anyị kwesịrị ịna-eme ma ghara ịna-eme ha ka hà bụ ndị a ma ama n’ụwa, ọ ga-abara ha uru. Anyị na-enyere ha aka ka ha ghara ịdị mpako, iche na ha ka ndị ọzọ ma ọ bụ ịbụ ndị oké ezi omume.

20. Olee uru ịsọpụrụ ndị ọzọ na-abara anyị?

20 Ịsọpụrụ ndị anyị kwesịrị ịsọpụrụ ga-eme ka anyị ghara ịna-eche naanị gbasara onwe anyị. Ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-ebuli onwe anyị elu ma a jaa anyị mma. Ọ ga-emekwa ka anyị na-eme ihe nzukọ Jehova gwara anyị, nke bụ́ ka anyị ghara ịna-akwanyere ndị mmadụ ùgwù na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ karịa otú anyị kwesịrị, ma hà bụ ụmụnna ma hà bụ ndị ụwa. Ihe ọzọ bụ na ọ na-enyere anyị aka ka anyị ghara ịkwụsị ife Chineke ma onye anyị na-asọpụrụ mee ihe anyị na-atụghị anya ya.

21. Olee uru kachanụ anyị ga-erite ma anyị na-asọpụrụ ndị anyị kwesịrị ịsọpụrụ?

21 Uru kachanụ anyị ga-erite ma anyị na-asọpụrụ ndị anyị kwesịrị ịsọpụrụ bụ na ọ ga-eme Chineke obi ụtọ. Anyị ga na-eme ihe ọ chọrọ ka anyị mee ma si otú ahụ gosi na anyị na-erubere ya isi. Ọ ga-eme ka ọ zaa onye ọ bụla na-akwa ya emo okwu. (Ilu 27:11) Ndị juru n’ụwa a bụ ndị na-amaghị otú e kwesịrị isi na-asọpụrụ mmadụ. Ma, obi dị anyị ụtọ na anyị ma otú e si asọpụrụ ndị mmadụ otú Jehova chọrọ.