Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mach 2017

Esa, Jehọshafat, Hezekaya, na Josaya

Jiri Obi Gị Niile Na-efe Jehova

Jiri Obi Gị Niile Na-efe Jehova

“Jehova, biko, cheta otú m si jiri eziokwu na obi zuru ezu jee ije n’ihu gị.”—2 Eze 20:3.

ABỤ: 52, 65

1-3. Gịnị ka mmadụ iji “obi zuru ezu” na-efe Jehova pụtara? Nye ihe atụ.

ANYỊ na-emejọkarị n’ihi na anyị ezughị okè. Ma, obi dị anyị ụtọ na Jehova anaghị emeso anyị “dị ka mmehie anyị si dị,” ọ bụrụhaala na anyị echegharịa, jiri okwukwe na obi umeala na-arịọ ya mgbaghara n’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. (Ọma 103:10) Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nabata ofufe anyị na-efe ya kwa ụbọchị, anyị kwesịrị ‘iji obi anyị dum jeere ya ozi,’ otú ahụ Devid gwara Sọlọmọn ka o mee. (1 Ihe 28:9) Olee otú anyị ga-esi eme ya ebe ọ bụ na anyị ezughị okè?

2 Iji nyere anyị aka, anyị ga-eleba anya n’ihe dị iche n’ihe Eze Esa mere na ihe Eze Amazaya mere. Ndị eze abụọ a chịrị Juda mere ihe dị mma n’anya Jehova, ma Esa ji obi ya niile mee ya. (2 Ihe 15:16, 17; 25:1, 2; Ilu 17:3) Ha abụọ ezughị okè, ha mejọkwara. N’agbanyeghị ya, Esa ahapụghị ime ihe Chineke chọrọ n’ihi na o ji obi ya niile jeere Chineke ozi. Ma, Amazaya ejighị obi ya niile jeere Jehova ozi. Mgbe o merichara ndị iro Chineke,  o wetara chi dị iche iche ndị ahụ na-efe ma malite ife ha.—2 Ihe 25:11-16.

3 Iji “obi zuru ezu” na-efe Chineke pụtara mmadụ iji obi ya niile na-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Na Baịbụl, okwu bụ́ “obi” na-apụtakarị ụdị onye mmadụ bụ. Ihe ndị so na ya bụ ihe na-agụ mmadụ agụụ, ihe ọ na-eche, otú o si akpa àgwà, otú o si ele ihe anya, na ihe ndị o kpebiri ime. N’ihi ya, onye ji obi ya niile na-efe Jehova anaghị eji ihu abụọ efe ya. Ọ naghị efe Jehova naanị ka a sị na ọ na-efe ya. Anyịnwa kwanụ? Ọ bụ eziokwu na anyị ezughị okè, anyị jiri obi anyị niile na-efe Chineke ma ghara ịna-eme ihu abụọ, ọ pụtara na anyị ji “obi zuru ezu” na-efe ya.—2 Ihe 19:9.

4. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya ugbu a?

4 Ka anyị nwee ike ịghọtakwu ihe mmadụ iji obi ya niile na-efe Jehova pụtara, anyị ga-eleba anya n’ihe Esa mere, lebakwa anya n’ihe ụfọdụ ndị eze ndị ọzọ chịrị Juda mere, bụ́ ndị ji obi ha niile fee Chineke. Ha bụ Jehọshafat, Hezekaya, na Josaya. Ha anọ mejọrọ ihe, ma ha na Jehova ka dịkwa ná mma. Gịnị mere Chineke ji were ha ka ndị ji obi ha niile fee ya, oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka ha?

OBI ESA “ZURU EZU” N’EBE JEHOVA NỌ

5. Olee ihe ndị Esa mere mgbe ọ na-achị?

5 Esa bụ eze nke atọ chịrị Juda mgbe alaeze ebo iri Izrel nke dị n’ebe ugwu kewapụchara onwe ha. O wepụrụ arụsị niile dị n’ebe ọ na-achị, chụpụkwa ndị ikom na-agba akwụna n’ụlọ arụsị. Ọ chụtudịrị nne ya ochie bụ́ Meaka ka ọ ghara ịbụkwa ‘nnukwu nwaanyị, n’ihi na o mere arụsị jọgburu onwe ya.’ (1 Eze 15:11-13) Esa gwakwara ndị ya “ka ha chọọ Jehova . . . nakwa ka ha debe iwu ya na ntụziaka ya.” N’eziokwu, Esa mere ka ndị ọzọ fewe Jehova.—2 Ihe 14:4.

6. Gịnị ka Esa mere mgbe ndị Itiopia bịara ibuso Juda agha?

6 Mgbe Esa malitere ịchị, Jehova mere ka udo dịrị na Juda ruo afọ iri. Ma, onye Itiopia aha ya bụ Zira chị otu nde ndị agha na narị ụgbọ ịnyịnya atọ bịa ibuso Juda agha. (2 Ihe 14:1, 6, 9, 10) Gịnị ka Esa mere? O mere ihe gosiri na ọ tụkwasịrị Jehova obi ya niile. (Gụọ 2 Ihe E Mere 14:11.) Jehova zara ekpere Esa ji obi ya niile kpee ma mee ka o merie n’agha ahụ, gbuokwa ndị agha Itiopia. (2 Ihe 14:12, 13) Jehova nwere ike ime ka ndị eze na-anaghị erubere ya isi merie ndị iro ha n’ihi aha ya. (1 Eze 20:13, 26-30) Ma, Esa tụkwasịrị Chineke obi, Jehova zakwara ekpere ya. N’eziokwu, Esa mechara mee ihe ụfọdụ na-adịghị mma. Dị ka ihe atụ, ọ gakwuuru eze Siria ka o nyere ya aka kama ịrịọ Jehova ka o nyere ya aka. (1 Eze 15:16-22) Ma, Jehova kwuru na “obi Esa zuru ezu n’ụbọchị ya niile.” Olee otú anyị ga-esi mee ihe dị mma otú ahụ Esa mere?—2 Ihe 15:17.

7, 8. Olee otú ị ga-esi ṅomie Esa n’ozi ị na-ejere Jehova?

7 Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike inyocha obi ya ka ọ mata ma ò ji obi ya niile na-efe Chineke. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ kpebisiri ike ime ihe dị Jehova mma, ịgbachitere ofufe ya, na ime ka ọgbakọ dị ọcha?’ Chegodị ụdị obi ike Esa nwere, nke mere o ji chụtuo Meaka, bụ́ “nnukwu nwaanyị” na Juda. O nwere ike ị gaghị ama onye  metụrụla ụdị ihe ahụ Meaka mere, ma o nwere mgbe i kwesịrị ịkata obi ka Esa. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye ezinụlọ gị ma ọ bụ ezigbo enyi gị emehie ma jụ ichegharị, a chụọ ya n’ọgbakọ? Ị̀ ga-akwụsị gị na ya ịna-akpa? Gịnị ka obi gị ga-agwa gị mee?

8 I nwere ike igosi na i ji obi gị niile na-efe Chineke otú ahụ Esa mere ma ị tụkwasị Chineke obi ma ndị mmadụ megidewe gị, ọ bụrụgodị na e nwere mgbe ụfọdụ i chere na ị gaghị edili ya. E nwere ike ịna-achọ gị okwu ma ọ bụ na-akwa gị emo n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ị bụ Onyeàmà Jehova. Ndị ọrụ ibe gị nwekwara ike ịna-akparị gị n’ihi na ị chọrọ iji abalị ole ole gaa mgbakọ ma ọ bụkwanụ na ị naghị arụkarị ọrụ ma a gbasaa ọrụ. Ụdị ihe ahụ mee, kpeere Chineke ekpere otú ahụ Esa mere. Jiri obi ike tụkwasị Jehova obi ma na-eme ihe dị mma. Cheta na Chineke nyeere Esa aka ma mee ka ọ dị ike. Ọ ga-emekwa ka ị dị ike.

9. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị ji obi anyị niile na-efe Jehova mgbe anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma?

9 Ndị na-efe Chineke anaghị eche naanị gbasara onwe ha. Esa mere ka ndị ọzọ fewe Chineke. Anyịnwa kwesịkwara inyere ndị ọzọ aka ka ha “chọọ Jehova.” Obi ga-atọ Jehova ụtọ ma ọ hụ na anyị na-agwa ndị agbata obi anyị na ndị ọzọ banyere ya n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, chọọkwa ka ndị mmadụ nweta ndụ ebighị ebi.

JEHỌSHAFAT CHỌRỌ JEHOVA

10, 11. Olee otú ị ga-esi ṅomie Jehọshafat?

10 Jehọshafat bụ́ nwa Esa akwụsịghị ‘ije ije n’ụzọ nna ya Esa.’ (2 Ihe 20:31, 32) Gịnị mere Baịbụl ji kwuo otú ahụ? Jehọshafat mere ka nna ya. Ọ gbara ndị mmadụ ume ka ha chọọ Jehova. Otú o si mee ya bụ na ọ haziri ka ha jiri “akwụkwọ iwu Jehova” na-ezi ndị mmadụ ihe. (2 Ihe 17:7-10) Ọ gadịrị n’alaeze ebe ugwu nke Izrel, bụ́ ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu, ‘ka o mee ka ha laghachikwuru Jehova.’ (2 Ihe 19:4) Jehọshafat bụ eze “ji obi ya dum chọọ Jehova.”—2 Ihe 22:9.

11 Anyị niile nwere ike iso na-ekwusa ozi ọma Jehova chọrọ ka anyị na-ekwusa taa. Ị̀ na-agba mbọ ịkụziri ndị ọzọ Okwu Chineke n’ọnwa ọ bụla otú ọ ga-eru ha n’obi ka ha nwee ike ifewe Chineke? Ọ bụrụ na ị na-agba mbọ, Chineke ga-enyere gị aka inweta onye ị ga-amụwara ihe. Ị̀ na-ekpe ekpere ka Chineke nyere gị aka? Ị̀ dị njikere ịmụrụ mmadụ ihe, ọ bụrụgodị na ọ bụ oge i wepụtara ị ga-eji mee ihe ndị ọzọ? Otú ahụ Jehọshafat si gaa n’ókèala ndị Ifrem nyere ndị mmadụ aka ka ha laghachikwuru Jehova, anyị nwere ike inyere ndị na-anaghị ejekwa ozi aka. Ihe ọzọ bụ na ndị okenye ọgbakọ na-aga eleta ndị bi n’ókèala ha a chụrụ n’ọgbakọ ma gbalịa inyere ha aka, ya bụ, ndị hapụrụla àgwà ọjọọ ha.

12, 13. (a) Gịnị ka Jehọshafat mere mgbe ụjọ jidere ya? (b) Gịnị mere anyị kwesịrị iji ṅomie Jehọshafat?

12 Jehọshafat akwụsịghị iji obi ya niile na-efe Chineke otú ahụ nna ya bụ́ Esa mere, ma mgbe ìgwè ndị agha bịara ibuso Juda agha. (Gụọ 2 Ihe E Mere 20:2-4.) Ụjọ tụrụ Jehọshafat. Ma, ‘o kpebiri ịchọ Jehova.’ N’ekpere o kpere, o ji obi umeala kwuo na ndị ya “enweghị ike iguzo n’ihu nnukwu ìgwè mmadụ a” nakwa na ya na ndị ya  amaghị ihe ha ga-eme. Ọ tụkwasịrị Jehova obi ya niile. Ọ sịrị: “Ọ bụ gị ka anyị lekwasịrị anya.”—2 Ihe 20:12.

13 O nwere mgbe ụfọdụ anyị na-agaghị ama ihe anyị ga-eme ma ọ bụdị ụjọ ejide anyị otú ahụ o jidere Jehọshafat. (2 Kọr. 4:8, 9) Ma cheta na Jehọshafat kwuru n’ekpere o kpere na ya na ndị ya amaghị ihe ha ga-eme. (2 Ihe 20:5) Ndị isi ezinụlọ kwesịrị iṅomi Jehọshafat. Ha kwesịrị ịrịọ Jehova ka o duzie ha ma nye ha ike ha ga-eji merie nsogbu ndị na-abịara ha. Ihere emela gị ịrịọ Jehova ihe ndị a n’ihu ndị ezinụlọ gị. I mee otú ahụ, ha ga-aghọta na ị tụkwasịrị Jehova obi. Chineke nyeere Jehọshafat aka. Ọ ga-enyekwara gị aka.

HEZEKAYA AKWỤSỊGHỊ IME IHE DỊ MMA

14, 15. Olee otú Hezekaya si gosi na ọ tụkwasịrị Chineke obi ya niile?

14 Hezekaya bụ eze ọzọ ‘rapaara Jehova n’ahụ́’ n’agbanyeghị na nna ya mere ihe ọjọọ, feekwa arụsị. Hezekaya “wepụrụ ebe ndị dị elu, kụrisịa ogidi nsọ ma gbutuo ogwe osisi dị nsọ, gwerisịakwa agwọ ọla kọpa ahụ Mozis mere,” n’ihi na ndị Izrel na-efe ya. Hezekaya ji obi ya niile na-efe Jehova, n’ihi na ‘ọ nọ na-edebe ihe Jehova nyere Mozis n’iwu.’—2 Eze 18:1-6.

15 Hezekaya tụkwasịrị Jehova obi ya niile, ma mgbe ndị Asiria bụ́ ndị na-achị n’oge ahụ bịara ibuso ndị Juda agha, yiekwa ha egwu na ha ga-ebibi Jeruselem. Eze Asiria bụ́ Senakerib kwara Jehova emo, gbalịa ime ka ụjọ jide Hezekaya ka ọ chịliere Asiria aka elu. Ma, Hezekaya tụkwasịrị Jehova obi ya niile, riọkwa ya ka o nyere ya aka. (Gụọ Aịzaya 37:15-20.) Chineke zara ekpere ya ma zite otu mmụọ ozi ka o gbuo otu narị puku ndị agha Asiria na iri puku asatọ na puku ise.—Aịza. 37:36, 37.

16, 17. Olee otú ị ga-esi na-eṅomi Hezekaya?

16 Hezekaya mechara rịawa ọrịa, ya afọ obere ka ọ nwụọ. Ọ rịọrọ Jehova ka o cheta otú o si jee ije n’ihu ya. (Gụọ 2 Ndị Eze 20:1-3.) Anyị mụtara na Baịbụl na anyị ekwesịghị ịtụ anya n’oge a ka Chineke rụọ ọrụ ebube gwọọ anyị ma ọ bụ mee ka anyị dịkwuo ogologo ndụ. Ma, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịgwa Jehova n’ekpere otú ahụ Hezekaya gwara ya, sị: ‘M ji eziokwu na obi zuru ezu jee ije n’ihu gị.’ Obi ò siri gị ike na Jehova ga na-elekọta gị mgbe niile, ọ bụrụgodị na ị na-arịa ọrịa?—Ọma 41:3.

17 Anyị chebara ihe Hezekaya mere echiche, anyị nwere ike ịchọpụta ihe anyị kwesịrị iwepụ, bụ́ ihe na-eme ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma ma ọ bụ ihe na-eme ka anyị ghara iji ofufe ya kpọrọ ihe. O doro anya na anyị ekwesịghị ịna-eme ka ndị ụwa, bụ́ ndị na-anọ n’Ịntanet eme ụfọdụ ndị ka hà bụ chi. N’eziokwu, o nwere ike ịna-atọ ụfọdụ Ndị Kraịst ụtọ isi n’Ịntanet ezigara ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị enyi ha ozi. Ma, ọtụtụ ndị ụwa na-ejikarị Ịntanet ezigara ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyị ndị ha na-amaghị ozi. Ha nwekwara ike iji oge buru ibu na-ekiri foto ha ma ọ bụ na-agụ gbasara ha. Mmadụ iji oge buru ibu na-eme ihe na-enweghị isi na ọdụ na-akpata nsogbu. Isi nwedịrị ike ibuwe Onye Kraịst ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị na-enwe mmasị n’ihe ndị  ọ na-ede n’Ịntanet ma ọ bụ iwe ewewe ya ma ha  kwụsị inwe mmasị na ha. Ì chere na Pọl onyeozi ma ọ bụ Akwịla na Prisila gaara ewepụta oge kwa ụbọchị na-etinye foto n’Ịntanet ma ọ bụ gbalịwa ịmata ihe onye na-abụghị nwanna na-eme? Baịbụl gwara anyị na Pọl nọ ‘na-ekwusasi okwu Chineke ike.’ O kwukwara na Prisila na Akwịla ji oge ha na-akọwara ndị ọzọ “ụzọ Chineke n’ụzọ ziri ezi karị.” (Ọrụ 18:4, 5, 26) Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-akpachapụ anya ka m ghara ime ndị ọzọ ka hà bụ chi ma ọ bụ ghara iji oge karịrị akarị na-eme ihe na-enweghị isi na ọdụ?’—Gụọ Ndị Efesọs 5:15, 16.

JOSAYA RUBEERE IWU JEHOVA ISI

18, 19. Olee otú ị ga-esi mee ka Josaya?

18 Eze Josaya, bụ́ nwa nwa Hezekaya, ‘jikwa obi ya dum’ rubere iwu Jehova isi. (2 Ihe 34:31) Mgbe ọ ka na-eto eto, “ọ malitere ịchọ Chineke Devid.” Mgbe ọ dị afọ iri abụọ, ọ malitere ikpochapụ arụsị na Juda. (Gụọ 2 Ihe E Mere 34:1-3.) Josaya ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme ihe dị Chineke mma karịa ọtụtụ ndị eze chịrị Juda. Otu ụbọchị, a hụrụ akwụkwọ e dere Iwu Chineke na ya. O nwere ike ịbụ nke ahụ Mozis ji aka ya dee. Mgbe a gụụrụ ya Josaya, ọ chọpụtara na ya kwesịrị imekwu ihe dị Chineke mma. Ọ gwara ndị ọzọ ka ha fee Jehova. Ihe a ọ gwara ha mere na ha “akwụsịghị iso Jehova” n’oge niile ọ dị ndụ.—2 Ihe 34:27, 33.

19 Ndị na-eto eto kwesịrị ibido mgbe ha ka bụ nwata na-achọ Jehova otú ahụ Josaya mere. O nwere ike ịbụ Eze Manase kụziiri Josaya na Chineke bụ onye ebere. Ndị na-eto eto, na-akpanụ ndị merela agadi n’ezinụlọ unu na n’ọgbakọ unu nso, bụ́ ndị ji obi ha niile na-efe Chineke, ka unu hụ otú Jehova sirila gọzie ha. Chetakwanụ na ihe Josaya gụtara n’Akwụkwọ Nsọ ruru ya n’obi ma mee ka o mee ihe dị mma. Ọ bụrụ na ị na-agụ Okwu Chineke, o nwere ike ime ka ị na-enwekwu obi ụtọ, meekwa ka gị na Chineke dịkwuo ná mma. O nwekwara ike ime ka i nyere ndị ọzọ aka ka ha fee Chineke. (Gụọ 2 Ihe E Mere 34:18, 19.) Ịmụ Baịbụl nwekwara ike inyere gị aka ka ị chọpụta ebe ị ga-emekwu nke ọma n’ozi Chineke. E nwee ebe ị chọpụtara ị ga-emekwu nke ọma, gbalịa mee ya otú ahụ Josaya mere.

JIRI OBI GỊ NIILE NA-EFE JEHOVA

20, 21. (a) Olee ihe ndị eze anọ ahụ anyị mụrụ gbasara ha mere? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-eso nke a?

20 È nwere ihe ndị ị mụtara n’aka ndị eze anọ a chịrị Juda anyị mụrụ gbasara ha, bụ́ ndị ji obi ha niile fee Chineke? Ha ji ịnụ ọkụ n’obi mee ihe dị Chineke mma. Ha akwụsịghị ime otú ahụ, ma mgbe ndị iro dị ike bịara ibuso ha agha. Ihe kacha mkpa bụ na ha fere Jehova n’ihi na ha hụrụ ya n’anya.

21 Anyị ga-achọpụta n’isiokwu na-eso nke a na ndị eze anọ ahụ anyị mụrụ gbasara ha mejọrọ ihe. Ma, Jehova bụ́ onye na-enyocha obi nyochara obi ha, hụ na ha ji obi ha niile na-efe ya. Anyị ezughịkwa okè. Jehova nyochaa obi anyị, ọ̀ ga-ahụ na anyị ji obi anyị niile na-efe ya? N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’ihe anyị ga-amụta n’ihe eze ndị ahụ mejọrọ.