Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mach 2017

 AKỤKỌ NDỤ

Iso Ndị Maara Ihe Na-eje Ije Abaarala M Uru

Iso Ndị Maara Ihe Na-eje Ije Abaarala M Uru

N’ỤTỤTỤ otu ụbọchị n’obodo Brukins dị na Saụt Dakota, n’Amerịka, ikuku nọ na-efe, oyi ana-atụ. O chetaara m na ezigbo oyi ga-atụwa ebe ahụ n’oge na-adịghị anya. Ma, o nwere ike iju gị anya na n’otu ụbọchị ahụ, mmadụ ole na ole anyị dị nọ na-ama jijiji n’otu ebe a na-edosa nri anụmanụ. Anyị guzo n’ihu ebe a na-agbanyere anụ ụlọ mmiri ọṅụṅụ. Mmiri a gbanyere na ya jụrụ ezigbo oyi. Ka m kọọrọ gị ihe ụfọdụ gbasara onwe m ka i nwee ike ịghọta ihe kpatara ya.

MGBE M DỊ OBERE

Nwanne papa m bụ́ Alfred na papa m

A mụrụ m n’abalị asaa n’ọnwa atọ n’afọ 1936. Abụ m nwa nke ikpeazụ n’ime ụmụ anọ papa m na mama m mụrụ. N’oge ahụ, anyị bi n’obere ugbo dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Saụt Dakota. Ezinụlọ anyị anaghị eji ọrụ ugbo egwu egwu. Ma ọ bụghị ya bụ ọrụ kacha anyị mkpa. N’afọ 1934, e mere papa m na mama m baptizim, ha aghọọ Ndịàmà Jehova. Ha nyefere Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, onwe ha. N’ihi ya, ọ bụ ime uche ya kacha ha mkpa. Papa m bụ́ Clarence bụ ohu ọgbakọ (nke a na-akpọzi onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ) n’obere ọgbakọ dị na Kọndi, na Saụt Dakota. Nwanne papa m aha ya bụ Alfred mechakwara bụrụ ohu ọgbakọ.

Ịga ọmụmụ ihe na ịga n’ụlọ n’ụlọ na-ezi ndị ọzọ ozi ọma gbasara olileanya magburu onwe ya Baịbụl kwuru banyere ọdịnihu so n’ihe ezinụlọ anyị na-eme mgbe niile. Àgwà ọma papa m na mama m na-akpa na otú ha si na-azụ anyị bụ́ ụmụ ha baara anyị ezigbo uru. Mụ na nwanne m nwaanyị bụ́ Dorothy ghọrọ ndị nkwusa mgbe anyị dị afọ isii. N’afọ 1943, m malitere ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, nke e bidoro n’oge na-adịbeghị anya.

Mgbe m na-asụ ụzọ n’afọ 1952

Anyị anaghị eji mgbakọ egwu egwu. Nwanna Grant Suiter bụ ọkà okwu si esi bịa n’otu nke  anyị gara n’afọ 1949, na Suu Fọls dị na Saụt Dakota. M ka na-echeta okwu o kwuru, nke isiokwu ya bụ “Ọgwụgwụ Adịla Nso Karịa Otú I Chere.” O kwuru na Ndị Kraịst niile kwesịrị iji ndụ ha niile na-ekwusa ozi ọma gbasara Alaeze Chineke nke na-achị n’eluigwe. Okwu ahụ mere ka m nyefee Jehova onwe m. Ná mgbakọ sekit ọzọ e mere na Brukins, m guzo n’ebe ahụ oyi na-atụ m kọrọ gbasara ya ná mmalite, na-eche ka e mee m baptizim. E ji ígwè rụọ ihe ahụ e ji agbanyere anụ ụlọ mmiri. Ọ bụ ebe ahụ ka e mere anyị anọ baptizim n’abalị iri na abụọ n’ọnwa iri na otu n’afọ 1949.

M kpebiri ịmalite ịsụ ụzọ. M bidoro ịsụ ụzọ n’abalị mbụ n’ọnwa mbụ n’afọ 1952, mgbe m dị afọ iri na ise. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe.” (Ilu 13:20) E nwere ọtụtụ ndị maara ihe n’ezinụlọ anyị, bụ́ ndị kwadoro mkpebi m mere ịmalite ịsụ ụzọ. Onye mụ na ya so na-asụ ụzọ bụ nwanne papa m aha ya bụ Julius. Ọ dị afọ iri isii mgbe ahụ. N’agbanyeghị na ọ tọrọ m ọtụtụ afọ, oge ndị anyị ji jekọọ ozi ọma tọgburu anyị atọgbu. Amụtara m ọtụtụ ihe n’aka ya. Dorothy malitekwara ịsụ ụzọ n’oge na-adịghị anya.

OTÚ NDỊ NLEKỌTA SEKIT SI GOSI NA HA HỤRỤ M N’ANYA

N’oge niile m bụ onye na-eto eto, papa m na mama m na-akpọta ọtụtụ ndị nlekọta sekit na ndị nwunye ha n’ụlọ anyị. Jesse Cantwell na nwunye ya bụ́ Lynn nyeere m ezigbo aka. Ume ha gbara m so n’ihe mere m ji kpebie ịsụ ụzọ. Otú ha si gosi na ha hụrụ m n’anya mere ka m kpebie ihe ndị m ga-eme n’ozi Chineke. Ha letawa ọgbakọ ndị dị nso n’ọgbakọ anyị, ha na-akpọ m mgbe ụfọdụ ka m soro ha gaa ozi ọma. Ọ tọgburu m atọgbu ma gbaa m ume.

Ndị ọzọ letawara ọgbakọ anyị bụ Nwanna Bud Miller na nwunye ya Joan. Adị m afọ iri na asatọ n’oge ahụ. Ndị ọchịchị gwakwara m ka m gaa agha. Ná mbido, otú ụlọ ọrụ na-ekpebi ndị ga-aga agha si na-ele m anya adabaghị adaba n’ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara itinye aka n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Achọkwara m ịna-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Jọn 15:19) M gwara ụlọ ọrụ ahụ ka ha were m ka onye ozi Chineke.

Obi dị m ụtọ mgbe Nwanna Miller kwetara iso m mgbe m gara ịzara ọnụ m n’ụlọ ọrụ ahụ. Nwanna ahụ na-ekwute ọnụ ya. Ụjọ anaghịkwa atụ ya. Obi siri m ezigbo ike na nwanna ji ofufe Chineke kpọrọ ihe kwụ m n’azụ. Ihe ndị anyị kwuru mere  ka ha werezie m ka onye ozi Chineke ná ngwụcha oge ọkọchị n’afọ 1954. Ọ bụ ya mere m ji nwee ike ime ihe ọzọ m kpebiri ime n’ozi Chineke.

Mgbe m bịara ọhụrụ na Betel, jiri ụgbọala na-arụ ọrụ n’ugbo

Mgbe obere oge gara, a kpọrọ m ka m bịa jewe ozi na Betel, n’ebe a na-akpọ Ugbo Watchtower n’oge ahụ, nke dị na Staten Aịland, Niu Yọk. M jere ozi ebe ahụ ihe dị ka afọ atọ. Amụtara m ọtụtụ ihe n’ebe ahụ n’ihi na m matara ọtụtụ ndị maara ihe, mụ na ha arụkọọkwa ọrụ.

OZI M JERE NA BETEL

Mgbe mụ na Nwanna Franz nọ n’ụlọ ọrụ redio anyị bụ́ WBBR

Ụlọ ọrụ redio anyị a na-akpọ WBBR so n’ihe ndị a rụrụ n’ugbo dị na Staten Aịland. Ndịàmà Jehova ji ya zie ozi ọma malite n’afọ 1924 ruo 1957. Ọ bụ naanị mmadụ iri na ise ruo iri abụọ, bụ́ ndị nọ na Betel, na-arụ ọrụ n’ugbo ahụ. Ọtụtụ n’ime anyị ka bụ ndị na-eto eto mgbe ahụ. Anyị ahụbeghịkwa ọtụtụ ihe ná ndụ. Ma, Eldon Woodworth, bụ́ nwanna katarala ahụ́ e tere mmanụ, so anyị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ. O mere ihe gosiri n’eziokwu na ọ ma ihe. Otú o si hụ anyị n’anya ka nna mere ka okwukwe anyị sie ike. Mgbe ọ bụla ezughị okè kpatara nsogbu, Nwanna Woodworth na-ekwu, sị: “Ihe Onyenwe anyị ji ndị ohu ya na-ezughị okè na-arụ dị egwu.”

Harry Peterson na-anụ ọkụ n’obi pụrụ iche n’ozi ọma

Ihe ọma ọzọ meere anyị bụ na Nwanna Frederick Franz sokwa anyị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ. Amamihe ya na otú o si mara Akwụkwọ Nsọ nke ọma baara anyị niile ezigbo uru. O mere ihe gosiri na ọ hụrụ onye ọ bụla n’ime anyị n’anya. Onye na-esiri anyị nri bụ Harry Peterson; ọ na-adịrị anyị mfe ịkpọ ya aha nna ya karịa ịkpọ ya ezigbo aha ya bụ́ Papargyropoulos. Yanwa bụkwa nwanna e tere mmanụ. Ọ na-ejikwa ịnụ ọkụ n’obi pụrụ iche ekwusa ozi ọma. Nwanna Peterson rụrụ ọrụ ya nke ọma na Betel, ma ọ naghị eleghara ozi ọma anya. Ọ na-enyefe ọtụtụ narị magazin kwa ọnwa. Ọ ma Baịbụl nke ọma. Ọ na-azakwa ọtụtụ ajụjụ ndị anyị na-ajụ.

M RITERE URU N’AKA ỤMỤNNA NWAANYỊ MAARA IHE

A na-agba ihe ndị a kọpụtara n’ugbo ahụ ná mkpọ̀. N’otu afọ, mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri a na-agbara ezinụlọ Betel ná mkpọ̀ nwere ike iju obere efere dị iri puku anọ na ise. Mụ na Etta Huth rụkọrọ ọrụ. Ọ bụ nwanna nwaanyị ma ihe n’eziokwu. Ọ bụ ya na-ahụ maka otú e si agba ihe ndị ahụ ná mkpọ̀. N’oge ahụ, ụmụnna nwaanyị na-esi n’ọgbakọ dị iche iche abịa enye aka. Etta  na-enye aka ahazi ọrụ ahụ. N’agbanyeghị na ọ ma ọrụ ahụ nke ọma, ọ na-akwanyere ụmụnna ndị na-elekọta ugbo ahụ ùgwù. Ihe ahụ o mere bụ ihe anyị niile kwesịrị ịmụta.

Mụ na Angela na Etta Huth

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Angela Romano so n’ụmụnna nwaanyị na-abịa enye aka n’ọrụ ahụ. Etta nyeere ya aka mgbe ọ batara n’ọgbakọ. N’oge ahụ m na-eje ozi na Betel, m si otú ahụ mata nwanna nwaanyị ọzọ maara ihe, onye mụ na ya jekọrọla ozi ruo afọ iri ise na asatọ. Mụ na Angie lụrụ n’ọnwa anọ n’afọ 1958. Anyị arụọkwala ọtụtụ ọrụ tọrọ anyị ezigbo ụtọ n’ozi Jehova. Kemgbe ahụ, otú Angie si jiri obi ya niile na-erubere Jehova isi emeela ka anyị na-ebi n’udo. M tụkwasịrị ya obi n’agbanyeghị ụdị nsogbu nwere ike ịbịara anyị.

MGBE M JERE OZI ALA ỌZỌ, RỤỌKWA ỌRỤ SEKIT NA ỌRỤ DISTRIKTI

Mgbe e rere ụlọ ọrụ redio anyị ahụ bụ́ WBBR dị na Staten Aịland n’afọ 1957, m jetụrụ ozi na Betel dị na Bruklin. Mụ na Angie lụrụ. N’ihi ya, m hapụrụ Betel. Anyị sụrụ ụzọ na Staten Aịland ihe dị ka afọ atọ. M rụtụrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ redio ahụ e rere, nke ndị zụrụ ya kpọwaziri WPOW.

Mụ na Angie kpebisiri ike na anyị agaghị ekwe ka ịchụ ego megharịa anyị anya ka anyị nwee ike ịga ebe ọ bụla a ga-eziga anyị. N’ihi ya, ná mmalite afọ 1961, anyị kwetara ịga bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na Fọls Siti dị na Nebraska. Ọ dịghị anya anyị gara ebe ahụ, a kpọọ anyị ka anyị gaa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. N’oge ahụ, a na-aga ya otu ọnwa na Saụt Lansịn dị na Niu Yọk. Ụlọ akwụkwọ ahụ tọrọ anyị ụtọ. Anyị tụkwara anya ịlaghachi Nebraska gaa mee ihe anyị mụtara. N’ihi ya, o juru anyị anya mgbe e nyere anyị ọrụ ọzọ, ya bụ, ka anyị bụrụ ndị ozi ala ọzọ na Kambodia. Kambodia bụ ọmarịcha obodo dị n’Ebe Ndịda Eshia. Ozi anyị jere ebe ahụ mere ka anyị nwee ike ịhụ ihe ndị anyị na-ahụtụbeghị, nụ ụda anyị na-anụtụbeghị, nụkwa ísì anyị na-anụtụbeghị. Anyị chọsiri ike ịga kwusaa ozi ọma n’ebe ahụ.

Ma, ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị gbanwere n’obodo ahụ, anyị akwafee na Vietnam nke Ebe Ndịda. O wutere anyị na n’ime afọ abụọ anyị nọrọ ebe ahụ, ezigbo ọrịa bịara m. N’ihi ya, a gwara anyị ka anyị laghachi n’obodo anyị. Ihe ahụ́ m chọrọ bụ ka e nyetụ m oge ka m nweta onwe m. Ma, ozugbo m nwetara onwe m, anyị malitekwara ozi oge niile.

Mgbe a na-agba mụ na Angela ajụjụ ọnụ na tiivi n’afọ 1975

N’ọnwa atọ n’afọ 1965, m ghọrọ onye nlekọta sekit, mụ na nwunye m ebido ileta ọgbakọ dị iche iche. Ruo afọ iri atọ na atọ, anyị rụrụ ọrụ sekit na ọrụ distrikti nakwa ọtụtụ ọrụ a na-arụ tupu mgbakọ amalite na n’oge mgbakọ. Mgbakọ na-atọ m ụtọ kemgbe ụwa. N’ihi ya, inye aka na-ahazi ya mere m obi ụtọ. Anyị nọrọ na Niu Yọk Siti afọ ole na ole, meekwa ọtụtụ mgbakọ distrikti n’Ámá Egwuregwu Yanki.

ỊLAGHACHI BETEL NA ỊKỤZI IHE N’ỤLỌ AKWỤKWỌ NDỊ E NWERE

Ọrụ na-adịghị mfe ma na-atọ ụtọ nọ na-echere mụ na Angie otú ahụ ọ na-adị ọtụtụ ndị nọ n’ozi oge niile pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1995, a gwara m ka m kụziwe ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. Mgbe afọ atọ gara, a kpọrọ anyị ka anyị bịa jewe ozi na Betel. Obi tọgburu m atọgbu na m laghachiri n’ebe m bidoro ozi oge niile  pụrụ iche n’ihe karịrị afọ iri anọ tupu mgbe ahụ. M rụtụrụ ọrụ na Ngalaba Ije Ozi, kụziekwa ihe n’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova. N’afọ 2007, Òtù Na-achị Isi hiwere Ngalaba Na-ahụ Maka Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova ka ọ na-elekọta ụlọ akwụkwọ ndị a na-enwe na Betel. M lekọtara ngalaba ahụ ruo afọ ole na ole.

Anyị ahụla ọtụtụ ihe a gbanwere n’oge na-adịbeghị anya n’ihe gbasara ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova. A malitere Ụlọ Akwụkwọ Ndị Okenye Ọgbakọ n’afọ 2008. N’ime afọ abụọ, a zụrụ ihe karịrị puku ndị okenye iri na abụọ na Patasịn nakwa na Betel dị na Bruklin. A ka na-enwe ụlọ akwụkwọ ahụ n’ebe dị iche iche. Ndị na-akụzi ihe na ya bụ ndị nkụzi a zụrụ azụ na-anọghị na Betel. N’afọ 2010, a gụgharịrị Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi aha, ka ọ zawa Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị. E mechara malite ụlọ akwụkwọ ọzọ a kpọrọ Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye.

Malite n’afọ ije ozi 2015, e mere ka ụlọ akwụkwọ abụọ ahụ bụrụ otu, a kpọwazie ya Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ndị na-aga ya nwere ike ịbụ di na nwunye ma ọ bụ ụmụnna bụ́ ndị okokporo ma ọ bụ ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di. Obi dị ọtụtụ ụmụnna ụtọ n’ụwa niile ịnụ na a ga-enwe ụlọ akwụkwọ ahụ n’ọtụtụ alaka ụlọ ọrụ. Obi dị m ụtọ ịhụ ụlọ akwụkwọ dị iche iche e nwere ná nzukọ Jehova. Obi dịkwa m ụtọ na m matara ọtụtụ ndị gara ụlọ akwụkwọ ndị a.

M cheta ihe ndị mere malite mgbe m na-emebeghị baptizim n’ebe ahụ a na-agbanyere anụ ụlọ mmiri, m na-ekele Jehova maka ndị maara ihe nyeere m aka n’ọgbakọ. Mụ na ha niile abụghị ọgbọ ma ọ bụ si n’otu obodo. Ma n’ime obi m, ha bụ ụmụnna ji ofufe Jehova kpọrọ ihe. Omume ha na otú ha si ele ihe anya gosiri na ha ji obi ha niile hụ Jehova n’anya. Ná nzukọ ya, e nwere ọtụtụ ndị maara ihe anyị na ha nwere ike ịna-eje ije. Emeela m otú ahụ, ya abaara m ezigbo uru.

Obi na-adị m ụtọ ịhụ ụmụ akwụkwọ si n’ebe dị iche iche n’ụwa