Gianni na Maurizio bụ enyi kemgbe ihe dị ka afọ iri ise. Ma, e nwere mgbe nsogbu chọrọ ime ka ha tisaa. Maurizio kwuru, sị: “Mgbe ihe siri ike, m mere mmehie ụfọdụ dị oké njọ, nke mere ka anyị ghara ịdịzi ná mma.” Gianni kwukwara, sị: “Ọ bụ Maurizio mụụrụ m Baịbụl mgbe m malitere ịmụ ihe. Ọ na-enyere m aka n’ọgbakọ. N’ihi ya, ekwetaghị m na ọ ga-eme ihe ahụ o mere. Obi gbawara m n’ihi na ama m na anyị agaghịzi abụ enyi. Ọ dị m ka ụwa ọ̀ gwụla.”

EZIGBO ndị enyi bara uru. Mmadụ abụọ ịbụ enyi ma ghara itisa anaghị eme na mberede. E nwee ihe chọrọ ime ka enyi na enyi tisaa, gịnị ga-enyere ha aka ka ha ghara itisa? Anyị ga-amụta ọtụtụ ihe n’aka ụfọdụ ndị e kwuru okwu ha na Baịbụl, bụ́ ndị bụ́ ezigbo enyi ma nsogbu emechaa chọọ ime ka ha tisaa.

MGBE ENYI GỊ MEJỌRỌ

O doro anya na Eze Devid, bụ́ onye ọzụzụ atụrụ, nwere ezigbo ndị enyi. Jọnatan bụ otu n’ime ha nwere ike ịgbata gị n’obi. (1 Sam. 18:1) Ma, Devid nwere enyi ndị ọzọ, dị ka onye amụma bụ́ Netan. Baịbụl agwaghị anyị mgbe ha ghọrọ enyi. Ma, o nwere mgbe Devid kọọrọ Netan ihe ọ chọrọ ime otú ahụ enyi nwere ike ịkọrọ enyi ya. Devid chọrọ ịrụrụ Jehova ụlọ. Ọ ga-abụrịrị na Devid ejighị ihe Netan gwara ya gwuo egwu n’ihi na Netan bụ enyi ya, bụrụkwa onye nwere mmụọ nsọ Jehova.—2 Sam. 7:2, 3.

Ma, e nwere nsogbu chọrọ ime ka ha gharazie ịbụ enyi. Eze Devid na Bat-shiba kwara iko, Devid emechaa mee ka e gbuo  Yuraya bụ́ di ya. (2 Sam. 11:2-21) Kemgbe ọtụtụ afọ, Devid na-erubere Jehova isi, na-ekpekwa ikpe ziri ezi. Ma, o mechara mee mmehie a jọgburu onwe ya. Gịnị mere ezigbo eze a ji mee ụdị ihe a? Ọ̀ bụ na ọ maghị na ihe o mere jọgburu onwe ya? Ò chere na ya ga-ezochirili ya Chineke?

Gịnị ka Netan ga-eme? Ọ̀ ga-asị onye ọzọ gaa gwa eze mmehie ahụ o mere? Ndị ọzọ ma otú Devid si mee ka e gbuo Yuraya. N’ihi ya, gịnị mere Netan ga-eji tinye ọnụ n’okwu ahụ, meekwa ihe nwere ike ime ka ya na Devid ghara ịdịkwa ná mma? Ọ bụrụ na Netan ekwuo, e nwedịrị ike igbu ya. A sị ka e kwuwe, Devid mere ka e gbuo Yuraya na-enweghị ihe o mere.

Ma, Netan na-ekwuchitere Chineke. Onye amụma a ma na ọ gbachi nkịtị, ya na Devid agaghị adị ná mma otú ha dịbu, akọnuche ya ga na-amakwa ya ikpe. Enyi ya bụ́ Devid mere ihe na-adịghị Jehova mma. E kwesịrị inyere Devid aka ka ya na Jehova dịkwa ná mma. N’eziokwu, Devid chọrọ ezigbo enyi. Netan bụ ụdị enyi ahụ. O ji ihe atụ malite okwu ahụ ka o nwee ike ikwu ihe ga-eru Devid bụ́bu onye ọzụzụ atụrụ n’obi. Netan ziri Devid ozi Chineke ziri ya, ma o mere ya otú Devid ga-aghọta na ihe o mere jọgburu onwe ya, ya echegharịakwa.—2 Sam. 12:1-14.

Gịnị ka ị ga-eme ma enyi gị mejọọ ma ọ bụ mee mmehie dị oké njọ? I nwere ike iche na ịgwa ya ihe ọjọọ ahụ o mere ga-eme ka gị na ya ghara ịdị ná mma. I nwekwara ike iche na ị gwa ndị okenye ihe ahụ o mere, bụ́ ndị nwere ike inyere ya aka, ọ pụtara na i meela enyi gị ihe ọjọọ. Gịnị ka ị ga-eme?

Nwanna Gianni anyị kwuru okwu ya sịrị: “M ghọtara na ihe agbanweela. Maurizio anaghịzi akọrọ m ihe otú ọ na-emebu. M kpebiri ịgakwuru ya n’agbanyeghị na o siiri m ezigbo ike. M nọ na-eche, sị, ‘Gịnị ka m ga-agwa ya ọ na-amaghị? O nwere ike wee ezigbo iwe.’ Ma, mgbe m chetara ihe niile mụ na ya mụrụ, m katara obi gaa gwa ya okwu. E nweela mgbe Maurizio si otú ahụ nyere m aka. Achọghị m ka mụ na ya tisaa. Ma, m chọrọ inyere ya aka n’ihi na m hụrụ ya n’anya.”

Maurizio sịkwara: “Gianni kwuru otú ọ dị ya n’obi. Ihe ọ gwara m bụ eziokwu. Ama m na nsogbu m kpataara onwe m esighị yanwa ma ọ bụ Jehova n’aka. N’ihi ya, m nabatara aka ná ntị a dọrọ m, mụ na Jehova adịkwa ná mma ka oge na-aga.”

MGBE ENYI GỊ NỌ NÁ NSOGBU

Devid nwere ndị enyi ọzọ, bụ́ ndị ji obi ha niile na-enyere ya aka mgbe ihe siiri ya ike. Otu n’ime ha bụ Hushaị, onye Baịbụl kpọrọ “enyi Devid.” (2 Sam. 16:16; 1 Ihe 27:33) Ọ ga-abụ na ọ na-eje ozi n’obí eze, bụrụkwa onye ya na Devid na-anọ mgbe niile, onye na-agakwara eze ozi mgbe ụfọdụ.

Mgbe Absalọm bụ́ nwa Devid chụturu nna ya n’ocheeze, ọtụtụ ndị Izrel dụnyeere Absalọm úkwù. Ma, Hushaị emeghị otú ahụ. O so Devid mgbe ọ gbapụrụ. Obi gbawara Devid n’ihi na nwa ya na ụfọdụ ndị ọ tụkwasịrị obi gbara ya mgba okpuru. Ma, Hushaị ahapụghị Devid. Ọ dị njikere ịkụghasị nkata ọjọọ ahụ a kpara n’agbanyeghị na ime otú ahụ nwere ike ịta isi ya. Ihe mere o ji mee ya abụghị naanị maka na ọ na-ejere eze ozi. Ihe o mere gosiri na ọ bụ ezigbo enyi Devid.—2 Sam. 15:13-17, 32-37; 16:15–17:16.

Obi dị anyị ụtọ ịhụ otú ụmụnna anyị taa si dịrị n’otu n’ihi na ha hụrụ ibe ha n’anya, ọ bụghị n’ihi ọrụ e nyere ha n’ọgbakọ. Omume ha na-egosi na ha na-asị: “Ihe mere m ji bụrụ enyi gị abụghị  iji mezuo iwu, kama ọ bụ maka na ejighị m gị egwu egwu.”

Ọ bụ ihe otu nwanna aha ya bụ Federico chọpụtara. Ezigbo enyi ya bụ́ Antonio nyeere ya aka mgbe ihe siiri ya ike. Federico kwuru, sị: “Mgbe Antonio gafetara n’ọgbakọ anyị, ọ dịghị anya anyị aghọọ enyi. Anyị abụọ bụ ohu na-eje ozi, jirikwa obi ụtọ na-arụkọ ọrụ. N’oge na-adịghị anya, e mere ya okenye. Ọ bụghị naanị na ọ bụ enyi m, kama ọ na-enyekwara m aka n’ọgbakọ.” Federico mechara mee ihe na-adịghị mma. Ọ gara ozugbo ka ndị okenye nyere ya aka, ma o rughịzi eru ịbụ ọsụ ụzọ na ohu na-eje ozi. Gịnị ka Antonio mere?

Mgbe ihe siiri Federico ike, enyi ya bụ́ Antonio gere ya ntị, gbaakwa ya ume

Federico kwuru, sị: “M chọpụtara na Antonio ghọtara otú ọ dị m. Ọ gbalịsiri ike ịna-akasi m obi. Ọ chọsiri ike ka mụ na Chineke dịkwa ná mma. Ọ hapụghịkwa m. Ọ gbara m ume ka okwukwe m sie ike, ka m gharakwa ịda mbà.” Antonio sịrị: “M wepụtakwuru oge ka mụ na Federico na-anọ. M chọrọ ka obi na-eru ya ala ịkọrọ m ihe ọ bụla, ọ bụrụgodị ihe na-ewute ya.” Okwukwe Federico mechara siekwa ike. Ka oge na-aga, a họpụtara ya ịbụ ọsụ ụzọ na ohu na-eje ozi. Antonio kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na anyị abụọ anọghịzi n’otu ọgbakọ, anyị dị ná mma karịa otú anyị dịtụrụla.”

Ị̀ GA-ECHE NA ENYI GỊ AGBAALA GỊ MGBA OKPURU?

Olee otú obi ga-adị gị ma ezigbo enyi gị hapụ gị mgbe o kwesịrị inyere gị aka? Ụdị ihe a na-ewe ezigbo iwe. Ị̀ ga-agbaghara ya? Ùnu ga-emecha dị ná mma otú unu dịbu?

Chegodị ihe mere Jizọs mgbe ọ fọrọ ụbọchị ole na ole ka e gbuo ya. Ya na ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi anọọla ọtụtụ mgbe, ha na ya dịkwa n’otu n’ihi na ha hụrụ ibe ha n’anya. Ọ dabara adaba na Jizọs kpọrọ ha ndị enyi ya. (Jọn 15:15) Ma, gịnị mere mgbe a nwụchiri ya? Ndịozi ya hapụrụ ya gbaa ọsọ. Pita  ekwuola hoo haa na ọ gaghị ahapụ Nna ya ukwu. Ma n’otu abalị ahụ, Pita gọnahụrụ Jizọs.—Mat. 26:31-33, 56, 69-75.

Jizọs ma na ọ bụ naanị ya ka ọnwụnwa ikpeazụ ahụ ga-abịara. Ma, ihe ndị na-eso ụzọ ya mere kwesịrị iwute ya, ma ọ bụdị gbawaa ya obi. Ma, okwu ya na ndị na-eso ụzọ ya kwurịtara abalị ole na ole a kpọlitechara ya n’ọnwụ egositụdịghị na o wutere ya, na iwe were ya ma ọ bụ na ọ kwara mmakwaara. Jizọs abịaghị gụsịwa ihe ndị na-eso ụzọ ya mejọrọ, ma nke ha mere n’abalị ahụ a nwụchiri ya.

Kama, Jizọs mesiri Pita na ndịozi ndị ọzọ obi ike. Iji gosi na ọ tụkwasịrị ha obi, ọ gwara ha otú ha ga-esi kwusaa ozi ọma, bụ́ ọrụ kacha mkpa a rụtụrụla kemgbe ụwa. Jizọs ka weere ndịozi ya ka ndị enyi ya. Ha echefughị otú Jizọs si hụ ha n’anya. Ha ga-agbalịsi ike ka ha ghara ime ihe ga-ewute Nna ha ukwu ọzọ. N’eziokwu, ha rụrụ ọrụ ahụ Jizọs nyere ndị niile na-eso ụzọ ya.—Ọrụ 1:8; Kọl. 1:23.

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Elvira chetara mgbe ya na ezigbo enyi ya bụ́ Giuliana nwere nghọtahie. Ọ sịrị: “Mgbe ọ gwara m na ihe m mere were ya iwe, ahụ́ nwụrụ m. O kwesịrị iwe iwe. Ma, ihe tọrọ m ụtọ bụ na ọ na-echegbu onwe ya banyere m nakwa nsogbu ihe ahụ m mere ga-akpata. Obi dị m ụtọ na o lekwasịghị anya n’ihe ọjọọ ahụ m mere ya, kama o lekwasịrị anya ná nsogbu m na-akpatara onwe m. M kelere Jehova na enwere m enyi na-echere m echiche ọma n’agbanyeghị na m mere ihe were ya iwe.”

N’ihi ya, olee ihe ezigbo enyi ga-eme ma e nwee ihe chọrọ ime ka ya na enyi ya tisaa? O kwesịrị ịdị njikere iji obiọma gwa enyi ya okwu, kwuokwa otú ọ dị ya n’obi. Ụdị enyi ahụ ga-adị ka Netan na Hushaị, bụ́ ndị na-ahapụghị Devid ma mgbe ihe siiri ya ike. Ọ ga-adịkwa ka Jizọs, bụ́ onye gbaghaara ndịozi ya. Ị̀ bụ ụdị enyi a?