Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mach 2017

Ị̀ Ga-echebara Ihe Ndị E Dere n’Oge Gara Aga Echiche?

Ị̀ Ga-echebara Ihe Ndị E Dere n’Oge Gara Aga Echiche?

“E dekwara ha ede ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị, anyị ndị ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a bịakwasịworo.”—1 KỌR. 10:11.

ABỤ: 11, 61

1, 2. Gịnị mere anyị ga-eji mụọ gbasara ihe ndị eze anọ chịrị Juda mere?

Ị HỤ ebe ihe chịturu mmadụ, ya adaa, ọ̀ bụ na ị gaghị akpachara anya ma ị gafewe ebe ahụ? Ichebara ihe ndị ọzọ mejọrọ echiche nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara imejọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ofufe anyị na-efe Jehova. Anyị ga-amụta ihe bara uru n’ihe ndị ọzọ mejọrọ, ma ndị e dere banyere ha na Baịbụl.

2 Ndị eze anọ ahụ chịrị Juda anyị mụrụ gbasara ha n’isiokwu bu nke a ụzọ ji obi ha niile fee Jehova. Ma, ha mekwara mmehie jọgburu onwe ya. Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe mere ha, oleekwa otú anyị ga-esi gbaara ihe ha mere ọsọ? Ichebara ihe ha mere echiche ga-enyere anyị aka ịmụta ihe n’ihe e dere n’oge gara aga, bụ́ ndị e dere iji nye anyị ntụziaka.—Gụọ Ndị Rom 15:4.

ỊTỤKWASỊ AMAMIHE MMADỤ OBI NA-AKPATA ỌDACHI

3-5. (a) Ọ bụ eziokwu na Esa ji obi ya niile na-efe Jehova, olee ihe o mejọrọ? (b) Olee ihe ọ ga-abụ ya mere Esa ji tụkwasị mmadụ obi mgbe Beasha bịara ibuso Juda agha?

3 Ka anyị burugodị ụzọ mụọ gbasara Esa ma chọpụta uru Okwu Chineke ga-abara anyị. Esa tụkwasịrị Jehova obi  mgbe otu nde ndị agha Itiopia bịara ibuso ndị Juda agha. Ma, ọ tụkwasịghị Jehova obi mgbe Beasha bụ́ eze Izrel malitere iwusikwu obodo Rema ike, bụ́ obodo ha na Juda gbara agbata obi. (2 Ihe 16:1-3) Mgbe Eze Beasha bịara ịlụso Esa agha, Esa tụkwasịrị amamihe ya obi ma nye Ben-hedad bụ́ eze Siria aka azụ ka ọ gaa buso Beasha agha. Ihe a Esa mere ọ̀ gaziiri ya? Baịbụl sịrị na mgbe “Beasha nụrụ ya, ọ kwụsịrị iwu Rema ozugbo, kwụsịkwa ọrụ ọ nọ na-arụ.” (2 Ihe 16:5) N’ihi ya, ihe Esa mere gaziiri ya ma e lee ya anya elu elu.

4 Ma, olee otú Jehova si lee ihe Esa mere anya? Chineke zigara onye amụma ya bụ́ Hanenaị ka ọ gaa baara Esa mba maka na ọ tụkwasịghị Jehova obi. (Gụọ 2 Ihe E Mere 16:7-9.) Hanenaị gwara ya, sị: “Malite ugbu a gaa n’ihu, a ga na-ebuso gị agha.” Beasha lawara. Ma, a nọ na-ebuso Esa na ndị ya agha n’oge niile ọ na-achị.

5 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị mụtara na Chineke nyochara obi Esa ma hụ na o ji obi ya niile na-efe ya. (2 Ihe 15:17) N’anya Chineke, Esa bụ onye ezi omume n’ihi na ọ na-eme ihe Chineke chọrọ. Ma, e nwere ihe ndị Esa mejọrọ, ya ejirikwa isi ya buru ihe o metara. Mgbe Beasha bịara ịlụso Esa agha, gịnị mere Esa ji tụkwasị ma onwe ya ma Ben-hedad obi kama ịtụkwasị Jehova obi? Ọ̀ ga-abụ na o chere na ya ga-emerili n’agha ahụ ma o jiri akọ hazie otú ọ ga-esi lụọ ya kama ịrịọ Chineke ka o nyere ya aka? Ọ̀ ga-abụ na o gere ntị na ndụmọdụ na-adịghị mma ndị ọzọ nyere ya?

6. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Esa mejọrọ? Kọwaa.

6 Ihe anyị mụrụ gbasara Esa, ọ̀ ga-eme ka anyị chebara ihe anyị na-eme echiche? Mgbe nsogbu anyị chere na anyị agaghị edili bịaara anyị, o nwere ike dịrị anyị mfe ịtụkwasị Jehova obi. Ma, gịnị ka anyị na-eme ma obere nsogbu bịara anyị? Ànyị na-atụkwasị onwe anyị obi, na-agbalị ka anyị dozie nsogbu ahụ n’onwe anyị? Ka ànyị na-ebu ụzọ lebara ihe Baịbụl kwuru anya ma gbalịa mee ya, si otú ahụ gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi ka o doziere anyị nsogbu ahụ? Dị ka ihe atụ, ndị ezinụlọ gị nwere ike na-emegide gị maka na ị chọrọ ịga ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbakọ. Gị arịọ Jehova ka o duzie gị nakwa ka o nyere gị aka ka ị mata ihe ị ga-eme. Gịnịkwa ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na i nweghịzi ọrụ, ya ana-esiri gị ike inweta ọrụ ọzọ? Mgbe gị na onye chọrọ iwe gị n’ọrụ na-ekwurịta, ị̀ ga-agwa ya na ị ga na-aga ọmụmụ ihe n’izu ọ bụla? Nsogbu ọ bụla ọ bụ, anyị kwesịrị ime ihe ọbụ abụ kwuru. Ọ sịrị: “Nyefee ụzọ gị n’aka Jehova, dabere n’ebe ọ nọ, ya onwe ya ga-emekwa ihe.”—Ọma 37:5.

GỊNỊ NWERE IKE IME MA GỊ NA NDỊ ỌJỌỌ NA-AKPA?

7, 8. Olee ihe Jehọshafat mejọrọ, oleekwa ihe merenụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

7 Ka anyị leba anya n’ihe nwa Esa, bụ́ Jehọshafat, mere. O nwere ọtụtụ àgwà ọma, meekwa ọtụtụ ihe ọma n’ihi na ọ tụkwasịrị Chineke obi. Ma, o mekwara ihe na-adịghị mma. Dị ka ihe atụ, ya na ajọ Eze Ehab, bụ́ onye na-achị alaeze ebe ugwu, gọrọ ọgọ. Jehọshafat mechara soro Ehab buso ndị Siria agha n’agbanyeghị na onye amụma bụ́ Mịkaya gwara ya agala. Ọ fọrọ obere ka e gbuo ya n’agha ahụ. O mechaziri laghachi Jeruselem. (2 Ihe 18:1-32) Onye amụma bụ́ Jihu jụrụ ya, sị: “Ọ̀ bụ ndị ajọ  omume ka e kwesịrị inyere aka, ọ̀ bụkwa ndị kpọrọ Jehova asị ka i kwesịrị ịhụ n’anya?”—Gụọ 2 Ihe E Mere 19:1-3.

8 Jehọshafat ọ̀ mụtara ihe n’ihe mere ya? Ọ bụ eziokwu na ọ kwụsịghị iji ịnụ ọkụ n’obi na-eme ihe dị Jehova mma, o yiri ka ọ mụtaghị ihe n’ihe mere mgbe o so Ehab gaa agha nakwa n’aka ná ntị Jihu dọrọ ya. Ọ gakwara meta onye ọjọọ ọzọ, bụ́ onye iro Chineke, enyi. Na nke ugbu a, ọ bụ ajọ Eze Ehazaya, bụ́ nwa Ehab ka o metara enyi. Jehọshafat na Ehazaya rụrụ ụgbọ mmiri. Ma, ụgbọ mmiri ndị ahụ mechara kpuo, ha ejighịkwa ha mee ihe ha bu n’obi rụọ ha.—2 Ihe 20:35-37.

9. Olee ihe nwere ike ime ma anyị na ndị ọjọọ na-akpa?

9 Ịgụ akụkọ Jehọshafat kwesịrị ime ka anyị chebara ihe ndị anyị na-eme echiche. Maka gịnị? Eze Jehọshafat bụ ezigbo mmadụ. O mere ihe dị mma, ‘jirikwa obi ya dum chọọ Jehova.’ (2 Ihe 22:9) Ma, ọ gara, ya na ndị ọjọọ ana-akpa, ya akpatara ya nsogbu. Cheta ihe Baịbụl kwuru n’akwụkwọ Ilu. Ọ sịrị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” (Ilu 13:20) Ihe ọzọ bụ na anyị nwere ike na-agbalị inyere ndị nwere mmasị aka ka ha bịa fee Jehova. Ma, otú Jehọshafat na Ehab si kpachie anya gaara ata isi Jehọshafat. Anyịnwa nwekwara ike ịba ná nsogbu ma anyị na ndị na-anaghị efe Jehova na-akpachi anya.

10. (a) Ọ bụrụ na anyị na-achọ onye anyị ga-alụ, gịnị ka anyị ga-amụta n’aka Jehọshafat? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị icheta gbasara imete ndị ọjọọ enyi?

10 Olee ihe bara uru anyị ga-amụta n’ihe mere Jehọshafat? Onye Kraịst nwere ike ikwe ka onye na-ahụghị Jehova n’anya rie ya obi, ya echewe na ya agaghị achọtali onye ọ ga-alụ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ nwanna nwaanyị, ndị ezinụlọ ya na-anọghị n’ọgbakọ nwere ike na-enye ya nsogbu ka ọ lụọ di tupu ya aghọọ ọtọ n’aka nne. Ihe ọzọ bụ na o nwere ike dịrị ụfọdụ otú ahụ ọ dị otu nwanna nwaanyị bụ́ onye kwuru, sị: “Ịchọ onye ga-ahụ anyị n’anya na onye anyị na ya ga na-anọ dị anyị  n’ọbara.” Gịnị ka Onye Kraịst kwesịrị ime? Ichebara ihe mere Jehọshafat echiche nwere ike nyere ya aka. Jehọshafat na-arịọkarị Jehova ka o duzie ya. (2 Ihe 18:4-6) Ma, gịnị mere mgbe Jehọshafat metere Ehab enyi, bụ́ onye na-ahụghị Jehova n’anya? Jehọshafat kwesịrị icheta na anya Jehova na-ahụ ndị ji obi ha niile na-efe ya. N’oge anyị a kwa, Jehova “na-ahụzu ụwa dum,” ọ dịkwa njikere igosi anyị “ike ya.” (2 Ihe 16:9) Ọ ghọtara otú ihe si dịrị anyị. Ọ hụkwara anyị n’anya. Ì nwere okwukwe na Chineke ga-eme ka i nweta onye ga-ahụ gị n’anya na onye gị na ya ga na-anọ? Ka obi sie gị ike na ọ ga-eme otú ahụ mgbe oge ruru.

Mata na ị ga-aba ná nsogbu ma gị na onye na-anaghị efe Jehova na-akpachi anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

EKWELA KA OBI GỊ DỊRỊ MPAKO

11, 12. (a) Olee otú Hezekaya si gosi ihe dị ya n’obi? (b) Gịnị mere iwe Chineke abịakwasịghị Hezekaya?

11 Ihe anyị ga-amụta n’aka Hezekaya gbasara obi anyị. N’otu oge, Jehova bụ́ Onye na-enyocha obi mere ka a mata ihe dị Hezekaya n’obi. (Gụọ 2 Ihe E Mere 32:31.) Mgbe ezigbo ọrịa bịara Hezekaya, Chineke nyere ya ihe ịrịba ama na-egosi na ọ ga-agbake, ya bụ, onyinyo lara azụ. Ọ ga-abụ na ndị isi Babịlọn zitere ndị bụ́ ọnụ na-ekwuru ha ka ha jụọ Hezekaya banyere ihe ịrịba ama ahụ. (2 Eze 20:8-13; 2 Ihe 32:24) Hezekaya gosiri ndị Babịlọn ahụ “ụlọ ndebe akụ̀ ya dum,” nke mere ka a mata ihe dị ya n’obi mgbe Chineke “hapụrụ ya.” Nzuzu a Hezekiah zuzuru gbara “ihe niile dị ya n’obi” n’anwụ.

12 Baịbụl agwaghị anyị ihe mere obi Hezekaya ji dị mpako. Ọ̀ ga-abụ maka na o meriri ndị Asiria, ka ọ̀ ga-abụ maka na Chineke rụrụ ọrụ ebube gwọọ ya? Ka ọ̀ ga-abụ n’ihi na o nwere “akụnụba na ebube nke ukwuu”? Nke ọ bụla ọ bụ, mpako Hezekaya mere ka ọ ghara igosi na obi dị ya ụtọ maka “ihe ọma e meere ya.” Ọ dị mwute. Ọ bụ eziokwu na Hezekaya rịọrọ Chineke ka o cheta otú o si jiri obi ya niile na-efe ya, e nwere mgbe Hezekaya mere ihe na-adịghị Jehova mma. Ma, o mechara ‘weda onwe ya ala.’ N’ihi ya, iwe Chineke abịakwasịghị ya na ndị ya.—2 Ihe 32:25-27; Ọma 138:6.

13, 14. (a) Olee mgbe Jehova nwere ike ‘hapụ anyị iji lee anyị ule’? (b) Olee ihe anyị ga-eme ma a jaa anyị mma maka ihe anyị mere?

13 Olee ihe anyị ga-amụta ma anyị gụọ akụkọ Hezekaya ma chebara ya echiche? Cheta na Hezekaya malitere ịdị mpako mgbe Jehova mere ka o merie Senakerib n’agha, gwọọkwa ya ọrịa ya. Ọ bụrụ na ihe ọma meere anyị, ò nwere ike bụrụ na Jehova ‘hapụrụ anyị iji lee anyị ule,’ ka a mata ihe dị anyị n’obi? Dị ka ihe atụ, nwanna nwere ike gbaa mbọ kwado ihe omume e nyere ya ná mgbakọ ma mee ya, ọtụtụ ndị ajaa ya mma maka ya. Gịnị ka ọ ga-eme?

14 A jaa anyị mma, anyị kwesịrị icheta ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Unu onwe unu, mgbe unu mere ihe niile e kenyere unu, sịnụ, ‘Anyị bụ ndị ohu na-abaghị uru ọ bụla. Ihe anyị mere bụ ihe anyị kwesịrị ime.’” (Luk 17:10) E nwere ihe ọzọ anyị ga-amụta n’ihe Hezekaya mere. Mpako ọ dị mere ka ọ ghara igosi na obi dị ya ụtọ maka “ihe ọma e meere ya.” Anyị chebara ọtụtụ ihe ọma Chineke meere anyị echiche, ọ ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịkpa àgwà na-adịghị ya mma. Anyị ga na-agwa ndị ọzọ banyere Jehova nakwa ihe ọma ndị o meere anyị. Ọ bụ ya nyere anyị ma Akwụkwọ Nsọ ma mmụọ nsọ na-enyere anyị aka.

 KPACHARA ANYA MGBE Ị NA-EKPEBI IHE Ị GA-EME

15, 16. Gịnị mere Josaya ji nwụọ n’agha?

15 N’ikpeazụ, gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe mere Eze Josaya? Chegodị ihe mere o ji nwụọ n’agha. (Gụọ 2 Ihe E Mere 35:20-22.) Josaya ‘gara ibuso’ Niko bụ́ eze Ijipt agha n’agbanyeghị na eze ahụ gwara ya na o nweghị ihe na-esere ya na ya. Baịbụl sịrị na ihe Niko kwuru “si n’ọnụ Chineke.” Gịnịzi mere Josaya ji gaa ibuso Niko agha? Baịbụl ekwughị.

16 Ma, olee otú Josaya ga-esi mara na ihe Niko kwuru si n’ọnụ Jehova? Ọ gaara ajụ Jeremaya, bụ́ otu n’ime ndị amụma na-erubere Chineke isi. (2 Ihe 35:23, 25) Ma, Baịbụl ekwughị na o mere otú ahụ. Ihe ọzọ bụ na Niko na-aga Kakemish ka ọ gaa buso “ụlọ ọzọ” agha, ọ bụghị Jeruselem. Agha ahụ agbasaghị aha Chineke. Niko akparịghịkwa Jehova ma ọ bụ ndị ya. N’ihi ya, Josaya ekwesịghị ịga buso Niko agha. Ò nwere ihe anyị ga-amụta n’ihe a? Mgbe nsogbu bịaara anyị, anyị kwesịrị ibu ụzọ tụlee ihe Jehova chọrọ ka anyị mee banyere nsogbu ahụ.

17. Mgbe nsogbu bịaara anyị, olee otú anyị ga-esi ghara imejọ ụdị ihe ahụ Josaya mejọrọ?

17 Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, anyị kwesịrị ibu ụzọ chee ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ma mee ihe anyị kwesịrị ime. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịgakwuru ndị okenye. O nwere ike bụrụ na anyị ebula ụzọ chebara ihe ahụ echiche, meekwa nchọnchọ n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Ma, e nwere ike inwe ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru anyị kwesịrị ichebara echiche, bụ́ ihe okenye nwere ike inyere anyị aka ịtụle. Dị ka ihe atụ, nwanna nwaanyị ma na o kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 4:20) Ma, ka e were ya na e nwere ụbọchị o bu n’obi ịga ozi ọma, ma di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova chọrọ ka ọ nọrọ n’ụlọ n’ihi na ọ dịla anya ya na nwunye ya nọrịrị, e nwekwara ebe ọ chọrọ ịkpọ ya aga. Nwanna nwaanyị ahụ nwere ike tụlee amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara irubere Chineke isi na iwu Jizọs nyere ka e kwusaa ozi ọma. (Mat. 28:19, 20; Ọrụ 5:29) Ma, o kwesịkwara icheta na nwunye kwesịrị ido onwe ya n’okpuru di ya nakwa na onye na-efe Chineke kwesịrị inwe ezi uche. (Efe. 5:22-24; Fil. 4:5) Di ya ọ̀ chọrọ ịkwụsị ya ịga ozi ọma, ka ọ̀ bụ naanị ka ya na ya nọrịa n’ụbọchị ahụ? Anyị kwesịrị iji ezi uche na-eme ihe Chineke chọrọ ma na-agbalị ka anyị nwee akọnuche dị ọcha.

JIRI OBI GỊ NIILE NA-EFE JEHOVA, NA-AṄỤRỊKWA ỌṄỤ

18. Olee uru ọ ga-abara gị ma ị na-echebara akụkọ ndị eze anọ ndị ahụ a kọrọ n’isiokwu a echiche?

18 Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, mgbe ụfọdụ, anyị nwekwara ike mee otu n’ime mmehie ndị eze anọ ndị ahụ anyị kwuru banyere ha mere. Nke mbụ, anyị nwere ike ịtụkwasị amamihe anyị obi. Nke abụọ, anyị nwere ike mete ndị ọjọọ enyi. Nke atọ, anyị nwere ike ịdị mpako. Nke anọ, anyị nwere ike kpebie ihe anyị ga-eme n’ebughị ụzọ chee ihe bụ́ uche Chineke gbasara ihe ahụ. Obiọma Jehova mere ka ọ na-ahụta ihe anyị na-emeta, otú ahụ ọ hụtara ihe dị mma ndị eze anọ ahụ mere. Jehova na-ahụ otú anyị hụruru ya n’anya na otú anyị chọrọ ijeruru ya ozi. Ọ bụ ya mere o ji nye anyị ihe atụ ndị a iji nyere anyị aka ka anyị ghara ime mmehie jọgburu onwe ya. Ka anyị na-echebara akụkọ ndị a a kọrọ na Baịbụl echiche, na-ekelekwa Jehova maka na o mere ka e dee ha na Baịbụl.