Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mach 2017

A Hụrụ Aha Dị na Baịbụl n’Iberibe Ite Ndị Mgbe Ochie

A Hụrụ Aha Dị na Baịbụl n’Iberibe Ite Ndị Mgbe Ochie

N’afọ 2012, ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie hụrụ iberibe ite gbarala puku afọ atọ. Obi tọgburu ndị na-eme nchọpụta atọgbu. Maka gịnị? Ọ bụghị n’ihi iberibe ite ndị ahụ, kama ọ bụ n’ihi ihe e dere na ha.

Mgbe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie wekọtara iberibe ite ndị ahụ, ha matara ihe ndị Kenan oge ochie dere n’ite ahụ. Ihe e dere na ya bụ: “Eshbel Ben [nwa] Beda’.” Ihe a bụ nke mbụ ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie hụrụ ebe e dere aha a n’ihe ndị mgbe ochie.

E nwere onye ọzọ a kpọrọ Eshbel na Baịbụl. O so n’ụmụ ndị nwoke Eze Sọl mụrụ. (1 Ihe 8:33; 9:39) Otu ọkachamara aha ya bụ Yusef Garfinke, bụ́ onye so ná ndị gwutere iberibe ite ahụ, kwuru, sị: “Anyị kwesịrị icheta na aha ahụ bụ́ Eshbel dị na Baịbụl, dịrịkwa n’ihe e dere n’ihe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọpụtara, ma ọ bụ naanị n’oge Eze Devid na-achị.” Ụfọdụ chere na ọ bụ naanị ndị oge ahụ na-aza ụdị aha ahụ. Ihe a bụ ihe ọzọ na-egosi otú ihe ndị mgbe ochie si akwado ihe Baịbụl kwuru.

Na Baịbụl, aha ọzọ a kpọrọ Eshbel bụ́ nwa Sọl bụ Ish-boshet. E ji “boshet” dochie “bel.” (2 Sam. 2:10) N’ihi gịnị? Ndị na-eme nchọpụta kwuru na ọ ga-abụ na onye dere Samuel nke Abụọ achọghị ide Eshbel n’ihi na ọ ga-eme ka ndị Izrel chewe gbasara Bel, bụ́ chi mmiri ozuzo ndị Kenan fere. Ma, aha ahụ bụ́ Eshbel ka dị n’akwụkwọ Ihe E Mere nke Mbụ.