“N’ihi nke a ka m ji bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.”—JỌN 18:37.

ABỤ: 15, 74

1, 2. (a) Gịnị mere ụwa ji na-ekewa n’ike n’ike? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

OTU nwanna nwaanyị bi n’ebe ndịda Yurop chetara ihe ndị o mere n’oge gara aga. Ọ sịrị: “Malite mgbe m dị obere, ihe juru ebe niile bụ ikpe na-ezighị ezi. N’ihi ya, otú ndị ọchịchị si achị n’obodo anyị anaghị amasị m. M sokwa ná ndị na-akwado ka a gbanwee ọchịchị. Nke bụ́ eziokwu bụ na m bụ enyi nwaanyị otu onye na-eyi ọha egwu ruo ọtụtụ afọ.” Otu nwanna bi n’ebe ndịda Afrịka kwuru ihe mere o jibu na-eme ihe ike. Ọ sịrị: “M kweere na ndị agbụrụ m ka ndị agbụrụ ọzọ mma. M banyere n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị. A gwara anyị ka anyị jiri ube gbuo onye ọ bụla na-emegide anyị, ma ndị agbụrụ anyị nọ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ.” Nwanna nwaanyị bi na Yurop kwukwara, sị: “Akpọrọ m onye ọ bụla si n’obodo ọzọ ma ọ bụ onye si n’okpukpe ọzọ asị.”

2 Ọtụtụ ndị taa na-akpakwa àgwà otú ahụ mmadụ atọ a kpara. Òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche na-akpata ọgba aghara ka ha nwee ike inwere onwe ha. Ndị mmadụ na-alụ ọgụ n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ọtụtụ obodo, a na-akpọ ndị mbịarambịa asị. Baịbụl kwuru na n’oge ikpeazụ na ndị dị iche iche ga-abụ “ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla.” (2 Tim. 3:1, 3) Ebe ọ bụ na ụwa na-ekewa n’ike n’ike,  olee otú Ndị Kraịst ga-esi na-adị n’otu? Anyị ga-amụta ọtụtụ ihe n’ihe Jizọs mere n’oge ya mgbe e nwere ọgba aghara n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ka anyị tụlee ajụjụ atọ dị mkpa. Ha bụ, gịnị mere Jizọs etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla? Olee otú o si gosi na ndị ohu Chineke ekwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị? Olee otú o si kụziere anyị na anyị ekwesịghị itinye aka n’ọgba aghara?

JIZỌS Ọ̀ KWADORO NDỊ CHỌRỌ ỊCHỊ ONWE HA?

3, 4. (a) N’oge Jizọs, olee ihe ndị Juu nọ na-atụ anya ya? (b) Olee otú ihe a si kpaa ndịozi Jizọs aka?

3 Ọtụtụ ndị Juu Jizọs ziri ozi ọma chọsiri ike inwere onwe ha n’aka ndị Rom. Ndị Juu bú ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’isi gbalịsiri ike ime ka ọ na-enu ndị Juu ndị ọzọ enu n’obi inwere onwe ha. Ọtụtụ n’ime ndị a bú ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’isi sonyeere Judas onye Galili. Ọ bụ mesaya ụgha duhiere ọtụtụ ndị n’oge ndịozi Jizọs. Onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Josifọs kwuru na Judas “mere ka ndị obodo ya nupụrụ ndị Rom isi, ma kpọọ ndị na-akwụ ndị Rom ụtụ isi ndị ụjọ.” Ndị Rom mechakwara gbuo Judas. (Ọrụ 5:37) Ụfọdụ n’ime ndị ahụ bú ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’isi mechadịrị kpata ọgba aghara ka ha nwee ike inweta ihe ha bu n’obi.

4 E wezụga ndị Juu ndị ahụ bú ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’isi, ndị Juu ndị ọzọ na-atụsi anya ike ka Mesaya bịa. Ha chere na ọ bịa, ọ ga-eme ka ha nwere onwe ha n’aka ndị Rom, meekwa ka Izrel bụrụ mba ukwu. (Luk 2:38; 3:15) Ọtụtụ ndị kweere na Mesaya ga-eme ka alaeze ya dịrị ná mba Izrel. Ọ bụrụ na o mee, ọtụtụ nde ndị Juu bi n’ebe dị iche iche ga-alọta. Cheta na o nwere mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim jụrụ Jizọs, sị: “Ọ̀ bụ gị bụ Onye ahụ nke Na-abịa, ka ànyị ga-atụwa anya onye ọzọ?” (Mat. 11:2, 3) Ọ ga-abụ na Jọn chọrọ ịma ma à ga-enwe onye ọzọ ga-emere ndị Juu ihe ha na-atụ anya ya. Ndị na-eso ụzọ Jizọs abụọ ahụ hụrụ ya mgbe ha nọ n’ụzọ na-aga Emeọs tụrụ anya na Jizọs gaara eme ka ndị Izrel nwere onwe ha. (Gụọ Luk 24:21.) Obere oge ihe a mechara, ndịozi Jizọs jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ na-eweghachiri Izrel alaeze ahụ n’oge a?”—Ọrụ 1:6.

5. (a) Gịnị mere ndị Galili ji chọọ ka Jizọs bụrụ eze ha? (b) Olee otú Jizọs si gbazie ha?

5 O doro anya na ihe ndị ahụ ha na-atụ anya ka Mesaya meere ha mere ka ndị Galili chọọ ka Jizọs bụrụ eze ha. Ọ ga-abụ na ha chere na Jizọs ga-abụ ezigbo onye ọchịchị. Ọ bụ ezigbo ọkà okwu, ọ ga-agwọli ndị ọrịa, ma nye ndị agụụ na-agụ nri. Mgbe Jizọs nyere puku mmadụ ise nri, o juru ha anya. Ọ ghọtara ihe ha chọrọ ime. Baịbụl sịrị: “Ebe Jizọs maara na ha na-achọ ịbịa jide ya ka ha mee ya eze, ọ gaghachiri n’ugwu ahụ naanị ya.” (Jọn 6:10-15) N’echi ya, ọ ga-abụ na isi ajụọla ndị Galili ahụ chọrọ ime Jizọs eze oyi. N’ihi ya, Jizọs gwara ha na ihe mere ya ji bịa abụghị ka o nye ha nri, kama, ka ọ kụziere ha gbasara Alaeze Chineke. Ọ gwara ha, sị: “Rụọnụ ọrụ, ọ bụghị iji nweta nri nke na-ala n’iyi, kama iji nweta nri na-adịgide adịgide nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.”—Jọn 6:25-27.

6. Olee otú Jizọs si mee ka o doo anya na ya achọghị ịbụ onye ọchịchị n’ụwa? (Lee ihe nke mbụ e sere ná mmalite isiokwu a.)

6 Obere oge tupu Jizọs anwụọ, ọ ghọtara na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya na-atụ anya ka ọ nọrọ na Jeruselem na-achị. O meere ha ihe atụ gbasara maịna, si otú ahụ gbazie ha. Ihe ọ pụtara bụ na  Jizọs bụ́ “nwoke nke si n’ezinụlọ eze,” ga-aga ebe ọzọ nọrọ ruo ogologo oge. (Luk 19:11-13, 15) Jizọs gwara Pọntiọs Paịlet na ya anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Pọntiọs Paịlet jụrụ ya, sị: “Ị̀ bụ eze ndị Juu?” (Jọn 18:33) Ọ ga-abụ na Paịlet na-atụ ụjọ na Jizọs ga-eme ka ndị mmadụ nupụrụ ndị Rom isi. Jizọs zara ya, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Jọn 18:36) Jizọs jụrụ itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ihi na Alaeze ya dị n’eluigwe. Ọ gwara Paịlet na ihe mere o ji bịa n’ụwa bụ ka ọ “gbaara eziokwu àmà.”—Gụọ Jọn 18:37.

Ị̀ na-elekwasị anya ná nsogbu ụwa ka ọ̀ bụ n’Alaeze Chineke? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Gịnị mere o nwere ike iji sie ike ịghara ịkwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla ma n’obi anyị?

7 Anyị ghọta ihe bụ́ ọrụ anyị nke ọma otú ahụ Jizọs si ghọta nke ya, anyị agaghị akwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla ma n’obi anyị. Ma, o nwere ike isi ike. Otu onye nlekọta sekit kwuru, sị: “N’ebe m bi, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-agbazi ndị mmadụ ara. Ha na-ewere ya na ndị obodo ha ka ndị ọzọ mma, nakwa na ihe ga-aka mma ma ha jiri aka ha na-achị onwe ha. Obi dị m ụtọ na ụmụnna lekwasịrị anya n’ikwusa ozi ọma Alaeze ma si otú ahụ dịrị n’otu. Ha tụkwasịrị Chineke obi na ọ bụ ya ga-eme ka ikpe ziri ezi dịrị n’ụwa, meekwa ka nsogbu anyị ndị ọzọ bie.”

OLEE OTÚ JIZỌS SI GHARA ITINYE AKA NA NDỌRỌ NDỌRỌ ỌCHỊCHỊ?

8. Olee nsogbu ndị Juu nọ na ya n’oge Jizọs?

8 Ikpe na-ezighị ezi juru ebe niile na-eme ka ndị mmadụ na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’oge Jizọs, ịkwụ ụtụ isi mere ka ọtụtụ ndị tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Nke bụ́ eziokwu bụ na Judas onye Galili nupụụrụ ndị Rom isi n’ihi na ha na-edeba aha ndị mmadụ n’akwụkwọ iji hụ na ha kwụrụ ụtụ isi. Ndị Rom chọrọ ka ndị ha na-achị, ma ndị gere Jizọs ntị na-akwụ ụtụ isi maka ala, ụlọ, na ihe ndị ọzọ. Ndị ọnaụtụ na-arụrụ aka nke mere ka nsogbu ịkwụ ụtụ isi ka njọ. Mgbe ụfọdụ, ha na-akwụ ndị nọ n’ọkwá ukwu ụgwọ ka ha nye ha ikike ịnakọta ụtụ isi. Ha na-esizi n’ego ndị ahụ ha nakọtara enweta nnukwu ego. Zakịọs, onyeisi ndị ọnaụtụ bi na Jeriko bara ọgaranya n’ihi na ọ na-eme ka ndị mmadụ na-akwụ nnukwu ụgwọ. (Luk 19:2, 8) Ọ ga-abụ na ọtụtụ ndị ọnaụtụ na-emekwa ihe a ọ na-eme.

9, 10. (a) Olee otú ndị iro Jizọs si gbalịa ime ka o tinye ọnụ n’ihe gbasara ọchịchị? (b) Olee ihe anyị mụtara n’ihe Jizọs zara ha? (Lee ihe nke abụọ e sere ná mmalite isiokwu a.)

9 Ndị iro Jizọs gbalịrị ime ka o tinye ọnụ n’ihe gbasara ịkwụ ụtụ isi. Ha jụrụ ya banyere “ụtụ isi,” ya bụ, otu mkpụrụ  ego ndị Rom chọrọ ka ndị ha na-achị kwụọ. (Gụọ Matiu 22:16-18.) Ịkwụ ụtụ isi a na-ewe ndị Juu ezigbo iwe n’ihi na ọ na-echetara ha na ọ bụ ndị Rom na-achị ha. “Ndị òtù Herọd,” bụ́ ndị kwulitere okwu a, chere na ọ bụrụ na Jizọs ekwuo na ha ekwesịghị ịkwụ ụtụ isi, ha ga-ekwu na ọ na-agba ọchịchị ndị Rom mgba okpuru. Ọ bụrụkwanụ na ọ sị na ha kwesịrị ịkwụ ụtụ isi, ndị mmadụ ga-akwụsị iso ya.

10 A bịa n’ihe gbasara ịkwụ ụtụ isi, Jizọs hụrụ na ọ nọpụrụ iche. Ọ sịrị: “Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.” (Mat. 22:21) Jizọs ma na ọtụtụ ndị ọnaụtụ na-arụrụ aka. Ma, o lekwasịghị anya na ya. Kama, o lekwasịrị anya n’ihe kacha mkpa, ya bụ, n’Alaeze Chineke, bụ́ ihe ga-egboro ndị mmadụ mkpa ha. Jizọs si otú a gosi ndị niile na-eso ụzọ ya ihe ha kwesịrị ịna-eme. Ha ekwesịghị itinyewe ọnụ n’okwu gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ bụrụgodị na otu ndị na-ekwu ihe dị mma, ndị nke ọzọ a na-ekwu ihe na-adịghị mma. Ndị Kraịst na-ebu ụzọ achọ Alaeze Chineke nakwa ezi omume ya. Ha anaghị akatọ ihe ụfọdụ na-adịghị mma ndị ọchịchị na-eme.—Mat. 6:33.

11. Olee ụzọ kacha mma e nwere ike isi mee ka ndị mmadụ kwụsị imegbu ibe ha?

11 Ọtụtụ Ndịàmà Jehova akwụsịla ile ndị ọchịchị anya ọjọọ ha na-elebu ha. Otu nwanna nwaanyị bi na Briten kwuru, sị: “Mgbe m gụchara gbasara ihe ndị mere n’oge ochie na mahadum, ihe banyere ọchịchị bịara na-ewe m ezigbo iwe. Achọrọ m ịgbachitere ndị isi ojii ka e nye ha ihe ruuru ha ebe ọ bụ na e mekpọọla anyị ọnụ. M na-emerikarị mgbe ọ bụla mụ na ndị mmadụ rụrụ ụka gbasara otú e si na-emegbu ndị isi ojii, ma ọ naghị eme ka m na-enwe obi ụtọ. Amaghị m na ndị mmadụ kwesịrị ibu ụzọ wepụ ihe ndị mere ha ji na-akpọ ndị agbụrụ ọzọ asị n’obi ha. Ma, mgbe m malitere ịmụ Baịbụl, m ghọtara na m kwesịrị ibu ụzọ wepụ ya n’obi m. Otu nwanna nwaanyị onye ọcha medara obi nyere m aka ime otú ahụ. Ugbu a, m bụ ọsụ ụzọ oge niile n’ọgbakọ ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe. M na-amụkwa otú m ga-esi ezi ụdị mmadụ dị iche iche ozi ọma.”

“MỊGHACHI MMA AGHA GỊ N’ỌBỌ YA”

12. Olee ụdị “ihe iko achịcha” Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha zere?

12 N’oge Jizọs, ndị isi okpukpe na-akwado ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Òtù okpukpe dị iche iche ndị Juu nọ na ya yiri òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị e nwere taa.” Ọ bụ ya mere Jizọs ji dọọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Ghewenụ anya unu oghe, lezienụ anya maka ihe iko achịcha nke ndị Farisii nakwa maka ihe iko achịcha nke Herọd.” (Mak 8:15) Mgbe Jizọs kwuru banyere Herọd, ọ ga-abụ na ọ na-ekwu gbasara ndị òtù Herọd. Ndị Farisii chọrọ ka ndị Juu nwere onwe ha n’aka ndị Rom. Akwụkwọ Matiu kwuru na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha zere ndị Sadusii. Ndị Sadusii chọrọ ka ndị Rom na-achị n’ihi na o mere ka ha nọrọ n’ọkwá ukwu. Jizọs dọsiri ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ike ka ha ghara inwe ihe jikọrọ ha na ozizi ma ọ bụ “ihe iko achịcha” nke òtù atọ ndị a. (Mat. 16:6, 12) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe a mgbe obere oge a chọrọ ime ya eze gachara.

13, 14. (a) Olee otú ihe banyere ọchịchị na okpukpe si akpata tigbuo zọgbuo na ikpe na-ezighị ezi? (b) Gịnị mere na anyị ekwesịghị itinye aka n’ọgba aghara n’agbanyeghị na a na-emegbu anyị? (Lee ihe nke atọ e sere ná mmalite isiokwu a.)

13 Ọ bụrụ na ndị okpukpe ana-akwado ndị ọchịchị, o nwere ike ịkpata tigbuo  zọgbuo. Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa na tigbuo zọgbuo. Nke a bụ otu ihe mere ndị isi nchụàjà na ndị Farisii ji kpaa nkata igbu ya. Ụjọ na-atụ ha na ndị mmadụ ga-egewe Jizọs ntị ma kwụsị iso ha. Ọ bụrụ na nke a emee, ọ pụtara na ha agaghịzi enwe ọkwá ma n’ọchịchị ma n’okpukpe. Ha kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya otú a, ha niile ga-enwe okwukwe n’ebe ọ nọ, ndị Rom ga-abịakwa were ma ụlọ nsọ anyị ma mba anyị.” (Jọn 11:48) N’ihi ya, Keyafas, Nnukwu Onye Nchụàjà, kpara nkata igbu Jizọs.—Jọn 11:49-53; 18:14.

14 Keyafas zigara ndị agha n’abalị ka ha gaa jide Jizọs. Jizọs ma nkata a ha na-akpa igbu ya. N’ihi ya, ná nri ikpeazụ ya na ndịozi ya riri, ọ gwara ha ka ha weta ụfọdụ mma agha. Mma agha abụọ ga-ezu ịkụziri ha ihe dị ezigbo mkpa. (Luk 22:36-38) N’abalị ahụ, Pita mịịrị mma agha gbuo ya otu n’ime ndị bịara ijide Jizọs. O doro anya na ezigbo iwe were Pita n’ihi otú ha si bịa n’abalị ijide Jizọs. (Jọn 18:10) Ma, Jizọs gwara Pita, sị: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya, n’ihi na ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Mat. 26:52, 53) Olee ihe Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya? Ọ bụ na ha ekwesịghị ịbụ nke ụwa. Ihe a ka o kpere n’ekpere n’abalị ahụ. (Gụọ Jọn 17:16.) Ọ bụ naanị Chineke ka ọ dị n’aka ịkwụsị ikpe na-ezighị ezi.

15, 16. (a) Olee otú Okwu Chineke sirila nyere Ndị Kraịst aka izere ọgba aghara? (b) Olee ihe dị iche Jehova na-ahụ ka ọ na-ele otú ihe si kwụrụ n’ụwa taa?

15 Nwanna nwaanyị ahụ anyị kwuburu okwu ya bi n’ebe ndịda Yurop mụtara otu ihe ahụ Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Achọpụtala m na itinye aka n’ọgba aghara anaghị eme ka e nwee ikpe ziri ezi. Ahụla m na ndị na-akpata ọgba aghara na-anwụkarị. Obi na-agbawakwa ọtụtụ ndị ọzọ. Obi dị m ụtọ na Baịbụl mere ka m mata na ọ bụ naanị Chineke ga-eme ka e nwee ikpe ziri ezi n’ụwa. Ọ bụ ihe m na-akụziri ndị ọzọ kemgbe afọ iri abụọ na ise ugbu a.” Nwanna ahụ bi n’ebe ndịda Afrịka ejirila “mma agha nke mmụọ nsọ,” bụ́ Okwu Chineke dochie anya ube ya. (Efe. 6:17) Ọ na-ekwusaziri ndị mmadụ ozi ọma nke udo n’agbanyeghị agbụrụ ha si. Mgbe nwanna nwaanyị ahụ bi na Yurop ghọchara Onyeàmà Jehova, ọ lụrụ otu nwanna si n’agbụrụ ọ kpọburu asị. Ụmụnna atọ a gbanwere àgwà ha n’ihi na ha chọrọ ime ka Kraịst.

16 Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị gbanwee àgwà anyị otú ahụ ụmụnna ndị ahụ gbanwere nke ha. Baịbụl ji ndị mmadụ tụnyere oké osimiri nke na-amali elu, nke na-anaghị adajụ adajụ. (Aịza. 17:12; 57:20, 21; Mkpu. 13:1) Ebe ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akpasu ndị mmadụ iwe, na-ekewa ndị mmadụ, ma na-akpata ọgba aghara, anyịnwa dị n’udo, dịrịkwa n’otu. Ka Jehova na-ahụ otú udo si na-emi ala n’ụwa anyị a, obi na-atọ ya ụtọ na ndị ohu ya dị n’otu.—Gụọ Zefanaya 3:17.

17. (a) Olee ihe atọ ga-eme ka anyị na-adị n’otu? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

17 Anyị amụtala ihe atọ ga-eme ka Ndị Kraịst na-adị n’otu. Nke mbụ, anyị nwere obi ike na Alaeze Chineke ga-eme ka ikpe na-ezighị ezi kwụsị. Nke abụọ, anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Nke atọ, anyị anaghị etinye aka n’ọgba aghara. Ma mgbe ụfọdụ, ịkpọasị nwere ike ime ka anyị ghara ịdị n’otu. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi emeri nsogbu a otú ahụ Ndị Kraịst oge ochie mere.