Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2017

Na-akwado Ọchịchị Jehova

Na-akwado Ọchịchị Jehova

“I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile.”MKPU. 4:11.

ABỤ: 112, 133

1, 2. Gịnị kwesịrị ido onye ọ bụla n’ime anyị anya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

DỊ KA anyị mụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, Ekwensu kwuru na otú Jehova si achị adịghị mma nakwa na ihe ga-aka adịrị ụmụ mmadụ mma ma ha chịwa onwe ha. Ihe a Setan kwuru ọ̀ bụ eziokwu? Ka e were ya na ụmụ mmadụ ga-adịli ndụ ebighị ebi ma ha chịwa onwe ha. Ihe ọ̀ ga-aka adịrị ha mma ma Chineke anaghị achị ha? Obi ọ̀ ga-aka adị gị ụtọ ma Chineke hapụ gị ka ị na-achị onwe gị, gị adịrịkwa ndụ ebighị ebi?

2 O nweghị onye ga-azara gị ajụjụ ndị a. Onye ọ bụla kwesịrị ichebara ha echiche. Anyị mee otú ahụ, o kwesịrị ido anyị anya na ọ bụ ọchịchị Chineke kacha mma. Anyị kwesịkwara iji obi anyị niile na-akwado ya. Baịbụl kwuru ihe ga-eme ka anyị kwetasie ike. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe Baịbụl gwara anyị mere o ji bụrụ na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị.

Ọ BỤ JEHOVA KWESỊRỊ ỊCHỊ

3. Gịnị mere o ji bụrụ naanị Jehova kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa?

3 Ọ bụ Jehova Chineke kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa n’ihi na ọ pụrụ ime ihe niile, bụrụkwa Onye kere anyị. (1 Ihe 29:11; Ọrụ 4:24) Ná Mkpughe 4:11, Jọn hụrụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ha na Kraịst ga-eso chịa  ka ha nọ n’eluigwe na-asị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.” Ebe ọ bụ Jehova kere ihe niile, o doro anya na ọ bụ ya kwesịrị ịchị ma ụmụ mmadụ ma ndị mmụọ ozi.

4. Gịnị mere na anyị ekwesịghị inupụrụ ọchịchị Chineke isi maka na ọ hapụrụ anyị ka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme?

4 O nweghị ihe Setan kere. N’ihi ya, o kwesịghị ịchị eluigwe na ụwa. Isi ya na Adam na Iv nupụụrụ ọchịchị Jehova gosiri na ha dị mpako. (Jere. 10:23) Ebe ọ bụ na Chineke hapụrụ ha ka ha jiri aka ha kpebie ihe ha ga-eme, ha nwere ike ikpebi inupụrụ Chineke isi. Ma, ọ̀ pụtara na ha kwesịrị ime otú ahụ? Mba. Otú ahụ Chineke hapụrụ ndị mmadụ ka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme mere ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe dị mma ha ga-eme kwa ụbọchị. Ma, ọ pụtaghị na ha kwesịrị inupụrụ Onye kere ha ma nye ha ndụ isi. O doro anya na inupụrụ Jehova isi ga-egosi na ha emeghị ihe Chineke chọrọ ka ha mee. Ebe anyị bụ ndị mmadụ, ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị anyị ma na-eduzi anyị.

5. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na ihe ọ bụla Chineke kpebiri ime ziri ezi?

5 E nwere ihe ọzọ mere o ji bụrụ Jehova kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. O kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Onye na-egosi obiọma, na-ekpekwa ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume n’ụwa; n’ihi na ọ bụ ihe ndị a na-atọ m ụtọ.” (Jere. 9:24) Ọ naghị eji iwu ụmụ mmadụ na-ezughị okè mere ekpebi ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Ọ na-eji uche ya amata ihe dị mma ọ ga-eme, jirikwa ya nye ụmụ mmadụ iwu ha ga na-erubere isi. Baịbụl kwuru na “ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala nke ocheeze” ya. N’ihi ya, ka obi sie anyị ike na iwu ya niile, ụkpụrụ ya, na ihe ndị o kpebiri ime ziri ezi. (Ọma 89:14; 119:128) Setan agaghị emeli ka ikpe ziri ezi dịrị n’ụwa n’agbanyeghị na o kwuru na otú Jehova si achị adịghị mma.

6. Olee otu n’ime ihe mere o ji bụrụ Jehova kwesịrị ịchị ụwa a?

6 Ihe ọzọ mere o ji bụrụ Jehova kwesịrị ịchị bụ na ọ bụ ya ghọtara, marakwa otú e si elekọta eluigwe na ụwa. Dị ka ihe atụ, chegodị otú Chineke si mee ka Ọkpara ya nwee ike ịgwọ ọrịa ndị nyịrị ndị dọkịta. (Mat. 4:23, 24; Mak 5:25-29) Jehova ewereghị ya ka ọrụ ebube. Ọ ghọtara otú ahụ́ mmadụ si arụ ọrụ, nweekwa ike imezi ihe ọ bụla mebiri na ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe gbasara ikike o nwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ na igbochi ọdachi ndị na-emere onwe ha.

7. Olee otú amamihe Jehova si ka amamihe ụwa a Setan na-achị?

7 Ụwa a Setan na-achị ahụbeghị otú a ga-esi dozie okwu ndị mmadụ na-ese n’otu mba nakwa nke mba na mba na-ese. Ọ bụ naanị Jehova ma otú udo ga-esi adị n’ụwa. (Aịza. 2:3, 4; 54:13) Ka anyị na-amụ banyere ihe ọmụma Jehova na amamihe ya, obi dị anyị otú ahụ ọ dị Pọl onyeozi, bụ́ onye kwuru, sị: “Lee otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi! Lee otú a na-apụghị ịchọpụtacha ikpe ya, na otú a na-apụghị ịchọpụtacha ụzọ ya.”—Rom 11:33.

Ọ BỤ ỌCHỊCHỊ JEHOVA KACHA MMA

8. Olee otú obi na-adị gị gbasara otú Jehova si achị?

8 Ọ bụghị naanị na Baịbụl mere ka o doo anya na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị, kama o kwukwara ihe gosiri na  ọchịchị ya ka nke ndị ọzọ mma. Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na o ji ịhụnanya na-achị. N’eziokwu, otú Jehova si achị na-eme anyị obi ụtọ. Baịbụl kwuru na ọ ‘na-eme ebere, na-eme amara, na ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ nakwa na obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu.’ (Ọpụ. 34:6) Chineke na-akwanyere ndị na-ejere ya ozi ùgwù. Ọ na-elekọta anyị karịa otú anyị nwere ike ilekọta onwe anyị. Cheta na Setan kwuru na Jehova na-eme ka ihe ọma ghara iru ndị na-efe ya aka. Ma, ọ bụ okpookpo ụgha. Chineke jidị Ọkpara ya chụọ àjà ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.—Gụọ Abụ Ọma 84:11; Ndị Rom 8:32.

9. Olee otú anyị si mara na Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya n’otu n’otu?

9 Ọ bụghị naanị na Jehova hụrụ ndị niile na-efe ya n’anya, kama ọ hụkwara onye nke ọ bụla n’ime ha n’anya. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe ndị mere n’ime narị afọ atọ Jehova ji ndị ikpe na-eduzi ndị Izrel ma mee ka ha na-emeri ndị iro ha. N’oge ahụ tara akpụ, ọ hụrụ otu nwaanyị na-abụghị onye Izrel, aha ya bụ Rut. Nwaanyị ahụ hapụrụ ọtụtụ ihe iji fewe Jehova. Jehova gọziri ya, mee ka ọ lụta di, mụtakwa nwa nwoke. Ihe ọzọ bụ na, mgbe a ga-akpọlite Rut n’ọnwụ, ọ ga-achọpụta na nwa ya so ná ndị e si n’agbụrụ ha mụta Mesaya. Cheekwa otú obi ga-esi bụrụ ya sọ aṅụrị mgbe ọ ga-amata na e dere akụkọ ya n’akwụkwọ Baịbụl a kpọrọ Rut.—Rut 4:13; Mat. 1:5, 16.

10. Gịnị mere Jehova anaghị achị ọchịchị aka ike?

10 Jehova anaghị achị ọchịchị aka ike. Ọ na-eme ka ndị ọ na-achị nwere onwe ha, meekwa ka ha na-enwe obi ụtọ. (2 Kọr. 3:17) Devid kwuru banyere Chineke, sị: “Ebube na ịma mma dị n’ihu ya, ike na ọṅụ dịkwa n’ebe ọ nọ.” (1 Ihe 16:7, 27) Ọbụ abụ bụ́ Itan dere, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eti mkpu ọṅụ. Jehova, ọ bụ n’ìhè nke ihu gị ka ha na-eje ije. Ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihi aha gị ogologo ụbọchị dum, a na-ebuli ha elu site n’ezi omume gị.”—Ọma 89:15, 16.

11. Olee otú anyị ga-esi mee ka obi sikwuo anyị ike na ọ bụ ọchịchị Jehova kacha mma?

11 Ichebara ihe ọma Jehova na-emere anyị echiche ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na ọ bụ ọchịchị ya kacha mma. Obi ga-adị anyị otú ahụ ọ dị otu ọbụ abụ, bụ́ onye kwuru, sị: “Otu ụbọchị n’ogige gị dị mma karịa otu puku ụbọchị n’ebe ọzọ.” (Ọma 84:10) A naghị ajụ ajụ ma ihe a ọ̀ bụ eziokwu. Ebe ọ bụ Jehova kere anyị ma nye anyị ndụ, ọ ma ihe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ. Ọ na-enyekwa anyị ọtụtụ ihe ga-eme anyị obi ụtọ. Ihe ọ bụla ọ sịrị anyị mee ga-abara anyị uru, bụrụkwa ihe ga-emecha mee ka anyị na-enwe obi ụtọ, ọ bụrụgodị na ọ pụtara na anyị ga-ahapụ ihe ụfọdụ.—Gụọ Aịzaya 48:17.

12. Olee ihe kacha mkpa mere anyị ji akwado ọchịchị Jehova?

12 Ihe Baịbụl kwuru gosiri na Jizọs chịchaa otu puku afọ, ụfọdụ ndị ga-enupụrụ ọchịchị Jehova isi. (Mkpu. 20:7, 8) Gịnị ga-eme ka ha mee otú ahụ? Mgbe ahụ a ga-atọpụ Ekwensu n’ụlọ mkpọrọ, o doro anya na ọ ga-ekpebisi ike iduhie ndị mmadụ, mee ka ha chewe naanị maka onwe ha otú ahụ ọ na-eme. O nwere ike ịgbalịwa ọzọ ka ndị mmadụ kweta na ha ga-adị ndụ ebighị ebi ma ha erubereghị Jehova isi. Anyị ma na ọ bụ ụgha. Ma, onye ọ bụla kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ ga-ekweta ihe ahụ Ekwensu ga-ekwu?’ Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya ma na-efe ya maka na obi siri anyị ike na ọ na-eme ihe ọma  nakwa na ọ bụ ya kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa, anyị agaghị achọ iji ntị anụ ihe ahụ Ekwensu ga-ekwu. O nweghị onye ọzọ anyị ga-achọ ka ọ chịwa anyị ma ọ bụghị Jehova. Ọ bụ ya kwesịrị ịchị anyị. Ọ na-ejikwa ịhụnanya achị.

JIRI OBI GỊ NIILE NA-AKWADO ỌCHỊCHỊ CHINEKE

13. Olee otú iṅomi Chineke si egosi na anyị na-akwado ya?

13 O doro anya na anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-akwado ọchịchị Jehova. Anyị amụtala na ọ bụ ya kwesịrị ịchị nakwa na ọ bụ ọchịchị ya kacha mma. Otú anyị ga-esi na-akwado ọchịchị Jehova bụ ịna-erubere ya isi, jirikwa obi anyị niile na-efe ya. Olee otú ọzọ anyị ga-esi gosi na anyị na-akwado ya? Ọ bụ ime ihe ọ bụla ọ chọrọ. Ọ bụrụ na anyị na-eṅomi Jehova, anyị na-egosi na ọchịchị ya dị anyị mma nakwa na anyị na-akwado ya.—Gụọ Ndị Efesọs 5:1, 2.

14. Olee otú ndị okenye na ndị isi ezinụlọ ga-esi ṅomie Jehova?

14 Anyị amụtala na Baịbụl na otú Jehova si achị magburu onwe ya. N’ihi ya, ọ bụrụ na ọchịchị Jehova dị ndị isi ezinụlọ na ndị okenye mma, ha agaghị adị aka ike, na-eme ka à ga-asị na ha bụ eze. Kama, ha ga-eṅomi Jehova. Pọl onyeozi ṅomiri Jehova na Ọkpara ya. (1 Kọr. 11:1) O menyeghị ndị ọzọ ihere ma ọ bụ manye ha ime ihe ọ chọrọ. Kama ime otú ahụ, ọ rịọrọ ha arịrịọ. (Rom 12:1; Efe. 4:1; Faị. 8-10) Ọ bụ ihe Jehova chọrọ. N’ihi ya, ndị niile ọchịchị ya dị mma kwesịrị ịna-eme otú ahụ.

15. Olee otú irubere ndị Chineke ji eduzi ọgbakọ ya isi si egosi na ọchịchị Jehova dị anyị mma?

15 Olee otú anyị si emeso ndị Jehova ji na-eduzi ọgbakọ ya? Anyị kwesịrị ịna-erubere ha isi. Ọ bụ otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwado ọchịchị Jehova. Ọ bụrụgodị na anyị aghọtachaghị ihe  ha kpebiri ma ọ bụ na ọ dịchaghị anyị mma, anyị ka kwesịrị ịna-akwado ihe ha kwuru. Ndị ụwa anaghị eme otú ahụ. Ma, ọ bụ otú ndị Jehova na-achị na-eme. (Efe. 5:22, 23; 6:1-3; Hib. 13:17) Ime otú ahụ ga-abara anyị uru n’ihi na Chineke chọrọ ka ihe dịrị anyị mma.

16. Olee otú ndị na-akwado ọchịchị Chineke si ekpebi ihe ha ga-eme?

16 Ihe anyị na-ekpebi ime kwesịkwara igosi na anyị na-akwado ọchịchị Chineke. Jehova enyeghị anyị iwu n’ihe niile anyị na-eme. Kama ime otú ahụ, ọ gwara anyị otú o si ele ihe anya. Dị ka ihe atụ, o depụtaraghị Ndị Kraịst ụdị uwe ha ga na-eyi. Kama, ọ gwara ha ka ha na-eyi uwe dị mma n’anya, na-ejikwa ejiji kwesịrị Ndị Kraịst. (1 Tim. 2:9, 10) Ọ chọghịkwa ka anyị mee ihe ga-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ ma ọ bụ ihe ga-enyewe akọnuche ha nsogbu. (1 Kọr. 10:31-33) Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe Jehova chere na-ekpebi ihe anyị ga-eme, kama imewe ihe ọ bụla masịrị anyị, anyị ga-egosi na ọchịchị ya dị anyị mma nakwa na anyị na-akwado ya.

Na-akwado ọchịchị Chineke mgbe ị na-ekpebi ihe ị ga-eme nakwa n’ihe ndị ị na-eme n’ezinụlọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 ruo na nke 18)

17, 18. Olee ihe di na nwunye ga-eme iji gosi na ha na-akwado ọchịchị Jehova?

17 Ka anyị leba anya n’otú di na nwunye ga-esi na-eme ihe Jehova chọrọ, si otú ahụ na-akwado ọchịchị ya. Gịnị ka ha kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ha anaghị ebi n’udo? Ọ bụrụkwanụ na ihe ha hụrụ abụghị ihe ha tụrụ anya ya? Ọ ga-adị mma ka ha cheta otú Jehova si meso ndị Izrel. Ọ gwara ha na ya bụ di ha, hanwa abụrụ nwunye ya. (Aịza. 54:5; 62:4) Mba Izrel nupụụrụ Jehova isi ọtụtụ ugboro. Otú ha si na-emeso Jehova dị ka ebe nwaanyị na-anaghị erubere di ya isi. Ma, Jehova agbakụtaghị ha azụ ngwa ngwa. O meere ha ebere ọtụtụ ugboro. O kweghịkwa akagbu ọgbụgba ndụ ha na ya. (Gụọ Abụ Ọma 106:43-45.) Ọ̀ bụ na ụdị ịhụnanya ahụ anaghị eme ka anyị bịarukwuo Jehova nso?

18 N’ihi ya, di na nwunye bụ́ ndị hụrụ Jehova n’anya na-eṅomi ya. Ha nwee nsogbu, ha anaghị achọ ime ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị iji dozie ya. Ha ghọtara na Jehova ejikọtala ha, nakwa na ọ chọrọ ka ha “rapara” n’ahụ́ ibe ha. Ọ bụ naanị ịkwa iko ka Baịbụl kwuru ga-eme ka mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm gaa lụọ onye ọzọ. (Mat. 19:5, 6, 9) Ọ bụrụ na ha na-agbalịsi ike idozi ihe ọ bụla na-esere ha, ha ga-egosi na ha na-akwado ọchịchị Jehova.

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị mejọọ Chineke?

19 Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị nwere ike ime ihe ga-ewe Jehova iwe mgbe ụfọdụ. Ọ ma na anyị ga-eme otú ahụ. Ọ bụ ihe mere o ji jiri Ọkpara ya chụọ àjà. N’ihi ya, anyị mejọọ, anyị kwesịrị ịrịọ Jehova mgbaghara. (1 Jọn 2:1, 2) Kama obi ịna-ajọ anyị njọ mgbe niile, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị mụta ihe n’ihe anyị mejọrọ. Ọ bụrụ na anyị anọrọ Jehova nso, ọ ga-agbaghara anyị, mee ka anyị nweta onwe anyị, ma ghara ime ụdị ihe ahụ ọzọ.—Ọma 103:3.

20. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akwado ọchịchị Chineke ugbu a?

20 N’ụwa ọhụrụ, ọ bụ Jehova ga na-achị mmadụ niile. Ha ga-amụtakwa ezi omume ya. (Aịza. 11:9) Ma, e nwere ọtụtụ ihe ọ na-akụziri anyị ugbu a. N’oge na-adịghị anya, o nweghị onye ga-ekwu na ọchịchị Chineke adịghị mma. Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị ịna-akwado ọchịchị Chineke. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-erubere ya isi, na-ejere ya ozi, na-agbalịsikwa ike iṅomi ya n’ihe ọ bụla anyị na-eme.