Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2017

Lekwasị Anya n’Ihe Dị Ezigbo Mkpa

Lekwasị Anya n’Ihe Dị Ezigbo Mkpa

“Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”—ỌMA 83:18.

ABỤ: 46, 136

1, 2. (a) Olee ihe dị ezigbo mkpa mmadụ niile kwesịrị iburu n’obi? (b) Gịnị mere ihe a ji dị ezigbo mkpa?

ỌTỤTỤ ndị weere ego ka ihe dị ezigbo mkpa. Mkpa ha bụ ịkpata akụ̀ ma ọ bụ ijidesi ihe ha nwere ike. E nwekwara ndị weere ihe gbasara ezinụlọ, ahụ́ ike, ma ọ bụ ihe ndị ha chọrọ inweta ka ihe dị ezigbo mkpa.

2 Ma, ihe dị ezigbo mkpa anyị niile ga-eburu n’obi bụ ka e gosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ichefu ihe a dị ezigbo mkpa. Olee otú o nwere ike isi mee? Anyị nwere ike ịnọ ebe anyị na-eche banyere ihe ndị anyị na-eme n’ụbọchị, chefuzie na ọ dị ezigbo mkpa ka e gosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị. Anyị nwekwara ike ikwe ka ọnwụnwa ndị bịaara anyị mee ka anyị chefuo ihe ahụ dị ezigbo mkpa. Ma, anyị ghọtakwuo na ọ dị ezigbo mkpa ka e gosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị, anyị ga-enwekwu ike idi nsogbu ndị na-abịara anyị kwa ụbọchị. Ịghọta ya ga-eme ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma.

GỊNỊ MERE O JI DỊ EZIGBO MKPA?

3. Gịnị na gịnị ka Setan kwuru gbasara ọchịchị Chineke?

3 Ihe Setan bụ́ Ekwensu mere gosiri na ọ chọghị ka e kweta  na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị. O kwuru na otú Chineke si achị adịghị mma nakwa na ọ na-abụ, Jehova hụ ihe ga-abara ndị o kere eke uru, ya ejichie ya. Ihe Ekwensu kwuru pụtara na ụmụ mmadụ chịwa onwe ha, obi ga-aka adị ha ụtọ, ihe adịkwara ha ná mma. (Jen. 3:1-5) Setan kwukwara na o nweghị mmadụ ji obi ya niile na-erubere Chineke isi, na onye ọ bụla ga-ajụ ọchịchị Jehova ma ọnwụnwa tara akpụ bịara ya. (Job 2:4, 5) N’ihi ihe ahụ Ekwensu kwuru, Jehova enyela ohere ka ihe ndị na-emenụ mee ka o doo ewu na ọkụkọ anya na onye jụrụ ọchịchị Chineke enweghị ebe o ji azụ aga.

4. Gịnị mere e ji kwesị igosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị?

4 O doro anya na Jehova ma na ihe ahụ niile Ekwensu kwuru bụ ụgha. Gịnịkwanụ mere o ji kwe ka oge na-aga, nye Setan ohere ịgbalịwa ka o gosi na ihe o kwuru bụ eziokwu? Azịza ajụjụ a gbasara ndị niile o kere eke. (Gụọ Abụ Ọma 83:18.) A sị ka e kwuwe, Adam na Iv jụrụ ọchịchị Jehova. Otú ahụkwa ka ọtụtụ ndị ọzọ mere kemgbe ahụ. Ihe a nwere ike ime ka ụfọdụ ndị chewe ma ihe ahụ Ekwensu kwuru ọ̀ bụ eziokwu. Ọ bụrụ na a zaghị ajụjụ ahụ dị n’uche ndị mmadụ ma n’uche ndị mmụọ ozi, o nweghị ndị ga-adị n’otu, ma mba na mba, ma agbụrụ na agbụrụ, ma ezinụlọ ma ndị mmadụ n’otu n’otu. Ma, Jehova gosichaa na ọ bụ ya kwesịrị ịchị, onye ọ bụla ga na-erubere ọchịchị ya magburu onwe ya isi. Udo ga-adịghachi ma n’eluigwe ma n’ụwa.—Efe. 1:9, 10.

5. Gịnị ka anyị ga-eme iji gosi na anyị na-akwado ọchịchị Jehova?

5 Jehova ga-egosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị. Ọchịchị Setan na nke ụmụ mmadụ ga-akụ afọ n’ala. A ga-ebibikwa ya. Ọchịchị Chineke nke ga-esi n’aka Alaeze Mesaya chịa ga-aga siriri werere, ndị rubeere Chineke isi emeekwa ka o doo anya na ụmụ mmadụ ga-akwadoli ọchịchị Chineke. (Aịza. 45:23, 24) Ị̀ chọrọ iso ná ndị na-akwado ọchịchị Jehova? À na-ajụkwa ajụ? Anyị chọọ ịna-erubere Chineke isi, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ihe ahụ dị mkpa ma ghọta na ọ dị ezigbo mkpa.

IGOSI NA Ọ BỤ JEHOVA KWESỊRỊ ỊCHỊ DỊ MKPA KARỊA NZỌPỤTA ANYỊ

6. Olee otú igosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị dịruru ná mkpa?

6 Dị ka anyị kwurula, igosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị bụ ihe dị ezigbo mkpa ụmụ mmadụ ga-eburu n’obi. Ọ dị mkpa karịa obi ụtọ onye ọ bụla. Ma ọ̀ pụtara na nzọpụta anyị abachaghị uru ma ọ bụ na ihe gbasara anyị anaghị emetụ Jehova n’obi? Mbanụ. N’ihi gịnị?

7, 8. Gịnị mere imezu nkwa Chineke ji soro n’otú ọ ga-esi gosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị?

7 Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu ma jiri ha kpọrọ ihe. O ji Ọkpara ya chụọ àjà ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16; 1 Jọn 4:9) Ma Jehova emezughị nkwa ya, Ekwensu ga-ahụ ihe ọ ga-akụdo aka kpọọ ya onye ụgha, kwuokwa na otú o si achị adịghị mma n’ihi na ọ na-eme ka ihe ọma ghara iru ndị ọ na-achị aka. Ọ ga-akwado emo ndị iro Jehova na-akwa ya. Ha na-asị: “Olee ebe nkwa a nke ọnụnọ ya dị? Leenụ, site n’ụbọchị nna nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe niile ka dị kpọmkwem otú ha dị site ná mmalite okike.” (2 Pita 3:3, 4) N’ihi ya, Jehova ga-ahụrịrị na ịzọpụta ndị na-erubere ya isi ga-eso n’otú ọ ga-esi eme ka o doo anya na ọ bụ ya kwesịrị ịchị. (Gụọ Aịzaya 55:10, 11.) Ihe ọzọ bụ na ihe e ji mara ọchịchị Jehova bụ ịhụnanya. N’ihi ya,  obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-ahụ ndị ji obi ha niile na-efe ya n’anya ma jiri ha kpọrọ ihe mgbe niile.—Ọpụ. 34:6.

8 Anyị kwuo na ịkwado ọchịchị Jehova dị ezigbo mkpa, ọ pụtaghị na nzọpụta anyị ma ọ bụ anyịnwa abachaghị uru n’anya ya. Naanị ihe ọ pụtara bụ na anyị ghọtara na ịkwado ọchịchị Jehova dị mkpa karịa nzọpụta anyị. Ịghọta ihe a ga-eme ka anyị lekwasị anya n’ihe dị ezigbo mkpa ma na-akwado ọchịchị Jehova magburu onwe ya.

KA ANYỊ NA-ELE NSOGBU ANYỊ ANYA OTÚ KWESỊRỊ EKWESỊ

9. Gịnị ka Setan kwuru gbasara Job? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

9 Akwụkwọ Job so n’akwụkwọ mbụ e dere na Baịbụl. O mere ka o doo anya na anyị kwesịrị ile ihe gbasara ọchịchị Jehova anya otú kwesịrị ekwesị. O mekwara ka anyị mata na Setan rụrụ ụka na Job ga-agbakụta Chineke azụ ma o jiri ezé kpee ekwere. Setan gwara Chineke ka o jiri aka ya taa Job ahụhụ. Jehova emeghị otú ahụ. Ma, ọ hapụrụ Setan ka ọ nwaa Job. Ọ sịrị Setan: “Ihe niile o nwere dị gị n’aka.” (Gụọ Job 1:7-12.) Ọ dịghị anya, ihe niile Job nwere emie ala, ma ndị ozi ya, ma ihe o ji akpa afọ ezinụlọ ya, ma ụmụ ya iri. Setan mere ka ọ dị ka ọ̀ bụ Chineke kpatara ahụhụ ahụ Job na-ata. (Job 1:13-19) Ihe ọzọ Setan mere bụ ime ka ọrịa ọjọọ na-asọ oyi zuo Job ahụ́. (Job 2:7) Ihe gbawakwuru Job obi bụ okwu ọjọọ nwunye ya na mmadụ atọ sịrị na ha bụ ndị enyi ya gwara ya.—Job 2:9; 3:11; 16:2.

10. (a) Gịnị ka Job mere nke gosiri na o rubeere Chineke isi? (b) Olee ebe o mejọrọ?

10 Gịnị mechara mee? E mere ka o doo anya na ihe Setan kwuru bụ ụgha chara acha. Job ekweghị agbakụta Chineke azụ. (Job 27:5) Ma, o nwere mgbe Job chefuru ihe dị ezigbo mkpa. Ihe dịzi ya mkpa abụrụ ime ka a ghọta na ya bụ onye ezi omume. Ọ chọwadịrị ka a gwa ya ihe mere o ji na-ata ahụhụ. (Job 7:20; 13:24) N’ihi ahụhụ niile ọ tara, anyị nwere ike iche na ihe ahụ o mere enweghị ihe ọ bụ. Ma, Chineke chọpụtara na e kwesịrị ịgbazi Job olu. Gịnị ka Jehova gwara ya?

11, 12. Gịnị ka Jehova nyeere Job aka ịghọta? Gịnịkwa ka Job mere?

11 Ihe Chineke gwara Job dị n’isi nke 38 ruo 41 n’akwụkwọ Job. Ma, o nweghị ebe Chineke gwara Job kpọmkwem ihe mere o ji na-ata ahụhụ. Ihe mere Jehova ji gwawa Job okwu abụghị ka ọ kọwaara ya ihe mere o ji na-ata ahụhụ, ka à ga-asị na Chineke kwesịrị ịzara ọnụ ya. Kama, Jehova chọrọ inyere Job aka ka ọ ghọta na o nweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere Chineke. O nyekwaara  Job aka ịghọta na e nwere ihe ndị ka mkpa o kwesịrị ichebara echiche. (Gụọ Job 38:18-21.) Ihe a nyeere Job aka ilewe nsogbu ya anya otú kwesịrị ekwesị.

12 Mgbe Job dichara nsogbu ya niile, otú Jehova si gwa ya okwu ò gosiri na Jehova enweghị obi ebere? Mbanụ. Job echeghịkwa otú ahụ. N’agbanyeghị ahụhụ ahụ niile, Job mechara kwuo ihe gosiri na ihe Chineke gwara ya dị ya mma. O kwudịrị, sị: “Ekwukwaghị m ihe m kwuru, echegharịwo m n’ájá na ntụ.” Ọ bụ uru ndụmọdụ a kapịrị ọnụ Jehova ji obiọma nye ya baara ya. (Job 42:1-6) Nwa okorobịa aha ya bụ Elaịhu ebula ụzọ nye Job ndụmọdụ iji gbazie ya olu. (Job 32:5-10) Mgbe Job nabatachara ndụmọdụ Chineke nyere ya ma gbanwee otú o si eche echiche, Jehova mere ka ndị ọzọ mata na obi dị ya ụtọ maka otú Job si rubere ya isi n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara ya.—Job 42:7, 8.

13. Olee otú ndụmọdụ Jehova nyere Job ga-esi baara ya uru mgbe ọnwụnwa ndị bịaara ya biri?

13 Ndụmọdụ Jehova nyere Job ka baara ya uru ma mgbe ọnwụnwa ndị ahụ bịaara ya biri. Olee otú o si baara ya uru? Ọ bụ eziokwu na Jehova ‘gọziri ikpeazụ Job karịa mmalite ya,’ ọ ga-abụrịrị na o wetụrụ oge tupu Job enwetakwa ihe ndị o nweburu. O mechara mụta “ụmụ ndị ikom asaa na ụmụ ndị inyom atọ.” (Job 42:12-14) O doro anya na Job echefughị ụmụ ya ndị ahụ Setan gburu. Ọ ga-abụ na ná mmalite, ahụhụ ahụ ọ tara apụghị ya apụ n’obi. Ọ bụrụgodị na o mechara ghọtakwuo ihe mere ọnwụnwa ndị ahụ ji bịara ya, o nwere ike ịna-eme ya nọtụ, ya echewe ihe mere o ji dị mkpa ka ọ taruo ahụhụ otú ahụ. Ihe ọ sọkwara ya ya chewe, ọ ga na-echeta ndụmọdụ Chineke nyere ya. Ime otú ahụ ga-enyere ya aka ịna-ele nsogbu ya anya otú kwesịrị ekwesị, ya akasiekwa ya obi.—Ọma 94:19.

Nsogbu bịara anyị, ànyị ga-elekwasịli anya n’ihe dị ezigbo mkpa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe mere Job?

14 Akụkọ Job nwekwara ike ime ka anyị lewe nsogbu anyị anya otú kwesịrị ekwesị, kasiekwa anyị obi. A sị ka e kwuwe, Jehova mere ka e dee ya na Baịbụl “iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Rom 15:4) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ihe dị mkpa ọ na-akụziri anyị bụ: Anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị banyere nsogbu bịaara anyị ruo nke na ọ ga-eme ka anyị chefuo ihe dị ezigbo mkpa, nke bụ́ igosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị. Ka anyị mee ka Job ma na-erubere Jehova isi iji gosi na anyị na-akwado ọchịchị ya, ọ bụrụgodị na nsogbu tara akpụ abịara anyị.

15. Olee uru ọ ga-aba ma anyị rubere Chineke isi mgbe ọnwụnwa bịaara anyị?

 15 Gịnị mere ichebara uru irubere Jehova isi bara echiche ga-eji kasie anyị obi? Ọ bụ n’ihi na e nwere uru ọnwụnwa bịaara anyị ga-aba. Ọ naghị egosi na Jehova na-ewesa anyị iwe. Kama, ọ na-eme ka anyị nwee ike igosi na anyị na-akwado ọchịchị Chineke. (Ilu 27:11) Ntachi obi anyị na-eme ka ihe anyị “dị Chineke mma,” na-emekwa ka olileanya anyị sikwuo ike. (Gụọ Ndị Rom 5:3-5.) Akụkọ Job na-eme ka o doo anya na “Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu, na-emekwa ebere.” (Jems 5:11) N’ihi ya, ka obi sie anyị ike na ọ ga-agọzi anyị na ndị niile na-akwado ọchịchị ya. Ịmata ihe a ga-enyere anyị aka ‘ịtachi obi n’ụzọ zuru ezu, jirikwa ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi.’—Kọl. 1:11.

EBE ANYỊ GA-ELEKWASỊ ANYA

16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-echeta na ọ dị mkpa ka anyị na-akwado ọchịchị Jehova?

16 O doro anya na ọ naghị adị mfe ilekwasị anya n’otú anyị ga-esi na-akwado ọchịchị Jehova. Nsogbu bịaara anyị nwere ike ịdị anyị mgbe ụfọdụ ka ọ̀ karịala. O nwere otú anyị ga-echeru obere nsogbu bịaara anyị, ya adịzie ka ọ̀ bụ nnukwu nsogbu. N’ihi ya, nsogbu siri ike bịara anyị, anyị kwesịrị ịna-echeta mgbe niile na ọ dị mkpa ka anyị kwado ọchịchị Chineke.

17. Olee otú ịrụsi ọrụ Jehova ike ga-esi nyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe dị ezigbo mkpa?

17 Ịrụsi ọrụ Jehova ike ga-enyere anyị aka ịna-elekwasị anya n’ihe dị ezigbo mkpa. Dị ka ihe atụ, ọrịa strok bịara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Renee, ahụ́ mgbu na ọrịa kansa ekweghịkwa ya ṅụọ mmiri tọgbọ iko. Mgbe ọ nọ n’ụlọ ọgwụ, ọ na-ezi ndị ụlọ ọgwụ na ndị ọrịa na ndị ọzọ ozi ọma. N’otu ebe, o ji awa iri asatọ zie ozi ọma n’izu abụọ na ọkara. Mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ, ọ kwụsịghị ịkwado ọchịchị Jehova. Ọ bụ ihe mere ka obi na-erutụ ya ala.

18. Olee otú ihe otu nwanna nwaanyị mere si egosi na ịkwado ọchịchị Jehova na-aba uru?

18 N’eziokwu, anyị kwesịkwara ịna-akwado ọchịchị Jehova mgbe anyị na nsogbu ndị na-abịara anyị kwa ụbọchị na-alụ. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jennifer nọrọ abalị atọ n’ọdụ ụgbọelu, na-eche ụgbọelu ga-ebula ya. N’ụbọchị atọ ahụ, o nweghị ụgbọelu e kwere ka o felie. Ike gwụrụ ya. Owu ana-amakwa ya. Ihe a gaara eme ka o chewe na ọ bụ ụwa nke ya kacha njọ. Kama ime otú ahụ, ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka iji Baịbụl gbaa ndị ọzọ ọ dị otú ahụ ọ dị ya ume. Gịnị meziri? O ziri ọtụtụ ndị ozi ọma, nyefeekwa ọtụtụ akwụkwọ. Ọ sịrị: “Obi siri m ike na Jehova gọziri m n’agbanyeghị ọnwụnwa ahụ, nyekwa m ike ịna-eto aha ya.” O doro anya na o lekwasịrị anya ná nzube Jehova.

19. Gịnị ka ndị Jehova na-eme n’ihe gbasara ọchịchị ya?

19 Ihe dị iche n’ezi okpukpe na okpukpe ụgha bụ na ndị na-ekpe ezi okpukpe na-akwado ọchịchị Jehova kemgbe ụwa. Ebe anyị na-efe Chineke n’eziokwu, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka ọ na-akwado ọchịchị Jehova.

20. Olee otú obi na-adị Jehova maka mbọ ị na-agba ịkwado ọchịchị ya?

20 Ka i ji obi gị niile na-ejere Jehova ozi ma na-atachi obi n’ọnwụnwa ndị na-abịara gị, ka obi sie gị ike na Jehova ji mbọ ị na-agba ịkwado ọchịchị ya kpọrọ ihe. (Ọma 18:25) Isiokwu na-eso nke a ga-akọwa ihe ọzọ mere anyị ji kwesị iji obi anyị niile na-akwado ọchịchị Jehova nakwa otú anyị ga-esi na-eme ya.