Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2017

Ka Obi Gị Dịrị n’Akụ̀ Bara Ezigbo Uru

Ka Obi Gị Dịrị n’Akụ̀ Bara Ezigbo Uru

“Ebe akụ̀ unu dị, n’ebe ahụ ka obi unu ga-adịkwa.”—LUK 12:34.

ABỤ: 153, 104

1, 2. (a) Olee akụ̀ atọ bara ezigbo uru Jehova nyere anyị? (b) Olee ihe ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

Ọ BỤ Jehova kacha nwee akụ̀ ma n’eluigwe ma n’ụwa. (1 Ihe 29:11, 12) Ebe ọ bụ Nna na-emesapụ aka, ọ na-ewere akụ̀ ya nye ndị niile ma na ọ bara ezigbo uru. Obi dị anyị ụtọ na Jehova enyela anyị akụ̀ ya ndị bara ezigbo uru. Ụfọdụ n’ime ha bụ (1) Alaeze Chineke, (2) ozi ọma anyị na-ekwusa na-azọ ndụ, na (3) eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke. Ma, ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ghara iji akụ̀ ndị a kpọrọ ihe, ya bụ, tụfuo ha. Anyị chọọ ijidesi ha ike, anyị kwesịrị ịna-echebara uru ha bara echiche ma jiri ha kpọrọkwuo ihe. Jizọs sịrị: “Ebe akụ̀ unu dị, n’ebe ahụ ka obi unu ga-adịkwa.”—Luk 12:34.

2 Ka anyị leba anya n’otú anyị ga-esi jiri Alaeze Chineke, ozi ọma, na eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke kpọrọkwuo ihe. Ka anyị na-eleba anya na ha, chee otú ị ga-esi jiri akụ̀ ndị a Chineke nyere anyị kpọrọkwuo ihe.

 ALAEZE CHINEKE DỊ KA NKUME PEL DỊ OKÉ ỌNỤ AHỊA

3. Olee ihe onye ahịa ahụ Jizọs ji nye ihe atụ dị njikere ime ka o nwee ike inweta nkume pel dị oké ọnụ ahịa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Gụọ Matiu 13:45, 46. Jizọs nyere ihe atụ banyere onye ahịa nke na-achọ nkume pel ọma. O doro anya na kemgbe ọtụtụ afọ, onye ahịa ahụ azụọla ọtụtụ nkume pel ma ree ha. Ma otu ụbọchị, ọ hụrụ nke mara ezigbo mma. Naanị ịhụ ya mere ya obi ụtọ. Ma, ịzụta ya pụtara na ọ ga-ere ihe niile o nwere. Chegodị otú o si jiri nkume pel ahụ kpọrọ ihe.

4. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ji Alaeze Chineke kpọrọ ihe otú onye ahịa ahụ ji nkume pel ahụ kpọrọ ihe?

4 Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe atụ a? Eziokwu banyere Alaeze Chineke dị ka nkume pel ahụ dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụrụ na anyị ji eziokwu a kpọrọ ihe otú onye ahịa ahụ ji nkume pel ahụ kpọrọ ihe, anyị ga-adị njikere ịhapụ ihe niile ka anyị soro ná ndị Alaeze Chineke ga-achị. (Gụọ Mak 10:28-30.) Ka anyị mụọ gbasara mmadụ abụọ mere otú ahụ.

5. Olee otú Zakịọs si gosi na ya chọsiri ike inweta Alaeze Chineke?

5 Zakịọs bụ onyeisi ndị ọnaụtụ. Otú o si baa ọgaranya bụ ịpụnara ndị mmadụ ego ha. (Luk 19:1-9) Ma, mgbe ọ nụrụ ka Jizọs na-ekwusa banyere Alaeze Chineke, ọ ghọtara na ihe ọ nụrụ bara ezigbo uru, ya emee ihe ozugbo. O kwuru, sị: “Lee! Onyenwe anyị, ọkara nke ihe m nwere ka m ga-enye ndị ogbenye, ihe ọ bụla m pụnaara onye ọ bụla site n’ebubo ụgha, m ga-enyeghachi ya okpukpu anọ.” O ji obi ya niile weghachi ego ọ pụnaara ndị mmadụ ma kwụsị inwe anyaukwu.

6. Olee ihe otu nwaanyị gbanwere n’ihi na ọ chọrọ iso ná ndị Alaeze Chineke ga-achị? Gịnị mere o ji mee otú ahụ?

6 Mgbe otu nwaanyị nụrụ banyere Alaeze Chineke afọ ole na ole gara aga, ọ na-edina nwaanyị ibe ya. Ọ bụ onyeisi n’òtù na-agbachitere ndị na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha. Ma, ka ọ na-amụ Baịbụl, ọ ghọtara na eziokwu banyere Alaeze Chineke bara ezigbo uru, ghọtakwa na o kwesịrị ịkwụsị àgwà ọjọọ ọ na-akpa. (1 Kọr. 6:9, 10) Otú o si hụ Jehova n’anya mere ka ọ hapụ òtù ahụ ma kwụsị idina nwaanyị ibe ya. E mere ya baptizim n’afọ 2009. N’afọ na-eso ya, ọ malitere ịsụ ụzọ oge niile. Otú o si hụ Jehova n’anya ma jiri Alaeze ya kpọrọ ihe karịrị ihe ọ bụla na-agụ anụ ahụ́ ya agụụ.—Mak 12:29, 30.

7. Olee otú anyị ga-esi jiri Alaeze Chineke kpọrọkwuo ihe?

7 N’eziokwu, ọtụtụ n’ime anyị gbanwere ndụ anyị kpamkpam ka anyị soro ná ndị Alaeze Chineke ga-achị. (Rom 12:2) Ma, a ka nwere ihe anyị kwesịrị ịna-eme. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ịchụ akụnụba, agụụ mmekọahụ ọ bụla rụrụ arụ, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ghara ime ka anyị jiri ihe gbasara Alaeze Chineke gwuwe egwu. (Ilu 4:23; Mat. 5:27-29) Jehova enyela anyị akụ̀ ọzọ bara ezigbo uru ga-enyere anyị aka iji Alaeze ya kpọrọkwuo ihe.

OZI ỌMA ANYỊ NA-EKWUSA NA-AZỌ NDỤ

8. (a) Gịnị mere Pọl onyeozi ji kpọọ ozi ọma anyị na-ezi ‘akụ̀ dị n’arịa e ji ụrọ kpụọ’? (b) Olee otú Pọl si gosi na o ji ozi ọma kpọrọ ihe?

8 Cheta na Jizọs nyere anyị ọrụ ikwusa na ịkụzi banyere Alaeze Chineke. (Mat. 28:19, 20) Pọl onyeozi ghọtara na ikwusa ozi ọma bara ezigbo uru. Ọ kpọrọ ozi ọma gbasara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ‘akụ̀ dị n’arịa e ji ụrọ kpụọ.’ (2 Kọr. 4:7;  1 Tim. 1:12) Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị dị ka ite ájá. Ma ozi ọma anyị na-ekwusa dị ka akụ̀ bara ezigbo uru n’ihi na o nwere ike ime ka anyị na ndị anyị na-ezi ya nweta ndụ ebighị ebi. Ọ bụ ya mere Pọl ji kwuo, sị: “Ana m eme ihe niile n’ihi ozi ọma, ka m wee bụrụ onye na-ezisara ya ndị ọzọ.” (1 Kọr. 9:23) N’eziokwu, otú Pọl si jiri ozi ọma kpọrọ ihe mere ka ọ gbasie mbọ ike ịkụziri ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke. (Gụọ Ndị Rom 1:14, 15; 2 Timoti 4:2.) O nyeere ya aka ịtachi obi mgbe a na-echi ya ọnụ n’ala. (1 Tesa. 2:2) Olee otú anyị ga-esi jiri ozi ọma kpọrọ ihe otú ahụ o mere?

9. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi gosi na anyị ji ozi ọma kpọrọ ihe?

9 Otú ọzọ Pọl si gosi na o ji ozi ọma kpọrọ ihe bụ iji ohere ọ bụla zie ndị ọzọ ozi ọma. Anyị na-ezi ozi ọma mgbe anyị na-anọghị n’ozi ọma, n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, nakwa n’ụlọ n’ụlọ otú ahụ ndịozi na Ndị Kraịst oge mbụ mere. (Ọrụ 5:42; 20:20) O kwe anyị omume, anyị ga-achọ ụzọ anyị ga-esi jekwuoro Jehova ozi. Anyị nwere ike ịsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ ghọọ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Anyị nwekwara ike ịmụ asụsụ ọzọ, kwaga ebe ọzọ n’obodo anyị ma ọ bụkwanụ n’obodo ọzọ.—Ọrụ 16:9, 10.

10. Olee otú Chineke si gọzie Irene n’ihi mbọ ọ gbara izi ndị mmadụ ozi ọma?

10 Chegodị gbasara otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka aha ya bụ Irene. Ọ lụbeghị di. Ọ chọrọ ịna-ezi ndị na-asụ Rọshịan kwafetara n’Amerịka ozi ọma. N’ihi ya, n’afọ 1993, o sowere otu ìgwè na-eji asụsụ Rọshịan amụ ihe na Niu Yọk Siti. N’oge ahụ, e nwere naanị ihe dị ka ndị nkwusa iri abụọ n’ìgwè ahụ. Irene agbaala ezigbo mbọ iji asụsụ ahụ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ruo ihe dị ka afọ iri abụọ. O kwuru, sị: “Amụtachabeghị m asụsụ Rọshịan.” Ma, Jehova agọziela mbọ ya na ụmụnna ndị ọzọ dị ka ya gbara. Taa, e nwere ọgbakọ isii na-eji asụsụ Rọshịan amụ ihe na Niu Yọk Siti. Mmadụ iri na ise n’ime ndị Irene mụụrụ ihe emeela baptizim. Ụfọdụ n’ime ha nọ na Betel. Ụfọdụ na-asụ ụzọ. E nwekwara ndị bụ́ okenye. Irene sịrị: “M chee ihe ndị ọzọ m gaara eme, e nweghị nke gaara eme m obi ụtọ karịa nke a.” N’eziokwu, o ji ozi ọma kpọrọ ihe.

Ì weere ozi ọma ị na-ekwusa ka akụ̀, na-ewepụtakwara ya oge kwa izu? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)

11. Ọ bụrụ na anyị akwụsịghị ikwusa ozi ọma, olee ihe ọma ga-esi na ya apụta?

11 Ọ bụrụ na anyị ji ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe, anyị ga na-ekwusa ya n’agbanyeghị mkpagbu otú ahụ Pọl onyeozi mere. (Ọrụ 14:19-22) N’agbata afọ 1930 na 1944, e mesiri ụmụnna anyị bi n’Amerịka ike. Ma, ha mere ka Pọl. Ha akwụsịghị ikwusa ozi ọma. Mgbe ndị ọchịchị chọrọ ka a kwụsị ozi ọma a, ụmụnna anyị gara ụlọikpe ma merie ọtụtụ ugboro. N’afọ 1943, mgbe Nwanna Nathan Knorr na-ekwu gbasara otu ikpe ụmụnna  anyị meriri n’Ụlọikpe Kasị Elu n’Amerịka, ọ sịrị: “Ọ bụ mbọ unu gbara mere anyị ji merie n’ikpe ndị a. A sị na ndị nkwusa ejisighị ike na-ekwusa ozi ọma, a garaghị enwe ikpe ndị a ga-ekpe n’Ụlọikpe Kasị Elu. Ihe mere anyị ji merie ná mkpagbu a na-akpagbu anyị bụ na unu bụ́ ndị nkwusa, ya bụ, ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile, akwụsịghị ikwusa ozi ọma. Ihe mere ụlọikpe ahụ ji mechaa kpelaara anyị ikpe a bụ na ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị akwụsịghị ikwusa ozi ọma.” Otú ahụkwa ka ụmụnna ndị bi ná mba ndị ọzọ si merie n’ọtụtụ ikpe n’ihi na ha akwụsịghị ikwusa ozi ọma. N’eziokwu, anyị jiri ozi ọma kpọrọ ihe, mkpagbu agaghị emeli ka anyị kwụsị ikwusa ya.

12. Gịnị ka i kpebisiri ike ime n’ihe banyere ozi ọma ị na-ekwusa?

12 Anyị were ozi ọma ka akụ̀ bara ezigbo uru Jehova nyere anyị, ihe ga-adị anyị mkpa agaghị abụ ịgụrụ awa. Kama, anyị ga-eme ihe niile anyị nwere ike ime iji ‘na-agbasi àmà ike banyere ozi ọma.’ (Ọrụ 20:24; 2 Tim. 4:5) Ma, gịnị ka anyị ga-akụziri ndị ọzọ? Ka anyị leba anya n’akụ̀ ọzọ Chineke nyere anyị.

EZIOKWU BARA EZIGBO URU ANYỊ MỤTARA

13, 14. Gịnị bụ “ụlọ akụ̀” ahụ Jizọs kwuru okwu ya na Matiu 13:52? Olee otú anyị si etinye ihe na ya?

13 Akụ̀ nke atọ Chineke nyere anyị bụ eziokwu niile anyị mụtara. Jehova bụ Chineke eziokwu. (2 Sam. 7:28; Ọma 31:5) Ebe ọ bụ Nna na-emesapụ aka, ọ na-akụziri ndị na-atụ egwu ya eziokwu ndị a. Malite mgbe mbụ anyị nụrụ eziokwu a, anyị amụtala ọtụtụ eziokwu n’Okwu ya bụ́ Baịbụl, n’akwụkwọ ndị a na-ebipụtara anyị, ná mgbakọ nakwa n’ọmụmụ ihe anyị na-aga kwa izu. Ka oge na-aga, anyị enwetala ihe Jizọs kpọrọ “ụlọ akụ̀,” bụ́ ebe anyị na-edokọta eziokwu niile anyị mụtara, ma ndị ọhụrụ ma ndị ochie. (Gụọ Matiu 13:52.) Jehova ga-enyere anyị aka ịna-etinyekwu eziokwu ọhụrụ ndị anyị mụtara “n’ụlọ akụ̀” anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-achọ ha ka akụ̀ zoro ezo. (Gụọ Ilu 2:4-7.) Olee otú anyị ga-esi eme ya?

14 Anyị kwesịrị ịna-amụ ihe nke onwe anyị ma na-eme ezigbo nchọnchọ n’Okwu Chineke nakwa n’akwụkwọ anyị. Ọ ga-enyere anyị aka ịmụta eziokwu “ndị dị ọhụrụ,” bụ́ ndị anyị na-amabughị. (Jọsh. 1:8, 9; Ọma 1:2, 3) Ụlọ Nche mbụ e bipụtara n’ọnwa Julaị afọ 1879 kwuru na eziokwu yiri obere okooko osisi dị n’ebe ahịhịa na-ama pokopoko juru. Ahịhịa ahụ fọrọ obere ka ọ kpagbuo okooko osisi ahụ. Onye chọrọ ịhụ okooko osisi ahụ ga-elezi anya. Onye chọkwara inweta ya ga-ehulata ala. Afọ ekwesịghị iju ya ma o nweta naanị otu. Ọ ga-agba mbọ ka o nwetakwuo. N’eziokwu, o kwesịrị ịna-agụsi anyị agụụ ike ịmụtakwu eziokwu Baịbụl anyị ga-etinye n’ụlọ akụ̀ anyị.

15. Gịnị mere anyị nwere ike iji kpọọ eziokwu ụfọdụ nke “ochie,” oleekwa nke i ji kpọrọ ihe karịchaa?

15 Anyị mụtara ụfọdụ eziokwu bara ezigbo uru mgbe anyị malitere ịna-eso ndị Chineke. E nwere ike ịkpọ ihe ndị ahụ eziokwu “ochie” n’ihi na ọ bụ ha ka anyị bu ụzọ mụta. Olee ụfọdụ n’ime ha? Ná mmalite, anyị mụtara na ọ bụ Jehova kere anyị ma nye anyị ndụ nakwa na e nwere ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ. Anyị mụtakwara na ịhụnanya Chineke mere ka o jiri Ọkpara ya chụọ àjà iji gbapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Ihe ọzọ anyị mụtara bụ na Alaeze Chineke ga-eme ka ahụhụ niile kwụsị nakwa na anyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe udo na obi ụtọ ga-adị.—Jọn 3:16; Mkpu. 4:11; 21:3, 4.

16. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma a gbanwee otú anyị sibu ghọta eziokwu Baịbụl?

 16 Otú anyị si ghọta amụma Baịbụl ma ọ bụ amaokwu ụfọdụ nwere ike ịgbanwe mgbe ụfọdụ. Ụdị ihe ahụ mee, anyị kwesịrị iwepụta oge mụọ ya nke ọma ma chebara ya echiche. (Ọrụ 17:11; 1 Tim. 4:15) Ọ bụghị naanị na anyị ga-agbalị ịghọta ihe gbara ọkpụrụkpụ dị iche n’otú anyị si ghọta ya ugbu a na otú anyị si ghọta ya mgbe mbụ, kama anyị kwesịrị ịgbalị ka anyị ghọta obere ihe ndị a kọwara na nke ọhụrụ ahụ. Anyị ga-esi otú ahụ tinye eziokwu ọhụrụ ahụ n’ụlọ akụ̀ anyị. Gịnị mere anyị ji kwesị ime otú ahụ?

17, 18. Olee otú mmụọ nsọ ga-esi nyere anyị aka?

17 Jizọs kụziri na mmụọ nsọ Chineke nwere ike ime ka anyị cheta ihe ndị anyị mụrụ n’oge gara aga. (Jọn 14:25, 26) Olee otú ihe a Jizọs kwuru ga-esi nyere anyị aka mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma? Chegodị banyere otu nwanna aha ya bụ Peter. N’afọ 1970, ọ dị afọ iri na itoolu, ọ dịbeghịkwa anya ọ malitere ije ozi na Betel dị na Briten. Mgbe ọ nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ, ọ hụrụ otu nwoke nwere afụ ọnụ, onye dị ihe dị ka iri afọ ise. Peter jụrụ ya ma ọ̀ ga-achọ ịghọta Baịbụl. O juru nwoke ahụ anya, ya agwa Peter na ebe ọ bịara bụ n’ụlọ onye bụ́ rabaị n’okpukpe ndị Juu. Nwoke ahụ jụrụ Peter otu ajụjụ ka ọ mara ihe ọ ga-aza. Ọ jụrụ ya, sị: “Ehee, nwa m, olee asụsụ e ji dee akwụkwọ Daniel?” Peter zara ya, sị: “E ji asụsụ Arameik dee ebe ụfọdụ.” Peter mechara kwuo, sị: “O juru onye rabaị ahụ anya na m ma azịza ya. Ma ọ bụ m ka ọ kadị ju anya. Olee otú m si mata azịza ajụjụ ahụ? Mgbe m lara, gaa chọọ n’Ụlọ Nche na Teta! ọnwa ndị gara aga, m hụrụ otu isiokwu kọwara na e ji asụsụ Arameik dee akwụkwọ Daniel.” * O doro anya na mmụọ nsọ nwere ike ime ka anyị cheta ihe ndị anyị gụrụ n’oge gara aga, bụ́ ihe ndị anyị tinyere nke ọma n’ụlọ akụ̀ anyị.—Luk 12:11, 12; 21:13-15.

18 Ọ bụrụ na anyị ji eziokwu Jehova na-akụziri anyị kpọrọ ihe, anyị ga-achọ ịna-etinye ya n’ụlọ akụ̀ anyị, ma ihe ọhụrụ anyị ghọtara ma nke ochie. Ka anyị na-enwekwu obi ụtọ maka ya ma jiri ya kpọrọkwuo ihe, anyị ga-adịkwu njikere ịkụziri ya ndị ọzọ.

EKWELA KA IHE Ọ BỤLA MEE AKỤ̀ CHINEKE NYERE GỊ

19. Gịnị mere anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla mee akụ̀ Chineke nyere anyị?

19 Setan na ụwa ya na-agbasi mbọ ike ka anyị ghara iji akụ̀ ndị bara ezigbo uru anyị kwuru banyere ha n’isiokwu a kpọrọ ihe. O nwere ike iji aghụghọ ya nweta anyị. Mmadụ nwere ike ikwe anyị nkwa ọrụ na-enye ezigbo ego. Anyị nwere ike ịrọwa nrọ ibi ndụ ndị oké ozu ma ọ bụ chọọ ịna-egosi na anyị bụ aka ji akụ̀. Ihe ndị a nwere ike imegharị anyị anya. Jọn onyeozi gwara anyị na ụwa a na-agabiga, ya na agụụ ihe ọjọọ ya. (1 Jọn 2:15-17) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka anyị ghara ikwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị jiri akụ̀ ndị a Chineke nyere anyị gwuo egwu.

20. Gịnị ka i kpebiri ime ka ihe ọ bụla ghara ime akụ̀ Chineke nyere gị?

20 Dịrị njikere ịhapụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka ị ghara iji Alaeze Chineke kpọrọ ihe. Jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ozi ọma. Ekwela ka ikwusa ozi ọma a na-azọ ndụ gwụ gị ike. Na-achọsi eziokwu Baịbụl ike. I mee otú ahụ, ị ga-akpatara onwe gị ‘akụ̀ n’eluigwe, ebe onye ohi na-adịghị eru nso, ebe nla na-adịghịkwa erichapụ. N’ihi na ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.’—Luk 12:33, 34.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ para. 17 Mgbe e dere Baịbụl, e ji asụsụ Arameik dee Daniel 2:4b ruo 7:28.