Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2017

Jehova Na-akasi Anyị Obi ná Mkpagbu Anyị Niile

Jehova Na-akasi Anyị Obi ná Mkpagbu Anyị Niile

“Chineke nke nkasi obi niile . . . na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.”—2 KỌR. 1:3, 4.

ABỤ: 38, 56

1, 2. Olee otú Jehova si akasi anyị obi mgbe ọnwụnwa bịaara anyị? Olee nkwa o kwere anyị na Baịbụl?

OTU nwanna na-alụbeghị nwaanyị kọọrọ otu okenye lụrụla nwaanyị ihe na-echegbu ya. Ọ nọ na-eche gbasara 1 Ndị Kọrịnt 7:28, bụ́ ebe kwuru, sị: “Ndị lụrụ [di ma ọ bụ nwunye] ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” Ọ jụrụ okenye ahụ, sị: “Gịnị bụ ‘mkpagbu’ a? Olee otú m ga-esi emeri ya ma m lụọ nwaanyị?” Tupu okenye ahụ azaa ajụjụ ahụ, o bu ụzọ gwa nwanna ahụ ka o chebara ihe ọzọ Pọl onyeozi kwuru echiche. Pọl kwuru na Jehova bụ “Chineke nke nkasi obi, . . . onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.”—2 Kọr. 1:3, 4.

2 N’eziokwu, Jehova bụ Nna hụrụ anyị n’anya. Ọ na-akasikwa anyị obi mgbe ọnwụnwa bịaara anyị. O nwere ike ịbụ na e nweela mgbe ụfọdụ Chineke ji Okwu ya nyere gị aka ma duzie gị. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ chọrọ ka ihe gaziere anyị otú ahụ ọ chọkwara ka ọ gaziere ndị fere ya n’oge gara aga.—Gụọ Jeremaya 29:11, 12.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

 3 O doro anya na ọ na-aka adịrị anyị mfe idi nsogbu ma ọ bụ mkpagbu ma anyị mata ihe kpatara ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ná nsogbu ndị a na-enwe n’alụmdi na nwunye ma ọ bụ n’ezinụlọ. N’ihi ya, olee ihe ụfọdụ nwere ike ịkpata “mkpagbu n’anụ ahụ́” Pọl kwuru okwu ya? Olee ndị a kọrọ gbasara ha ma n’oge Baịbụl ma n’oge anyị a nwere ike ịkasi anyị obi? Ịmata azịza ajụjụ ndị a ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị.

“MKPAGBU N’ANỤ AHỤ́”

4, 5. Olee ihe ụfọdụ na-akpata “mkpagbu n’anụ ahụ́”?

4 Baịbụl gwara anyị ihe Chineke kwuru obere oge o kechara mmadụ. Ọ sịrị: ‘Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.’ (Jen. 2:24) Jehova kwuru ihe a mgbe o jikọrọ di na nwunye mbụ. Ma, ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, ndị lụrụ di na nwunye kwesịrị ịtụ anya na nsogbu ga-abịara ha. (Rom 3:23) Tupu nwaanyị alụọ di, ọ bụ nne na nna ya na-agwa ya ihe ọ ga-eme. Ma, ọ lụọ di, ọ bụzi di ya ka ọ ga na-erubere isi. Chineke nyere nwoke ikike ịbụ isi nke nwaanyị ya. (1 Kọr. 11:3) Ihe a anaghị adịrị ụfọdụ ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ mfe. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na nwaanyị ga na-eme ihe di ya kwuru karịa ihe nne ya na nna ya gwara ya. Ihe ọzọ nwere ike ịkpatara di na nwunye lụrụ ọhụrụ nsogbu bụ ma ha na ndị ọgọ ha na-enwe nghọtahie.

5 Nwaanyị gwa di ya, sị: “Adịla m ime,” chegodị otú obi nwere ike ịdị ha abụọ. Obi nwere ike ịdị ha ezigbo ụtọ. Ma ha nwekwara ike na-echegbu onwe ha ma à ga-amụ nwa ahụ siriri werere nakwa ma ahụ́ ọ̀ ga-esi ya ike ma a mụọ ya. Ha ga-echekwa banyere ego ha ga-emefu, ma mgbe nwaanyị ahụ dị ime ma mgbe ọ mụchara nwa. A mụchaa nwa ahụ, a ga-enwekwa ihe ndị ọzọ di na nwunye ahụ kwesịrị ịgbanwe. Nwaanyị ahụ mụrụ nwa ọhụrụ nwere ike jiri oge ya niile na-elekọta nwa ahụ. Ụdị ihe a emeela ka ọtụtụ ndị bụ́ di chee na nwunye ha ajụla ha. Ihe ọzọ bụ na di ga-enwekwu ọrụ, n’ihi na o nweela nwa ọhụrụ ọ ga na-egboro mkpa ma na-elekọta.

6-8. Olee otú obi nwere ike ịdị di na nwunye ma ha chọọ nwa, ma ha amụtaghị?

6 E nwekwara ụdị nsogbu ọzọ na-abịara ụfọdụ di na nwunye. Ha chọsiri ike ịmụta ụmụ, ma e nweghị nke ha mụtara. Nwaanyị lụọ di, ma ọ tụghị ime, o nwere ike na-agbawa ya obi. Ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ ịmụ ụmụ anaghị eme ka mmadụ ghara ịna-echegbu onwe ya. Ma, di na nwunye chọọ nwa, ma ha amụtaghị, ọ na-abụrụ ha “mkpagbu n’anụ ahụ́.” (Ilu 13:12) N’oge Baịbụl, ọ bụ ihe ihere ma nwaanyị amụtaghị nwa. Obi gbawara Rechel, bụ́ nwunye Jekọb, mgbe ọ hụrụ na nwanne ya nwaanyị mụtara ụmụ. (Jen. 30:1, 2) N’obodo ụfọdụ, ndị mmadụ na-amụ ọtụtụ ụmụ. A na-ajụkarị ndị ozi ala ọzọ nọ n’ụdị obodo ahụ ihe mere na ha amụghị nwa. N’agbanyeghị otú ha si wetuo obi kọwaa ihe kpatara ya, ụfọdụ nwere ike ịsị ha, “Anyị ga na-ekpere unu ekpere.”

7 Cheekwa gbasara otu nwanna nwaanyị bi n’Ịngland. Ọ chọrọ nwa elu, chọọ ala, ma nwa ekweghị abịa. Ka oge na-aga, ọ kwụsịrị ịhụ nsọ ya. O kwuru na obi gbawara ya, n’ihi na o doola ya anya na ọ gaghị amụta nwa n’ụwa ochie a. Ya na di ya kpebiri ịzụrụ nwa.  Ma, o kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, m ka na-akwa arịrị. Ama m na ịzụrụ nwa na ịmụta nwa nke m abụghị otu ihe ahụ.”

8 Baịbụl kwuru na a ga-esi “n’ịmụ nwa” chebe nwaanyị bụ́ Onye Kraịst. (1 Tim. 2:15) Ma, ọ pụtaghị na ịmụta nwa ga-eme ka nwaanyị nweta ndụ ebighị ebi. Kama, ọ pụtara na nwaanyị ilekọta ụmụ ya na ime ihe ndị ọzọ dị n’ụlọ nwere ike ime ka ọ ghara inwe ohere ọ ga-eji na-agba asịrị ma ọ bụ na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ya. (1 Tim. 5:13) Ma, ọ ka nwere ike inwe nsogbu ndị lụrụ di na nwunye na ndị nwere ezinụlọ na-enwe.

Olee otú mmadụ ga-esi kara obi ma mmadụ nwụnahụ ya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 12)

9. Olee otú ọnwụ di ma ọ bụ nwunye si bụrụ ọnwụnwa?

9 E kwuwe gbasara nsogbu ndị na-abịara di na nwunye, e nwere nke na-agaghị abata mmadụ n’obi ozugbo. Ọ bụ ọnwụ igbu onye dị mmadụ n’obi. Ọnwụ di ma ọ bụ nwunye so n’ọnwụnwa bịaarala ọtụtụ ndị. O nwere ike ịbụ na onye nke dị ndụ atụghị anya ụdị ọnwụnwa a n’ụwa ochie a. Ndị Kraịst kwetasiri ike na Jizọs ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọdịnihu otú ahụ o kwere ná nkwa. (Jọn 5:28, 29) Olee uru olileanya ahụ ga-abara onye nke dị ndụ? Ọ ga-akasi ya ezigbo obi. Ọ bụ ya bụ ụzọ ọzọ Nna anyị hụrụ anyị n’anya si eji Okwu ya akasi ndị mkpagbu bịaara obi ma na-akwado ha. Ka anyị lebazie anya n’otú Jehova si kasie ụfọdụ ndị fere ya obi nakwa uru ọ baara ha.

OTÚ JEHOVA SI AKASI ANYỊ OBI MA ỌNWỤNWA BỊARA ANYỊ

10. Olee otú Hana si kwụsị ịna-echegbu onwe ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

10 Ọnwụnwa bịaara Hana bụ́ nwunye Elkana hụrụ n’anya. Ọ mụtaghị nwa, nwunye di ya bụ́ Penina ana-amụ ka ọkụkọ. (Gụọ 1 Samuel 1:4-7.) Penina nọ na-akwa Hana emo “kwa afọ.” Ihe a mere ka obi na-ajọ Hana ezigbo njọ. Ọ kọọrọ Jehova nsogbu ya n’ekpere ka ọ kasie ya obi. N’eziokwu, ‘o kpere ekpere ruo ogologo oge n’ihu Jehova.’ Ọ̀ tụrụ anya ka Jehova za ekpere ya? Ọ ga-abụrịrị na ọ tụrụ anya ya. Ọ bụrụgodị na ọ tụghị anya ya, “ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ.” (1 Sam. 1:12, 17, 18) Obi siri ya ike na Jehova ga-eme ka ọ mụta nwa ma ọ bụ si n’ụzọ ọzọ tie ya aka n’obi.

11. Olee otú ikpe ekpere ga-esi kasie anyị obi?

11 Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, birikwa n’ụwa Setan na-achị, ọnwụnwa na mkpagbu ga na-abịara anyị. (1 Jọn 5:19) Ma, obi dị anyị ụtọ ịmata na Jehova bụ “Chineke nke nkasi obi niile.” Otu ụzọ anyị nwere ike isi merie ọnwụnwa ndị na-abịara anyị bụ ịna-ekpe ekpere. Hana kọọrọ Jehova otú ọ dị ya n’obi. N’ihi ya, ọnwụnwa bịara anyị, ihe anyị kwesịrị ime abụghị naanị ịgwa Jehova nsogbu ahụ. Anyị kwesịrị ịrịọsi ya arịrịọ ike, nke bụ́ iji obi anyị niile kpesie ekpere ike ma kọọrọ ya otú ọ dị anyị n’obi.—Fil. 4:6, 7.

12. Gịnị nyeere Ana aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na di ya nwụrụ?

12 Ọ bụrụgodị na ọ na-adị anyị ka ndụ anyị dị enweghị isi na ọdụ n’ihi na anyị amụtaghị nwa ma ọ bụ na mmadụ nwụnahụrụ anyị, anyị ka nwere ike ịkara obi. Di Ana, bụ́ onye amụma nwaanyị, nwụrụ mgbe ha lụrụ naanị afọ asaa. Baịbụl ekwughị ma hà mụtara ụmụ. Gịnị ka Ana nọ na-eme ruo mgbe ọ gbara afọ iri asatọ na anọ? Luk 2:37 kwuru na ‘ọ dịghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ, na ọ na-eje ozi dị nsọ abalị na ehihie, na-ebu ọnụ, na-arịọsikwa arịrịọ ike.’  N’eziokwu, ife Jehova kasiri Ana obi, meekwa ka ọ na-enwe obi ụtọ.

13. Nye ihe atụ na-egosi otú ezigbo ndị enyi nwere ike isi kasie anyị obi mgbe ndị ezinụlọ anyị mere ihe wutere anyị.

13 Ọ bụrụ na anyị na-akpa ụmụnna anyị nso, ọ ga-eme ka anyị nweta ezigbo ndị enyi. (Ilu 18:24) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Paula dị afọ ise mgbe mama ya hapụrụ ọgbakọ. O chetara otú o si wute ya n’oge ahụ. Ọ dịghịrị ya mfe idi nsogbu ahụ. Ma, otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Ann malitere ịna-agba ya ume ma na-enyere ya aka. Paula kwuru, sị: “N’agbanyeghị na Ann abụghị nwanne m, otú o si gosi na ọ hụrụ m n’anya nyeere m aka. O mere ka m ghara ịkwụsị ife Jehova.” Paula ka jikwa obi ya niile na-efe Jehova. Obi dị ya ụtọ na mama ya alọghachila n’ọgbakọ. Obi dịkwa Ann ụtọ na o nyeere Paula aka ịna-efe Jehova.

14. Olee uru anyị ga-erite ma anyị na-akasi ndị ọzọ obi?

14 Ọ bụrụ na anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma, anyị nwere ike chefuo ihe ụfọdụ na-enye anyị nsogbu n’obi. Ọtụtụ ụmụnna nwaanyị, ma ndị lụrụ di ma ndị na-alụbeghị, ma na ịbụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ n’ikwusa ozi ọma na-eme ka ha na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ha chọrọ ịna-eme uche Chineke iji na-asọpụrụ ya. Ụfọdụ ndị  na-eweredị ikwusa ozi ọma ka ihe na-eme ka ahụ́ na-adị ha mma. N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị niile ana-egosi na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi, ma ndị anyị na-ezi ozi ọma ma ndị nọ n’ọgbakọ, anyị na ụmụnna anyị ga na-adịkwu ná mma. (Fil. 2:4) Pọl onyeozi gosiri otú e si eme ya. O lekọtara ọgbakọ dị na Tesalonaịka otú ahụ “nne nke na-enye nwa ara” si elekọta ụmụ ya. Ọ kasikwara ha obi otú ahụ nna si akasi ụmụ ya obi.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 11, 12.

ỊKASI EZINỤLỌ DỊ ICHE ICHE OBI

15. Ole ndị ka Chineke nyere ọrụ ịkụziri ụmụaka eziokwu Baịbụl?

15 Ihe ọzọ e kwesịrị ilebara anya bụ otú anyị ga-esi na-akasi ezinụlọ dị iche iche obi ma na-enyere ha aka. Mgbe ụfọdụ, ndị batara ọhụrụ n’ọgbakọ nwere ike ịgwa ndị nkwusa na-eme nke ọma ka ha nyere ha aka na-akụziri ụmụ ha banyere Jehova, ma ọ bụdị mụwara ụmụaka ha ihe. Baịbụl kwuru na ọ bụ nne na nna ka Jehova nyere ọrụ ịkụziri ụmụaka ha ihe na ịzụ ha. (Ilu 23:22; Efe. 6:1-4) Mgbe ụfọdụ, ndị ọzọ nwere ike nye aka. Ọ na-abakwa uru. Ma, ọ pụtaghị na nne na nna agaghịzi arụ ọrụ ha. Ha na ụmụ ha kwesịrị ịna-ekwurịta okwu mgbe niile.

16. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-amụrụ ụmụaka ihe?

16 Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna ekpebie ka nwanna ọzọ na-amụrụ ụmụ ya ihe, nwanna ahụ ekwesịghị ịnara nne ahụ ma ọ bụ nna ahụ ọrụ ya. Mgbe ụfọdụ, a na-agwa nwanna ka ọ mụwara ụmụaka nne na nna ha na-abụghị Ndịàmà Jehova ihe. Ma, nwanna ahụ kwesịrị iburu n’obi na ịmụrụ ha ihe apụtaghị na ọ bụzi ya bụ nne ha ma ọ bụ nna ha. A mụwara ụmụaka ahụ ihe, ọ ga-adị mma ka a nọrọ n’ụlọ ha mgbe ndị mụrụ ha ma ọ bụ nwanna ọzọ ma nke a na-akọ nọ ya ma ọ bụkwanụ n’ebe dị mma ndị mmadụ ga na-ahụ ha. E mee otú ahụ, anyị agaghị eme ka ụfọdụ ndị ghọtahie ihe a na-eme. Anyị ga-enwe olileanya na ka oge na-aga, nne ha na nna ha ga-akụziwere ha banyere Jehova, nke bụ́ ọrụ o nyere ha.

17. Olee otú ụmụaka nwere ike isi na-akasi ndị ezinụlọ ha obi?

17 Ndị na-eto eto hụ Jehova n’anya ma na-eme ihe o kwuru, ha nwere ike ịna-akasi ndị ezinụlọ ha obi. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-akwanyere ndị mụrụ ha ùgwù ma na-enyere ha aka. Ha jirikwa obi ha niile na-efe Jehova, ọ ga na-agba ndị ezinụlọ ha ume. Tupu Iju Mmiri oge Noa, Lemek, si n’agbụrụ Set, fere Jehova. O kwuru banyere nwa ya bụ́ Noa, sị: “Onye a ga-ewetara anyị nkasi obi n’ọrụ anyị nakwa ná ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ihi ọnụ Jehova bụrụ ala.” Amụma a mezuru mgbe Jehova kagburu ọnụ ahụ ọ bụrụ ala. (Jen. 5:29; 8:21) Taa, ụmụaka ndị ji obi ha niile na-efe Jehova nwekwara ike ịkasi ndị ezinụlọ ha obi, na-enyere ha niile aka idi nsogbu ndị na-abịara ha ugbu a, dịkwa ndụ mgbe ihe karịrị Iju Mmiri ga-abịa.

18. Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka idi ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị?

18 Ikpe ekpere, ịtụgharị uche ná ndị Baịbụl kọrọ akụkọ ha, na ịkpa ụmụnna nso na-akasi ọtụtụ nde mmadụ obi ugbu a n’ọnwụnwa niile na-abịara ha. (Gụọ Abụ Ọma 145:18, 19.) Anyị mata na Jehova dị njikere ịkasi anyị obi mgbe niile, ọ ga-eme ka anyị die ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị, ma ugbu a ma n’ọdịnihu.