Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2017

Ị̀ Ga-edozi Esemokwu, Meekwa Ka Udo Dị?

Ị̀ Ga-edozi Esemokwu, Meekwa Ka Udo Dị?

JEHOVA CHINEKE gwara Ndị Kraịst ka ha jiri udo kpọrọ ihe, ka ha na ndị ọzọ na-adị n’udo. Anyị mee otú ahụ, ezigbo udo ga-adị n’ọgbakọ. Ọ ga-emekwa ka ndị chọrọ udo bata n’ọgbakọ.

Dị ka ihe atụ, otu dibịa afa a ma ama na Madagaska hụrụ otú Ndịàmà Jehova si dịrị n’otu, ya asị onwe ya: ‘Mgbe ọ bụla m ga-achọ ịgawa chọọchị, ọ bụ nke a ka m ga-aga.’ Ka oge na-aga, o sepụrụ aka ná mgbaasị, jiri ọnwa ole na ole mee ka alụmdi na nwunye ya dịrị otú Baịbụl kwuru. O bidoziri ife Jehova, bụ́ Chineke udo.

Kwa afọ, ọtụtụ ndị na-eme ihe nwoke ahụ mere. Ha na-abata n’ọgbakọ, hụ udo ha na-achọ kemgbe. Ma, Baịbụl kwuru hoo haa na ọ bụrụ na “oké ekworo na esemokwu” adịrị n’ọgbakọ, o nwere ike itisa ndị enyi, kpatakwa nsogbu. (Jems 3:14-16) Obi dị anyị ụtọ na Baịbụl nyekwara anyị ezigbo ndụmọdụ gbasara otú anyị ga-esi gbaara nsogbu ndị ahụ ọsọ ma mee ka udo dị. Ka anyị leba anya n’akụkọ ndị mere eme iji nyere anyị aka ime otú ahụ.

NSOGBU NA IHE A GA-EME

Otu nwanna aha ya bụ Chris sịrị: “Ihe anaghị adabara mụ na otu nwanna mụ na ya na-arụkọ ọrụ. E nwere mgbe anyị nọ na-abarịta mba, mmadụ abụọ abata hụ ka anyị na-ese okwu.”

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Janet sịrị: “Nwanna nwaanyị mụ na ya na-esokarị aga ozi ọma nọkatara kwụsị mụ na ya iso aga. O mechara kwụsị ịtụpụrụ m ọnụ. Amaghị m ihe kpatara ya.”

Otu nwanna aha ya bụ Michael sịrị: “Mụ na mmadụ abụọ ndị ọzọ nọ na-ekwurịta okwu n’ekwentị. Otu onye asị anyị ka e mesịa, mụ echee na ọ pịnyụọla nke ya. M gwaziri onye nke ọzọ ihe na-adịghị mma gbasara onye ahụ. Ma, ọ pịnyụbeghị ekwentị ya.”

Nwanna ọzọ aha ya bụ Gary sịrị: “N’ọgbakọ anyị, ndị ọsụ ụzọ abụọ malitere ise okwu. Otu na-abakarịrị onye nke ọzọ mba. Esemokwu ha mere ka obi ghara ịdị ndị ọzọ mma.”

I nwere ike iche na ihe ndị a a kọrọ bụ obere ihe. Ma, nke ọ bụla n’ime ha nwere ike ịgbawa ndị ahụ obi, meekwa ka udo ghara ịdị n’ọgbakọ. Ma, obi ga-adị gị ụtọ ma ị mata na ụmụnna ndị ahụ mechara kpezie n’ihi ime ihe Baịbụl kwuru. Olee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru i chere nyeere ha aka?

 “Unu ewesola ibe unu iwe n’ụzọ.” (Jen. 45:24) Ọ bụ Josef gwara ụmụnne ya ihe a mgbe ha na-alaghachikwuru nna ha. Ndụmọdụ ahụ baara ha uru. Ọ bụrụ na mmadụ anaghị ejide onwe ya ma na-ewe iwe ọsịịsọ, o nwere ike ịkpasu ndị ọzọ iwe. Chris chọpụtara na nsogbu ya bụ mpako nakwa na ọ na-esiri ya ike ịnara ndụmọdụ. Ma, ọ chọrọ ịgbanwe. Ọ bụ ya mere o ji rịọ nwanna ahụ ya na ya na-ese okwu mgbaghara, gbalịsiekwa ike ịna-ejide onwe ya. Mgbe nwanna ahụ hụrụ na Chris agbawala mbọ ịgbanwe, yanwa malitekwara ịgbanwe. Ha abụọ jizi obi ụtọ na-ejere Jehova ozi.

“Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu.” (Ilu 15:22) Janet chọpụtara na ya kwesịrị ịgbakwu mbọ mee ihe a Baịbụl kwuru. O kpebiri ịgakwuru nwanna nwaanyị nke ọzọ ka ha ‘gbaa izu.’ Ka ha na-akparịta ụka, Janet ji akọ gwa ya ka o kwuo ihe na-ewe ya iwe. Ikwurịta ya siiri ha ike ná mmalite, ma ha mechara wetuo obi kwurịta ihe na-esere ha. Nwanna nwaanyị ahụ chọpụtara na ya ghọtahiere otu ihe merenụ, nke na-agbasadịghị Janet. Ọ rịọrọ Janet mgbaghara. Ha abụọ jikwa otu obi na-ejere Jehova ozi.

“Ya mere, ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà, i wee nọrọ n’ebe ahụ cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà gawa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo.” (Mat. 5:23, 24) I nwere ike icheta ndụmọdụ a Jizọs nyere mgbe ọ na-akụzi ihe n’elu ugwu. Okwu ọjọọ ahụ Michael kwuru gbasara nwanna nke ọzọ ahụ mechara wute ya. O kpebisiri ike ịgba mbọ ka ya na ya kpezie. O weturu obi rịọ nwanna ahụ mgbaghara ihu na ihu. Gịnịzi mere? Michael sịrị: “Nwanna m ji obi ya niile gbaghara m.” Ha abụrụkwa enyi otú ha bụbu.

“Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya.” (Kọl. 3:12-14) Otu okenye ji obiọma nyere ụmụnna nwaanyị abụọ ahụ sụrụla ụzọ ọtụtụ afọ aka ichebara ajụjụ ndị a echiche: ‘Anyị abụọ ànyị kwesịrị ime ka obi jọwa ndị ọzọ njọ n’ihi okwu anyị na-ese? È nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji ghara ịna-ediri ibe anyị ihe ma na-ejere Jehova ozi n’udo?’ Ha nabatara ndụmọdụ okenye ahụ nyere ha ma mee ihe ọ gwara ha. Ha jizi otu obi na-ekwusa ozi ọma.

 Mmadụ mejọọ gị, ime ihe ahụ Ndị Kọlọsi 3:12-14 kwuru nwere ike inyere gị aka. Ọtụtụ ndị achọpụtala na ịdị umeala n’obi nwere ike ime ka ha gbaghara onye ahụ ma chefuo ihe o mere. Ị gbalịchaa ma o kweghị gị, i nwere ike ime ihe Jizọs kwuru na Matiu 18:15. Ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere bụ ihe e kwesịrị ime ma mmadụ mee mmehie dị oké njọ. Ma, i nwere ike ime ihe ahụ o kwuru. Gakwuru nwanna ahụ ma wetuo obi ka gị na ya kwurịta ihe ahụ ma kpezie.

E nwere aro ndị ọzọ bara uru dị na Baịbụl. Ihe ga-enyere gị aka ime ihe ndị ahụ bụ inwe àgwà ndị so ná ‘mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ya bụ, ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.’ (Gal. 5:22, 23) Ọ na-abụ, a tụọ njin mmanụ, ya ana-arụ ọrụ nke ọma. Otú ahụkwa ka àgwà ọma ndị a si eme ka udo dị.

ÀGWÀ DỊ ICHE ICHE NA-EME KA ỌGBAKỌ NA-ATỌKWU ỤTỌ

Onye ọ bụla nwere àgwà nke ya. Otú anyị si ele ihe anya na otú anyị si ekwu ihe dị anyị n’obi dịkwa iche iche. Ihe ndị a nwere ike ime ka enyi na enyi na-enwe obi ụtọ. Ma, àgwà dị iche iche nwekwara ike ịkpata nghọtahie na esemokwu. Otu nwanna bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ nyere ihe atụ a: “O nwere ike isiri onye na-eme ihere ike ịkpa onye dị aghịrịịgha nso. Otú àgwà ha si dị iche iche nwere ike ịdị ka o nweghị ihe ọ bụ. Ma, o nwere ike ime ka ha see ezigbo okwu.” Ma, ì chere na ndị àgwà ha dị iche iche ga-eserịrị okwu? Chegodị banyere mmadụ abụọ so ná ndịozi Jizọs. Olee ụdị onye Pita bụ? I nwere ike iwere ya ka onye na-anaghị asọ anya, onye na-emekwa ihe ozugbo ozugbo. Jọn kwanụ? Anyị nwere ike iwere ya ka onye na-eche echiche tupu ya ekwuo okwu ma ọ bụ mee ihe ọ bụla. E nwere ike inwe ihe  ụfọdụ mere anyị ga-eji chee otú ahụ gbasara ndịozi abụọ a. O yiri ka àgwà ha abụọ abụghị otu. Ma, ha rụkọrọ ọrụ nke ọma. (Ọrụ 8:14; Gal. 2:9) N’ihi ya, Ndị Kraịst àgwà ha na-abụghị otu ga-arụkọli ọrụ taa.

Nwanna nọ n’ọgbakọ unu nwere ike na-ekwu ma ọ bụ na-eme ihe na-ewe gị iwe. Ma, ị ghọtara na Kraịst nwụrụ n’ihi onye ahụ. I kwesịkwara igosi na ị hụrụ onye ahụ n’anya. (Jọn 13:34, 35; Rom 5:6-8) N’ihi ya, kama ịna-agbara ya ọsọ ma ọ bụ kpebie na gị na ya agaghị abụli enyi, jụọ onwe gị, sị: ‘Nwanna a ọ̀ na-eme ihe Baịbụl kwuru na ọ dị njọ? Ọ̀ kpachaara anya na-akpasu m iwe? Ka ọ̀ bụ naanị na àgwà anyị abụghị otu?’ Ajụjụ dị ezigbo mkpa ị ga-ajụ onwe gị bụ: ‘Olee àgwà ọma ya ndị nwere ike ịbara m uru?’

Ajụjụ nke ikpeazụ a dị mkpa. Ọ bụrụ na onye ahụ na-ekwu ekwurekwu ma gịnwa anaghị ekwu, chegodị otú o si adịrị ya mfe ịmalite izi mmadụ ozi ọma. I nwere ike ịgwa ya ka unu rụọ, ka ị hụ ihe ị ga-amụta n’aka ya. Ọ bụrụ na ọ na-emesapụ aka, ma ọ na-esiri gị ike imesapụ aka, ọ́ gaghị adị mma ka ị chọpụta otú obi ga-esi dị gị ụtọ ma ị na-enye ndị agadi, ndị ọrịa, ma ọ bụ ndị ihe na-esiri ike ihe? Ihe dị mkpa bụ na, ọ bụrụgodị na àgwà gị dị iche na nke ya, gị na ya nwere ike ịna-adị ná mma ma unu lekwasị anya n’ebe onye nke ọ bụla na-eme nke ọma. O nwere ike ịbụ na ime otú ahụ agaghị eme ka unu bụrụ nnu na mmanụ. Ma, o nwere ike ime ka unu dị ná mma, meekwa ka udo na-adị n’ọgbakọ, obi eruokwa gị ala.

O nwere ike ịbụ na àgwà Yuodia na Sintiki dị iche iche. Ma, Pọl onyeozi gwara ha ka ha “nwee otu obi n’ime Onyenwe anyị.” (Fil. 4:2) Ị̀ ga-agbalịsi ike otú ahụ ka unu nwee otu obi, meekwa ka udo dị?

EKWELA KA ESEMOKWU DỊGIDE

Ụfụ obi yiri ahịhịa ọjọọ na-eto n’ebe e nwere ọmarịcha okooko osisi. Ọ ga  na-agbasa ma e fopụghị ya. Ozugbo ụfụ obi bara mmadụ n’obi, o nwedịrị ike ịkpata nsogbu n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova na ụmụnna anyị n’anya, anyị ga-agbalịsi ike ka àgwà anyị ghara itisa ọgbakọ.

I wetuo onwe gị ala ma gbalịsie ike ka gị na nwanna kpezie, o nwere ike ịrụpụta ihe magburu onwe ya

Anyị buru ime udo n’obi gaa ka anyị na nwanna kpezie, ihe ọma ọ ga-arụpụta nwere ike iju anyị anya. Chegodị banyere otu nwanna nwaanyị. O kwuru, sị: “O nwere mgbe ọ dị m ka otu nwanna nwaanyị ọ̀ na-eme m ka m̀ bụ taata. O nyere m nsogbu n’obi. Iwe eju m obi. Mụ akparịwa ya. M chere, sị: ‘Ebe ọ bụ na ọ naghị akwanyere m ùgwù ruuru m, agaghị m na-akwanyere ya ùgwù.’”

Nwanna a mechara jiri ire ya gụọ ezé ya ọnụ. Ọ sịrị: “M malitere ịhụ ihe m na-emejọ. Ike agwụ m. M ghọtara na m kwesịrị ịgbanwe otú m si eche echiche. Mgbe m gwachara Jehova gbasara ya, m zụtaara nwanna nwaanyị ahụ obere onyinye ma dee ihe na kaadị, rịọ ya mgbaghara maka otú m si kpaso ya àgwà. Mụ na ya makụrụ, kwekọrịtakwa na anyị ga-echefu ihe ahụ. Anyị esebeghị okwu ọzọ kemgbe ahụ.”

Ndị mmadụ na-achọ udo ka à na-anwụ anwụ. Ma, ọtụtụ ndị nwere ike ịkpawa àgwà ga-eme ka udo ghara ịdị ma ha chee na a kparịala ha ma ọ bụ na o nweghị ihe e ji ha kpọrọ. Ọ bụ otú ọtụtụ ndị ụwa na-eme. Ma, ndị na-efe Jehova kwesịrị ịdị n’udo, dịrịkwa n’otu. Jehova nyere Pọl mmụọ nsọ ide, sị: “M . . . na-arịọsi unu ike ka unu na-eje ije n’ụzọ kwesịrị òkù ahụ a kpọrọ unu, n’ịdị umeala n’obi na ịdị nwayọọ zuru ezu, n’ogologo ntachi obi, jirikwa ịhụnanya na-ediri ibe unu ihe, na-agbasi mbọ ike ka unu nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.” (Efe. 4:1-3) “Udo” a bara ezigbo uru. Ka anyị mee ka ọ na-esikwu ike. Ka anyị kpebisiekwa ike ịna-edozi nghọtahie ọ bụla anyị na nwanna nwere.