Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2016

N’oge anyị a, nwoke ahụ jí mpi ink odeakwụkwọ nọchiri anya Jizọs Kraịst, bụ́ onye a na-anaghị ahụ anya nke na-aka ndị a ga-echebe akara

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ọhụụ Ezikiel, ole ndị ka nwoke ahụ jí mpi ink odeakwụkwọ na ndị ikom isii ahụ jí ngwá ọgụ e ji akụgbu mmadụ nọchiri anya ha?

Ha nọchiri anya ndị mmụọ ozi duziri mbibi e bibiri Jeruselem, ndị ga-ebibikwa ụwa Setan a n’Amagedọn. Ihe a bụ nghọta ọhụrụ. Gịnị mere o ji daba adaba?

Mgbe Ezikiel hụchara ihe ọjọọ a na-eme na Jeruselem tupu e bibie ya n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst, Chineke mere ka ọ hụ ihe ndị ga-eme tupu mbibi ahụ. Ọ hụrụ ndị ikom isii jí ngwá ọgụ e ji akụgbu mmadụ, hụkwa otu nwoke nọ́ n’etiti ha, “nke yi uwe linin,” ‘fanyekwa mpi ink nke odeakwụkwọ n’úkwù.’ (Ezik. 8:6-12; 9:2, 3) A gwara nwoke ahụ, sị: “Gagharịa n’ime obodo a, . . . kaa ndị na-eze ume ma na-asụ ude n’ihi ihe arụ niile a na-eme n’ime ya akara n’egedege ihu.” A gwaziri ndị ikom ahụ jí ngwá ọgụ e ji akụgbu mmadụ ka ha gaa gbuo ndị niile nọ́ n’obodo ahụ, bụ́ ndị a na-akaghị akara ahụ. (Ezik. 9:4-7) Gịnị ka ọhụụ a na-akụziri anyị? Ònye bụ nwoke ahụ jí mpi ink odeakwụkwọ?

E buru amụma a n’afọ 612 Tupu Oge Ndị Kraịst. Mgbe mbụ o mezuru bụ mgbe ndị agha Babịlọn bibiri Jeruselem, ya bụ, mgbe afọ ise gachara. N’agbanyeghị na ọ bụ ndị Babịlọn, bụ́ ndị na-ekpere arụsị, bibiri Jeruselem, ọ bụ Jehova kwere ka ha mee ya. (Jere. 25:9, 15-18) Ihe mere o ji kwe ka ha mee ya bụ iji taa ndị ahụ nupụụrụ ya isi ahụhụ. Ma, ihe e mere abụghị igbu onye ọ bụla a hụrụ. E gbukọtaghị ndị ezi omume na ndị ajọ omume. Jehova ji obiọma mee ndokwa ka e chebe ndị Juu ihe arụ a na-eme n’obodo ahụ na-adịghị mma.

Ezikiel esoghị kaa akara ahụ ma ọ bụ bibie ndị ahụ mere ihe ọjọọ. Kama, ọ bụ ndị mmụọ ozi duziri mbibi ahụ. N’ihi ya, amụma a mere ka anyị hụ ihe mere n’eluigwe. Ọrụ Jehova nyere ndị mmụọ ozi ya bụ ma iduzi mbibi e bibiri ndị ajọ omume ma ịhọpụta ndị ezi omume a ga-echebe. *

N’oge gara aga, anyị kọwara na n’oge anyị a, nwoke ahụ jí mpi ink odeakwụkwọ nọchiri anya ndị e tere mmanụ ka nọ́ n’ụwa. Anyị chere na e zie mmadụ ozi ọma, ya echegharịa, a kaala ya akara na-egosi na a ga-echebe ya. Ma n’afọ ndị na-adịbeghị anya, o doola anya na e kwesịrị ịgbanwe otú ahụ anyị si kọwaa amụma a. Ihe e kwuru na Matiu 25:31-33 gosiri na ọ bụ Jizọs ga-ekpe ndị mmadụ ikpe. Mgbe ọ ga-eme ya bụ n’oké mkpagbu na-abịanụ. N’oge ahụ, ọ ga-echebe ndị o kpebiri na ha bụ atụrụ, ma bibie ndị o kpebiri na ha bụ ewu.

N’ihi otú a anyị si ghọta amụma ahụ Ezikiel buru, olee ihe ndị anyị mụtara n’amụma ahụ? Ihe ise anyị mụtara bụ:

  1.  Tupu e bibie Jeruselem, Ezikiel na Jeremaya dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ihe ga-eme obodo ahụ. Ha mere ka ndị nche otú ahụ Aịzaya mere tupu mgbe ahụ. Taa, Jehova na-esi n’aka mmadụ ole na ole e tere mmanụ akụziri ndị ya ihe, na-adọkwa ha aka ná ntị tupu oké mkpagbu ahụ amalite. Ndị niile só n’ezinụlọ Kraịst, ya bụ, ndị Chineke niile, so na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị ahụ.—Mat. 24:45-47.

  2. Ezikiel esoghị kaa ndị a ga-echebe akara n’oge ochie. Ndị Chineke taa esoghịkwa na-aka ndị a ga-echebe akara. Naanị ihe ha na-eme bụ izi ndị mmadụ ozi Jehova chọrọ ka e zie ha. Ọ bụ ndị mmụọ ozi na-eduzi ozi ọma ahụ a na-ekwusa n’ụwa niile.—Mkpu. 14:6.

  3.    N’oge Ezikiel, e nweghị onye a kara akara nkịtị n’egedege ihu ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Gịnị ka ndị mmadụ kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka e chebe ha n’oké mkpagbu ahụ na-abịanụ? Ha kwesịrị ige ntị n’ozi ọma ahụ a na-ekwusa, na-eṅomi àgwà Kraịst, nyefeekwa Chineke onwe ha ma na-akwado ụmụnna Kraịst n’ozi ọma ha na-ekwusa. (Mat. 25:35-40) A ga-aka ndị na-eme ihe ndị a akara n’oké mkpagbu ahụ na-abịanụ, nke pụtara na a ga-echebe ha.

  4.  N’oge anyị a, nwoke ahụ jí mpi ink odeakwụkwọ nọchiri anya Jizọs Kraịst, bụ́ onye a na-anaghị ahụ anya nke na-aka ndị a ga-echebe akara. N’oké mkpagbu ahụ, a ga-aka oké ìgwè mmadụ ahụ akara mgbe a ga-ekpebi na ha bụ atụrụ. Ọ pụtara na ha ga-adịzi ndụ ebighị ebi n’ụwa a.—Mat. 25:34, 46. *

  5. N’oge anyị a, ndị ikom isii ahụ jí ngwá ọgụ e ji akụgbu mmadụ nọchiri anya ndị mmụọ ozi nọ́ n’eluigwe na Jizọs bụ́ onyeisi ha. Ha ga-ebibi mba niile na ihe ọjọọ niile n’oge na-adịghị anya.—Ezik. 9:2, 6, 7; Mkpu. 19:11-21.

Ihe ndị a anyị ghọtara na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova anaghị ebibikọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume. (2 Pita 2:9; 3:9) Ha na-echetakwara anyị na ikwusa ozi ọma dị mkpa n’oge anyị a. Mmadụ niile kwesịrị ịnụ ya tupu ọgwụgwụ abịa.—Mat. 24:14.

^ para. 6 E chebere ndị dị́ ka Barọk (bụ́ odeakwụkwọ Jeremaya), Ibed-melek, bụ́ onye Itiopia, na ndị Rikab n’agbanyeghị na a kaghị ha akara nkịtị n’egedege ihu. (Jere. 35:1-19; 39:15-18; 45:1-5) Akara a kara ha pụtara na a ga-echebe ha.

^ para. 12 Ọ gaghị adị mkpa ka a kaa ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi akara a iji chebe ha. Kama, mgbe a ga-aka ha akara ikpeazụ bụ tupu ha anwụọ ma ọ bụ tupu oké mkpagbu ahụ amalite.—Mkpu. 7:1, 3.