Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2016

Àgwà Dị́ Chineke Mma Nke Bara Uru Karịa Dayamọnd

Àgwà Dị́ Chineke Mma Nke Bara Uru Karịa Dayamọnd

Kemgbe ụwa, a na-ewere dayamọnd ka ihe bara ezigbo uru. A na-ere ụfọdụ n’ime ha ọtụtụ nde naịra. Ma, ọ̀ ga-abụ na e nwere ihe ndị bara uru n’anya Chineke karịa dayamọnd ma ọ bụ nkume ndị dị́ oké ọnụ ahịa?

 E nwere otu onye nkwusa a na-emebeghị baptizim aha ya bụ Haykanush. O bi n’Aminia. Otu ụbọchị, ọ hụrụ otu akwụkwọ ikike e ji agafe mba ọzọ n’ebe dị́ nso n’ụlọ ya. Ihe dị́ n’ime ya bụ kaadị ụfọdụ e ji adọrọ ego na ego buru ezigbo ibu. Ọ gwara di ya, bụ́kwa onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.

Ihe na-esiri ha abụọ ezigbo ike. Ha jikwa ụgwọ; ma, ha kpebiri na ha ga-ewega ego ahụ n’adres e dere n’akwụkwọ ahụ. O juru nwoke ihe ahụ funahụrụ na ndị ezinụlọ ya anya. Haykanush na di ya kọwara na ọ bụ ihe ha na-amụta na Baịbụl mere ka ha weghachite ihe ahụ furu efu. Ha kpebiri na ha ga-akwụwa aka ọtọ. Ha ji ohere ahụ gwa ezinụlọ ahụ banyere Ndịàmà Jehova, nyekwa ha ụfọdụ akwụkwọ anyị.

Ezinụlọ ahụ chọrọ inyetụ Haykanush ego maka ihe ahụ o mere, ya ajụ. N’echi ya, nwunye nwoke ahụ gara n’ụlọ Haykanush hà, rịọsie ya ike ka ọ nara mgbaaka dayamọnd o wetaara ya iji kelee ha maka ihe ahụ o mere.

Otú ahụ o juru ezinụlọ ahụ anya mgbe Haykanush na di ya weghachitere ihe ahụ furu efu ka ọ na-ejukwa ọtụtụ ndị taa. Ma ọ̀ ga-eju Jehova anya? Olee otú ọ ga-esi ele ihe ahụ ha mere anya? Otú ahụ ha si kwụwa aka ọtọ ọ̀ bara uru?

ÀGWÀ NDỊ BARA URU KARỊA IHE A NA-AHỤ ANYA

Ịza ajụjụ ndị ahụ esighị ike n’ihi na ndị na-efe Chineke kwetara na ịkpa àgwà dị́ Jehova mma bara uru n’anya ya karịa dayamọnd, ọlaedo, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ a na-ahụ anya. N’eziokwu, ihe Jehova na-ewere ka ihe bara uru dị iche n’ihe ọtụtụ ndị na-ewere ka ihe bara uru. (Aịza. 55:8, 9) Ndị na-efe Jehova ghọtara na mbọ ha na-agba iṅomi àgwà Jehova bara ezigbo uru.

Anyị ga-aghọtakwu ihe a a na-ekwu ma anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru banyere nghọta na amamihe. Ilu 3:13-15 sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị onye chọtaworo amamihe, na onye nwetara nghọta, n’ihi na ọ dị mma inweta ya dị ka uru karịa inweta ọlaọcha dị ka uru, inweta ya dị ka ihe mmadụ rụpụtara dịkwa mma karịa inweta ọlaedo. Ọ dị oké ọnụ ahịa karịa nkume kọral, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ọzọ na-atọ gị ụtọ nke pụrụ ịha ka ya.” O doro anya na Jehova na-eji àgwà ndị ahụ akpọrọ ihe karịa ụdị akụ̀ ọ bụla.

Oleekwanụ maka ịkwụwa aka ọtọ?

Jehova na-akwụwa aka ọtọ; ‘ọ pụghị ịgha ụgha.’ (Taị. 1:2) N’oge ndịozi Jizọs, Chineke nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ idegara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru akwụkwọ ozi. Ọ sịrị ha: “Na-ekpenụ ekpere maka anyị, n’ihi na anyị kwenyesiri ike na anyị nwere akọ na uche ziri ezi, ebe anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”—Hib. 13:18.

Jizọs Kraịst gosiri otú e si akwụwa aka ọtọ. Dị ka ihe atụ, chegodị mgbe Keyafas bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà sịrị ya: “Eji m Chineke dị ndụ na-eme ka ị ṅụọ iyi na ị ga-agwa anyị ma ọ̀ bụ gị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke!” Jizọs gwara ya hoo haa na ya bụ Mesaya n’agbanyeghị na ikwu nke bụ́ eziokwu nwere ike ime ka ndị Sanhedrin kwuo na ọ na-ekwulu Chineke, nke nwere ike ime ka e gbuo ya.—Mat. 26:63-67.

Anyịnwa kwanụ? Ànyị ga-ekwu eziokwu ma ọ bụrụ na e nwere ihe anyị ga-erite ma anyị hapụ ikwu eziokwu ma ọ bụ ma anyị gbanwetụ ihe bụ́ eziokwu?

IHE MERE ỊKWỤWA AKA ỌTỌ JI ESI IKE

O doro anya na ịkwụwa aka ọtọ adịghị mfe n’oge ikpeazụ a ọtụtụ ndị bụ ‘ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, na ndị hụrụ ego  n’anya.’ (2 Tim. 3:2) Ụkọ ego na enweghị ọrụ emeela ka ịkwụwa aka ọtọ laa ka naị. Ọtụtụ ndị chere na o nweghị ihe o mere ma ha zuo ohi, ghọgbuo mmadụ, ma ọ bụ mee ihe ọzọ bụ́ akwụwaghị aka ọtọ. Otú ụdị echiche a si zuo ebe niile emeela ka ọtụtụ ndị na-eche na mmadụ agaghị akwụwali aka ọtọ. E nweedịla ụfọdụ Ndị Kraịst mere ihe ha na-ekwesịghị ime n’ụdị ihe a, mebiekwa aha ọma ha n’ọgbakọ n’ihi na ha chọrọ irite “uru aghụghọ.”—1 Tim. 3:8; Taị. 1:7.

Ma ọtụtụ Ndị Kraịst na-eṅomi Jizọs. Ha ghọtara na àgwà ndị dị́ Chineke mma dị mkpa karịa akụ̀ ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ha nwere ike inweta. N’ihi ya, Ndị Kraịst bụ́ ndị na-eto eto anaghị aghọ aghụghọ iji gafee n’ule n’ụlọ akwụkwọ. (Ilu 20:23) Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị mgbe niile ka a na-emere onye kwụwara aka ọtọ ihe ọma otú ahụ e meere Haykanush, ma ịkwụwa aka ọtọ dị mma n’anya Chineke. Ọ na-eme ka anyị nwee akọnuche dị́ ọcha, nke bụ́ ihe bara ezigbo uru.

Dị ka ihe atụ, otu nwoke aha ya bụ Gagik sịrị: “Tupu mụ aghọọ Onye Kraịst, m na-arụ ọrụ n’otu nnukwu ụlọ ọrụ. Onye nwe ụlọ ọrụ ahụ anaghị ekwe akwụ ụtụ isi. Ihe ọ na-eme bụ ikwu na ego ụlọ ọrụ anyị na-enweta dị obere. Ebe m bụ onyeisi ụlọ ọrụ anyị, a chọrọ ka m na-enye onye na-anatara gọọmenti ụtụ isi aka azụ ka o kweta ileghara aghụghọ ahụ ụlọ ọrụ anyị na-aghọ anya. Ihe ahụ m na-eme mere ka a mara m ka onye na-anaghị akwụwa aka ọtọ. Mgbe m mụtara eziokwu banyere Jehova, m kwụsịrị ịna-eme ya n’agbanyeghị na a na-akwụ m ezigbo ụgwọ n’ọrụ ahụ. Kama, m mepere ụlọ ọrụ nke m. Ozugbo m mepere ụlọ ọrụ ahụ, m debara aha ya n’akwụkwọ gọọmenti ma kwụọ ụtụ isi niile m kwesịrị ịkwụ.”—2 Kọr. 8:21.

Gagik sịrị: “Ego m na-akpata ugbu a bụ ihe dị́ ka ọkara ihe m na-akpatabu. N’ihi ya, o siiri m ike ịna-egboro ndị ezinụlọ m mkpa ha. Ma, m na-enwekwu obi ụtọ ugbu a. M nwere akọnuche dị́ ọcha n’ihu Jehova. M na-egosi ụmụ m ndị nwoke abụọ àgwà ọma ha kwesịrị ịna-akpa. Enweekwala m ọtụtụ ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ. Ihe ndị mụ na ha na-emekọ ihe gbasara ụtụ isi nakwa ndị ọzọ jizi mara m bụ na m na-akwụwa aka ọtọ.”

JEHOVA NA-ENYERE ANYỊ AKA

Jehova hụrụ ndị na-achọ ozizi ya mma n’anya, ya bụ, ndị na-eṅomi otú o si akwụwa aka ọtọ nakwa àgwà ya ndị ọzọ magburu onwe ha. (Taị. 2:10) O nyere Eze Devid ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ọ dị mgbe m bụ nwata, emewokwa m agadi, ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.”—Ọma 37:25.

Ihe Rut mere gosiri na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ọ rapaara nne di ya bụ́ Neomi n’ahụ́ kama ịhapụ ya mgbe o mere agadi. Rut so ya laa n’Izrel, bụ́ ebe ọ ga-enwe ike ịna-efe ezi Chineke. (Rut 1:16, 17) Rut kwụwara aka ọtọ, na-arụsikwa ọrụ ike n’Izrel. Ọ gbasiri mbọ ike n’ịtụtụkọrọ ihe e wefọrọ n’ubi otú ahụ e kwuru n’Iwu Chineke nyere ndị Izrel. Jehova ahapụghị Rut na Neomi otú ahụ ọ na-ahapụghịkwa Devid mgbe ọtụtụ afọ gachara. (Rut 2:2-18) Ma, cheta na ihe Jehova meere Rut abụghị naanị igboro ya mkpa ya. Ọ họọrọ ya ka o soro ná ndị bụ́ nne ochie Eze Devid na Mesaya e kwere ná nkwa.—Rut 4:13-17; Mat. 1:5, 16.

O nwere ike ịna-esiri ụfọdụ ndị ohu Jehova ike ịkpata ego ga-ezuru ha igbo mkpa ha. Kama imewe ihe ha ma na ọ dịghị mma  iji kpata ego, ha na-arụsi ọrụ ike. Ha na-esi otú ahụ egosi na ha ji ịkwụwa aka ọtọ na àgwà ndị ọzọ dị́ Chineke mma kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike inye ha.—Ilu 12:24; Efe. 4:28.

Ndị Kraịst n’ụwa niile emeela otú ahụ Rut mere n’oge ochie. Ha egosila na ha nwere okwukwe na Jehova ga-enyere ha aka. Ha tụkwasịrị obi ha niile n’Onye ahụ kwere nkwa n’Okwu ya bụ́ Baịbụl, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” (Hib. 13:5) Jehova egosila ọtụtụ ugboro na ọ bụrụ na anyị na-akwụwa aka ọtọ mgbe niile n’agbanyeghị na ihe na-esiri anyị ike, na ya ga-enyeliri anyị aka nakwa na ya ga-eme otú ahụ. Ọ na-emezu nkwa ahụ o kwere na ya ga na-egboro ndị na-efe ya mkpa ha.—Mat. 6:33.

N’eziokwu, ndị mmadụ nwere ike iji dayamọnd na ihe ndị ọzọ a na-ahụ anya kpọrọ ihe. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na otú anyị si akwụwa aka ọtọ ma na-eṅomi àgwà Jehova ndị ọzọ bara uru n’anya ya karịa dayamọnd na ihe ndị ọzọ na-ada oké ọnụ.

Ịkwụwa aka ọtọ na-eme ka anyị nwee akọnuche dị́ ọcha, na-emekwa ka ọnụ kaa anyị izi ndị mmadụ ozi ọma