Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2016

Ị̀ Na-ekwe Ka Jehova Kpụzie Gị?

Ị̀ Na-ekwe Ka Jehova Kpụzie Gị?

“Lee! Dị ka ụrọ ọkpụite ji n’aka, otú ahụ ka unu dị n’aka m.”—JERE. 18:6.

ABỤ: 60, 22

1, 2. Gịnị mere Chineke ji were Daniel ka “nwoke a hụrụ n’anya nke ukwuu,” oleekwa otú anyị nwere ike isi na-erube isi otú ahụ o rubere?

MGBE a dọọrọ ndị Juu n’agha laa Babịlọn, ha hụrụ na obodo ahụ jupụtara n’arụsị na ndị na-efe ndị mmụọ ọjọọ. Ma ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi, dị́ ka Daniel na ndị enyi ya atọ, ekweghị ka ndị Babịlọn mee ka ha mewe ihe ọjọọ. (Dan. 1:6, 8, 12; 3:16-18) Daniel na ndị enyi ya kpebisiri ike na ọ bụ naanị Jehova ka ha ga-efe nakwa na ọ bụ ya ga-akpụzi ha. Ha mekwara otú ahụ. N’agbanyeghị na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na Daniel biri ndụ ya niile na Babịlọn, mmụọ ozi Chineke kwuru na ọ bụ “nwoke a hụrụ n’anya nke ukwuu.”—Dan. 10:11, 19.

2 N’oge ochie, ọkpụite nwere ike itinye ụrọ n’ihe e ji akpụ ihe ka o nwee ike ịkpụ ihe yiri ihe ahụ. Ndị ohu Jehova taa ma na ọ bụ ya bụ Ọkaakaa Eluigwe na Ụwa, nakwa na ọ bụ ya nwere ikike ịkpụzi ndị mmadụ na mba dị́ iche iche. (Gụọ Jeremaya 18:6.) Chineke nwekwara ikike ịkpụzi onye ọ bụla n’ime anyị. Ma, ọ na-ahapụ anyị ka anyị jiri aka anyị kpebie ihe anyị ga-eme, ọ chọkwara ka anyị jiri obi anyị niile na-erubere ya isi. N’isiokwu a, anyị ga-amụta otú anyị ga-esi dị́ ka ụrọ na-ekwe ọkpụkpụ. Anyị ga-aza ajụjụ atọ. (1) Olee àgwà ndị nwere ike ime ka anyị ghara ịnabata ndụmọdụ Jehova na-enye anyị? (2) Olee otú anyị ga-esi nwee àgwà ndị ga-eme ka anyị na-erube isi ma dịrị ka ụrọ na-ekwe ọkpụkpụ? (3) Olee otú ndị  nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ga-esi na-erubere Chineke isi ma ha kpụziwa ụmụ ha?

ZERE ÀGWÀ NDỊ NWERE IKE IME KA OBI GỊ KPỌCHIE

3. Olee àgwà ọjọọ ndị nwere ike ime ka obi anyị kpọchie? Nye ihe atụ.

3 Ilu 4:23 sịrị: “Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị, n’ihi na ọ bụ na ya ka isi iyi nke ndụ si apụta.” Olee àgwà ọjọọ ndị anyị kwesịrị izere? Ụfọdụ n’ime ha bụ mpako, ịkpachara anya na-eme mmehie, na enweghị okwukwe. Àgwà ndị a nwere ike ime ka anyị nupụwa isi, dịwakwa isi ike. (Dan. 5:1, 20; Hib. 3:13, 18, 19) Ọ bụ ihe mere Ọzaya eze Juda. (Gụọ 2 Ihe E Mere 26:3-5, 16-21.) Mgbe Ọzaya malitere ịbụ eze, ọ nọ “na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova,” ‘na-achọkwa Chineke.’ Ma, ‘ozugbo o siri ike, obi ya adịzie mpako’ n’agbanyeghị na ọ bụ Chineke nyere ya ike. Ọ gbalịdịrị isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ụlọ nsọ, ihe ọ bụ naanị ndị nchụàjà sí n’agbụrụ Erọn kwesịrị ime. Mgbe ndị nchụàjà gwara ya na o kwesịghị ime ya, iwe were ya n’ihi mpako ya. Gịnị meziri ya? Jehova menyere ya ihere, ya abụrụzie onye ekpenta ruo mgbe ọ nwụrụ.—Ilu 16:18.

4, 5. Gịnị ka mpako nwere ike ime anyị ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya? Nye ihe atụ.

4 Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, mpako nwere ike ime ka anyị ‘chewe banyere onwe anyị karịa ka anyị kwesịrị iche,’ nke nwere ike ime ka anyị jụ ndụmọdụ sí n’Akwụkwọ Nsọ. (Rom 12:3; Ilu 29:1) Ụdị ihe ahụ mere otu okenye aha ya bụ Jim. O kwetaghị ihe ndị okenye ndị ọzọ kwuru gbasara otu okwu. Ọ sịrị: “Agwara m ụmụnna ndị ahụ na ihe ha mere adịghị mma, ma hapụ ha pụọ.” Mgbe ihe dị́ ka ọnwa isii gara, ọ gafere n’otu ọgbakọ dị́ nso. Ma, a họpụtaghị ya n’ebe ahụ ka ọ bụrụ okenye. O kwuru, sị: “Obi gbawara m. Otú m si bụrụ onye ezi omume n’anya onwe m megharịrị m anya. N’ihi ya, m si n’ọgbakọ pụọ.” Jim kwụsịrị ife Jehova ruo afọ iri. Ọ sịrị: “M weere ya na a kparịala m, mụ atawa Jehova ụta maka ihe merenụ. N’afọ ndị ahụ, ụmụnna bịara n’ụlọ m, na-agbalị inyere m aka. Ma, ekweghị m ege ha ntị.”

5 Ihe nwanna a mere na-egosi otú mpako nwere ike isi mee ka anyị kwuwe na ihe ọjọọ anyị mere dị mma, nke ga-eme ka anyị dị́ ka ụrọ na-ekweghị ọkpụkpụ. (Jere. 17:9) Ọ sịrị: “Ihe m nọ na-eche mgbe niile bụ otú ndị okenye ndị ọzọ si mejọọ ihe.” È nwetụla mgbe iwe were gị n’ihi ihe nwanna mere gị ma ọ bụ n’ihi na a napụrụ gị ihe ùgwù ije ozi? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka i mere? Ò mere ka ị dịzie mpako? Ka ihe kacha gị mkpa ọ̀ bụ ka gị na nwanna gị mee udo nakwa ka ị na-erubere Jehova isi?—Gụọ Abụ Ọma 119:165; Ndị Kọlọsi 3:13.

6. Olee ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị akpachara anya na-eme mmehie?

6 Ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya na-eme mmehie, ma eleghị anya na-emedị ya na nzuzo, o nwere ike ime ka o siere ya ike ịnabata ndụmọdụ sí n’aka Chineke. O nwere ike ịna-adịziri ya mfe ime mmehie. Otu nwanna kwuru na ya megidere omume ọjọọ ruo mgbe ọ na-anaghịzi ewute ya. (Ekli. 8:11) Nwanna ọzọ nke na-ele ndị gba ọtọ mechara kwuo, sị: “M maliteziri ịna-akatọ ndị okenye.” Ile ndị gba ọtọ mere ka ya na Jehova ghara ịdị ná mma. E mechara mata ihe ahụ ọ na-eme, ndị okenye enyere ya aka. O doro anya na anyị niile ezughị okè. Ma, anyị katọwa ụmụnna anyị ma ọ bụ kwuwe na ihe ọjọọ anyị na-eme adịghị njọ kama ịrịọ Chineke ka ọ gbaghara anyị ma nyere anyị aka, o nwere ike ịbụ na obi anyị amalitela ịkpọchi.

7, 8. (a) Olee otú ndị Izrel si gosi na enweghị okwukwe na-eme ka obi mmadụ kpọchie? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ ha mere?

 7 Ihe ndị Izrel Jehova napụtara n’aka ndị Ijipt mere na-eme ka anyị mata otú enweghị okwukwe nwere ike isi mee ka obi mmadụ kpọchie. Ha ji anya ha hụ ọtụtụ ọrụ ebube Chineke rụụrụ ha. Ụfọdụ ọrụ ebube ndị ahụ dị egwu. Ma, mgbe ha rutewere Ala Nkwa ahụ, ha gosiri na ha enweghị okwukwe. Kama ịtụkwasị Jehova obi, ha malitere ịtụ ụjọ, tamuwekwa ntamu megide Mozis. Ha chọwadịrị ịlaghachi n’Ijipt, bụ́ ebe ha bụbu ndị ohu. O wutere Jehova nke ukwuu, ya asị: “Ruo ole mgbe ka ndị a ga na-akparị m.” (Ọnụ Ọgụ. 14:1-4, 11; Ọma 78:40, 41) N’ihi enweghị okwukwe na otú obi si kpọọ ọgbọ ahụ nkụ, ha niile nwụrụ n’ala ịkpa.

8 Ugbu a ọ fọrọ obere ka anyị banye n’ụwa ọhụrụ, ihe ndị na-eme ga-egosi ma ànyị nwere okwukwe. Anyị kwesịrị ịchọpụta ma okwukwe anyị ò sikwara ike. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ileru onwe anyị anya ma mata otú anyị si ele ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:33 anya. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe ndị m weere ka ihe kacha mkpa na ihe ndị m na-ekpebi ime hà na-egosi na m kwetara ihe ahụ Jizọs kwuru? M̀ ga-ekpebi ịhapụ ịga ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma n’ihi na m chọrọ ịkpatakwu ego? Gịnị ka m ga-eme ma ọ bụrụ na onye m na-arụrụ ọrụ agwa m ka m tinyekwuo oge m na ike m n’ọrụ m? M̀ ga-ekwe ka ụwa a na-agwa m ihe m ga-eme, ma ọ bụdị mee ka m kwụsị ife Jehova?’

9. Gịnị mere anyị ji kwesị ‘ịna-anwale ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ’? Olee otú anyị nwere ike isi mee ya?

9 Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ. Chegodị banyere onye na-efe Jehova nke na-anaghị emecha ihe Baịbụl kwuru. O nwere ike ịbụ ihe gbasara ndị ya na ha na-akpa, onye a chụrụ n’ọgbakọ, ma ọ bụ ntụrụndụ. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ò nwere ike ịbụ na m na-eme otú ahụ?’ Anyị chọpụta na obi anyị amalitela ịkpọchi, anyị kwesịrị inyocha okwukwe anyị ozugbo. Baịbụl dụrụ anyị ọdụ, sị: “Na-anwalenụ ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ, na-anwapụtanụ ihe unu onwe unu bụ.” (2 Kọr. 13:5) Anyị kwesịrị ịna-eme, anyị nọtụ, anyị ejiri Okwu Chineke leruo onwe anyị anya ma gwa onwe anyị eziokwu.

DỊRỊ KA ỤRỌ NA-EKWE ỌKPỤKPỤ

10. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịdị ka ụrọ na-ekwe ọkpụkpụ n’aka Jehova?

10 Chineke chọrọ ka anyị dịrị ka ụrọ na-ekwe ọkpụkpụ. Ọ bụ ya mere o ji nye anyị Okwu ya bụ́ Baịbụl, mee ka anyị nọrọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, na-agakwa ozi ọma. Otú ahụ mmiri si eme ka ụrọ na-ekwe ọkpụkpụ ka ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị na ịtụgharị uche na ya ga-esi nyere anyị aka ikwe ka Jehova na-akpụzi anyị. Jehova gwara ndị eze Izrel ka ha jiri aka ha depụta Iwu ya ma na-agụ ya kwa ụbọchị. (Diut. 17:18, 19) Ndịozi Jizọs ghọtara na ịgụ Akwụkwọ Nsọ na ịtụgharị uche na ya ga-abara ha uru n’ozi ọma ha na-ekwusa. N’ihe ndị ha dere, ha kwughachiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ọtụtụ ugboro, gwakwa ndị ha ziri ozi ọma ka ha na-eme otú ahụ. (Ọrụ 17:11) Taa, anyị ahụla na ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị na ịtụgharị uche na ya dị ezigbo mkpa. (1 Tim. 4:15) Ime otú ahụ na-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi ma kwe ka Jehova na-akpụzi anyị.

Gbasie mbọ ike ka ndokwa ndị Chineke mere na-enyere gị aka ịdị ka ụrọ na-ekwe ọkpụkpụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo na nke 13)

11, 12. Olee otú Jehova nwere ike isi jiri ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpụzi anyị otú na-egosi na ọ ma ihe bụ́ mkpa onye ọ bụla n’ime anyị? Nye ihe atụ.

11 Jehova ma ihe bụ́ mkpa onye ọ bụla n’ime anyị, ọ na-ejikwa ọgbakọ Ndị Kraịst akpụzi anyị. Otu okenye mechara kpawa nwanna ahụ aha ya bụ Jim nso,  iwe ya adajụwa. Jim kwuru, sị: “O nweghị mgbe ọ tara m ụta maka ihe m mere ma ọ bụ katọwa m. Kama ime otú ahụ, obi siri ya ike na m ga-alọghachi n’ọgbakọ. O gosikwara m na o ji obi ya niile chọọ inyere m aka.” Mgbe ihe dị́ ka ọnwa atọ gara, okenye ahụ gwara Jim ka ọ bịa ọmụmụ ihe. Jim sịrị: “Ọgbakọ ji obi ụtọ nabata m. Ịhụnanya ha mere ka m gbanwee echiche m. M matara na ihe kacha mkpa abụghị otú obi dị m. N’afọ ndị ahụ niile, nwunye m akwụsịghị ife Jehova. Ya na ụmụnna ndị ọzọ nyeere m ezigbo aka, mụ ejiri nwayọọ nwayọọ malitekwa ife Jehova. Ihe ọzọ gbara m ume bụ isiokwu abụọ bụ́ ‘Ụta Adịghịrị Jehova’ na ‘Jiri Ịnọgidesi Ike n’Ihe Jeere Jehova Ozi,’ ndị gbara n’Ụlọ Nche November 15, 1992.”

12 Jim mechara bụrụkwa okenye. Kemgbe ahụ, o nyerela ụmụnna ndị ọzọ aka imeri ụdị nsogbu ahụ ma mee ka okwukwe ha sikwuo ike. O kwuru, sị: “Echeburu m na mụ na Jehova dị n’ezigbo mma, ma otu abụghị n’ezi. Ọ na-ewute m na m kwere ka mpako mee ka m ghara ilekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa, meekwa ka ihe ndị ọzọ mejọrọ na-echu m ụra.”—1 Kọr. 10:12.

13. Olee àgwà ọma ozi ọma anyị na-ekwusa nwere ike inyere anyị aka ịna-akpa, oleekwa uru ọ ga-aba?

13 Olee otú ịga ozi ọma nwere ike isi mee ka àgwà anyị ka mma? Izi ndị ọzọ ozi ọma nwere ike inyere anyị aka ịmụta ịdị umeala n’obi nakwa àgwà ndị só ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22, 23) Chegodị banyere àgwà ọma ndị ịga ozi ọma nyeere gị aka ka ị na-akpa. Ka anyị na-eṅomikwa Kraịst, anyị na-achọ ozi ọma anyị mma, nke nwere ike ime ka ụfọdụ ndị nabata ya. Dị ka ihe atụ, ụmụnna abụọ bí n’Ọstrelia gara izi otu nwaanyị ozi ọma n’ụlọ ya. Ma ezigbo iwe were ya, ya agwawa ha okwu ọjọọ. Ma ha gere ya ntị n’akparịghị ya. Nwaanyị ahụ mechara  kwaa mmakwara, degara alaka ụlọ ọrụ anyị akwụkwọ ozi, sị: ‘Mmadụ abụọ ahụ bịara n’ụlọ m nwere ndidi, dịkwa obi umeala. M chọrọ ịrịọ ha mgbaghara maka otú m si bụrụ onye ezi omume n’anya onwe m, dịrịkwa mpako. Iberiibe m dara mere ka m lechaa ndị bịara ịgwa m Okwu Chineke sí otú ahụ chụpụ ha.’ Nwaanyị ahụ ọ̀ gaara ede ụdị ihe ahụ ma a sị na ụmụnna ndị ahụ mere ihe ọ bụla gosiri na iwe na-ewe ha? O nwere ike ọ gaaraghị ede ya. O doro anya na ozi ọma anyị na-abara ma anyịnwa ma ndị agbata obi anyị uru.

NA-ERUBERE CHINEKE ISI MGBE Ị NA-AKPỤZI ỤMỤ GỊ

14. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịna-akpụzi ụmụ ha nke ọma?

14 Ọtụtụ ụmụaka na-adị umeala n’obi, na-achọsikwa ike ịmụta ihe. (Mat. 18:1-4) N’ihi ya, ndị nne na nna má ihe na-agbalịsi ike ka ụmụ ha mụta eziokwu Baịbụl ma jiri ya kpọrọ ihe mgbe ha ka dị obere. (2 Tim. 3:14, 15) N’eziokwu, ọ bụrụ na ndị nne na nna chọrọ ka ụmụ ha mụta ihe ha na-akụziri ha, hanwa kwesịrị ibu ụzọ mee ka eziokwu Baịbụl dịrị n’obi ha, ha ana-emekwa ihe ha na-akụziri ụmụ ha. Ha mee otú ahụ, ọ bụghị naanị na ụmụ ha ga na-anụ eziokwu Baịbụl ha na-akụziri ha, kamakwa ha ga na-ahụ otú ha si eme ya. Ha ga-aghọtakwa na ihe mere nne ha na nna ha ji na-adọ ha aka ná ntị bụ na ha hụrụ ha n’anya otú ahụ Jehova hụrụ ha.

15, 16. Olee otú ndị nne na nna kwesịrị isi gosi na ha tụkwasịrị Chineke obi ma a chụọ nwa ha n’ọgbakọ?

15 Ma, n’agbanyeghị otú e si kụziere ụmụaka eziokwu Baịbụl, ụfọdụ n’ime ha na-emecha hapụ ọgbakọ ma ọ bụdị a chụọ ha n’ọgbakọ. Ọ na-emekwa ka obi gbawaa ndị ezinụlọ ha. Otu nwanna nwaanyị bí na Saụt Afrịka sịrị: “Mgbe a chụrụ nwanne m n’ọgbakọ, ọ dị m ka ọ̀ nwụọla. Obi gbawara anyị.” Gịnị ka ya na nne ya na nna ya mere? Ha mere ihe Baịbụl kwuru ka e mee. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 5:11, 13.) Papa ya na mama ya sịrị: “Anyị kpebiri ime ihe Baịbụl kwuru n’ihi na anyị ma na ọ bụ ime ihe Chineke chọrọ ga-akacha baa uru. Anyị ghọtara na ịchụ mmadụ n’ọgbakọ bụ ịdọ aka ná ntị sí n’aka Jehova. Obi sikwara anyị ike na Jehova na-adọ mmadụ aka ná ntị otú kwesịrị ekwesị nakwa iji gosi na ọ hụrụ onye ahụ n’anya. N’ihi ya, naanị ihe anyị na ya na-emekọ bụ ihe dị́ mkpa gbasara ezinụlọ anyị.”

16 Olee otú obi dị nwa ha ahụ? O mechara kwuo, sị: “Ama m na ndị ezinụlọ anyị akpọghị m asị, kama ha na-erubere Jehova na nzukọ ya isi.” Ọ sịkwara: “Mmadụ chọpụta na naanị ihe ga-abara ya uru bụ ịrịọ Jehova ka o nyere ya aka ma gbaghara ya, ọ ga-aghọta na Jehova dị ya ezigbo mkpa.” Chegodị ụdị ọṅụ ezinụlọ a nwere mgbe a nabatara nwa okorobịa ahụ n’ọgbakọ. N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị egee Chineke ntị n’ihe niile anyị na-eme, ọ ga-abara anyị ezigbo uru.—Ilu 3:5, 6; 28:26.

17. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-erubere Jehova isi mgbe niile? Olee uru anyị ga-erite ma anyị mee otú ahụ?

17 Aịzaya buru amụma na ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn ga-emecha chegharịa ma kwuo, sị: “Jehova, ị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ọ bụ gị kpụrụ anyị; anyị niile bụkwa ọrụ aka gị.” Ha ga-arịọkwa ya, sị: “Echetala njehie anyị ruo mgbe ebighị ebi. Biko, leenụ: anyị niile bụ ndị gị.” (Aịza. 64:8, 9) Ọ bụrụ na anyị eweda onwe anyị ala ma na-erubere Jehova isi mgbe niile, ọ ga-ahụ anyị n’anya nke ukwuu otú ahụ ọ hụrụ Daniel onye amụma. Jehova ga-ejikwa Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na nzukọ ya na-akpụzi anyị ka anyị nwee ike ịbụ ‘ụmụ ya’ zuru okè n’ọdịnihu.—Rom 8:21.