Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2016

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Gịnị mere Jehova ji kwado agha ndị Izrel lụrụ n’oge ochie?

Jehova hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ma, mgbe ndị ọjọọ chọrọ imemila ndị Izrel, ọ gwara ndị Izrel ka ha buso ha agha. Ọ bụ naanị ya kpebiri ndị ga-aga agha na mgbe a ga-alụ ya.—w15 11/1, peeji nke 4-5.

Olee ihe ndị dị́ mkpa ndị nne na nna ga-eme iji zụọ ụmụ ha ka ha na-efe Jehova?

Ọ dị mkpa ka ndị nne na nna hụ ụmụ ha n’anya ma sí n’omume ha na-akụziri ha ịdị umeala n’obi. Ọ dịkwa mkpa ka ha na-egosi na ha nwere nghọta, na-agbalịsikwa ike ịghọta ụmụ ha.—w15 11/15, peeji nke 9-11.

Gịnị mere na e kwesịghị iche na poopu nọchiri anya Pita?

Matiu 16:17, 18 ekwughị na ọ bụ Pita onyeozi ga-abụ onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst. Kama ikwu na ọ bụ Pita ka Jizọs mere onyeisi, Baịbụl kwuru na ọ bụ Jizọs bụ nkume e ji tọọ ntọala ọgbakọ ya. (1 Pita 2:4-8)—w15 12/1, peeji nke 12-14.

Olee ihe ndị anyị kwesịrị ichebara echiche tupu anyị ekwuo okwu?

Ọ bụrụ na anyị chọrọ iji ire anyị na-ekwu ihe dị́ mma, ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’obi bụ (1) mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu (Ekli. 3:7), (2) ihe anyị kwesịrị ikwu (Ilu 12:18), na (3) otú anyị kwesịrị isi na-ekwu okwu (Ilu 25:15).—w15 12/15, peeji nke 19-22.

Olee ihe ụfọdụ bụ́ akwụwaghị aka ọtọ Ndị Kraịst na-anaghị eme?

Ezigbo Ndị Kraịst anaghị aghara ndị ọzọ ụgha, ha anaghịkwa ekwutọ ndị ọzọ. Ha anaghị agha ụgha ma ọ bụ kwuo ihe na-abụghị eziokwu iji mebie aha mmadụ, ha anaghịkwa aghọgbu mmadụ ma ọ bụ zuo ya ohi.—wp16.1, peeji nke 5.

Ole ndị bụ “ndị isi nchụàjà” e kwuru okwu ha na Baịbụl?

Ndị só ná “ndị isi nchụàjà” bụ ndị nọ́ n’isi n’ezinụlọ ndị nchụàjà. Ụfọdụ n’ime ha bụ nnukwu ndị nchụàjà a chụpụrụ n’ọrụ ịchụàjà.—wp16.1, peeji nke 10.

Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs?

Ndị Kraịst anaghị ebuli ha elu. Onye e tere mmanụ n’eziokwu agaghị achọ ka a na-ebuli ya elu; ọ gaghịkwa achọ ịmara ụwa niile ọkwa na Chineke eteela ya mmanụ. (Mat. 23:8-12)—w16.01, peeji nke 21-23.

Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’otú Ebreham si ghọọ enyi Chineke?

Ebreham mụtara banyere Chineke. O nwere ike ịbụ na o si n’aka Shem mụta ya. Ebreham si n’ihe Chineke meere ya na ezinụlọ ya mụta banyere Chineke. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị mee otú ahụ.—w16.02, peeji nke 4-6.

Ònye tinyere isiakwụkwọ na amaokwu ndị dị́ na Baịbụl?

Ọ bụ otu ụkọchukwu aha ya bụ Stephen Langton kerisịrị Baịbụl n’isi n’isi n’ihe dị́ ka n’afọ 1205. Ndị Juu bụ́ ọkà n’idepụta ihe bu ụzọ kerisịa Akwụkwọ Nsọ Hibru n’amaokwu n’amaokwu. N’ihe dị ka narị afọ anọ na iri isii gara aga, otu ọkà mmụta aha ya bụ Robert Estienne kerisịkwara Akwụkwọ Nsọ Grik n’amaokwu n’amaokwu.—wp16.2, peeji nke 14-15.

Mgbe Setan nwara Jizọs ọnwụnwa, ọ̀ kpọọrọ ya gaa n’ụlọ nsọ ka ọ̀ bụ n’ọhụụ ka o gosiri ya ụlọ nsọ ahụ?

Anyị amaghị kpọmkwem. Matiu 4:5 na Luk 4:9 nwere ike ịpụta na ọ bụ n’ọhụụ ka a kpọ Jizọs gaa ebe ahụ ma ọ bụ na o guzoro n’otu ebe dị́ elu n’ụlọ nsọ ahụ.—w16.03, peeji nke 31-32.

Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa nwere ike isi dị́ ka igirigi?

Igirigi na-ada nwayọọ nwayọọ, na-eme ka ahụ́ ruo ndị mmadụ ala, na-emekwa ka ihe a kụrụ akụ dị́ ndụ. Igirigi bụ ngọzi sí n’aka Chineke. (Diut. 33:13) Otú ahụ ka mbọ niile ndị ohu Chineke na-agba n’ozi ọma dị.—w16.04, peeji nke 32.