Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jun 2016

Ekwela Ka Ihe Ndị Ọzọ Na-emejọ Mee Ka Ị Sụọ Ngọngọ

Ekwela Ka Ihe Ndị Ọzọ Na-emejọ Mee Ka Ị Sụọ Ngọngọ

“Na-agbaghara ibe unu kpamkpam.”—KỌL. 3:13.

ABỤ: 121, 75

1, 2. Olee otú Baịbụl si buo amụma na ndị Jehova ga-adịkwu ọtụtụ?

NZUKỌ Jehova pụrụ ezigbo iche. Ndị nọ́ na ya bụ Ndịàmà ya jí obi ha niile na-efe ya n’ụwa niile. Ọ bụ eziokwu na ha niile ezughị okè, na-emejọkwa ihe, ma mmụọ nsọ Chineke na-eme ka ọgbakọ ya zuru ụwa ọnụ na-amụba ma na-aga n’ihu. Chegodị banyere ụfọdụ n’ime ihe dị́ egwu Jehova jirila ndị ya rụọ n’agbanyeghị na ha ezughị okè.

2 Mgbe oge ikpeazụ malitere n’afọ 1914, ndị ohu Chineke nọ́ n’ụwa ebughị ibu. Ma Jehova gọziri ozi ọma ha nọ na-ekwusa. Kemgbe ọtụtụ afọ, ọtụtụ nde mmadụ amụtala eziokwu Baịbụl, ghọọkwa Ndịàmà Jehova. Jehova kwuru na ụdị ihe a ga-eme. Ọ sịrị: “Onye nta ga-aghọ otu puku mmadụ, onye kasị nta ga-aghọkwa mba dị ike. Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka o mezuo ọsọ ọsọ n’oge ya.” (Aịza. 60:22) Amụma a na-emezu n’oge ikpeazụ a. N’eziokwu, e nwere ọtụtụ mba ndị bí na nke ọ bụla n’ime ha na-aharughị ka mmadụ ole bụ́ ndị Jehova n’ụwa niile.

3. Olee otú ndị ohu Chineke sirila gosi na ha hụrụ ndị mmadụ n’anya?

3 N’oge anyị a, Jehova enyerela ndị ya aka ịmụta ịhụ ibe ha n’anya n’ihi na ịhụnanya bụ àgwà ya bụ́ isi. (1 Jọn 4:8)  Jizọs ṅomiri ịhụnanya Chineke ma gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya . . . Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị Jehova egosila na ha hụrụ ibe ha n’anya mgbe mba dị́ iche iche lụrụ agha. Dị ka ihe atụ, e gburu ihe dị́ ka nde mmadụ iri ise na ise naanị n’Agha Ụwa nke Abụọ. Ma, Ndịàmà Jehova etinyeghị aka n’agha ahụ tara isi ọtụtụ ndị n’ụwa niile. (Gụọ Maịka 4:1, 3.) O meela ka ‘aka ha dị ọcha n’ebe ọbara mmadụ niile dị.’—Ọrụ 20:26.

4. Gịnị mere otú ndị ohu Jehova si na-amụba ji pụọ iche?

4 Ndị Chineke na-enwe ọganihu n’ụwa kpọrọ ha asị, nke Baịbụl kwuru na ọ bụ Setan, bụ́ “chi nke usoro ihe a,” na-achị ya. (2 Kọr. 4:4) Ndị ọchịchị ụwa na usoro mgbasa ozi ha dị n’aka ya. Ọ na-ejikwa ha agba mbọ ka ọ kwụsị ozi ọma anyị na-ekwusa. Ma, ọ gaghị akwụsịli ya. Setan ma na oge fọọrọ ya dịzi obere. Ọ bụ ya mere o ji esi n’ụzọ dị́ iche iche agbalịsi ike ka anyị kwụsị ife Jehova.—Mkpu. 12:12.

IHE GA-EGOSI MA Ị̀ NA-ERUBERE JEHOVA ISI

5. Gịnị mere ndị ọzọ nwere ike iji mee ihe ga-ewute anyị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

5 Ọgbakọ Ndị Kraịst ghọtara na ịhụ Chineke na ndị mmadụ ibe anyị n’anya dị ezigbo mkpa. Ihe Jizọs kwuru gosiri na ọ ga-adị otú ahụ. Mgbe ọ na-aza ajụjụ a jụrụ ya banyere iwu kachanụ, ọ sịrị: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ. Nke abụọ, nke dị ka ya, bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’” (Mat. 22:35-39) Ma, Baịbụl mere ka o doo anya na n’ihi mmehie Adam, anyị niile bu ezughị okè pụta ụwa. (Gụọ Ndị Rom 5:12, 19.) N’ihi ya, ụfọdụ ndị nọ́ n’ọgbakọ nwere ike ikwu ma ọ bụ mee ihe ga-ewute anyị. Ụdị ihe a nwere ike ime ka a mata ma ànyị hụrụ Jehova na ndị na-efe ya n’anya. Gịnị ka anyị ga-eme ma ụdị ihe a mee? Ndị fere Chineke n’oge ochie kwuru ma ọ bụ mee ihe wutere ndị ọzọ. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ha mere.

Gịnị ka ị gaara eme ma a sị na i bi n’Izrel n’oge Ilaị na ụmụ ya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6. Olee otú o si bụrụ na Ilaị adọghị ụmụ ya aka ná ntị?

6 Dị ka ihe atụ, Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ilaị nwere ụmụ abụọ na-anaghị erubere iwu Jehova isi. Baịbụl kwuru, sị: “Ụmụ Ilaị bụ ndị ikom na-abaghị n’ihe; ha amaghị Jehova.” (1 Sam. 2:12) N’agbanyeghị na nna ha nọ na-agbalịsi ike ịkwado ofufe Jehova, ụmụ ya abụọ nọ na-eme mmehie ndị jọgburu onwe ha. Ilaị ma ihe ha nọ na-eme, o kwesịkwara ịdọ ha aka ná ntị, ma o meghị ihe o kwesịrị ime. Ọ bụ ya mere Chineke ji maa ezinụlọ Ilaị ikpe. (1 Sam. 3:10-14) Ka oge na-aga, Jehova ekweghịzi ka ndị sí n’ezinụlọ Ilaị bụrụ nnukwu ndị nchụàjà. Gịnị ka ị gaara eme ma a sị na ị nọ n’oge Ilaị, hụ ka ụmụ ya na-eme ihe ọjọọ niile ahụ, ya agbachi ha nkịtị? Ọ̀ gaara eme ka ị sụọ ngọngọ ma kwụsị ife Chineke?

7. Olee mmehie jọgburu onwe ya Devid mere, gịnịkwa ka Chineke mere banyere ya?

7 Jehova hụrụ Devid n’anya. Ọ kpọrọ ya “nwoke obi ya nabatara.” (1 Sam. 13:13, 14; Ọrụ 13:22) Ma, Devid na Bat-shiba mechara kwaa iko, nwaanyị ahụ adị ime. N’oge ahụ, di ya Yuraya nọ n’ebe ha na-alụ agha. Mgbe ọ lọrutere ụlọ, Devid  mere ihe niile o nwere ike ime ka Yuraya na nwunye ya Bat-shiba nwee mmekọahụ ka ọ dịzie ka ọ̀ bụ Yuraya tụwara nwunye ya ime. Yuraya ekweghị eme ihe eze gwara ya. N’ihi ya, Devid kpara nkata ka e gbuo ya n’agha. Devid hụsiri anya maka ihe ọjọọ ahụ o mere. Nsogbu si n’elu sí n’ala bịara ya na ezinụlọ ya. (2 Sam. 12:9-12) Ma, Chineke meere ya ebere n’ihi otú o si jiri obi ya niile na-eme ihe ziri ezi n’anya ya. (1 Eze 9:4) A sị na ị nọ mgbe ahụ, gịnị ka ị gaara eme? Ihe ọjọọ ahụ Devid mere ọ̀ gaara eme ka ị sụọ ngọngọ?

8. (a) Olee otú Pita onyeozi si kwuo ihe ọzọ, mee ihe ọzọ? (b) Mgbe Pita mejọchara, gịnị mere Jehova ji ka jiri ya na-arụ ọrụ?

8 Onye ọzọ Baịbụl kọrọ akụkọ ya bụ Pita onyeozi. Jizọs họọrọ ya ka o soro ná ndịozi ya. Ma, mgbe ụfọdụ, Pita kwuru ma ọ bụ mee ihe o mechara kwaara mmakwara. Dị ka ihe atụ, mgbe ihe siri ezigbo ike, ndịozi Jizọs hapụrụ ya gbaa ọsọ. Pita ebula ụzọ kwuo na ya agaghị ahapụ Jizọs ọ bụrụgodị na ndị ọzọ ahapụ ya. (Mak 14:27-31, 50) Ma, mgbe a nwụchiri Jizọs, ndịozi ya niile hapụrụ ya gbaa ọsọ, ma Pita. Pita gọnahụrụ Jizọs ugboro ugboro. (Mak 14:53, 54, 66-72) Ma, Pita kwara ụta, Jehova ejirikwa ya ka na-arụ ọrụ. A sị na ị bụ onye na-eso ụzọ Jizọs mgbe ahụ, ihe ahụ Pita mere ọ̀ gaara eme ka ị kwụsị irubere Jehova isi?

9. Gịnị mere obi ji sie gị ike na Chineke na-eme ihe ziri ezi mgbe niile?

9 Ndị a anyị kwuru banyere ha bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ndị mere ihe wutere ndị ọzọ. E nwere ọtụtụ ndị ọzọ bụ́ ndị ohu Jehova mere ihe ọjọọ wutere ndị ọzọ, ma n’oge gara aga ma n’oge anyị a. Ụdị ihe ahụ mee taa, gịnị ka ị ga-eme? Ihe ndị ọzọ mejọrọ ọ̀ ga-eme ka ị sụọ ngọngọ, hapụ Jehova na ndị ya, ma ndị nọ́ n’ọgbakọ unu? Ka ị̀ ga-aghọta na Jehova nwere ike icheretụ ka ndị mere ihe ọjọọ chegharịa nakwa na ọ ga-emecha mezie ihe ọ bụla e mebiri, meekwa ihe ziri ezi? Ma, mgbe ụfọdụ, ndị mere mmehie dị́ oké njọ anaghị achọ ka  Jehova meere ha ebere. Ha anaghị ekwe echegharị. Ụdị ihe a mee, obi ọ̀ ga-esi gị ike na Jehova ga-emecha kpee ndị ahụ mere ihe ọjọọ ikpe, ikekwe, chụọ ha n’ọgbakọ?

AHAPỤKWALA JEHOVA

10. Olee ihe Jizọs ghọtara banyere ihe Judas Iskarịọt na Pita mejọrọ?

10 Baịbụl kọrọ banyere ọtụtụ ndị ohu Chineke na-ahapụghị Jehova na ndị ya n’agbanyeghị ihe ọjọọ ndị ọzọ mere. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs ji otu abalị kpegara Nna ya ekpere, ọ họọrọ ndịozi iri na abụọ. Judas Iskarịọt bụ otu n’ime ha. Mgbe Judas mechara rara Jizọs nye n’aka ndị iro ya, Jizọs ekweghị ka ihe ahụ Judas mere mee ka ya na Nna ya, bụ́ Jehova, ghara ịdị ná mma. O kweghịkwa ka ngọnahụ Pita gọnahụrụ ya mee ka o mee otú ahụ. (Luk 6:12-16; 22:2-6, 31, 32) Jizọs ma na ọ bụghị Jehova ma ọ bụ ndị ya ka e kwesịrị ịta ụta maka ihe ahụ Judas Iskarịọt na Pita mere. Ọ ka nọkwa na-arụ ọrụ magburu onwe ya ọ na-arụ n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya mere ihe wutere ya. Jehova gọziri ya ma kpọlite ya n’ọnwụ, mechaa mee ka ọ bụrụ Eze ga-achị n’Alaeze ya n’eluigwe.—Mat. 28:7, 18-20.

11. Gịnị ka Baịbụl buru n’amụma banyere ndị ohu Jehova taa?

11 E nwere ezigbo ihe mere Jizọs ji tụkwasị Jehova na ndị ya obi. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. N’eziokwu, anyị chee echiche nke ọma, anyị ga-aghọta na ihe Jehova si n’aka ndị ohu ya na-arụ n’oge ikpeazụ a dị egwu. E nweghị ndị ọzọ na-ekwusa eziokwu Baịbụl n’ụwa niile, n’ihi na e nweghị ndị ọzọ Jehova na-eduzi otú o si eduzi ọgbakọ ya dị́ n’otu taa. Aịzaya 65:14 kwuru banyere ụdị obi ụtọ ha na-enwe ugbu a n’ihi ihe Chineke na-emere ha. Ọ sịrị: “Lee! Ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi na obi dị ha mma.”

12. Olee ihe anyị na-ekwesịghị ime ma ndị ọzọ mejọọ ihe?

12 Ndị ohu Jehova na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na Jehova na-eduzi ha ma na-enyere ha aka ime ọtụtụ ihe ọma. Ma, ndị nọ́ n’ụwa Setan na-eru uju ka nsogbu ụwa a na-aka njọ. Ọ ga-abụ ịda iberiibe ma mmadụ tawa Jehova ma ọ bụ ọgbakọ ya ụta maka ihe mmadụ ole na ole n’ime ndị na-efe Chineke mejọrọ. Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova na ndokwa ndị o mere obi, matakwa otú anyị kwesịrị isi na-ele ihe ndị ọzọ mejọrọ anya ma ọ bụ ihe anyị kwesịrị ime ma ụdị ihe ahụ mee.

IHE Ị GA-EME MA E MEJỌỌ GỊ

13, 14. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-enwere ibe anyị ndidi? (b) Olee nkwa anyị kwesịrị ịna-echeta?

13 Gịnịzi ka anyị kwesịrị ime ma nwanna kwuo ma ọ bụ mee ihe were anyị iwe? Baịbụl nyere anyị ndụmọdụ magburu onwe ya, sị: “Adịla ngwa ná mmụọ gị ịbụ onye a kpasuru iwe, n’ihi na iwe iwe bụ ihe na-adịgide n’obi ndị nzuzu.” (Ekli. 7:9) Anyị kwesịrị icheta na kemgbe Adam na Iv mehiechara n’Iden ihe dị́ ka puku afọ isii gara aga, ụmụ mmadụ bụzi ndị na-ezughị okè. Ndị na-ezughị okè na-emejọkarị ihe. N’ihi ya, ọ gaghị adị mma ka anyị tụwa anya ka ụmụnna anyị mee ihe ha na-agaghị emeli. Anyị ekwesịghịkwa ikwe ka ihe ha mejọrọ mee ka anyị ghara inwe ọṅụ anyị kwesịrị inwe n’ozi anyị na-ejere Chineke n’oge ikpeazụ a. Nke ga-akadị njọ bụ ikwe ka ihe ndị ọzọ mejọrọ mee ka anyị sụọ ngọngọ ma sí ná nzukọ Jehova pụọ. Anyị mee otú ahụ, ọ bụghị naanị na anyị agaghịzi enwe ihe ùgwù ịna-eme uche Chineke, kamakwa  anyị agaghịzi enwe olileanya ibi n’ụwa ọhụrụ Chineke.

14 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enwe ezigbo ọṅụ na olileanya siri ike, anyị kwesịrị ịna-echeta nkwa na-akasi obi Jehova kwere. Ọ sịrị: “Lee, m na-eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. A gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.” (Aịza. 65:17; 2 Pita 3:13) Ekwela ka ihe ndị ọzọ mejọrọ mee ka ị ghara inweta ihe ọma ndị a.

15. Gịnị ka Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ime ma ndị ọzọ mejọọ ihe?

15 Ma, ebe ọ bụ na anyị abanyebeghị n’ụwa ọhụrụ, anyị kwesịrị ịna-eche banyere ihe Chineke kwuru anyị kwesịrị ime ma ndị ọzọ kwuo ma ọ bụ mee ihe were anyị iwe. Dị ka ihe atụ, otu n’ime ihe anyị kwesịrị icheta bụ ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu na-agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu nke eluigwe ga na-agbagharakwa unu; ma ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu njehie unu.” Chetakwa na mgbe Pita jụrụ Jizọs ma ànyị kwesịrị ịgbaghara mmadụ “ruo ugboro asaa,” Jizọs sịrị ya: “Ana m asị gị, ọ bụghị, Ruo ugboro asaa, kama, Ruo ugboro iri asaa na asaa.” O doro anya na ihe Jizọs kwuru pụtara na anyị kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ mgbe niile. Ọ bụ ya bụ ihe mbụ anyị kwesịrị ịna-eme.—Mat. 6:14, 15; 18:21, 22.

16. Olee àgwà ọma Josef kpara?

16 Ihe Josef mere na-akụziri anyị ihe anyị kwesịrị ime ma ndị ọzọ mee ihe were anyị iwe. Ọ bụ naanị Josef na nwanne ya nke ọ tọrọ ka Rechel mụtaara Jekọb. Jekọb mụrụ ụmụ nwoke iri ndị ọzọ, ma ọ hụrụ Josef n’anya karịa ha niile. Ọ bụ ya mere ha ji nwewere ya anyaụfụ. Asị ha kpọrọ ya mere ka ha ree ya ka ọ gaa gbawa ohu. Mgbe ọtụtụ afọ gara, ihe ọma Josef mere n’Ijipt mere ka ọ bụrụ osote eze Ijipt. Mgbe ụnwụ dara n’ala ahụ, ụmụnne Josef bịara ịzụrụ nri n’Ijipt, ma ha amataghịzi Josef. A sị na Josef chọrọ, ọ gaara eji ikike o nwere megwara ụmụnne ya ihe ọjọọ niile ha mere ya. Kama ime otú ahụ, o lere ụmụnne ya ule ka ọ mata ma hà agbanweela. Mgbe Josef chọpụtara na ụmụnne ya agbanweela n’eziokwu, ọ gwara ha na ya bụ Josef. O mechara sị ha: “Unu atụla egwu. Mụ onwe m ga na-enye unu na ụmụntakịrị unu ihe oriri.” Baịbụl kwukwara, sị: “O wee si otú ahụ kasie ha obi wee gwa ha okwu mesiri ha obi ike.”—Jen. 50:21.

17. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ndị ọzọ mejọọ ihe?

17 Anyị kwesịkwara ịna-echeta na ebe anyị niile na-emejọ ihe, anyị nwere ike ime ihe ga-ewe ndị ọzọ iwe. Anyị chọpụta na anyị emeela otú ahụ, Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịgakwuru onye ahụ anyị mejọrọ ma gbalịa ka anyị na ya mee udo. (Gụọ Matiu 5:23, 24.) Ebe ọ bụ na obi na-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ọzọ eburughị anyị iwe n’obi n’ihi ihe anyị mejọrọ, anyịnwa ekwesịghị iburu ndị ọzọ iwe n’obi. Ndị Kọlọsi 3:13 gwara anyị, sị: “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.” Baịbụl kwuru na ịhụnanya anaghị “agụkọ ihe ọjọọ.” (1 Kọr. 13:5) Ọ bụrụ na anyị ana-agbaghara ndị ọzọ, Jehova ga na-agbaghara anyị. N’ihi ya, ndị ọzọ mejọọ ihe, anyị kwesịrị iṅomi otú Nna anyị nke eluigwe si emere anyị ebere ma anyị mejọọ ihe.—Gụọ Abụ Ọma 103:12-14.