Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jenụwarị 2017

“Tụkwasị Jehova Obi, Na-emekwa Ihe Ọma”

“Tụkwasị Jehova Obi, Na-emekwa Ihe Ọma”

“Tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma . . . na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi.”ỌMA 37:3.

ABỤ: 133, 63

1. Olee ihe ndị mere ka otú Jehova si kee anyị pụọ iche?

JEHOVA kere ụmụ mmadụ otú pụrụ iche. O kere anyị otú anyị ga-enwe ike iche echiche, ka anyị nwee ike ịna-edozi nsogbu ndị bịaara anyị, nweekwa ike ime atụmatụ ihe anyị ga-eme n’ọdịnihu. (Ilu 2:11) O nyere anyị ikike imezu ihe ndị dị mma anyị bu n’obi ime. (Fil. 2:13) O nyekwara anyị akọnuche, ya bụ, ihe na-eme ka anyị mara ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Akọnuche a na-enyere anyị aka anyị aghara ime ihe ọjọọ, nyekwara anyị aka imezi ihe anyị na-emetaghị.—Rom 2:15.

2. Olee ihe Jehova chọrọ ka anyị jiri ihe ndị o nyere anyị na-eme?

2 Jehova chọrọ ka anyị jiri ihe ndị a o nyere anyị mee ihe ndị ga-aba uru. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, marakwa na anyị ga-enwe obi ụtọ ma anyị jiri ihe ndị a o nyere anyị mee ihe bara uru. Jehova ejirila Baịbụl gwa anyị ọtụtụ ugboro ka anyị jiri ihe ndị a o nyere anyị mee ihe ga-aba uru. Dị ka ihe atụ, n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e kwuru, sị: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru”; kwuokwa, sị: “Ihe niile ruru  gị aka ime, jiri ike gị dum mee ha.” (Ilu 21:5; Ekli. 9:10) A gwara anyị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, sị: “Ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya, ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ,” gwakwa anyị, sị: “Dị ka onye ọ bụla natara onyinye, jirinụ ya na-ejere ibe unu ozi.” (Gal. 6:10; 1 Pita 4:10) Ihe ndị a gosiri na Jehova chọrọ ka anyị na-eme ihe ga-abara anyị na ndị ọzọ uru.

3. Olee ihe ụmụ mmadụ na-agaghị emeli n’onwe ha?

3 Jehova makwa na e nwere ihe ndị ụmụ mmadụ na-agaghị emeli. Anyị agaghị ejili aka anyị ewepụ ezughị okè, mmehie, na ọnwụ. E nyeghịkwa anyị ikike ịtụrụ ndị ọzọ ụka, n’ihi na onye ọ bụla nwere ikike iji aka ya ekpebi ihe ọ ga-eme. (1 Eze 8:46) N’agbanyeghịkwa otú anyị maruru n’ihe, anyị dị ka ụmụaka ma e jiri anyị tụnyere Chineke.—Aịza. 55:9.

Mgbe nsogbu bịaara gị, “tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma”

4. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 Anyị kwesịrị ikwe ka Jehova na-eduzi anyị n’ihe niile anyị na-eme ma tụkwasị ya obi na ọ ga na-akwado anyị ma na-emere anyị ihe ndị anyị na-agaghị emeliri onwe anyị. Mana, anyị kwesịkwara ịna-eme ihe anyị nwere ike ime iji dozie nsogbu anyị na iji nyere ndị ọzọ aka. (Gụọ Abụ Ọma 37:3.) N’eziokwu, anyị kwesịrị ‘ịtụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma’; kwesịkwa ịna-eme ihe “n’ikwesị ntụkwasị obi.” Ka anyị tụlee ihe anyị ga-amụta n’aka Noa, Devid, nakwa ndị ọzọ ji obi ha niile fee Chineke, bụ́ ndị tụkwasịrị Jehova obi ma mee ihe ndị ha kwesịrị ime. Anyị ga-ahụ ihe ndị ha ga-emeli na ihe ndị ha na-agaghị emeli, hụkwa otú ha si mee ndị nke ha ga-emeli.

MGBE IHE ỌJỌỌ GBARA ANYỊ GBURUGBURU

5. Kọwaa ụdị ọnọdụ Noa nọ na ya.

5 N’oge Noa, ụwa ‘jupụtara n’ime ihe ike’ na omume rụrụ arụ. (Jen. 6:4, 9-13) Ọ ma na Chineke ga-emecha bibie ụwa ọjọọ ahụ. N’agbanyeghị ya, ọ ga-abụ na ihe ọjọọ ndị na-eme n’oge ahụ nyere ya nsogbu n’obi. O doro Noa anya na e nwere ihe ndị ọ na-agaghị emeli gbasara ihe ọjọọ ndị na-emenụ, nweekwa ndị nke ọ ga-emeli.

Mgbe a na-ekweghị ege gị ntị n’ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6-9)

6, 7. (a) Gịnị ka Noa na-agaghị emeli? (b) Olee otú ọnọndụ anyị na nke Noa si yie?

6 Ihe Noa na-agaghị emeli: N’agbanyeghị na Noa ji obi ya niile kwusaa ozi ịdọ aka ná ntị Jehova dunyere ya, ọ gaghị  amanyeli ndị ajọ mmadụ ka ha nabata ozi ahụ, ọ gaghịkwa emeli ka Iju Mmiri ahụ bịa ngwa ngwa. Noa kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-emezu ihe o kwuru, ya bụ, na ọ ga-ebibi ihe ọjọọ nakwa na ọ ga-eme ya mgbe oge ya ruru.—Jen. 6:17.

7 Anyịnwa bikwa n’ụwa ihe ọjọọ juru, anyị makwa na Jehova ekwuola na ọ ga-ebibi ya. (1 Jọn 2:17) Ka ọ dịgodị, anyị agaghị amanyeli ndị mmadụ ka ha nabata ‘ozi ọma Alaeze Chineke.’ O nweghịkwa ihe anyị ga-emeli ka ụbọchị “oké mkpagbu” bịa ngwa ngwa. (Mat. 24:14, 21) Anyị kwesịrị inwe okwukwe siri ike ka Noa, obi esiekwa anyị ike na Chineke ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya. (Ọma 37:10, 11) Obi siri anyị ike na Jehova agaghị ekwe ka ụwa ọjọọ a jiri otu ụbọchị gafee mgbe o bu n’obi ibibi ya.—Hab. 2:3.

8. Olee otú Noa si lekwasị anya n’ihe ndị ọ ga-emeli? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

8 Ihe Noa ga-emeli: Noa ekweghị ka ihe ndị ọ na-agaghị emeli mee ka ike gwụ ya. O lekwasịrị anya ná ndị nke ọ ga-emeli. Ebe Noa bụ “onye na-ekwusa ezi omume,” o ji obi ya niile kwusaa ozi ịdọ aka ná ntị Chineke dunyere ya. (2 Pita 2:5) O doro anya na ozi ọma a o kwusara mere ka okwukwe ya sie ike. E wezụga ozi ọma o kwusara, o mere ihe niile o nwere ike ime iji rụọ ụgbọ Chineke gwara ya rụọ.—Gụọ Ndị Hibru 11:7.

9. Olee otú anyị ga-esi eme ka Noa?

9 Anyị na-agbalị ‘inwe ọtụtụ ihe anyị na-arụ n’ọrụ Onyenwe anyị,’ otú ahụ Noa mere. (1 Kọr. 15:58) Ihe só n’ọrụ ndị ahụ bụ ịrụ ebe ndị anyị na-anọ efe Chineke, iso na-enye aka ná mgbakọ anyị dị iche iche, ịna-enye aka n’ọrụ a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ọfis ndị nsụgharị. Ma, nke kachanụ bụ na anyị na-ekwusa ọzi ọma mgbe niile, ebe anyị ma na ọrụ a na-eme ka olileanya anyị nwere na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu sikwuo ike. Otu nwanna nwaanyị ji obi ya niile na-ejere Chineke ozi kwuru, sị: “Mgbe ị na-agwa ndị ọzọ banyere ngọzi nke Alaeze Chineke, ị ga-chọpụta na ndị na-ege gị ntị enwetụghị olileanya, nakwa na ha na-ele nsogbu ha anya dị ka nke na-adịgide adịgide.” N’eziokwu, ikwusa ozi ọma na-eme ka obi sikwuo anyị ike na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu, meekwa ka anyị kpebisikwuo ike ịghara ịda mba n’ọsọ ndụ anyị na-agba.—1 Kọr. 9:24.

 MGBE ANYỊ MERE MMEHIE

10. Kọwaa nsogbu ndị bịaara Devid.

10 Jehova kwuru na Devid bụ “nwoke obi [ya] nabatara.” (Ọrụ 13:22) Ihe e ji mara Devid bụ na o ji obi ya niile eme uche Chineke. N’agbanyeghị ya, o nwere mgbe o mere mmehie dị oké njọ. Ya na Bat-shiba kwara iko. O medịrị nke ka njọ. Ọ kpara nkata ka e gbuo di Bat-shiba bụ́ Yuraya n’ọgbọ agha ebe ọ na-achọ izochi ihe o mere. Devid nyedịrị Yuraya akwụkwọ ozi o ji kwuo ka e gbuo ya, ka o jiri aka ya nye ya onyeisi agha. (2 Sam. 11:1-21) Mmehie Devid mechara gbaa n’anwụ. (Mak 4:22) Gịnị ka Devid mere mgbe mmehie ya pụtara ìhè?

Mgbe mmehie ndị i mere n’oge gara aga na-enye gị nsogbu n’obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11-14)

11, 12. (a) Gịnị ka Devid na-agaghị emeli gbasara mmehie ndị ahụ o mere? (b) Gịnịkwa ka Jehova ga-emere anyị ma ọ bụrụ na anyị mere mmehie dị oké njọ ma mechaa chegharịa?

11 Ihe Devid na-agaghị emeli: Devid agaghị emezili ihe o mehiere, ọ gaghịkwa agbanahụli nsogbu ndị si na ya pụta. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụfọdụ nsogbu ihe a o mere kpataara ya ga-adịgide ruo mgbe ọ ga-anwụ. (2 Sam. 12:10-12, 14) N’ihi ya, o kwesịrị inwe okwukwe. Obi kwesịkwara isi ya ike na ebe ọ bụ na o chegharịala n’eziokwu, Jehova ga-agbaghara ya, nyekwara ya aka idi nsogbu ihe ndị o mere kpataara ya.

12 Anyị niile na-emehiecha n’ihi na anyị ezughị okè. E nwere mmehie ụfọdụ ndị dị oké njọ karịa ibe ha. Anyị agaghịkwa emezili ụfọdụ n’ime mmehie ndị ahụ. Naanị ihe anyị ga-eme bụ idiwe nsogbu ndị si na ha pụta. (Gal. 6:7) Ma, obi siri anyị ike na ọ bụrụhaala na anyị echegharịa, Jehova ga-emezu nkwa o kwere anyị na ọ ga-enyere anyị aka ná nsogbu bịaara anyị, a sịgodị na ọ bụ nke anyị kpataara onwe anyị.—Gụọ Aịzaya 1:18, 19; Ọrụ Ndịozi 3:19.

13. Olee ihe Devid mere ka ya na Jehova dịghachị ná mma?

13 Ihe Devid ga-emeli: Devid kwere ka Jehova nyere ya aka ka ya na ya dịkwa ná mma. Otú o si mee ya bụ na ọ nabatara ihe onye amụma Jehova, bụ́ Netan, gwara ya. (2 Sam. 12:13) Ihe ọzọ Devid mere bụ na o kpere ekpere, kwupụtara Chineke mmehie ya, gosikwa n’eziokwu na ọ chọrọ ka ya na Jehova dịghachi ná mma. (Ọma 51:1-17) Devid ekweghị ka obi na-ama ya ikpe mee ka ike gwụ ya. Kama, ọ mụtara ihe n’ihe o mejọrọ. N’eziokwu, o meghịkwa mmehie ndị ahụ dị oké njọ ọzọ. Ya na Chineke dịgidere ná mma ruo mgbe ọ nwụrụ ka ọtụtụ afọ gachara. Jehova ka na-echetakwa ya ka onye guzosiri ike n’ebe ọ nọ.—Hib. 11:32-34.

14. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Devid?

14 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Devid? Ọ bụrụ na anyị emee mmehie dị oké njọ, anyị kwesịrị iji obi anyị niile chegharịa, rịọkwa Jehova ka ọ gbaghara anyị. Anyị ga-ekwupụtarịrị mmehie anyị. (1 Jọn 1:9) Anyị kwesịkwara ịgakwuru ndị okenye, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ka anyị na Jehova dịkwa ná mma. (Gụọ Jems 5:14-16.) Ọ bụrụ na anyị anabata aka Jehova na-enyere anyị, anyị na-egosi na obi siri anyị ike na ọ ga-agwọ anyị otú o kwere ná nkwa, gbagharakwa anyị. N’ihi ya, ka anyị gbaa mbọ mụta ihe n’ihe mere anyị, nọgide na-ejere Jehova ozi, nweekwa obi ike na ihe ga-adịrị anyị mma ọdinihu.—Hib. 12:12, 13.

IHE ANYỊ NA-AMỤTA N’AKA NDỊ ỌZỌ

Mgbe ọrịa bịara (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Olee ihe anyị mụtara n’aka Hana?

15 I nwere ike icheta ndị ọzọ ji obi ha niile fee Chineke n’oge gara aga, bụ́ ndị tụkwasịrị Jehova obi ma mee ihe ndị ha ga-emeli. Dị ka ihe atụ, Hana bụ nwaanyị aga. O nweghịkwa ihe ọ ga-emeli gbasara ya. Ma, obi siri ya ike na Jehova ga-akasi ya obi. N’ihi ya, ọ nọgidere  na-efe Chineke n’ụlọikwuu, na-akọkwara ya mkpa ya n’ekpere. (1 Sam. 1:9-11) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịṅomi Hana? Ọ bụrụ na anyị na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwee nsogbu ndị anyị na-agaghị emeli ihe ọ bụla banyere ha, anyị na-akọrọ ya Jehova, ebe anyị ma na ọ na-eche banyere anyị. (1 Pita 5:6, 7) Anyị na-emekwa ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị nwee ike ina-aga ọmụmụ ihe anyị, sorokwa na-eme ihe ndị ọzọ a na-eme ná nzukọ Jehova, n’ihi na ha na-abara anyị uru.—Hib. 10:24, 25.

Mgbe nwa gị kpafuru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16. Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ịmụta n’aka Samuel?

16 Oleekwanụ maka ndị nne na nna ji obi ha niile na-efe Chineke, ma ụmụ ha ahapụ ọgbakọ? Samuel onye amụma agaghị amanyeli ụmụ ya bụ́ ndị dimkpa ka ha na-erubere Chineke isi. (1 Sam. 8:1-3) Ọ hapụụrụ Jehova okwu ahụ. Ma, Samuel ga-erubereli Nna ya nke eluigwe bụ́ Jehova isi ma na-eme ihe ọ chọrọ. (Ilu 27:11) Taa, ụdị ihe a emeela ọtụtụ ndị nne na nna ji obi ha niile na-efe Chineke. Obi siri ha ike na Jehova na-achọ ndị mmehie chegharịrị echegharị ka ọ nabata ha, otú ahụ nna nwa mmefu mere n’akụkọ nwa mmefu ahụ. (Luk 15:20) Ka ọ dịgodi, ndị nne na nna ahụ na-agbasị mbọ ike ka hanwa na-erubere Jehova isi, na-atụkwa anya na ụmụ ha ga-amụta ihe n’aka ha, lọghachikwute Jehova.

Mgbe ihe na-esiri gị ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Olee ihe anyị na-amụta n’akụkọ gbasara otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye?

17 Cheekwa banyere otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye n’oge Jizọs. (Gụọ Luk 21:1-4) E nweghị ihe ọ ga-emeli gbasara nrụrụaka na arụrụala juru n’ụlọ nsọ. (Mat. 21:12, 13) E nweghịkwa ezigbo ihe ọ ga-emeli ka ọ gharazie ịbụ ogbenye. Ma, o ji obi ya niile nye “obere mkpụrụ ego abụọ,” nke bụ́ “ihe niile o nwere o ji ebi ndụ.” Nwaanyị a na-atụ egwu Jehova gosiri na o ji obi ya niile tụkwasị Jehova obi. Ọ makwa na ya buru ụzọ na-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke, Jehova ga na-enye ya ihe ndị na-akpa ya. Okwukwe nwaanyị a nwere n’ebe Jehova nọ mere ka ọ kwado ihe ndị gbasara ofufe Chineke n’oge ahụ. Obi sikwara anyịnwa ike na ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, Jehova ga na-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị.—Mat. 6:33.

18. Nye ihe atụ nke otu nwanna lere ihe anya otú kwesịrị ekwesị.

18 Ọtụtụ ndị anyị na ha na-efekọ Chineke n’oge a egosikwala na ha tụkwasịrị Jehova obi, na-eme ihe ndị ha ga-emeli, ma wepụ obi ha ná ndị nke ha na-agaghị emeli. Chegodị banyere Nwanna Malcolm, bụ́ onye jegideere Jehova ozi ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 2015. Ọtụtụ nsogbu bịaara ya na nwunye ya ọtụtụ afọ ha ji jeere Jehova ozi. O kwuru, sị: “Anyị amaghị ihe ga-eme anyị echi. Mgbe ụfọdụ, naanị ihe anyị nwere ike ime bụ ikwu ihe anyị chere. Ma Jehova na-agọzi ndị tụkwasịrị ya obi.” O nyeziri ndụmọdụ, sị: “Na-ekpe ekpere ka Jehova nyere gị aka ịna-eme nke ọma n’ozi ya. Na-eche banyere ihe ndị ị ga-emeli n’ozi Jehova, ọ bụghị ihe ndị ị na-agaghị emeli.” *

19. (a) Gịnị mere isiokwu afọ 2017 ji daba adaba? (b) Olee otú ị ga-esi eme ihe e kwuru n’isiokwu afọ 2017 ná ndụ gị?

19 Ka ụwa ochie a “na-ajọwanye njọ,” anyị ga na-atụ anya na nsogbu tara akpụ ga na-abịara anyị. (2 Tim. 3:1, 13) N’ihi ya, ọ dị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ka anyị ghara ikwe ka nsogbu ndị na-abịara anyị mee ka ike gwụ anyị. Kama, anyị kwesịrị ịgbasị mbọ ike tụkwasị Jehova obi, ma na-eme ihe ndị anyị ga-emeli. Ọ bụ ya mere isiokwu afọ 2017 ji daba nnọọ adaba. Isiokwu ahụ sịrị: “Tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma.”—Ọma 37:3.

Isiokwu afọ 2017 bụ: “Tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma.”Abụ Ọma 37:3