Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jenụwarị 2017

“Nyefee Ya n’Aka Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi”

“Nyefee Ya n’Aka Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi”

“Ihe ị nụrụ n’ọnụ m . . . nyefee ya n’aka ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị ga-erukwa eru nke ọma ịkụziri ya ndị ọzọ.”2 TIM. 2:2.

ABỤ: 123, 53

1, 2. Olee otú ọtụtụ ndị si ewerekarị ihe ha na-arụ?

NDỊ mmadụ na-ejikarị ihe ha na-arụ akọwa onwe ha. Ọtụtụ ndị na-ewerekwa ya na ọ bụ ọrụ mmadụ na-arụ ka e ji ama ụdị onye ọ bụ. N’obodo ụfọdụ, otu n’ime ihe a na-ajụkarị mmadụ iji mata onye ahụ bụ, “Gịnị ka ị na-arụ?”

2 Mgbe ụfọdụ, Baịbụl na-eji ihe ndị ụfọdụ na-arụ akọwa ha. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru banyere “Matiu onye ọnaụtụ”; “Saịmọn, onye na-esiji akpụkpọ anụ”; na “Luk, bụ́ ọgwọ ọrịa, onye a hụrụ n’anya.” (Mat. 10:3; Ọrụ 10:6; Kọl. 4:14) A na-ejikwa ọrụ Chineke nyere ụfọdụ ama ha. Anyị na-agụ gbasara mmadụ ndị dị ka Eze Devid, Ịlaịja onye amụma, na Pọl onyeozi. Ndị a ji ọrụ Chineke nyere ha kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na e nwere ọrụ Jehova nyere anyị, anyị kwesịkwara iji ya kpọrọ ihe.

3. Gịnị mere ndị okenye ji kwesị ịzụ ụmụ okorobịa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Ọtụtụ n’ime anyị nwere mmasị n’ihe anyị na-arụ, chọọkwa ịrụ ya ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ọ dị mwute na kemgbe oge Adam, ọ na-abụ otu ọgbọ na-eme agadi, ọgbọ ọzọ ana-anọchi ya. (Ekli. 1:4) Taa, ụdị mgbanwe a emeela ka ọ dị mkpa na  Ndị Kraịst ga-emegharị ihe ụfọdụ. Ọrụ ndị ohu Jehova na-arụ amụbaala n’ebe o buru ibu. Ka a na-enwe ọrụ ọhụrụ, a na-enwekarịkwa otú ọhụrụ e kwesịrị isi na-arụ ya. Otú ọhụrụ a e si arụ ụfọdụ ọrụ ndị a pụtakwara na a ga-eji ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ na-arụ ha. Ọ na-esiri ụfọdụ ndị merela agadi ike ịrụ ọrụ ndị a otú ọhụrụ e sizi arụ ha. (Luk 5:39) Ọ bụrụgodị ndị nke ọ na-anaghị esiri ike, nke bụ́ eziokwu bụ na ndị na-akatabeghị ahụ́ nwere ume na ike karịrị nke ndị katarala ahụ́. (Ilu 20:29) N’ihi ya, ọ bara uru, kwesịkwa ekwesị, ka ndị okenye zụọ ụmụ okorobịa ka ha nwee ike ịna-arụkwu ọrụ ndị dị n’ọgbakọ.—Gụọ Abụ Ọma 71:18.

4. Gịnị mere o ji esiri ụfọdụ ike inye ndị ọzọ ọrụ? (Kwuo ihe dị n’igbe bụ́ “ Ihe Mere Ụfọdụ Ndị Anaghị Enyefe Ndị Ọzọ Ọrụ.”)

4 O nwere ike isiri ndị nọ n’ọkwá ike inyefe ndị ka bụ́ okorobịa ọrụ. Ụjọ ha bụ na e nwere ike ịnaghara ha ọrụ ha dị ha ezigbo mkpa. Ọ na-echu ndị ọzọ ụra na ọ bụghịzi hanwa ga na-ahazi otú ọrụ ahụ si aga nakwa na ọrụ ahụ agaghị aga nke ọma ma ha hapụ ya, n’ihi na ụmụ okorobịa agaghị arụtali ya nke ọma otú hanwa ga-esi arụta ya. Ụfọdụ nwere ike ịna-ekwu na ha enweghị ohere ha ga-eji azụ ndị ọzọ. Ụmụ okorobịa kwesịkwara inwe ndidi ma ọ bụrụ na e nyekwubeghị ha ọrụ.

5. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

5 Ka anyị legodi okwu a anya n’ụzọ abụọ. Nke mbụ bụ, olee otú ndị okenye ga-esi enyere ndị na-eto eto aka ka ha werekwuo ọrụ ndị dị n’ọgbakọ, oleekwa ihe mere ha ji kwesị ime otú ahụ? (2 Tim. 2:2) Nke abụọ bụ, gịnị mere ndị a na-azụ ji kwesị ịsa anya ná mmiri, kwesịkwa ịna-akpa àgwà otú kwesịrị ekwesị, ka ha na-enyere ụmụnna ndị katarala ahụ́ aka, na-amụtakwa ihe n’aka ha? Ka anyị legodị otú Eze Devid si kwadebe nwa ya maka ọrụ dị ezigbo mkpa ọ ga-arụ.

DEVID KWADEBERE SỌLỌMỌN, NYEKWARA YA AKA

6. Olee ihe Eze Devid chọrọ ime, oleekwa ihe Jehova gwara ya?

6 Mgbe Devid gbachara ọsọ ndụ ruo afọ asatọ, ọ ghọrọ eze, birikwa n’ọmarịcha  ụlọ. Ma, obi adịghị ya mma na e nweghị ụlọ a rụụrụ Jehova, ya achọọ ịrụrụ ya ụlọ. Ọ gwara Netan onye amụma, sị: “Lee, m bi n’ụlọ e ji osisi sida wuo, ma igbe ọgbụgba ndụ Jehova dọrọ n’okpuru ákwà ụlọikwuu.” Netan gwara ya, sị: “Mee ihe ọ bụla dị gị n’obi, n’ihi na ezi Chineke nọnyeere gị.” Ma, Jehova achọghị ya otú ahụ. O dunyere Netan ka ọ gaa gwa Devid, sị: “Ọ bụghị gị ga-ewuru m ụlọ m ga-ebi.” N’agbanyeghị na Jehova mesiri Devid obi ike na ya ga-anọgide na-agọzi ya, o kwuru na ọ bụ Sọlọmọn nwa Devid ga-arụ ụlọ nsọ ya. Olee ihe Devid mere?—1 Ihe 17:1-4, 8, 11, 12; 29:1.

7. Olee ihe Devid mere mgbe Jehova kwuru na ọ bụghị ya ga-arụrụ ya ụlọ?

7 Devid ejighị maka ya jụ inyere nwa ya aka, obi agaghịkwa jọwa ya njọ na ọ bụghị ya ka a ga-asị rụrụ ụlọ nsọ ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na a kpọwara ụlọ nsọ ahụ ụlọ nsọ Sọlọmọn, ọ bụghị nke Devid. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịbụ na o wutere Devid na ya emelighị ihe o bu n’obi ime, o ji obi ya niile kwado ọrụ ahụ. Ọ haziri ndị ga-arụ ọrụ ahụ wekọtakwa ígwè, ọla kọpa, ọlaọcha, na ọlaedo, nakwa osisi sida, a ga-eji rụọ ụlọ ahụ. Ihe ọzọkwa bụ na ọ gbara Sọlọmọn ume, sị ya: “Ugbu a, nwa m, ka Jehova nọnyere gị, ị ga-enwekwa ihe ịga nke ọma wee wuo ụlọ Jehova bụ́ Chineke gị, dị nnọọ ka o kwuru banyere gị.”—1 Ihe 22:11, 14-16.

8. Gịnị mere ọ ga-eji adị Devid ka Sọlọmọn agaghị emeli ihe dị n’ịrụ ụlọ nsọ ahụ, ma gịnị ka o mere?

8 Gụọ 1 Ihe E Mere 22:5. O nwere ike ịbụ na Devid chere n’obi ya na Sọlọmọn agaghị emeli ihe dị n’ịhazi otú a ga-esi rụọ ụlọ ahụ dị ezigbo mkpa. A sị ka e kwuwe, ụlọ ahụ “ga-adị ebube nke ukwuu,” ma Sọlọmọn ka “bụ obere nwa, isi akabeghịkwa ya.” Ma, Devid ma na Jehova ga-enyere Sọlọmọn aka ya arụọ ọrụ o nyere ya. Devid lekwasịziri anya n’otú ọ ga-esi kwado ọrụ ahụ, wetakwa ọtụtụ ihe a ga-eji arụ ya.

ỊZỤ NDỊ ỌZỌ NA-EME OBI ỤTỌ

Ọ na-eme obi ụtọ ịhụ ka ụmụ okorobịa na-arụzi ọrụ ndị e nwere n’ọgbakọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

9. Gịnị mere obi ji kwesị ịdị ndị okenye katarala ahụ́ ụtọ inyefe ụmụ okorobịa ọrụ hanwa na-arụ? Nye ihe atụ.

9 Obi ekwesịghị ịjọ ndị merela agadi njọ ma ha nyefewe ụmụ okorobịa ọrụ ha. Anyị niile ma na ọ bụ ihe e kwesịrị ime n’ihi na ihe kacha mkpa bụ ka ọrụ Jehova na-aga n’ihu. Obi kwesịrị ịdị ndị okenye ụtọ ma ndị na-eto eto ha zụrụ ruo eruo ịrụ ọrụ ndị e nwere n’ọgbakọ. Iji maa atụ, chegodi banyere otu nna na-akụziri nwa ya otu e si anya ụgbọala. Mgbe nwa ahụ di obere, naanị ihe ọ na-eme bụ ịna-ele papa ya anya. Nwa ahụ totụkwuo, papa ya akụziweziere ya otú e si anya ya. Mgbe nwa ahụ toruziri ịnya ụgbọala, ya anyawa ya, papa ya ana-enyekwu ya ntụziaka. Mgbe ụfọdụ, ha nwere ike ịna-eme, papa ya nyatụ, nwa ahụ anyatụ. Ma ka oge na-aga, ọ ga-abụzi naanị nwa ahụ ga na-anyatazi papa ya mere agadi. Obi na-adịzi papa ahụ ụtọ na ọ bụzi nwa ya na-anyazi  ụgbọala ahụ, ọ naghịkwa ewute ya na ọ bụghịzi yanwa na-anya. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ na-adị ndị okenye, obi na-adị ha ụtọ mgbe ha zụrụ ụmụ okorobịa ka ha rụwa ọrụ ndị dị n’ọgbakọ.

10. Olee otú ikike e nyere Mozis na otuto a na-enye ya dị ya?

10 Ndị okenye kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara imere ndị ọzọ anyaụfụ n’ihe ha na-arụ. Legodi ihe Mozis mere mgbe ụfọdụ ndị bidoro ime ka ndị amụma n’ebe ụmụ Izrel mara ụlọikwuu. (Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 11:24-29.) Jọshụa, bụ́ onye na-enyere Mozis aka, chọrọ ka ha kwụsị ihe ahụ ha na-eme. Ọ ga-abụ na Jọshụa chere na ndị ahụ na-aga ịnara Mozis ọkwá ya. Ma, Mozis gwara ya, sị: “Ị̀ na-ekworo m ekworo? Ekworola m ekworo, ọ dị m ka ya bụrụ na ndị Jehova niile bụ ndị amụma, n’ihi na Jehova ga-eme ka mmụọ ya dịrị n’ahụ́ ha.” Mozis hụrụ na aka Jehova dị n’ihe ahụ merenụ. Ọ chọghị ka a na-ebuli ya elu. O kwuru na ọ ga-amasị ya ka ndị ohu Jehova niile nwee ike ịrụ ọrụ ahụ yanwa na-arụ. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe obi ụtọ ka Mozis ma e nye ndị ọzọ ọrụ a gaara enye anyị?

11. Olee ihe otu nwanna kwuru gbasara inyefe onye ọzọ ọrụ ọ na-arụbu?

11 Taa, e nwere ọtụtụ ụmụnna ndị rụsirila ọrụ ike ruo ọtụtụ afọ, kwadebekwa ndị ọzọ ka ha nwee ike ịrụkwu ọrụ ndị dị n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ́ Peter ejeela ozi oge niile afọ iri asaa na anọ. O jirikwala afọ iri atọ na ise n’ime ya jee ozi n’otu alaka ụlọ ọrụ dị na Yurop. Ọ bụ ya bụbu onye na-elekọka Ngalaba Ije Ozi n’ebe ahụ. Mana, ọ kwụsịrị ịrụ ọrụ ahụ n’oge na-adịbeghị anya. Ọ bụzi Paul, onye ya na Peter rụkọrọla ọrụ ahụ ruo ọtụtụ afọ, bụzi onye nlekọta ngalaba ahụ. Mgbe a jụrụ Peter otú mgbanwe a dị ya, ọ sịrị, “Obi dị m ụtọ na e nwere ụmụnna ndị a zụrụla ka ha na-arụkwu nnukwu ọrụ ndị e nwere ná nzukọ a, ha ana-arụkwa ya nke ọma.”

KA ANYỊ JIRI ỤMỤNNA ANYỊ NDỊ KATARALA AHỤ́ KPỌRỌ IHE

12. Olee ihe anyị na-amụta n’akụkọ gbasara Rehoboam?

12 Mgbe Sọlọmọn nwụrụ, nwa ya Rehoboam ghọrọ eze. Mgbe Rehoboam chọrọ ndụmọdụ maka otú ọ ga-esi arụ ọrụ ya, o bu ụzọ gakwuru ndị katarala ahụ́. Ma, ọ naraghị ndụmọdụ ha nyere ya. Kama nke ahụ, ọ naara ndụmọdụ ndị ọgbọ ya na-ejere ya ozi nyere ya. Nsogbu si na ya pụta abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. (2 Ihe 10:6-11, 19) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ọ dị mma ịgakwuru ndị agadi ma anyị chọọ ndụmọdụ, anyị kwesịkwara ichebara ndụmọdụ ha nyere anyị echiche. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị na iwu ji ụmụ okorobịa isi otú ochie e si eme ihe na-eme ya, ha ekwesịghị ileghara ndụmọdụ ndị katarala ahụ́ nyere ha anya.

13. Olee ihe ndị na-akatabeghị ahụ kwesịrị ịna-eme?

13 Ọ bụzi ndị okenye na-akatabeghị ahụ́ na-ahaziri ndị okenye ọrụ n’ọgbakọ ụfọdụ, ebe e nwere ndị okenye katarala ahụ́. Ọ bụ eziokwu na e nyere ndị a na-akatabeghị ahụ́ ọrụ ndị a, ha ka kwesịrị ịna-ege ntị n’ezigbo ndụmọdụ ndị ahụ katarala ahụ́ na-enye ha. Paul anyị kwuburu okwu ya, bụ́ onye na-arụzi ihe Peter na-arụbu, kwuru, sị: “M na-ewepụta oge gakwuru Nwanna Peter ka o nye m ndụmọdụ, m na-agwakwa ndị ọzọ mụ na ha na-arụ ka ha na-eme otú ahụ.”

14. Olee ihe anyị na-amụta n’otú Pọl onyeozi na Timoti si mekọọ ihe?

14 Timoti, bụ́ nwa okorobịa, so Pọl onyeozi jee ozi ọtụtụ afọ. (Gụọ Ndị Filipaị 2:20-22.) E nwere mgbe Pọl degara Ndị Kọrịnt akwụkwọ ozi, sị: ‘M na-ezitere unu Timoti, ebe ọ bụ  nwa m m hụrụ n’anya nke kwesịrị ntụkwasị obi n’ime Onyenwe anyị; ọ ga-echetakwara unu otú m si eme ihe n’ime Kraịst Jizọs, dị nnọọ ka m na-akụzi n’ebe niile n’ọgbakọ niile.’ (1 Kọr. 4:17) Obere ihe a Pọl kwuru gosiri na ya na Timoti na-emekọ ihe. Pọl ewepụtala oge kụziere Timoti “otú [yanwa bụ́ Pọl] si eme ihe n’ime Kraịst.” Timoti mụtara ihe Pọl kụziiri ya nke ọma, ya emee ka Pọl hụ ya n’anya, nweekwa obi ike na Timoti ga-enyeliri ụmụnna ndị nọ na Kọrịnt aka. Ndị okenye kwesịrị ịmụta ezigbo ihe n’ihe a Pọl mere ka ha na-azụ ndị ọzọ ka ha rụwazie ọrụ ndị dị n’ọgbakọ.

ONYE Ọ BỤLA NWERE ỌRỤ Ọ GA-ARỤ

15. Olee otú akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Rom ga-esi enyere anyị aka ma ọnọdụ anyị gbanwee?

15 Anyị bi n’oge dị ezigbo mkpa. Nzukọ Jehova na-eto n’ike n’ike n’ọtụtụ ụzọ. Otú a nzukọ Jehova si na-eto na-emekwa ka a na-enwe mgbanwe. Ọ bụrụ na mgbanwe ndị a emetụta anyị, ka anyị dịrị umeala n’obi ma lekwasị anya n’ihe ga-eme ka ọgbakọ Jehova na-aga n’ihu, ọ bụghị n’ihe anyịnwa chọrọ. Anyị na-eme otú a, ọ ga-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu. Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Rom, sị: “Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị iche; kama ka ọ na-eche echiche iji nwee uche zuru okè, onye ọ bụla dị ka okwukwe Chineke nyere ya si dị. N’ihi na dị nnọọ ka anyị nwere ọtụtụ akụkụ ahụ́ n’otu ahụ́, ma akụkụ ahụ́ ndị ahụ niile adịghị arụ otu ọrụ, otú ahụ ka anyị onwe anyị bụ otu ahụ́ n’ime Kraịst.”—Rom 12:3-5.

16. Olee ihe ndị na-akatabeghị ahụ́ na ndị katarala ahụ́, nakwa ndị nwunye ha, ga-eme iji hụ na udo dị n’ọgbakọ Jehova, mmadụ niile adịrịkwa n’otu?

16 N’agbanyeghị ihe bụ́ ọnọdụ anyị, ka anyị na-agbasi mbọ ike ka ozi Jehova na-aga n’ihu. Unu ụmụnna anyị ndị katarala ahụ́, zụọnụ ụmụ okorobịa ka ha na-arụ ọrụ unu na-arụbu. Ununwa ụmụ okorobịa, naranụ ọrụ ndị e nyere unu, dịrịnụ umeala n’obi, na-akwanyekwaranụ ndị katarala ahụ́ ùgwù. Unu ụmụ nwaanyị, na-eṅominụ Prisila, bụ́ nwunye Akwịla, onye ji obi ya niile kwado di ya mgbe ọnọdụ ha gbanwere.—Ọrụ 18:2.

17. Olee ihe obi siri Jizọs ike na ndị na-eso ụzọ ya ga-emeli, oleekwa ihe ọ zụrụ ha ka ha mee?

17 Jizọs kacha mee ihe anyị kwesịrị iṅomi ma a bịa n’ihe banyere ịzụ ndị ọzọ ka ha nwee ike ịrụkwu ọrụ ndị e nwere. Ọ ma na ya ga-ejecha ozi ọ bịara ije n’ụwa n’oge na-adịghị anya nakwa na ndị ọzọ ga-arụrụ ọrụ ahụ gaa n’ihu. Ọ bụ eziokwu na ndị na-eso ụzọ ya ezughị okè, obi siri ya ike na ha na-arụli ya. Ọ bụ ya mere o ji gwa ha na ha ga-arụ ọrụ karịrị nke ọ rụrụ. (Jọn 14:12) Ọ zụrụ ha nke ọma, ha ekwusaakwa ozi ọma ahụ n’ebe niile n’ụwa n’oge ahụ.—Kọl. 1:23.

18. Olee ihe ọma ga-emere anyị n’ọdịnihu, oleekwa ihe anyị ga na-eme ugbu a?

18 Mgbe Jizọs nwụchara, a kpọlitere ya n’ọnwụ ya agaa eluigwe, ebe e nyekwuru ya ọrụ ọ ga-arụ, nyekwa ya ikike “dị elu karịa ọchịchị na ikike na ike na ịbụisi ọ bụla.” (Efe. 1:19-21) Ọ bụrụ na anyị efegide Jehova nwụọ tupu Amagedọn abịa, a ga-akpọlite anyị n’ọnwụ anyị abaa n’ụwa ọhụrụ, ebe anyị ga-enwe ọtụtụ ọrụ na-enye obi ụtọ anyị ga-arụ. Ma, ka ọ dịgodị, e nwere ọrụ dị ezigbo mkpa anyị niile ga-eso arụ, ya bụ, ikwusa ozi ọma na ime ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ka anyị niile, ma onye ukwu ma onye nta, nọgide ‘na-enwe ọtụtụ ihe anyị na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị.’—1 Kọr. 15:58.