Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jenụwarị 2017

Jiri Ikike Chineke Nyere Gị Ịna-ekpebi Ihe Ị Ga-eme Kpọrọ Ihe

Jiri Ikike Chineke Nyere Gị Ịna-ekpebi Ihe Ị Ga-eme Kpọrọ Ihe

“Ebe ọ bụla mmụọ Jehova dị, n’ebe ahụ ka nnwere onwe dị.”2 KỌR. 3:17.

ABỤ: 62, 65

1, 2. (a) Olee ihe dị iche iche ndị mmadụ kwuru gbasara mmadụ ikpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme? (b) Gịnịkwanụ ka Baịbụl gwara anyị, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

MGBE otu nwaanyị na-achọ ikpebi ihe ọ ga-eme, ọ gwara enyi ya nwaanyị, sị: “Agwala m ihe ga-eme ka m chewe echiche; gwa m ihe m ga-eme.” Nwaanyị ahụ chọrọ ka a gwa ya ihe ọ ga-eme kama iji ikike Chineke nyere ya ekpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme. Gịnwakwanụ? Ọ̀ na-amasị gị iji aka gị ekpebi ihe ị ga-eme, ka ị̀ na-achọ ka ndị ọzọ na-ekpebiri gị ya? Olee otú i si ele okwu gbasara mmadụ iji aka ya ekpebiri onwe ya ihe anya?

2 E nweela ihe dị iche iche ndị mmadụ kwurula gbasara ya. Ụfọdụ ndị na-ekwu na o nweghị onye ga-ejili aka ya ekpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme n’ihi na Chineke adịla mbụ kpebie ihe niile. Ndị ọzọ na-ekwu na naanị mgbe a ga-asị na mmadụ ji aka ya ekpebiri onwe ya ihe bụ ma ọ bụrụ na ọ bụ yanwa na-ekpebi ihe niile. Ma, ọ bụ Baịbụl ga-agwa anyị nke bụ́ eziokwu n’okwu a. Gịnị mere anyị ji sị na ọ bụ Baịbụl? Ọ gwara anyị na Chineke kere anyị otú anyị ga-enwe ike ịna-ekpebiri onwe anyị ezigbo ihe anyị ga-eme. (Gụọ Jọshụa 24:15.) Baịbụl zakwara ajụjụ ndị dị ka: Olee otú anyị ga-esi jiri ikike a Chineke nyere anyị na-ekpebi ihe bara uru? È nwere ihe ndị ọ na-abụghị anyị ga-ekpebi? Olee  otú ihe anyị kpebiri ime si egosi otú anyị hụruru Jehova n’anya? Oleekwa otú anyị ga-esi egosi na anyị ghọtara na ọ bụ ndị ọzọ ka ọ dịịrị ikpebiri onwe ha ihe ha ga-eme?

GỊNỊ KA ANYỊ GA-AMỤTA N’AKA JEHOVA NA JIZỌS?

3. Olee otú Jehova si gosi otú kacha mma mmadụ ga-esi jiri ikike o nwere ikpebi ihe mee ihe ga-abara ndị ọzọ uru?

3 Ọ bụ naanị Jehova nweere onwe ya ikpebi ime ihe ọ bụla masịrị ya. Ma, anyị ga-amụta ihe n’otú o si ekpebi ihe ọ ga-eme. Dị ka ihe atụ, ọ họọrọ mba Izrel ka ha bụrụ mba a kpọkwasịrị aha ya, ya bụ, ‘ihe onwunwe ya pụrụ iche.’ (Diut. 7:6-8) Ọ pụtaghị na Chineke nọkatara nnọọ họrọ ha. Ọ họọrọ ha n’ihi nkwa o kwere enyi ya Ebreham ọtụtụ narị afọ gara aga tupu oge ụmụ Izrel. (Jen. 22:15-18) Otú Jehova sikwa ekpebi ihe na-egosikwa na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, na-ekpekwa ikpe ziri ezi. Ihe gosiri na ọ bụ eziokwu bụ otú o si mesoo ụmụ Izrel n’agbanyeghị na ha hapụrụ ya gaa fee chi ọzọ ọtụtụ ugboro. Mgbe ọ bụla ha chegharịa n’eziokwu, Jehova na-eji obi ya niile emere ha ebere, na-egosikwa ha na ya hụrụ ha n’anya. O kwuru, sị: “M ga-agwọ ekwesịghị ntụkwasị obi ha. M ga-eji obi m hụ ha n’anya.” (Hos. 14:4) Jehova gosiri anyị otú kacha mma mmadụ ga-esi jiri ikike o nwere kpebie ime ihe ga-abara ndị ọzọ uru.

4, 5. (a) Ònye bụ onye mbụ e nyere ikike ikpebi ihe ọ ga na-eme? (b) Olee ajụjụ onye ọ bụla kwesịrị ịjụ?

4 Mgbe Jehova malitere ike ihe, o ji obi ọcha ya kee ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ otú ha ga na-ekpebi ihe ha ga-eme. Onye mbụ o si otú a kee bụ Ọkpara ya, bụ́ “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya.” (Kọl. 1:15) Tupudị Jizọs abịa n’ụwa, o kpebiri na ọ ga na-erubere Nna ya isi, ọ bụghị iso Setan nupụụrụ Jehova isi. Ka oge na-aga, mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o ji ikike Chineke nyere ya ikpebi ihe ọ ga-eme kpebie na ya agaghị ekwe ka Setan nwata ya. (Mat. 4:10) N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, o ji obi ya niile kpee ekpere ma kwuo ihe gosiri na ya kpebisiri ike ime uche Chineke. Ọ sịrị: “Nna, ọ bụrụ na ị chọọ, wepụ iko a n’ebe m nọ. Ka o sina dị, ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.” (Luk 22:42) Ka anyị ṅomie Jizọs, jiri ikike anyị nwere ikpebi ihe anyị ga na-eme na-eme uche Jehova. Ànyị ga-emeli ya?

5 Ee, anyị ga-emeli ka Jizọs, n’ihi na e kekwara anyịnwa n’onyinyo Chineke. (Jen. 1:26) Ma, ọ bụghị ihe niile ka anyị ga-emeli. E nyeghị anyị ikike ịna-eme nnọọ ihe otú ọ bụla masịrị anyị. Ọ bụ naanị Jehova nweere onwe ya ime ihe ọ bụla ọ chọrọ. Baịbụl gosiri na Chineke enyeghị anyị ikike ime ihe niile. Ọ chọkwara ka anyị ghara ime ihe ọ na-enyeghị anyị ikike ime. Dị ka ihe atụ, ndị nwunye kwesịrị ịnọ n’okpuru di ha, ụmụaka anọrọ n’okpuru ndị nne na nna ha. (Efe. 5:22; 6:1) Olee ihe icheta na Chineke enyeghị anyị ikike ime otú masịrị anyị ga-enyere anyị aka ime ma anyị kpebiwe ihe anyị ga-eme? Ihe anyị ga-eme n’okwu a ga-egosi ma ànyị ga-adị ndụ ebighị ebi ka ọ̀ bụ na anyị agaghị adị.

IHE ANYỊ KWESỊRỊ IJI IKIKE A EME NA IHE ANYỊ NA-EKWESỊGHỊ IJI YA EME

6. Mee ihe atụ gosiri na anyị ekwesịghị inwe ikike ime otú ọ bụla masịrị anyị.

6 Ànyị ga-asị na ọ bụ anyịnwa na-ekpebiri onwe anyị ihe ma ọ bụrụ na ọ bụghị ihe niile ka anyị na-eji aka anyị ekpebi? Ee. Maka gịnị? Ọ bụ maka na otú a a na-enyeghị anyị ikike ime otú ọ bụla masịrị anyị bụ maka ọdịmma anyị. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ikpebi iji ụgbọala aga ebe dị́ ezigbo anya. Ma, obi ọ̀ ga-eru anyị ala ịna-agba n’okporo ụzọ na-ekwo ekwo a na-enweghị iwu na-achịkwa otú a ga-esi na-agba na ya, onye ọ bụla ana-agbakwa otú masịrị ya? O doro anya na obi agaghị eru anyị ala. N’eziokwu, anyị chọọ ka ikike a e nyere anyị ikpebi ihe anyị ga na-eme baara anyị uru, anyị ekwesịghị ịna-eme otú masịrị anyị.  Ka anyị tụlee akụkọ ụfọdụ ndị dị na Baịbụl iji hụ na ọ dị mma na Jehova enyeghị anyị ikike ịna-eme otú ọ bụla masịrị anyị.

7. (a) Olee otú ikike Chineke nyere Adam ịna-ekpebi ihe ọ ga-eme si mee ka ọ dị iche n’ihe ndị ọzọ e kere eke n’Ogige Iden? (b) Kọwaa otú Adam si jiri ikike a Chineke nyere ya mee ihe.

7 Mgbe Chineke kere nwoke mbụ bụ́ Adam, o kere ya otú ahụ o si kee ndị mmụọ ozi, ya bụ, ka o nwee ikike ịna-ekpebi ihe ọ ga-eme. Ihe a mere ka Adam dị iche n’ụmụ anụmanụ na-anaghị eche ihe eche eme. Ka anyị legodị otú Adam si jiri ikike a mee ihe bara uru. E bu ụzọ kee ụmụ anụmanụ tupu e kee mmadụ. Ma, Jehova hapụrụ Adam ka o jiri aka ya gụọ ụmụ anụmanụ ndị ahụ aha. Baịbụl sịrị: “O wee malite ime ka ha na-abịakwute mmadụ ahụ ka ọ mara ihe ọ ga-agụ nke ọ bụla.” Mgbe Adam leruchara anụmanụ nke ọ bụla anya ma gụọ ya aha dabara adaba, Jehova agaghị gụgharịwa ya aha. Kama, “ihe ọ bụla mmadụ ahụ gụrụ mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ, ya abụrụ aha ya.”—Jen. 2:19.

8. Olee otú Adam si jiri ikike e nyere ya ikpebi ihe mee ihe na-abaghị uru, oleekwa ihe ọ kpatara?

8 Ma, ọ dị mwute na ọrụ Chineke nyere Adam ka ọ na-akọ ihe na paradaịs mbụ ahụ ma na-elekọta ya ejughị ya afọ. Ikike niile Chineke nyere ya, nke ga-eme ka o nwee ike imezu ihe ọ gwara ya ejughị ya afọ. Jehova gwara ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu, ka azụ̀ . . . na anụ ufe . . . na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.” (Jen. 1:28) Kama ime ihe a gwara ya, o kpebiri inupụrụ Chineke isi gaa rie mkpụrụ osisi ọ sịrị ha erila. Ihe a jọgburu onwe ya Adam kpebiri ime emeela ka ụmụ ya na-ahụsi anya kemgbe ọtụtụ puku afọ. (Rom 5:12) Nsogbu a ihe Adam kpebiri ime kpatara kwesịrị ime ka anyị kpachara anya ma hụ na ihe ndị anyị na-ekpebi ime dabara n’ihe bụ́ uche Jehova.

9. Olee ihe Jehova gwara ụmụ Izrel ka ha jiri aka ha kpebie, oleekwa ihe ha kpebiri ime?

9 Ụmụ Adam ketara ezughị okè na ọnwụ n’aka nne na nna ha nupụrụ isi. Ma, ha ka nwere ikike ikpebi ihe hanwa ga-eme. Ihe gosiri na ọ bụ eziokwu bụ otú Jehova si mesoo ụmụ Izrel. Jehova si n’aka Mozis gwa ụmụ Izrel ka ha kpebie ma hà ga-aghọ ihe onwunwe ya pụrụ iche. (Ọpụ. 19:3-6) Gịnị ka ha kwuru? Ha ji aka ha kpebie na ha ga-eme ihe dị n’ịghọ ndị a kpọkwasịrị aha Chineke. Ha niile ji otu olu kwuo, sị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru.” (Ọpụ. 19:8) Ma, ọ jọgburu onwe ya na ka oge na-aga, ụmụ Izrel kwụsịrị ime ihe ahụ ha kwere nkwa ime. Ka anyị mụta ihe n’ihe a ma jiri ikike Jehova nyere anyị ikpebiri onwe anyị ihe na-ekpebi irubere ya isi n’ihe niile na ime ihe ọ chọrọ.—1 Kọr. 10:11.

10. Olee ihe atụ ndị gosiri na mmadụ na-ezughị okè ga-ejili ikike Chineke nyere ya ikpebi ihe ọ ga-eme mee uche Chineke? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

10 Ndị Hibru isi iri na otu, e dere aha ndị ohu Jehova iri na isii, bụ́ ndị họọrọ iji ikike Jehova nyere ha kpebie ihe dabara n’uche ya. Jehova gọziri ha maka ya, ha enweekwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Dị ka ihe atụ, Noa gosiri na ya nwere ezigbo okwukwe, họrọkwa ime ihe Chineke gwara ya, nke bụ́ ka ọ rụọ ụgbọ a ga-eji zọpụta ezinụlọ ya nakwa agbụrụ mmadụ. (Hib. 11:7) Ebreham na Sera jikwa obi ha niile kwe ka Jehova duzie ha, ha abaa n’ala o kwere ha ná nkwa. Mgbe ha malitere njem a dị ogologo, ha ‘nwere ohere ịlaghachi’ n’obodo Ọọ ahụ bara ọgaranya ma ha chọọ. Ma, okwukwe ha mere ka ha lekwasị anya ná “mmezu nke nkwa [Chineke],” n’ihi na “ha na-achụso ebe ka mma.” (Hib. 11:8, 9, 13, 15, 16) Mozis gbakụtara akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Ijipt azụ. “Ọ họọrọ ka e megbukọta ya na ndị Chineke kama ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge.” (Hib. 11:24-26) Ka anyị jiri onyinye a Chineke nyere anyị kpọrọ ihe, jirikwa ya na-eme uche  Chineke, si otú ahụ na-eṅomi okwukwe ndị ohu Chineke n’oge ochie.

11. (a) Olee ngọzi anyị ga-enweta ma anyị jiri ikike e nyere anyị na-ekpebiri onwe anyị ihe? (b) Olee ihe kacha mkpa anyị ga-eji maka ya kpebie ime ihe dị mma?

11 Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị ka ọ̀ ka mfe ka onye ọzọ na-ekpebiri anyị ihe. Ọ bụrụ na anyị ana-ekwe ka onye ọzọ na-ekpebiri anyị ihe, ọ ga-eme ka anyị ghara inweta ngọzi anyị ga-enweta ma anyị na-ekpebi ihe anyị ga na-eme n’onwe anyị. E kwuru gbasara ngọzi ahụ na Diuterọnọmi 30:19, 20. (Gụọ ya.) Amaokwu nke iri na itoolu gosiri ihe abụọ Chineke gwara ụmụ Izrel ka ha họrọ otu na ya. N’amaokwu nke iri abụọ, Jehova nyere ha ohere na-enweghị atụ ka ha gosi ya ihe dị ha n’obi. Anyịnwakwa nwere ike iji aka anyị họrọ ife Jehova. Ihe kacha mkpa anyị ga-eji maka ya jiri ikike Chineke nyere anyị kpebie ime ihe dị mma bụ iji gosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya nakwa iji too ya.

EJILA IKIKE CHINEKE NYERE GỊ IKPEBIRI ONWE GỊ IHE EME OTÚ MASỊRỊ GỊ

12. Olee ihe anyị na-ekwesịghị iji ikike e nyere anyị ikpebiri onwe anyị ihe eme?

12 Ka e were ya na i nyere enyi gị onyinye pụrụ iche. O doro anya na obi agaghị adị gị mma ma ị nụ na ọ tụfuru onyinye ahụ, ma ọ bụkwanụ na o ji ya merụọ onye ọzọ ahụ́. Werezie ya mara otú ọ ga-adị Jehova ka ọ na-ahụ ka ọtụtụ ndị na-eji ikike o nyere ha ikpebiri onwe ha ihe eme otú masịrị ha, ma ọ bụdị jiri ya na-emerụ ndị ọzọ ahụ́. N’eziokwu, dị nnọọ ka Baịbụl buru n’amụma, “n’oge ikpeazụ,” ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-enweghị ekele.” (2 Tim. 3:1, 2) Ya adịla mgbe anyị ga-eji ikike a Jehova nyere anyị eme otú masịrị anyị. Ka anyị gharakwa igosi na o nweghị ihe anyị ji ya kpọrọ. Oleezi ihe ga-enyere anyị aka ka anyị ghara iji ya eme otú masịrị anyị?

13. Olee otu ụzọ anyị ga-esi egosi na anyị ejighị ikike anyị nwere ikpebiri onwe anyị ihe eme otú masịrị anyị?

13 Anyị niile nweere onwe anyị ikpebi ụdị ndị anyị na ha ga na-akpa, ụdị ejiji anyị ga-eji, na ụdị ihe anyị ga na-eji atụrụ ndụ. Ma, anyị nwere ike jirizie maka na anyị nweere onwe anyị ikpebi ihe anyị ga-eme na-eme ihe Chineke kpọrọ asị ma ọ bụkwanụ na-eme ka ndị ụwa. (Gụọ 1 Pita 2:16.) Kama iji ikike a na-eme ihe na-agụ “anụ ahụ́” anyị agụụ, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-ekpebi ime ihe ndị ga-enyere anyị aka irube isi n’ihe a Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.”—Gal. 5:13; 1 Kọr. 10:31.

14. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme?

 14 Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-ekpebi ime otú masịrị anyị bụ ma anyị tụkwasị Jehova obi ma kwe ka ọ na-eduzi anyị ka anyị ghara ikpebi ihe ndị na-adabaghị n’uche ya. Ọ bụ naanị ya ‘na-akụziri anyị otú anyị ga-esi baara onwe anyị uru.’ (Aịza. 48:17) Anyị kwesịrị ikweta na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ụzọ mmadụ adịghị ya n’aka. Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.” (Jere. 10:23) Ya adịla mgbe anyị ga-atụkwasị onwe anyị obi ma na-eme otú masịrị anyị, otú ahụ Adam na ndị Izrel ahụ nupụụrụ Chineke isi mere. Kama nke ahụ, ka anyị “jiri obi [anyị] dum tụkwasị Jehova obi.”—Ilu 3:5.

OTÚ ANYỊ GA-ESI EGOSI NA ANYỊ GHỌTARA NA Ọ BỤ NDỊ ỌZỌ KA Ọ DỊỊRỊ IKPEBIRI ONWE HA IHE

15. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe e kwuru ná Ndị Galeshia 6:5?

15 Otu ihe ọzọ dịkwa mkpa n’okwu a bụ na anyị kwesịrị ịghọta na ọ bụ ndị ọzọ ka ọ dịịrị iji aka ha ekpebi ihe ha ga-eme, ọ bụghị anyịnwa ga-ekpebiri ha. Ebe ọ bụ na anyị niile nwere ikike ikpebiri onwe anyị ihe anyị ga-eme, o ga-esi ezigbo ike Ndị Kraịst abụọ ekpebie ime otu ihe. Ọ ga-esikwa ezigbo ike ha ekpebie otu ihe n’ihe banyere otú ha si akpa àgwà na otú ha si efe Chineke. Cheta ihe dị ná Ndị Galeshia 6:5. (Gụọ ya.) Ọ bụrụ na anyị echeta na Onye Kraịst ọ bụla “ga-ebu ibu nke ya,” ọ ga-eme ka anyị ghọta na ọ bụ ha ka ọ dịịrị iji aka ha ekpebi ihe ha ga-eme.

Anyị nwere ike iji aka anyị ekpebi ihe anyị ga-eme ma ghara ịmanye ndị ọzọ ka ha mee uche anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

16, 17. (a) Olee otú okwu gbasara mmadụ iji aka ya ekpebi ihe ọ ga-eme si bute esemokwu na Kọrịnt? (b) Olee otú Pọl si dozie nsogbu ahụ, oleekwa ihe nke a na-akụziri anyị gbasara ịhapụ ndị ọzọ ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme?

16 Ka anyị tụlee ihe atụ dị na Baịbụl nke gosiri ihe mere anyị ji kwesị ịhapụ ụmụnna anyị ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme ma akọnuche ha kwe ha. E nwere mgbe Ndị Krịast nọ na Kọrịnt sere okwu gbasara iri anụ ọ ga-abụ na e ji chụọrọ arụsị àjà, mechaa bupụta ya n’ahịa. Ụfọdụ chere, sị: ‘Ebe ọ bụ na arụsị abụghị ihe ọ bụla, onye akọnuche ya kwere rie ya emeghị ihe ọjọọ.’ Ma, ndị ọzọ nọbu na-ekpere arụsị ndị ahụ chere na mmadụ rie ụdị anụ ahụ, onye ahụ ekpeerela arụsị. (1 Kọr. 8:4, 7) Okwu a chọrọ ibute nkewa n’ọgbakọ dị na Kọrịnt. Olee otú Pọl si nyere Ndị Kraịst nọ́ na Kọrịnt aka ka ha mata otú Chineke si ele okwu ahụ anya?

17 Pọl bu ụzọ chetara ha na nri abụghị ya ga-eme ka ha na Chineke dịrị ná mma. (1 Kọr. 8:8) Ihe ọzọ o mere bụ inye ha ndụmọdụ ka ha ghara ikwe ka ‘ikike ha nwere’ ịhọrọ ihe ha ga-eme “ghọọrọ ndị na-adịghị ike ihe ịsụ ngọngọ.” (1 Kọr. 8:9) Mgbe e mechara, ọ dụrụ ndị akọnuche ha na-ekweghị ha rie ụdị anụ ahụ ọdụ ka ha ghara ịkatọ ndị akọnuche ha kwere ha rie ya. (1 Kọr. 10:25, 29, 30) Ya bụ, n’okwu a gbasara ofufe Chineke, Onye Kraịst ọ bụla ga-ekpebi ime ihe akọnuche ya kwere ya mee. Ebe Onye Kraịst ọ bụla ga-ekpebi ihe ọ ga-eme n’ụdị okwu a, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịhapụ ụmụnna anyị ka ha jiri aka ha kpebie ihe ha ga-eme n’okwu ndị na-adịchaghị mkpa ka nke a?—1 Kọr. 10:32, 33.

18. Olee otú ị ga-esi egosi na obi dị gị ụtọ maka otú Chineke si kee gị ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ị ga-eme?

18 Jehova kere anyị niile otú anyị ga-enwe ike ịna-ekpebiri onwe anyị ihe anyị ga-eme. (2 Kọr. 3:17) Obi dị anyị ụtọ maka otú a o si kee anyị n’ihi na ọ na-eme ka anyị nwee ike ikpebi ihe ndị ga-egosi otú anyị hụruru Jehova n’anya. Ka anyị nọgide na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka otú a Chineke si kee anyị. Anyị ga-eme otú a ma anyị na-ekpebi ime ihe ndị dị ya mma, hapụkwa ndị ọzọ ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme.