Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jenụwarị 2017

Ị Ga-adịli Umeala n’Obi ma Mgbe O Siri Ike Ime Otú Ahụ

Ị Ga-adịli Umeala n’Obi ma Mgbe O Siri Ike Ime Otú Ahụ

‘Jiri obi umeala soro Chineke gị na-eje ije.’MAỊ. 6:8.

ABỤ: 48, 95

1-3. Olee ihe onye amụma ahụ si Juda a na-akpọghị aha ya na Baịbụl na-emeghị, oleekwa ihe ọ kpataara ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

E NWERE mgbe Jehova zigara otu onye amụma ya si Juda ka ọ gaa zie Eze Jerobaom ozi na-agba agba ná ntị. Jerobaom bụ eze Izrel, ma ọ kwụsịrị ife Jehova. Onye amụma a dị umeala n’obi ziri ozi ahụ otú Jehova gwara ya, Jehova anapụtakwa ya mgbe Jeroboam ji iwe chọọ igbu ya maka ozi ahụ o ziri.—1 Eze 13:1-10.

2 Mgbe onye amụma ahụ na-alaghachi, o zutere otu agadi nwoke si n’obodo Betel dị nso n’ebe ahụ. Agadi nwoke ahụ gwara ya na ya bụ onye amụma Jehova. Ọ ghọgburu onye amụma ahụ si Juda, ya emee ihe Chineke si ya emela. Chineke sịrị ya, “Erila ihe oriri, aṅụkwala mmiri, esikwala n’ụzọ i siri gaa laghachi.” Ihe a o mere wutere Jehova. Mgbe onye amụma ahụ lawaziri, ọdụm hụrụ ya n’ụzọ, dọgbuo ya.—1 Eze 13:11-24.

3 Gịnị mere onye amụma a ji gee agadi nwoke ahụ ghọgburu ya ntị kama ime ihe Jehova gwara ya? Baịbụl agwaghị anyị. Ma, o nwere ike ịbụ na o chefuru na o kwesịrị ‘iji obi umeala soro Chineke na-eje ije.’ (Gụọ Maịka 6:8.)  Na Baịbụl, ihe ndị so n’iso Jehova eje ije bụ ịna-atụkwasị ya obi, irubere ya isi, na ikwe ka ọ na-eduzi anyị. Onye dị umeala n’obi ma na ya na Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya kwesịrị ịna-akparịta ụka mgbe niile. Onye amụma ahụ gaara arịọ Jehova ka o mee ka ihe ọ gwara ya dokwuo ya anya. Ma, Akwụkwọ Nsọ ekwughị na o mere otú ahụ. Mgbe ụfọdụ, a na-enwe ihe ndị siri ike anyị ga-ekpebi, anyị anaghịkwa amacha ihe anyị ga-eme. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị ga-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ka anyị ghara ime ihe jọgburu onwe ya.

4. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị mụtara ihe mere anyị ka ji kwesị ịdị umeala n’obi nakwa otú anyị ga-esi egosi na anyị dị umeala n’obi. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka o sieere anyị ike ịdị umeala n’obi? Oleekwa otú anyị ga-esi mụta ịdị umeala n’obi, dịrịkwa ya na-aga ma mgbe o siri ike ime otú ahụ? Iji zaa ajụjụ ndị a, anyị ga-atụle ihe atọ nwere ike ime ka ịdị umeala n’obi siere anyị ike, anyị ga-ahụkwa otú anyị ga-esi mee ihe kwesịrị ekwesị na nke ọ bụla n’ime ha.—Ilu 11:2.

MGBE ỌNỌDỤ ANYỊ GBANWERE

5, 6. Olee otú Bazilaị si gosi na ya dị umeala n’obi?

5 Ihe gbanwee ná ndụ anyị, o nwere ike ime ka o siere anyị ike ịdị umeala n’obi. E nwere mgbe Devid gwara Bazilaị, bụ́ onye dị afọ iri asatọ, ka ọ bịa biri n’obí ya. Ihe a bụ ezigbo ihe ùgwù. Ọ bụrụ na o kwere, ọ gaara ebi n’obí eze, soro ya na-ekpori ndụ. Ma, ọ jụrụ. Maka gịnị? Ebe ọ bụ na o meela agadi, ọ gwara Devid na ya achọghị ịghọrọ ya ibu arọ. N’ihi ya, Bazilaị gwara Devid ka ọ kpọrọwa Kimham. Ọ ga-abụ na Kimham bụ nwa Bazilaị.—2 Sam. 19:31-37.

6 Ịdị umeala n’obi nyeere Bazilaị aka ime ihe kwesịrị ekwesị. Ihe mere o ji jụ ịga biri n’obí eze Devid abụghị n’ihi na o chere na ya erughị eru, ọ bụghịkwa n’ihi na ọ chọghị ihe ga-enye ndụ ya nsogbu. Kama ọ bụ maka na Bazilaị ma na ọnọdụ ya agbanweela, marakwa na e nwere ihe ndị ya na-agaghị emelizi. Ọ chọghị iwere ọrụ ọ ma na ya agaghị arụli. (Gụọ Ndị Galeshia 6:4, 5.) Ọ bụrụ na anyị ana-achụ ọkwá ka a na-anwụ anwụ, ma ọ bụ na-achọ ịbụ onye a ma ama, naanị ihe ọ ga-eme bụ ime ka onwe anyị buwe anyị isi, anyị amalite ịsọ mpị, nke ga-emecha kpatara anyị nsogbu. (Gal. 5:26) Ọ bụrụ na anyị adịrị obi umeala, anyị na ụmụnna anyị ga na-arụkọ ọrụ ọnụ iji hụ na a na-eto Jehova, anyị ga na-agbakwa mbọ inyere ndị ọzọ aka.—1 Kọr. 10:31.

7, 8. Olee otú ịdị umeala n’obi ga-esi mee ka anyị ghara ịtụkwasị onwe anyị obi?

7 O nwere ike isiri anyị ike ịdị umeala n’obi ma e nye anyị ihe ùgwù, ma ọ bụkwanụ nye anyị ikike buru ibu. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Nehemaya. Mgbe ọ nụrụ gbasara ọtụtụ nsogbu ụmụ Izrel nwere, ọ rịọrọ Jehova n’ekpere ka o nyere ha aka. (Nehe. 1:4, 11) Jehova zara ekpere Nehemaya. Eze Atazaksis mere ya gọvanọ obodo Izrel. N’agbanyeghi na Nehemaya aghọọla onye ukwu, baakwa ọgaranya, ọ tụkwasịghị onwe ya obi. O kwere ka Jehova na-eduzi ya, ya ana-agụkwa Iwu Chineke ka ọ mara ihe ọ ga-eme. (Nehe. 8:1, 8, 9) Nehemaya ejighị ikike o nwere na-erigbu ndị ọzọ. Kama, ọ nọ na-ejere ha ozi.—Nehe. 5:14-19.

8 Akụkọ Nehemaya gosiri otú ịdị umeala n’obi ga-esi nyere anyị aka ka anyị ghara ịtụkwasị onwe anyị obi mgbe ihe anyị na-arụ n’ọgbakọ gbanwere ma ọ bụ mgbe e nyekwuru anyị ihe ùgwù.  Ọ bụrụ na okenye atụkwasị onwe ya obi, o nwere ike ime ka ọ malite ileba anya n’ihe gbasara ọgbakọ n’ebughị ụzọ kpee ekpere. Ụfọdụ ndị nwere ike ibu ụzọ kpebichaa ihe ha ga-eme, rịọwazie Jehova ka o mee ka ihe ahụ ha kpebiri gaa nke ọma. À ga-asị na onye mere otú ahụ dị umeala n’obi? Onye dị umeala n’obi na-echeta mgbe niile na e nweghị ebe o ruuru ya na Chineke. Ọ naghị atụkwasị onwe ya obi, a sịgodi na ọ na-eme ihe o merela mbụ. (Gụọ Ilu 3:5, 6.) Ebe ọ bụ na anyị niile so n’ezinụlọ Chineke, anyị na-agbalị ịrụ ọrụ anyị dị ka ndị nọ́ n’otu ezinụlọ ma ọ bụ n’ọgbakọ, ọ bụghị iji rịgoo n’ọkwá.—1 Tim. 3:15.

MGBE A KATỌRỌ ANYỊ MA Ọ BỤ TOO ANYỊ

9, 10. Olee otú ịdị umeala n’obi ga-esi nyere anyị aka ma a katọọ anyị?

9 O nwere ike isiri anyị ike ijide onwe anyị ma a gwa anyị okwu ọjọọ. Ọ bụ ụdị ihe ahụ mere Hana. Nwunye di ya bụ́ Penina na-emewa ya obi mgbe niile. Ọ bụ eziokwu na di ya hụrụ ya n’anya nke ukwuu, ma obi adịghị ya mma, n’ihi na ọ bụ nwaanyị aga. N’otu oge, mgbe Hana nọ na-ekpe ekpere n’ụlọ nsọ, Ilaị, bụ́ nnukwu onye nchụàjà, boro ya ebubo na ọ ṅụjuola mmanya isi. Legodi nnọọ. Ma, n’agbanyeghị ihe a niile, Hana jidere onwe ya, wetuo obi gwa Ilaị na e nweghị mmanya ya ṅụrụ. Hana mechara kpee ekpere gosiri na o nwere okwukwe na Jehova, nakwa na ọ hụrụ Chineke n’anya.—1 Sam. 1:5-7, 12-16; 2:1-10.

10 Anyị dịrị umeala n’obi, ọ ga-enyekwara anyị aka ‘iji ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.’ (Rom 12:21) Ọ bụ ihe ọjọọ juru n’ụwa Setan a. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị ghara ikwe ka ihe na-adịghị mma ndị ọzọ na-eme na-eme anyị obi ọjọọ. (Ọma 37:1) O nwere ike ịkacha ewute anyị ma ọ bụrụ na ọ bụ nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị mere ihe ahụ. Ụdị ihe a mee, onye dị umeala n’obi ga-eṅomi Jizọs. Baịbụl kwuru na “mgbe a na-ekwujọ ya, ọ dịghị ekwujọgwara . . . , kama ọ nọ na-enyefe onwe ya n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” (1 Pita 2:23) Jizọs ma na ọ bụ  Jehova nwe ịbọ ọbọ. (Rom 12:19) Anyị kwesịkwara ịdị umeala n’obi, gharakwa ‘iji ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ.’—1 Pita 3:8, 9.

11, 12. (a) E towe anyị gabiga okè, olee otú anyị ga-esi egosi na anyị dị umeala n’obi? (b) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị dị umeala n’obi n’otú anyị si eji ejiji nakwa n’otú anyị si akpa àgwà?

11 Ọ bụrụ na e towe anyị gabiga okè, o nwere ike ime ka o siere anyị ike ịdị umeala n’obi. Ka anyị lee ihe Esta mere mgbe ọnọdụ ya gbanwere. Ọ mara mma dị egwu. E dowekwara ya ebe a na-elekọta ya, na-enyekwa ya ihe ahụ́ ya chọrọ ruo otu afọ. O so n’ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị ọzọ si ebe dị iche iche n’Alaeze Peshia nọkọta ọnụ na-ejike ka a mara onye nke eze Peshia ga-alụ. N’agbanyeghị ihe a, onwe ya ebughị ya isi, ọ nọkwa na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. O bidoghịkwa dịwa mpako mgbe eze mechara họrọ ya ka ọ bụrụ nwunye ya.—Esta 2:9, 12, 15, 17.

Otú anyị si eji ejiji, ọ̀ na-egosi na anyị na-akwanyere Jehova na ndị ọzọ ùgwù, ka ọ̀ na-egosi na anyị adịghị umeala n’obi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12 Anyị dịrị umeala n’obi, ọ ga-eme ka anyị na-eji ejiji, na-akpakwa àgwà otú ga-egosi na anyị na-ekwanyere ndị ọzọ ùgwù. Kama ịna-etu ọnụ ma ọ bụ ịna-eme ka a hụchata anyị, ka anyị cheta na ihe ga-eme ka ihe anyị na-amasị ndị ọzọ bụ ma anyị nwee ‘mmụọ dị jụụ, dịkwa nwayọọ.’ (Gụọ 1 Pita 3:3, 4; Jere. 9:23, 24) Ọ bụ otú anyị si ekwu okwu ma ọ bụ otú anyị si eme ka e si ama ma onwe anyị ọ̀ na-ebu anyị isi. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike malite ịna-agwa ndị ọzọ gbasara ihe ndị anyị na-arụ n’ọgbakọ, otú anyị si mara ihe na-aga n’ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ otú anyị na ụmụnna ndị a ma ama si bụrụ enyi. Ma ọ bụkwanụ, anyị nwere ike ikwu okwu otú ga-eme ka ndị ọzọ towe naanị anyị maka ihe anyị na ndị ọzọ mere. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Jizọs. Ebe o si nweta ọtụtụ n’ime ihe ndị o kwuru bụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. O kwuru ihe ndị a otú ga-eme ka ndị na-ege ya ntị mata na ha si n’aka Jehova, ọ bụghị n’echiche nke onwe ya.—Jọn 8:28.

MGBE ANYỊ NA-EKPEBI IHE ANYỊ GA-EME

13, 14. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, olee otú ọ ga-esi enyere anyị aka ikpebi ihe ndị dị mma?

13 Mgbe ọzọ anyị ga-egosi ma ànyị dị umeala n’obi bụ mgbe anyị chọrọ ikpebi ihe anyị ga-eme, ma ọ bụkwanụ mgbe e kpebiri ihe gbasara anyị. Mgbe Pọl nọ na Sesaria, Agabọs onye amụma gwara ya na ọ bụrụ na ọ gaa Jeruselem, a ga-anwụchi ya. E nwedịrị ike igbu ya. Ụjọ tụrụ ụmụnna ndị Sesaria, ha arịọ Pọl ka ọ ghara ịga. Ma, Pọl ekweghị. Ihe mere na o kweghị eme ihe ha kwuru abụghị n’ihi na o weere onwe ya ka anwụ anwụ. Ụjọ atụghị ya n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi kpamkpam. O kpebisikwara ike na ya ga-agaru ozi o dunyere ya n’isi, ebe ọ sọkwara ya ya bụrụ. Mgbe ụmụnna hụrụ ihe o kpebiri ime, ha kwụsịziri inye ya nsogbu.—Ọrụ 21:10-14.

14 Ọ bụrụkwa na anyị dị umeala n’obi, ọ ga-eme ka anyị kpebie ihe dị mma, a sịgodi na anyị amaghị ihe ga-emecha si na ya pụta. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị abanye n’ozi oge niile, anyị nwere ike ịna-eche ihe nwere ike ime anyị ma ahụ́ rịawa anyị, na otú anyị ga-esi elekọta ndị mụrụ anyị mere agadi, nakwa otú anyị ga-esi elekọta onwe anyị ma anyị kaa nká. O nweghị ihe anyị ga-ekpe n’ekpere ma ọ bụ mee na nchọnchọ, anyị amatachaa ihe anyị ga-eme. (Ekli. 8:16, 17) Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, ọ ga-eme ka anyị mara ihe anyị ga-emeli na ebe ike anyị ruru. Anyị mechaa nchọnchọ, jụọ ndị ọzọ ase, kpeekwa ekpere ka Jehova duzie anyị, ka anyị mee ihe ọ bụla ọ chọrọ ka anyị mee. (Gụọ Ekliziastis 11:4-6.)  Jehova ga-eme ka ihe anyị kpebiri ime gaa nke ọma, ma ọ bụkwanụ ya enyere anyị aka anyị amara ma ànyị ga-ekpebi ime ihe ọzọ.—Ilu 16:3, 9.

NỌGIDE NA-ADỊ UMEALA N’OBI

15. Olee otú iche banyere Jehova ga-esi enyere anyị aka ịdị umeala n’obi?

15 Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ uru anyị ga-erite ma anyị dịrị umeala n’obi, olee ihe ga-enyere anyị aka ịnọgide na-adị umeala n’obi? Ka anyị tụlee ihe anọ. Nke mbụ, anyị ga-adị umeala n’obi ma ọ bụrụ na anyị ana-atụ egwu Jehova, ghọtakwa na o nweghị ebe anyị ruru ya. (Aịza. 8:13) Ka anyị cheta na ọ bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile ka anyị na ya na-emekọ ihe, ọ bụghị mmụọ ozi ma ọ bụ mmadụ nkịtị. Anyị ghọta nke a, ọ ga-eme ka anyị ‘weda onwe anyị ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke.’—1 Pita 5:6.

16. Olee otú anyị iche banyere otú Jehova si hụ anyị n’anya si enyere anyị aka ịdị umeala n’obi?

16 Ihe nke abụọ ga-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi bụ iche banyere otú Jehova si hụ anyị n’anya. Pọl onyeozi kwuru na Jehova mere ka akụkụ ahụ́ ndị e chere na o nweghị ihe ha bụ nwee “nsọpụrụ ka ukwuu.” (1 Kọr. 12:23, 24) Otú ahụkwa ka onye ọ bụla n’ime anyị bara uru n’anya Jehova, n’agbanyeghị na e nwere ebe ndị anyị na-anaghị emete. Ọ naghị eji otu onye atụnyere nwanne ya, ma ọ bụkwanụ kwụsị ịhụ anyị n’anya n’ihi na anyị mehiere ihe. Obi na-eru anyị ala n’ọrụ ọ bụla anyị na-arụrụ ya n’ihi na anyị ma na ọ hụrụ anyị n’anya.

17. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị lekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma?

17 Ihe nke atọ ga-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi bụ ma anyị ghọta ihe bụ́ ọrụ anyị n’ọgbakọ Jehova, na-elekwasịkwa anya n’ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma. Kama ịchọwa ka a hụchata anyị, ma ọ bụkwanụ chọwa ịna-atụrụ ndị ọzọ ihe ha ga-eme, anyị ga-eji obi umeala na-ajụ ha ma hà nwere ndụmọdụ ha ga-enye anyị, na-emekwa ihe ha gwara anyị. (Ilu 13:10) Anyị ga-eso ha na-aṅụrị ọṅụ ma e nye ha ọrụ pụrụ iche. Anyị ga na-etokwa Jehova ka anyị na-ahụ otú o si na-agọzi “ụmụnna [anyị] niile ndị nọ n’ụwa.”—1 Pita 5:9.

18. Olee otú ịzụ akọnuche anyị ga-esi enyere anyị aka ịdị umeala n’obi?

18 Ihe nke anọ ga-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi bụ ma anyị jiri Baịbụl na-azụ akọnuche anyị. Anyị ga-enwe ike ikpebi ime ihe ndị ga-amasị Jehova ma ọ bụrụ na anyị amụta ịna-ele ihe anya otú o si ele ya. Ọ bụrụ na anyị ana-amụchi ihe anya, na-ekpe ekpere ma na-eme ihe anyị mụtara, ọ ga-eme ka anyị jiri nwayọọ nwayọọ zụọ akọnuche anyị nke ọma. (1 Tim. 1:5) Anyị ga-amụta ịna-ebute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ. Anyị mee ike anyị, Jehova kwere nkwa na ya ‘ga-enyesị anyị ọzụzụ,’ nke ga-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi, na-emekwa ka ya.—1 Pita 5:10.

19. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-adị umeala n’obi ruo mgbe ebighị ebi?

19 Onye amụma ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite na Jehova kwụsịrị ịdị ná mma, ya anwụọkwa, n’ihi na ọ kpara àgwà gosiri na ọ dịghị umeala n’obi. Ma, anyị ga-anọgideli na-adị umeala n’obi ma e nwegodị ihe mere ka o siere anyị ike ime otú ahụ. Otú ndị ohu Chineke n’oge ochie nakwa n’oge a sirila kpaa àgwà gosiri na anyị ga-emeli ya. Ka anyị na-ejekwuru Jehova ozi, anyị ga na-adịkwu umeala n’obi. (Ilu 8:13) N’agbanyeghị ihe bụ́ ọrụ anyị ugbu a n’ọgbakọ Jehova, naanị isodị Jehova na-eje ije bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ. Jiri ya kpọrọ ihe, gbalịakwa ike gị niile ka i jiri obi umeala soro ya na-eje ije ruo mgbe ebighị ebi.