Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jenụwarị 2017

Ihe Mere Anyị Ka Ji Kwesị Ịna-adị Umeala n’Obi

Ihe Mere Anyị Ka Ji Kwesị Ịna-adị Umeala n’Obi

“Ndị dị obi umeala nwere amamihe.”ILU 11:2.

ABỤ: 38, 69

1, 2. Gịnị mere Chineke ji jụ otu nwoke dịbu umeala n’obi? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

MGBE Eze Sọl malitere ịchị ụmụ Izrel oge ochie, ọ dị obi umeala, ndị ọzọ na-akwanyekwara ya ùgwù. (1 Sam. 9:1, 2, 21; 10:20-24) Ma, obere oge ọ ghọchara eze, o mere ọtụtụ ihe gosiri na ọ dị mpako. E nwere otu oge Samuel onye amụma gburu oge ịga Gilgal chụọ àjà, Sọl enweghị ndidi chere ya. Ndị Filistia nọ na-ejikere ịbịa busoo ha agha, ọtụtụ ndị Izrel ana-ahapụkwa ya na-agbasasị. Ọ ga-abụ na Sọl nọ na-eche mgbe ahụ, sị: ‘M kwesịrị ime ihe ngwa ngwa ugbu a.’ N’ihi ya, ọ chụụrụ Chineke àjà, bụ́kwanụ ọrụ na-erughịrị ya. Ihe ahụ o mere wutere Jehova.—1 Sam. 13:5-9.

2 Mgbe Samuel rutere Gilgal, ọ baara Sọl mba. Kama Sọl ga-anabata ihe a gwara ya, ọ gọwara isi ya, chọwadị ibulara ya ndị ọzọ, na-emekwa ka o nweghị oké ihe dị n’ihe ahụ o mere. (1 Sam. 13:10-14) Malite mgbe ahụ gawa, Sọl meweziri ihe ndị gosiri na ọ dị mpako, ndị mechara mee ka ọ gharazie ịbụ eze, ya na Jehova agharaziekwa ịdị ná mma.  (1 Sam. 15:22, 23) Ọ bụ eziokwu na Sọl dị umeala n’obi ná mmalite, ma otú ihe si gaara ya n’ikpeazụ jọgburu onwe ya.—1 Sam. 31:1-6.

3. (a) Gịnị ka ọtụtụ ndị chere gbasara ịdị umeala n’obi? (b) Olee ajụjụ ndị e kwesịrị ịza?

3 N’ụwa a onye ọ bụla na-achọ ịka ibe ya, ọtụtụ ndị chere na ha ga-abụrịrị ndị a ma ama ka ihe nwee ike ịgaziri ha. N’ihi ya, ha anaghị adị umeala n’obi. Dị ka ihe atụ, otu nwoke a ma ama na-eme fim, na-azọkwa ọchịchị kwuru, sị: “E nweghị ihe jikọrọ mụ na ịdị umeala n’obi, e nweghịkwanụ otú m ga-esi adịli umeala n’obi.” Oleezi ihe mere anyị ka ji kwesị ịdị umeala n’obi? Olee ihe e ji ama onye dị umeala n’obi na onye na-adịghị? Oleekwa otú anyị ga-esi na-adị umeala n’obi mgbe e nwere ihe mere ka o sie ike, ma ọ bụkwanụ mgbe ndị ọzọ chọrọ ime ka anyị dị mpako? N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ abụọ mbụ ahụ a jụrụ, zazie nke atọ n’isiokwu na-esonụ.

OLEE IHE MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊDỊ UMEALA N’OBI?

4. Gịnị ka e ji ama onye dị mpako?

4 Baịbụl gwara anyị otú ịdị umeala n’obi si dịrị iche n’ịdị mpako. (Gụọ Ilu 11:2.) Devid rịọrọ Jehova ka ọ ghara ‘ikwe ka ya mee omume mpako.’ (Ọma 19:13) Olee omume ndị bụ́ omume mpako? Ọ bụrụ na mmadụ akaa anya mee ihe a na-enyeghị ya ikike ime, o meela omume mpako. Mgbe ụfọdụ, anyị niile na-eme omume mpako n’ihi na anyị ezughị okè. Ma, ọ bụrụ na anyị na-emekarị ihe na-erughịrị anyị, otú ahụ Eze Sọl mere, ka oge na-aga, ihe anyị ga na-ewe Chineke iwe. Abụ Ọma 119:21 kwuru na Jehova ‘na-abara ndị mpako mba.’ Gịnị mere Jehova ji abara ha mba?

5. Olee ihe mere mpako ji jọgbuo onwe ya?

5 Mmadụ ime ihe na-erughịrị ya jọgbudịrị onwe ya karịa mmadụ imehie ihe n’amaghị ama. Otu ihe mere o ji jọgbuo onwe ya bụ na onye na-eme otú a anaghị ewere Jehova ka onye kwesịrị ịchị ya. Nke abụọ bụ na ọ bụrụ na anyị emee ihe na-erughịrị anyị, anyị na ndị ọzọ nwere ike ise okwu. (Ilu 13:10) Nke atọ bụ na anyị nwere ike imenye onwe anyị ihere, ma ọ bụkwanụ a chịwa anyị ọchị, ma ọ bụrụ na a mata na anyị mere ihe anyị na-ekwesịghị ime. (Luk 14:8, 9) O nweghị mgbe mmadụ ịrụ ọrụ na-erughịrị ya na-arụpụta ezigbo ihe. Ọ kacha mma ịdị umeala n’obi otú ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru.

OLEE OTÚ E SI AMA ONYE DỊ UMEALA N’OBI?

6, 7. Olee ihe e ji ama onye dị umeala n’obi?

6 Ihe e ji amakarị onye dị umeala n’obi bụ na ọ maara ebe ike ya ruru. Dị ka e kwuru na Baịbụl, otu ihe e ji ama onye dị umeala n’obi bụ na ọ naghị ebuli onwe ya elu. E kwuru na onye dị otú ahụ ‘dị nwayọọ n’obi.’ (Fil. 2:3) Onye dị umeala n’obi anaghị eme ihe na-erughịrị ya, ọ naghị etu ọnụ, ọ na-ekweta ma o mejọọ ihe, ọ na-egekwa ndị ọzọ ntị. N’eziokwu, ụdị àgwà a na-eme Jehova obi ụtọ.

7 Baịbụl kwuru na onye dị umeala n’obi ma na o nwere ihe ndị ọ na-agaghị emeli, ma ọ bụkwanụ ihe ndị a na-enyeghị ya ikike ime. Ihe a na-eme ka ọ kwanyere ndị ọzọ ùgwù, jirikwa obiọma na-emeso ha ihe.

8. Olee ihe ụfọdụ na-egosi na mmadụ adịwala mpako?

8 Olee otú anyị nwere ike isi malite ịdị mpako? Lee ihe ụfọdụ nwere ike inyere anyị aka ịmata ma ànyị adịwala mpako. Anyị nwere ike ịna-ewere onwe anyị ka ànyị adịka mkpa, ma ọ bụkwanụ were ya ka o nweghị onye ha ka anyị n’ihi ọrụ e nyere anyị. (Rom 12:16) Anyị nwere ike ịna-eme ihe ndị ga-eme ka ndị ọzọ towe anyị. (1 Tim. 2:9, 10) Ma ọ bụkwanụ anyị  nwere ike ikwo maka ọkwá anyị ma ọ bụ ndị anyị ma na-esi ọnwụ ka e mee ihe anyị chọrọ. (1 Kọr. 4:6) Mgbe ụfọdụ, onye na-eme ụdị ihe a nwedịrị ike ọ gaghị ama na ya adịwala mpako.

9. Olee ihe mere ụfọdụ ji dịwa mpako? Nye ihe atụ si na Baịbụl.

9 O nweghị onye na-agaghị amaliteli ịdị mpako ma ọ bụrụ na ọ chịkwaghị ihe na-agụ anụ ahụ́ ya agụụ. Oké ọchịchọ, anyaụfụ, na iwe ọkụ, emeela ka ụfọdụ kpaa àgwà gosiri na ha dị mpako. Ụdị ihe a mere ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, dị ka Absalọm, Ọzaya, na Nebukadneza. Jehova mesikwara ha ike n’ihi mpako ha.—2 Sam. 15:1-6; 18:9-17; 2 Ihe 26:16-21; Dan. 5:18-21.

10. Gịnị mere anyị ekwesịghị ikwubi ihe mere ndị ọzọ ji mee ihe ha mere? Nye ihe atụ.

10 Ma, e nwere ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka ụfọdụ mee omume mpako. Iji maa atụ, ka anyị tụlee akụkọ a kọrọ na Jenesis 20:2-7 na Matiu 26:31-35. Ihe mere ha ji mee ihe ha mere ọ̀ bụ n’ihi na ha dị mpako? Ka ọ̀ ga-abụ na ha aghọtaghị ihe niile merenụ, ma ọ bụkwanụ na ha echebaghịrị ya echiche nke ọma? Ebe ọ bụ na anyị anọghị ndị ọzọ n’obi, ọ ga-akacha mma ka anyị ghara ikwubi ihe mere ha ji mee ihe ha mere n’ihi na anyị amaghị ihe dị ha n’obi.—Gụọ Jems 4:12.

KA ANYỊ GHỌTA IHE BỤ́ ỌRỤ ANYỊ

11. Olee otú anyị ịma ihe bụ́ ọrụ anyị n’ọgbakọ Chineke si egosi na anyị dị umeala n’obi?

11 Otú anyị si egosi na anyị dị umeala n’obi bụ na anyị ga-ebugodị ụzọ mara ihe bụ́ ọrụ anyị n’ọgbakọ Jehova. Jehova abụghị Chineke aghara. O nyere onye ọ bụla ihe ọ ga na-arụ n’ọgbakọ. Ọ bụ eziokwu na ihe onye ọ bụla na-arụ n’ọgbakọ dị iche iche, ma anyị niile dịcha mkpa. Jehova nwere obi ebere. O nyere onye ọ bụla n’ime anyị onyinye dị iche iche, meekwa ka anyị nwee nkà dị iche iche. Anyị nwere ike iji ha na-ejere Jehova ozi, na-emekwa ihe ga-abara ndị ọzọ uru. (Rom 12:4-8) Jehova enyela anyị onyinye ndị pụrụ iche. Ọ chọkwara ka anyị jiri ha na-eme ihe bara uru.—Gụọ 1 Pita 4:10.

Olee otú ihe Jizọs mere mgbe ọrụ ya gbanwere ga-esi enyere anyị aka ma ọrụ anyị gbanwee? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12-14)

12, 13. Gịnị mere o kwesịghị iju anyị anya ma ọ bụrụ na ihe anyị na-arụ n’ọgbakọ ana-agbanwe mgbe ụfọdụ?

12 A kụghị ihe anyị ga-arụ n’ọgbakọ Jehova ntu. O nwere ike ịgbanwe ka oge na-aga. Tụlegodi ihe gbasara Jizọs. Ná mmalite, ya na Chineke nọ n’eluigwe. (Ilu 8:22) E mechaa, ya esoro Chineke kee ndị mmụọ ozi ndị ọzọ, eluigwe na ala nakwa ụmụ mmadụ. (Kọl. 1:16) Ma, ka oge na-aga, Jizọs nwetara ọrụ ọzọ n’ụwa. Ọ bịara ghọọ nwa ọhụrụ na-enweghị ihe ọ bụla ọ ma, mechaakwa ghọọ dimkpa. (Fil. 2:7) Mgbe o jichara ndụ ya chụọ àjà, ọ laghachiri eluigwe bụrụkwa mmụọ, ka ọ chịwa n’Alaeze Chineke n’afọ 1914. (Hib. 2:9) Ma, nke a agaghị abụ nke ikpeazụ ọrụ ya ga-agbanwe. Ọ chịchaa Ọchịchị Puku Afọ ya, ọ ga-ewerezi Alaeze ya nyefee Jehova, ka “Chineke wee bụrụ ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.”—1 Kọr. 15:28.

13 Anyị kwesịkwara ịtụ anya na ọrụ anyị nwekwara ike ịgbanwe ka oge na-aga. Ihe ụfọdụ anyị kpebiri ime ná ndụ na-eso akpata mgbanwe ndị a. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ikpebi na anyị ga-alụ di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụkwanụ kpebie na anyị ga-amụ ụmụ. Ka oge na-aga, anyị nwere ike ịhazi ihe ndị anyị na-eme ka anyị nwee ike ịbanye n’ozi oge niile. Ihe ọ bụla anyị kpebiri n’ihe ndị a nwechara ọrụ ya na ya so. Ọ bụrụ na ọnọdụ anyị agbanwee, o nwere ike ime ka anyị nwekwuo ọrụ anyị ga na-arụ ma ọ bụkwanụ mee ka nke anyị na-arụ arụ beleta. Ma ànyị ka na-eto eto ma ànyị emeela agadi, ma ahụ́ ọ̀ dị anyị ma ahụ́  ọ̀ na-enyetụ anyị nsogbu, Jehova ma ọrụ kacha mma ọ ga-enye anyị ná nzukọ ya. Ọ naghị atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. O jikwa ihe ọ bụla anyị na-eme kpọrọ ihe.—Hib. 6:10.

14. Ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi, olee otú ọ ga-esi enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ n’ọnọdụ ọ bụla anyị nọ na ya?

14 Ihe niile Jizọs rụrụ mere ya obi ụtọ, anyị nwekwara ike inwe obi ụtọ n’ihe ọ bụla anyị na-arụ. (Ilu 8:30, 31) Ihe ọ bụla onye dị umeala n’obi na-arụ n’ọgbakọ na-eju ya afọ. Inwetakwu ihe ùgwù n’ọgbakọ anaghị echu ya ụra, ọ naghịkwa emere ndị ọzọ anyaụfụ n’ihe ndị ha na-arụ. Kama, ọ na-eji ike ya niile arụ nke ọ bụla e nyere ya, na-enwekwa obi ụtọ na ya, n’ihi na o weere ya na ọrụ ọ bụla e nyere ya si n’aka Jehova. Ọ naghịkwa etinye anya n’ọrụ Jehova nyere ndị ọzọ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, ọ ga-enyere anyị aka iji obi anyị niile na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma na-akwado ha.—Rom 12:10.

OTÚ ANYỊ NA-EKWESỊGHỊ ISI ELE ÀGWÀ A BỤ́ ỊDỊ UMEALA N’OBI ANYA

15. Olee ihe anyị na-amụta n’otú Gidiọn si dịrị umeala n’obi?

15 Gidiọn bụ nwoke dị ezigbo umeala n’obi. N’oge mbụ mmụọ ozi Jehova bịakwutere ya, o kwuru na ya si n’ezinụlọ kacha nta n’Izrel. (Ikpe 6:15) Mgbe ọ narachara ọrụ ahụ Jehova nyere ya, ọ gbalịrị ghọta ihe a chọrọ ka o mee, rịọkwa Jehova ka o duzie ya. (Ikpe 6:36-40) Gidiọn nwere obi ike. Ma, ọ kpara àgwà otú gosiri na ọ ma ihe. (Ikpe 6:11, 27) O leghị ọrụ a e nyere ya anya ka ohere ọ ga-eji mee ka ndị mmadụ mara ya.  Kama nke ahụ, ozugbo ọ rụchara ọrụ e nyere, ọ laghachiri n’ọrụ ọ na-arụbu.—Ikpe 8:22, 23, 29.

16, 17. Gịnị ka onye dị umeala n’obi ga-atụle mgbe ọ na-eche ma ọ̀ ga-anara ọrụ a chọrọ inyekwu ya n’ọgbakọ?

16 Ihe anyị na-ekwu abụghị na onye dị umeala n’obi anaghị agba mbọ ka o ruo eruo ka a họpụta ya ịrụkwu ọrụ ndị dị n’ọgbakọ. Akwụkwọ Nsọ gbara anyị niile ume ka anyị gbaa mbọ na-enwe ọganihu. (1 Tim. 4:13-15) Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ pụtara na ihe ga-egosi na anyị na-enwe ọganihu bụ na a ga na-agbanwere anyị ihe anyị na-arụ? Ọ bụghị ihe ọ pụtara. Jehova ka ga-enyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma n’ọrụ anyị na-arụ ugbu a. Anyị ga-enwelikwa ike ijikwu onyinye ndị Chineke nyere anyị na-eme ihe ndị bara uru.

17 Ihe e jikwa ama onye dị umeala n’obi bụ na tupu ya anara ọrụ ọhụrụ a chọrọ inye ya, ọ na-ebu ụzọ mara ihe ọ chọrọ ya n’aka. Ọ ga-elebazi anya n’otú ihe si dịrị ya iji mara ma ọ̀ ga-arụli ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ nara ọrụ ahụ, ọ̀ ka ga-enweli efe ịrụ ọrụ ndị ọzọ dị mkpa ọ na-arụ? Ò nwere ike inye ndị ọzọ ọrụ ndị ọ na-arụ ugbu a ka o nwee ike ịrụ nke ọhụrụ a chọrọ inye ya? Ọ bụrụ na ihe ọ zara n’ajụjụ nke mbụ ma ọ bụ na ha abụọ bụ mba, ọ pụtara na o nwere ike ikwu ka e nye onye ọzọ ọrụ ahụ ruo mgbe yanwa ga-enwe ike ịnara ọrụ ọhụrụ. Anyị kpee ekpere ma chebara ya echiche nke ọma, ọ ga-enyere anyị aka anyị aghara ikweta ime ihe anyị na-agaghị emeli. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị agaghị anara ọrụ ahụ.

18. (a) Anyị dịrị umeala n’obi, gịnị ka ọ ga-eme ka anyị mee ma e nye anyị ọrụ ọhụrụ? (b) Olee otú ihe e kwuru ná Ndị Rom 12:3 si gbasa onye dị umeala n’obi?

18 Akụkọ Gidiọn gosiri na anyị agaghị enweli ike ịrụ ọrụ e nyere anyị ma ọ bụrụ na Jehova anọnyereghị anyị. A sị ka e kwuwe, a kpọọla anyị ka anyị “soro Chineke [anyị] na-eje ije.” (Maị. 6:8) N’ihi ya, mgbe ọ bụla e nyekwuru anyị ọrụ ọhụrụ, anyị kwesịrị iche ezigbo echiche gbasara ihe Jehova na-agwa anyị n’Okwu ya nakwa n’ọgbakọ ya. Anyị kwesịrị ịmụta otú anyị ga-esi na-agbanwe ihe ndị anyị na-eme ka anyị nwee ike ịna-eso Jehova. Ka anyị cheta na ọ bụghị ike anyị na-eme ka anyị na-arụ ihe ndị anyị na-arụ n’ozi Jehova, kama ọ bụ n’ihi na Jehova dị umeala n’obi, chọọkwa inyere anyị aka. (Ọma 18:35) Ọ bụrụ na anyị ejiri obi umeala soro Chineke na-eje ije, ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-eche na o nweghị onye ha ka anyị, ma ọ bụkwanụ na e nweghị ihe anyị dị mma ya.—Gụọ Ndị Rom 12:3.

19. Olee ihe ndị mere anyị ji kwesị ịdị umeala n’obi?

19 Onye dị umeala obi ma na ọ bụ naanị Jehova ka e kwesịrị inye otuto niile maka ọganihu ọ bụla anyị nwere n’ihi na ọ bụ ya kere anyị, ọ bụkwa ya bụ Onye Kasị Ihe Niile Elu n’eluigwe na ala. (Mkpu. 4:11) Anyị dịrị umeala n’obi, obi ga-adị anyị ụtọ n’ihe ọ bụla anyị na-arụ n’ozi Jehova, anyị ga-ejikwa obi anyị dum na-arụ ya. Onye dị umeala n’obi agaghị na-esi ọnwụ ka e mee uche ya, ọ ga na-ege ndị ọzọ ntị, nke ga-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ Jehova. Ọ bụrụkwa na anyị adịrị umeala n’obi, anyị ga-ewere na ndị ọzọ ka anyị, ọ ga-emekwa ka anyị na-elezi anya ma ghara itinye aka ná mmehie dị oké njọ. Ọ bụ ihe ndị a niile mere ndị ohu Chineke ka ji kwesị ịdị umeala n’obi, Jehova ejighịkwa ndị dị umeala n’obi egwu egwu. Ma, oleekwanụ otú anyị ga-esi na-adị umeala n’obi mgbe e nwere ihe mere ka o sie ike? Isiokwu na-esonụ ga-agwa anyị ihe ga-enyere anyị aka.