Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Jenụwarị 2016

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka ‘Onyinye Chineke Na-enye n’Efu’

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka ‘Onyinye Chineke Na-enye n’Efu’

“Ekele dịrị Chineke maka onyinye ya a na-apụghị ịkọwa akọwa nke ọ na-enye n’efu.”—2 NDỊ KỌRỊNT 9:15.

ABỤ: 121, 63

1, 2. (a) Olee ihe ndị só ‘n’onyinye a na-apụghị ịkọwa akọwa Chineke nyere anyị n’efu’? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

JEHOVA zitere Ọkpara ya n’ụwa ka ọ nwụọ n’ihi anyị. O si otú a nye anyị onyinye kacha egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. (Jọn 3:16; 1 Jọn 4:9, 10) Pọl onyeozi kpọrọ ya ‘onyinye a na-apụghị ịkọwa akọwa nke ọ na-enye n’efu.’ (2 Ndị Kọrịnt 9:15) N’ihi gịnị?

2 Pọl ma na ọ bụ àjà ahụ Jizọs chụrụ ga-eme ka ọmarịcha nkwa niile Chineke kwere anyị mezuo. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:20.) Ihe ọ pụtara bụ na ‘onyinye Chineke a na-apụghị ịkọwa akọwa’ bụ ma àjà ahụ Jizọs chụrụ ma ịhụnanya Jehova nke na-adịgide adịgide ma ihe ọma niile ọ na-emere anyị. O nweghị otú a ga-esi kọwaa ụdị onyinye ahụ ka anyị ghọtachaa ya. Olee otú obi kwesịrị ịdị anyị n’ihi onyinye a pụrụ iche? Olee otú anyị kwesịrị isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ya ka anyị na-akwadebe maka Ncheta Ọnwụ Kraịst na Wenezdee, abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa atọ, n’afọ 2016?

 ONYINYE PỤRỤ ICHE CHINEKE NYERE ANYỊ

3, 4. (a) Olee otú obi na-adị gị ma e nye gị onyinye? (b) Olee otú onyinye pụrụ iche nwere ike isi mee ka ndụ mmadụ gbanwee?

3 Obi na-adị anyị ụtọ ma e nye anyị onyinye. Ma e nwere onyinye ndị bara uru ma ọ bụ pụọ iche nke na ha nwere ike ịgbanwe ndụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na mmadụ gburu ọchụ. E kwesịrị igbu ya maka ihe ahụ o mere. Ma, otu onye ọ na-amaghị ejiri obi ya niile kweta ịnwụchitere ya ọnwụ. Olee otú ụdị onyinye ahụ pụrụ iche ga-eme ka obi dị́ onye ahụ gburu mmadụ?

4 Ụdị onyinye ahụ pụrụ iche ga-eme ka onye ahụ gbanwee ihe ụfọdụ ná ndụ ya. O nwere ike imekwa ka ọ na-emesapụkwuru ndị ọzọ aka, na-ahụkwu ndị ọzọ n’anya, na-agbagharakwa onye ọ bụla mejọrọ ya. Ruo mgbe ọ ga-anwụ, ọ ga-achọ ịna-egosi na obi dị ya ụtọ maka ihe ahụ e meere ya.

5. Gịnị mere àjà ahụ Jizọs chụrụ ji bụrụ onyinye karịrị onyinye ọ bụla ọzọ?

5 Onyinye ahụ pụrụ iche Chineke nyere anyị karịrị onyinye ahụ anyị ji mee ihe atụ. (1 Pita 3:18) Chegodị echiche. Anyị niile ketara mmehie n’aka Adam. Ihe mmehie na-akpata bụ ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Ọ bụ ịhụnanya Jehova mere ka o zite Jizọs n’ụwa ka ọ nwụọ n’ihi mmadụ niile, ya bụ, ka o “detụ ọnwụ ire maka mmadụ niile.” (Ndị Hibru 2:9) Ma e nwere ihe ọzọ àjà ahụ Jizọs chụrụ ga-eme. Ọ ga-ewepụ ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. (Aịzaya 25:7, 8; 1 Ndị Kọrịnt 15:22, 26) Ndị niile nwere okwukwe na Jizọs ga-ebi n’udo, obi adịkwa ha ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Ụfọdụ ga-eso Kraịst bụrụ eze n’eluigwe. Ndị ọzọ ga-ebi n’ụwa mgbe Alaeze Chineke ga na-achị. (Ndị Rom 6:23; Mkpughe 5:9, 10) Olee ihe ọma ndị ọzọ só n’onyinye ahụ Jehova nyere anyị?

6. (a) Olee ihe ọma ndị só n’onyinye ahụ Jehova nyere anyị ị na-atụ anya ya? (b) Olee ihe atọ onyinye ahụ Chineke nyere anyị ga-eme ka anyị mee?

6 Ihe ọma ndị ọzọ só n’onyinye Chineke bụ na ụwa ga-abụ paradaịs, a ga-agwọ ndị ọrịa, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. (Aịzaya 33:24; 35:5, 6; Jọn 5:28, 29) Anyị hụrụ Jehova na Ọkpara ya n’anya maka ‘onyinye ahụ a na-apụghị ịkọwa akọwa ha nyere anyị n’efu.’ Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ahụ? Ọ bụ (1) ịna-eṅomi Jizọs, (2) ịna-ahụ ụmụnna anyị n’anya, na (3) iji obi anyị niile na-agbaghara ndị ọzọ.

“ỊHỤNANYA NKE KRAỊST NWERE NA-AKPALI ANYỊ”

7, 8. Olee otú ịhụnanya Kraịst kwesịrị ime ka obi dị́ anyị? Gịnịkwa ka o kwesịrị ime ka anyị mee?

7 Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị iji ndụ anyị na-asọpụrụ Jizọs. Pọl onyeozi sịrị: “Ịhụnanya nke Kraịst nwere na-akpali anyị.” (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15.) Pọl ma na ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ maka otú Jizọs si hụ anyị n’anya nke ukwuu, ọ ga-eme ka anyị hụ Jizọs n’anya, na-asọpụkwara ya. Ọ bụrụ na anyị aghọta nke ọma ihe Jehova meere anyị, ịhụnanya ya ga-eme ka anyị na-ebi ndụ otú ga-egosi na anyị na-asọpụrụ Jizọs. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

8 Ịhụ Jehova n’anya ga-eme ka anyị na-eṅomi Jizọs, ya bụ, na-esochi nzọụkwụ ya anya. (1 Pita 2:21; 1 Jọn 2:6) Ọ bụrụ na anyị na-erubere Chineke na Kraịst isi, ọ ga-egosi na anyị hụrụ ha n’anya. Jizọs sịrị: “Onye nabatara ihe m nyere n’iwu  ma na-edebe ha, ọ bụ onye ahụ hụrụ m n’anya. N’aka nke ọzọ, onye hụrụ m n’anya ka Nna m ga-ahụ n’anya, m ga-ahụkwa ya n’anya ma gosi ya onwe m nke ọma.”—Jọn 14:21; 1 Jọn 5:3.

9. Olee ihe ndị mmadụ nwere ike ime ka anyị mewe?

9 N’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs a, anyị kwesịrị ịtụgharị uche n’ihe anyị ji ndụ anyị na-eme. N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ebe ụfọdụ m na-eṅomi Jizọs ugbu a? Olee ebe ndị m kwesịrị imekwu nke ọma?’ Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị a n’ihi na ndị ụwa chọrọ ka anyị na-ebi ndụ otú ha si ebi. (Ndị Rom 12:2) Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, ha nwere ike ime ka anyị ṅomiwe ndị nkụzi ụwa, ndị na-agba bọl ma ọ bụ ndị ọzọ a ma ama. (Ndị Kọlọsi 2:8; 1 Jọn 2:15-17) Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-eme ka ha?

10. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs a? Olee ihe azịza ha nwere ike ime ka anyị mee? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

10 Anyị kwesịrị iji oge Ncheta Ọnwụ Jizọs chee echiche banyere uwe anyị, fim anyị na-ele, egwú anyị na-ege, na ihe ndị anyị tinyere na kọmputa anyị, n’ekwentị anyị ma ọ bụ ihe yiri ya. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na Jizọs nọ ebe a hụ uwe m yi, ihere ọ̀ ga-eme m?’ (Gụọ 1 Timoti 2:9, 10.) ‘Uwe m ọ̀ na-egosi na m bụ onye na-eso ụzọ Kraịst? Obi ọ̀ ga-adị Jizọs ụtọ iso m na-ele fim ndị m na-ele? Ọ̀ ga-ege egwú ndị m na-ege? Ọ bụrụ na Jizọs agbaziri ekwentị m, ihe ọ ga-ahụ ọ̀ ga-eme m ihere? Ọ̀ ga-esiri m ike ịkọwara Jizọs ihe mere m ji egwu egwuregwu vidio ndị m na-egwu?’ Otú anyị si hụ Jehova n’anya kwesịrị ime ka anyị tụfuo ihe ọ bụla na-ekwesịghị Onye Kraịst, n’agbanyeghị ego ole a zụrụ ya. (Ọrụ Ndịozi 19:19, 20) Mgbe anyị nyefere Jehova onwe anyị, anyị kwere ya nkwa na anyị ga-eji ndụ anyị na-asọpụrụ Kraịst. N’ihi ya, anyị ekwesịghị inwe ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị ghara ịna-eṅomi Jizọs.—Matiu 5:29, 30; Ndị Filipaị 4:8.

11. (a) Olee otú ịhụnanya anyị hụrụ Jehova na Jizọs si eme ka anyị na-agbakwu mbọ n’ozi ọma? (b) Olee otú ịhụnanya anyị nwere ike isi mee ka anyị nyere ndị nọ́ n’ọgbakọ anyị aka?

11 Otú anyị si hụ Jizọs n’anya na-eme ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, na-akụzikwara ha ihe. (Matiu 28:19, 20; Luk 4:43) N’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs a, ì nwere ike ịhazi ihe ị na-eme kwa ụbọchị ka i nwee ike ịsụ ụzọ inyeaka, jiri iri awa atọ ma ọ bụ iri awa ise kwusaa ozi ọma? Otu nwanna dị́ afọ iri asatọ na anọ nwunye ya nwụrụ chere na nká na ọrịa agaghị ekwe ya sụọ ụzọ. Ma, ndị ọsụ ụzọ ya na ha bi n’otu ebe chọrọ inyere ya aka. Ha haziri otú a ga-esi na-ebu ya n’ụgbọala, họrọkwa ókèala ọ ga-agali. N’ihi ya, nwanna ahụ rụzuru awa iri atọ o kpebiri ịrụ. Ì nwere ike inyere onye ọgbakọ unu aka ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa atọ ma ọ bụ n’ọnwa anọ n’afọ a? Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị mmadụ niile ga-abụli ndị ọsụ ụzọ, ma anyị nwere ike iji oge anyị na ike anyị jekwuoro Jehova ozi. Anyị mee otú ahụ, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka otú Jizọs si hụ anyị n’anya otú ahụ ọ dị Pọl. Olee ihe ọzọ ịhụnanya Chineke ga-eme ka anyị mee?

ANYỊ JI ỤGWỌ ỊHỤ IBE ANYỊ N’ANYA

12. Gịnị ka ịhụnanya Chineke ga-eme ka anyị mee?

12 Nke abụọ, ịhụnanya Chineke kwesịrị ime ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya. Jọn onyeozi dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ otú a ka Chineke si hụ anyị n’anya,  anyị onwe anyị ji ụgwọ ịhụrịta ibe anyị n’anya.” (1 Jọn 4:7-11) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke hụ anyị n’anya, anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị n’anya. (1 Jọn 3:16) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ ha n’anya?

13. Olee otú Jizọs si kụziere anyị ịhụ ndị ọzọ n’anya?

13 Jizọs gosiri anyị otú anyị ga-esi hụ ndị ọzọ n’anya. Mgbe ọ nọ n’ụwa, o nyeere ndị mmadụ aka, nke ka nke, ndị dị́ umeala n’obi. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, ndị ngwọrọ, ndị ìsì, na ndị ogbi. (Matiu 11:4, 5) Jizọs emeghị ka ndị ndú okpukpe. O ji obi ụtọ kụziere ndị chọrọ ịmụta banyere Chineke ihe. (Jọn 7:49) Ọ hụrụ ndị dị́ umeala n’obi n’anya, gbasiekwa mbọ ike inyere ha aka.—Matiu 20:28.

Ì nwere ike inyere nwanna mere agadi aka n’ozi ọma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Olee ihe i nwere ike ime iji gosi na ị hụrụ ụmụnna gị n’anya?

14 I kwesịkwara iji oge Ncheta Ọnwụ Jizọs chee otú ị ga-esi nyere ụmụnna nọ́ n’ọgbakọ unu aka, nke ka nke, ndị merela agadi. Ì nwere ike ịga leta ha? Ì nwere ike ịga bunye ha nri, rụọrọ ha ọrụ ụfọdụ n’ụlọ, buga ha n’ọmụmụ ihe, ma ọ bụ gwa ha ka gị na ha rụọ n’ozi ọma? (Gụọ Luk 14:12-14.) Anyị kwesịrị ikwe ka ịhụnanya Chineke mee ka anyị gosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya.

NA-EMERE ỤMỤNNA ANYỊ EBERE

15. Gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta?

15 Nke atọ, ịhụnanya Jehova na-eme ka anyị na-agbaghara ụmụnna anyị. Anyị niile ketara mmehie na ọnwụ n’aka Adam. N’ihi ya, o nweghị onye ga-asị, “Àjà ahụ Jizọs chụrụ abaraghị m uru.” Ọ bụrụgodị onye kacha agbasi mbọ ike ife Chineke, àjà ahụ Jizọs chụrụ baara ya uru. Chineke agbagharala onye ọ bụla n’ime anyị nnukwu ụgwọ anyị ji ya. Gịnị mere o ji dị́ mkpa ka anyị ghọta ihe a? Anyị ga-ahụ azịza ajụjụ a n’otu n’ime ihe atụ ndị Jizọs mere.

16, 17. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe atụ ahụ Jizọs mere banyere otu eze na ndị ohu ya? (b) Ugbu a ị tụgharịchara uche n’ihe atụ ahụ Jizọs mere, gịnị ka i kpebisiri ike ime?

16 Jizọs mere ihe atụ banyere otu eze nke gbaghaara ohu ya nnukwu ụgwọ o ji ya, ya bụ, iri nde dinarịọs isii. Ma, mgbe e mechara, ohu ahụ ekweghị agbaghara ohu ibe ya obere ụgwọ o ji ya, ya bụ, naanị otu narị dinarịọs. Ebere eze ahụ meere ya kwesịrị ime ka ọ gbaghara ohu ibe ya. Ezigbo iwe were eze ahụ mgbe ọ nụrụ na ohu ya ekweghị agbaghara ohu ibe ya obere ụgwọ o ji ya. Ọ sịrị: “Ajọ ohu, m kagbuuru gị ụgwọ niile i ji, mgbe ị rịọsiri m arịrịọ ike. Ọ̀ bụ na gị onwe gị ekwesịghị imere ohu ibe gị ebere, dị ka m mekwaara gị ebere?” (Matiu 18:23-35) Jehova agbagharala anyị nnukwu ụgwọ anyị ji ya otú ahụ eze ahụ gbaghaara ohu ya. Gịnị ka ịhụnanya Jehova na ebere ya kwesịrị ime ka anyị mee?

17 Ka anyị na-akwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị nwere ike ịjụ onwe  anyị, sị: ‘Ò nwere nwanna mere ihe were m iwe? Ò siiri m ike ịgbaghara ya?’ Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị iṅomi Jehova, bụ́ onye “na-agbaghara mmehie.” (Nehemaya 9:17; Abụ Ọma 86:5) Ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ maka ebere dị́ ukwuu Jehova meere anyị, anyị ga na-emere ndị ọzọ ebere ma jiri obi anyị niile na-agbaghara ha. Ọ bụrụ na anyị ahụghị ụmụnna anyị n’anya, na-agbagharakwa ha, anyị agaghị atụ anya ka Jehova hụ anyị n’anya ma na-agbaghara anyị. (Matiu 6:14, 15) Ọ bụrụ na anyị agbaghara ndị ọzọ, ọ pụtaghị na ihe ha mere ewuteghị anyị. Kama ọ ga-enyere anyị aka inwekwu obi ụtọ n’ọdịnihu.

18. Olee otú ịhụnanya Chineke si nyere otu nwanna nwaanyị aka ịna-edi ihe nwanna nwaanyị ọzọ na-emejọ?

18 O nwere ike isiri ọtụtụ n’ime anyị ike ‘ịna-edi’ ezughị okè ụmụnna anyị. (Gụọ Ndị Efesọs 4:32; Ndị Kọlọsi 3:13, 14.) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Nkechi mere otú ahụ. [1] (Tụlee ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.) O nyeere otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ aha ya bụ Chinyere aka. Dị ka ihe atụ, ọ na-eji ụgbọala ebuga Chinyere n’ebe ọ bụla ọ chọrọ ịga, na-agara ya ahịa, na-arụkwara ya ihe ndị ọzọ. N’agbanyeghị ihe niile Nkechi meere Chinyere, Chinyere na-agwa ya okwu ọjọọ mgbe niile. N’ihi ya, ọ naghị adịrị Nkechi mfe mgbe niile inyere ya aka. Ma o lekwasịrị anya n’àgwà ọma Chinyere nwere ma nyere ya aka afọ ole na ole ruo mgbe Chinyere rịawara ọrịa ma mechaa nwụọ. N’agbanyeghị na inyere Chinyere aka adịrịghị Nkechi mfe, ọ sịrị: “M na-atụ anya ịhụ Chinyere mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ. M chọrọ ịma otú àgwà ya ga-adị ma o zuo okè.” O doro anya na ịhụnanya Chineke nwere ike ime ka anyị na-edi ihe ụmụnna anyị mere anyị, na-atụkwa anya mgbe ezughị okè na-agaghịzi adị ruo mgbe ebighị ebi.

19. Gịnị ka ‘onyinye a na-apụghị ịkọwa akọwa Chineke nyere anyị n’efu’ ga-eme ka i mee?

19 N’eziokwu, Jehova enyela anyị ‘onyinye a na-apụghị ịkọwa akọwa n’efu.’ Ka anyị na-egosi mgbe niile na obi dị anyị ụtọ maka ya. Oge Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ oge magburu onwe ya anyị ga-eji tụgharịa uche n’ihe niile Jehova na Jizọs meere anyị. Ka ịhụnanya ha mee ka anyị na-eṅomikwu Jizọs, na-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya, jirikwa obi anyị niile na-agbaghara ụmụnna anyị.

^ [1] (paragraf nke 18) Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.