NDỊ MMADỤ chọrọ inwe obi ụtọ. Ma, n’oge ikpeazụ a, onye ọ bụla nwere nsogbu “tara akpụ” ya na ya na-alụ. (2 Tim. 3:1) Ụfọdụ ndị anaghị enwe obi ụtọ n’ihi mmegbu, ọrịa, enweghị ọrụ, ọnwụ ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ. Ndị ohu Chineke nwedịrị ike ịda mbà n’obi, ya emee ka ha ghara ịna-enwe ọṅụ. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, olee ihe i nwere ike ime ka i nwewekwa ọṅụ?

Ka anyị nwee ike ịza ajụjụ a, anyị kwesịrị ibu ụzọ ghọta ihe inwe ezigbo ọṅụ pụtara, nakwa otú ndị ọzọ si na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara ha. Anyị ga-amụtakwa ihe anyị ga-eme, ọ bụghị naanị ka anyị na-enwe ọṅụ, kama, ihe anyị ga-eme ka anyị na-enwekwu ọṅụ.

GỊNỊ BỤ ỌṄỤ?

Mmadụ inwe ọṅụ dị iche n’ihu ịbụ mmadụ ọchị ọchị. Dị ka ihe atụ: Onye aṅụrụma nwere ike ṅụchaa mmanya, na-achịgbu onwe ya n’ọchị. Ma, ọ bụrụ na mmanya apụọ ya n’anya, ọ gaghịzi na-achị ọchị n’ihi na ọ ga-echetakwa nsogbu ndị ya na ya na-alụ. Ọchị a ọ chịrị obere oge apụtaghị na o nwere ezigbo ọṅụ.—Ilu 14:13.

Ọṅụ bụ obi ụtọ si n’ala ala obi anyị na-enwe mgbe ihe ọma meere anyị ma ọ bụ mgbe anyị na-atụ anya ihe ọma ga-emere anyị. Mmadụ inwe ọṅụ pụtara inwe obi ụtọ ma mgbe ihe dị mma ma mgbe ihe na-adịghị mma. (1 Tesa. 1:6) Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe nwere ike na-enye mmadụ nsogbu n’obi ma ya ana-enwekwa ọṅụ. Dị ka ihe atụ, a pịara ndịozi ihe maka na ha na-ekwusa banyere Kraịst. Ma, ha “si n’ihu Sanhedrin ahụ pụọ, na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na a gụwo ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha ya.” (Ọrụ 5:41) O doro anya na ha anaghị aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe a pịara ha. Ma, ebe ha bụ ndị ohu Chineke, ha nwere ọṅụ n’ihi na ha rubeere Chineke isi.

Anyị ebughị àgwà a bụ́ ọṅụ pụta ụwa. Ọ naghịkwanụ abịara onwe ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọṅụ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka “iyiri mmadụ ọhụrụ,” nke ọṅụ so na ya. (Efe. 4:24; Gal. 5:22) Ọ bụrụ na anyị enwee ọṅụ, ọ ga-adịrị anyị mfe idi nsogbu ndị anyị na ha na-alụ.

NDỊ ANYỊ KWESỊRỊ IṄOMI

Jehova chọrọ ka ihe ọma na-eme n’ụwa a, ọ bụghị ihe ọjọọ anyị na-ahụkarị na-eme n’ụwa taa. Ma, ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme anaghị eme ka Jehova ghara ịna-enwe ọṅụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ike na ọṅụ dịkwa n’ebe ọ nọ.” (1 Ihe 16:27) Ihe ọzọ bụ na ihe ọma ndị ohu ya na-eme, na-eme “ka obi [Jehova] ṅụrịa.”—Ilu 27:11.

Ọ bụrụ na anyị anaghị echegbu onwe anyị mgbe ihe anyị tụrụ anya ya na-emeghị, anyị na-eṅomi Jehova. Kama ichegbuwa onwe anyị, anyị nwere ike ilekwasị anya n’ihe ọma ndị anyị nwere ugbu a, ma jiri ndidi na-echere ihe ọma ndị anyị ga-enweta n’ọdịnihu. *

 E nwekwara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nọgidere na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara ha. Ebreham nọgidere na-enwe ọṅụ ma mgbe a chọrọ igbu ya, nakwa mgbe ndị ọzọ kpataara ya nsogbu. (Jen. 12:10-20; 14:8-16; 16:4, 5; 20:1-18; 21:8, 9) N’agbanyeghị nsogbu ndị ahụ, ọ nọgidere na-enwe ọṅụ n’ime obi ya. Olee otú o si mee ya? Ọ nọ na-eche banyere olileanya o nwere ịdị ndụ n’ụwa ọhụrụ mgbe Mesaya ga-achịwa. (Jen. 22:15-18; Hib. 11:10) Jizọs sịrị: “Ebreham nna unu ji ọṅụ dị ukwuu tụọ anya ịhụ ụbọchị m.” (Jọn 8:56) Anyị nwere ike ịna-eche banyere ọṅụ anyị ga-enwe n’ọdịnihu, si otú ahụ na-eṅomi Ebreham.—Rom 8:21.

Pọl onyeozi na Saịlas mere ka Ebreham. Ha nwekwara okwukwe siri ike ma nọgide na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị ihe ndị e mere ha. Dị ka ihe atụ, mgbe a kụchara ha isi aba okpu ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ, ‘n’etiti abalị, ha nọ na-ekpe ekpere ma jiri abụ na-eto Chineke.’ (Ọrụ 16:23-25) Ihe ọzọ mere ka Pọl na Saịlas na-enwe ọṅụ bụ n’ihi na ha ma na ha na-ata ahụhụ n’ihi aha Kraịst. Anyị na-eṅomi Pọl na Saịlas ma anyị cheta uru anyị na-erite n’ihi na anyị na-efe Chineke otú ọ chọrọ.—Fil. 1:12-14.

Taa, e nwere ọtụtụ ụmụnna anyị nọgidere na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị nsogbu ha na-agabiga. Dị ka ihe atụ, n’ọnwa Nọvemba afọ 2013, otu ajọ ifufe kpara mkpamkpa ọjọọ na Filipinz ma mebisie ihe karịrị otu puku ụlọ ụmụnna. Otu nwanna aha ya bụ George so ná ndị ajọ ifufe a kwaturu ụlọ ha n’obodo Takloban kwuru, sị: “N’agbanyeghị ihe mere ụmụnna anyị, ha nọgidere na-enwe obi ụtọ. Agaghị m akọwali ụdị ọṅụ anyị nwere.” Mgbe ọ bụla anyị nọ n’ezigbo nsogbu, anyị ga na-enwe ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị na-echebara ihe ọma niile Jehova na-emere anyị echiche ma na-ekele ya maka ha. Olee ihe ọzọ Jehova merela anyị nke na-eme ka anyị na-enwe ọṅụ?

IHE MERE ANYỊ JI NA-ENWE ỌṄỤ

Ihe kacha eme ka anyị na-enwe ọṅụ bụ adịm ná mma anyị na Chineke. Chegodị echiche: Anyị ma Ọkaakaa Eluigwe na Ala. Ọ bụ Nna anyị, Chineke anyị, na Enyi anyị.—Ọma 71:17, 18.

Obi dịkwa anyị ụtọ na Jehova nyere anyị ndụ, nyekwa anyị ihe ndị anyị ji na-ekpori ndụ. (Ekli. 3:12, 13) Ebe o mere ka anyị mata ya, anyị ghọtara ihe o bu n’obi imere anyị, ghọtakwa otú anyị ga-esi na-ebi ndụ. (Kọl. 1:9, 10) N’ihi ya, anyị ji ndụ anyị na-eme ihe bara uru. Ma, ọtụtụ ndị aghọtaghị ihe Chineke chọrọ ka ha jiri ndụ ha na-eme. Pọl kọwara ihe dị iche ná anyịnwa na ndị ọzọ. Ọ sịrị: “‘Anya ahụbeghị, ntị anụbeghịkwa, obi mmadụ echebeghịkwa ihe Chineke kwadebeere ndị hụrụ ya n’anya.’ N’ihi na ọ bụ anyị ka Chineke kpugheere ha site na mmụọ ya.” (1 Kọr. 2:9, 10) Ịmata ihe Jehova bu n’obi imere anyị, na-eme ka anyị na-enwe ọṅụ.

Chegodị ihe ọzọ Jehova merela anyị. Ọ̀ bụ na obi anaghị atọ anyị ụtọ na ọ na-agbaghara anyị mmehie? (1 Jọn 2:12) N’ihi obi ebere Chineke, anyị nwere olileanya na n’oge na-adịghị anya, ụwa ọhụrụ ga-abịa. (Rom 12:12) Ma ugbu a, Jehova emeela ka anyị nwee ọtụtụ ndị enyi anyị na ha na-efe ya. (Ọma 133:1) Baịbụl na-emesi anyị obi ike na Jehova ga-echebe anyị ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ghara ime anyị ihe ọ bụla. (Ọma 91:11) Ọ bụrụ na anyị echebara ihe ọma ndị a Chineke meere anyị echiche, anyị ga na-enwekwu ọṅụ.—Fil. 4:4.

OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWEKWU ỌṄỤ

Onye Kraịst nke nwere ọṅụ, ò nwere ike inwekwu ọṅụ? Jizọs kwuru, sị: “Ihe ndị a ka m gwara unu, ka ọṅụ m wee dịrị n’ime unu, ka e wee mee ka ọṅụ unu zuo ezu.” (Jọn 15:11) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na anyị nwere ike inwekwu ọṅụ. E nwere ike iji mgbalị  anyị na-eme inwekwu ọṅụ tụnyere ọkụ. Anyị ga na-etinye nkụ n’ọkụ ahụ ka ọ nọgide na-enwu. Otú ahụ ka ọ dịkwa mmadụ inwe ọṅụ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwekwu ọṅụ, anyị ga-agba mbọ ka anyị na Chineke nọgide na-adị ná mma. Cheta na ọ bụ mmụọ nsọ na-eme ka anyị na-enwe ọṅụ. N’ihi ya, anyị ga-enwekwu ezigbo ọṅụ ma anyị na-arịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, nakwa ma anyị na-atụgharị uche na Baịbụl, bụ́ nke e ji ike mmụọ nsọ dee.—Ọma 1:1, 2; Luk 11:13.

Ihe ọzọ ga-eme ka anyị na-enwekwu ọṅụ bụ ịna-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ. (Ọma 35:27; 112:1) Maka gịnị? Maka na e kere anyị ka anyị na-eme uche Chineke. Baịbụl kwuru, sị: “Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa ihe o nyere n’iwu. N’ihi na ọ bụ ya bụ ọrụ dum dịịrị mmadụ.” (Ekli. 12:13) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Chineke chọrọ, anyị ga na-enwe ezigbo ọṅụ. *

URU INWE ỌṄỤ NA-ABA

E nwere ọtụtụ uru ndị ọzọ anyị ga-erite ma anyị na-enwekwu ọṅụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị ejiri ọṅụ na-efe Nna anyị nke eluigwe, n’agbanyeghị nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị, ihe anyị ga na-amasịkwu ya. (Diut. 16:15; 1 Tesa. 5:16-18) Uru ọzọ anyị ga-erite ma anyị na-enwe ezigbo ọṅụ bụ na ọ ga-eme ka anyị ghara ịchọ ka anyị nweta ọtụtụ ihe onwunwe, kama, anyị ga-agba mbọ hapụ ihe ụfọdụ na-amasị anyị n’ihi Alaeze Chineke. (Mat. 13:44) Mgbe anyị hụrụ uru mbọ a anyị gbara bara, anyị ga na-enwekwu ọṅụ, ahụ́ ga na-erukwu anyị ala, anyị ga-emekwa ka ndị ọzọ na-enwe ọṅụ.—Ọrụ 20:35; Fil. 1:3-5.

Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na ị na-enwekwu ọṅụ, o nwere ike ime ka ị ghara ịna-arịakarị ọrịa. Baịbụl kwuru, sị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa.” (Ilu 17:22) Ihe a Baịbụl kwuru dabara n’ihe otu nwoke na-eme nchọpụta na Mahadum nke Nebraska, dị n’Amerịka kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ị na-enwe obi ụtọ ugbu a, obi eruokwa gị ala, o nwere ike ime ka ị ghara ịna-arịakarị ọrịa n’ọdịnihu.”

Ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere, na-amụ ihe, ma na-echebara ihe ndị anyị na-amụ echiche, ọ ga-eme ka anyị nweta mmụọ nsọ ga-eme ka anyị na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị na anyị bi n’oge ihe na-esi ezigbo ike. Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịna-enwekwu ọṅụ bụ ịna-echebara ihe ọma ndị Chineke na-emere anyị echiche, ịna-eṅomi okwukwe ndị ọzọ, na ime uche Chineke. Anyị mee ihe ndị a, anyị ga-ekweta na ihe a Abụ Ọma 64:10 kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova, gbabakwa n’ime ya.”

^ para. 10 Anyị ga-atụle àgwà a bụ́ ndidi n’isiokwu ndị anyị ga-atụle n’ọdịnihu e ji na-akọwa àgwà ndị so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.”

^ para. 20 Ị chọọ ịmatakwu ihe ị ga-eme ka ị na-enwekwu ọṅụ, gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị Ọzọ Ị Ga-eme Ka Ị Na-enwekwu Ọṅụ.”