Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Febụwarị 2017

Ebe ndị ọsụ ụzọ bụ́ George Rollston na Arthur Willis kwụsịrị ka ha gbanye mmiri n’ụgbọala ha.—N’Ebe Ugwu Ọstrelia, n’afọ 1933

 IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

“Ụzọ Ọjọọ ma Ọ Bụ Ụzọ Dị Anya Anaghị Egbochi Ndịàmà Jehova”

“Ụzọ Ọjọọ ma Ọ Bụ Ụzọ Dị Anya Anaghị Egbochi Ndịàmà Jehova”

N’ABALỊ iri abụọ na isii n’ọnwa atọ n’afọ 1937, ụmụ nwoke abụọ ike gwụchara ji nwayọọ nwayọọ nyara ụgbọala ha dị uzuzu uzuzu banye na Sidni dị n’Ọstrelia. Kemgbe ha hapụrụ obodo ahụ otu afọ tupu mgbe ahụ, ha agaala ihe karịrị puku kilomita iri na itoolu na narị atọ. Ebe ndị ha gara so n’ebe ndị kacha dịpụ adịpụ nakwa ebe ndị a na-enweghị ezigbo ụzọ n’Ọstrelia. Aha ha bụ Arthur Willis na Bill Newlands. Ha abụghị ndị na-eme nchọpụta ma ọ bụ ndị na-aga ịhụ obodo ha na-agatụbeghị. Ha so ná ndị ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi, ndị kpebisiri ike ịga kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke n’ime ime obodo ndị juru n’Ọstrelia.

N’ihe dị ka afọ 1928, ebe Ndị Mmụta Baịbụl * ole na ole bi n’Ọstrelia kacha kwusaa ozi ọma bụ n’obodo ndị dị n’akụkụ osimiri nakwa n’obodo ndị gbara ha gburugburu. E nwere ime ime obodo dị iche iche ndị mmadụ na-ebikọtaghị ọnụ na ha. Ebe ndị ahụ ji ihe karịrị okpukpu isii ka Naịjirịa. Mmiri anaghịkwa ezocha na ha. Ma ụmụnna ndị ahụ ghọtara na ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ịgba àmà banyere ya “ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa,” ma n’ime ime obodo ndị ahụ dị n’Ọstrelia. (Ọrụ 1:8) Ma, olee otú ha ga-esi rụọ nnukwu ọrụ ahụ? Ha kpebisiri ike ime ike ha niile ma tụkwasị Jehova obi ha niile na ọ ga-agọzi mbọ ha na-agba.

NDỊ ỌSỤ ỤZỌ MALITERE IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ A NA-EKWUSATỤBEGHỊ YA

N’afọ 1929, ọgbakọ ndị dị na Kwinsland nakwa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ọstrelia rụrụ ụfọdụ ụgbọala bụ́ ọkpọka a ga-eji na-aga ekwusa ozi ọma n’ebe ndị ahụ na-adịghị n’akụkụ osimiri. Ndị na-anya ụgbọala ndị ahụ bụ ndị ọsụ ụzọ bụ́ aka ochie ga-anyali ụgbọala n’ụzọ ọjọọ ndị ahụ, nweekwa ike ịrụzi ya ma o mebie. Ha gara ọtụtụ ebe a na-ekwusatụbeghị ozi ọma.

Ndị ọsụ ụzọ ndị na-agaghị azụli ụgbọala gbaara ígwè gaa kwusaa ozi ọma n’ime ime obodo ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1932, mgbe Bennett Brickell dị afọ iri abụọ na atọ, o si na Rọkhamtịn dị na Kwinsland gafee ime ime obodo ndị dị n’ebe ugwu Kwinsland ịga kwusaa ozi ọma. Njem ahụ were ya ọnwa ise. Ihe ndị o bujuru n’ígwè ya bụ blanket,  ákwà, nri, na ọtụtụ akwụkwọ. Mgbe taya ígwè ya mebichara, ọ nọkwa na-aga, nwee obi ike na Jehova ga-edu ya. Ọ kwaara ígwè ya gaa narị kilomita atọ na iri abụọ fọrọ afọ. Ebe ndị ọ gafere bụ ebe agụụ mmiri gugburula ọtụtụ ndị. Ruo afọ iri atọ, Nwanna Brickell ji ígwè, ọgba tum tum, na ụgbọala gaa ọtụtụ narị puku kilomita n’ebe dị iche iche n’Ọstrelia. Ọ malitere izi ndị nwe ala ozi ọma, nyekwa aka hiwe ọgbakọ ndị ọhụrụ. A ma ya ama, na-akwanyekwara ya ùgwù n’ime ime obodo ndị ahụ niile.

OTÚ HA SI MERIE NSOGBU NDỊ BỊAARA HA

Ọstrelia so ná mba ndị ala ha buru ezigbo ibu n’ụwa, ma ndị bi na ya adịghị ọtụtụ, nke ka nke, n’ọtụtụ ime ime obodo ebe ndị bi na ha na-ebikọtaghị ọnụ. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova emeela ihe gosiri na ha kpebisiri ike izi ndị bi n’ebe ndị ahụ ozi ọma.

Ndị ọsụ ụzọ aha ha bụ Stuart Keltie na William Torrington mere otú ahụ. N’afọ 1933, ha gafere Ọzara Simsịn, bụ́ ebe ájá juru, ịga kwusaa ozi ọma n’obodo Alis Sprịngs dị n’etiti Ọstrelia. Obere ụgbọala ha mebiri, ha ahapụ ya ebe ahụ, Nwanna Keltie ejiri kamel kwusara ozi ọma na-aga. E ji osisi rụọ ụkwụ nwanna ahụ. Mbọ ndị ọsụ ụzọ ndị ahụ gbara bara ezigbo uru mgbe ha hụrụ otu onye nwe họtel n’ebe a na-akpọ Wiliam Krik, bụ́ ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị. Aha nwoke ahụ bụ Charles Bernhardt. O mechara bata n’ọgbakọ, ree họtel ya, malite ịsụ ụzọ naanị ya ruo afọ iri na ise n’ụfọdụ obodo mmiri na-anaghị ezocha, so ná ndị kacha dịpụ adịpụ n’Ọstrelia.

Ebe Nwanna Arthur Willis na-akwado ịga kwusaa ozi ọma n’ime ime obodo ndị dị n’Ọstrelia.—N’obodo Pet, dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ọstrelia, n’afọ 1936

Ndị ọsụ ụzọ ndị ahụ kwesịrị ịkata obi, jisiekwa ike, ka ha nwee ike imeri nsogbu ndị ga-abịara ha. Mgbe Nwanna Arthur Willis na Nwanna Bill Newlands, ndị a kpọrọ aha ha ná mmalite isiokwu a, gara ikwusa ozi ọma n’ime ime obodo ndị dị n’Ọstrelia, ịga kilomita iri atọ na abụọ were ha izu abụọ n’ihi na nnukwu mmiri ozuzo mere ka ọpọtọpọtọ ju n’ọzara ahụ. Mgbe ụfọdụ, ha na-akwara ụgbọala ha gafee ndagwurugwu ndị bụ́ nkume nkume nakwa ájá ndị juru n’akụkụ osimiri, anwụ ana-acha ha, ọsụsọ ana-agbakwa ha ka ha na-agbalị ịkwa ya. Ụgbọala ha na-emebikarị. O mebie, ha na-eji ụkwụ ma ọ bụ gbaa ígwè ọtụtụ ụbọchị gaa n’obodo dị nso. Ha na-anọ ebe ahụ chere ọtụtụ izu ka e bute ihe ndị ha ga-eji gbanwee ihe ndị mebiri n’ụgbọala ha. N’agbanyeghị nsogbu ndị ahụ niile, ha adaghị mbà. Mgbe Nwanna Arthur Willis na-akọwa ihe e kwuru na magazin bụ́ The Golden Age, o mechara kwuo, sị: ‘Ụzọ ọjọọ ma ọ bụ ụzọ dị anya anaghị egbochi Ndịàmà Jehova ịga zie ozi ọma.’

Nwanna Charles Harris, bụ́ onye sụrụ ụzọ ọtụtụ afọ, kwuru na otú ime ime obodo ndị ahụ si dịpụ adịpụ nakwa nsogbu ndị ha nwere mere ka ya na Jehova dịkwuo ná mma. O kwukwara, sị: “Ọ na-akacha mma ma mmadụ nwee naanị ihe ole na ole. Ebe ọ bụ na Jizọs rahụrụ n’èzí mgbe ụfọdụ, obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ ime otú ahụ ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka anyị rụọ ọrụ e nyere anyị.” Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ mekwara otú ahụ. Mbọ ndị ha gbara mere ka ozi ọma ruo n’ebe niile n’Ọstrelia, nyekwara ọtụtụ ndị aka igosi na ha na-akwado Alaeze Chineke.

^ para. 4 Ndị Mmụta Baịbụl malitere ịza Ndịàmà Jehova n’afọ 1931.—Aịza. 43:10.