“Na-echetanụ ndị na-edu ndú n’etiti unu.”HIB. 13:7.

ABỤ: 125, 43

1, 2. Mgbe Jizọs laghachiri eluigwe, gịnị ka ndịozi ya nwere ike ịna-eche?

CHEGODỊ banyere mgbe ndịozi Jizọs guzo n’Ugwu Oliv, na-ele anya n’eluigwe. Ọ dịbeghị anya ha hụrụ ka e buliri Jizọs, bụ́ nna ha ukwu na enyi ha, ígwé ojii ekpuchie ya ka ha ghara ịhụkwa ya. (Ọrụ 1:9, 10) Ruo ihe dị ka afọ abụọ, Jizọs nọ na-akụziri ha ihe, na-agba ha ume, na-edukwa ha. Ugbu a, ọ hapụla ha. Gịnị ka ha ga-eme?

2 Tupu Jizọs alaghachi eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Olee otú ha ga-esi rụọ ọrụ ahụ? N’eziokwu, Jizọs mesiri ha obi ike na mmụọ nsọ ga-enyere ha aka. (Ọrụ 1:5) Ma, ọ bụrụ na ha ga-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụwa niile, e kwesịrị ịna-eduzi ha ma na-ahazi ha. N’oge ochie, Jehova ji ndị mmadụ na-edu ndị ya ma na-ahazi ha. N’ihi ya, ndịozi Jizọs nwere ike ịna-eche, sị: ‘Jehova ọ̀ ga-ahọpụta onye ndú ọhụrụ?’

3. (a) Mgbe Jizọs laghachiri eluigwe, olee ihe dị mkpa ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi mere? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

 3 Mgbe ihe na-erughị izu abụọ gachara, ndị na-eso ụzọ Jizọs gụrụ Akwụkwọ Nsọ, rịọ Chineke ka o duzie ha. Ha họọrọ Matayas ka ọ nọchie Judas Iskarịọt ma bụrụ onye nke iri na abụọ ná ndịozi Jizọs. (Ọrụ 1:15-26) Gịnị mere ịhọpụta Matayas ji dị ma hanwa ma Jehova ezigbo mkpa? Ọ bụ n’ihi na ndịozi Jizọs ghọtara na ha kwesịrị ịdị mmadụ iri na abụọ. * Jizọs ahọrọghị ndịozi ya naanị ka ha na ya na-eje ozi ọma, kama ka ha na-arụ ọrụ dị mkpa n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Gịnị bụ ọrụ ahụ? Olee otú Jehova si si n’aka Jizọs nyere ha aka ịrụ ya? Olee ọrụ yiri ya a na-arụ ná nzukọ Chineke taa? Oleekwa otú anyị ga-esi ‘na-echeta ndị na-edu ndú n’etiti anyị,’ nke ka nke, ndị so ‘n’ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche’?—Hib. 13:7; Mat. 24:45.

JIZỌS NA-EDUZI ÒTÙ NA-ACHỊ ISI

4. Olee ọrụ ndịozi na ndị okenye ndị ọzọ nọ na Jeruselem rụrụ n’oge ndịozi Jizọs?

4 Na Pentikọst afọ 33, ndịozi Jizọs malitere iduzi ọgbakọ Ndị Kraịst. N’ụbọchị ahụ, “Pita biliri ọtọ, ya na ndịozi iri na otu ahụ,” ma zie ìgwè mmadụ ozi na-enye ndụ, ma ndị Juu ma ndị ha tọghatara atọghata. (Ọrụ 2:14, 15) Ọtụtụ n’ime ha ghọrọ Ndị Kraịst. Mgbe e mechara, ndị ahụ chegharịrị ọhụrụ “nọkwa na-ege ntị n’ozizi ndịozi.” (Ọrụ 2:42) Ọ bụ ndịozi Jizọs na-ekwu ihe a ga-eji ego ọgbakọ mee. (Ọrụ 4:34, 35) Ha na-akụziri ndị Chineke ihe, na-ekpekwa ekpere maka ha. Ha kwuru, sị: “Anyị ga-anọgidesi ike n’ikpe ekpere, na-ejekwa ozi banyere okwu Chineke.” (Ọrụ 6:4) Ha họpụtara ụmụnna ma nke a na-akọ ka ha gaa kwusawa ozi ọma n’ebe a na-ekwusatụbeghị ya. (Ọrụ 8:14, 15) Ka oge na-aga, ndị okenye ndị ọzọ e tere mmanụ so ndịozi bụrụ òtù na-achị isi na-eduzi ọgbakọ dị iche iche.—Ọrụ 15:2.

5, 6. (a) Olee otú mmụọ nsọ si nye òtù na-achị isi ike? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee otú ndị mmụọ ozi si nyere òtù na-achị isi aka? (ch) Olee otú Okwu Chineke si duzie òtù na-achị isi?

5 N’oge ndịozi Jizọs, Ndị Kraịst ghọtara na ọ bụ Jehova Chineke si n’aka Onye Ndú ha, bụ́ Jizọs, na-eduzi òtù na-achị isi. Gịnị mere obi ji sie ha ike? Nke mbụ bụ na mmụọ nsọ nyere òtù na-achị isi ike. (Jọn 16:13) Chineke wụkwasịrị Ndị Kraịst niile e tere mmanụ mmụọ nsọ, ma o mere ka ndịozi na ndị okenye ndị ọzọ nọ na Jeruselem na-elekọta ọgbakọ, nke bụ́ ọrụ Chineke nyere ha. Dị ka ihe atụ, n’afọ 49, mmụọ nsọ nyeere òtù na-achị isi aka ikpebi ihe gbasara ibi úgwù. Ọgbakọ niile mere ihe ha kwuru. E sikwa otú ahụ ‘na-eme ka ọgbakọ dị iche iche dị ike n’okwukwe, ha na-amụbakwa n’ọnụ ọgụgụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.’ (Ọrụ 16:4, 5) Akwụkwọ ozi ahụ òtù na-achị isi dere gosikwara na ha nwere àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, dị ka ịhụnanya na okwukwe.—Ọrụ 15:11, 25-29; Gal. 5:22, 23.

6 Nke abụọ bụ na ndị mmụọ ozi nyeere òtù na-achị isi aka. Tupu Kọnịliọs abụrụ onye Jentaịl mbụ a na-ebighị úgwù e mere baptizim, mmụọ ozi gwara ya ka o zie ozi ka a kpọọ Pita onyeozi. Mgbe Pita zichara Kọnịliọs na ndị ikwu ya ozi ọma, Chineke wụkwasịrị ha  mmụọ nsọ n’agbanyeghị na e bighị ha úgwù. Ihe a mere ka ndịozi na ụmụnna ndị ọzọ mee ihe bụ́ uche Chineke ma nabata ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 11:13-18) Ndị mmụọ ozi nyekwara aka ka ozi ọma ahụ òtù na-achị isi na-ahazi ruo ọtụtụ ebe. (Ọrụ 5:19, 20) Nke atọ bụ na Okwu Chineke duziri òtù na-achị isi. Akwụkwọ Nsọ duziri ndị okenye ndị ahụ e tere mmanụ, ma mgbe ha na-ekpebi ihe gbasara ozizi ma mgbe ha na-ekwu ihe a ga-eme n’ọgbakọ.—Ọrụ 1:20-22; 15:15-20.

7. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ọ bụ Jizọs bụ Onye Ndú ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ?

7 N’agbanyeghị na òtù na-achị isi na-ekwu ihe a ga-eme n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ, ha ghọtara na ọ bụ Jizọs bụ Onye Ndú ha. Pọl onyeozi kwuru na Kraịst “nyere ụfọdụ ka ha bụrụ ndịozi.” Ọ sịkwara: “Ka anyị site n’ịhụnanya tolite n’ihe niile n’ime onye ahụ bụ́ isi, ya bụ, Kraịst.” (Efe. 4:11, 15) Kama ịzawa aha otu n’ime ndịozi a ma ama, e si “ná nduzi Chineke gụọ ndị na-eso ụzọ Jizọs aha bụ́ Ndị Kraịst.” (Ọrụ 11:26) N’eziokwu, Pọl kwuru na ha kwesịrị ‘ijidesi omenala e nyefere ha n’aka ike,’ ya bụ, ihe ndị si n’Akwụkwọ Nsọ ndịozi na ndị okenye ndị ọzọ kụziiri ha. Ma, o kwukwara, sị: “Ma achọrọ m ka unu mara na Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwaanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” (1 Kọr. 11:2, 3) O doro anya na Jehova họpụtara Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst ka ọ na-edu ọgbakọ ya.

“IHE A ABỤGHỊ ỌRỤ MMADỤ”

8, 9. Malite n’afọ 1870, olee ọrụ dị mkpa Nwanna Russell nọ na-arụ?

8 Malite n’afọ 1870, Nwanna Russell na ụfọdụ ndị enyi ya gbalịsiri ike ifewe Chineke otú Ndị Kraịst oge mbụ si fee ya. Iji nyere ha aka ịna-akụzi eziokwu n’asụsụ dị iche iche, ha hiwere ụlọ ọrụ iwu kwadoro a na-akpọ Zion’s Watch Tower Tract Society n’afọ 1884, Nwanna Russell abụrụ onyeisi oche ya. * Ọ mụrụ Baịbụl nke ọma. Ọ tụghị ụjọ ịgba ozizi ụgha n’anwụ, ya bụ, ozizi ndị dị ka Atọ n’Ime Otu na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ọ ghọtara na a gaghị ahụ Jizọs anya mgbe ọ ga-abịa ọzọ nakwa na “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” ga-agwụ n’afọ 1914. (Luk 21:24) Nwanna Russell ji oge ya, ike ya, na ego ya na-akọrọ ndị ọzọ eziokwu ndị a. O doro anya na n’oge ahụ dị mkpa, Jehova na onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst ji Nwanna Russell na-arụ ọrụ.

9 Nwanna Russell achọghị ka ndị mmadụ towe ya. N’afọ 1896, o dere, sị: “Anyị achọghị otuto ma ọ bụ nsọpụrụ n’ihi ihe anyị na-ede; anyị achọghị ka a na-akpọ anyị Revren ma ọ bụ Rabaị. Anyị achọghịkwa ka a na-akpọ onye ọ bụla aha anyị.” O mechara kwuo, sị: “Ihe a abụghị ọrụ mmadụ.”

10. (a) Olee mgbe Jizọs họpụtara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi”? (b) Kọwaa otú o si doo anya na Òtù Na-achị Isi dị iche na Watch Tower Society.

10 N’afọ 1919, afọ atọ mgbe Nwanna Russell nwụchara, Jizọs họpụtara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.” Gịnị mere o ji họpụta ya? Ọ bụ ka ọ na-enye ezinụlọ ya ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị.’ (Mat. 24:45) N’oge ahụ, ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime ụmụnna e tere mmanụ na-ewepụta ihe a na-akụziri ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ụmụnna ndị ahụ na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin, Niu Yọk. Okwu ahụ bụ́ “òtù na-achị isi”  malitere ịgba n’akwụkwọ anyị mgbe afọ 1940 gachara. N’oge ahụ, e chere na e nweghị ihe dị iche n’òtù na-achị isi na Watch Tower Bible and Tract Society. Ma, n’afọ 1971, e mere ka o doo anya na Òtù Na-achị Isi dị iche na Watch Tower Society, nke bụ́ ụlọ ọrụ e hiwere n’ihi ihe iwu kwuru, ọ bụghị n’ihi ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Kemgbe ahụ, ndị so n’Òtù Na-achị Isi bụzi ụmụnna e tere mmanụ, ndị na-esoghị ná ndị na-eduzi Watch Tower Society. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọ bụ ụmụnna ndị ma nke a na-akọ, bụ́ ndị so ‘n’atụrụ ọzọ,’ na-eduzi Watch Tower Society na ụlọ ọrụ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ. Ihe a mere ka Òtù Na-achị Isi nwee ike ilekwasị anya n’ịkụziri anyị Okwu Chineke na iduzi anyị. (Jọn 10:16; Ọrụ 6:4) Ụlọ Nche Julaị 15 afọ 2013 kwuru na “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi” bụ mmadụ ole na ole n’ime ụmụnna nwoke e tere mmanụ. Ọ bụ ha bụ Òtù Na-achị Isi.

Ihe a bụ òtù na-achị isi n’agbata afọ 1951 na 1959

11. Olee otú Òtù Na-achị Isi si arụ ọrụ ha?

11 Ụmụnna ndị so n’Òtù Na-achị Isi na-ezukọ ekpebi ihe ndị dị mkpa a ga-eme. Olee otú ha si eme ya? Ha na-ezukọ kwa izu, nke na-enyere ha aka ịna-ekwurịta okwu na ịna-adị n’otu. (Ilu 20:18) Kwa afọ, ha na-agbanwe onyeisi oche ná nnọkọ ndị ha na-enwe n’ihi na o nweghị onye ka ibe ya n’ime ndị so n’Òtù Na-achị Isi. (1 Pita 5:1) Otú ahụkwa ka a na-agbanwe onye ga-abụ onyeisi oche na kọmitii isii ndị e nwere n’Òtù Na-achị Isi. Onye ọ bụla so n’Òtù Na-achị Isi anaghị ewere onwe ya ka onye ndú ụmụnna ya, kama ọ na-ewere onwe ya ka onye so ‘n’ezinụlọ’ Kraịst. Onye ọ bụla n’ime ha sokwa ná ndị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi” na-akụziri Okwu Chineke, na-emekwa ihe ha kwuru.

Kemgbe Jizọs họpụtara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi n’afọ 1919, ha na-ewepụta ihe a na-akụziri ndị Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11)

“ÒNYE N’EZIE BỤ OHU AHỤ KWESỊRỊ NTỤKWASỊ OBI, ONYE NWEKWARA UCHE?”

12. Ebe ọ bụ na Òtù Na-achị Isi asịghị na mmụọ nsọ na-agwa ha okwu ma ọ bụ na ha zuru okè, olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

12 Òtù Na-achị Isi asịghị na mmụọ nsọ na-agwa ha okwu ma ọ bụ na ha zuru okè. N’ihi ya, ha nwere ike imejọ n’ihe gbasara ịkụzi Baịbụl ma ọ bụ iduzi nzukọ Chineke. Dị ka ihe atụ, n’Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ, e dere isiokwu bụ́ “Ime Ka Ihe Anyị Kweere Dokwuo Anya.” Ọ bụ ebe e depụtara ihe ndị a gbanwere n’otú anyị si ghọta ihe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl. Jizọs agwaghị anyị na ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi agaghị emejọ n’ihe gbasara ịkụzi Okwu Chineke. N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi zaa ajụjụ ahụ Jizọs jụrụ, nke bụ́: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche?” (Mat. 24:45) Olee ihe gosiri na Òtù Na-achị Isi bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi? Ka anyị leba anya n’ihe atọ ahụ nyeere òtù na-achị isi aka n’oge ndịozi Jizọs.

13. Olee otú mmụọ nsọ sirila nyere Òtù Na-achị Isi aka?

13 Ihe na-egosi na mmụọ nsọ na-enyere Òtù Na-achị Isi aka. Mmụọ nsọ enyerela Òtù Na-achị Isi aka ịghọta eziokwu Baịbụl ndị a na-aghọtaghị n’oge gara aga. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ihe ndị anyị kweere e mere ka ha dokwuo anya e kwuburu na paragraf bu nke a ụzọ. O doro anya na ọ bụghị mmadụ ka otuto ga-agara maka ịchọpụta “ihe ndị miri emi nke Chineke” na ịkọwa ha. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 2:10.) Obi dị Òtù Na-achị Isi otú ọ dị Pọl onyeozi, bụ́ onye dere, sị: “Ihe ndị a ka anyị na-ekwukwa, anyị ejighị okwu e ji amamihe mmadụ kụzie na-ekwu ya, kama anyị ji okwu e ji mmụọ nsọ kụzie  na-ekwu ya.” (1 Kọr. 2:13) Mgbe okpukpe ụgha kụzirila ozizi ụgha ruo ọtụtụ narị afọ, gịnị mere ezigbo Ndị Kraịst ji na-aghọtakwu eziokwu Baịbụl kemgbe afọ 1919? Naanị ihe kpatara ya bụ na Chineke ji mmụọ nsọ ya na-enyere Òtù Na-achị Isi aka.

14. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 14:6, 7, olee otú ndị mmụọ ozi si na-enyere ndị Chineke aka taa?

14 Ihe na-egosi na ndị mmụọ ozi na-enyere Òtù Na-achị Isi aka. Nnukwu ọrụ Òtù Na-achị Isi na-arụ bụ ịhazi otú ihe karịrị nde ndị nkwusa asatọ ga-esi na-ekwusa ozi ọma ná mba niile. Gịnị mere ọrụ ahụ ji na-aga nke ọma? Ihe so kpata ya bụ na ndị mmụọ ozi na-enye aka. (Gụọ Mkpughe 14:6, 7.) E nweela ọtụtụ mgbe ndị nkwusa gara zie ndị mmadụ ozi ọma bụ́ ndị ka kpepụrụ ekpere ka Chineke nyere ha aka. * Otú ozi ọma ahụ si na-aga n’ihu n’agbanyeghị na a na-emegide ndị na-ekwusa ya n’obodo ụfọdụ gosiri na ndị mmụọ ozi na-enyere ha aka.

15. Olee otú Òtù Na-achị Isi si dị iche ná ndị ndú Krisendọm? Nye ihe atụ.

15 Okwu Chineke na-eduzi Otú Na-achị Isi. (Gụọ Jọn 17:17.) Chegodị ihe mere n’afọ 1973. N’afọ ahụ, Ụlọ Nche Bekee June 1 (nke gbara na nke Igbo na July 1, 1974) jụrụ ma ndị na-akwụsịbeghị ịṅụ sịga hà ruru eru ime baptizim. Ọ zara na ihe Baịbụl kwuru gosiri  na ha erughị eru. Ụlọ Nche ahụ depụtara ụfọdụ amaokwu Baịbụl ma kọwaa ihe mere e ji kwesị ịchụpụ onye na-ekweghị akwụsị ịṅụ sịga n’ọgbakọ. (1 Kọr. 5:7; 2 Kọr. 7:1) O kwuru na iwu a esighị n’aka ụmụ mmadụ, kama na o si n’aka Chineke, bụ́ onye si n’Okwu ya bụ́ Baịbụl kwuo ihe bụ́ uche ya. È nwere okpukpe ọzọ na-eji Okwu Chineke ekpebi ihe niile ha na-eme, ọ bụrụgodị na ime otú ahụ nwere ike ime ka ihe siere ụfọdụ ndị òtù ha ike? Otu akwụkwọ e biri n’oge na-adịbeghị anya nke kwuru gbasara okpukpe ndị dị n’Amerịka kwuru, sị: “Ndị isi chọọchị na-agbanwe ozizi ha mgbe niile ka ọ daba n’ihe ọtụtụ ndị òtù ha na ọtụtụ ndị ọzọ n’ụwa kweere nakwa ihe ha chere.” Ebe ọ bụ na Òtù Na-achị Isi na-eji Okwu Chineke ekpebi ihe ha na-eme kama iji ihe ọtụtụ ndị n’ụwa chere, ònye ka a ga-asị na-eduzi ndị Chineke taa?

‘NA-ECHETA NDỊ NA-EDU NDÚ’

16. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi na-echeta Òtù Na-achị Isi?

16 Gụọ Ndị Hibru 13:7. Baịbụl kwuru ka anyị ‘na-echeta ndị na-edu ndú.’ Otu ụzọ anyị nwere ike isi na-eme ya bụ ịna-echeta Òtù Na-achị Isi n’ekpere. (Efe. 6:18) Chegodị banyere ọrụ ndị ha na-arụ ịkụziri anyị Okwu Chineke, ịhazi ozi ọma a na-ekwusa n’ebe dị iche iche n’ụwa na ịhụ maka onyinye ndị mmadụ na-enye. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịna-echeta ha n’ekpere mgbe niile.

17, 18. (a) Olee otú anyị si akwado Òtù Na-achị Isi? (b) Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa si egosi na anyị na-akwado Jizọs na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi?

17 N’eziokwu, icheta Òtù Na-achị Isi abụghị naanị n’ọnụ, kama anyị kwesịkwara ịna-eme ihe ha gwara anyị. Ha na-esi n’akwụkwọ ndị ha na-ebipụtara anyị, ọmụmụ ihe, na mgbakọ agwa anyị ihe anyị ga-eme. Ha na-ahọpụtakwa ndị nlekọta sekit. Ndị nlekọta sekit ahọpụta ndị okenye ọgbakọ. Otú ndị nlekọta sekit na ndị okenye si echeta Òtù Na-achị Isi bụ ịna-eme ihe a gwara ha. Ọ bụrụ na anyị niile na-erubere ndị Onye Ndú anyị bụ́ Jizọs ji arụ ọrụ isi, ọ ga-egosi na anyị na-akwanyere ya ùgwù.—Hib. 13:17.

18 Otú ọzọ anyị si echeta Òtù Na-achị Isi bụ ịna-ekwusasi ozi ọma ike. A sị ka e kwuwe, Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ka ha ṅomie okwukwe ndị na-edu ndú n’etiti ha. Otú ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi si jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ma na-akwado ya gosiri na okwukwe ha siri ike. Ì so n’atụrụ ọzọ na-akwado ndị e tere mmanụ n’ọrụ a dị mkpa? Obi ga-adị gị ezigbo ụtọ mgbe Onye Ndú anyị bụ́ Jizọs ga-asị gị: “Ihe niile unu meere otu n’ime ndị kasị nta n’ime ụmụnna m ndị a, ọ bụ m ka unu meere ya.”—Mat. 25:34-40.

19. Gịnị mere i ji kpebisie ike ịna-eso Onye Ndú anyị bụ́ Jizọs?

19 Mgbe Jizọs laghachiri eluigwe, ọ hapụghị ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 28:20) Ọ ma na mmụọ nsọ, ndị mmụọ ozi, na Okwu Chineke nyeere ya aka mgbe ọ na-eje ozi ya n’ụwa. O jikwa ihe ndị ahụ enyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi aka taa. Ndị so n’ohu ahụ e tere mmanụ “na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’agbanyeghị ebe ọ na-eje.” (Mkpu. 14:4) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ha na-agwa anyị, ọ pụtara na anyị na-eso Onye Ndú anyị bụ́ Jizọs. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi. (Mkpu. 7:14-17) E nweghị onye ndú bụ́ mmadụ ga-ekwe ụdị nkwa ahụ.

^ para. 3 Ọ dị ka Jehova ọ̀ chọrọ ka e jiri ndịozi iri na abụọ ahụ mere ‘nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala’ Jeruselem Ọhụrụ. (Mkpu. 21:14) Ọ bụ ya mere na e kwesịghị idochi onyeozi ọ bụla kwesịrị ntụkwasị obi nke jechara ozi ya n’ụwa.

^ para. 8 Kemgbe afọ 1955, ihe e jizi mara ụlọ ọrụ ahụ bụ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania.

^ para. 14 Gụọ akwụkwọ bụ́ ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke,’ peeji nke 58-59.