“Jehova ga na-edu gị mgbe niile.”AỊZA. 58:11.

ABỤ: 15222

1, 2. (a) Olee otú Ndịàmà Jehova si dị iche n’okpukpe ndị ọzọ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya?

NDỊ mmadụ na-ajụkarị Ndịàmà Jehova, sị: “Ònye bụ onyeisi unu?” Ihe mere ha ji ajụ ajụjụ a bụ na ọtụtụ okpukpe nwere nwoke ma ọ bụ nwaanyị bụ́ onyeisi ha. Ma, obi na-adị anyị ụtọ ịgwa ha na Onyeisi anyị abụghị mmadụ na-ezughị okè. Ọ bụ Jizọs Kraịst. Ọ na-erubere Nna ya na Onyeisi ya, bụ́ Jehova, isi.—Mat. 23:10.

2 Ma, e nwere ụfọdụ ụmụ nwoke a kpọrọ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi,” ndị Chineke si n’aka ha na-eduzi ndị ya taa. (Mat. 24:45) N’ihi ya, olee otú anyị si mara n’eziokwu na ọ bụ Jehova si n’aka Ọkpara ya a na-anaghị ahụ anya na-edu anyị? N’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya, anyị ga-eleba anya n’otú Jehova si si n’aka ụfọdụ ndị na-edu ndị ya kemgbe ọtụtụ puku afọ. N’isiokwu abụọ a, anyị ga-atụle ihe atọ na-egosi na ọ bụ Jehova si n’aka ndị ahụ duo ndị ya n’oge ochie, nke na-egosi n’eziokwu na ọ bụ ya ka na-edu ndị ya n’oge anyị a.—Aịza. 58:11.

CHINEKE NYERE HA MMỤỌ NSỌ

3. Gịnị nyere Mozis ike idu ndị Izrel?

3 Mmụọ nsọ nyere ndị nọchitere anya Chineke ike. Chegodị banyere Mozis bụ́ onye Chineke họpụtara idu ndị Izrel. Gịnị nyeere ya aka ịrụ ọrụ a dị mkpa? Jehova  “nyere ya mmụọ nsọ ya.” (Gụọ Aịzaya 63:11-14.) Ebe ọ bụ mmụọ nsọ nyere Mozis ike, ọ bụ Jehova nọ na-edu ndị Izrel.

4. Olee otú ndị Izrel si mata na ọ bụ mmụọ nsọ na-enye Mozis ike? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 Ebe ọ bụ na a naghị ahụ mmụọ nsọ anya, olee otú ndị Izrel si mata na ọ bụ ya na-enye Mozis ike? Mmụọ nsọ mere ka Mozis rụọ ọrụ ebube, meekwa ka ọ gwa Fero ihe bụ́ aha Chineke. (Ọpụ. 7:1-3) Mmụọ nsọ mekwara ka Mozis nwee ọmarịcha àgwà ndị dị ka ịhụnanya, ịdị nwayọọ n’obi, na ndidi, nke mere ka o ruo eruo idu ndị Izrel. Mozis adịghị aka ike, ọ naghịkwa achọ ihe ga-abara naanị ya uru otú ahụ ndị na-achị mba ndị ọzọ na-eme. (Ọpụ. 5:2, 6-9) Eziokwu gbara ka ọnwa bụ na ọ bụ Jehova họpụtara Mozis ka ọ na-edu ndị Izrel.

5. Kọwaa otú Jehova si nye ndị Izrel ndị ọzọ ike idu ndị ya.

5 Ka oge na-aga, mmụọ nsọ nyere ndị ọzọ Jehova họpụtara ike idu ndị ya. Baịbụl kwuru na “Jọshụa nwa Nọn jupụtara na mmụọ amamihe.” (Diut. 34:9) ‘Mmụọ Jehova kpuchiri Gidiọn.’ (Ikpe 6:34) ‘Mmụọ Jehova malitekwara ịkpa ike n’ahụ́ Devid.’ (1 Sam. 16:13) Ndị a niile tụkwasịrị mmụọ nsọ Chineke obi ka o nyere ha aka. O nyere ha ike ime ihe ndị ha na-agaraghị ejili ike nke ha mee. (Jọsh. 11:16, 17; Ikpe 7:7, 22; 1 Sam. 17:37, 50) N’ihi ya, ọ bụ Jehova ka e toro maka ihe ndị ahụ ha mere.

6. Gịnị mere Chineke ji chọọ ka ndị Izrel na-erubere ndị ndú ha isi?

6 Gịnị ka ndị Izrel kwesịrị ime mgbe ha hụrụ ihe gosiri na ọ bụ mmụọ nsọ nyere ndị na-edu ha ike? Mgbe ndị Izrel nọ na-atamu ntamu gbasara otú Mozis si na-edu ha, Jehova jụrụ, sị, “Ruo ole mgbe ka ndị a ga na-akparị m?” (Ọnụ Ọgụ. 14:2, 11) O doro anya na Jehova họọrọ Mozis, Jọshụa, Gidiọn, na Devid ka ha bụrụ ndị ndú na-anọchite anya ya. Mgbe ndị Izrel rubeere ha isi, ọ bụ Jehova ka ha na-erubere isi n’eziokwu.

NDỊ MMỤỌ OZI NYEERE HA AKA

7. Olee otú ndị mmụọ ozi si nyere Mozis aka?

7 Ndị mmụọ ozi nyeere ndị na-anọchite anya Chineke aka. (Gụọ Ndị Hibru 1:7, 14.) Jehova si n’aka ndị mmụọ ozi nye Mozis iwu, kwado ya ma duzie ya. Chineke zipụrụ Mozis “ka ọ bụrụ ma onye na-achị achị ma onye nnapụta site n’aka mmụọ ozi ahụ nke pụtara ìhè n’ihu ya n’osisi ogwu ahụ.” (Ọrụ 7:35) Jehova ‘si n’aka ndị mmụọ ozi’ nye Mozis iwu ọ ga-eji na-agwa ndị Izrel ihe ha ga-eme. (Gal. 3:19) Jehova gwakwara Mozis, sị: “Duru ndị Izrel gawa n’ebe m gwara gị okwu banyere ya. Lee! Mmụọ ozi m ga-ebutere gị ụzọ.” (Ọpụ. 32:34) Baịbụl ekwughị na ndị Izrel hụrụ mmụọ ozi ahụ mgbe ọ na-eme ihe ndị ahụ. Ma, otú Mozis si na-agwa ndị Izrel ihe ha ga-eme ma na-eduzi ha mere ka o doo ha anya na mmụọ ozi nyeere ya aka.

8. Olee otú ndị mmụọ ozi si nyere Jọshụa na Hezekaya aka?

8 Mgbe Mozis nwụrụ, Jọshụa nọchiri ya. Baịbụl kwuru na “ọchịagha nke ụsụụ ndị agha Jehova” mere ka Jọshụa nwee ike iduru ndị Chineke gaa lụso ndị Kenan agha ma merie ha. (Jọsh. 5:13-15; 6:2, 21) Mgbe Eze Hezekaya na-achị ndị Chineke, ìgwè ndị agha Asiria bịara ibibi Jeruselem. N’otu abalị, “mmụọ ozi Jehova gara gbuo otu narị puku na iri puku mmadụ asatọ na puku ise.”—2 Eze 19:35.

9. Gịnị ka Chineke chọrọ ka ndị Izrel na-eme n’agbanyeghị na ndị na-anọchite anya ya ezughị okè?

 9 Ndị mmụọ ozi zuru okè, ma ndị ha nyeere aka ezughị okè. E nwere mgbe Mozis na-edoghị Jehova nsọ. (Ọnụ Ọgụ. 20:12) Jọshụa ajụghị Jehova ihe ọ ga-eme tupu ya na ndị Gibiọn agbaa ndụ. (Jọsh. 9:14, 15) E nwere mgbe obi Hezekaya “dị mpako.” (2 Ihe 32:25, 26) N’agbanyeghị na ndị a ezughị okè, Jehova chọrọ ka ndị Izrel na-erubere ha isi. O ji ndị mmụọ ozi ya na-enyere ha aka. O doro anya na ọ bụ Jehova nọ na-edu ndị ya.

OKWU CHINEKE DUZIRI HA

10. Olee otú Iwu Chineke si duzie Mozis?

10 Okwu Chineke duziri ndị na-anọchite anya Chineke. Baịbụl kpọrọ Iwu ahụ e nyere ndị Izrel “iwu Mozis.” (1 Eze 2:3) Ma, Baịbụl mere ka o doo anya na ọ bụ Jehova nyere ha Iwu ahụ, Mozis rubekwaara Iwu ahụ isi. (2 Ihe 34:14) Mgbe Jehova gwachara Mozis otú ọ ga-esi rụọ ụlọikwuu Chineke, ‘Mozis mere ihe niile Jehova nyere ya n’iwu. O mere nnọọ otú ahụ.’—Ọpụ. 40:1-16.

11, 12. (a) Gịnị ka Chineke chọrọ ka Jọshụa na ndị eze chịrị ndị Izrel na-eme? (b) Gịnị ka Okwu Chineke mere ka ndị duru ndị Izrel mee?

11 Jọshụa nwere Okwu Chineke mgbe ọ malitere ịchị. Jehova gwara ya, sị: “Ị ga na-agụkwa ihe dị na ya n’olu dị ala ehihie na abalị, ka i wee lezie anya mee ihe niile e dere na ya.” (Jọsh. 1:8) Ndị eze, bụ́ ndị mechara chịa ndị Chineke, mekwara otú ahụ. Ha kwesịkwara ịna-agụ Iwu ahụ kwa ụbọchị, were akwụkwọ depụta ya ma “debe ihe niile e kwuru n’iwu a nakwa ụkpụrụ ndị a site n’ime ha.”—Gụọ Diuterọnọmi 17:18-20.

12 Olee otú Okwu Chineke si duzie ndị a duru ndị Izrel? Chegodị gbasara Eze Josaya. Mgbe a hụrụ akwụkwọ e dere Iwu Mozis, odeakwụkwọ Josaya malitere ịgụrụ ya akwụkwọ ahụ. * Gịnị ka eze ahụ mere mgbe ọ nụrụ ya? Baịbụl sịrị na mgbe “eze nụrụ ihe e kwuru n’akwụkwọ iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya ozugbo.” Ma, ọ bụghị naanị ihe o mere. Okwu Chineke mere ka Josaya malite ibibi arụsị niile dị n’obodo ahụ na ịhazi ememme ngabiga pụrụ iche. (2 Eze 22:11; 23:1-23) Ebe ọ bụ na Josaya na ndị ọzọ bụ́ ezigbo ndị ndú rubeere Okwu Chineke isi, ha dị njikere ịgbanwe ntụziaka ha nyere ndị Chineke, meekwa ka o dokwuo anya. Ihe ndị ha gbanwere mere ka ndị Chineke rubere Jehova isi.

13. Olee ihe dị iche ná ndị duru ndị Chineke n’oge ochie na ndị chịrị mba ndị na-ekpere arụsị?

13 Ndị eze ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi adịghị ka ndị na-achị mba ndị ọzọ, bụ́ ndị na-eji amamihe mmadụ na ihe na-eme naanị ugbu a ekpebi ihe ha ga-eme. O nweghị ụdị ihe arụ ndị Kenan na ndị na-achị ha na-anaghị eme. Ha na-edina nwanne ha, nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha, na anụmanụ, jiri ụmụaka na-achụ àjà, na-ekpekwara arụsị. (Lev. 18:6, 21-25) Ndị eze Babịlọn na ndị eze Ijipt anaghị edewe ihe ọcha otú ahụ Chineke nyere ndị Izrel iwu ka ha na-eme, nke ndị sayensị chọpụtarala na ọ bara ezigbo uru. (Ọnụ Ọgụ. 19:13) Ma, ndị Chineke n’oge ochie hụrụ otú ndị na-edu ha si nyere ha aka ka omume ha, ofufe ha, na ahụ́ ha na-adị ọcha. O doro anya na ọ bụ Jehova nọ na-edu ha.

14. Gịnị mere Jehova ji taa ụfọdụ n’ime ndị duru ndị Izrel ahụhụ?

 14 Ọ bụghị ndị eze niile chịrị ndị Chineke n’oge ochie mere ihe Chineke gwara ha. Ndị na-erubereghị Jehova isi ekweghị ka mmụọ nsọ, ndị mmụọ ozi, na Okwu Chineke duzie ha. Mgbe ụfọdụ, Jehova tara ha ahụhụ ma ọ bụ jiri ndị ọzọ dochie ha. (1 Sam. 13:13, 14) Mgbe oge ruru, ọ họpụtara onye karịrị ndị niile ahụ o si n’aka ha duzie ndị ya.

JEHOVA HỌPỤTARA ONYE NDÚ ZURU OKÈ

15. (a) Olee otú ndị amụma si gosi na a ga-enwe onye ndú zuru okè? (b) Ònye bụ onye ndú ahụ ha buru n’amụma?

15 Ruo ọtụtụ narị afọ, Jehova buru amụma na ọ ga-ahọpụtara ndị ya onye ndú zuru okè. Mozis gwara ndị Izrel, sị: “Jehova bụ́ Chineke gị ga-esi n’etiti ụmụnne gị họpụtara gị onye amụma nke dị ka mụ onwe m—ya ka unu ga-ege ntị.” (Diut. 18:15) Aịzaya buru amụma na Onye a ga-abụ “onye ndú na ọchịagha.” (Aịza. 55:4) Daniel si n’ike mmụọ nsọ dee banyere ọbịbịa “Mesaya bụ́ Onye Ndú.” (Dan. 9:25) Jizọs Kraịst mechara kwuo na ọ bụ ya bụ “Onye Ndú” ndị Chineke. (Gụọ Matiu 23:10.) Ndị na-eso ụzọ Jizọs ji obi ha niile na-eso ya, kwetasie ike na ọ bụ ya ka Jehova họọrọ. (Jọn 6:68, 69) Gịnị mere ha ji kwetasie ike na ọ bụ Jizọs Kraịst ka Jehova si n’aka ya na-edu ndị ya?

16. Olee ihe gosiri na ọ bụ mmụọ nsọ nyere Jizọs ike?

16 Mmụọ nsọ nyere Jizọs ike. Mgbe e mere Jizọs baptizim, Jọn Onye Na-eme Baptizim hụrụ ka “eluigwe na-ekewa, hụkwa ka mmụọ nsọ na-ebekwasị ya dị ka nduru.” Mmụọ nsọ mechara mee ka ọ ‘banye n’ala ịkpa.’ (Mak 1:10-12) N’oge niile Jizọs jere ozi ya n’ụwa, mmụọ nsọ Chineke nyere ya ike ịrụ ọrụ ebube na iji ikike Chineke nyere ya na-akụziri ndị mmadụ ihe. (Ọrụ 10:38) Mmụọ nsọ nyekwaara Jizọs aka ịhụ ndị ọzọ n’anya, inwe ọṅụ, na inwe okwukwe siri ike. (Jọn 15:9; Hib. 12:2) O nweghị onye ndú ọzọ mere ihe gosiri na mmụọ nsọ nyere ya ike otú ahụ. O doro anya na ọ bụ Jehova họpụtara Jizọs ka ọ bụrụ Onye Ndú.

Olee otú ndị mmụọ ozi si nyere Jizọs aka obere oge e mechara ya baptizim? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Gịnị ka mmụọ ozi mere iji nyere Jizọs aka?

17 Ndị mmụọ ozi nyeere Jizọs aka. Obere oge e mechara Jizọs baptizim, “ndị mmụọ ozi bịara wee malite ijere ya ozi.” (Mat. 4:11) Mgbe ọ fọrọ awa ole na ole ka e gbuo ya, “otu mmụọ ozi nke si n’eluigwe pụtara ìhè n’ihu ya wee mee ka ọ dị ike.” (Luk 22:43) Obi siri Jizọs ike na Jehova ga-ezite mmụọ ozi ga-enyere ya aka mgbe ọ bụla e kwesịrị inyere ya aka ka o mee uche Chineke.—Mat. 26:53.

18, 19. Olee otú Okwu Chineke si duzie ihe Jizọs na-eme na ihe ọ na-akụzi?

 18 Okwu Chineke duziri Jizọs. Malite mgbe Jizọs bidoro ozi ya n’ụwa, o kwere ka Akwụkwọ Nsọ na-eduzi ya. (Mat. 4:4) N’eziokwu, o rubeere Okwu Chineke isi ruo mgbe ọ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ. N’ihe ikpeazụ o kwuru tupu ya anwụọ, o kwudịrị ihe ụfọdụ e buru n’amụma gbasara Mesaya. (Mat. 27:46; Luk 23:46) Ma, ndị isi okpukpe n’oge ahụ na-eleghara Okwu Chineke anya ma o kwuo ihe dị iche n’ihe ha na-eme. Jizọs kwuru ihe Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo banyere ha, sị: “Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị nnọọ anya n’ebe m nọ. Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m ofufe, n’ihi na ozizi ha na-ezi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.” (Mat. 15:7-9) Jehova ọ̀ ga-ahọrọ ụdị ndị ahụ ka ha na-edu ndị ya?

19 Jizọs kwere ka Okwu Chineke na-eduzi ihe ọ na-eme na ihe ọ na-akụzi. Mgbe ndị isi okpukpe ndị Juu bịara nwaa ya, o jighị amamihe nke ya ma ọ bụ ihe ndị ọ mụtara mgbe ọ nọ n’eluigwe zaa ha. Kama, o weere Akwụkwọ Nsọ ka o kwuchaa o bie. (Mat. 22:33-40) Kama iji akụkọ gbasara ihe ndị na-eme n’eluigwe ma ọ bụ otú e si kee eluigwe na ụwa na-akọju ndị mmadụ isi, “o mepere obi ha nke ọma ka ha ghọta ihe Akwụkwọ Nsọ pụtara.” (Luk 24:32, 45) Jizọs ji Okwu Chineke kpọrọ ihe, gbasiekwa mbọ ike ịgwa ndị ọzọ ihe o kwuru.

20. (a) Olee otú Jizọs si gosi na ya na-erubere Chineke isi? (b) Gịnị dị iche n’ihe Jizọs mere na ihe Herọd mere?

20 Ọ bụ eziokwu na “okwu ọma” Jizọs kwuru tụrụ ndị nụrụ ya n’anya, ọ bụ Jehova, bụ́ Onye kụziiri ya ihe, ka o nyere otuto maka ya. (Luk 4:22) Mgbe otu nwoke bụ́ ọgaranya kpọrọ Jizọs “Ezi Onye Ozizi” iji too ya, Jizọs weturu obi sị ya: “Gịnị mere i ji akpọ m ezi onye? Ọ dịghị onye bụ́ ezi onye, ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke.” (Mak 10:17, 18) O metụdịghị ka Herọd Agrịpa nke Mbụ, bụ́ onye mechara ghọọ eze Juda mgbe ihe dị ka afọ asatọ gachara. N’otu ememme pụrụ iche, Herọd “yiiri uwe onye eze.” Mgbe ìgwè mmadụ hụrụ ya ma nụ olu ya, ha tiri mkpu, sị: “Ọ bụ olu chi, ọ bụghị olu mmadụ!” O doro anya na obi tọgburu Herọd atọgbu maka otú ha si too ya. Gịnịzi mere? “Mmụọ ozi Jehova tiri ya ihe ozugbo, n’ihi na o nyeghị Chineke otuto ahụ; ikpuru tagburu ya, o wee kubie ume.” (Ọrụ 12:21-23) Ò nwere onye na-ekwu eziokwu ga-ahụcha ihe ahụ merenụ, ya asị na Herọd bụ onye Jehova họọrọ ịbụ onye ndú? Ma, Jizọs mere ka o doo ewu na ọkụkọ anya na ọ bụ Chineke họpụtara ya. O toro Jehova mgbe niile, mee ka a ghọta na ọ bụ Chineke na-edu ndị ya.

21. Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

21 Jizọs agaghị abụ Onye Ndú naanị afọ ole na ole. Mgbe o si n’ọnwụ bilie, o kwuru, sị: “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” Ọ sịkwara: “Lee! m nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:18-20) Ebe Jizọs bụzi mmụọ a na-anaghị ahụ anya n’eluigwe, oleekwanụ otú o si na-edu ndị Chineke nọ n’ụwa? Ole ndị ka Jehova họpụtara ịnọchite anya Jizọs ma na-eduzi ndị Chineke n’ụwa? Olee otú Ndị Kraịst ga-esi mata ndị na-anọchite anya ya? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 12 O nwere ike ịbụ akwụkwọ ahụ Mozis ji aka ya dee.