Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Febụwarị 2017

Ihe Mgbapụta Bụ ‘Onyinye Zuru Okè’ Nna Anyị nke Eluigwe Nyere Anyị

Ihe Mgbapụta Bụ ‘Onyinye Zuru Okè’ Nna Anyị nke Eluigwe Nyere Anyị

“Ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè si n’elu bịa, n’ihi na ọ na-esi n’aka Nna nke ìhè eluigwe abịa.”—JEMS 1:17.

ABỤ: 148, 109

1. Olee uru anyị ga-erite n’àjà Jizọs chụrụ?

E NWERE ọtụtụ ihe ọma anyị ga-enweta n’ihi àjà Jizọs Kraịst ji ndụ ya chụọ. Àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ bụ ihe mgbapụta ga-eme ka ụmụ Adam niile bụ́ ndị ezi omume, mechaa soro n’ezinụlọ Chineke. Ihe mgbapụta ahụ mekwara ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ. Ma, uru àjà Kraịst chụrụ bara abụghị naanị na ọ ga-eme ka Chineke gọzie ndị na-erubere ya isi n’ọdịnihu. Otú ahụ Jizọs kwetara nwụọ ma kwado ezi omume Jehova mere ka e dozie okwu dị mkpa nke gbasara onye ọ bụla ma n’eluigwe ma n’ụwa.—Hib. 1:8, 9.

2. (a) Olee ihe ndị dị ezigbo mkpa Jizọs kwuru n’ekpere ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ihe dị ka afọ abụọ tupu Jizọs anwụọ ma jiri ndụ ya chụọ àjà, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze  gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Mat. 6:9, 10) Iji mee ka obi dịkwuo anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ, ka anyị tụlee otú o si gbasa ido aha Chineke nsọ, ọchịchị Alaeze Chineke, na imezu ihe Chineke bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ.

“KA E DOO AHA GỊ NSỌ”

3. Olee ihe aha Jehova nọchiri anya ya? Olee otú Setan si kwutọọ aha nsọ Chineke?

3 Ihe mbụ Jizọs kwuru n’Ekpere Onyenwe Anyị bụ ka e doo aha Chineke nsọ. Aha Jehova nọchiri anya Jehova na onye ọ bụ. Ọ bụ Jehova kacha bụrụ Onye ezi omume, Onye dị ike, na Onye dị nsọ n’eluigwe na n’ụwa. N’ekpere ọzọ Jizọs kpere, ọ kpọrọ Jehova “Nna dị nsọ.” (Jọn 17:11) Ebe Jehova dị nsọ, ihe niile ọ na-eme na iwu ọ bụla o nyere dị nsọ. Ma, Setan ji aghụghọ kwuo n’ogige Iden na ọ bụghị Chineke kwesịrị ịna-agwa ndị mmadụ ihe ha ga na-eme. Setan kwutọrọ aha nsọ Chineke, si otú ahụ ghagide Jehova ụgha.—Jen. 3:1-5.

4. Olee otú Jizọs si mee ka e doo aha Chineke nsọ?

4 Ihe ọzọ bụ na Jizọs ejighị aha Jehova gwuo egwu. (Jọn 17:25, 26) O mere ka e doo aha Chineke nsọ. (Gụọ Abụ Ọma 40:8-10.) Otú Jizọs si rubere Chineke isi n’emehieghị gosiri na ọ bụ Jehova kwesịrị ịgwa ndị niile o kere eke nwere ọgụgụ isi ihe ha ga-eme. Ma mgbe Setan mere ka Jizọs taa ahụhụ nwụọ, Jizọs akwụsịghị irubere Nna ya nke eluigwe isi. Isi Jizọs rubeere Jehova gosiri na mmadụ zuru okè nwere ike irubere Chineke isi n’ihe niile n’emehieghị.

5. Olee otú anyị ga-esi mee ka e doo aha Chineke nsọ?

5 Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ejighị aha Jehova egwu egwu? Anyị ga-egosi ya n’àgwà anyị. Jehova chọrọ ka anyị dị nsọ. (Gụọ 1 Pita 1:15, 16.) Ọ pụtara na ọ bụ naanị Jehova ka anyị ga na-efe, jirikwa obi anyị niile na-erubere ya isi. Ọ bụrụgodị mgbe a na-emegide anyị, anyị na-agbalị ịna-erubere ụkpụrụ ya na iwu ya isi. Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Jehova chọrọ, anyị na-eme ka ìhè anyị nwuo, si otú ahụ na-eme ka e too aha Jehova. (Mat. 5:14-16) Ebe anyị bụ ndị dị nsọ, otú anyị si ebi ndụ kwesịrị igosi na iwu Jehova nyere dị mma nakwa na Setan bụ onye ụgha. Anyị niile na-emehie. Anyị mehie, anyị kwesịrị iji obi anyị niile chegharịa ma kwụsị àgwà ndị na-eme ka e kwụtọọ aha Jehova.—Ọma 79:9.

6. Gịnị mere Jehova ga-eji were anyị ka ndị ezi omume n’agbanyeghị na anyị ezughị okè?

6 Jehova na-agbaghara anyị mmehie ma anyị nwee okwukwe n’àjà Jizọs chụrụ. Ọ bụ ndị nyefere ya onwe ha ka o weere ka ndị na-efe ya. Jehova kpọrọ Ndị Kraịst e tere mmanụ ndị ezi omume n’ihi na ha bụ ụmụ ya, kpọọkwa ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ndị ezi omume n’ihi na ha bụ ndị enyi ya. (Jọn 10:16; Rom 5:1, 2; Jems 2:21-25) N’ihi ya, ihe mgbapụta ahụ na-eme ka anyị bụrụ ndị ezi omume n’anya Jehova ugbu a, na-emekwa ka anyị soro na-edo aha ya nsọ.

“KA ALAEZE GỊ BỊA”

7. Olee ihe ọma ihe mgbapụta ahụ ga-eme ka ndị mmadụ nweta mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa?

7 Ihe ọzọ Jizọs kwuru n’ekpere ahụ ọ kụziri bụ: “Ka alaeze gị bịa.” Olee otú ihe mgbapụta ahụ si gbasa Alaeze Chineke? Ihe mgbapụta ahụ mere ka a na-achịkọta otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ, ndị ga-eso  Kraịst bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. (Mkpu. 5:9, 10; 14:1) Jizọs na ndị ga-eso ya chịa otu puku afọ n’Alaeze Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi rite uru n’àjà ahụ ọ chụrụ. Ụwa ga-aghọ paradaịs. A ga-emekwa ka mmadụ niile kwesịrị ntụkwasị obi zuo okè. Ndị niile na-efe Chineke n’eluigwe na n’ụwa ga-emecha bụrụ otu ezinụlọ. (Mkpu. 5:13; 20:6) Jizọs ga-egwepịa isi agwọ ahụ, wepụkwa nsogbu niile nnupụisi Setan kpatara ma n’eluigwe ma n’ụwa.—Jen. 3:15.

8. (a) Olee otú Jizọs si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka ịghọta na Alaeze Chineke dị mkpa? (b) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwado Alaeze Chineke taa?

8 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ịghọta na Alaeze Chineke dị mkpa. Ozugbo o mechara baptizim, o kwusara “ozi ọma alaeze Chineke” n’ebe ọ bụla ọ gara. (Luk 4:43) N’okwu ikpeazụ ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya tupu ya alaghachi eluigwe, ọ gwara ha ka ha bụrụ ndị àmà ya ‘ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.’ (Ọrụ 1:6-8) Ndị mmadụ n’ụwa niile ga-esi n’ozi ọma ahụ mụta banyere ihe mgbapụta ahụ ma bụrụ ndị Alaeze Chineke ga-achị. Taa, otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwado Alaeze Chineke bụ ịna-enyere ụmụnna Kraịst nọ n’ụwa aka n’ozi ọma ahụ Jizọs kwuru ka e kwusaa n’ụwa niile.—Mat. 24:14; 25:40.

‘KA UCHE GỊ MEE’

9. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova ga-emezu ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ?

9 Ihe ọzọ Jizọs kwuru bụ, ‘Ka uche gị mee.’ Gịnị ka ọ pụtara? Ọ bụ Jehova kere ihe niile. O kwuo na ihe ga-eme, ọ ga-emerịrị. (Aịza. 55:11) Jehova agaghị ekwe ka isi Setan nupụụrụ ya kụghasịa ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ. Malite mgbe Jehova kere ụwa, ọ chọrọ ka ụmụ zuru okè Adam na Iv ga-amụ jupụta na ya. (Jen. 1:28) A sị na Adam na Iv nwụrụ n’amụtaghị nwa, ihe ahụ Chineke bu n’obi ka ụmụ ha jupụta ụwa gaara akụ afọ n’ala. N’ihi ya, mgbe Adam na Iv mehiechara, Jehova hapụrụ ha ka ha mụta ụmụ. Chineke ga-esi n’ihe mgbapụta ahụ mee ka ndị niile nwere okwukwe zuo okè ma dị ndụ ebighị ebi. Jehova hụrụ ndị mmadụ n’anya, chọọkwa ka ndị na-erubere ya isi na-ebi ụdị ndụ o bu n’obi kee ha.

10. Olee uru ihe mgbapụta ahụ ga-abara ndị nwụrụ anwụ?

10 Gịnịkwanụ ka a ga-eme ọtụtụ ijeri ndị nwụrụ anwụ, ndị a na-akụzighịrị banyere Jehova? Ihe mgbapụta ahụ ga-eme ka a kpọlite ndị nwụrụ anwụ. Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya. Ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ ma nye ha ohere ịmụta ihe ọ chọrọ ma nweta ndụ ebighị ebi. (Ọrụ 24:15) Jehova chọrọ ka ndị mmadụ dị ndụ, ghara ịnwụ. Ebe Jehova bụ Isi Iyi nke ndụ, ọ bụ Nna onye ọ bụla a kpọlitere n’ọnwụ. (Ọma 36:9) N’ihi ya, ọ dabara adaba na Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe.” (Mat. 6:9) Jehova enyela Jizọs ọrụ dị mkpa ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 6:40, 44) Na Paradaịs, Jizọs ga-eme ihe gosiri na ọ bụ yanwa bụ “mbilite n’ọnwụ na ndụ.”—Jọn 11:25.

11. Gịnị ka Chineke bu n’obi gbasara “oké ìgwè mmadụ” ahụ?

11 Ọ bụghị naanị mmadụ ole na ole ka Jehova ga-emere ihe ọma. Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla nke na-eme uche Chineke, ọ bụ ya bụ nwanne m nwoke na nwanne m nwaanyị na nne m.”  (Mak 3:35) Ihe Chineke bu n’obi gbasara “oké ìgwè mmadụ” a na-enweghị ike ịgụta ọnụ ndị si ná mba niile na ebo niile na asụsụ niile, bụ ka ha bụrụ ndị na-efe ya. Ndị nwere okwukwe n’àjà ahụ Kraịst chụrụ ma mee ihe Chineke chọrọ ga-eso tie mkpu ọṅụ, sị: “Nzọpụta anyị si n’aka Chineke anyị, bụ́ onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, nakwa n’aka Nwa Atụrụ ahụ.”—Mkpu. 7:9, 10.

12. Olee otú Ekpere Onyenwe Anyị si gosi ihe Jehova bu n’obi imere ụmụ mmadụ?

12 Ihe Jizọs kwuru n’ekpere ahụ ọ kụziri gosiri ihe Jehova bu n’obi imere ndị na-erubere ya isi. Anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka e doo aha Jehova nsọ otú ahụ Jizọs kwuru n’ekpere ahụ. (Aịza. 8:13) Aha Jizọs pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.” Iji ihe mgbapụta ahụ zọpụta anyị ga-eme ka a sọpụrụ aha Jehova, na-etokwa ya. Chineke ga-eji Alaeze ya mee ka ndị na-erubere ya isi rite uru n’ihe mgbapụta ahụ. N’eziokwu, Ekpere Onyenwe Anyị na-eme ka obi sie anyị ike na o nweghị ihe ga-eme ka uche Chineke ghara imezu.—Ọma 135:6; Aịza. 46:9, 10.

GOSI NA OBI DỊ GỊ ỤTỌ MAKA IHE MGBAPỤTA AHỤ

13. Gịnị ka baptizim na-egosi?

13 Otu n’ime ụzọ dị mkpa anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ bụ inyefe Jehova onwe anyị n’ihi okwukwe anyị nwere n’àjà ahụ Kraịst chụrụ, e meekwa anyị baptizim. Ime baptizim ga-egosi na “anyị bụ nke Jehova.” (Rom 14:8) Baptizim na-anọchite anya arịrịọ anyị rịọrọ Chineke ka o nye anyị ezi akọnuche. (1 Pita 3:21) Otú Jehova si meere anyị ihe anyị rịọrọ ya bụ iji ọbara Kraịst sachaa anyị. Obi siri anyị ezigbo ike na  ọ ga-enye anyị ihe niile o kwere anyị ná nkwa.—Rom 8:32.

Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14)

14. Gịnị mere Jehova ji nye anyị iwu ka anyị hụ ndị agbata obi anyị n’anya?

14 Olee otú ọzọ anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ? Ebe ihe niile Jehova na-eme gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya, ọ chọrọ ka ndị niile na-efe ya hụ ibe ha n’anya otú ahụ ịhụnanya bụ àgwà ya bụ́ isi. (1 Jọn 4:8-11) Ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya ga-egosi na anyị chọrọ ịbụ ‘ụmụ nke Nna anyị nọ n’eluigwe.’ (Mat. 5:43-48) Iwu kachanụ bụ ịhụ Jehova n’anya, nke abụọ abụrụ ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya. (Mat. 22:37-40) Otu n’ime ụzọ dị mkpa anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya bụ ịna-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke otú ahụ Jizọs gwara anyị. Anyị ga-eme ka a na-eto Chineke ma ọ bụrụ na anyị ana-egosi na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya. N’eziokwu, ịhụnanya Chineke ‘ga-ezu okè n’ime anyị’ ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya, nke ka nke, ụmụnna anyị.—1 Jọn 4:12, 20.

IHE MGBAPỤTA AHỤ NA-EME KA ‘OGE INWETA UME SI N’IHU JEHOVA BỊA’

15. (a) Olee ihe ọma Jehova na-emere anyị ugbu a? (b) Olee ihe ọma ndị ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu?

15 Anyị nwee okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ, Jehova ga-agbaghara anyị mmehie anyị. Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na Chineke ‘ga-ehichapụ mmehie anyị.’ (Gụọ Ọrụ Ndịozi 3:19-21.) Dị ka anyị kwuru ná mmalite, ihe mgbapụta ahụ mere ka Jehova kpọọ Ndị Kraịst e tere mmanụ ụmụ ya. (Rom 8:15-17) Ọ dị ka à ga-asị na Jehova edeela aha anyị bụ́ ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ na satifiket ọ ga-eji were anyị ka ụmụ ya. Mgbe anyị ga-ezu okè ma gafee ule ikpeazụ, obi ga-adị ya ụtọ ịbịanye aka na satifiket ahụ ma were anyị ka ụmụ ya ọ hụrụ n’anya ga-ebi n’ụwa. (Rom 8:20, 21; Mkpu. 20:7-9) Jehova ga-ahụ ụmụ ya n’anya ruo mgbe ebighị ebi. Uru ihe mgbapụta ahụ bara ga-adịru mgbe ebighị ebi. (Hib. 9:12) O nweghị mgbe onyinye ahụ na-agaghịzi aba uru. E nweghị onye ga-anapụli anyị ya.

16. Olee otú ihe mgbapụta ahụ si mee ka anyị nwere onwe anyị?

16 Ekwensu agaghị emeli ka ndị ji obi ha niile chegharịa ghara iso n’ezinụlọ Jehova. Jizọs bịara n’ụwa nwụọ “naanị otu ugboro.” N’ihi ya, ọ gaghị eji ndụ ya chụọ àjà ọzọ. (Hib. 9:24-26) Ọ kagbuola ikpe ọnwụ anyị ketara n’aka Adam kpamkpam. Àjà Kraịst ji ndụ ya chụọ emeela ka anyị gharazie ịbụ ohu nke ụwa a Setan na-achị, anyị anaghịkwa atụ egwu ọnwụ.—Hib. 2:14, 15.

17. Olee uru ịhụnanya Chineke ga-abara gị?

17 Nkwa ọ bụla Chineke kwere ga-emezurịrị. Jehova agaghị ekwe ka ihere mee anyị. Ọ naghị agbanwe agbanwe otú ahụ iwu ndị na-achị ihe ndị o kere eke na-anaghị agbanwe. (Mal. 3:6) Jehova nyere anyị ihe karịrị ndụ. O nyere anyị ịhụnanya ya. Baịbụl sịrị: “Anyị onwe anyị amarawokwa ma kwere n’ịhụnanya ahụ Chineke nwere n’ebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:16) Ọ ga-eme ka ụwa niile bụrụ paradaịs mara mma. Ndị niile nọ n’ụwa ga-ahụ ibe ha n’anya otú ahụ Chineke hụrụ anyị n’anya. Ka anyị soro ndị ohu Jehova nọ n’eluigwe, sị: “Ka ngọzi na otuto na amamihe na ekele na nsọpụrụ na ike na ume dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.”—Mkpu. 7:12.