Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Febụwarị 2017

 AKỤKỌ NDỤ

Anyị Hụrụ Ọtụtụ Ụzọ Jehova Si Meere Anyị Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ

Anyị Hụrụ Ọtụtụ Ụzọ Jehova Si Meere Anyị Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ

MGBE papa m bụ́ Arthur bụ nwa okorobịa, ọ hụrụ Chineke n’anya, chọọkwa ịbụ ụkọchukwu ndị Metọdist. Ma, egwú dagharịrị mgbe ọ gụrụ akwụkwọ Ndị Mmụta Baịbụl ma malite iso ha. E mere ya baptizim n’afọ 1914 mgbe ọ dị afọ iri na asaa. N’oge ahụ, Agha Ụwa Mbụ kpụ ọkụ n’ọnụ, a kpọkwara ya ka o soro gaa agha. O kweghị aga agha. N’ihi ya, a tụrụ ya mkpọrọ ọnwa iri n’Ụlọ Mkpọrọ Kịngstịn dị n’Ọnterio, na Kanada. Mgbe papa m si n’ụlọ mkpọrọ pụta, ọ ghọrọ onye kọpọtụa, ya bụ, ọsụ ụzọ oge niile.

N’afọ 1926, papa m lụrụ otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Hazel Wilkinson, onye mama ya mụtara eziokwu Baịbụl n’afọ 1908. A mụrụ m n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa anọ n’afọ 1931. Ọ bụ m bụ nwa nke abụọ n’ime ụmụ anọ papa m na mama m mụrụ. Ezinụlọ anyị ji ofufe Jehova kpọrọ ihe. Papa m ejighị Baịbụl egwu egwu. N’ihi ya, anyị mụtakwara iji Okwu Chineke kpọrọ ihe. Ezinụlọ anyị na-agachi ozi ụlọ n’ụlọ anya.—Ọrụ 20:20.

M MERE KA PAPA M, EKWEGHỊ M AGA AGHA, M MALITEKWARA ỊSỤ ỤZỌ

Agha Ụwa nke Abụọ malitere n’afọ 1939. N’afọ na-eso ya, a machibidoro Ndịàmà Jehova iwu na Kanada. Ụlọ akwụkwọ gọọmenti na-eme ememme ndị e ji eto mba. A na-agwa ụmụ akwụkwọ ka ha gbupụrụ ọkọlọtọ, bụọkwa abụ e ji eto mba. Mgbe a na-eme ememme ndị a, ndị nkụzi na-agwa mụ na nwanne m nwaanyị tọrọ m aha ya bụ Dorothy ka anyị pụọ na klas. Ma, otu ụbọchị, o juru m anya na onye nkụzi anyị kpọrọ m onye ụjọ iji menye m ihere. Mgbe a gbasara, ụfọdụ ụmụ klas anyị bara m ọgụ, kụtuo m n’ala. Ma, ihe a mere ka m kpebisikwuo ike ‘irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.’—Ọrụ 5:29.

 N’ọnwa asaa n’afọ 1942, mgbe m dị afọ iri na otu, m mere baptizim na tankị a gbajuru mmiri n’ebe a na-azụ anụmanụ. Anyị mechie ụlọ akwụkwọ, ọ na-atọ m ụtọ ịsụ ụzọ oge ezumike, nke a na-akpọzi ịsụ ụzọ inyeaka. N’otu afọ, m so ụmụnna atọ ndị ọzọ gaa zie ndị na-egbutu osisi ozi ọma n’ókèala a na-eketaghị ọrụ n’ebe ugwu Ọnterio.

N’abalị mbụ n’ọnwa ise n’afọ 1949, m ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile. Ebe ọ bụ na alaka ụlọ ọrụ na-arụ ụlọ ndị ọhụrụ, a kpọrọ m ka m bịa nye aka. M mechara soro ná ndị na-eje ozi na Betel dị na Kanada n’abalị mbụ n’ọnwa iri na abụọ n’afọ ahụ. E nyere m ọrụ n’ebe a na-ebi akwụkwọ, mụ amụta otú e si eji otu ígwè pụrụ iche ebi akwụkwọ. M rụrụ ọrụ abalị ọtụtụ izu, bipụta otu traktị kọrọ gbasara otú e si na-emegide ụmụnna anyị na Kanada.

Mgbe m mechara rụwa ọrụ ná Ngalaba Ije Ozi, m gbara ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ bịara ileta alaka ụlọ ọrụ ajụjụ ọnụ. Ha na-aga ijewe ozi na Kwebek, bụ́ ebe a na-echi ụmụnna anyị ọnụ n’ala mgbe ahụ. Otu n’ime ha bụ Mary Zazula, onye si Edmọntịn, dị n’Albeta. Papa ya na mama ya bu Chọọchị Ọtọdọks n’isi. N’ihi ya, ha chụpụrụ ya na Joe nwanne ya nwoke tọrọ ya n’ụlọ maka na ha ekweghị akwụsị ịmụ Baịbụl. N’ọnwa isii n’afọ 1951, e mere ha abụọ baptizim, ha amalite ịsụ ụzọ mgbe ọnwa isii gara. N’oge ahụ m gbara ha ajụjụ ọnụ, otú Mary si jiri ihe gbasara ofufe Chineke kpọrọ ihe masịrị m. M sịrị onwe m, ‘Ọ dị ka ọ̀ bụ nwa agbọghọ a ka m ga-alụ, ọ gwụkwala ma m̀ chọpụtara ihe na-adịghị mma gbasara ya.’ Anyị lụrụ mgbe ọnwa itoolu gara, ya bụ, n’abalị iri atọ n’ọnwa mbụ n’afọ 1954. Mgbe otu izu gara, a kpọrọ anyị ka a zụọ m ka m bụrụ onye nlekọta sekit. Anyị letara ọgbakọ ndị dị n’otu sekit dị n’ebe ugwu Ọnterio ruo afọ abụọ bido mgbe ahụ.

Ka ozi ọma na-agbasa n’ụwa niile, a gwara ụmụnna na a chọkwuru ndị ozi ala ọzọ. Mụ na nwunye m kwuru na o nweghị ebe anyị na-agaghị ejeli ozi, ebe ọ bụ na anyị diri oké oyi na anwụnta n’oge ọkọchị na Kanada. Anyị gara klas nke iri abụọ na asaa n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied, n’ọnwa asaa n’afọ 1956. N’ọnwa iri na otu, anyị gawara Brazil, bụ́ ebe e zigara anyị.

OZI ALA ỌZỌ ANYỊ JERE NA BRAZIL

Mgbe anyị rutere n’alaka ụlọ ọrụ dị na Brazil, anyị malitere ịmụ asụsụ Pọchugiiz. Mgbe anyị mụtachara otú anyị ga-esi malite izi mmadụ ozi ọma, mụtakwa ihe anyị ga-ekwu n’otu nkeji ma anyị nyefewe mmadụ magazin, a gwara anyị ka anyị malite ịga ozi ọma. A tụụrụ anyị aro na ọ bụrụ na anyị hụ onye nwere mmasị, ka anyị gụọrọ ya amaokwu Baịbụl ndị kwuru otú ụwa ga-adị mgbe Alaeze Chineke ga na-achị. N’ụbọchị mbụ anyị gara ozi ọma, otu nwaanyị gere anyị ntị nke ọma. N’ihi ya, m gụụrụ ya Mkpughe 21:3, 4. Mgbe m gụchara ya, m tụbọrọ.  Okpomọkụ amarabeghị m ahụ́ mgbe ahụ. Ọ ka ga na-enyekwa m nsogbu.

Ebe anyị jere ozi ala ọzọ bụ n’obodo Kampọs, bụ́ ebe e nwere ọgbakọ iri na ise ugbu a. Mgbe anyị ruru ebe ahụ, e nwere naanị otu obere ìgwè na-aghọbeghị ọgbakọ na ebe ndị ozi ala ọzọ na-ebi. Ụmụnna nwaanyị anọ bi na ya tupu anyị abịa. Ha bụ: Esther Tracy, Ramona Bauer, Luiza Schwarz, na Lorraine Brookes, onye na-azazi Lorraine Wallen. Ọrụ m na-arụ n’ebe ahụ bụ inye aka na-asa ákwà na iweta nkụ e ji esi nri. N’otu abalị Mọnde anyị mụchara Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, anyị hụrụ ihe mere ka anyị kụja. Nwunye m dina n’oche kushọn na-ezu ike, mụ na ya ana-ekwurịta ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ. Mgbe o weliri isi n’ihe o ji hiwe isi ka o bilie, agwọ si na ya pụta. Ahụ́ erughị anyị ala ruo mgbe m gburu ya.

Mgbe anyị mụrụ asụsụ Pọchugiiz otu afọ, e mere m onye nlekọta sekit. Anyị biri ndụ ndị ime obodo. Anyị enweghị ọkụ eletrik, anyị na-arahụ n’ute, jirikwa ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya na-aga ebe ndị anyị na-aga. Mgbe anyị gara ikwusa ozi ọma n’ókèala a na-eketaghị ọrụ, anyị bara ụgbọ okporo ígwè gaa n’otu obodo bụ́ ugwu ugwu. Anyị nwetara ụlọ anyị ga-anọ obere oge ma kwụọ ụgwọ ya. Alaka ụlọ ọrụ ziteere anyị narị magazin asatọ anyị ga-eji na-aga ozi ọma. Anyị na-aga post ọfis ọtụtụ ugboro iburu igbe magazin ndị ahụ.

N’afọ 1962, e nwere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze n’ebe dị iche iche na Brazil maka ụmụnna nwoke. Ụmụnna nwaanyị bụ́ ndị ozi ala ọzọ sokwa gaa ya. Ruo ọnwa isii, a gwara m ka m gaa na-akụzi ihe n’ebe ndị e nwere ụlọ akwụkwọ ahụ. Ma nwunye m esoghị m gaa. M gara kụzie na Manaụs, Belem, Fọtaleza, Risifi, na Salvadọ. M haziri otu mgbakọ distrikti n’ebe a ma ama ndị mmadụ na-anọ akụ egwú n’obodo Manaụs. Nnukwu mmiri ozuzo mere ka a ghara inwe mmiri dị ọcha a ga-aṅụ, meekwa ka a ghara inwe ebe dị mma ụmụnna ga-anọ na-eri nri ná mgbakọ. (N’oge ahụ, a na-esi nri ná mgbakọ.) M kọọrọ otu soja nsogbu anyị, ya emetere anyị ebere ma hazie ka e butere anyị mmiri ọṅụṅụ ga-ezuru anyị ná mgbakọ ahụ. O zitekwara ndị soja ka ha rụọrọ anyị ebe abụọ buru ibu. Anyị na-anọ n’otu esi nri, nọrọ na nke ọzọ na-eri nri.

N’oge ahụ m na-anọghị ya, nwunye m na-aga ozi ọma n’ebe ndị si Pọtugal na-achụ nta ego. Naanị ihe ndị mmadụ na-achọ ịnụ ebe ahụ bụ ihe gbasara ego. O nweghị onye kwere ka o zie ya ozi ọma. N’ihi ya, ọ gwara ụfọdụ ndị na-eje ozi na Betel, sị, “Emekataghị m gaa biri na Pọtugal.” Ọ dịghị anya ihe a mechara, anyị enweta akwụkwọ ozi ka anyị gaa jewe ozi na Pọtugal. O juru anyị anya. N’oge ahụ, a machiri Ndịàmà Jehova izi ozi ọma n’ebe ahụ. Ma anyị kwetara ịga n’agbanyeghị na obi adịghị nwunye m mma ná mmalite.

 OZI ANYỊ JERE NA PỌTUGAL

Anyị rutere n’obodo Lizbọn dị na Pọtugal n’ọnwa asatọ n’afọ 1964. Ndị uwe ojii nzuzo nke mba Pọtugal nọ na-emesi ụmụnna anyị ike. N’ihi ya, ọ kaara anyị mma na o nweghị onye nabatara anyị, anyị agaghịkwa chọwa ụmụnna bi n’obodo ahụ. Anyị nọrọ na họtel, na-eche ka e nye anyị akwụkwọ ikike ibi n’obodo ahụ. Mgbe anyị nwetara akwụkwọ ikike ahụ, anyị nwetara ụlọ, kwụọ ụgwọ ya. N’ọnwa mbụ n’afọ 1965, anyị kpọtụụrụ alaka ụlọ ọrụ. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị mechara gaa ọmụmụ ihe mgbe ọnwa ise gachara.

Anyị nụrụ na ndị uwe ojii na-aga n’ụlọ ụmụnna anyị kwa ụbọchị, na-achọ ma è nwere ihe ha ga-ahụ. Ọgbakọ na-anọ n’ụlọ ụmụnna amụ ihe n’ihi na ndị ọchịchị nọ na-emechisị Ụlọ Nzukọ Alaeze. A kpụụrụ ọtụtụ ụmụnna gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ka a gbaa ha ajụjụ. Ha tara ụmụnna ahụhụ ka ha kwuo aha ụmụnna ndị na-eduzi ọmụmụ ihe. Ihe a mere ka ụmụnna anyị na-akpọ ibe ha naanị aha ha, dị ka José ma ọ bụ Paulo, kama ịkpọ aha nna ha. Anyị sokwa ụmụnna mee otú ahụ.

Ihe kacha anyị mkpa bụ ịgba mbọ ka ụmụnna anyị na-enweta akwụkwọ ga-enyere ha aka ịtachi obi. Ọrụ e nyere nwunye m bụ iji ígwè taịpraịta na-edepụta isiokwu ndị a na-amụ amụ gbara n’Ụlọ Nche na akwụkwọ anyị ndị ọzọ. O depụtachaa ya n’akwụkwọ pụrụ iche a na-akpọ stensụl, e jiri ya bipụta ya ọtụtụ.

ỊGBACHITERE OZI ỌMA N’ỤLỌIKPE

N’ọnwa isii n’afọ 1966, e kpere ikpe dị mkpa na Lizbọn. A kpọpụrụ ụmụnna iri anọ na itoolu nọ n’Ọgbakọ Feijo n’ụlọikpe n’ihi na a sịrị na ha gara ọmụmụ ihe iwu na-akwadoghị n’ụlọ ndị mmadụ. Iji kwadebe ha maka ikpe ahụ na ajụjụ ndị a ga-ajụ ha, m mere ka à ga-asị na m bụ ọkàiwu na-agbalị igosi na ụmụnna dara iwu. Anyị ma na a ga-ama ụmụnna anyị ikpe, ma anyị ghọtara na ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị nụ ozi ọma. Ihe ọkàiwu anyị ji mechie okwu ya bụ iji obi ike kwuo ihe Gameliel kwuru n’oge ndịozi Jizọs. (Ọrụ 5:33-39) Ụlọ ọrụ mgbasa ozi kọrọ gbasara ikpe ahụ. A tụrụ ụmụnna niile ahụ mkpọrọ, ụfọdụ otu ọnwa na ọkara, ụfọdụ ọnwa ise na ọkara. Obi dị anyị ụtọ na ọkàiwu kwuchitere ọnụ anyị mechara kweta ka a mụwara ya Baịbụl. Ọ malitekwara ịbịa ọmụmụ ihe tupu ya anwụọ.

N’ọnwa iri na abụọ n’afọ 1966, e mere m onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ. M jikwa oge buru ibu na-arụ ihe gbasara ikpe ụmụnna nwere n’ụlọikpe. Anyị gbalịsiri ike ka ndị mmadụ ghọta ihe mere e ji kwesị ịhapụ Ndịàmà Jehova nọ na Pọtugal ka ha na-efe Chineke otú ha chọrọ. (Fil. 1:7) E mechara deba okpukpe Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ iwu kwadoro n’abalị iri na asatọ n’ọnwa iri na abụọ n’afọ 1974. Nwanna Nathan Knorr na Frederick Franz si n’isi ụlọ anyị bịa Pọtugal iji soro ụmụnna ṅụrịa n’otu nnọkọ pụrụ iche e nwere n’Opọtu nakwa na  Lizbọn. Ndị niile bịara ya dị iri puku anọ na isii, narị asatọ na iri asaa.

Jehova mere ka ozi ọma ruo ọtụtụ ebe n’agwaetiti ndị a na-asụ Pọchugiiz, dị ka Azores, Kep Vad, Madera, nakwa Sao Tome na Prịnsipe. Otú ọtụtụ ndị si na-abata n’ọgbakọ mere ka a rụkwuo ụlọ ndị ọzọ n’alaka ụlọ ọrụ n’afọ 1988. N’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa anọ n’afọ ahụ, Nwanna Milton Henschel kwuru okwu e ji nyefee Jehova ụlọ ọhụrụ ndị ahụ a rụrụ. Ndị bịaranụ dị iri puku anọ na ise, narị ise na iri abụọ na abụọ. Obi dị onye ọ bụla ụtọ ịhụ ndị ozi ala ọzọ jeburu ozi na Pọtugal ka ha bịara nnọkọ ahụ pụrụ iche.

ANYỊ RITERE URU N’AKA ỤMỤNNA JI OBI HA NIILE NA-EFE CHINEKE

Kemgbe ọtụtụ afọ, mụ na nwunye m amụtala ọtụtụ ihe n’aka ụmụnna ji obi ha niile na-efe Chineke. M mụtara ezigbo ihe mgbe mụ na Nwanna Theodore Jaracz rụkọrọ ọrụ n’oge ọ bụ onye nlekọta zoonu. Alaka ụlọ ọrụ anyị gara ileta nọ ná nnukwu nsogbu. Ndị so na Kọmitii Alaka emeela ihe niile ha nwere ike ime iji dozie nsogbu ahụ. Nwanna Jaracz gwara ha okwu ga-eme ka obi ruo ha ala. Ọ sịrị ha: “Oge eruola ka anyị nyetụ mmụọ nsọ ohere ka ọ rụọ ọrụ.” Mgbe mụ na nwunye m gara Bruklin ọtụtụ afọ gara aga, anyị na Nwanna Franz na ụmụnna ole na ole ndị ọzọ nọrịrị n’otu mgbede. Iji pịachie nnọkọ ahụ, a gwara Nwanna Franz ka o kwuo ihe o chere banyere ọtụtụ afọ o jirila jeere Jehova ozi. Ọ sịrị: “Aro m na-atụ bụ: Nọsie ike ná nzukọ Jehova a na-ahụ anya n’agbanyeghị ihe merenụ. Ọ bụ naanị ya na-arụ ọrụ ahụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-arụ, ya bụ, ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.”

Ime otú ahụ atọgbuola mụ na nwunye m. Obi na-adịkwa anyị ụtọ ma anyị cheta oge ndị anyị gara leta alaka ụlọ ọrụ dị iche iche n’ụwa niile. Oge ndị ahụ mere ka anyị nwee ike igosi na obi dị anyị ụtọ maka ozi ụmụnna anyị niile ji obi ha dum na-eje, na-agbakwa ha ume ka ha nọsie ike n’ozi ha na-ejere Jehova, nke bụ́ ihe ùgwù pụrụ iche.

Afọ na-agbakwanụ ọsọ. Anyị abụọ agafeela afọ iri asatọ. E nwere ọtụtụ ọrịa na-ekweghịzi nwunye m ṅụọ mmiri tọgbọ iko. (2 Kọr. 12:9) Ọnwụnwa ndị bịaara anyị emeela ka okwukwe anyị sikwuo ike, meekwa ka anyị kpebisie ike ịna-erubere Chineke isi. Anyị chechaa ọtụtụ afọ anyị jirila jeere Chineke ozi, anyị na-ekweta na Jehova esila n’ọtụtụ ụzọ meere anyị obiọma ya na-erughịrị mmadụ. *

^ para. 29 Ka a na-akwadebe ibipụta isiokwu a, Nwanna Douglas Guest nwụrụ. O fere Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa iri n’afọ 2015.