Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Eprel 2017

Olee Ihe Na-agaghịzi Adị Mgbe Alaeze Chineke Ga-abịa?

Olee Ihe Na-agaghịzi Adị Mgbe Alaeze Chineke Ga-abịa?

“Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa, ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 JỌN 2:17.

ABỤ: 134, 24

1, 2. (a) Olee otú e nwere ike isi jiri ụwa ochie a tụnyere onye omekome a mara ikpe ọnwụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee otú obi ga-adị onye ọ bụla ma e bibichaa ụwa ochie a?

KA E were ya na ị hụrụ onye omekome e du si n’ụlọ mkpọrọ na-apụta, ndị du ya etie, sị: “Lee onye nwụrụ anwụ na-aga ije!” Nwoke ahụ yiri onye ahụ́ dị; ọ bụghịkwa na e nwere ọrịa chọrọ igbu ya. Gịnịzi mere ha ji kwuo ihe ahụ? Ọ bụ n’ihi na a maala ya ikpe ọnwụ, ndị nche eduru ya na-aga ebe a ga-egbu ya. Ọ dị nnọọ ka à ga-asị na ọ nwụọla. *

2 E nwere ike ikwu na ụwa ochie a yiri nwoke ahụ a mara ikpe ọnwụ. Ọ dịla anya a mara ụwa a ikpe ọnwụ, a ga-ebibikwa ya n’oge na-adịghị anya. Baịbụl kwuru, sị: “Ụwa na-agabiga.” (1 Jọn 2:17) A ga-ebibirịrị ụwa ọjọọ a. Ma, e nwere ihe dị iche ná mbibi a ga-ebibi ya na ogbugbu a ga-egbu onye mkpọrọ ahụ. E gbuwe onye ahụ, ụfọdụ ndị nwere ike ịsị na ha ekweghị, sịkwa na e kpere ya ikpe arụrụala ma ọ bụ tụwa anya na a gaghị egbu ya. Ma, ọ bụ Ọkaakaa eluigwe na ụwa kpebiri ibibi ụwa a. Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. (Diut. 32:4)  Ọ gaghị egbu oge tupu ya ebibie ya. E nweghịkwa onye ọ ga na-eme obi abụọ ma ikpe ahụ o kpere ò ziri ezi. E bibichaa ụwa ochie a, onye ọ bụla, ma n’eluigwe ma n’ụwa, ga-eji obi ya niile kweta na Jehova kpere ikpe ziri ezi. Ahụ́ ga-eru onye ọ bụla ala.

3. Olee ihe anọ gbara ọkpụrụkpụ na-agaghịzi adị ma Alaeze Chineke bịa?

3 Ma, olee ihe ndị so ‘n’ụwa’ ahụ Baịbụl kwuru na ọ “ga-agabiga”? Ọtụtụ n’ime ihe ndị mmadụ weere taa ka ihe aka na-agaghị akpa agaghịzi adị. Ò kwesịrị iwute anyị? Mbanụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na o so n’ihe anyị na-ekwusa ‘n’ozi ọma alaeze’ Chineke. (Mat. 24:14) N’ihi ya, ka anyị leba anya n’ihe anọ gbara ọkpụrụkpụ na-agaghịzi adị ma Alaeze Chineke bịa, ya bụ, ndị ọjọọ, òtù dị iche iche na-arụrụ aka, àgwà ọjọọ, na nsogbu ụwa. Na nke ọ bụla, anyị ga-atụle (1) nsogbu ihe ndị a na-akpatara anyị ugbu a, (2) ihe Jehova ga-eme gbasara ha, na (3) otú ọ ga-esi jiri ihe dị mma dochie ha.

NDỊ ỌJỌỌ

4. Olee nsogbu ndị ọjọọ na-akpatara anyị ugbu a?

4 Olee nsogbu ndị ọjọọ na-akpatara anyị ugbu a? Mgbe Pọl onyeozi buchara amụma na n’oge ikpeazụ a, “a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ,” o ji ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-ajọwanye njọ.” (2 Tim. 3:1-5, 13) Ị̀ hụla ka amụma a na-emezu? Ndị ọjọọ emesiela ọtụtụ n’ime anyị ike. Ha nwere ike bụrụ ndị na-eme ihe ike, ndị na-akpọ ndị agbụrụ ọzọ asị, na ndị omekome obi fere azụ. Ụfọdụ n’ime ha anaghị ezo ihe ọjọọ ha na-eme ezo. Ndị ọzọ na-aghọgbu ndị mmadụ, na-eme ka à ga-asị na ha bụ ezigbo mmadụ. Ọ bụrụgodị na ha emesitụbeghị anyị ike, ha na-akpatara anyị nsogbu. Ọ na-agbawa anyị obi ma anyị hụ ihe ha na-eme ndị mmadụ. Otú ha si emeso ụmụaka, ndị agadi, na ndị ọzọ na-enweghị ike ichebe onwe ha na-atụ anyị ụjọ. Ndị ọjọọ na-akpa àgwà ka anụmanụ ma ọ bụdị na-akpa àgwà ndị mmụọ ọjọọ. (Jems 3:15) Obi dị anyị ụtọ na Okwu Chineke mere ka anyị nwee olileanya.

5. (a) Gịnị mere Jehova ji ka hapụ ndị ọjọọ? (b) Gịnị ga-eme ndị ọjọọ jụrụ ịgbanwe?

5 Gịnị ka Jehova ga-eme? Jehova hapụrụ ndị ọjọọ ugbu a ka ọ mara ma hà ga-agbanwe. (Aịza. 55:7) Ọ bụ eziokwu na a ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya, e kpebeghị ndị ọjọọ ikpe ikpeazụ. Ọ bụ ụwa ochie a ka a mara ikpe ọnwụ. Ma, gịnị ga-eme ndị jụrụ ịgbanwe, bụ́ ndị na-akwado ihe ọjọọ ruo mgbe oké mkpagbu ahụ ga-abịa? Jehova kwere nkwa na ọ ga-ebibi ndị ọjọọ niile n’ụwa. (Gụọ Abụ Ọma 37:10.) Ndị ọjọọ nwere ike iche na ha ga-agbanahụ ikpe ahụ. Ọtụtụ ndị amụtala izochi ihe ọjọọ ha mere. Ọtụtụ mgbe, a naghịkwa ata ha ahụhụ maka ihe ha metara. (Job 21:7, 9) Ma, Baịbụl gwara anyị, sị: ‘Anya Chineke na-ahụ ụzọ mmadụ, ọ na-ahụkwa nzọụkwụ ya niile. Ọchịchịrị ma ọ bụ oké itiri ọ bụla adịghị, bụ́ ebe ndị na-eme ihe ọjọọ ga-ezo.’ (Job 34:21, 22) O nweghị ebe mmadụ ga-ezo ka Jehova Chineke ghara ịhụ ya. O nweghị onye ga-aghọgbuli Chineke. Ọ na-ahụ ihe niile ndị ọjọọ na-eme. A lụchaa agha Amagedọn, anyị ga-ele anya n’ebe ha na-anọ, ma anyị agaghị ahụ ha. Ha agaghịzi adị ruo mgbe ebighị ebi.—Ọma 37:12-15.

6. Olee ndị ga-adị ndụ ma e bibie ndị ọjọọ? Gịnị mere o ji bụrụ ozi ọma?

 6 Olee ndị ga-adị ndụ ma e bibie ndị ọjọọ? Jehova kwere nkwa a na-emesi anyị obi ike. Ọ sịrị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” Otu Abụ Ọma ahụ kwukwara, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọma 37:11, 29) Olee ndị bụ́ “ndị dị umeala n’obi” na “ndị ezi omume”? Ndị dị umeala n’obi bụ ndị kwere ka Jehova na-ezi ha ihe na ndị na-erubere ya isi. Ndị ezi omume bụ ndị ọ na-atọ ụtọ ime ihe dị Jehova Chineke mma. N’ụwa taa, ndị ọjọọ karịrị ndị ezi omume. Ma, n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ, ọ bụ naanị ndị dị umeala n’obi na ndị ezi omume ga-adị ndụ. N’eziokwu, ha ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs.

ÒTÙ DỊ ICHE ICHE NA-ARỤRỤ AKA

7. Olee nsogbu òtù na-arụrụ aka na-akpatara anyị taa?

7 Olee nsogbu òtù na-arụrụ aka na-akpatara anyị ugbu a? Ọ bụghị ndị mmadụ n’otu n’otu na-akpata ọtụtụ ihe ọjọọ na-eme taa, kama ọ bụ òtù dị iche iche na-arụrụ aka. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere okpukpe ụgha ndị na-agwa ọtụtụ nde mmadụ ihe na-abụghị eziokwu gbasara Chineke na ihe ga-eme ụwa na ụmụ mmadụ n’ọdịnihu, na-ekwukwa na a gaghị atụkwasịli Baịbụl obi nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-abụghị eziokwu. Cheekwa banyere ọchịchị ndị na-akpata agha na igbu ndị agbụrụ ọzọ, na-emegbu ndị ogbenye na ndị na-enweghị ka ọ hà ha, na-akwadokwa iri ngarị na ile mmadụ anya n’ihu. E nwekwara ụlọ ọrụ ndị na-emetọsị ikuku na mmiri n’ihi anyaukwu, na-emebi akụ̀ ndị Chineke nyere ụmụ mmadụ n’ụwa, na-erigbukwa ọtụtụ ndị na-azụ ihe ha na-emepụta ka mmadụ ole na ole bụ́ ndị aka ji akụ̀ nwekwuo ego, ndị bụ́ ogbenye ọnụ ntụ abụrụ ájá dị n’ala. O doro anya na ụlọ ọrụ ndị na-arụrụ aka so na-akpata ọtụtụ nsogbu juru n’ụwa taa.

8. Gịnị ka Baịbụl kwuru ga-eme òtù dị iche iche ọtụtụ ndị weere ka ihe siri ezigbo ike taa?

8 Gịnị ka Jehova ga-eme? Oké mkpagbu ga-amalite mgbe ndị ọchịchị ga-alụso okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa ọgụ, ya bụ, nwaanyị akwụna ahụ Baịbụl kpọrọ Babịlọn Ukwu. (Mkpu. 17:1, 2, 16; 18:1-4) A ga-ebibi okpukpe ụgha niile kpamkpam. Ma, gịnị ga-eme òtù na-arụrụ aka? Baịbụl ji òtù na ụlọ ọrụ dị iche iche ndị mmadụ weere ka ihe siri ezigbo ike tụnyere ugwu na agwaetiti. (Gụọ Mkpughe 6:14.) Baịbụl buru amụma na a ga-ebibi ọchịchị na òtù dị iche iche na-akwado ha. Oké mkpagbu ahụ ga-akwụsị mgbe a ga-ebibi ọchịchị niile dị n’ụwa ochie a na ndị niile na-anaghị akwado Alaeze Chineke. (Jere. 25:31-33) A gaghịzi enwe òtù ọ bụla na-arụrụ aka.

9. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na a ga-ahazi ụwa ọhụrụ ahazi?

9 Gịnị ka a ga-eji dochie òtù na-arụrụ aka? A lụchaa agha Amagedọn, à ga-enwe òtù ọ bụla n’ụwa? Baịbụl sịrị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.” (2 Pita 3:13) A ga-ebibi eluigwe ochie na ụwa ochie, ya bụ, ndị ọchịchị na-arụrụ aka na ndị ha na-achị. Gịnị ka a ga-eji dochie ha? Okwu ahụ bụ́ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” pụtara na a ga-enwe  ọchịchị ọhụrụ na ụmụ mmadụ ndị ọchịchị ahụ ga na-achị. Alaeze ahụ Jizọs Kraịst ga na-achị ga-egosi na Jehova abụghị Chineke aghara. (1 Kọr. 14:33) N’ihi ya, a ga-ahazi “ụwa ọhụrụ” ahazi. A ga-enwe ụmụ nwoke bụ́ ndị ezi omume ga na-elekọta ihe ndị a na-eme. (Ọma 45:16) Kraịst na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị ga-eso ya na-achị, ga na-eduzi ha. Chegodị otú ụwa ga-adị mgbe òtù dị iche iche na-arụrụ aka na-agaghịzi adị, e nweekwa naanị otu nzukọ dị n’otu nke na-akwụwa aka ọtọ.

ÀGWÀ ỌJỌỌ

10. Olee ụdị omume ọjọọ a na-emekarị n’ebe unu bi? Olee nsogbu ọ na-akpatara gị na ndị ezinụlọ gị?

10 Olee nsogbu àgwà ọjọọ na-akpatara anyị ugbu a? Anyị bi n’ụwa omume ọjọọ juru. Ihe a na-ahụ ebe niile n’oge a bụ omume rụrụ arụ, akwụwaghị aka ọtọ, na tigbuo zọgbuo. Ọtụtụ mgbe, ọ naghị adịrị ndị nne na nna mfe inyere ụmụ ha aka ka ha ghara ịmụta àgwà ọjọọ ndị a. Ndị na-emepụta ihe ndị e ji atụrụ ndụ n’ụwa na-eme ka ihe ndị ahụ yie ihe dị mma, jirikwa iwu Jehova na-eme akaje. (Aịza. 5:20) Ezigbo Ndị Kraịst na-agbalịsi ike ka ha ghara ịmụta ụdị àgwà ahụ. Ha anaghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma n’ụwa a ọtụtụ ndị na-eleghara iwu Jehova anya.

11. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ikpe Jehova kpere Sọdọm na Gọmọra?

11 Gịnị ka Jehova ga-eme gbasara àgwà ọjọọ? Chegodị ihe o mere gbasara omume ọjọọ juru na Sọdọm na Gọmọra. (Gụọ 2 Pita 2:6-8.) Lọt bụ onye ezi omume. Ihe ọjọọ niile a na-eme n’ebe ahụ nyere ya na ndị ezinụlọ ya nsogbu n’obi. Mgbe Jehova bibiri ebe ndị ahụ niile, ihe o mere abụghị naanị ikpochapụ ihe ọjọọ ndị a na-eme na ha. O mere ka mbibi ahụ “ghọọrọ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’ọdịnihu ihe atụ.” Otú ahụ Jehova si kpochapụ ihe ọjọọ niile a na-eme n’oge ahụ ka ọ ga-ekpochapụkwa àgwà ọjọọ niile taa mgbe ọ ga-ekpe ụwa ochie a ikpe.

12. Olee ihe ụfọdụ ị na-atụ anya ime ma Chineke bibichaa ụwa ochie a?

12 Gịnị ka a ga-eji dochie àgwà ọjọọ? N’ụwa ọhụrụ, anyị ga na-arụ ọtụtụ ihe ga na-eme anyị obi ụtọ. Chegodị ụdị obi ụtọ anyị ga-eji na-arụ ọrụ ka ụwa ghọọ paradaịs ma ọ bụ na-arụ ụlọ, ma nke anyị ma nke ndị anyị hụrụ n’anya. Chegodị otú ọ ga-adị gị mgbe ị ga na-anabata ọtụtụ nde ndị a kpọlitere n’ọnwụ ma na-akụziri ha ihe Jehova chọrọ ka ha na-eme nakwa ihe ndị o meere ụmụ mmadụ. (Aịza. 65:21, 22; Ọrụ 24:15) E nwere ọtụtụ ihe anyị ga na-arụ ga-eme ka ọṅụ ju anyị obi, meekwa ka a na-eto Jehova.

NSOGBU ỤWA

13. Gịnị ka isi ahụ Setan, Adam, na Iv nupụụrụ Jehova kpatara n’ụwa taa?

13 Olee otú nsogbu ụwa si akpa anyị aka ọjọọ taa? Ndị ọjọọ, òtù na-arụrụ aka, na àgwà ọjọọ so na-eme ka nsogbu ju n’ụwa a. È nwere onye agha na ịda ogbenye na-emesibeghị ike ma ọ bụ onye a na-akpọtụbeghị asị n’ihi agbụrụ o si? Ọrịa na ọnwụ kwanụ? Ha niile na-akpa anyị aka ọjọọ. Ihe kpatara nsogbu ndị a bụ na Setan, Adam, na Iv nupụụrụ Jehova isi. O nweghị onye n’ime anyị ga-agbanahụli nsogbu nnupụisi ahụ kpatara.

14. Gịnị ka Jehova ga-eme gbasara nsogbu ụwa a? Nye ihe atụ.

 14 Gịnị ka Jehova ga-eme gbasara nsogbu ụwa a? Chegodị gbasara agha. Jehova kwere nkwa ịkwụsị agha niile. (Gụọ Abụ Ọma 46:8, 9.) Ọrịa kwanụ? Ọ ga-ewepụ ya. (Aịza. 33:24) Ọnwụ kwanụ? Jehova ga-eloda ya ruo mgbe ebighị ebi. (Aịza. 25:8) Ọ ga-ewepụ ịda ogbenye. (Ọma 72:12-16) Otú ahụ ka ọ ga-eme nsogbu ndị ọzọ niile na-eme ka anyị na-ata ikikere ezé taa. Ọ ga-ewepụkwa ihe Baịbụl kpọrọ “ikuku” ọjọọ nke ụwa ochie a, n’ihi na mmụọ Setan na nke ndị mmụọ ọjọọ ya agaghịzi adị.—Efe. 2:2.

Chegodị otú ụwa ga-adị mgbe agha, ọrịa, ma ọ bụ ọnwụ na-agaghịzi adị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Olee ihe ụfọdụ na-agaghịzi adị ruo mgbe ebighị ebi ma a lụchaa Amagedọn?

15 Chegodị otú ụwa ga-adị mgbe agha, ọrịa, ma ọ bụ ọnwụ na-agaghịzi adị. Ị̀ makwa otú ọ ga-adị? A gaghịzi enwe ụdị ndị agha ọ bụla, ngwá agha ma ọ bụ ihe a ga-eji na-echeta agha. A gaghịkwa enwe ụlọ ọgwụ, ndị dọkịta, ndị nọọsụ, ma ọ bụ ịnshọrans maka ahụ́ ike, ebe a na-edebe ozu, ma ọ bụ ebe a na-eli ozu. Ebe ọ bụ na mpụ na arụrụala ga-ala ka naị, a gaghịzi enwe ndị uwe ojii ma ọ bụ mkpịsị ugodi. A gaghịkwa na-etinye ihe ga-eme ka a mata na ndị ohi abịala. Ihe ndị a niile na-ekowe ndị mmadụ obi n’elu agaghịzi adị.

16, 17. (a) Olee otú obi ga-adị ndị Amagedọn na-egbughị? Nye ihe atụ. (b) Gịnị ka anyị ga-eme ka obi sie anyị ike na a gaghị ebibi anyị ma e bibiwe ụwa ochie a?

16 Olee otú ihe ga-adị ma Chineke wepụ nsogbu ụwa a? Ọ dịghị mfe iche otú ọ ga-adị. Ogologo oge anyị birila n’ụwa ochie a nwere ike ime ka anyị gharazie ịna-aghọtacha otú nsogbu ụwa si akpa anyị aka ọjọọ. Chegodị gbasara ndị bi n’ebe dị nso n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè. O nwere ike ha agaghịzi na-anụcha mkpọtụ ụgbọ okporo ígwè na-eme. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị bi n’akụkụ ebe a na-ekpofu ahịhịa. O nwere ike ha agaghịzi na-anụcha ísì ebe ahụ. Ma, Jehova wepụ nsogbu ndị ahụ niile, anyị ga-ekuru ume ndụ.

17 Gịnị ka a ga-eji dochie nsogbu juru n’ụwa a? Abụ Ọma 37:11 kwuru, sị: “Ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” Ihe a Baịbụl kwuru ọ́ naghị eme gị obi ụtọ? Otú a ka Jehova chọrọ ka obi dị gị. N’ihi ya, gbalịsie ike ka ị nọrọ Jehova Chineke na nzukọ ya nso n’oge ikpeazụ a nsogbu na-ezo ka mmiri. Jiri olileanya i nwere kpọrọ ihe, na-eche banyere ya, ghọta na ọ bụ ihe ga-eme eme, na-agwakwa ndị ọzọ banyere ya. (1 Timoti 4:15, 16; 1 Pita 3:15) I mee otú ahụ, obi ga-esi gị ike na a gaghị ebibi gị ma e bibiwe ụwa ochie a. Kama nke ahụ, ị ga-adị ndụ, obi ana-atọ gị ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.

^ para. 1 Ihe a kọrọ na paragraf a bụ ihe a na-emebu n’ụlọ mkpọrọ ọtụtụ afọ gara aga n’ebe ụfọdụ n’Amerịka.