Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Eprel 2017

Na-ewepụta Onwe Gị Ijere Jehova Ozi Ka E Too Ya

Na-ewepụta Onwe Gị Ijere Jehova Ozi Ka E Too Ya

“N’ihi ndị Izrel inye onwe ha n’afọ ofufo, gọzienụ Jehova.”—IKPE 5:2.

ABỤ: 150, 10

1, 2. (a) Gịnị ka Elifaz na Bildad kwuru gbasara otú Chineke si ele ozi anyị na-ejere ya anya? (b) Gịnị ka Jehova kwuru gbasara ya?

“Ò NWERE uru mmadụ pụrụ ịbara Chineke, nke na onye nwere nghọta ga-abara ya uru? Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọ̀ na-enweta obi ụtọ ọ bụla na ị bụ onye ezi omume, ka ọ̀ na-erite uru ọ bụla na ụzọ gị enweghị ihe ịta ụta?” (Job 22:1-3) Ì chetụla ihe bụ́ azịza ajụjụ ndị a? Mgbe Elifaz onye Timan bu ụzọ jụọ Job ajụjụ ndị a, o doro anya na o chere na azịza ha bụ mba. Enyi ya bụ́ Bildad onye Shua kwudịrị na ụmụ mmadụ agaghị abụli ndị ezi omume n’anya Chineke.—Gụọ Job 25:4.

2 Ndị a sịrị na ha bịara ịkasi Job obi kwuru na mbọ anyị na-agba n’ozi Chineke abaghị uru n’anya ya, na o weere anyị ka nla, ikpuru, ma ọ bụ idide na-abaghị uru ọ bụla. (Job 4:19; 25:6) Ma anyị elerughị anya, anyị nwere ike chee na ihe ahụ Elifaz na Bildad kwuru gosiri na ha dị umeala n’obi. (Job 22:29) A sị kwuwe, ọ bụrụ na anyị esi n’ugwu dị elu ma ọ bụ na windo ụgbọelu lee ndị nọ n’ala anya, o nwere ike ịdị ka mmadụ ọ̀ dị ezigbo ntakịrị. Ma, ọ̀ bụ otú ahụ ka Jehova si were ozi anyị na-eje iji na-akwado Alaeze ya ma o si n’eluigwe na-ele anyị? Jehova mere ka a mata ihe dị ya n’obi mgbe  ọ gwara Elifaz, Bildad, na Zofa na ha ghara ụgha, ma kwuo na obi dị ya ụtọ n’ihe Job mere. Ọ kpọrọ Job ohu ya. (Job 42:7, 8) N’ihi ya, e nwere ‘uru mmadụ baara Chineke.’

“GỊNỊ KA Ị NA-ENYE YA?”

3. Gịnị ka Elaịhu kwuru banyere mbọ anyị na-agba ijere Jehova ozi? Gịnị ka ihe o kwuru pụtara?

3 Jehova abaraghị Elaịhu mba n’ihi na ọ jụrụ, sị: “Ọ bụrụ n’ezie na ị bụ onye ziri ezi, gịnị ka ị na-enye ya, ọ̀ bụkwa gịnị ka ọ na-enweta n’aka gị?” (Job 35:7) Ihe a Elaịhu kwuru ọ̀ pụtara na mbọ anyị na-agba n’ozi Chineke abaghị uru ọ bụla. Mbanụ. Ihe o kwuru pụtara na ma anyị efeghị Jehova, o nweghị ihe ọ ga-ewepụ ya n’ahụ́. Jehova nwezuru ihe niile. Anyị agaghị emeli ka ọ bakwuo ọgaranya, ma ọ bụ sikwuo ike. Kama, ọ bụ ya nyere anyị nkà na ike ọ bụla anyị nwere, meekwa ka anyị na-akpa àgwà ọma. Ọ na-ahụkwa ihe anyị na-eji ya eme.

4. Gịnị ka Jehova ji ihe ọma anyị na-emere ndị ọzọ tụnyere?

4 Jehova na-ewere ihe ọma ọ bụla e meere ndị ohu ya na ọ bụ ya ka e meere ya. Ilu 19:17 sịrị: “Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe, ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.” Amaokwu Baịbụl a ọ̀ na-ekwu na Jehova na-ahụ ihe ọ bụla e meere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha? Ànyị kwesịrị ikwu na ọ bụrụ na anyị emeere ndị ọzọ ebere, Onye kere eluigwe na ụwa ga-ewere ya ka ego anyị gbazinyere ya, nke ọ ga-eji ihe ọma kwụọ anyị ụgwọ ya? À na-ajụkwa ajụ? Ihe Jizọs bụ́ Ọkpara ya kwuru gosiri na ọ bụ eziokwu.—Gụọ Luk 14:13, 14.

5. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza ugbu a?

5 Jehova gwara Aịzaya onye amụma ka o kwuchite ọnụ ya, nke gosiri na obi dị Jehova ụtọ na ndị na-efe ya so na-emezu nzube ya. (Aịza. 6:8-10) Aịzaya ji obi ya niile mee ihe Jehova kwuru. Ọtụtụ ndị na-emekwa otú ahụ taa, na-asị: “Lee m! Ziga m.” Ha na-arụ ọrụ na-adịghị mfe n’ozi Jehova. Ma, mmadụ nwere ike ịjụ, sị: ‘Mbọ m na-agba n’ozi Chineke ọ̀ bara uru? Ọ bụ eziokwu na Jehova meere m amara kwe ka m wepụta onwe m na-ejere ya ozi, ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ka Okwu ya mezuo n’agbanyeghị otú ihe m rụrụ n’ozi ya hà?’ Chegodị otú ihe mere n’oge Debora na Berak si zaa ajụjụ ndị a.

ONYE TỤRỤ EGWU, MA CHINEKE EMEE KA Ọ KATA OBI

6. Olee ihe dị iche ná ndị Izrel na ndị agha Jebin?

6 Jebin bụ́ eze ndị Kenan “ji aka ike megbuo ụmụ Izrel” ruo afọ iri abụọ. Ụjọ anaghịdị ekwe ndị Izrel pụta èzí. E lewe ya otú ndị agha si ele ihe anya, ndị Izrel enweghị ezigbo ngwá agha, ma nke ha ga-eji alụ agha ma nke ha ga-eji echebe onwe ha. Ma ndị iro ha nwere narị ụgbọ ịnyịnya itoolu ndị nwere mma.—Ikpe 4:1-3, 13; 5:6-8. *

7, 8. (a) Olee iwu Jehova bu ụzọ nye Berak? (b) Olee otú ndị Izrel si merie ndị agha Jebin? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

7 Ma, Jehova si n’ọnụ Debora, bụ́ onye amụma nwaanyị, nye Berak iwu doro anya, sị: “Gaa gbasaa onwe gị n’Ugwu Tebọ, sikwa n’etiti ụmụ Naftalaị nakwa n’etiti ụmụ Zebulọn kpọrọ puku ndị ikom iri. M ga-adọtakwara gị Sisera onyeisi ndị agha Jebin na ụgbọ ịnyịnya agha ya na ìgwè ndị agha ya n’iyi  ndagwurugwu Kaịshọn, m ga-enyefekwa ya n’aka gị.”—Ikpe 4:4-7.

8 A gwara mmadụ niile. Ndị wepụtara onwe ha ezukọta n’Ugwu Tebọ. Berak egbughị oge ime ihe Jehova gwara ya. (Gụọ Ndị Ikpe 4:14-16.) Mgbe a na-alụ agha ahụ na Teanak, nnukwu mmiri ozuzo mere ka ọpọtọpọtọ ju ebe ahụ niile. Berak chụụrụ ndị agha Sisera ruo Haroshet, ihe ruru kilomita iri abụọ na anọ. Ụgbọ ịnyịnya Sisera ahụ na-atụ egwu abaghịzi uru. O nwere ebe ha ruru, Sisera ahapụ ya gbaga Zeananim. O nwere ike ịbụ na ebe ahụ dị nso na Kidesh. Ọ gbabara n’ụlọikwuu Jeel, bụ́ nwunye Hiba onye Kenaịt, Jeel anabata ya. Agha ahụ mere ka ike gwụ Sisera, ụra eburu ya. Ọ maghịzi mgbe Jeel ji kata obi were ntú kpọnye ya n’isi, ya anwụọ pịị. (Ikpe 4:17-21) Ndị Izrel si otú ahụ sụọ ndị iro ha akwụ. *

NDỊ WEPỤTARA ONWE HA IJERE CHINEKE OZI NA NDỊ NA-EWEPỤTAGHỊ ONWE HA

9. Gịnị ka anyị na-amụta ná Ndị Ikpe 5:20, 21 gbasara agha ndị Izrel na Sisera lụrụ?

9 E kwesịrị ịmụkọ Ndị Ikpe isi nke anọ na nke ise ọnụ n’ihi na isi nke ọ bụla kọwara ihe ụfọdụ isi nke ọzọ na-ekwughị. Dị ka ihe atụ, Ndị Ikpe 5:20, 21 kwuru, sị: “Kpakpando si n’eluigwe buo agha, ha si n’ụzọ ha buso Sisera agha. Iyi Kaịshọn buuru ha.” Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ pụtara na ndị mmụọ ozi nyeere ndị Izrel aka n’agha ahụ, ka ọ̀ pụtara na nkume ndị na-acha ọkụ ka kpakpando nọ na-ezo ka mmiri? Baịbụl ekwughị. Ma, e wepụ enyemaka Chineke, è nwere ihe ọzọ a ga-asị na ọ bụ ya mere ka nnukwu mmiri zoo n’ebe ahụ nakwa n’oge ahụ ka ọpọtọpọtọ mee ka narị ụgbọ ịnyịnya agha itoolu ndị ahụ ghara ịgbapụ ọsọ. Ndị Ikpe 4:14, 15 kwuru ugboro atọ na ọ bụ Jehova mere ka ndị Izrel merie. O nweghị onye ọ bụla n’ime puku ndị Izrel iri so gaa agha ahụ nwere ike itu ọnụ na ọ bụ ya mere ka ha merie.

10, 11. Gịnị bụ “Mirọz”? Gịnịkwa mere e ji bụọ ya ọnụ?

10 Mgbe ndị Izrel merichara n’agha, Debora na Berak bụrụ abụ iji nye Jehova otuto. Ma, o nwere ike iju gị anya na ha bụrụ abụ, sị: “‘Bụọnụ Mirọz ọnụ,’ ka mmụọ ozi Jehova kwuru, ‘na-abụnụ ndị bi na ya ọnụ mgbe niile, n’ihi na ha abịaghị nyere Jehova aka, ha esoghị ndị dike nyere Jehova aka.’”—Ikpe 5:23.

11 Ọ ga-abụ ọnụ a bụrụ Mirọz mere ka o sie ike ịmata ebe ọ bụ. Ò nwere ike ịbụ obodo ndị bi na ya jụrụ iso Berak gaa agha? Ọ bụrụ na Sisera si ebe ahụ gbafee, ndị bi na ya hà nwere ohere ijide Sisera ma ha emeghị otú ahụ? Olee otú ọ ga-esi bụrụ na ha anụghị òkù ahụ Jehova kpọrọ ka ndị mmadụ wepụta onwe ha? Puku mmadụ iri si n’Izrel zukọtara ịlụso ndị Kenan agha. Chegodị otú ndị Mirọz ga-esi na-ele dike ọjọọ a ka naanị ya na-agbafe n’okporo ámá ha ka a ghara igbu ya. Ihe a gaara abụ ezigbo ohere ha ga-eji kwado nzube Jehova, ya agọzie ha. Ma, mgbe e nyere ha ohere ịrụrụ Jehova ọrụ, e nweghị ihe ha mere maka ya. Ọ dị ka ha emeghị ka Jeel, bụ́ onye ji obi ike mee ihe a kọrọ malite n’amaokwu nke iri abụọ na anọ.—Ikpe 5:24-27.

12. Ndị Ikpe 5:9, 10, gịnị dị iche n’ihe ndị wepụtara onwe ha mere na ihe ndị na-ewepụtaghị onwe ha mere, oleekwa otú o si gbasa anyị taa?

12 Ndị Ikpe 5:9, 10, anyị hụkwuru ihe dị iche n’ihe ndị wepụtara onwe ha soro Berak lụọ agha mere na ihe ndị  na-ewepụtaghị onwe ha mere. Debora na Berak jara “ndị ọchịagha Izrel” mma, bụ́ ndị so ndị Izrel ndị ọzọ wepụta onwe ha. Ha emeghị ka “ndị na-agba nne ịnyịnya ibu na-acha ọbara ọbara,” bụ́ ndị na-ewepụtaghị onwe ha n’ihi na ha dị mpako, na ndị ‘nọdụrụ na kapet ọma,’ bụ́ ndị ikpori ndụ na-atọgbu atọgbu. Ndị so Berak wepụtara onwe ha lụọ agha n’Ugwu Tebọ bụ́ okwute okwute nakwa na ndagwurugwu Kaịshọn ọpọtọpọtọ juru. Ha emeghị ka ‘ndị ahụ jere ije n’okporo ụzọ,’ bụ́ ndị na-achọghị inye onwe ha nsogbu. A gwara ndị ahụ niile ikpori ndụ na-atọ ụtọ ka ha ‘tụgharịa uche.’ N’eziokwu, ha kwesịrị iche echiche gbasara ohere ha gaara eji rụọrọ Jehova ọrụ. Otú ahụkwa ka onye ọ bụla na-anaghị ewepụtacha onwe ya ijere Chineke ozi taa kwesịrị ime.

13. Olee otú ihe ebo Ruben, Dan, na Asha mere si dị iche n’ihe Zebulọn na Naftalaị mere?

13 Ndị wepụtara onwe ha ji anya ha hụ otú Jehova si gosi na ọ bụ Ọkaakaa. Ha nwere ike ịgwa ndị ọzọ ihe ha hụrụ “ka ha malitere ịkọ ọrụ ezi omume Jehova.” (Ikpe 5:11) Ihe ọzọ bụ na e kwuru ná Ndị Ikpe 5:15-17 na ebo Ruben, Dan, na Asha ji ìgwè atụrụ ha, ụgbọ mmiri ha, ọdụ ụgbọ mmiri ha, na akụ̀ ha ndị ọzọ kpọrọ ihe karịa ọrụ Jehova. Ma, Zebulọn na Naftalaị emeghị otú ahụ. Ha “tinyere mkpụrụ obi ya n’ihe ize ndụ ruo n’ọnwụ” iji kwado Debora na Berak. (Ikpe 5:18) Anyị ga-amụta ihe bara uru n’ihe ndị wepụtara onwe ha mere na ihe ndị na-ewepụtaghị onwe ha mere n’ozi Jehova.

TOONỤ JEHOVA

14. Olee otú anyị si egosi na anyị na-akwado ọchịchị Jehova taa?

14 Taa, anyị anaghị alụ agha iji kwado Jehova, kama otú anyị si egosi na anyị na-akwado Jehova bụ ịkata obi ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ọ dị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ka anyị wepụta onwe anyị ịrụ ọrụ ná nzukọ Jehova. Ọtụtụ nde ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-ewepụta onwe ha ije  ụdị ozi oge niile dị iche iche, ya bụ, ịbụ ndị ọsụ ụzọ, ndị na-eje ozi na Betel, na ndị na-enyere ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze aka. Ọtụtụ ndị, ma ndị agadi ma ndị na-eto eto, na-ewepụta onwe ha ịrụ ọrụ ná mgbakọ dị iche iche. Cheekwa banyere ndị okenye na-arụsi ọrụ ike na Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ nakwa ndị nke na-ahazi mgbakọ ukwu. Ka obi sie gị ike na obi dị Jehova ụtọ maka otú i si wepụta onwe gị na-arụrụ ya ọrụ. Ọ gaghịkwa echefu ya.—Hib. 6:10.

Tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme, chee ihe ọ ga-eme ezinụlọ gị na ọgbakọ unu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Olee otú anyị ga-esi mata ma ànyị emewela anya ụra n’ịrụrụ Jehova ọrụ?

15 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-ahapụrụ ndị ọzọ ọtụtụ ọrụ? M̀ na-ekwe ka ịchụ akụ̀ mee ka m ghara ịna-ewepụta onwe m ịrụrụ Jehova ọrụ? M̀ nwere okwukwe na obi ike iji ihe ọ bụla m nwere na-eme ihe Jehova nyere n’iwu otú ahụ Berak, Debora, Jeel, na puku ndị Izrel iri mere? Ọ bụrụ na m na-eche echiche ịkwaga mba ọzọ gaa chụọ ego, m̀ na-ekpe ekpere ma chee ihe ịga ebe ahụ ga-eme ezinụlọ m na ọgbakọ anyị?’ *

16. Olee ihe anyị ga-enye Jehova nke ọ na-enweghị?

16 Jehova kwanyeere anyị ùgwù kwe ka anyị na-akwado ọchịchị ya. Kemgbe ahụ Ekwensu mere ka ụmụ mmadụ kwadowe ọchịchị nke ya, ọ bụrụ na ị na-akwado ọchịchị Jehova, e nwere ihe ị na-eme ka o doo Setan anya. Ihe mere i ji ewepụta onwe gị ijere Jehova ozi bụ na i nwere okwukwe, chọọkwa ịna-erubere ya isi. Ọ na-emekwa Jehova obi ụtọ. (Ilu 23:15, 16) Ọ na-eji otú i si akwado ya aza Setan, bụ́ onye na-akwa ya emo, okwu. (Ilu 27:11) N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-erubere Jehova isi, e nwere ike ikwu na ị na-enye Jehova ihe o weere ka ihe bara ezigbo uru. Ọ ga-emekwa ya ezigbo obi ụtọ.

17. Olee ihe Ndị Ikpe 5:31 kwuru gbasara ihe ga-eme n’ọdịnihu?

17 N’oge na-adịghị anya, ndị ga-eju n’ụwa bụ ndị na-akwado ọchịchị Jehova karịa ọchịchị ọ bụla ọzọ. Ọ dị anyị ka ụbọchị ahụ ruo eruo. Obi dị anyị otú ọ dị Debora na Berak, bụ́ ndị bụrụ abụ, sị: “Jehova, ka ndị iro gị niile si otú a laa n’iyi, ka ndị hụrụ gị n’anya dịrị ka mgbe anyanwụ ji ike ya dum na-awa.” (Ikpe 5:31) Ihe a ga-eme mgbe Jehova ga-ebibi ụwa Setan a. Agha Amagedọn bido, Jehova agaghị achọ ka ndị ohu ya wepụta onwe ha ịlụso ndị iro agha. Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ‘ga-eguzoro otu ebe, hụ otú Jehova ga-esi zọpụta anyị.’ (2 Ihe 20:17) Ka ọ dị ugbu a, anyị nwere ọtụtụ ohere iji obi ike na ịnụ ọkụ n’obi na-akwado ọchịchị Jehova.

18. Olee uru ozi i wepụtara onwe gị na-ejere Jehova ga-abara ndị ọzọ?

18 Debora na Berak bụrụ abụ iji too Jehova, ọ bụghị ụmụ mmadụ. Ha bụrụ abụ, sị: “N’ihi ndị Izrel inye onwe ha n’afọ ofufo, gọzienụ Jehova.” (Ikpe 5:1, 2) Otú ahụ ka ọ dị taa. Na-ewepụta onwe gị ijere Jehova ozi ka ndị niile ritere uru na ya too Jehova.

^ para. 6 Ụdị mma a na-adị nkọ, tookwa ogologo. Mgbe ụfọdụ, ọ na-arọ arọ. A na-arụnye ya n’ụgbọ ịnyịnya. O nwere ike ịbụ n’ụkwụ ya. È nwere onye ga-elecha ụdị ngwá agha ahụ na-atụ egwu, gaa lụsowa onye ji ya ọgụ?

^ para. 15 Gụọ isiokwu bụ́ “Nchegbu Gbasara Ego,” nke gbara n’Ụlọ Nche Julaị 1, 2015.