Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Eprel 2017

Ị̀ Na-ele Ikpe Ziri Ezi Anya Otú Jehova Si Ele Ya?

Ị̀ Na-ele Ikpe Ziri Ezi Anya Otú Jehova Si Ele Ya?

“M ga-akpọsa aha Jehova . . . , Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ.”—DIUT. 32:3, 4.

ABỤ: 110, 2

1, 2. (a) Olee mmegbu e megburu Nebọt na ụmụ ya? (b) Olee àgwà abụọ anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

WERE ya na ị nọ mgbe e boro otu nwoke ebubo ụgha na o mere ihe kwesịrị ime ka e gbuo ya. O juru ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya ezigbo anya ma wute ha na a mara ya ikpe ọnwụ n’ihi akaebe ụgha ndị ọjọọ gbagidere ya. Ahụ́ nwụrụ ndị ikpe ziri ezi na-amasị mgbe ha hụrụ ka a na-egbu nwoke na-enweghị ihe o mere na ụmụ ya. Ihe a abụghị akụkọ ifo. Ọ bụ ihe mere Nebọt, bụ́ onye ji obi ya niile na-efe Jehova. Nwoke a dịrị ndụ n’oge Eze Ehab na-achị Izrel.—1 Eze 21:11-13; 2 Eze 9:26.

2 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere Nebọt nakwa ihe otu okenye kwesịrị ntụkwasị obi mejọrọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs. Mgbe anyị na-amụ gbasara ndị a Baịbụl kọrọ akụkọ ha, anyị ga-amụta na ịdị umeala n’obi dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ igosi na anyị na-ele ikpe ziri ezi anya otú Jehova si ele ya. Anyị ga-amụtakwa otú ịgbaghara ndị mere anyị ihe ọjọọ n’ọgbakọ ga-esi gosi na  anyị na-ele ikpe ziri ezi anya otú Jehova si ele ya.

IKPE NA-EZIGHỊ EZI E KPERE

3, 4. Olee ụdị onye Nebọt bụ? Gịnị mere o ji jụ iresị Eze Ehab ubi vaịn ya?

3 Nebọt ji obi ya niile na-efe Jehova mgbe ọtụtụ ndị Izrel sooro Eze Ehab na nwunye ọjọọ ya bụ́ Jezibel na-eme ihe ọjọọ. Ndị ahụ na-efe Bel anaghị asọpụrụ Jehova ma ọ bụ iwu ya. Ma, Nebọt ji adịm ná mma ya na Jehova kpọrọ ihe karịa ndụ ya.

4 Gụọ 1 Ndị Eze 21:1-3. Mgbe Ehab kwuru na ya chọrọ ịzụrụ ubi vaịn Nebọt ma ọ bụkwanụ nye ya ubi vaịn ka nke ahụ mma, Nebọt jụrụ. Maka gịnị? Ọ kwanyeere Ehab ùgwù ma kwuo, sị: “Tụfịakwa! Dị ka Jehova si ele ihe anya, agaghị m enye gị ihe nketa nna nna m hà.” Nebọt jụrụ ime ihe Eze Ehab gwara ya n’ihi na Jehova nyere ndị Izrel iwu ka onye ọ bụla ghara ire ihe nketa ezinụlọ ya. (Lev. 25:23; Ọnụ Ọgụ. 36:7) O doro anya na Nebọt rubeere Jehova isi.

5. Olee otú Jezibel si mee ka e gbuo Nebọt?

5 Ọ dị mwute na ọjụjụ Nebọt jụrụ iresị Eze Ehab ubi vaịn ahụ mere ka Ehab na nwunye ya mee ihe jọgburu onwe ya. Jezibel gwara ụmụ nwoke abụọ ka ha bo Nebọt ebubo ụgha ka o nwee ike inwetara di ya ubi vaịn ahụ. Ihe a ha mere mere ka e gbuo Nebọt na ụmụ ya. Gịnị ka Jehova mere gbasara ikpe na-ezighị ezi a?

CHINEKE KPERE IKPE ZIRI EZI

6, 7. Olee otú Jehova si gosi na ọ hụrụ ikpe ziri ezi n’anya? Oleekwa otú ihe Jehova mere si kasie ndị ikwu Nebọt na ndị enyi ya obi?

6 Jehova gwara Ịlaịja ozugbo ka ọ gaa gwa Ehab okwu. Ịlaịja gwara Ehab na ọ bụ ogbu mmadụ na onye ohi. Gịnị ka Jehova kpebiri ime? O kpebiri na a ga-egbu Ehab na nwunye ya nakwa ụmụ ya otú ahụ e gburu Nebọt.—1 Eze 21:17-25.

7 Ọ bụ eziokwu na ihe a jọgburu onwe ya Ehab mere wutere ndị ikwu Nebọt na ndị enyi ya, ma o doro anya na ihe kasiri ha obi bụ na Jehova hụrụ mmegbu ahụ, meekwa ihe ozugbo maka ya. Ma, o nwere ike ịbụ na ihe ọzọ ha na-atụghị anya ya merenụ mere ka a mata ma hà tụkwasịrị Jehova obi ma dị umeala n’obi.

8. Gịnị ka Ehab mere mgbe ọ nụrụ ihe Jehova kpebiri ime? Gịnịzi ka Jehova mere?

8 Mgbe Ehab nụrụ ihe Jehova kpebiri ime ya, “ọ dọwara uwe ya wee yiri ákwà iru uju; o wee buo ọnụ ma yiri ákwà iru uju dinara ala ma na-eje ije ná mwute.” Ehab wedara onwe ya ala. Gịnịzi ka Jehova mere? Ọ gwara Ịlaịja, sị: “Ebe ọ bụ na o wedara onwe ya ala n’ihi m, agaghị m eweta ọdachi ahụ n’ụbọchị ya. Ọ bụ n’ụbọchị nwa ya ka m ga-eme ka ọdachi ahụ dakwasị ụlọ ya.” (1 Eze 21:27-29; 2 Eze 10:10, 11, 17) Jehova, bụ́ Onye “na-enyocha obi,” meere Ehab ebere.—Ilu 17:3.

ỊDỊ UMEALA N’OBI NA-ECHEBE ANYỊ

9. Gịnị mere ịdị umeala n’obi ga-eji chebe ndị ikwu Nebọt na ndị enyi ya?

9 Olee otú ihe a Jehova mere dị ndị ma ihe ahụ jọgburu onwe ya Ehab mere? Otú Jehova si gbanwee ihe o kpebiri ime Ehab nwere ike ime ka a mata ma ndị ikwu Nebọt na ndị enyi ya hà tụkwasịrị Chineke obi. Ọ bụrụ na ha tụkwasịrị ya obi, ịdị umeala n’obi ga-echebe ha, mee ka ha jiri obi ha niile  na-efe ya, obi esiekwa ha ike na ọ gaghị ekpeli ikpe na-ezighị ezi. (Gụọ Diuterọnọmi 32:3, 4.) Nebọt, ụmụ ya, na ndị ikwu ya ga-ahụ ikpe ziri ezi zuru okè mgbe Jehova ga-akpọlite ndị ezi omume n’ọnwụ. (Job 14:14, 15; Jọn 5:28, 29) Onye dị umeala n’obi na-echetakwa na “ezi Chineke ga-ekpe ụdị ọrụ niile ikpe, tinyere ihe niile zoro ezo, iji kpebie ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ.” (Ekli. 12:14) N’eziokwu, Jehova kpewe ikpe, ọ na-echebara ihe ndị anyị na-amaghị echiche. N’ihi ya, ịdị umeala n’obi na-eme ka ndị aka ha dị ọcha ghara ịkwụsị ịtụkwasị Jehova obi.

10, 11. (a) Olee ihe ụfọdụ nwere ike ịdị anyị ka hà bụ ikpe na-ezighị ezi? (b) Olee otú ịdị umeala n’obi ga-esi chebe anyị?

10 Gịnị ka ị ga-eme ma ndị okenye kpebie ihe ị na-aghọtaghị ma ọ bụ ihe ị na-ekwetaghị? Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na a napụ gị ma ọ bụ onye ị hụrụ n’anya ihe ùgwù n’ọgbakọ? A chụọkwanụ di gị ma ọ bụ nwunye gị, nwa gị ma ọ bụ ezigbo enyi gị n’ọgbakọ, gị echee na e kpetaghị ikpe ahụ? Gịnị ka ị ga-eme ma i chee na ebere e meere onye mere ihe ọjọọ adabaghị adaba? Ụdị ihe a ga-eme ka a mata ma ànyị tụkwasịrị Jehova na  ọgbakọ ya obi. Olee otú ịdị umeala n’obi ga-esi chebe gị ma ụdị ọnwụnwa ahụ bịara gị? Ka anyị leba anya n’ụzọ abụọ.

Ndị okenye kpebie ihe ị na-ekwetaghị, gịnị ka ị ga-eme ma a maa ya n’ọkwa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11)

11 Nke mbụ bụ na ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị ghọta na anyị amaghị ihe niile merenụ. N’agbanyeghị otú anyị maruru, ọ bụ naanị Jehova na-enyocha obi. (1 Sam. 16:7) Ọ bụrụ na anyị amata eziokwu a doro anya, ọ ga-eme ka anyị dị umeala n’obi, ghọta na e nwere ihe ndị anyị na-amaghị, gbanweekwa otú anyị si ele okwu ahụ anya. Nke abụọ bụ na ịdị umeala n’obi ga-enyere anyị aka irubere Jehova isi ma nwee ndidi, chere ya ka o mezie ihe ọ bụla bụ́ ikpe na-ezighị ezi. Sọlọmọn kwuru ụdị ihe ahụ mgbe o dere, sị: “Ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu ezi Chineke mma . . . Ma ọ gaghị adịrị onye ajọ omume mma ma ọlị, ọ gaghịkwa eme ka ụbọchị ndụ ya . . . dị ogologo.” (Ekli. 8:12, 13) N’eziokwu, ịdị umeala n’obi ga-abara ma anyịnwa ma onye ọ bụla ọ gbasara ezigbo uru.—Gụọ 1 Pita 5:5.

IHU ABỤỌ E MERE N’ỌGBAKỌ

12. Olee ihe Baịbụl kọrọ anyị ga-eleba anya na ya ugbu a? Maka gịnị?

12 Ihe mere Ndị Kraịst oge mbụ n’Antiọk nke Siria mere ka a mata ma hà dị umeala n’obi, na-agbaghakwara ndị ọzọ. Ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kọrọ ma hụ otú ọ ga-esi nyere anyị aka ịmata ma ànyị na-agbaghara ndị ọzọ, meekwa ka anyị ghọtakwuo otú ịgbaghara ndị ọzọ si gbasa otú Jehova si ele ikpe ziri ezi anya.

13, 14. Olee ọrụ pụrụ iche e nyere Pita onyeozi? Oleekwa otú o si gosi na ya anaghị atụ egwu?

13 Pita onyeozi bụ okenye a ma ama n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ bụ ezigbo enyi Jizọs. Jizọs nyekwara ya ọrụ ndị dị mkpa. (Mat. 16:19) Dị ka ihe atụ, n’afọ 36, e nyere Pita ọrụ pụrụ iche ịga zie Kọnịliọs na ndị ezinụlọ ya ozi ọma. Ihe mere o ji bụrụ ihe pụrụ iche bụ na Kọnịliọs bụ onye Jentaịl a na-ebighị úgwù. Mgbe e nyere Kọnịliọs na ezinụlọ ya mmụọ nsọ, Pita sịrị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla pụrụ igbochi iji mmiri mee ndị a baptizim, bụ́ ndị natara mmụọ nsọ ọbụna dị ka anyị natara?”—Ọrụ 10:47.

14 N’afọ 49, ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem zukọrọ ka ha kpebie ma è kwesịrị ibi ndị Jentaịl ghọrọ Ndị Kraịst úgwù. Ná nzukọ ahụ, Pita kwuru okwu n’atụghị egwu, chetara ụmụnna na ọ dịbeghị anya ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù natara mmụọ nsọ. Otú ahụ Pita ji ọnụ ya kọọ ihe ọ hụrụ nyeere òtù na-achị isi aka n’oge ahụ ikpebi ihe ha ga-eme. (Ọrụ 15:6-11, 13, 14, 28, 29) Ọ ga-abụ na obi dị Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu na ndị Jentaịl ụtọ maka otú Pita si kwuo okwu n’atụghị egwu. Ọ gaghị esiri ha ike ịtụkwasị ụdị nwanna ahụ ṅụjuru mmiri ara afọ obi.—Hib. 13:7.

15. Olee ihe Pita mejọrọ mgbe ọ nọ n’Antiọk nke Siria? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

15 Ọ dịghị anya e nwechara nzukọ ahụ n’afọ 49, Pita agaa Antiọk nke Siria. N’ebe ahụ, ya na ụmụnna bụ́ ndị Jentaịl nọ na-emekọ ihe. O doro anya na ha mụtara ezigbo ihe n’aka ya. Ma, chegodị otú ọ ga-esi ju ha anya ma wute ha maka na Pita nọkatara kwụsị iso ha na-eri nri. Banabas na ụmụnna ndị ọzọ bụ́ ndị Juu sokwa Pita kpawa àgwà ọjọọ ahụ. Gịnị mere okenye ọgbakọ ṅụjuru mmiri ara afọ ji kpawa ụdị  àgwà ahụ nwere ike ịkpata obi abụghị otu n’ọgbakọ? Ajụjụ kadị mkpa bụ, gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe ahụ Pita mejọrọ, nke ga-enyere anyị aka ma okenye kwuo ma ọ bụ mee ihe were anyị iwe?

16. Olee otú e si gbazie Pita? Olee ajụjụ ndị e kwesịrị ịza?

16 Gụọ Ndị Galeshia 2:11-14. Pita tụrụ egwu mmadụ. (Ilu 29:25) N’agbanyeghị na ọ ma otú Jehova si ele ndị Jentaịl anya, ọ tụrụ ụjọ ihe ụmụnna bụ́ ndị Juu nọ na Jeruselem ga-eche. Pọl onyeozi nọ ná nzukọ ahụ e nwere na Jeruselem n’afọ 49. N’ihi ya, ọ nọ n’Antiọk ebe ahụ gwa Pita na ọ bụ onye ihu abụọ. (Ọrụ 15:12; Gal. 2:13) Gịnị ka ụmụnna bụ́ ndị Jentaịl ga-eme n’ihi ihe ahụ Pita mejọrọ? Hà ga-ekwe ka o mee ka ha sụọ ngọngọ? Ihe ahụ o mejọrọ ọ̀ ga-eme ka a napụ ya ihe ùgwù ndị o nwere n’ọgbakọ?

NA-AGBAGHARA NDỊ ỌZỌ

17. Olee uru Pita ritere n’otú Jehova si agbaghara ndị mmadụ?

17 Pita weturu obi nara ndụmọdụ ahụ Pọl nyere ya. Baịbụl ekwughị na a napụrụ Pita ihe ùgwù ndị o nwere n’ọgbakọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke mechara nye ya mmụọ nsọ ide akwụkwọ abụọ dị na Baịbụl. N’akwụkwọ nke abụọ Pita dere, ọ kpọrọ Pọl “nwanna anyị a hụrụ n’anya.” (2 Pita 3:15) Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịbụ na ihe ahụ Pita mejọrọ wutere ụmụnna bụ́ ndị Jentaịl, Jizọs bụ́ onyeisi ọgbakọ ka jikwa ya na-arụ ọrụ. (Efe. 1:22) Ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ agbaghara Pita, ọ ga-egosi na ha na-eṅomi Jizọs na Nna ya. Ọ ga-abụrịrị na o nweghị onye kwere ka ihe ahụ mmadụ na-ezughị okè mejọrọ mee ka ọ sụọ ngọngọ.

18. Olee mgbe o nwere ike ịdị mkpa ka anyị gosi na anyị na-ele ikpe ziri ezi anya otú Jehova si ele ya?

18 Otú ahụ ọ dị n’oge ndịozi Jizọs ka ọ dịkwa n’oge anyị a. E nweghị okenye ọ bụla zuru okè n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge anyị a n’ihi na “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) O nwere ike ịdịrị anyị mfe ikweta ihe a Baịbụl kwuru. Ma ebe nsogbu na-adịzi bụ mgbe nwanna mejọrọ anyị n’ihi ezughị okè. Ụdị ihe a mee, ànyị ga-eṅomi otú Jehova si ele ikpe ziri ezi anya? Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma okenye kwuo ihe yiri ka ọ̀ kpọrọ gị asị? Ị̀ ga-ekwe ka ihe ahụ o kwuru n’echeghị echiche kpasuo gị iwe ma ọ bụ wute gị? Kama ikwu ozugbo na nwanna ahụ erughịzi eru ịbụ okenye, ị̀ ga-enwe ndidi, chere Jizọs, bụ́ onyeisi ọgbakọ? Ị̀ ga-agbalịsi ike ịhụ ihe ka mkpa, ikekwe, cheta na nwanna ahụ ejirila obi ya niile jeere Jehova ozi ọtụtụ afọ? Nwanna mee gị ihe ọjọọ ma ka bụrụ okenye n’ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ e nye ya ihe ùgwù ndị ọzọ, ị̀ ga-eso ya ṅụrịa ọṅụ? Ọ bụrụ na ị gbaghara ya, o nwere ike igosi na ị na-ele ikpe ziri ezi anya otú Jehova si ele ya.—Gụọ Matiu 6:14, 15.

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ịna-eme?

19 Ndị hụrụ ikpe ziri ezi n’anya na-atụsi anya ike ịhụ mgbe Jehova ga-ewepụ ihe ọ bụla bụ́ ikpe na-ezighị ezi Setan na ụwa ochie ya na-akpatara ndị mmadụ. (Aịza. 65:17) Tupu mgbe ahụ, ka onye ọ bụla n’ime anyị kpebisie ike ịna-ele ikpe ziri ezi anya otú Jehova si ele ya. Otú anyị ga-esi mee ya bụ iwetu obi ghọta na e nwere ihe ndị anyị na-agaghị emeli, jirikwa obi anyị niile na-agbaghara ndị mejọrọ anyị.