Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Disemba 2017

Jekọb ọ̀ ghọrọ nna nna Mesaya n’ihi na ọ zụrụ ihe ruuru ọkpara n’aka Isọ?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’Izrel oge ochie, ọ̀ bụ iwu na ọ bụ onye e nyere ihe ruuru ọkpara ka a ga-esi n’ezinụlọ ya mụta Mesaya?

O nweela oge ndị anyị kwurula ụdị ihe a. O yiri ka ọ̀ dabara n’ihe e kwuru ná Ndị Hibru 12:16. Amaokwu ahụ kwuru na Isọ ‘ejighị ihe dị nsọ kpọrọ ihe.’ “nyefere [Jekọb] ihe ruuru ya dị ka ọkpara iji gbanweta otu efere nri.” O yiri ka ihe amaokwu a na-ekwu ọ̀ bụ na mgbe Jekọb nwetara ‘ihe ruuru ọkpara,’ o sozi ná nna nna Mesaya.—Mat. 1:2, 16; Luk 3:23, 34.

Ma, ihe ndị anyị tụlere na Baịbụl gosiri na ọ bụghị iwu na mmadụ ga-abụrịrị ọkpara tupu e si n’ezinụlọ ya mụta Mesaya. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ mere anyị ji kwuo otú ahụ.

A bịa n’ụmụ Jekọb ma ọ bụ Izrel, aha nwa mbụ Lia mụụrụ ya bụ Ruben. Mgbe e mechara, nwunye ya ọ kacha hụ n’anya bụ́ Rechel mụtaara ya ọkpara aha ya bụ Josef. Mgbe Ruben kpara àgwà ọjọọ, e nyefere Josef ihe ruuru ọkpara. (Jen. 29:31-35; 30:22-25; 35:22-26; 49:22-26; 1 Ihe 5:1, 2) Ma, Mesaya esighị n’ezinụlọ Ruben ma ọ bụ Josef. O si n’ezinụlọ Juda, bụ́ nwa nke anọ Lia mụtaara Jekọb.—Jen. 49:10.

 Luk 3:32 mechara kwuo mmadụ ise ọzọ a ga-esi n’ezinụlọ ha mụta Mesaya. Ọ ga-abụ na ha niile bụ ọkpara. Boaz mụrụ Obed. Ọkpara Obed bụ Jesi.—Rut 4:17, 20-22; 1 Ihe 2:10-12.

Ma, nwa Jesi aha ya bụ Devid abụghị ọkpara. Ọ bụ ya bụ nwa ikpeazụ n’ime ụmụ asatọ Jesi mụrụ. Ma, ọ bụ n’ezinụlọ Devid ka e si mụta Mesaya. (1 Sam. 16:10, 11; 17:12; Mat. 1:5, 6) Solomon bụ onye ọzọ e si n’ezinụlọ ya mụta Mesaya, ma ọ bụghị ya bụ ọkpara Devid.—2 Sam. 3:2-5.

Ihe anyị na-ekwu ebe a abụghị na mmadụ ịbụ ọkpara abaghị uru ọ bụla. A na-akwanyere ọkpara ezigbo ùgwù. Ọ bụkwa ya na-anọchi nna ya ma nna ya nwụọ. A na-ekenye ya òkè abụọ n’ime ihe niile nna ya nwere.—Jen. 43:33; Diut. 21:17; Jọsh. 17:1.

Ma, e nwere ike inye onye ọzọ ihe ruuru ọkpara. Ebreham chụpụrụ Ishmel, ma nye Aịzik ihe ruuru ọkpara. (Jen. 21:14-21; 22:2) Dị ka anyị kwurula, e weere ihe ruuru Ruben, bụ́ ọkpara Jekọb nye Josef.

Ugbu a ka anyị lebazie anya n’ihe e kwuru ná Ndị Hibru 12:16. Ọ sịrị: “Ka e wee ghara inwe onye ọ bụla nke na-akwa iko ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ejighị ihe dị nsọ kpọrọ ihe, dị ka Isọ, onye nyefere ihe ruuru ya dị ka ọkpara iji gbanweta otu efere nri.” Gịnị ka a na-ekwu n’amaokwu a?

Ihe Pọl na-ekwu okwu ya ebe a abụghị ezinụlọ Mesaya si na ya. Ọ ka gwara Ndị Kraịst ka ha ‘na-emere ụkwụ ha ụzọ kwụ ọtọ.’ Ọ bụrụ na ha emee ihe a ọ gwara ha, ọ ga-eme ka a ‘ghara ịnapụ ha obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ,’ bụ́ nke e nwere ike ịnapụ ha ma ha kwaa iko. (Hib. 12:12-16) Ha kwaa iko, ha ga-adị ka Isọ, bụ́ onye na-ejighị “ihe dị nsọ” kpọrọ ihe, ma nwee mmasị n’ihe ụwa.

Isọ dịrị ndụ n’oge ochie, o nwedịrị ike ịbụ na ọ chụụrụ Chineke àjà mgbe ụfọdụ. (Jen. 8:20, 21; 12:7, 8; Job 1:4, 5) Ma, o cheghị echiche nke ọma, ọ hapụrụ ihe ndị ruuru ya ka ọkpara n’ihi otu efere ofe. O nwere ike ịbụ na ọ chọghị ịta ahụhụ e kwuru na mkpụrụ Ebreham ga-ata. (Jen. 15:13) Ihe Isọ mere gosiri na o nwere mmasị n’ihe ụwa. Ọ lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ na-ekpere arụsị, si otú ahụ gosi na o jighị ihe dị nsọ kpọrọ ihe. Ihe a o mere mere ka obi gbawaa ndị mụrụ ya. (Jen. 26:34, 35) Isọ adịghị ka Jekọb. Jekọb gbara mbọ lụọ nwaanyị na-efe ezi Chineke.—Jen. 28:6, 7; 29:10-12, 18.

N’ihi ihe niile a anyị kwurula, gịnị ka anyị nwere ike ikwu banyere ezinụlọ e si na ya mụta Jizọs, bụ́ Mesaya? Mgbe ụfọdụ, o si n’ezinụlọ ọkpara, ma ọ bụghị mgbe niile ka o si n’ezinụlọ ọkpara. Ndị Juu ghọtara ma kwere na ihe a bụ eziokwu. Ha kwetakwara na Kraịst ga-esi n’ezinụlọ Devid, bụ́ nwa ikpeazụ Jesi.—Mat. 22:42.