Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Disemba 2017

Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha “Mara Ihe Iji Nweta Nzọpụta”

Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha “Mara Ihe Iji Nweta Nzọpụta”

“Ebe ị makwaara na ọ bụ malite n’oge ị bụ nwa ọhụrụ ka ị maara ihe odide ndị ahụ dị nsọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka ị mara ihe iji nweta nzọpụta.”—2 TIM. 3:15.

ABỤ: 141, 134

1, 2. Gịnị nwere ike ime ka ndị nne na nna ụfọdụ na-echegbu onwe ha ma ụmụ ha chọọ inyefe Jehova onwe ha, e meekwa ha baptizim?

ỌTỤTỤ puku ndị anyị na-amụrụ Baịbụl na-enyefe Jehova onwe ha, e meekwa ha baptizim. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-eto eto a mụrụ n’ọgbakọ ma ha kpebiri iji ndụ ha na-eme ihe bara uru. (Ọma 1:1-3) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna bụ́ Onye Kraịst, o doro anya na ị na-atụsi anya ụbọchị a ga-eme nwa gị baptizim, ike.—Tụlee 3 Jọn 4.

2 Ma, e nwere ihe ndị nwere ike ịna-echegbu gị. O nwere ike ịbụ na ị hụla ụfọdụ ụmụ okoro na agbọghọ e merela baptizim, ma ka oge na-aga, ha amalite ịna-eche ma ime ihe Chineke kwuru ọ̀ baara ha uru. Ụfọdụ n’ime ha apụọla n’ọgbakọ. Ma, i nwere ike na-eche na nwa gị nwere ike malite ife Jehova, ma ka oge na-aga, ọ gaghịzi eji ọgbakọ kpọrọ ihe. O nwere ike ịdị ka ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ Efesọs n’oge ndịozi, bụ́ ndị Jizọs gwara, sị: ‘Unu ahapụwo ịhụnanya ahụ unu nwere na mbụ.’ (Mkpu. 2:4) Olee otú i nwere ike  isi mee ka ụdị ihe a ghara ime nwa gị, ma nyere ya aka ka o “toruo nzọpụta.” (1 Pita 2:2) Iji zaa ajụjụ a, ka anyị tụlee banyere Timoti.

“Ị MAARA IHE ODIDE NDỊ AHỤ DỊ NSỌ”

3. (a) Olee otú Timoti si ghọọ Onye Kraịst? Olee otú o si na-eme ihe ndị ọ mụtara? (b) Gịnị bụ ihe atọ Pọl gwara Timoti gbasara ha?

3 Pọl onyeozi gara Listra n’afọ 47. Ọ ga-abụ mgbe Timoti, bụ́ onye nwere ike ịbụ nwa okorobịa n’oge ahụ, mụtara banyere ihe Jizọs na-akụzi. Ọ nọ na-eme ihe ọ mụtara na Baịbụl. Mgbe afọ abụọ gachara, ya na Pọl malitere iso na-aga ozi ọma. Mgbe ihe dị ka afọ iri na isii gachara, Pọl degaara Timoti akwụkwọ ozi, sị: “Nọgide n’ihe ndị ị mụtara, ndị e mekwara ka i kwere, ebe ị maara ndị i si n’aka ha mụta ha, ebe ị makwaara na ọ bụ malite n’oge ị bụ nwa ọhụrụ ka ị maara ihe odide ndị ahụ dị nsọ [Akwụkwọ Nsọ Hibru], bụ́ ndị nwere ike ime ka ị mara ihe iji nweta nzọpụta site n’okwukwe i nwere n’ime Kraịst Jizọs.” (2 Tim. 3:14, 15) Cheta na Pọl kwuru gbasara (1) ịmara ihe odide ndị ahụ dị nsọ, (2) ime ka i kwere n’ihe ndị ị mụtara, na (3) ịmara ihe iji nweta nzọpụta site n’okwukwe i nwere n’ime Kraịst Jizọs.

4. Olee ihe ndị i jirila kụziere ụmụ gị ndị dị obere ihe? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 Ebe ị bụ nne ma ọ bụ nna bụ́ Onye Kraịst, ị chọrọ ka nwa gị mara ihe odide ndị ahụ dị nsọ. Taa, ha bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Akwụkwọ Nsọ Grik. Obere ụmụaka nwere ike ịmụta banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nakwa akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl. Nzukọ Jehova ewepụtarala anyị ọtụtụ ihe ndị nne na nna nwere ike iji na-akụziri ụmụ ha ihe. Ì nwere ike icheta ụfọdụ n’ime ha dị n’asụsụ gị? Nwa gị kwesịrị ịma ihe Baịbụl na-ekwu ka ya na Jehova nwee ike ịdị n’ezigbo mma.

‘IME KA I KWERE’

5. (a) Gịnị ka ‘ime ka i kwere’ pụtara? (b) Olee otú anyị si mara na e mere ka Timoti kwere n’ihe a kụziiri ya banyere Jizọs?

5 Ịma ihe odide ndị dị nsọ dị mkpa. Ma, ịkụziri ụmụaka banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nakwa ihe ndị mere eme a kọrọ na Baịbụl abụghị ebe okwu biri. E mere ka Timoti “kwere.” Ihe okwu Grik e si na ya sụgharịa “ka i kwere” pụtara bụ “ime ka obi sie mmadụ ike” ma ọ bụ “ime ka mmadụ kwetasie ike na ihe o kweere bụ eziokwu.” Timoti ma Akwụkwọ Nsọ Hibru malite mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ. O mechara kweta na Jizọs bụ Mesaya. E nwere ike ikwu ya n’ụzọ ọzọ na ihe ndị ọ mụtara mere ka okwukwe ya sikwuo ike. Nke bụ́ eziokwu bụ na Timoti kwetasiri ike banyere ihe a kụziiri ya nke na e mere ya baptizim, ya esoro Pọl na-eje ozi ala ọzọ.

6. Olee otú ị ga-esi nyere ụmụ gị aka ka ha kwere n’ihe ha na-amụta n’Okwu Chineke?

6 Olee otú ị ga-esi mee ka okwukwe ụmụ gị sie ike ka Timoti, ka e nwee ike ime ka ha kwere? Nke mbụ bụ inwe ndidi. Ime ka mmadụ kwere n’ihe a kụziiri ya na-ewe oge. Ọ bụghịkwanụ ihe ị ga-ebufere ụmụ gị naanị n’ihi na e mere ka kwere. Nwa gị nke ọ bụla kwesịrị iji “ike iche echiche” ya kweta n’eziokwu Baịbụl. (Gụọ Ndị Rom 12:1.) Gịnwa bụ́ nne ma ọ bụ nna nwere ọrụ dị mkpa ị ga-arụ iji mee ka okwukwe nwa gị sie ike, nke ka nke, ma ọ jụọ gị ajụjụ. Ka anyị tụlee otu ihe atụ.

7, 8. (a) Olee otú otu nna bụ́ Onye Kraịst si nwee ndidi mgbe ọ na-akụziri nwa ya ihe? (b) Olee mgbe i nweerela nwa gị ụdị ndidi ahụ?

7 Otu nna aha ya bụ Thomas nwere nwa nwaanyị dị afọ iri na otu. Ọ sịrị:  “Nwa m nwere ike ịjụ, sị, ‘Ọ̀ ga-abụ na Jehova kere otu ihe, ihe ahụ e jiri nwayọọ nwayọọ ghọọ ihe ndị ọzọ dị ndụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị mere anyị anaghị atụ vootu iji mee ka ihe ka mma?’ Mgbe ụfọdụ, ana m ejide onwe m ka m ghara ịgwa ya ozugbo ihe ọ ga-ekwere. A sị ka e kwuwe, ihe ga-eme ka mmadụ kweta na ihe a kụziiri ya bụ eziokwu abụghị otu ọkpụrụkpụ ihe. Kama, ọ bụ ụmụ irighiri ihe ga-eme ka o kweta.”

8 Thomas makwa na o kwesịrị inwe ndidi ka o nwee ike ịkụziri nwa ya ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na Ndị Kraịst niile kwesịkwara inwe ndidi. (Kọl. 3:12) Thomas ghọtara na ya na nwa ya ga-ekwurịta okwu ọtụtụ ugboro ka nwa ya nwee ike ikweta n’ihe ọ na-ekwu. Ya na nwa ya ga-ekwurịta ihe dị na Baịbụl ka o nyere ya aka ikweta n’ihe ọ na-amụ. Thomas kwuru, sị: “Mụ na nwunye m na nwa anyị kwuwe ihe dị mkpa, anyị ga-achọ ịmata ma ò kwetara n’ihe ọ na-amụ, nakwa ma ọ̀ ghọtara ya. Obi na-atọ anyị ụtọ ma ọ jụọ anyị ajụjụ. N’eziokwu, m na-echegbu onwe m ma ọ bụrụ na o kweta n’ihe ahụ n’ajụghị anyị ajụjụ.”

9. Olee otú i nwere ike isi nyere nwa gị aka ka o kweta n’ihe Okwu Chineke na-ekwu?

9 Ndị nne na nna jiri ndidi na-akụziri ụmụ ha ihe, ka oge na-aga, ụmụ ha ga-aghọtawa ihe ndị dị “obosara na ịdị ogologo na ịdị elu na ịdị omimi” dị n’ihe ndị ha kweere. (Efe. 3:18) Anyị kwesịrị iji ihe ha ga-aghọtali n’ihi afọ ndụ ha nọ na ya na-akụziri ha ihe. Ka ha na-ekwetasikwu ike n’ihe ndị ha na-amụta, ọ ga-adịrị ha mfe ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị ha kweere, ma ụmụ akwụkwọ ibe ha. (1 Pita 3:15) Dị ka ihe atụ, ụmụ gị hà nwere ike iji Baịbụl kọwaara mmadụ ebe mmadụ na-aga ma ọ nwụọ? Otú Baịbụl si kọwaa ya, hà ghọtara ya? * Cheta na i kwesịrị inwe ndidi iji nyere nwa gị aka ka o kweta n’ihe Okwu Chineke na-ekwu, ma mbọ ị gbara inyere ya aka efughị ọhịa.—Diut. 6:6, 7.

10. Gịnị bụ ihe dị mkpa so n’ihe ị na-akụziri ụmụ gị?

10 Ma, ka nwa gị nwee ike ikweta n’ihe ọ na-amụ, gịnwa ga-ebu ụzọ kweta na ha. Otu nne aha ya bụ Stephanie mụrụ ụmụ nwaanyị atọ. O kwuru, sị: “Kemgbe ụmụ m dị obere, m na-ajụ onwe m, sị: ‘M̀ na-agwa ụmụ m ihe mere ji kwere na Jehova dị, na ọ hụrụ m n’anya, nakwa na ụzọ ya ziri ezi? Ụmụ m, hà ma na hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu?’ Agaghị m atụ anya ka ụmụ m kwere, ọ gwụkwala ma kweere.”

‘ỊMARA IHE IJI NWETA NZỌPỤTA’

11, 12. Gịnị bụ amamihe? Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na ọ bụghị afọ ndụ ga-eme ka mmadụ nwee amamihe?

11 Anyị amụtala na Timoti (1) ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma nakwa na (2) o kwetasiri ike n’ihe o kweere. Ma, olee ihe Pọl bu n’obi kwuo na ihe odide dị nsọ nwere ike ime ka Timoti “nweta nzọpụta”?

12 Akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, kọwara na otu n’ime ihe amamihe pụtara na Baịbụl bụ “mmadụ iji ihe ọ ma na ihe ọ ghọtara na-edozi nsogbu nke ọma, na-agbara nsogbu ọsọ, na-eme ihe ụfọdụ ọ chọrọ ime, ma ọ bụ na-agwa ndị ọzọ ka ha mee otú ahụ. Ọ dị iche ná nzuzu.” Baịbụl kwuru na “nzuzu ka e kekọtara ya na obi nwata.” (Ilu 22:15) Ebe ọ bụ na amamihe dị iche na nzuzu, amamihe  bụ otu n’ime ihe e ji ama onye tozuru okè. Ihe na-eme ka mmadụ bụrụ Onye Kraịst tozuru okè abụghị afọ ndụ ya, kama ọ bụ na onye ahụ na-atụ egwu Chineke ma dị njikere ịna-erubere ya isi.—Gụọ Abụ Ọma 111:10.

13. Olee otú ụmụ okoro na agbọghọ ga-esi gosi na ha ma ihe iji nweta nzọpụta?

13 Ụmụ okoro na agbọghọ tozuru okè n’ọgbakọ anaghị ekwe ka ihe na-agụ ha agụụ ma ọ bụ nsogbu ndị enyi ha na-enye ha mee ka ha bụrụ “ndị ebili mmiri na-enugharị na ndị ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị.” (Efe. 4:14) Kama, ‘a na-azụ ikike nghọta ha azụ,’ ka ha nwee ike “ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.” (Hib. 5:14) Iji gosi na ha eruwela ntozu okè, ha na-ekpebi ihe ndị bara uru ha ga-eme, ma ndị mụrụ ha ma ọ bụ ndị ọzọ hà na-ahụ ha ma ọ bụ na ha anaghị ahụ ha. (Fil. 2:12) Mmadụ kwesịrị inwe ụdị amamihe a ka e nwee ike ịzọpụta ya. (Gụọ Ilu 24:14.) Olee otú ị ga-esi nyere ụmụ gị aka ka ha nwee ụdị amamihe a? Nke mbụ bụ na i kwesịrị ịgwa ụmụ gị hoo haa ihe ndị ị ma Baịbụl kwuru bụ àgwà ọma ma ọ bụ àgwà ọjọọ. Ụmụ gị kwesịrị isi n’ihe ndị ị na-ekwu na ihe ndị ị na-eme mata na ị na-agba mbọ ime ihe Baịbụl kwuru.—Rom 2:21-23.

Gịnị mere mbọ ndị nne na nna na-agba inyere ụmụ ha aka ji dị mkpa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 ruo na nke 18)

14, 15. (a) Olee ihe nwa chọrọ ime baptizim kwesịrị ichebara echiche? (b) Olee otú i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka ka ha chebara uru ọ ga-abara ha ma ha rubere Chineke isi, echiche?

14 Ma, naanị ịgwa ụmụ gị ihe ndị bụ́ ihe ọma na ihe ndị bụ́ ihe ọjọọ abụghị ebe okwu biri. I kwesịkwara inyere ha aka ka ha chebara ajụjụ ndị a echiche. Ha bụ: ‘Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na ihe ndị nwere ike ịna-agụ anụ ahụ́ anyị agụụ adịghị mma? Gịnị mere m ji kwetasie ike na ime ihe Baịbụl kwuru baara m uru mgbe niile?’—Aịza. 48:17, 18.

15 Ọ bụrụ na nwa gị ekwuo na ya chọrọ ime baptizim, nyere ya aka ka o chebara ihe ndị a chọrọ ya n’aka ma e mechaa ya baptizim, echiche. Olee otú obi dị ya banyere ha? Olee uru ihe ndị ahụ ga-abara ya? Olee nsogbu ndị o nwere  ike ịkpatara ya? Gịnị mere uru ọ ga-abara ya ji karịa nsogbu ndị o nwere ike ịkpatara ya? (Mak 10:29, 30) E mechaa mmadụ baptizim, ya na ihe ndị a nwere ike ịna-alụ. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka mmadụ chebara ihe ndị ahụ echiche tupu e mee ya baptizim. Nyere nwa gị aka ka o chebara uru ọ ga-abara ya ma o rubere Chineke isi echiche, nakwa nsogbu ndị ọ ga-akpatara ya ma o nupụrụ ya isi. Ime otú ahụ nwere ike ime ka nwa gị kwetakwuo na ime ihe Baịbụl kwuru ga-abara ya uru mgbe niile.Diut. 30:19, 20.

MGBE ONYE NA-ETO ETO E MERELA BAPTIZIM NA-ENWE OBI ABỤỌ

16. Olee ihe ndị nne na nna kwesịrị ime ma nwa ha e merela baptizim ejichaghịkwa ofufe Chineke kpọrọ ihe?

16 Gịnị ka ị ga-eme ma nwa gị e merela baptizim ejichaghịkwa ofufe Chineke kpọrọ ihe? Dị ka ihe atụ, nwa gị na-eto eto e merela baptizim nwere ike nwewe mmasị n’ihe ụwa ma ọ bụ malite inwe obi abụọ ma ime ihe Baịbụl kwuru ọ̀ baara ya uru. (Ọma 73:1-3, 12, 13) Ebe ị bụ nne ma ọ bụ nna, cheta na ihe i mere nwere ike ime ka nwa gị nọgide na-efe Jehova ma ọ bụ kwụsị ife ya. Ekwela ka ihe a nwa gị na-eche sewere gị na ya okwu, ma ọ̀ ka dị obere ma ọ bụ onye na-eto eto ugbu a. Ihe kwesịrị ịbụ mkpa gị bụ ime ka ọ mata na ị hụrụ ya n’anya, nakwa na ị chọrọ inyere ya aka.

17, 18. Ọ bụrụ na onye na-eto eto ana-enwe obi abụọ, olee otú nne na nna ya ga-esi nyere ya aka?

17 Onye na-eto eto merela baptizim enyefeela Jehova onwe ya. Ihe a o mere gosiri na o kwela Chineke nkwa na ọ ga na-ahụ ya n’anya, nakwa na ọ ga-eji ofufe ya kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla ọzọ. (Gụọ Mak 12:30.) Jehova ejighị nkwa ahụ egwu egwu. Anyị ekwesịkwaghị iji ya egwu egwu. (Ekli. 5:4, 5) Jiri nwayọọ kọọrọ nwa gị ihe ndị a n’oge dabara adaba. Ma, tupu gị eme otú ahụ, gụọ ihe nzukọ Jehova wepụtara maka nne na nna. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ime ka nwa gị ghọta na nnyefe o nyefere Jehova onwe ya, e meekwa ya baptizim abụghị ihe e ji egwu egwu, nakwa na ọ ga-abara ya ọtụtụ uru.

18 Dị ka ihe atụ, ị gaa n’ebe e dere isiokwu ndị ọzọ, ị ga-ahụ ihe ndị ga-enyere gị aka n’isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Nne na Nna Na-ajụ.” Ọ dị n’azụ akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1. O kwuru, sị: ‘Echela ozugbo na nwa gị ajụla ihe i kweere. A na-enwekarị ihe na-akpata ya.’ O nwere ike ịbụ nsogbu ndị enyi ya na-enye ya. Ihe ọzọ nwere ike ịkpata ya bụ owu ma ọ bụ nwa ahụ ịna-eche na ụmụaka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-eme nke ọma karịa ya. Ihe ndị e dere n’isiokwu ndị ọzọ ahụ kwukwara na nsogbu ndị ahụ apụtaghị na nwa gị ajụla ihe i kweere. Ihe na-akpatakarị ya bụ ụfọdụ nsogbu ha na ya na-alụ ugbu a. Ihe ọzọ e kwuru n’isiokwu ndị ọzọ ahụ bụ otú nne ma ọ bụ nna ga-esi nyere nwa ya na-enwe obi abụọ banyere ihe ndị o kweere, aka.

19. Olee otú ndị nne na nna ga-esi nyere ụmụ ha aka ka ha “mara ihe iji nweta nzọpụta”?

19 Ebe ị bụ nne ma ọ bụ nna, i kwesịrị ịzụlite ụmụ gị “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” Ihe a bụ nnukwu ọrụ, nakwa ùgwù Jehova kwanyeere gị. (Efe. 6:4) Anyị amụtala na i kwesịrị ịkụziri ụmụ gị ihe Baịbụl kwuru ma nyere ha aka ka ha kweta n’ihe ha na-amụ. Ọ bụrụ na ha ekwetasie ike, ọ ga-eme ka ha nyefee Jehova onwe ha ma jiri obi ha niile na-ejere ya ozi. Ka Okwu Chineke, mmụọ nsọ ya, na mbọ niile ị na-agba nyere ụmụ unu aka ka ha “mara ihe iji nweta nzọpụta.”

^ para. 9 Ihe ndị ga-enyere gị aka ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi nke dị n’ebe e dere “Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka,” na-enyere ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto aka ịghọta eziokwu Baịbụl na ịkụziri ya ndị ọzọ. Ha dị na jw.org n’ọtụtụ asụsụ. Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa ebe e dere IHE NDỊ E JI AMỤ BAỊBỤL.