Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Disemba 2017

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye hà nwere ike ikpebi iji ihe a na-akpọ IUD (intrauterine device) gbochie afọ ime?

Ọ bụ di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ga-eji aka ha kpebie ma akọnuche ha ọ̀ ga-ekwe ka ha jiri IUD gbochie afọ ime. Ha kwesịrị ịchọpụta otú o si arụ ọrụ, chebakwara ihe Baịbụl kwuru echiche tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme.

Jehova nyere Adam na Iv iwu, sị “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba.” O mechakwara nye Noa na ezinụlọ ya otu iwu ahụ. (Jen. 1:28; 9:1) Baịbụl agwaghị anyị na Ndị Kraịst kwesịrị idebe iwu ahụ. N’ihi ya, di na nwunye ọ bụla kwesịrị ikpebi ma hà ga-eji ihe e ji egbochi afọ ime gbochie afọ ime ma ọ bụ kpebie mgbe ha ga-amụ nwa. Olee ihe ndị ha kwesịrị ichebara echiche?

Ndị Kraịst kwesịrị iji ihe Baịbụl kwuru kpebie ihe ọ bụla ha chọrọ ime gbasara igbochi afọ ime. Ọ bụ ya mere na ha ekwesịghị iwepụ afọ ime n’ihi na ha achọbeghị ịmụ nwa. Ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya wepụ afọ ime, onye ahụ ejighị ihe Baịbụl kwuru gbasara ndụ kpọrọ ihe. Ndị Kraịst ekwesịghị iwepụ afọ ime n’ihi na nwa ahụ e bu n’afọ bụ mmadụ. (Ọpụ. 20:13; 21:22, 23; Ọma 139:16; Jere. 1:5) Mmadụ chọọkwanụ iji IUD gbochie afọ ime?

Ụlọ Nche Bekee nke May 15, 1979 (peeji nke 30 ruo nke 31) kwuru gbasara IUD. Ụdị IUD ndị dị n’oge ahụ bụ obere ihe e ji plastik mee a na-etinye n’akpa nwa nwaanyị iji gbochie afọ ime. Ụlọ Nche ahụ kwuru na o dochaghị anya otú IUD si arụ ọrụ. Ọtụtụ ndị dọkịta sịrị na IUD na-eme ka ọbara ọcha nwoke ghara ịna-eru n’ebe àkwá nwaanyị dị, meekwa ka ya na àkwá nwaanyị ghara ịgwakọta. Ọ bụrụ na àkwá nwaanyị na ọbara ọcha agwakọtaghị, nwaanyị agaghị adị ime.

 Ma, ụfọdụ nchọnchọ e mere gosiri na n’oge ụfọdụ, àkwá na ọbara ọcha na-agwakọta, ghọwa nwa. Nwa ahụ nwere ike towe n’ime ebe àkwá si abanye n’akpa nwa ma ọ bụ ya abanye n’akpa nwa. Ọ bụrụ na ọ banye n’akpa nwa, IUD ga-eme ka ọ ghara ịnọli n’akpa nwa, ya emezie ka nwa ahụ pụọ. Ihe a na iwepụ afọ ime bụ otu ihe. Ihe ikpeazụ Ụlọ Nche ahụ kwuru bụ: “Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ichebara ihe ndị e kwuru gbasara IUD echiche nke ọma, chebakwara ihe Baịbụl kwuru gbasara iji ndụ kpọrọ ihe echiche tupu ya ekpebie ma ọ̀ ga-eji IUD gbochie afọ ime.”—Ọma 36:9.

Kemgbe afọ 1979 e dere Ụlọ Nche ahụ, ndị ọkachamara n’ihe gbasara ahụ́ ike na sayensị ewepụtala ọtụtụ ihe ọgbara ọhụrụ.

E mepụtala ụdị IUD abụọ. Otu bụ nke e tinyere kọpa. Ọtụtụ ndị malitere iji ya egbochi afọ ime n’Amerịka n’afọ 1988. Nke ọzọ bụ nke e tinyere mmiri ọgwụ. A malitere ire ya n’afọ 2001. Olee otú IUD abụọ a si arụ ọrụ?

Nke E Tinyere Kọpa: Anyị ekwuola na IUD na-eme ka ọbara ọcha nwoke ghara ịna-eru n’ebe àkwá nwaanyị dị. Ihe ọzọ IUD a na-eme bụ na ọ na-egbu ọbara ọcha. * Ọ na-agbanwekwa ime akpa nwa.

Nke E Tinyere Mmiri Ọgwụ: E nwere IUD dị iche iche e ji mmiri ọgwụ mee. Mmiri ọgwụ e ji mee ha yiri ndị na-adị ná mkpụrụ ọgwụ ndị a na-aṅụ iji gbochie afọ ime. Mmiri ọgwụ dị na IUD a na-eji nwayọọ nwayọọ abanye n’akpa nwa nwaanyị. E nwere ụfọdụ ụmụ nwaanyị IUD ndị a na-eme ka ahụ́ ha ghara ịna-emepụta àkwá. Ọ bụrụ na ahụ́ nwaanyị emepụtaghị àkwá, ọbara ọcha nwoke agaghị ahụ àkwá ya na ya ga-agwakọta. IUD ndị a na-agbanwe ime akpa nwa. * Ọ na-emekwa ka ihe na-alọ alọ n’ebe ọnụ ọnụ akpa nwa na-alọsi ike, ma mee ka ọbara ọcha ghara inwe ike ịgafe banye n’akpa nwa. IUD ndị a na-emekwa ihe ndị ahụ IUD ndị ahụ e ji plastik mee na-eme.

Dị ka anyị kwuburu, o yiri ka IUD abụọ ndị a na-agbanwecha ime akpa nwa. Nke a pụtara na ọ bụrụ na ahụ́ nwaanyị emepụta àkwá, àkwá ahụ na ọbara ọcha agwakọtakwa, o nwere ike ịbanye n’akpa nwa ma ọ gaghị anọli n’ebe ahụ n’ihi na ime akpa nwa ahụ agbanweela. Ọ ga-eme ka afọ ime ahụ pụọ n’egbughị oge. Ma, ndị ọkachamara kwetara na ọ na-esi ike ihe a emee, nakwa na o nwere ike ime onye ji mkpụrụ ọgwụ egbochi afọ ime.

N’ihi ya, e nweghị onye ga-ekwuli hoo haa na IUD ndị e ji kọpa mee ma ọ bụ ndị e ji mmiri ọgwụ mee enweghị ike ikwe ka àkwá nwaanyị na ọbara ọcha nwoke gwakọta. Ma, nchọnchọ ndị ọkachamara mere gosiri na ọ na-esi ike nwaanyị tinyere IUD ndị a adị ime n’ihi otú ha si eme ka ákwà na ọbara ọcha ghara ịgwakọta.

Ọ bụrụ na di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst chọrọ iji IUD gbochie afọ ime, ha nwere ike ịgakwuru dọkịta ha ka ha na ya kparịta ya. Ọ ga-agwa ha ụdị nke e nwere ebe ha bi, gwakwa ha uru na ọghọm dị na ya. Di na nwunye ahụ ekwesịghị ịtụwa anya ka onye ọzọ kpebiere ha ihe ha ga-eme. Ha ekwesịghịkwa ikwe ka onye ọzọ kpebiere ha ihe ha ga-eme, ọ sọkwa ya ya bụrụ dọkịta. (Rom 14:12; Gal. 6:4, 5) Ọ bụ ha ga-eji aka ha kpebie ya. Ihe kwesịrị ịbụ mkpa ha bụ ka ha mee ihe ga-eme Jehova obi ụtọ, meekwa ka akọnuche ha dị ọcha.—Tụlee 1 Timoti 1:18, 19; 2 Timoti 1:3.

^ para. 4 Otu akwụkwọ ụlọ ọrụ na-ahụ gbasara ahụ́ ike bụ́ England’s National Health Service kwuru, sị: “Ọ bụrụ na kọpa dị na IUD hiri nne, ọ ga-esi ike onye tinyere ya adị ime. Nke a pụtara na ọ bụrụ na ụmụ nwaanyị dị otu narị tinyere ya, ọ bụ naanị otu onye n’ime ha ga-adị ime n’otu afọ. Ọ bụrụ na kọpa dị na IUD ehighị nne, ọ gaghị esichara onye tinyere ya ike ịdị ime.”

^ para. 5 Ebe ọ bụ na IUD ndị a e ji mmiri ọgwụ mee na-agbanwe ime akpa nwa, oge ụfọdụ, ndị dọkịta na-eji ya akwụsị nnukwu ọbara na-agba ụfọdụ ụmụ nwaanyị ma ha nọrọ ná nsọ ha. Ha na-etinye ya ma ụmụ nwaanyị lụrụ di ma ndị nke na-alụbeghị di.