Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Disemba 2017

“Amaara M na Ọ Ga-ebili”

“Amaara M na Ọ Ga-ebili”

Enyi anyị na-arahụ ụra, ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya.’​—JỌN 11:11.

ABỤ: 142, 129

1. Olee ihe Mata kwetara ga-eme nwanne ya nwoke? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

MATA, bụ́ ezigbo enyi Jizọs, bụrụkwa onye na-eso ụzọ ya, na-eru uju. Nwanne ya nwoke Lazarọs anwụọla. Ò nwere ihe ga-akasi ya obi? À na-ajụkwa ajụ. Jizọs gwara ya ihe mesiri ya obi ike. Ọ gwara ya, sị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” Ọ ga-abụ na ihe a Jizọs gwara ya emechaghị ka ọ kwụsị iru uju. Ma, Mata kwetara ihe ahụ Jizọs gwara ya. Ọ gwara Jizọs, sị: “Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 11:20-24) Obi siri ya ezigbo ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọdịnihu. Jizọs rụziri ọrụ ebube. Ọ kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ n’ụbọchị ahụ.

2. Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike otú ahụ o siri Mata?

2 Anyị ekwesịghị ịtụwa anya na Jizọs ma ọ bụ Nna ya ga-arụrụ anyị ụdị ọrụ ebube a ugbu a. Ma, obi ò siri gị ike otú ahụ o siri Mata na a ga-akpọlite ndị nwụnahụrụ gị n’ọdịnihu? O nwere ike ịbụ di gị ma ọ bụ nwunye gị, nne gị, nna gị, nne nne gị ma ọ bụ nna nna gị. O nwekwara ike ịbụ na ị na-eru uju n’ihi na nwa gị nwụrụ. Ọ na-agụsi gị agụụ ike gị na ya ịmakụ, kwurịta okwu, ma ọ bụ chịa ọchị.  Dị ka Mata, o nwere ezigbo ihe mere i kwesịrị iji jiri obi ụtọ kwuo, sị: ‘Amaara m na onye nwụnahụrụ m ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ.’ Ma, ọ dị mma ka Onye Kraịst ọ bụla chee ihe mere o ji kwere ná mbilite n’ọnwụ.

3, 4. Olee otú ihe Jizọs mere n’oge na-adịghị anya si mee ka okwukwe Mata sikwuo ike?

3 Mata bi nso na Jeruselem. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ọ hụghị mgbe Jizọs kpọlitere nwa nwaanyị di ya nwụrụ n’obodo Nen dị na Galili n’ọnwụ. Ma, ọ ga-abụ na ọ nụrụ banyere ya. Ọ ga-abụkwa na ọ nụrụ na Jizọs kpọlitere ada Jeirọs n’ọnwụ. Ndị niile nọ n’ụlọ nwata nwaanyị ahụ ‘maara na ọ nwụọla.’ Ma, Jizọs seere ya n’aka ma kwuo, sị: “Nwata nwaanyị, bilie!” O bilikwara ozugbo. (Luk 7:11-17; 8:41, 42, 49-55) Mata na nwanne ya nwaanyị bụ́ Meri ma na Jizọs ga-agwọli ndị ọrịa. N’ihi ya, ha kwetara na a sị na Jizọs nọ ya na ezigbo enyi ya Lazarọs agaraghị anwụ. Ma, ugbu a ọ nwụrụla, olee ihe Mata na-atụ anya ya? Cheta na Mata kwuru na Lazarọs ga-adị ndụ n’ọdịnihu, “n’ụbọchị ikpeazụ.” Gịnị mere obi ji sie ya ike na ọ ga-eme? Gịnịkwa mere obi ga-eji sie gị ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ n’ọdịnihu, ma ndị nwụnahụrụ gị?

4 O nwere ihe ndị mere obi ji kwesị isi gị ike. Ka anyị na-atụle ụfọdụ n’ime ha, i nwere ike ịhụ ihe Baịbụl kwuru gbasara mbilite n’ọnwụ nke ị na-echetụbeghị n’echiche. Ha ga-eme ka obi sikwuo gị ike na ị ga-ahụ ndị nwụnahụrụ gị ọzọ.

IHE NDỊ MERE KA ANYỊ NWEE OLILEANYA

5. Olee ihe mere obi ji sie Mata ike na a ga-akpọlite Lazarọs n’ọnwụ?

5 Cheta na Mata ekwughị, sị: ‘Enwere m olileanya na nwanne m nwoke ga-ebili.’ Kama, ọ sịrị: “Amaara m na ọ ga-ebili.” Ihe mere obi ji sie Mata ike bụ n’ihi na ọ ma banyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ tupu Jizọs amalite ozi ya n’ụwa. Ọ ga-abụ na ọ mụtara banyere ha n’ụlọ, nakwa n’ụlọ nzukọ mgbe ọ bụ nwata. Ugbu a, ka anyị leba anya n’atọ n’ime mbilite n’ọnwụ ndị ahụ Baịbụl kọrọ banyere ha.

6. Olee ọrụ ebube o doro anya na Mata ma banyere ya?

6 Mbilite n’ọnwụ mbụ a kọrọ na Baịbụl mere n’oge Chineke nyere Ịlaịja onye amụma ike ịrụ ọrụ ebube. E nwere otu nwaanyị di ya nwụrụ n’obodo Zarefat nke dị na Finishia, lere onye amụma a ọbịa. Chineke rụrụ ọrụ ebube mee ka ntụ ọka na mmanụ nwaanyị ahụ ghara ịgwụ agwụ ka agụụ ghara igbu ya na nwa ya nwoke. (1 Eze 17:8-16) Nwa ya a mechara daa ọrịa ma nwụọ. Ịlaịja gbataara ya ọsọ enyemaka. Mgbe Ịlaịja na-emetụ nwa ahụ aka, o kpere ekpere, sị: “Chineke m, biko, mee ka mkpụrụ obi nwatakịrị a bịaghachi n’ime ya.” Ihe ahụ o kwuru mere. Chineke nụrụ ekpere o kpere, ma mee ka nwa ahụ dị ndụ. Nke a bụ mbilite n’ọnwụ mbụ a kọrọ na Baịbụl. (Gụọ 1 Ndị Eze 17:17-24.) O doro anya na Mata ma banyere ya.

7, 8. (a) Kọọ ihe Ịlaịsha mere iji kasie nwaanyị na-eru uju obi. (b) Olee ihe ọrụ ebube Ịlaịsha rụrụ na-egosi banyere Jehova?

7 Ịlaịsha onye amụma bụ onye ọzọ kpọlitere mmadụ n’ọnwụ. Nke a bụ mbilite n’ọnwụ nke abụọ a kọrọ na Baịbụl. Otu nwaanyị Izrel a ma ama n’obodo Shunem lere Ịlaịsha ezigbo ọbịa. N’ihi ya, Chineke si n’aka onye amụma a mee ka nwaanyị a na di ya merela agadi mụta nwa nwoke. Mgbe afọ ole na ole gachara, nwa a nwụrụ. Chegodị otú obi si gbawaa nwaanyị ahụ. Di ya hapụrụ ya ka ọ gaa hụ Ịlaịsha n’Ugwu Kamel. Ọ gara ihe dị ka kilomita iri atọ. Onye amụma  ahụ zigara onye na-ejere ya ozi bụ́ Gehezaị ka o buru ya ụzọ gaa Shunem kpọlite nwa ahụ n’ọnwụ. Ma, Gehezaị emelighị ya. Ịlaịsha na nwaanyị ahụ obi na-agbawa emechazie rute.—2 Eze 4:8-31.

8 Ịlaịsha banyere n’ụlọ ebe ozu nwa ahụ nọ na Shunem, ma kpee ekpere. Jehova zara Ịlaịsha ekpere ma mee ka nwa ahụ dịghachi ndụ. Mgbe nne nwa ahụ hụrụ ya, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ. (Gụọ 2 Ndị Eze 4:32-37.) Ọ ga-abụ na o chetara ekpere Hana bụbu nwaanyị aga kpere mgbe ọ kpọtara Samuel n’ụlọikwuu ka o jewere Jehova ozi. Hana kpere ekpere, sị: ‘Jehova na-eme ka a rịdaa na Shiol, na-emekwa ka a rịgote.’ (1 Sam. 2:6) O doro anya na ọ bụ Chineke kpọlitere nwa ahụ n’ọnwụ na Shunem. Nke a gosiri na ọ ga-akpọliteli ndị nwụrụ anwụ.

9. Kọwaa otú mbilite n’ọnwụ nke atọ a kọrọ na Baịbụl si gbasa Ịlaịsha.

9 Ma, e nwere ihe ọzọ dị ịtụnanya mere mgbe Ịlaịsha nwụchara. Ọ bụrụla onye amụma ihe karịrị afọ iri ise ma mechaa ‘daa ọrịa, bụ́ ọrịa gburu ya.’ Mgbe oge gachara, ozu Ịlaịsha rere, ya afọzie ọkpụkpụ ya. Otu ụbọchị, ụfọdụ ndị Izrel bu ozu otu nwoke na-aga ebe ha chọrọ ili ya. Ozugbo ha hụrụ ndị iro ha, ha tụbara ozu nwoke ahụ n’ili Ịlaịsha ma ọ bụ n’ebe ọkpụkpụ ya dị. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ozu nwoke ahụ metụrụ ọkpụkpụ Ịlaịsha, ọ dịrị ndụ ozugbo ma guzoro n’ụkwụ ya.” (2 Eze 13:14, 20, 21) Akụkọ ndị a mere ka Mata ghọta na Chineke ka ọnwụ ike. Ha kwesịkwara ime ka obi sie gị ike na ike Chineke enweghị atụ.

IHE NDỊ MERE N’OGE NDỊOZI JIZỌS

10. Olee otú Pita si nyere Onye Kraịst nwụrụ anwụ aka?

10 N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, e nwekwara ndị ohu Chineke kpọlitere ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Jizọs gara n’obodo dị nso na Nen kpọlite onye nwụrụ anwụ, gaakwa n’ụlọ Jeirọs kpọlitekwa onye ọzọ. Pita onyeozi kpọlitekwara Onye Kraịst aha ya bụ Dọkas n’ọnwụ, bụ́ onye a na-akpọkwa Tabita. Pita batara n’ụlọ ebe ozu ya dị, kpee ekpere ma kwuo, sị: “Tabita, bilie!” O biliri ozugbo, Pita ‘echee ya n’ihu’ Ndị Kraịst ibe ya “ná ndụ.” Ihe a merenụ mesiri ndị mmadụ obi ike nke na o mere ka ‘ọtụtụ ndị ghọọ ndị kweere n’Onyenwe anyị.’ Ha na-akọrọ ndị ọzọ banyere Jizọs, na-akọkwara mmadụ niile na Jehova ga-akpọliteli ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.—Ọrụ 9:36-42.

11. Olee ihe Luk bụ́ dọkịta kwuru mere otu nwa okorobịa? Olee uru ọ baara ndị ọzọ?

11 E nwekwara ndị hụrụ onye ọzọ a kpọlitere n’ọnwụ. O nwere otu ụbọchị Pọl onyeozi na ndị ọzọ nọ na-enwe nzukọ n’ọnụ ụlọ dị n’elu na Troas, nke dị n’agbata ebe ugwu na ebe ọdịda anyanwụ Tọki. Pọl kwugidere okwu ruo ime ime abalị. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Yutikọs nọ ọdụ na windo na-ege ntị. Ma, ụra buuru ya, ya esi n’okpukpu ụlọ nke atọ daa. Ọ ga-abụ na Luk bụ́ dọkịta bu ụzọ rute n’ebe Yutikọs dara ma lee ya ahụ́. Ọ chọpụtara na ọ bụghị naanị na o merụrụ ahụ́ ma tụbọọ, kama na ọ nwụọla. Pọl gbadara n’ala, makụọ ya ma kwuo ihe tụrụ mmadụ niile n’anya, sị: “Ọ dịla ndụ.” Ọrụ ebube a metụrụ ndị mmadụ n’ahụ́. Ebe ndị mmadụ ma na nwa okorobịa ahụ nwụrụ anwụ a kpọlite ya n’ọnwụ, a ‘kasiri ha obi n’ụzọ na-enweghị atụ.’—Ọrụ 20:7-12.

OLILEANYA E JI N’AKA

12, 13. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị banyere ndị anyị kwurula na a kpọlitere n’ọnwụ?

12 Ndị ahụ a kọrọ a kpọlitere n’ọnwụ kwesịrị ime ka obi sie gị ike otú ahụ  o siri Mata. Obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke anyị, bụ́ Onye nyere anyị ndụ, ga-akpọliteli ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ma, otu ihe magburu onwe ya bụ na Jehova ji ndị ohu ya dị ka Ịlaịja, Jizọs, na Pita kpọlite ndị ahụ n’ọnwụ. Ihe ndị a mere n’oge Jehova na-enye ndị mmadụ ike ịrụ ọrụ ebube. Ma, gịnịkwanụ banyere ndị nwụrụ n’oge ndị ọzọ mgbe Chineke na-arụghị ụdị ọrụ ebube ndị ahụ? Ndị ohu Chineke hà ga-atụwa anya na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọdịnihu? Obi ọ̀ ga-esi ha ike otú ahụ o siri Mata mgbe o kwuru banyere nwanne ya nwoke, sị: “Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ”? Gịnị mere o ji kwere? Gịnịkwa mere i ji kwere?

13 E nwere ọtụtụ ebe na Baịbụl gosiri na ndị ohu Chineke ma na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọdịnihu. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

14. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta banyere mbilite n’ọnwụ ma a bịa n’ihe Baịbụl kwuru gbasara Ebreham?

14 Chegodị ihe Chineke gwara Ebreham ka o jiri Aịzik mee, bụ́ nwa ọ nọ na-atụ anya ya kemgbe. Jehova gwara ya, sị: “Biko, kpọrọ nwa gị nwoke, nwa ị mụrụ naanị ya, onye ị hụrụ n’anya nke ukwuu, bụ́ Aịzik, . . . chụọ ya dị ka àjà nsure ọkụ.” (Jen. 22:2) Olee otú i chere obi dị Ebreham mgbe Jehova gwara ya ihe a? Jehova kwere ya nkwa na a ga-esi ná mkpụrụ ya gọzie mba niile. (Jen. 13:14-16; 18:18; Rom 4:17, 18) Jehova kwukwara na a “ga-esi n’Aịzik,” gọzie ha. (Jen. 21:12) Ma, olee otú ọ ga-esi ekwe omume ma Ebreham jiri Aịzik chụọ àjà? Pọl kọwara na Ebreham kweere na Chineke nwere ike ịkpọlite Aịzik n’ọnwụ. (Gụọ Ndị Hibru 11:17-19.) Baịbụl ekwughị na Ebreham chere na ọ bụrụ na o mee ihe a Chineke gwara ya, na Chineke ga-akpọlite Aịzik n’ọnwụ n’awa ole na ole, mgbe otu ụbọchị ma ọ bụ otu izu gachara. Ebreham amaghị mgbe a ga-akpọlite nwa ya n’ọnwụ. Ma, ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-akpọlite Aịzik n’ọnwụ.

15. Olee olileanya Job nwere?

15 Job makwa na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọ ma na ọ bụrụ na e gbutuo osisi, o nwere ike ipulite ọzọ ma ghọọ osisi ọhụrụ. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị mmadụ. (Job 14:7-12; 19:25-27) Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ gaghị akpọliteli onwe ya n’ọnwụ. (2 Sam. 12:23; Ọma 89:48) Ma, nke  ahụ apụtaghị na Chineke enweghị ike ịkpọlite mmadụ n’ọnwụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Job kwetara na Jehova nwere oge ọ ga-akpọlite ya n’ọnwụ. (Gụọ Job 14:13-15.) Job amaghị mgbe ọ ga-abụ n’ọdịnihu. Ma, obi ka siri ya ike na Onye kere mmadụ ga-echeta ya ma kpọlite ya n’ọnwụ.

16. Olee ihe otu mmụọ ozi gwara Daniel onye amụma iji mee ka obi sie ya ike?

16 Onye ọzọ fere Chineke anyị ma a kọrọ akụkọ ya n’Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ Daniel. O jeere Chineke ozi ọtụtụ afọ, Jehova akwadokwa ya. E nwere mgbe otu mmụọ ozi kpọrọ ya “nwoke a hụrụ n’anya nke ukwuu,” ma gwa ya ka ‘udo dịrị ya,’ nakwa ka ọ “dị ike.”—Dan. 9:22, 23; 10:11, 18, 19.

17, 18. Olee nkwa e kwere Daniel banyere ọdịnihu?

17 Ma, mgbe oge ọnwụ Daniel ruwara, n’oge ọ fọrọ obere ka o ruo otu narị afọ, o nwere ike ịbụ na ọ nọ na-eche ihe ga-eme ya n’ọdịnihu. À ga-akpọlite ya n’ọnwụ? À na-ajụkwa ajụ. N’isi ikpeazụ nke akwụkwọ Daniel, Chineke gwara ya okwu iji mee ka obi sie ya ike. Ọ gwara ya, sị: “Gị onwe gị, gawa ruo n’ọgwụgwụ; ị ga-ezukwa ike.” (Dan. 12:13) Daniel ma na ndị nwụrụ anwụ na-ezu ike, marakwa na “ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol,” bụ́ ebe ọ ga-aga n’oge na-adịghị anya. (Ekli. 9:10) Ma, nke Daniel agwụbeghị. Jehova kwere ya ezigbo nkwa n’ọdịnihu.

18 Mmụọ ozi ahụ gwakwara Daniel, sị: “Ị ga-ebili ka i nweta òkè gị mgbe ụbọchị ndị a gwụchara.” O nweghị oge a gwara ya na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ. Daniel ga-anwụ ma zuru ike. Ma, mgbe Daniel nụrụ nkwa a bụ́ “Ị ga-ebili ka i nweta òkè gị,” ọ ghọtara na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ n’ọdịnihu. Nke a ga-abụ mgbe ogologo oge gacharala, ya bụ, “mgbe ụbọchị ndị a gwụchara.”

Obi kwesịrị isi gị ike otú ahụ o siri Mata, na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19 na nke 20)

19, 20. (a) Olee otú ihe ndị anyị lebarala anya n’isiokwu a si gbasa ihe Mata gwara Jizọs? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu na-eso nke a?

19 O doro anya na Mata nwere ezigbo ihe mere obi ji sie ya ike na nwanne ya nwoke, bụ́ Lazarọs, “ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” Nkwa Jehova kwere Daniel, nakwa otú obi si sie Mata ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ kwesịrị ime ka obi sie Ndị Kraịst ike taa. A ga-enwe mbilite n’ọnwụ.

20 Ndị anyị mụrụla na a kpọlitere n’ọnwụ n’oge gara aga emeela ka o doo anya na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị jeerela Chineke ozi nwere olileanya na e nwere oge a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọdịnihu. Ma, è nwere ihe gosiri na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ mgbe ogologo oge gachara e kwere nkwa a? Ọ bụrụ na e nwere, ọ ga-eme ka anyị nwekwuo olileanya otú ahụ Mata nwere, na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. Ma, olee mgbe ọ ga-abụ? Anyị ga-atụle ihe ndị a n’isiokwu na-eso nke a.