Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Disemba 2017

‘Enwere M Olileanya n’Ebe Chineke Nọ’

‘Enwere M Olileanya n’Ebe Chineke Nọ’

“Adam ikpeazụ ghọrọ mmụọ na-enye ndụ.”​—1 KỌR. 15:45.

ABỤ: 151, 147

1-3. (a) Olee ihe kwesịrị iso n’ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ anyị kweere? (b) Gịnị mere mbilite n’ọnwụ ji dị ezigbo mkpa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

GỊNỊ ka ị ga-aza ma mmadụ jụọ gị, sị: ‘Olee ozizi ndị gbara ọkpụrụkpụ i kweere? O doro anya na ị ga-agwa onye ahụ na i kweere na Jehova kere ihe niile, nakwa na ọ bụ ya nyere anyị ndụ. I nwekwara ike ịgwa ya na i kweere na Jizọs Kraịst, bụ́ onye nwụrụ iji gbapụta anyị. Ị ga-ejikwa obi ụtọ gwa ya na ụwa ga-aghọ paradaịs n’ọdịnihu, bụ́ ebe ndị Chineke ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ị̀ ga-agwa ya na mbilite n’ọnwụ so n’ihe ndị i kweere ị kacha jiri kpọrọ ihe?

2 E nwere ihe mere mbilite n’ọnwụ ji kwesị iso n’ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ anyị kweere, ọ bụrụgodị na anyị na-atụ anya na anyị agaghị anwụ n’oké mkpagbu, nakwa na anyị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa. Pọl onyeozi kwuru ihe mere mbilite n’ọnwụ ji dị mkpa. Ọ sịrị: “N’ezie, ọ bụrụ na mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị, a kpọliteghị Kraịst.” Ọ bụrụ na a kpọliteghị Kraịst n’ọnwụ, ọ gaghị abụ Eze anyị. Ihe anyị na-akụziri ndị mmadụ banyere ọchịchị ya abaghị uru. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:12-19.) Ma, anyị ma na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Ebe ọ bụ na anyị kweere ná mbilite  n’ọnwụ, anyị adịghị ka ndị Sadusii, bụ́ ndị na-ekwetatụdịghị na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ndị ọzọ na-akwagodị anyị emo, anyị ka kwetasiri ike na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.—Mak 12:18; Ọrụ 4:2, 3; 17:32; 23:6-8.

3 Pọl kwuru na “mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ” so ‘n’ozizi ndị mbụ banyere Kraịst.’ (Hib. 6:1, 2) O kwukwara na ya kweere ná mbilite n’ọnwụ. (Ọrụ 24:10, 15, 24, 25) Ọ bụ eziokwu na mbilite n’ọnwụ so n’ozizi ndị mbụ, ya bụ, otu n’ime ihe ndị mbụ anyị na-amụta n’Okwu Chineke, anyị ka kwesịrị ịmụ gbasara ya nke ọma. (Hib. 5:12) Maka gịnị?

4. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ banyere mbilite n’ọnwụ?

4 Ka ndị mmadụ na-amalite ịmụ Baịbụl, ọtụtụ n’ime ha na-agụ banyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’oge gara aga, dị ka Lazarọs. Ha na-amụtakwa na obi siri Ebreham, Job, na Daniel ike na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ n’ọdịnihu. Ma, gịnị ka ị ga-ekwu ma mmadụ gwa gị ka i jiri Baịbụl gosi ya ihe mere obi ji sie gị ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ n’agbanyeghị na o teela ezigbo aka Chineke kwere nkwa a? Baịbụl ò kwuru oge a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ? Azịza ajụjụ ndị a ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. N’ihi ya, ka anyị tụlee ihe Baịbụl kwuru.

MBILITE N’ỌNWỤ E KWURU ỌTỤTỤ NARỊ AFỌ GARA AGA NA A GA-ENWE

5. Olee mbilite n’ọnwụ anyị ga-ebu ụzọ atụle?

5 Anyị nwere ike na-eche otú onye nwụrụ anwụ n’oge na-adịghị anya ga-esi dị ndụ ọzọ. (Jọn 11:11; Ọrụ 20:9, 10) Gịnịkwanụ gbasara nkwa e kwere na a ga-akpọlite onye nwụrụ anwụ n’ọdịnihu, ọ bụrụgodị na o ruola ọtụtụ narị afọ ọ nwụrụ? Ànyị ga-ekwere ná nkwa a, ma onye ahụ ọ̀ nwụrụ n’oge na-adịghị anya ma ọ bụ na ọ dịla anya ọ nwụrụ? Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere mbilite n’ọnwụ e kwuru ọtụtụ narị afọ gara aga na a ga-enwe nke e mechara nwee. I kwekwaara na ya. Olee mbilite n’ọnwụ ọ bụ? Olee otú o si gbasa mbilite n’ọnwụ anyị na-atụ anya ya n’ọdịnihu?

6. Olee otú amụma e buru n’Abụ Ọma 118 si gbasa Jizọs?

6 Ka anyị tụlee mbilite n’ọnwụ e kwuru maka ya ọtụtụ afọ gara aga. Abụ Ọma 118 nke ọ ga-abụ na Devid dere, kwuru, sị: “Biko, Jehova, biko, zọpụta anyị! . . . Ka Onye na-abịa n’aha Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi.” Ọ ga-abụ na i chetara na ndị mmadụ kwuru banyere amụma a e buru gbasara Mesaya mgbe Jizọs gba nwa ịnyịnya ibu na-aga Jeruselem na Naịsan 9, ụbọchị ole na ole tupu e gbuo ya. (Ọma 118:25, 26; Mat. 21:7-9) Olee otú Abụ Ọma 118 si kwuo banyere onye e buru n’amụma na a ga-akpọlite n’ọnwụ ọtụtụ afọ tupu ya emee? Leekwa ihe ọzọ e kwuru n’Abụ Ọma ahụ. Ọ sịrị: “Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ aghọwo isi nkuku.”—Ọma 118:22.

“Ndị na-ewu ụlọ” jụrụ Mesaya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Olee otú ndị Juu si jụ Jizọs?

7 “Ndị na-ewu ụlọ,” ya bụ, ndị ndú ndị Juu jụrụ Mesaya. Ọ bụghị naanị na ha jụrụ ya ma ọ bụ ghara ikwere na ọ bụ Kraịst. Kama, ọtụtụ ndị Juu jụrụ ya nke na ha kwuru ka e gbuo ya. (Luk 23:18-23) N’eziokwu, ha so ná ndị mere ka e gbuo Jizọs.

A kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ya aghọọ “isi nkuku” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)

8. Olee otú Jizọs ga-esi ghọọ “isi nkuku”?

8 Ọ bụrụ na a jụrụ Jizọs ma gbuo ya, olee otú ọ ga-esi ghọọ “isi nkuku”? Ọ bụ naanị ma à kpọlitere ya n’ọnwụ. Jizọs mere ka o doo anya mgbe ọ kọrọ banyere otu nwoke nwere ubi vaịn, bụ́ onye zigara ndị na-ejere ya ozi ka ha gaa hụ ndị ọrụ ubi o nyefere ubi ya n’aka. Ha tikasịrị ndị na-ejere nwoke ahụ ozi  ahụ́ otú ahụ ndị Izrel mere ndị amụma Chineke ziteere ha. N’ikpeazụ, nwoke ahụ zigaara ha ọkpara ya. Hà nabatara ọkpara ya? N’ebeekwanụ. Ha gburu ọkpara ya. Mgbe Jizọs kọchara akụkọ a, o kwuru ihe e buru n’amụma n’Abụ Ọma 118:22. (Luk 20:9-17) Mgbe ndị ‘na-achị ndị Juu na ndị okenye na ndị odeakwụkwọ ha nwere nzukọ na Jeruselem,’ Pita onyeozi kwukwara ihe e dere n’amaokwu a mgbe ọ na-agwa ha okwu. Ọ gwara ha banyere ‘Jizọs Kraịst onye Nazaret, onye ha kpọgidere n’osisi, onye Chineke mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.’ O mechara kwuo, sị: “Onye a bụ ‘nkume ahụ nke unu bụ́ ndị na-ewu ụlọ mesoro dị ka ihe na-abaghị uru, nke ghọworo isi nkuku.’”—Ọrụ 3:15; 4:5-11; 1 Pita 2:5-7.

9. Olee ihe pụrụ iche Abụ Ọma 118:22 kwuru ga-emenụ?

9 O doro anya na amụma ahụ e buru n’Abụ Ọma 118:22 kwuru na a ga-enwe onye a ga-akpọlite n’ọnwụ mgbe ọtụtụ narị afọ gachara e kwuru ya. A ga-ajụ Mesaya ma gbuo ya. Ma, a ga-akpọlite ya n’ọnwụ ka ọ ghọọ isi nkuku. Ozugbo a kpọlitere ya, ọ ga-abụ naanị aha ya ka ‘e nyere ụmụ mmadụ, nke a ga-eji zọpụta ha.’—Ọrụ 4:12; Efe. 1:20.

10. (a) Gịnị ka e buru n’amụma n’Abụ Ọma 16:10? (b) Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Abụ Ọma 16:10 anaghị ekwu gbasara Devid?

10 Ka anyị tụlee amaokwu ọzọ kwuru gbasara onye a ga-akpọlite n’ọnwụ. O mezuru mgbe ihe karịrị otu puku afọ gachara. Nke a kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na Baịbụl kwuo na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ, a ga-enwe ya n’agbanyeghị ogologo oge o were tupu ya emee. Devid kwuru n’Abụ Ọma 16, sị: “Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m n’ime Shiol. Ị gaghị ekwe ka onye na-eguzosi ike n’ebe ị nọ banye n’olulu.” (Ọma 16:10) Devid anaghị ekwu na ya agaghị anwụ ma ọ bụ gaa n’ili. Okwu Chineke kwuru hoo haa na ọ kara nká ma nwụọ, nakwa na ‘o sooro nna nna ya hà dinaa, e wee lie ya n’Obodo Devid.’ (1 Eze 2:1, 10) N’ihi ya, ònye ka Abụ Ọma 16:10 na-ekwu banyere ya?

11. Olee mgbe Pita kọwara Abụ Ọma 16:10?

11 Ihe karịrị otu puku afọ Devid dechara Abụ Ọma 16:10, Pita kọwara onye amaokwu a na-ekwu banyere ya. Mgbe izu ole na ole gachara Jizọs nwụrụ, a kpọlite ya n’ọnwụ, Pita gwara ọtụtụ puku ndị Juu na ndị ha tọghatara atọghata okwu. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:29-32.) O chetaara ha na Devid nwụrụ, e lie ya. Ndị Pita na-agwa okwu ma ihe a ọ na-ekwu. Ma Baịbụl agwaghị anyị na o nwere onye n’ime ha gbaghara ihe a Pita kwuru na Devid “hụrụ ya tupu oge eruo ma kwuo okwu banyere mbilite n’ọnwụ” Mesaya.

12. Olee otú Abụ Ọma 16:10 si mezuo? Olee ihe ọ na-egosi gbasara mbilite n’ọnwụ e kwuru okwu ya?

12 Pita kwuru ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 110:1 iji mesie okwu ya ike. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:33-36.) Otú ahụ Pita si jiri Baịbụl mee ka ihe ọ na-ekwu doo ìgwè mmadụ ahụ anya mere ka ha kweta na Jizọs bụ “Onyenwe anyị na Kraịst.” Ha ghọtara na Abụ Ọma 16:10 mezuru mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Ka oge na-aga, Pọl onyeozi jikwa amaokwu Baịbụl ahụ mesie ihe o kwuru ike mgbe ọ na-agwa ndị Juu nọ n’obodo Antiọk dị na Pisidia okwu. Ihe o kwuru tọrọ ha ezigbo ụtọ, ha achọọ ka ọ gwakwuo ha okwu. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 13:32-37, 42.) Obi kwesịkwara isi anyị ike na amụma ndị ahụ e buru na Baịbụl banyere mbilite n’ọnwụ Jizọs bụ eziokwu, n’agbanyeghị na ọtụtụ narị afọ gara tupu ha emezuo.

 OLEE MGBE A GA-ENWE MBILITE N’ỌNWỤ?

13. Olee ajụjụ mmadụ nwere ike ịjụ banyere mbilite n’ọnwụ?

13 Obi kwesịrị isi anyị ike na Baịbụl kwuo na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ, a ga-enwe ya n’agbanyeghị ogologo oge o were tupu ya emee. Ma, mmadụ nwere ike na-ajụ, sị: ‘Ọ̀ pụtara na m ga-eche ogologo oge tupu a kpọlite ndị nwụnahụrụ m? Olee mgbe a ga-enwe mbilite n’ọnwụ m na-atụ anya ya?’ Jizọs gwara ndịozi ya na e nwere ihe ndị ha na-amaghị, nakwa ihe ndị ha na-enweghị ike ịma. Ọ gwakwara ha na e nwere ọtụtụ ihe ndị gbasara ‘oge ma ọ bụ mgbe a kara aka nke Nna m debere ka ọ dị n’aka ya.’ (Ọrụ 1:6, 7; Jọn 16:12) Ma, nke a apụtaghị na o nweghị ihe ọ bụla anyị ma banyere mgbe a ga-enwe mbilite n’ọnwụ.

14. Olee otú mbilite n’ọnwụ Jizọs si dị iche ná ndị e nwere tupu ya abịa n’ụwa?

14 Mbilite n’ọnwụ kacha mkpa Baịbụl kwuru okwu ya bụ mbilite n’ọnwụ Jizọs. Ọ bụrụ na a kpọliteghị ya n’ọnwụ, o nweghị onye n’ime anyị ga-enwe olileanya ịhụ ndị nwụnahụrụ ya anya ọzọ. Ndị ahụ Ịlaịja na Ịlaịsha kpọlitere n’ọnwụ tupu Jizọs abịa n’ụwa adịghị ndụ ebighị ebi. Ha mechakwara nwụọ ma ghọọ ájá n’ili. Ma, “e siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst, ọ dịkwaghị anwụ anwụ; ọnwụ abụkwaghị nna ya ukwu.” N’eluigwe, ọ na-adị ndụ “ruo mgbe niile ebighị ebi.”—Rom 6:9; Mkpu. 1:5, 18; Kọl. 1:18; 1 Pita 3:18.

15. Gịnị mere e ji kpọọ Jizọs “mkpụrụ mbụ”?

15 Jizọs bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya agaa eluigwe. Mbilite n’ọnwụ ya kacha nke ndị ọzọ a ga-akpọlite n’ọnwụ ịga eluigwe mkpa. (Ọrụ 26:23) Ma, ọ bụghị naanị ya ka e kwere nkwa na a ga-akpọlite n’ọnwụ ịga eluigwe. Jizọs kwere ndịozi ya nkwa na ha ga-eso ya chịa n’eluigwe. (Luk 22:28-30) Ma, ha ga-ebu ụzọ nwụọ tupu a kpọlite ha n’ọnwụ ịga eluigwe. A ga-akpọlite ha n’ọnwụ ha abụrụ mmụọ ka Jizọs. Pọl kwuru, sị: “E siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst, bụ́ mkpụrụ mbụ nke ndị dara n’ụra ọnwụ.” O kwukwara na e nwere ndị ọzọ a ga-akpọlite n’ọnwụ ịga eluigwe. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla n’ọnọdụ nke ya: Kraịst mkpụrụ mbụ, e mesịakwa, ndị nke Kraịst n’oge ọnụnọ ya.”1 Kọr. 15:20, 23.

16. Olee ihe mere ka anyị ghọta mgbe a ga-enwe mbilite n’ọnwụ nke ndị ga-aga eluigwe?

16 Ihe Pọl kwuru mere ka anyị ghọta mgbe a ga-enwe mbilite n’ọnwụ nke ndị ga-aga eluigwe. Ọ ga-abụ ‘n’oge ọnụnọ Kraịst.’ Ọtụtụ afọ ugbu a, Ndịàmà Jehova ejirila Baịbụl na-eme ka ndị mmadụ ghọta na “ọnụnọ” Kraịst malitere n’afọ 1914, nakwa na mgbe a ga-ebibi ụwa ọjọọ a dị ezigbo nso.

17, 18. Gịnị ga-eme ụfọdụ ndị e tere mmanụ n’oge ọnụnọ Kraịst?

 17 Baịbụl mere ka mbilite n’ọnwụ nke ndị ga-aga eluigwe dokwuo anya. Ọ sịrị: “Anyị achọghịkwa ka unu ghara ịma ihe banyere ndị na-ada n’ụra ọnwụ . . . N’ihi na ọ bụrụ na okwukwe anyị bụ na Jizọs nwụrụ, sikwa n’ọnwụ bilie, otú ahụkwa, Chineke ga-akpọlite ndị dara n’ụra ọnwụ . . . ka ha soro Jizọs . . . Anyị ndị dị ndụ, ndị a hapụrụ ruo n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị, agaghị ebu ndị dara n’ụra ọnwụ ụzọ ma ọlị; n’ihi na Onyenwe anyị ga-esi n’eluigwe rịdata. Ọ ga-eji olu dara ụda kpọọ òkù, . . . Ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị ha na Kraịst dị n’otu ga-ebukwa ụzọ bilie. E mesịa, anyị onwe anyị bụ́ ndị dị ndụ, ndị a hapụrụ, a ga-eburu anyị na ha gaa n’ígwé ojii izute Onyenwe anyị na mbara igwe; otú a ka anyị na Onyenwe anyị ga-anọ mgbe niile.”—1 Tesa. 4:13-17.

18 Mbilite n’ọnwụ nke mbụ ga-amalite obere oge “ọnụnọ” Kraịst malitere. Ndị e tere mmanụ dị ndụ n’oge oké mkpagbu ga-aga “izute Onyenwe anyị na mbara igwe.” (Mat. 24:31) Ndị ga-aga ‘izute ya’ ‘agaghị ada n’ụra ọnwụ.’ Nke a pụtara na ha agaghị anọ n’ụra ọnwụ ruo ogologo oge. Kama, ha nwụọ ‘a ga-agbanwe ha niile, n’ime ntakịrị oge, n’otu ntabi anya, n’oge a ga-afụ opi ikpeazụ.’—1 Kọr. 15:51, 52.

19. Olee “mbilite n’ọnwụ ka mma” anyị na-atụ anya ya?

19 Taa, ọtụtụ Ndị Kraịst abụghị ndị e tere mmanụ, ha esoghịkwa ná ndị a họọrọ iso Kraịst chịa n’eluigwe. Kama, ha na-atụsi anya “ụbọchị Jehova” ike mgbe ọ ga-ebibi ụwa ọjọọ a. E nweghị onye ma mgbe ọ ga-abụ, ma ihe ndị na-eme ugbu a gosiri na ọ dị nso. (1 Tesa. 5:1-3) Mgbe e bibichara ụwa ọjọọ a, a ga-enwe mbilite n’ọnwụ dị iche, ya bụ, a ga-akpọlite ndị mmadụ ịdị ndụ n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs. Ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-enwe olileanya izu okè, ha agaghị anwụkwa ọzọ. Nke ahụ bụ “mbilite n’ọnwụ ka mma.” Ọ ga-aka nke ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ n’oge gara aga mma n’ihi na ha mechakwara nwụọ.—Hib. 11:35.

20. Olee ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na a ga-ahazi mbilite n’ọnwụ ahazi?

20 Baịbụl kwuru na a ga-akpọlite ndị ahụ ga-aga eluigwe n’ọnwụ, “onye ọ bụla n’ọnọdụ nke ya.” (1 Kọr. 15:23) N’ihi ya, obi kwesịkwara isi anyị ike na a ga-ahazi mbilite n’ọnwụ nke ndị ahụ a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa ahazi. Nke ahụ nwere ike ime ka anyị jụọ, sị: À ga-akpọlite ndị nwụrụ n’oge na-adịghị anya obere oge Kraịst ga-amalite Ọchịchị Puku Afọ ya, ndị nke ha ma ha anabata ha? À ga-ebu ụzọ kpọlite ndị ohu Chineke n’oge ochie, bụ́ ndị ma nke a na-akọ n’ịhazi ihe, ka ha nye aka hazie ndị Chineke n’ụwa ọhụrụ? Gịnị ga-eme ndị na-efetụbeghị Jehova? Olee mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ? Oleekwa ebe ọ ga-abụ? E nwere ọtụtụ ajụjụ anyị nwere ike ịna-ajụ.Ma, anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị maka ihe ndị ahụ ugbu a. Ọ ga-akacha mma ka anyị chere ma hụ ihe Jehova ga-eme. Obi siri anyị ike na ihe Jehova ga-eme, ga-atọ anyị obi ụtọ.

21. Olee olileanya i nwere banyere mbilite n’ọnwụ?

21 Tupu oge ahụ eruo, anyị kwesịrị ime ka okwukwe anyị sikwuo ike. Jehova si n’aka Jizọs kwe anyị nkwa na ya ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ọ ga-achọ ịkpọlite n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29; 11:23) Ihe ọzọ gosiri na Jehova nwere ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ bụ n’ihi na Jizọs kwuru banyere Ebreham, Aịzik, na Jekọb, na “ha niile dị ndụ.” (Luk 20:37, 38) Ka ọ dị ugbu a, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji kwuo ihe a Pọl kwuru. Ọ sịrị: “Enwekwara m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ.”—Ọrụ 24:15.