Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Disemba 2017

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Gịnị mere ndị nne na nna bi ná mba ọzọ kwesịrị iji chee banyere asụsụ na-eru ụmụ ha n’obi iji nyere ụmụ ha aka ịghọta ihe a na-amụ n’ọgbakọ?

Ụmụaka ha na ndị nne na nna ha bi ná mba ọzọ nwere ike ịmụta asụsụ obodo ahụ n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ebe ha bi. Ọ bara uru ma ụmụaka mụta ihe karịrị otu asụsụ. Ndị nne na nna kwesịrị iche banyere ọgbakọ ha na ụmụ ha ga-anọ ka ụmụ ha nwee ike ịghọta eziokwu Baịbụl ma na-eme nke ọma. O nwere ike ịbụ ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ebe ha bi amụ ihe ma ọ bụ nke na-eji asụsụ ha amụ ihe. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-eji adịm ná mma ụmụ ha na Jehova kpọrọ ihe karịa ihe dị hanwa mma.—w17.05, peeji nke 9 ruo na nke 11.

Mgbe Jizọs jụrụ Pita, sị: “Ị̀ hụrụ m n’anya karịa ihe ndị a?” Gịnị bụ “ihe ndị a” Jizọs kwuru okwu ha? (Jọn 21:15)

O nwere ike ịbụ na Jizọs na-ekwu banyere azụ̀ ndị dị ebe ahụ ma ọ bụ ọrụ igbu azụ̀. Mgbe Jizọs nwụchara, Pita laghachiri n’ọrụ ọ na-arụbu, ya bụ, ọrụ igbu azụ̀. Ndị Kraịst kwesịrị ịchọpụta ma ọrụ ego ọ̀ bụ ya kacha ha mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ.—w17.05, peeji nke 22 ruo na nke 23.

Gịnị mere Ebreham ji sị nwunye ya kwuo na ọ bụ nwanne ya? (Jen. 12:10-13)

Nke bụ́ eziokwu bụ na Sera bụ nwanne Ebreham. Ọ bụrụ na Sera kwuru na ya bụ nwunye Ebreham, ha gaara egbu Ebreham, ọ gaaraghị amụta mkpụrụ ahụ Chineke kwere ya ná nkwa.—wp17.3, peeji nke 14 ruo na nke 15.

Olee ihe Elias Hutter mere iji nyere ndị chọrọ ịmụ asụsụ Hibru aka?

Ọ chọrọ ka ụmụ akwụkwọ mata ihe dị iche n’okwu Hibru ndị bụ́ isi e ji dee Baịbụl nakwa okwu ọ bụla a gbakwụnyere n’ihu ma ọ bụ n’azụ okwu ndị ahụ. O dere okwu Hibru ndị bụ́ isi ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo, deekwanụ okwu mgbakwụnye na-adị n’ihu ma ọ bụ n’azụ okwu ndị ahụ bụ́ isi ná mkpụrụ akwụkwọ na-agbaghị okpotokpo. E si otú ahụ Hutter si dee mkpụrụ okwu Hibru dee okwu ndị dị n’ala ala peeji nke New World Translation of the Holy Scriptures—With References.—wp17.4, peeji nke 11 ruo na nke 12.

Gịnị mere Onye Kraịst ekwesịghị inwe ụdị égbè ọ bụla ọ ga-eji na-echebe onwe ya maka ndị ọjọọ?

Ụfọdụ n’ime ha bụ na ndụ dị nsọ n’anya Chineke. Jizọs agwaghị ndị na-eso ụzọ ya ka ha nwee mma agha iji na-echebe onwe ha. (Luk 22:36, 38) Anyị ga-akpụgharị mma agha anyị ka ha bụrụ mma ogè. Ndụ karịrị ihe onwunwe. Anyị ekwesịghị ime ihe ga-enye akọnuche ndị ọzọ nsogbu. Anyị na-agbasikwa mbọ ike ka anyị bụrụ ndị e ji ama atụ. (2 Kọr. 4:2)—w17.07, peeji nke 31 ruo na peeji nke 32.

Gịnị mere ihe Matiu kọrọ banyere ihe ndị merenụ mgbe Jizọs na-etolite ji dị iche n’ihe Luk kọrọ?

Matiu lekwasịrị anya n’ihe gbasara Josef. Dị ka ihe atụ, ọ kọrọ ihe Josef mere mgbe ọ matara na Meri dị ime, otú mmụọ ozi si gwa Josef ná nrọ ka ọ gbalaga Ijipt, nakwa otú mmụọ ozi si gwa ya ná nrọ ka ọ laghachi Izrel. Ma Luk lekwasịrị anya n’ihe gbasara Meri. Ọ kọrọ otú Meri si gaa leta Elizabet, nakwa ihe Meri kwuru mgbe Jizọs gara n’ụlọ nsọ n’oge ahụ ọ di afọ iri na abụọ.—w17.08, peeji nke 32.

Olee ihe ụfọdụ merelanụ nke na-emeghị ka Okwu Chineke ghara ịdịgide?

Ihe okwu ụfọdụ ndị e ji dee Baịbụl n’oge ochie pụtara agbanweela ka oge na-aga. Mgbe ụfọdụ, ndị ọchịchị nwere ike gbanwee asụsụ ndị niile ha na-achị na-asụ. Ọtụtụ ndị agbaala mbọ ka a kwụsị ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ ọtụtụ ndị na-asụ.—w17.09, peeji nke 19 ruo na nke 21.

Ànyị nwere mmụọ ozi na-eche anyị nche?

Mba. Jizọs kwuru na ndị mmụọ ozi nke ndị na-eso ụzọ ya na-ahụ ihu Chineke. (Mat. 18:10) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ndị mmụọ ozi nwere mmasị n’ebe onye ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ ya nọ, ọ bụghị na ha na-eche ha nche.—wp17.5, peeji nke 5.

Olee ụdị ịhụnanya kachanụ?

A·gaʹpe bụ ịhụnanya kachanụ. Ihe e ji mara ya bụ ime ihe ziri ezi. Mmadụ inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ sokwa n’ihe e ji mara ụdị ịhụnanya a. Ma ihe kachanụ e ji mara ya bụ mmadụ iji obi ya niile meere ndị ọzọ ihe ga-abara ha uru.—w17.10, peeji nke 7.