Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2016

Na-atụkwasị Jehova Nchegbu Gị Niile

Na-atụkwasị Jehova Nchegbu Gị Niile

‘Na-atụkwasịnụ Jehova nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.’—1 PITA 5:7.

ABỤ: 60, 23

1, 2. (a) Gịnị mere na o kwesịghị iju anyị anya na anyị na-echegbu onwe anyị mgbe ụfọdụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

ANYỊ bi n’oge siri ike. Ezigbo iwe ji Setan bụ́ Ekwensu. Ọ “na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8; Mkpu. 12:17) N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na anyịnwa na-efe Chineke na-echegbu onwe anyị mgbe ụfọdụ. A sị ka e kwuwe, ndị fere Chineke n’oge gara aga chegburu onwe ha mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ‘mkpụrụ obi Eze Devid na-agba mgba,’ ya bụ, na ọ na-echegbu onwe ya. (Ọma 13:2) Chetakwa na Pọl onyeozi nọ na-enwe “nchegbu maka ọgbakọ niile.” (2 Kọr. 11:28) Ma, gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị na-echegbukarị onwe anyị?

2 Nna anyị nke eluigwe, onye hụrụ anyị n’anya, nyeere ndị ohu ya aka n’oge gara aga. Ọ na-enyekwara anyị aka ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị ma nsogbu bịara anyị. Baịbụl gwara anyị, sị: “Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:7) Ma, olee otú ị ga-esi eme ya? Ka anyị leba anya n’ihe anọ ga-enyere gị aka. Ha bụ: Iji obi gị niile na-ekpe ekpere, ịgụ Okwu Chineke ma na-echebara ihe ị na-agụ echiche, ikwe ka mmụọ nsọ  Jehova nyere gị aka, na ịkọrọ onye ị tụkwasịrị obi ihe na-echegbu gị. Ka anyị na-atụle ihe anọ a, lee ma ị̀ ga-achọpụta ihe ndị i kwesịrị ime ga-abara gị uru.

“TỤKWASỊ JEHOVA IBU ARỌ GỊ”

3. Olee otú ị ga-esi “tụkwasị Jehova ibu arọ gị” n’ekpere?

3 Ihe mbụ anyị ga-eme bụ iji obi anyị niile kọọrọ Jehova nsogbu anyị n’ekpere. Ọ bụrụ na e nwere ihe na-eme ka obi ghara iru gị ala, egwu ana-atụ gị, ma ọ bụ gị ana-echegbu onwe gị, gwa Nna gị nke eluigwe, bụ́ onye hụrụ gị n’anya, otú ọ dị gị n’obi. Devid rịọrọ Jehova, sị: “Chineke, biko, ṅaa ntị n’ekpere m.” O kwukwara, sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.” (Ọma 55:1, 22) Mgbe i mechara ihe niile i nwere ike ime iji dozie nsogbu gị, ekpere i ji obi gị niile kpee ga-abara gị uru karịa ichegbuwe onwe gị. Ma, olee otú ekpere ga-esi enyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị?—Ọma 94:18, 19.

4. Gịnị mere anyị ji kwesị ikpe ekpere ma e nwee ihe na-echegbu anyị?

4 Gụọ Ndị Filipaị 4:6, 7. Jehova nwere ike ịza ekpere anyị ji obi anyị niile na-ekpe mgbe niile. Olee otú o nwere ike isi mee ya? O nwere ike ime ka ahụ́ ruo anyị ala, ka anyị kwụsị ịna-echegbu onwe anyị. Ọtụtụ ndị esila n’ihe Chineke meere ha chọpụta na ihe a bụ eziokwu. Mgbe e nwere ihe na-echegbu ha, Chineke nyeere ha aka ka obi ruo ha ala otú mmadụ na-agaghị aghọtali. Chineke nwekwara ike imere gị ụdị ihe ahụ. N’ihi ya, “udo nke Chineke” nwere ike inyere gị aka imeri nsogbu ọ bụla bịaara gị. I nwere ike ịtụkwasị nkwa Jehova ji obiọma ya kwe gị obi. Ọ sịrị: “Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka.”—Aịza. 41:10.

OTÚ OKWU CHINEKE SI EME KA OBI RUO ANYỊ ALA

5. Olee otú Okwu Chineke ga-esi mee ka obi ruo gị ala?

5 Ihe nke abụọ ga-eme ka obi ruo gị ala bụ ịgụ Baịbụl na ịtụgharị uche na ya. Gịnị mere o ji dị mkpa? Baịbụl kwuru ihe ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị, na ihe nwere ike ime ka ị kwụsịlata ichegbu onwe gị ma ọ bụkwanụ kwụsịchaa ya kpamkpam. Echefukwala na ihe mere Baịbụl ji baa uru bụ na ihe e dere na ya bụ okwu Onye kere anyị nakwa amamihe ya. Ka ị na-atụgharị uche n’Okwu Chineke kwa ụbọchị ma na-eche otú kacha mma ị ga-esi na-eme ihe o kwuru, ọ ga-eme ka okwukwe gị sie ezigbo ike. Jehova kwuru na ịgụ Okwu ya ga-eme ka mmadụ ‘nwee obi ike ma dị ike,’ kama ‘ịma jijiji ma tụwa ụjọ.’—Jọsh. 1:7-9.

6. Olee uru ihe Jizọs kwuru ga-abara gị?

6 N’Okwu Chineke, anyị ga-ahụ ihe Jizọs kwuru kasiri ndị mmadụ obi. Ihe o kwuru na ihe ndị ọ kụziri mere ka obi ruo ndị nụrụ ya ala. Ọ na-atọ ìgwè mmadụ ụtọ ịnụ okwu ya n’ihi na ọ na-eme ka obi ruo ndị na-echegbu onwe ha ala, na-eme ka okwukwe ndị na-adịghị ike sie ike, kasiekwa ndị dara mbà obi. (Gụọ Matiu 11:28-30.) Ihe o mere gosiri na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi. Ọ kụziiri ha Okwu Chineke, gbooro ha mkpa ha, meekwa ka obi dị ha ụtọ. (Mak 6:30-32) Jizọs ga na-enyere anyị aka taa otú ahụ o kwere nkwa ịna-enyere ndịozi ya só ya na-agagharị aka. Ọ pụtaghị na anyị ga-anọrịrị n’ebe Jizọs nọ tupu ya enyere anyị aka. Ebe ọ bụ Eze anyị n’eluigwe, ọ ka na-enwere anyị ọmịiko. N’ihi ya, i chegbuwe onwe gị, ọ ga-emere gị ebere ma ‘gbatara gị ọsọ enyemaka n’oge kwesịrị ekwesị.’ O doro anya na Jizọs ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu  onwe gị. O nwekwara ike ime ka i nwee olileanya na obi ike.—Hib. 2:17, 18; 4:16.

ÀGWÀ ỌMA NDỊ MMỤỌ NSỌ GA-EME KA ANYỊ NA-AKPA

7. Olee uru ị ga-erite ma Chineke nye gị mmụọ nsọ otú ị rịọrọ ya?

7 Jizọs kwere anyị nkwa na Nna anyị nke eluigwe ga-enye anyị mmụọ nsọ ma anyị rịọ ya. (Luk 11:10-13) Ị ga-esi otú ahụ nweta ihe nke atọ ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị, ya bụ, mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Àgwà ndị a magburu onwe ha mmụọ nsọ na-enyere anyị aka ịna-akpa na-egosi àgwà e ji mara Chineke pụrụ ime ihe niile. (Gụọ Ndị Galeshia 5:22, 23; Kọl. 3:10) Ka ị na-amụta àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, gị na ndị ọzọ ga na-adịkwu ná mma. Ị ga-esi otú ahụ gbaara ọtụtụ ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ na-echegbu onwe ya ọsọ. Ka anyị leba anya n’otú mkpụrụ nke mmụọ nsọ ga-esi enyere gị aka.

8-12. Olee otú àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ ga-esi nyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị?

8 “Ịhụnanya, ọṅụ, udo.” Ọ bụrụ na ị na-agbalị ịna-akwanyere ndị mmadụ ùgwù, o nwere ike ime ka ị mara ihe i kwesịrị ime ma iwe wewe gị. N’ihi gịnị? Ka ị na-egosi ụmụnna gị na ị hụrụ ha n’anya, na-enwere ha ọmịiko, na-asọpụrụ ha, ị gaghị na-eme ihe nwere ike ime ka ị na-echegbu onwe gị.—Rom 12:10.

9 “Ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma.” Baịbụl sịrị: “Nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam.” (Efe. 4:32) Anyị na ndị mmadụ ga na-adị ná mma ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe a Baịbụl kwuru. Anyị agaghị eme ihe nwere ike ime ka anyị na-echegbu onwe anyị. E nwee nsogbu ndị ezughị okè kpatara, anyị ga-ama otú anyị ga-esi dozie ya.

10 “Okwukwe.” Ọtụtụ mgbe, ihe na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị bụ ihe gbasara ego na ihe onwunwe. (Ilu 18:11) N’ihi ya, okwukwe gị sie ike na Jehova ga na-elekọta gị, o nwere ike ime ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Pọl gwara anyị ka ihe ndị anyị nwere ugbu a ju anyị afọ. I mee ihe a o kwuru, i nwere ike ị gaghị na-echegbu onwe gị. Pọl kwukwara, sị: “N’ihi na [Chineke ekwuwo], sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’ Ka anyị nwee obi ike wee sị: ‘Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?’”—Hib. 13:5, 6.

11 “Ịdị nwayọọ, njide onwe onye.” Chegodị uru ọ ga-abara gị ma ị na-akpa àgwà ndị a. O nwere ike ime ka ị ghara ime ihe ndị ga-eme ka ị na-echegbu onwe gị. Ọ ga-abakwara gị uru ma i wepụ ‘obi ilu na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị’ n’obi gị.—Efe. 4:31.

12 O doro anya na ị ga-adị umeala n’obi ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịtụkwasị obi ‘n’aka dị ike nke Chineke’ na ‘ịtụkwasị Chineke nchegbu gị niile.’ (1 Pita 5:6, 7) Ma, ịdị umeala n’obi ga-eme ka ị na-eme ihe ga-eme ka gị na Chineke na-adị ná mma, ya ana-akwadokwa gị. (Maị. 6:8) Ọ bụrụ na ị ghọta na e nwere ihe ndị ị ga-emeli na ihe ndị ị na-agaghị emeli, o nwere ike ime ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị, n’ihi na ị ga-atụkwasị Chineke obi.

“UNU ECHEGBULA ONWE UNU”

13. Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ sịrị: “Unu echegbula onwe unu”?

13 Na Matiu 6:34 (gụọ ya), Jizọs nyere anyị ndụmọdụ bara uru, sị: “Unu echegbula onwe unu.” O nwere ike ịdị ka ime ihe a Jizọs kwuru ò siri ike. Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? O doro anya na ihe ọ na-ekwu abụghị na e nweghị mgbe onye na-efe Chineke ga-echegbu onwe ya.  Anyị ebula ụzọ mụta na Devid na Pọl chegburu onwe ha mgbe ụfọdụ. Ma, Jizọs ji ihe ahụ o kwuru na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya na nchegbu na-enweghị isi ma ọ bụ oké nchekasị anaghị eme ka nsogbu mmadụ nwere kwụsị. Ụbọchị nke ọ bụla na-enwe nsogbu nke ya. N’ihi ya, Ndị Kraịst ekwesịghị ibu nchegbu nke ụbọchị gara aga ma ọ bụ nke echi bukwasị na nke taa. Olee otú ị ga-esi mee ihe a Jizọs kwuru ma kwụsị ịna-echegbu onwe gị?

14. Gịnị ka ị ga-eme ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị banyere ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga?

14 Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-echegbu onwe ha maka ihe ndị ha mejọrọ n’oge gara aga. Obi nwere ike ịna-ama ha ikpe maka ihe ha mere n’oge gara aga. O nwedịrị ike ịbụ ọtụtụ afọ gara aga. Eze Devid chegburu onwe ya mgbe ụfọdụ banyere ihe ndị o mejọrọ. O kwuru, sị: “Ebigbọwo m n’ihi ịsụ ude nke obi m.” (Ọma 38:3, 4, 8, 18) Gịnị ka Devid kwesịrị ime mgbe ahụ? Gịnị ka o mere? Ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-emere ya ebere ma gbaghara ya. O ji obi ike kwuo, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye a gbaghaara nnupụisi ya.”—Gụọ Abụ Ọma 32:1-3, 5.

15. (a) Gịnị mere na i kwesịghị ịna-echegbu onwe gị maka ihe ndị na-eme ugbu a? (b) Olee ihe ndị i nwere ike ime ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị? (Kwuo ihe dị́ n’igbe bụ́ “ Ihe Ụfọdụ I Nwere Ike Ime Ka Ị Ghara Ịna-echegbu Onwe Gị.”)

15 I nwekwara ike ịna-echegbu onwe gị n’ihi ihe ndị na-eme ugbu a. Dị ka ihe atụ, mgbe Devid na-ede Abụ Ọma nke iri ise na ise, ụjọ nọ na-atụ ya na ọ ga-anwụ. (Ọma 55:2-5) Ma, o kweghị ka nchegbu mee ka ọ kwụsị ịtụkwasị Jehova obi. O kpesiri ekpere ike rịọ Jehova ka o nyere ya aka ná nsogbu ya. Ma, ọ ghọtakwara na ya kwesịrị ime ihe gbasara nsogbu ya. (2 Sam. 15:30-34) Ihe i kwesịrị ịmụta n’ihe a Devid mere bụ na kama ịna-echegbu onwe gị maka nsogbu bịaara gị, mee ihe i nwere ike ime iji dozie ya, tụkwasịkwa Jehova obi na ọ ga-enyere gị aka.

16. Olee otú ihe aha Chineke pụtara ga-esi mee ka okwukwe gị sie ike?

16 Onye Kraịst nwere ike ịna-echegbu onwe ya mgbe ụfọdụ maka ihe nwere ike ime n’ọdịnihu. Ma, i kwesịghị ikwe ka ihe ị na-amaghị ma ọ̀ ga-eme chuwe gị ụra. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ mgbe, ihe nwere ike mee, ma ọ gaghị adị njọ otú anyị tụrụ ụjọ ya. Ihe ọzọ bụ na e nweghị ihe karịrị Chineke, bụ́ onye anyị na-akọrọ ihe niile na-echegbu anyị. Otu n’ime ihe aha ya pụtara bụ “M Ga-abụ Ihe M Chọrọ Ịbụ.” (Ọpụ. 3:14) Ihe aha ya pụtara na-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-emeli ka ihe o bu n’obi maka ndị ohu ya mezuo. Obi kwesịrị isi gị ike na Chineke ga-akwụ ndị tụkwasịrị ya obi ụgwọ ma nyere ha aka ka ha ghara ịna-echegbu onwe ha banyere ihe gara aga, ihe na-eme ugbu a, na ihe ga-eme n’ọdịnihu.

 KỌỌRỌ YA ONYE Ị TỤKWASỊRỊ OBI

17, 18. Olee otú ịkọrọ onye ọzọ nsogbu gị ga-esi nyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị?

17 Ihe nke anọ ga-enyere gị aka ma e nwee ihe na-echegbu gị bụ ịkọrọ onye ị tụkwasịrị obi otú obi dị gị. Di gị ma ọ bụ nwunye gị, enyi gị ma ọ bụ okenye ọgbakọ nwere ike inyere gị aka ka i lewe nsogbu ahụ anya otú kwesịrị ekwesị. Baịbụl sịrị: “Ọ bụ nchegbu nke dị n’obi mmadụ ga-anyịgbu ya, ma, ọ bụ okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.” (Ilu 12:25) Ịkọrọ onye ọzọ nsogbu gị n’ezoghị ọnụ nwere ike inyere gị aka ịghọta ihe na-echegbu gị ma mee ihe i kwesịrị ime. Baịbụl kwukwara, sị: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu, ma a na-arụzu ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.”—Ilu 15:22.

18 Jehova na-ejikwa ọmụmụ ihe ọgbakọ enyere Ndị Kraịst aka idi ihe na-echegbu ha. Ị gaa ọmụmụ ihe, gị na ụmụnna gị ga-anọrị. Ihe gbasara gị na-emetụ ha n’obi. Ha chọkwara ịna-agbarịta ibe ha ume. (Hib. 10:24, 25) Otú gị na ha si ‘agbarịta ibe unu ume’ ga-enyere gị aka ka okwukwe gị sie ike, meekwa ka ọ dịrị gị mfe ịkwụsị ịna-echegbu onwe gị.—Rom 1:12.

IHE GA-AKACHA EME KA Ị DỊ IKE BỤ ADỊM NÁ MMA GỊ NA CHINEKE

19. Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike na adịm ná mma gị na Jehova ga-eme ka ị dị ike?

19 Chegodị otú otu okenye bí na Kanada si mata na ịkọrọ Jehova ihe na-echegbu ya bara ezigbo uru. Ọ bụ onye nkụzi. Ọrụ ahụ na-ewepụ ya ihe n’ahụ́. Ọ na-arịakwa otu ọrịa na-eme ka ọ na-echegbu onwe ya. Olee otú nwanna a si die nsogbu ahụ? Ọ sịrị: “Achọpụtara m na ihe kacha mee ka m die nsogbu ndị bịaara m bụ ịgbasi mbọ ike ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma. Ezigbo ndị enyi m n’ọgbakọ na ụmụnna ndị ọzọ na-enyere m aka ma nsogbu bịara m. M na-akọrọ nwunye m hoo haa otú obi dị m. Ndị okenye na onye nlekọta sekit anyị nyekwaara m aka ile nsogbu m anya otú Chineke si ele ya. M gakwara ụlọ ọgwụ, gbanwee ihe ụfọdụ m na-eji oge m eme, wepụtakwa oge m ga-eji na-ezu ike ma na-emega ahụ́. Eji m nwayọọ nwayọọ na-edi nsogbu m. E nwee nke m na-amaghị ihe m ga-eme banyere ya, m na-ahapụrụ ya Jehova.”

20. (a) Olee otú anyị ga-esi ‘tụkwasị Jehova nchegbu anyị’? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-esonụ?

20 N’isiokwu a, anyị amụtala na anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere kọọrọ Jehova ihe na-echegbu anyị, na-agụ Okwu ya ma na-atụgharị uche na ya. Anyị ahụla na ọ bara uru ịna-akpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ịna-akọrọ enyi anyị tụkwasịrị obi otú ọ dị anyị n’obi, na ịna-aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’otú ọzọ Jehova si eme ka anyị dị ike, nke bụ́ ime ka anyị nwee olileanya na ọ ga-akwụ anyị ụgwọ.—Hib. 11:6.