“Obi ụtọ na-adịrị mba nke Jehova bụ Chineke ya, bụ́ ndị ọ họọrọ ịbụ ihe nketa ya.”—ỌMA 33:12.

ABỤ: 40, 50

1. Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na ọ bụ Jehova nwe ihe niile? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

Ọ BỤ Jehova nwe ihe niile. Ọ bụ ya nwe “eluigwe, bụ́ eluigwe nke eluigwe, ụwa na ihe niile dị n’ime ya.” (Diut. 10:14; Mkpu. 4:11) Mmadụ niile bụ nke ya, n’ihi na ọ bụ ya kere anyị. (Ọma 100:3) Ma kemgbe ụwa, Chineke ahọrọla ụfọdụ ndị ka ha bụrụ ndị nke ya n’ụzọ pụrụ iche.

2. Olee ndị Baịbụl kwuru na ha bụ nke Jehova n’ụzọ pụrụ iche?

2 Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 135 kwuru na ndị fere Jehova n’Izrel oge ochie bụ “ihe onwunwe ya pụrụ iche.” (Ọma 135:4) Akwụkwọ Hosia kwukwara na ụfọdụ ndị na-abụghị ndị Izrel ga-abụ ndị Jehova. (Hos. 2:23) Ihe a Hosia kwuru mezuru mgbe Jehova malitere ịhọrọ ndị na-abụghị ndị Juu ka ha soro Kraịst chịa n’eluigwe. (Ọrụ 10:45; Rom 9:23-26) A kpọrọ ndị ahụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ “mba dị nsọ.” Ha bụ “ndị pụrụ iche nke Chineke.” (1 Pita 2:9, 10) Gịnịkwanụ banyere Ndị Kraịst niile nwere olileanya ịdị ndụ ebighị n’ụwa? Jehova na-akpọkwa ha “ndị m,” nakwa “ndị m họọrọ.”—Aịza. 65:22.

3. (a) Olee ndị ha na Jehova dị n’ezigbo mma taa? (b) Olee ihe anyị ga-eleba anya n’isiokwu a?

3 Taa, “ìgwè atụrụ nta,” bụ́ ndị nwere olileanya ịdị ndụ  n’eluigwe, nakwa “atụrụ ọzọ,” bụ́ ndị nwere olileanya ịdị ndụ n’ụwa bụ “otu ìgwè atụrụ.” Jehova weere ha ka ndị ya ma jiri ha kpọrọ ezigbo ihe. (Luk 12:32; Jọn 10:16) Anyị chọrọ igosi Jehova na obi dị anyị ụtọ na o kwere ka anyị na ya dịrị n’ezigbo mma. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ n’ùgwù a pụrụ iche ọ kwanyeere anyị.

INYEFE JEHOVA ONWE ANYỊ

4. Olee otu ụzọ anyị si egosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ikwe ka anyị na ya dịrị ná mma? Olee otú Jizọs si mee ihe yiri ya?

4 Otú anyị si egosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ịhọrọ anyị ka anyị bụrụ ndị ya bụ iji obi anyị niile nyefee ya onwe anyị. Baptizim a ga-eme anyị bụ ụzọ anyị si egosi n’ihu ọha na ọ bụ Jehova nwe anyị, nakwa na anyị dị njikere irubere ya isi. (Hib. 12:9) Jizọs mere ihe yiri ya n’oge e mere ya baptizim. E nwere ike ikwu na ọ gwara Jehova, sị: “Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ.” (Ọma 40:7, 8) Jizọs nyefere Jehova onwe ya ime uche ya, ọ bụ eziokwu na kemgbe a mụrụ ya, na o so ná mba nyefere Jehova onwe ha.

5, 6. (a) Olee otú obi dị Jehova mgbe e mere Jizọs baptizim? (b) Nye ihe atụ iji gosi na obi na-atọ Jehova ụtọ ma anyị nyefee ya onwe anyị n’agbanyeghị na ọ bụ ya nwe ihe niile.

5 Olee otú obi dị Jehova mgbe e mere Jizọs baptizim? Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe e mesịrị Jizọs baptizim, o si na mmiri ahụ bilie ozugbo; ma, lee! eluigwe meghere, o wee hụ ka mmụọ Chineke na-efedata dị ka nduru wee bekwasị ya. Lee! Otu olu sikwa n’eluigwe kwuo, sị: ‘Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.’” (Mat. 3:16, 17) Ọ bụ eziokwu na Jizọs bụ nke Nna ya bi n’eluigwe, obi dị Jehova ụtọ ịhụ na Ọkpara ya dị njikere ife naanị ya. Obi na-atọkwa Jehova ụtọ ma anyị nyefee ya onwe anyị. Ọ ga-agọzikwa anyị.—Ọma 149:4.

6 Dị ka ihe atụ, ka e were ya na otu nna nyere obere nwa ya nwaanyị biskiiti. Nwa ya a enyetụ ya biskiiti ahụ. Ọ̀ bụ na ọ bụghị nna ya nwe biskiiti ahụ? Ebe ọ bụ ya nwe ya, olee ihe mere nwa ya ji nyetụ ya biskiiti ahụ? Ezigbo nna agaghị echetụdị ụdị ajụjụ a n’echiche. Kama, obi ga-atọ ya ụtọ ịnara nwa ya biskiiti ahụ n’ihi na o gosiri na nwa ya hụrụ ya n’anya. Biskiiti ahụ nwa ya nyetụrụ ya ga-atọ ya ụtọ karịa biskiiti ọ bụla ọzọ o nwere. Otú ahụ ka ọ dịkwa Jehova. Obi na-atọ ya ụtọ ma anyị jiri obi anyị niile nyefee ya onwe anyị ife naanị ya.—Ọpụ. 34:14.

7. Olee otú Malakaị si nyere anyị aka ịghọta otú obi na-adị Jehova maka ndị ji obi ha niile na-efe ya?

7 Gụọ Malakaị 3:16. Ọ bụrụ na i nyefebeghị Jehova onwe gị, e meekwa gị baptizim, chee uru ọ bara ime otú ahụ. Ozugbo a tụụrụ ime anyị, anyị bụ nke Jehova. Ma, chegodị otú obi ga-esi atọ Jehova ụtọ ma i were ya ka onye ga na-achị gị, ma nyefee ya onwe gị ime uche ya. (Ilu 23:15) Jehova makwa ndị ji obi ha na-efe ya, ọ na-edekwa aha ha ‘n’akwụkwọ ncheta’ ya.

8, 9. Olee ihe Jehova chọrọ n’aka ndị aha ha dị ‘n’akwụkwọ ncheta’ ya?

8 E nwere ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka aha anyị dịgide ‘n’akwụkwọ ncheta’ nke Jehova. Malakaị kwuru hoo haa na anyị ‘ga-atụ egwu Jehova ma na-echebara aha ya echiche.’ Ọ bụrụ na anyị efee onye ọzọ ma ọ bụ ihe ọ bụla, Jehova ga-ewepụ aha  anyị n’akwụkwọ ya.—Ọpụ. 32:33; Ọma 69:28.

9 N’ihi ya, ikwe Jehova nkwa na anyị ga-eme uche ya, e meekwa anyị baptizim abụghị ebe okwu biri. Ihe ndị a ka anyị na-eme naanị otu ugboro, ma ife Jehova bụ ihe anyị ga na-eme n’oge niile anyị dị ndụ. Kwa ụbọchị, àgwà anyị kwesịrị igosi na anyị na-erubere Jehova isi, ọ bụrụhaala na anyị dị ndụ.—1 Pita 4:1, 2.

ANYỊ NA-AJỤ ỌCHỊCHỌ NKE ỤWA

10. Olee ihe dị iche n’etiti ndị na-ejere Jehova ozi na ndị na-anaghị ejere ya ozi?

10 N’isiokwu bú nke a ụzọ, anyị mụtara ihe Baịbụl kwuru banyere Ken, Sọlọmọn, na ndị Izrel. Ha niile kwuru na ha na-efe Jehova, ma ha ejighị obi ha niile fee ya. Ihe atụ ndị a mere ka anyị mata na ndị niile bụ́ nke Jehova kwesịrị ịkpọ ihe ọjọọ asị, ma na-eme ihe dị mma. (Rom 12:9) Mgbe Malakaị kwuchara banyere “akwụkwọ ncheta,” Jehova kwuru na e nwere “ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye ajọ omume, n’etiti onye na-ejere Chineke ozi na onye na-adịghị ejere ya ozi.”—Mal. 3:18.

11. Gịnị mere ndị ọzọ kwesịrị iji mara na anyị na-efe naanị Jehova?

11 E nwere otú ọzọ anyị ga-esi egosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ịhọrọ anyị ka anyị bụrụ ndị ya. Anyị kwesịrị ime ka ofufe anyị na-efe ya “pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.” (1 Tim. 4:15; Mat. 5:16) Jụọ onwe gị, sị: ‘Ndị ọzọ hà na-ahụ na ọ bụ naanị Jehova ka m na-efe? M̀ na-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ eme ka ndị mmadụ mata na m bụ Onyeàmà Jehova?’ Ebe ọ bụ na Jehova ahọrọla anyị ịbụ ndị ya, ọ ga-ewe ya ezigbo iwe ma ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike ịgwa ndị ọzọ na anyị bụ nke ya.—Ọma 119:46; gụọ Mak 8:38.

Otú i si ebi ndụ, ọ̀ na-eme ka ndị mmadụ mata na ị bụ Onyeàmà Jehova? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

12, 13. Olee otú ụfọdụ si mee ka ọ ghara ịdịrị ndị mmadụ mfe ịmata na ha bụ Ndịàmà Jehova?

12 Ọ dị mwute na ụfọdụ ụmụnna anyị na-eṅomi “mmụọ nke ụwa.” Nke a emeela ka ha ghara ịdịcha iche n’ebe ndị na-anaghị efe Jehova nọ. (1 Kọr.  2:12) “Mmụọ nke ụwa” na-eme ka ndị mmadụ na-eme ihe na-agụ anụ ahụ́ ha agụụ. (Efe. 2:3) Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị ọtụtụ ihe a kụziiri anyị banyere ya, ụfọdụ ka na-eji ejiji ndị na-ekwesịghị ekwesị. Ha na-eyi uwe ndị na-atapara ha n’ahụ́, nakwa ndị na-ahụ ụzọ. Ha na-eyidị uwe ndị ahụ abịa ọmụmụ ihe na mgbakọ, na-akpakwa ụdị isi e ji mara ụfọdụ ndị ụwa. (1 Tim. 2:9, 10) N’ihi ya, mgbe ọ bụla ha nọ n’ebe ọtụtụ ndị nọ, o nwere ike isiri ndị ọzọ ike ịmata onye bụ́ nke Jehova na onye bụ́ “enyi ụwa.”—Jems 4:4.

13 E nwekwara ụzọ ọzọ ụfọdụ ụmụnna anyị si na-akpatụ àgwà ka ndị ụwa. Dị ka ihe atụ, otú ha si agba egwú na otú ha si akpa àgwà n’oriri na nkwari ekwesịghịrị Ndị Kraịst. A bịa n’Ịntanet, ha etinyela foto ha ndị na-adịghị mma na ya, kwuokwa okwu ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe na-ekwesịghị ikwu. O nwere ike ịbụ na a dọbeghị ha aka ná ntị n’ọgbakọ n’ihi ime mmehie dị oké njọ, ma ha nwere ike mee ka ndị ọgbọ ha na-agba mbọ ịkpa àgwà ọma n’ọgbakọ kpawa àgwà ọjọọ.—Gụọ 1 Pita 2:11, 12.

Ekwela ka ndị na-akwụsịghị ike n’ebe Jehova nọ mebie adịm ná mma gị na Jehova

14. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma anyị chọọ ka anyị na Jehova na-adị n’ezigbo mma?

14 Ụwa na-eme ka “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ” na-echu anyị ụra. (1 Jọn 2:16) Ma, ebe anyị bụ nke Jehova, a na-agba anyị ume ka anyị “jụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa, ka anyị na-ebikwa ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a.” (Taị. 2:12) Ihe niile anyị na-eme, ma otú anyị si ekwu okwu, eri ihe, aṅụ ihe, eji ejiji, na ụdị ọrụ anyị na-arụ kwesịrị ido mmadụ niile anya na ọ bụ naanị Jehova ka anyị na-efe.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:31, 32.

ANYỊ ‘NWERE ỊHỤNANYA SIRI IKE N’EBE IBE ANYỊ NỌ’

15. Gịnị mere anyị kwesịrị iji hụ ụmụnna anyị n’anya ma jiri obiọma na-emeso ha ihe?

15 Ihe na-egosi na anyị ji adịm ná mma anyị na Chineke kpọrọ ezigbo ihe  bụ otú anyị si emeso ụmụnna anyị ihe. Ha bụkwa nke Jehova. Ọ bụrụ na anyị eburu nke a n’obi, anyị ga na-ahụ ụmụnna anyị n’anya, jirikwa obiọma na-emeso ha ihe. (1 Tesa. 5:15) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:35.

16. Gịnị ka anyị na-amụta n’Iwu Mozis gbasara otú Jehova si hụ ndị ya n’anya?

16 Iji ghọta otú anyị kwesịrị isi na-emeso ụmụnna anyị ihe n’ọgbakọ, chegodị gbasara ihe atụ a. N’ụlọ nsọ Jehova, e nwere arịa ndị a na-eji efe naanị Jehova. Iwu Mozis kwuru otú a ga-esi na-elekọta ha, kwuokwa na a ga-egbu onye ọ bụla dara iwu ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 1:50, 51) Ebe ọ bụ na Jehova lekọtara arịa ndị ahụ a na-eji efe ya, o doro anya na ọ ga-elekọtakwa ndị nyefere ya onwe ha ma na-erubere ya isi, bụ́ ndị ọ họọrọ ịbụ ndị ya. Jehova gwara ndị ya, sị: “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ mkpụrụ anya m aka.”—Zek. 2:8.

17. Olee ihe Jehova “na-ege ntị ma na-anụ”?

17 Malakaị kwuru na mgbe ndị Jehova nọ na-ekwurịta okwu na Jehova nọ “na-ege ntị ma na-anụ ihe ha na-ekwu.” (Mal. 3:16) N’eziokwu, Jehova “maara ndị bụ́ ndị ya.” (2 Tim. 2:19) Ọ ma ihe niile anyị na-ekwu, ma na-eme. (Hib. 4:13) Ọ bụrụ na anyị ejighị obiọma na-emeso ụmụnna anyị ihe, Jehova na-ahụ ya. Obi kwesịkwara isi anyị ike na Jehova na-ahụkwa mgbe anyị na-ele ụmụnna anyị ọbịa, na-emesapụrụ ha aka, na-agbaghara ha, ma jiri obiọma na-emeso ha ihe.—Hib. 13:16; 1 Pita 4:8, 9.

“JEHOVA AGAGHỊ AHAPỤ NDỊ YA”

18. Olee otú anyị ga-esi egosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ùgwù ọ kwanyeere anyị ka anyị bụrụ ndị ya?

18 O doro anya na anyị chọsiri ike igosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ùgwù ọ kwanyeere anyị ka anyị bụrụ ndị ya. Anyị ma na mgbe anyị nyefere Jehova onwe anyị, ọ bụ ihe kacha mma anyị kwesịrị ime. N’agbanyeghị na anyị bi “n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, nke hịgọkwara ahịgọ,” anyị chọrọ ka ndị mmadụ hụ na anyị bụ “ndị aka ha dị ọcha, . . . na-enwu n’etiti ha dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa.” (Fil. 2:15) Anyị kpebisiri ike na anyị ga-ezere ihe ọ bụla Jehova kpọrọ asị. (Jems 4:7) Anyị hụkwara ụmụnna anyị n’anya, na-akwanyekwara ha ùgwù n’ihi na ha bụkwa nke Jehova.—Rom 12:10.

19. Olee otú Jehova si agọzi ndị nke ya?

19 Baịbụl kwuru, sị: “Jehova agaghị ahapụ ndị ya.” (Ọma 94:14) Obi siri anyị ike na n’agbanyeghị ọdachi ọ bụla nwere ike ịdakwasị anyị, Jehova ga-anọnyere anyị. Ọnwụ enwedịghị ike ime ka Jehova kwụsị ịhụ anyị n’anya. (Rom 8:38, 39) Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị dị ndụ, anyị dị ndụ maka Jehova, ọ bụrụkwa na anyị nwụrụ anwụ, anyị nwụrụ maka Jehova. Ya mere, ma ànyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Jehova.” (Rom 14:8) Anyị na-atụsi anya ike ịhụ mgbe Jehova ga-akpọlite ndị enyi ya niile n’ọnwụ. (Mat. 22:32) Ka ọ dị ugbu a, Jehova na-agọzi anyị mmaji kwuru mmaji. Baịbụl kwuru na “obi ụtọ na-adịrị mba nke Jehova bụ Chineke ya, bụ́ ndị ọ họọrọ ịbụ ihe nketa ya.”—Ọma 33:12.