Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Nke 6 n'Afọ 2017

 ISIOKWU TETA! A | MMEBI ỤWA Ò RUWELA?

Onye Ọ Bụla Chọrọ Ịmata Azịza Ya

Onye Ọ Bụla Chọrọ Ịmata Azịza Ya

Ọ BỤRỤ na akụkọ ọjọọ juru n’ụwa taa na-eme ka ụjọ na-atụ gị nakwa ka ị na-echegbu onwe gị, mara na ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. N’afọ 2014, onye na-achị mba Amerika n’oge ahụ aha ya bụ Barack Obama kwuru na ihe ọjọọ dị iche iche ndị ụlọ ọrụ nta akụkọ na-agbasa n’akụkọ, emeela ka ọtụtụ ndị kwuo “na ụwa a aghịghasịala . . . nke na o nwekwaghị mmeta.”

O teghi aka o kwuchara ihe a, ya ekwuwe gbasara mbọ ndị a na-agba iji gboo nsogbu ndị e nwere n’ụwa taa. Ọ kpọrọ mbọ ndị gọọmenti ụfọdụ na-agba “ozi ọma,” kwuokwa na obi siri ya ezigbo ike na mbọ ha ndị ahụ ga-eme ka ihe dị mma. E nwere ike ikwu na ihe ọ na-ekwu bụ na ya kwetasiri ike na ọ bụ mbọ ndị a ndị mmadụ na-agba ga-eme ka ọdachi ndị ahụ a na-atụ anya na ha ga-akpata ụwa mmebi ghara ime.

Ọtụtụ ndị kwetara n’ihe a o kwuru. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị tinyere obi ha na sayensị na-ekwu na ọganihu a na-enwe n’ihe banyere nkà na ụzụ ga-enye aka dozie nsogbu ndị e nwere n’ụwa. Otu ọkachamara n’ihe gbasara nkà na ụzụ kwuru na obi siri ya ike na si ugbu a ruo n’ihe dị ka n’afọ 2030, “nkà na ụzụ anyị ga-eji otu puku okpukpu ka nke e nwere taa mma, nakwa na n’afọ 2045, ihe ọ ga-eji ka ya mma ga-eru okpukpu otu nde. Anyị na-eme nke ọma. Ọ bụ eziokwu na nsogbu na-abịa n’ike n’ike, ma, anyị na-egbo ha ngwa ngwa karịa otú ha si abịa.”

Olee otú nsogbu ụwa a jọruru ná njọ? Ọ̀ bụ eziokwu na ọ fọziri obere ka ụwa mebie? N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị sayensị na ndị ọchịchị na-ekwu na ihe ga-emecha dị mma, ọtụtụ ndị ka nọ ná mgbagwoju anya gbasara ihe ga-eme n’ọdịnihu. Gịnị kpatara ya?

NGWÁ AGHA ỌGWỤRỤ MBA. Òtù Mba Ụwa na òtù ndị ọzọ agbasiela mbọ ike iji hụ na mba dị iche iche mebisịrị ma kwụsị ịkpụ ngwá agha ọgwụrụ mba, ma mbọ ha kụrụ afọ n’ala. Ndị ọchịchị na-agba isi akwara elegharala iwu ndị gbochiri inwe ụdị ngwá agha ndị a anya. Mba ndị ahụ a ma na ha bụ aka ochie n’ịkpụ ngwá agha ọgwụrụ mba anọgidekwala na-akpụpụta ngwá agha ndị ka njọ. Mba ndị nke na-enwebughị ngwá agha ọgwụrụ mba enwetala ya, dịkwa njikere iji ya sụọ ndị mmadụ akwụ.

Otú mba dị iche iche sizi dị njikere maka agha ọgwụrụ mba ugbu a mere ka ahụ́ ghara irukwa onye ọ bụla ala, ma n’oge o yiri ka e nwere “udo.” Akwụkwọ bụ́ Bulletin of the Atomic Scientists kwuru na ihe na-akacha enye nsogbu n’obi bụ na e nwedịrị “ngwá agha ndị nwere ike ịgbapụ n’onwe ha gaa ‘gbuo’ ndị mmadụ.”

 ỌRỊA NDỊ NA-AKPA ANYỊ AKA ỌJỌỌ. E nwechaghị oké ihe sayensị ga-emeli iji mee ka mmadụ niile na-enwe ezigbo ahụ́ ike. Nsogbu ndị na-akpata ọrịa ndị dị ka ọbara mgbali elu, oké ibu, mmetọ ikuku, na ịṅụ ọgwụ ọjọọ na-arịzi ibe ya elu. Ọrịa ndị na-anaghị efe efe dị ka kansa, ọrịa obi, na ọrịa shuga na-egbuzi ọtụtụ ndị n’eleghị anya n’azụ. Ọrịa ndị ọzọ dị ka isi mmebi na-akpakwa ọtụtụ ndị aka ọjọọ. N’ime afọ ndị na-adịchabeghị anya, e nweela ọrịa ndị jọgburu onwe ha dị ka Ebola na ọrịa Zika. Ihe a na-ekwu bụ na ọrịa akala ụmụ mmadụ ike, o nweghịkwa onye ma mgbe ọ ga-akwụsị.

OTÚ NDỊ MMADỤ SI EMETO GBURUGBURU EBE OBIBI. Ụlọ ọrụ dị iche iche anọgidela na-emetọ ikuku. Ọtụtụ nde mmadụ na-anwụ kwa afọ n’ihi ikuru ikuku ọjọọ.

Ọhaneze na ụlọ ọrụ gọọmenti dị iche iche anọgidela na-awụnye mposi, ihe dị iche iche si n’ụlọ ọgwụ, rọba, kemikal na ihe ndị ọzọ na-adịghị mma n’ime osimiri. Otu akwụkwọ aha ya bụ Encyclopedia of Marine Science kwuru na “ihe ndị a na-adịghị mma a na-awụnye n’osimiri na-akpa ma azụ̀ ma ahịhịa ndị nọ n’ime osimiri aka ọjọọ, na-egbukwa ha. Otu ihe ahụ ka ọ na-emekwa ndị mmadụ na-eri ha.”

Ọ na-esi ike inweta mmiri ọṅụṅụ di mma. Otu onye sayensị si Briten aha ya bụ Robin McKie kwuru, sị: “Ụkọ mmiri a na-ekwu banyere ya n’ebe ụfọdụ ga-emecha zuo ụwa niile.” Ndị ọchịchị kwetara na ọ bụ ụmụ mmadụ kpatara ụkọ mmiri a dịnụ, nakwa na nsogbu ndị ọ ga-akpata ga-akarị akarị.

ỌDACHI NDỊ NA-EMERE ONWE HA. Oké ifufe na ala ọma jijiji na-eme ka e nwee idei mmiri ndị na-emebisị ihe, ala mbize na ụdị ọdachi ndị ọzọ. Ha egbuokwala ọtụtụ mmadụ ma kpatara ndị ọzọ nsogbu dị iche iche. Otu nchọpụta Ụlọ Ọrụ Amerịka Na-ahụ Maka Ụgbọelu na Mbara Elu mere ma bipụta gosiri na a ga-enwekwu “ajọ ifufe, oké okpomọkụ nakwa oké mmiri ozuzo na oké ọkọchị ndị ka njọ.” Ọdachi ndị na-emere onwe ha, ọ̀ ga-ala ụmụ mmadụ niile n’iyi?

Ọ ga-abụ na ị ma na e nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ nwere ike ịkpatara ndị mmadụ ọdachi. Ma, ịnọ na-eche gbasara ihe ọjọọ dị iche iche na-eme n’ụwa taa na ige ndị ọchịchị na ndị sayensị ntị a gaghị eme ka i nweta azịza na-eju afọ maka ihe ga-eme n’ọdịnihu. Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, ụfọdụ ndị amatala azịza ajụjụ gbasara ihe ndị na-eme n’ụwa taa nakwa ihe ga-eme n’ọdịnihu. Olee ebe a ga-esi achọta azịza ajụjụ ndị ahụ?