Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Nke 5 n'Afọ 2016

 ISIOKWU TETA! A

Jizọs Ọ̀ Bụ Mmadụ Dịrị Ndụ n’Ụwa A?

Jizọs Ọ̀ Bụ Mmadụ Dịrị Ndụ n’Ụwa A?

JIZỌS abụghị onye ukwu, ọ baghịkwanụ ọgaranya. O nweghịdị ụlọ nke aka ya. Ma, ihe ndị ọ kụziri abaarala ọtụtụ nde mmadụ uru. Ma, Jizọs ọ̀ bụ mmadụ dịrị ndụ n’ụwa a? Gịnị ka ndị ọkachamara oge a na ndị nke oge gboo kwuru?

  • Michael Grant, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme na ọkachamara n’ihe gbasara ndị mgbe ochie, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị ewere Agba Ọhụrụ otú anyị si were akwụkwọ ndị mgbe ochie ndị ọzọ, anyị ga-ekweta na Jizọs bụ mmadụ dịrị ndụ n’ụwa a otú ahụ anyị kwetakwara na ọtụtụ ndị ọgọ mmụọ a ma ama n’oge ochie dịrị ndụ.”

  • Rudolf Bultmann, bụ́ ọkà mmụta n’ihe gbasara Agba Ọhụrụ, kwuru, sị: “O nweghị ebe mmadụ ga-agbakwasị ụkwụ sị na Jizọs abụghị mmadụ dịrị ndụ n’ụwa a, ọ baghịkwa uru ịrụwa ụka gbasara ya. O nweghị onye isi dị mma ga-asị na ọ bụghị Jizọs hiwere òtù [Ndị Kraịst] ahụ a ma ama malitere n’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu.”

  • Will Durant, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme na ọkà ihe ọmụma, dere, sị: “Ọ bụrụ na ọ bụ mmadụ ole na ole bụ́ ndị nkịtị [ya bụ Matiu, Mak, Luk na Jọn] chepụtara akụkọ otu nwoke na-adịghị adị, akụkọ ya ana-akpa ike otú a, na-akụzikwara ndị mmadụ otú ha na ibe ha ga-esi dị n’udo, mara na ọ bụ ọrụ ebube dị egwu, nke kadị ndị nke ahụ e dere na Matiu, Mak, Luk na Jọn.”

  • Albert Einstein, bụ́ ọkà mmụta sayensị, kwuru, sị: “Abụ m onye Juu, mana, akụkọ gbasara nwoke onye Nazaret a masịrị m nke ukwuu.” Mgbe a jụrụ ya ma ò kwetara na Jizọs dịrị ndụ n’ụwa a, ọ sịrị: “À na-ajụkwa ajụ? O nweghị onye ga-agụcha akwụkwọ Matiu, Mak, Luk na Jọn, sị́ na Jizọs abụghị mmadụ dịrị ndụ n’ụwa a. Akwụkwọ ndị ahụ kọwara nnọọ ụdị onye Jizọs bụ nke ọma. Akụkọ ifo anaghị adị otú ahụ.”

    “O nweghị onye ga-agụcha akwụkwọ Matiu, Mak, Luk na Jọn, sị́ na Jizọs abụghị mmadụ dịrị ndụ n’ụwa a.”—Albert Einstein

 GỊNỊ KA AKỤKỌ IHE NDỊ MERE N’OGE OCHIE NA-EGOSI?

Ebe a kacha kọọ akụkọ banyere ndụ Jizọs na ozi ya bụ n’akwụkwọ Baịbụl ndị a na-akpọ Matiu, Mak, Luk na Jọn. Ma, e nwekwara ụfọdụ ndị mgbe ochie na-abụghị Ndị Kraịst dere banyere Jizọs.

  • TACITUS

    (Ọ dịrị ndụ malite n’ihe dị ka n’afọ 56 O.N.K. ruo n’afọ 120 O.N.K., O.N.K. pụtara Oge Ndị Kraịst) Tacitus so n’otu n’ime ndị Rom a ma ama kọrọ akụkọ ihe mere eme. O dere banyere ihe ndị mere n’Alaeze Ukwu Rom malite n’afọ 14 O.N.K. ruo n’afọ 68 O.N.K. (Jizọs nwụrụ n’afọ 33 O.N.K.) Tacitus kọrọ na mgbe ọkụ gbara n’obodo Rom n’afọ 64 O.N.K., ndị mmadụ boro ya Eze Ukwu Niro. Ma, ọ sịrị na ihe Niro meziri iji mee ka ndị mmadụ “kwụsị ebubo ahụ ha na-ebo ya” bụ ibo ya Ndị Kraịst. Tacitus sịrị: “Mgbe Taịbiriọs na-achị, e gburu Kraịst bụ́ onye malitere òtù [Ndị Kraịst]. Ọ bụ Pọntiọs Paịlet mara ya ikpe ọnwụ.”—Annals, XV, 44.

  • SUETONIUS

    (Ọ dịrị ndụ malite n’ihe dị ka n’afọ 69 O.N.K. ruo mgbe afọ 122 O.N.K. gachara) Suetonius bụ onye Rom na-akọ akụkọ ihe mere eme. N’akwụkwọ o dere a na-akpọ Lives of the Caesars, ọ kọrọ banyere ihe ndị mere malite n’ọchịchị Eze Ukwu Rom nke mbụ ruo na nke iri na otu. N’ihe o dere banyere Eze Ukwu Klọdiọs, ọ kọrọ na e nwere ọgba aghara dapụtaranụ n’etiti ndị Juu bi na Rom gbasara Jizọs. (Ọrụ Ndịozi 18:2) Suetonius dere, sị: “Ebe ọ bụ na Krestus [ya bụ Kraịst] na-eme ka ndị Juu na-eme ọgba aghara, ọ [ya bụ Klọdiọs] chụpụrụ ha na Rom.” (The Deified Claudius, XXV, 4) Ọ bụ eziokwu na o boro Jizọs ihe ọ na-emeghị, ma ihe a ọ kọrọ gosiri na o kwetara na Jizọs bụ mmadụ dịrị ndụ n’ụwa a.

  • PLINY THE YOUNGER

    (Ọ dịrị ndụ malite n’ihe dị ka n’afọ 61 O.N.K., ruo n’afọ 113 O.N.K.) Pliny The Younger bụ onye Rom na-ede akwụkwọ, ọ chịkwara obodo Bitinia (nke a na-akpọ Tọki taa). O degaara eze ukwu Rom aha ya bụ Trajan akwụkwọ ozi gwa ya aka ọ ga-eji eso Ndị Kraịst nọ n’ebe ọ na-achị. Pliny kwuru na ya na-amanye Ndị Kraịst ikwu na ha abụghịzi Ndị Kraịst. Onye ọ bụla jụrụ ime ya, ya egbuo ya. Ọ sịrị: ‘M hapụrụ ndị nke kwuru ihe m gwara ha kwuo iji rịọ chị anyị dị iche iche arịrịọ ma jirikwa mmanya na frankinsens kwanyere ihe oyiyi gị ùgwù ma kpọọ Kraịst iyi.’Pliny—Letters, Book X, XCVI.

  •  FLAVIUS JOSEPHUS

    (Ọ dịrị ndụ malite n’ihe dị ka n’afọ 37 O.N.K., ruo n’afọ 100 O.N.K.) Ọ bụ onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme, bụrụkwa onye nchụàjà. O kwuru banyere otu nnukwu onye nchụàjà ndị Juu ọnụ na-eru n’okwu aha ya bụ Anas. Ọ sịrị na Anas “kpọkọtara ndị ikpe Sanhedrin, [ya bụ, ụlọ ikpe kacha elu nke ndị Juu] kpọpụtara ha otu nwoke aha ya bụ Jems nwanne Jizọs onye a na-akpọ Kraịst.”Jewish Antiquities, XX, 200.

  • TALMUD

    Talmud bụ akwụkwọ e wekọtara ihe niile ndị rabaị dere malite n’agbata afọ 201 na afọ 600. Ihe e dere na ya gosiri na ndị iro Jizọs kwetara na o nwere onye bụ́ Jizọs. Otu ebe n’akwụkwọ ahụ sịrị: N’oge “Ememme Ngabiga, a kpọgidere Yeshu [ya bụ Jizọs] onye Nazaret n’elu osisi.” Ihe a o kwuru bụ eziokwu. (Babylonian Talmud, Sanhedrin 43a, Munich Codex; gụọ Jọn 19:14-16.) Ebe ọzọ n’akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Anyị achọghị ịmụta nwa ga na-emenye onwe ya ihere n’ihu ndị mmadụ otú a onye Nazaret a na-eme.” Onye Nazaret bụ aha ọzọ e ji mara Jizọs n’oge ahụ.—Babylonian Talmud, Berakoth 17b, footnote, Munich Codex; guọ Luk 18:37.

IHE BAỊBỤL KWURU BANYERE JIZỌS

Ebe a kacha kọọ akụkọ banyere ndụ Jizọs na ozi ya bụ n’akwụkwọ Baịbụl ndị a na-akpọ Matiu, Mak, Luk na Jọn. Akwụkwọ ndị a kpọrọ ndị mmadụ aha, kpọọ ebe dị iche iche aha, kwuokwa kpọmkwem oge ihe ndị e dere na ha mere. Ọ bụ ihe ndị a ka e ji ama akụkọ mere eme. Dị ka ihe atụ, ka anyị jiri ihe dị na Luk 3:1, 2 mata mgbe otu nwoke aha ya bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim malitere ọrụ ya.

“Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.”2 Timoti 3:16

Luk dere, sị: “N’afọ nke iri na ise nke ọchịchị Taịbiriọs Siza, mgbe Pọntiọs Paịlet bụ gọvanọ Judia, Herọd abụrụkwa onye na-achị ógbè Galili, ma Filip nwanne ya bụ onye na-achị ógbè Ituria na Trakọnaịtis, Laịsenias abụrụkwa onye na-achị ógbè Abilini, n’ụbọchị onyeisi nchụàjà bụ́ Anas na n’ụbọchị Keyafas, okwu Chineke ruru Jọn nwa Zekaraya ntị n’ala ịkpa.” Anyị si n’ihe a Luk dere mata na ọ bụ n’afọ 29 ka “okwu Chineke ruru Jọn nwa Zekaraya ntị.”

 Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme maara mmadụ asaa ahụ Luk kpọrọ aha. N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ ndị bidokwara ikwu na Pọntiọs Paịlet na Laịsenias abụghị ndị mmadụ dịrị ndụ n’ụwa a. Ma a sị na ndị ahụ ma, ha agaaraghị ekwu ihe ahụ n’ihi na a hụla ihe odide ndị mgbe ochie aha mmadụ abụọ a dị na ya. Nke a gosiri na ihe Luk kwuru bụ eziokwu. *

GỊNỊ MERE O JI GBASA ANYỊ?

Jizọs kụziiri ndị mmadụ gbasara Alaeze Chineke nke bụ́ ọchịchị ga-achị ụwa n’ọdịnihu

Ihe mere o ji gbasa anyị bụ na anyị kwesịrị ịma nke bụ́ eziokwu banyere Jizọs n’ihi na ihe ndị ọ kụziri dị ezigbo mkpa. Iji maa atụ, Jizọs kụziiri ndi mmadụ otú ha ga-esi ebi ezigbo ndụ ma na-enwe obi ụtọ. * O mekwara ka a mata na n’ọdịnihu, mmadụ niile ga-ebi n’udo na obi iru ala, otu ọchịchị a na-akpọ “alaeze Chineke” ana-achị ha.Luk 4:43.

Ọkpụkpọ a kpọrọ ọchịchị a “alaeze Chineke” dabara adaba n’ihi na ọ ga-eme ka Chineke chịwazie ụwa niile. (Mkpughe 11:15) Jizọs ji ihe o kwuru n’ekpere ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya mee ka ihe a doo anya. Ọ sịrị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, . . . Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa.” (Matiu 6:9, 10) Gịnị ka Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ? Lee ụfọdụ n’ime ha:

Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche na ihe ndị a bụ naanị ihe a na-arọ ná nrọ. Ma n’eziokwu, nke bụ́ nrọ bụ ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi na ha ga-eme ka ụwa a dị mma. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na e nweela ihe ọhụrụ ndị a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ, nweekwa ihe ndị dị ịtụnanya ndị sayensị na ndị nkà na ụzụ na-emepụta, ma ọtụtụ nde mmadụ ka nọ n’ụjọ n’ihi na ha amaghị ihe echi ga-abụ. Kwa ụbọchị, anyị na-ahụ ka ihe na-esikwu ike, ndị ọchịchị ana-emekpọ ndị ha na-achị ọnụ, ndị isi okpukpe ana-emegide ndị òtù ha, anyaukwu na nrụrụaka ana-akakwa njọ. N’eziokwu, ọchịchị ụmụ mmadụ adabaala afọ.Ekliziastis 8:9.

Ugbu a, anyị ahụla na ọ dị mkpa ka anyị mata nke bụ́ eziokwu banyere Jizọs. * 2 Ndị Kọrịnt 1:19, 20, sịrị: “N’agbanyeghị ole nkwa Chineke dị, ha abụrụwo Ee site na [Kraịst].”

^ para. 23 A hụrụ ihe odide ndị mgbe ochie e dere banyere otu “onye na-achị ógbè” nke aha ya bụ Laịsenias. (Luk 3:1) Ọ chịrị n’ógbè Abilini n’oge ahụ Luk kwuru.

^ para. 25 Ị gụọ Matiu isi nke 5 ruo na nke 7, ị ga-ahụ ọmarịcha ihe ndị Jizọs kụziri. A na-akpọkarị ha Ozizi Elu Ugwu Jizọs.

^ para. 32 Ị chọọ ịmatakwu banyere Jizọs na ihe ndị ọ kụziri, gaa na www.jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA.

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Baịbụl Ọ̀ Na-ekwu Eziokwu?

Ọ bụrụ na Baịbụl bụ okwu Chineke, ọ ga-adị iche n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ e detụrụla.

ỤLỌ NCHE

Jizọs Ò Bilitere n’Ọnwụ n’Eziokwu?

Olee ihe ndị gosiri na ihe Matiu, Mak, Luk na Jọn kọrọ gbasara Jizọs bụ eziokwu?